You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Amerịka egbuola Ayman al-Zawahiri bụ onyeisi otu al-Qaeda

E gburu ya n’isiobodo Afghanistan bụ Kabul n’ụbọchị ụka dịka otu nchekwa mba Amerịka nke CIA wakporo be ya.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chukwunaeme Obiejesi

  1. E jirila ọkụ gbagbuo mmadụ 20 nọ n'ụlọọgwụ na mba DR Congo

    Ngalaba United Nations ekwuola na mmadụ iri abụọ anwụọla ebe ọtụtụ ndị ọzọ merụrụ ahụ dịka ndị omekome wakporo ụfọdụ ebe na mpaghara ọwụwa anyanwụ mba DR Congo.

    Ụfọdụ ndị a nwụrụ bụ ụmụaka, ebe mmadụ anọ ọzọ nwụrụ n'elu akwa ọrịa ha n'ụlọọgwụ dị na mpaghara ugwu Livu.

    Ọ bụ ndị otu Allied Democratic Forces ka a na-ebo ebubo mkpamkp a.

    Otu a bụ ATF na Islamic State si n'otu efere erikọ ma mba Amerịka amachiele ha dịka otu oyiegwu.

  2. Etinyela ọnọdụ gbatagbata na mba Sri Lanka iji chụsaa ndị ngagharịiwe

    Praịm Mịnịsta mba Sri Lanka bụ Ranil Wickremesinghe etinyela ọnọdụ gbatagbata na mba ahụ dịka ndị na-eme ngagharịiwe jụrụ ịkwụsị.

    Nke a na-abịa dịka onyeisiala mba ahụ bụ Gotabaya Rajapaksa gbara arụkwaghịm, ma gbapụ ọsọ ndụ gbaga mba Maldives.

    Ndị na-eme ngagharịiwe chọkwara ka Ranil Wickremesinghe ritukwaa dịka Praịm Mịnịsta, mana o kwuru na ọ ga-aritu ma e hibe gọọmentị ọhụrụ.

    Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii ejirila anwụrụ ose chụsaa ndị ngagharịiwe nọchiri n'ụlọ Praịm Mịnịsta nakwa nke Onyeisiala, mana ọtụtụ ekweghị ịpụ.

    Dịka iwu Sri Lanka si dị, ọ bụrụ na Onyeisiala anọghị ya, Praịm Mịnịsta ga-ewere ọchịchị na nchereoge ruo abalị iri atọ.

  3. Mba France ekpebiela ịtụ otu onye ọchịchị mba Rwanda nga ruo afọ 20, Laurent Bucyibaruta bụ onye ọchịchị mba Rwanda ikpe marala na mba France ugbua.

    Ikpe amaala Laurent Bucyibaruta bụbu otu onye ọchịchị mba Rwanda e kwuru so kpaa nkata kpalitere ogbugbu ọtụtụ ndị mba ahụ n’afọ 1994 maka okwu ịkpa oke agbụrụ.

    Akụkọ kwuru na Bucyibaruta bụbu Gọvanọ mpaghara Gikongoro nke mba Rwanda n’oge ahụ gwara puku kwuru puku ndị agbụrụ Tutsi ka ha zoo n’ime ụlọakwụkwọ Murambi Technical School dịka e kwuru na e nwere ndị chọrọ igbu ha.

    Abalị ole m ole gachara ka ọ nyere ha ndụmọdụ a, a bịara n’ime ụlọakwụkwọ ahụ wakpoo ma gbuofuo ọtụtụ n’ime ha.

    Ngụkọ gosiri na oke ogbugbu a mere n’afọ 1994 dulara ihe ruru mmadụ 800,000 bụ ndị agbụrụ Tutsis na ndị na-abụchaghị Hutus ala mmụọ.

    Ihe igbaama ọtụtụ ndị ihe a mere metụtara wetere ụlọikpe ahụ bụ ihe mere ha jiri mee mkpebi na Bucyibaruta ga-aga nga ruo afọ iri abụọ.

  4. Ọ bụghị eziokwu na di Osinachi si na nga Kuje gbafuo

    Ndị na-ahụ maka ụlọmkpọrọ na Naịjiria bụ Nigeria Correction Service (NCS) ekwuola na ọ bụghị eziokwu na Peter Nwachukwu, di otiegwu ụka a ma ama bụ Osinachi Nwachukwu, so na ndị si na mkpọrọ Kuje gbafuo.

