You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Amerịka egbuola Ayman al-Zawahiri bụ onyeisi otu al-Qaeda

E gburu ya n’isiobodo Afghanistan bụ Kabul n’ụbọchị ụka dịka otu nchekwa mba Amerịka nke CIA wakporo be ya.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chukwunaeme Obiejesi

  1. “Anyị dị njikere ịkwụsị abụbọ ọrụ anyị echi mana...” - Asuu, Otu Asuu na Gọọmentị etiti ka na-asọkata mpị n'okwu ụgwọ ọrụ ha, leekwa nke dapụtara n'izu a.

    Otu ndị nkuzi mahadum na Naịjrịa bụ Academic Staff Union of Universities (Asuu) ekwuola na ha dị njikere ịkwụsị abụbụ ọrụ ha ugbua ma ọ bụrụ na gọọmentị kwee me ihe ha na-arịọ nke gụnyere ibuli ego ụgwọ ọrụ ha, iji teknụzụ na-ahazị usoro ịkwụ ha ụgwọ na ihe ndị ọzọ.

    Onyeisi otu a bụ Emmanuel Osodeke kwuru na gọọmenntị etiti emezubeghị ihe ndị ha rịọrọ nke bụ na nnọgide abụbọ ọrụ ha ugbua nọ n’aka gọọmentị etiti.

    Osodeke kwuru: “N'ihe gbasara, abụbọ ọrụ a, Asuu nwere nzubere ịkwụsị ya echi echi, anyị na gọọmentị etiti enwechaala mkparitaụka kemgbe, ihe anyị na-echezị ka gọọmentị kpọọ anyị ngwa ngwa ka anyị binye aka n'akwụkwọ nkwekọrịta ọhụrụ”

    Cheta na Asuu malitere abụbọ ọrụ ha kemgbe ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Febụwarị afọ a iji gosi iwe ha dịka ha kwuru na gọọmentị etiti ekwebeghị gee ha ntị na mkpesa ha.

  2. Lee ihe Lai Mohammed kwuru maka atụmatụ mwepụ ‘Fuel subsidy’ ugbua, Dịka ọnụego mmanụ ụgọala na-arị elu n'ụwa, Gọọmentị Naịjriịa ekwuola etu ha ga-esi enyere ndị mba ha aka.

    Minista mgbasaozi Naịjirịa bụ Lai Mohammed ekwuola na gọọmentị etiti agaghị ewepụ ego mbelata dị n’elu mmadụ ụgbọala (Fuel Subsidy) na Naịjrịa.

    Mohammed kọwara na Naịjriịa agaghị abụ ndị dị ịcheịche n’atụmatụ a ma kwuo na Naịjirịa so ụkpụrụ ọtụtụ mba ndị ọzọ na-echepụta echiche ụzọ ha ga-esi nyere ndị mba ha aka dịka ọnụ ego mmanụ ụgbọala na-arị elu n’akụkụ ụwa dị ịcheịche.

    N’okwu ya “Ịtụlee ọgbaghara na nsogbu mwepụ ego a ga-akpalịte ugbua, ọ dị gị ka ya bụ atụmatụ achịtara aja?”

    Na mkparịtaụka a o kwukwara na ọchịchị Onyeisiala Muhammadu Buhari enweterela Naịjirịa nchekwa karịa etu ọ dị mgbe ha nwetere ọchịchị.

  3. Gọọmentị Naịjiria chọrọ itinye ụmụakwụkwọ si Yukren lọta na mahadum Naịjiria

    Gọọmentị Naịjiria ewepụtala ohere ka ụmụakwụkwọ Naịjiria si mba Ukraine gbalata n’ihi agha, banye mahadum na Naịjiria.

    N’agbanyeghi na gọọmentị kwuru na nke a bụ inye ha ohere ịgụchapụ akwụkwọ ha, nke a na-abịa dịka ndị nkuzi mahadum na-agba abụbụọrụ kemgbe ọnwa anọ.

