“Anyị dị njikere ịkwụsị abụbọ ọrụ anyị echi mana...” - Asuu, Otu Asuu na Gọọmentị etiti ka na-asọkata mpị n'okwu ụgwọ ọrụ ha, leekwa nke dapụtara n'izu a.
Otu ndị nkuzi mahadum na Naịjrịa bụ Academic Staff Union of Universities (Asuu) ekwuola na ha dị njikere ịkwụsị abụbụ ọrụ ha ugbua ma ọ bụrụ na gọọmentị kwee me ihe ha na-arịọ nke gụnyere ibuli ego ụgwọ ọrụ ha, iji teknụzụ na-ahazị usoro ịkwụ ha ụgwọ na ihe ndị ọzọ.
Onyeisi otu a bụ Emmanuel Osodeke kwuru na gọọmenntị etiti emezubeghị ihe ndị ha rịọrọ nke bụ na nnọgide abụbọ ọrụ ha ugbua nọ n’aka gọọmentị etiti.
Osodeke kwuru: “N'ihe gbasara, abụbọ ọrụ a, Asuu nwere nzubere ịkwụsị ya echi echi, anyị na gọọmentị etiti enwechaala mkparitaụka kemgbe, ihe anyị na-echezị ka gọọmentị kpọọ anyị ngwa ngwa ka anyị binye aka n'akwụkwọ nkwekọrịta ọhụrụ”
Cheta na Asuu malitere abụbọ ọrụ ha kemgbe ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Febụwarị afọ a iji gosi iwe ha dịka ha kwuru na gọọmentị etiti ekwebeghị gee ha ntị na mkpesa ha.