    Chukwuedo Humphrey bụ Deputy Superintendent nakwa ọnụ na-ekwuru NCS n'Abuja, gwara BBC na "ọ bụghị eziokwu na di Osinachi Nwachukwu si Kuje gbafuo.

    "Dịka m na-agwa gị okwu ugbua, Anọ m n'ime ụlọmkpọrọ Kuje, ahụrụ m di Osinachi anya ugbua.

    "Ya bụ akụkọ na o si Kuje gbafuo abụghị eziokwu", ka Humphrey kwuru.

    Nke a na-abịa dịka akụkọ malitere ifegharị na di Osinachi bụ onye a nwụchiri n'ụlọmkpọrọ, so na ndị omekome si na nga gbafuo n'abalị Tuzde, abalị ise nke ọnwa Julaị 2022, mgbe ndị omekome wakporo ụlọmkpọrọ Kuje.

    Humphrey kwuru na ọ bụ kwa ụbọchị ka ha na-anwụchi ndị si n'ụlọmkpọrọ ahụ gbafuo.

    O kwukwara na ọ bụ eziokwu na ndị ụlọọrụ na-ahụ ibu agha megide ọgwụ ike na Naịjiria bụ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA), nwụchikwara otu n'ime ndị ahụ si n'ụlọmkpọrọ gbafuo, n'ụbọchị Mọnde.

    Cheta na a nwụchiri Peter Nwachukwu bụ di Osinachi n'ihi ebubo na ọ kpatara ọnwụ nwunye ya nwụrụ n'ọnwa Epreelụ 2022.

    Gọọmentị Naịjiria na-ebo ya ebubo 23 n'ihi ọnwụ nwunye ya.

    Peter na onwe ya ekwuola na aka ya dị ọcha, mgbe a kpụpụburu ya n'ụlọikpe n'ọnwa Mee.

  5. 'Ntuliaka ọkwa gọvanọ Osun steeti ga-aga sịrịrị werere' - Mahmood Yakubu

    Onyeisi Inec bụ Mahmood Yakubu ekwela nkwa na ntuliaka ọkwa Gọvanọ a ga-enwe n’Osun steeti na ngwụcha izuụkaa ga-aga siriri werere.

    O kwere nkwa a n’ọgbakọ ndị ọnụ na-eru n’okwu e nwere n’Osogbo taa bụ Tuzde, dịka ndị uweojii kwuru na ha ga-eziga ndịọrụ puku iri abụọ na otu iji wulite nchekwa n’oge ntulia aka ahụ.

  6. Ndị uweojii Ogun steeti anwuchiela otu nwoke gburu ma bọkasịa nwaanyị dị afọ 71

    Ndị uweojii Ogun Steeti anwuchiela otu nwoke dị afọ 54 aha ya bụ Dauda Bello maka ebubo na o gburu ma bọkasịa Mesesi Adisa dị afọ 71.

    E bidoro ịchọ Adisa kamgbe ọ hapụrụ ụlọ ya n'ụbọchị asatọ nke ọnwa June afọ 2022.

    Ndị uweojii na-eme nyocha chọpụtara na ọ bụ ụlọ Bello bụ ebe ikpeazụ nwaanyị a gara.

    Bello kwuru na ya na Adisa na-agbga mgbere ụmụaka.

    O kwuru na ọ chere na Adisa bu nnukwu ego mgbe ọ bịara n'ụlọ ya.

    Ọ bụ ya mere o jiri were osisi kụọ ya n'isi, kpọpụ ya n'ọhịa ma chọpụta na ọ bụ naanị puku naịra iri abụọ na abụọ ka ọ hụtara n'ahụ ya mgbe o gbuchara ya.

    O kwuru na ọ pepụrụ aka na ụkwụ ya iji ree were nwetekwuo ego ọzọ.

    Dịka ọ dị ugbua, Bello egosila ndị uweojii ọhịa na ebe o liri ya bụ nwaanyị.

  7. Etu emume akwamozu Shinzo Abe si gaa na Japan taa

    Ọtụtụ ndị mmadụ pụtara n’okporoụzọ na Tokyo taa bụ Tuzde iji kwanyere Shinzo Abe, bụbu Praịm mịnịsta mba ahụ ugwu ikpeazụ.