    Lee ozi Mịnịstrị na-ahụ maka mmekọrịta mba na mba ziputara na soshal midia maka ya:

  4. A nwụchiela nwamadi gbagburu mmadụ isii na mba Amerịka

    Aka akparala Robert E Crimo nke atọ, bụ nwamadi a na-enyo maka ịgbagbu mmadụ isii nso obodo Chicago, na mba Amerịka ụnyaahụ.

    Ndị uweojii kwuru na nwamadi ahụ dị afọ iri abụọ na abụọ, zoro n’ụlọelu na-agba ndị pụtara emume ụbọchị ncheta nnwereonwe ha egbe.

    Ha kwuru na ha chụrụ ya obere ọsọ tupu aka ha akpata ya. Tupu ha anwụchie ya, ha bu ụzọ kwuo na ọ bụ "onye a na-enyo enyo" maka ya bụ mwakpo, mana ka ha nwụchiri ya, ha kwuru na obi kara ha na ọ bụ nwamadi a kpara arụ a.

    Robert malitere ịkwa mgbọ dịka o ji nkeji iri na ise gafee elekere atọ nke ụtụtụ (n'oge Amerịka), na-emebeghi eme e bidoro emume ngosi (parade) ha na-emekarị kwa ụbọchị anọ nke Julaị.

    Mmadụ ise nwụrụ n'ọgbọ ahụ, ebe otu onye nwụrụ n'ụlọọgwụ. Ihe karịrị mmadụ iri abụọ merụkwara ahụ.

    Nke a mere n’ihe bụ mwakpo ọzọ na-eme na-erughi otu ọnwa a wakpochara obodo Uvalde, Texas na Buffalo, New York na mba ahụ.

  5. Ị bọọla chi?

    Chi taa ga-efotere gị ihe ọma.

    Nọnyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ga-amasị gị taa.

    Ndeewo.

  6. ‘E wepụrụ aha Naịjirịa na mba ebe ogbugbu ndị okpukperechi Kraịstị na-arị elu n'ihi okwu a achịtaghị aja’ – Lai Mohammed, Gọọmentị Naịjirịa asaala ndị omeiwu na-eme mkpesa ọhụrụ banyere Naịjirịa.

    Minista mgbasaozi na Naịjirịa bụ Lai Mohammed akatọọla mkpesa ndị omeiwu ise mere na mba Amerịka n’izu gara aga na-arịọ ka ebenye aha Naịjirịa ọzọ dịka mba ebe ogbugbu ndị okpukperechi Kraịstị na-arị elu.

    Nke a na-abịa dịka ndịomeiwu mba Amerịka mmadụ abụọ bụ Marco Rubio na Josh Hawley degaara onyeisiala mba ha bụ Joe Biden akwụkwọ site n’aka odeakwụkwọ ukwuu mba ahụ Anthony Bliken na-arịọ ka a gụnye Naịjirịa ọzọ na mba ndị oke ogbugbu ndị okpukperechi kraịstị dị ugbua.

    Ndị omeiwu mmadụ atọ ndị ọzọ binyere aka n’akwụkwọ mkpesa a.

    Mohammed sara mkepsa sị, ka ụwa cheta na e wepụrụ aha Naịjirịa n’okwu a na ọnwa ole m ole gara aga n’ihi nnyocha gosiri na eweghị eziokwu so ebubo okwu a na Naịjirịa.

    Cheta na Amerịka wepụrụ aha Naịjirịa na mba ndị ogbugbu mmadụ n'ihi okpukperechi dị elu n'ọnwa Nọvemba afọ 2021.

  7. 4th July: A na-achọ onye gbagburu mmadụ isii achọọ dịka Amerịka na-eme ncheta nnwereonwe mba ha

    Agbagbuola mmadụ isii n’egbe a gbara taa bụ ụbọchị anọ nke ọnwa July ebe ha na-azọ njem nkirianya maka ncheta ụbọchị mnwere onwe mba Amerịka n’aka ndị ọchịchị nchigbu.

    Ya bụ emume e mere na Chicago kụsara ka ọ gachara nkeji iri a malitere ya.

