Akụkọ na-ekwu na a na-achọ
mmadụ abụọ nọ n’ime ụgbọala nke idemmiri bupụrụ n’akụkọ Oke Oba nke Agege,. Legọs
steeti achọ.
Nke a bụ dịka mmiri malitere
kemgbe abalị ole m ole na steeti ahụ, gara n’ihu zoo nke ukwuu n’isi ụtụtụ Satọdee bụ ụbọchị
itoolu nke ọnwa Julaị, 2022.
Oke mmiri a kpalitere
idemmiri n’akụkụ steeti ahụ dị ịcheịche, nke gụnyere Agege.
Ụfọdụ anya hụrụ ihe a
mere kwuru na idemmiri ahụ bururu ụgbọala ndi a ma suchie ọnụ ụzọ mpụta ya bụ ụgbọala nke bụ na ha enweghị ike pụta n'oge.
Ndị ụlọọrụ gbata
gbata nke National Emergency
Management Agency, Nema kwuru na ha agbapụtala mmadụ anọ n’aka ụfọdụ ụgbọala
idemmiri a bururu n'akụkụ ebe ahụ.
Ndị ọrụ gọọmentị kọwara
na ụgbọala nke ndị a nọ n’ime ya bụ nke mmiri bupụrụ n’akụkụ Fatoki.
Akụkọ kwukwara na mmiri
bupụkwara mmadụ isii ọzọ nọ n’ime ụgbọala ma bubaa ha n’ime otu ụlọ arụchabeghị mana ndị ọrụ
gbata gbata nke mmenyụọkụ na Legọs steeti bụ Lagos State Fire Service
gbara ama na ha hụrụ mmadụ atọ n’ime otu ụgbọala Lexus ebe ha hụrụ mmadụ atọ ndị ọzọ nọ n’ime ụgbọala ọzọ nọ nso ebe ahụ.
E kwuru na ihe mere
idemmiri a jiri buru ndị a bụ na ha gbara isi akwara banyere n’ime idemmiri ndị nọ
ebe ahụ dịka oke mmiri ahụ nọ na-ezo.
Otu onye n’ime ndị bi
ebe ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha kọwara na gọọmentị malitere ịrụ olulu ebe
mmiri ga-esi agafe kemgbe, mana ọrụ ha na-aga nwayọ nwayọ.
Cheta na n’ọnwa Eprel,
gọọmentị Legọs steeti zipụtara ozi kwuo na oke mmiri ga-ezo n’afọ a nke bụ na
ogogo ya ga-eru 1,750mm.
Kọmịshọna ihe gbasara
ogige ebe obibi ndị mmadụ nakwa mmiri ọgbụgba bụ Tunji Bello kwuru n’oge ahụ na
ya bụ mmiri ozizo ga-emetụta akụnụba ndị mmadụ n’ụzọ ọjọọ.