    Ọ bu otu onye ojiegbe gbara Abe egbe n’ụbọchị Fraịde gara aga dịka ọna-ekwu okwu n’ọgbakọ ịchụ nta vootu. Ụgbọala bu akpati ozu nke Abe nọ n’ime ya gbagharịrị obodo Tokyo gburu gburu ka ndị mmadụ hụ ya anya ikpeazụ tupu e buga ozu ahụ ebe a nọrọ kpọọ ya ọkụ dịka omenala ha si dị.

    E nwekwara obere ọgbakọ ofufe n’ụlọ ofufe ‘Zojoji Temple’ maka Abe. Ọkọlọtọ mba Japan niile dị na Tokyo na-efe n’ọkara nke bụ ngosipụta nkwanye ugwu.

  8. Ukraine war: Iran na-akwado inye mba Rọshịa 'Drone' - Amerịka

    Mba Amerịka ekwuola na mba Iran na-akwado inye mba Rọshịa Drone karịrị otu narị ha ga-eji alụ agha na mba Yukren.

    Kama ha kwuru na ha amaghị ma orutela Rọshịa aka, nke a na-eme dịka mba Yukren na-arịọkwa ka ezitere ha Drone puku pụrụ puku iji nyere ha aka.

    Mba abụọ ndị a na-eji ya amata ebe ndị agha ha na-aluso ọgụ nọ.

  9. Ndị ojiegbe atọrọla otu nwaanyị n'ụlọụka n'Imo steeti

    Akụkọ si Imo steeti pụta na-akọwa na ndị ojiegbe mabatara ụlọụka First Baptist Church dị n'ụzọ Wetheral, n'Owere, Imo steeti, tọrọ otu nwaanyị.

    Ha tọrọla Biola Abioye a sị bụ onyeisi otu ụmụnwaanyị na steeti ahụ, n'ụlọụka na Sọnde, 10 nke ọnwa Julaị 2022.

    Otu n'ime ndị isi n'ụlọụka ahụ na-achọghị ka a kpọọ ya aha, gwara onye ntaakụkọ BBC na ndị omekome ahụ bu ụgbọala bịa, chere ruo mgbe a kachara ụka tupu ha atọrọ nwaanyị ahụ.

    O kwuru na ndị omekome ahụ bụ ndị ha chebu na ha bụ ndị ọrụ nchekwa, gbaliri egbe elu iji tinye ndị mmadụ ụjọ n'ahụ, tupu ha anyapụ.

    O kwukwara sị "O nwere onye ha kpọ n'ime ụgbọala ha tụrụ nwaanyị ahụ aka tupu ha akwabanye nwaanyị ahụ n'ụgbọala ha. Ha gbara egbe n'ahụaja ụlọụka anyị. Ọ bụ ihe iyi egwu...Di ya bụ onyeisi ụlọọrụ Imo State Zoological Garden and Wild Life Park, anọghị mgbe ihe a mere, o mere njem. Anyị emeela mkpesa n'aka ndị uweojii."

    Michael Abattam bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ, gwara BBC na ha anwụchiela otu onye a na-enyo na aka ya dị na ya bụ ihe, ma kwuo na a na-agba ya ajụjụ ọnụ.

  10. Onyeisiala mba Sri Lanka agbaala arụkwaghịm

    Praịm Mịnịsta mba Sri Lanka ekwuola na onyeisiala mba ahụ bụ Gotabaya Rajapaksa etịnyela akwụkwọ arụkwaghịm ma rituo n'ọkwa ya dịka onyeisiala.

    Nke a na-esote mwakpo ndị na-eme ngaghariiwe wakporo Obi ebe obibi onyeisiala mba ahụ.

    Dịka o siri dị, ndị a na-eme ngagharịiwe kwuru na ha agaghị apụ Obi ahụ tutu ruo mgbe onyeislala mba ahụ rituru n'ọchịchị.

    Praịm mịnịsta mba ahụ bụ Ranil Wickeremesinghe nọ kwa na ya bụ otu ọnọdọdụ dịka ndị a na-eme ngaghariiwe wakpokwara ụlọ ya ma jụ ipụ tupu ọ rituo n'ọkwa

    A na-ebo Rajapaksa ebubo na ọ bụ ya kpatara ọtanisi nọ na mba ahụ nke mere na ihe oriri, mmanụ ụgbọala na ihe oriri akọọla site n'ọnwa banye n'ọnwa.

  11. Unu abọọla chi

    Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị na mba ụwa niile

  12. Ka chi foo!

    Daalụ maka ịnọnyere anyị taa.

    Ụbọchị nta ka anyị chụọ n'Owere nchị.

  13. A gụpụtala ozu 17 mmiri riri na Legọs

    A gụpụtakwuola ozu mmadụ 13 tinyere anọ a gụpụtaburu, bụ ndị mmiri riri mgbe ụgbọmmiri bu ha kpuru na Legọs na Fraide.

    Ọnụ na-ekwuru ndị ụlọọrụ gbatagbata bụ National Emergency Management Agency (Nema) na steeti ahụ bụ Ibrahim Farinloye, kwuru na a ka na-achọ ma e nwere ndị ọzọ fọrọ.

    Ha kwuru na ha chọpụtara na e nwere ndị ọkwọụgbọmmiri na-arụ ọrụ ma ọ gafechaa elekere asaa nke abalị, nke iwu machiri.

    A chọpụtakwara na iwu machiri iji ụgbọmmiri e ji osisi rụọ na-ebu ndị na-eme njem, mana ọ bụ n'abalị ka ndị a na-eji aghụghọ biri na-eji ya ebu ndị mmadụ ma tinye ha n'ihe ize ndụ.

    Ka ọ dị ugbua, ndị ọrụ nchekwa mmiri dị iche iche na-atule uche ị ma etu ha ga-esi gbochie ụdịrị ihe a ime ọzọ.

  14. A gbagbuola mmadụ 15 na South Africa

    Ihe ruru mmadụ 15 anwụọla dịka ndị ekperima kwara mgbọ aghara aghara n'ọdọ mmanya dị na Soweto, mpaghara South Africa, dịka ndị uweojii si kwuo.

    Ndị uweojii kwuru na ndị ojiegbe ahụ banyere n'ọdọ mmanya Orlando East ahụ n'isi ụtụtụ Sọnde, malite ịkwa ndị ntorobịa dị ebe afọ 19 ruo 35 mgbọ, ma mechaa banye n'ụgbọala ha gbalaga.

    Ihe karịrị mmadụ 10 merụrụ ahụ ebe ụfọdụ na-azọ ndụ ha n'ụlọọgwụ.

    O nwebeghị ihe ndị uweojii chọpụtara bụ iwe ndị ekperima ahụ mere ha ji kpaa mkpamkpa a.

  15. Joe Aribo efegala premier League ebe obi ya dị kemgbe

    Onye egwu Super Eagles bụ Joe Aribo ịtinyela aka n'akwụkwọ ịgbara otu egwubọọlụ Southampton afọ ise ọzọ n'abịa.

    Ekwuputaghị ego ole a ga-akwụ ya mana kepuke na-ekwu na o nwereike iru nde pound isii.

    A tụrụ anya na ya bụ ego nwereike ịgbagoru nde pound iri mgbe a dịghị anya.

    Aribo dị afọ 25 na-agbara Ibroax ebe ọ nọrọ sozin atọ dịka o si Chalton pụta na 2019. mgbe ọ nyeere Rangers aka nweta mmeri na lig ndị Scotland na 2021.

    Aribo sị na "Premier League bụ ọkacha mma n'ụwa. O teela nkiriwara ya site mgbe m dị na nwata".

    "Ọ teela aka agụ ịgba na Premier League gụwara m".

    Onyeisi ndị Southampton bụ Ralph Hasenhuttl sị na "obi dị anyị ụtọ" ịnweta onyeegwu nwere ọtụtụ ihe n'ime ya.

  16. Ụmụnwaanyị mba Amerika agbaala isiakwara na ha chọrọ ite ime

    N'ofesi, ọtụtụ mmụnyaanyị emeela ngharịiwe na isiobodo mba Amerịak maka ya bụ iwu ite ime ha wepụrụ n'ọnwa gara aga.

    Ihe ruru ụmụnwaanyị puku iri na-esi ọnwụ ka gọọmentị mba ahụ nyegharịa ụmụnwaanyị ikike ite ime ka ọ dibụ na mbụ n'ihe ruru afọ iri ise agara aga.

    Lauren Pierce gbara afọ 33 si Dallas bịa ya bụ ngagharịiwe gbaa ihe ruru 2,100km sị na ihe ọkụkọ bu mmiri achụ dị ya oke mkpa.

    Ọ sị na "ọnweghị ihe ka ngagharịiwe a mkpa. O kwesiri ka ahapụrụ ụmụnwwaanyị ahụ ha. Ọ bụrugodi maka ya ka ha ga-eji nwuchie m, ngwa ha bịa".

    Texas nke Dallas bụ isiobodo ya so na steeti iri dị n'Amerịka machigoro ite ime kemgbe eri, dịka ndị ọzọ na-esochi h azụ.

  17. Ndị ọbịa puruiche gara Anambra steeti ụnyaahụ

    Otu mbaụwa ruru iri itoolu mere njem ọrụ otu ụbọchị n'Anambra steeti ụnyaahụ bụ Satọde bụ ebe ha kpọtụụrụ Obi nke Ọnitsha bụ Igwe Alfred Achebe n'obi ya.

    Gọvanọ Chukwuma Soludo nke Anmbra steeti dugharịrị ndị otu a si Amerịka, Uk, Canada nakwa otu dịka UN, WHO, UNDP nakwa ndịọzọ ụfọdụ ebe nwere nsogbu na steeti ahu.

    Soludo ji ohere ahụ kọwatara ndị ọbị ahụ ihe nrite niile dị n'azụmahịa na ịkwado ndị Anambra steeti n'ụzọ abụla ụzọ.

    O kwuru na gọọmentị ya chọrọ ịwetu ego gọọmentị ji eleta onwe ya iji mee ka ego e ji arụ ọrụ pụta,

    O kwuru na idemmiri dị na mpaghara dị iche iche na steeti ahụ na-echere ha akamgba, kwukwaa na ebe a na-aga njem nleta na steeti ahụ gboro kasaa, mana akpọkụ ka mba ndị a bịara njem ahụ bịa nye aka idozi Anambra steeti.

  18. A na-achọ mmadụ abụọ achọ dịka idemmiri bupụrụ ụgbọala ha nọ, Idemmiri so oke mmiri zoro na Legọs steeti n'izu a akpalịterela ọtụtụ ihe mgbu na steeti ahụ.

    Akụkọ na-ekwu na a na-achọ mmadụ abụọ nọ n’ime ụgbọala nke idemmiri bupụrụ n’akụkọ Oke Oba nke Agege,. Legọs steeti achọ.

    Nke a bụ dịka mmiri malitere kemgbe abalị ole m ole na steeti ahụ, gara n’ihu zoo nke ukwuu n’isi ụtụtụ Satọdee bụ ụbọchị itoolu nke ọnwa Julaị, 2022.

    Oke mmiri a kpalitere idemmiri n’akụkụ steeti ahụ dị ịcheịche, nke gụnyere Agege.

    Ụfọdụ anya hụrụ ihe a mere kwuru na idemmiri ahụ bururu ụgbọala ndi a ma suchie ọnụ ụzọ mpụta ya bụ ụgbọala nke bụ na ha enweghị ike pụta n'oge.

    Ndị ụlọọrụ gbata gbata nke National Emergency Management Agency, Nema kwuru na ha agbapụtala mmadụ anọ n’aka ụfọdụ ụgbọala idemmiri a bururu n'akụkụ ebe ahụ.

    Ndị ọrụ gọọmentị kọwara na ụgbọala nke ndị a nọ n’ime ya bụ nke mmiri bupụrụ n’akụkụ Fatoki.

    Akụkọ kwukwara na mmiri bupụkwara mmadụ isii ọzọ nọ n’ime ụgbọala ma bubaa ha n’ime otu ụlọ arụchabeghị mana ndị ọrụ gbata gbata nke mmenyụọkụ na Legọs steeti bụ Lagos State Fire Service gbara ama na ha hụrụ mmadụ atọ n’ime otu ụgbọala Lexus ebe ha hụrụ mmadụ atọ ndị ọzọ nọ n’ime ụgbọala ọzọ nọ nso ebe ahụ.

    E kwuru na ihe mere idemmiri a jiri buru ndị a bụ na ha gbara isi akwara banyere n’ime idemmiri ndị nọ ebe ahụ dịka oke mmiri ahụ nọ na-ezo.

    Otu onye n’ime ndị bi ebe ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha kọwara na gọọmentị malitere ịrụ olulu ebe mmiri ga-esi agafe kemgbe, mana ọrụ ha na-aga nwayọ nwayọ.

    Cheta na n’ọnwa Eprel, gọọmentị Legọs steeti zipụtara ozi kwuo na oke mmiri ga-ezo n’afọ a nke bụ na ogogo ya ga-eru 1,750mm.

    Kọmịshọna ihe gbasara ogige ebe obibi ndị mmadụ nakwa mmiri ọgbụgba bụ Tunji Bello kwuru n’oge ahụ na ya bụ mmiri ozizo ga-emetụta akụnụba ndị mmadụ n’ụzọ ọjọọ.

  19. Ikpe amaala nwoke tiri enyi nwaanyị ya ihe maka ebubo ime ka amụ ya ghara ikelizi ọzọ, Ụlọikpe dị n'Ireland ekpebiala na otu nwaafọ Naịjirịa bi na be ha ga-aga nga maka imekpa enyị nwaanyị ya ahụ.

    Otu ụlọikpe na mba Ireland atụọla otu nwaafọ Naịjirịa nga ruo afọ asatọ maka iwakpo enyi ya nwaanyị ma bo ya ebubo ikpelitere ya ọnọdụ amụ ekweghị nkeli ọzọ.

    Nwoke a akpọrọ Rotimi Adeyemo gbara afọ 52 natara mkpebi a n’aka ụlọikpe Belfast Crown dị na mpaghara Portadown nke mba ahụ.

    Ọkaikpe Justice Fowler mere mkpebi a n’ụbọchị Wenezde ma kwuo na Adeyemo boro enyi ya nwaanyị ebubo ọjọọ nke kwuru na ọ kụrụ ya ọgwụ tinyere ya n’ọnọdụ ihe Bekee na-akpọ ‘erectile dysfunction’ ya bụ ọnọdụ na amụ ya anaghịzị eleki elu.

    E kwuru na nwoke a wakporo ụlọ nwaanyị a ma tie ya ihe, tọdo ya n’olu, kụọ ya ọkpọ nakwa sụọ ya mma.

    Ọkaikpe ahụ kwupụtakwara na nwoke a mere ihe a n’ihu nwa nwaanyị ahụ dị naanị afọ asatọ onye so rịọ ya biko maka agwa ọ kpara mana ọ geghị ha ntị.

    Dịka nwoke a zubere imekpa nwaanyị ahụ ahụ n’ụzọ ọjọọ ma zube igbu ya, ya bụ nwaanyị mechara kụwa ya efere nkụwa n’isi ma gbapụ ọsọ ndụ ya.

    Ọ bụ etu ahụ ka o sizị gbapụta onwe ya n’aka nwoke a ma kpọọ ndị uweojii mba ahụ.

    Ihe a mere n’ụbọchị atọ nke ọnwa Ọgọọst, 2019.

  20. Ndị ngagharịiwe awakpoola be onyeisiala na Praim minista mba Sri Lanka, Igwe mmadụ ndị mba Sri Lanka na-egosi iwe ha nke bụ na ha emeela Praịm minista ha ekwetala iritu n'oche.

    Akụkọ ụwa niile kpụ n’ọnụ ugbua bụ etu puku kwuru puku ndị nghagharịiwe awakpola ebe obibi onyeisiala mba Sri Lanka bụ Gotabaya Rajapaksa taa bụ ụbọchị Satọdee.

    Ihea mere n’obodo Colombo nke mba ahụ.

    Ndị uweojii nwara ịkwụsị ndị a site n’igbali egbe elu ugboro ugboro mana ndị ngagharịiwe a kpọrọ ekwe nkụ dịka ha ji nzọm ụkwụ nke iwe wụba n’ogige ụlọ onyeisiala ha.

    Ndị nghagharịiwe a kwuru na iwe ha bụ ọchịchị si n’aka ndị ọchịchị mba ha nke ha kwuru na akpalitere ha ahụhụ na ihe isi ike.

    Ha tụkwara ezịnụlọ onyeisiala ha aka maka etu ha siri nọsịeike n’ọchịchị kemgbe ụwa nke mere ndị a jiri kwuo na ha na-emefu ego mba ahụ ma na-ebi ego aghara aghara n’aka mba Chaịna.

    Prịam minista mba ahụ bụ Ranil Wickremesighe ekwetela na mkpesa ndị a butere dịka o kwuru na ọ ga-aritu n’ọkwa oche ahụ ma gbaa arụkwaghịm iji nye ndị ọchịchị ọzọ ohere ichi.

    Ndị a wụbara be Prịam minista mba a ma nọrọ n’elu akwa ya na-ese ihe onyonye nakwa foto aghara aghara.

    Ugbua, amabeghị ebe onyeisiala Rajapaksa gbagara dịka ndị ọrụ nchekwa kwuru na ha kpọpụrụ ya ma zoo ya n’ebe nchekwa dị.