    Ndị uweojii sị na ha ka na-achọ nwatanwoke onyeisiọcha dị agbata afọ 18 - 20 a na-etu “armed and dangerous”.

    Ndị ọrụ obodo sị na mmadụ iri abụọ na anọ nọ n’ụlọọgwụ ugbua.

    Ndị uweojii Highland gbara ama na-asị ndị mmadụ ha kee nkwụcha maka na ya bụ agbadogwu gbara egbe ahụ ka na-akpagharị.

    Ndị uweojii ahụ agbaala ogige ebe ya bụ ihe mere ma nwetakwa ikemgbọ egbe ahụ onye ọjọọ ahụ gbapụrụ.

    Ha sị na agadogwu ahụ malitere ịgba egbe aghara aghara ka o rutere ebe ndị mmadụ na-eme emume ha ji eme ncheta ụbọchị mnwere onwe mba Amerịka.

    Ndị uweojii sị na o si n’elu ụlọ dị nso gbawa ya bụ egbe.

  8. Women African cup of Nation 2022: Bayana Bayana nke Saụt Afrịka efoola nku Falcons ka ọkụkọ Igbo., Nku ụmụnwaanyị Super Falcons Naịjirịa efelighị n'egwu nke mbụ ha n'asọmpị Wafcon.

    Asọmpi egwuregwu ụmụnwaanyị dị n'etiti Super Falcons nke Naịjirịa na Bayana Bayana nke Saụt Afrịka ebirila ọkụ na Rabat, mba Morocco. Ndị kwara Super Falcons ezigbo ọkụ na mmalite asọmpi ahụ na-ekweghi ha ṅụrụ mmiri tọgbọ iko.

    Otu egwuregwu abụọ sigidere ọnwụ ruo ngwụcha ọkara nke mbụ. Dịka o ruru na nkeji 60 nke agba abụọ, Bayana Bayana nke Saụt Afrịka nyere goolu nke mbụ site n'aka Jermaine Seoposenwe.

    Na-erughi nkeji abụọ nke ahụ mechara ha nyere Naịjirịa goolu ọzọ na nkeji 62' nke Hilda Tholakele nyere. Super Falcons gbagidere ọnyụpa ruo na nkeji 90' ebe ha nyetere otu goolu n’ala Rashidat Ajibade.

    Nke a ga-abụ ugboro abụọ Bayana Bayana nke Saụt Afrịka ga-emeri Super Falcons nke Naịjirịa n'otu usoro.

  9. Atọọrọla ụkọchukwu ụka Katọlịk ọzọ n’abalị atọ na Naịjirịa, Na nso nso a, atọọrla ọtụtụ ndị ụkọchukwu ụka Karịsti n'akụkụ Naịjirịa dị ịcheịche

    Ụka Katọlịk na mpaghara Northwest nke Kaduna steeti ekwuola na ndị omekome atọọrọla otu ụkọchukwu ha n’obodo Zambina nke steeti ahụ.

    Fada John Mark bụ otu n’ime ọnụ na-ekwuru Dayọsịs ụka Katọlịk na mpaghara Kafancha nke Kaduna steeti bụ Dayọsịs ihe a mere gbara BBC ama ya bụ ihe mere ma kọwa na a chọpụtara na a tọọrọ Fada Emmanuel Silas dịka ọpụtaghị doo Maasị isi ụtụtụ Mọnde a.

    Nke a na-abịa dịka omebeghị abalị abụọ a tọọrọ ndị ụkọchukwu ụka Katọlịk abụọ n’Edo steeti.

    Fada Mark kwuru na ụka ha abanyela ekpere ugbua arịọ ka atọhapụ ụkọchukwu a ngwa ngwa.

    Cheta na n’izu gara aga, atọọrọ otu Ụkọchukwu Katọlịk dịka ọ na-akwado ido ụka, e mechara hụ ozu onye ụkọchukwu ahụ dịka e gburu ya.

    Ndị isi ụka Karịsti na Naịjirịa ekwuola na mwakpo ndị okpukperechi Karịsti na-arịzị elu ugbua na Naịjirịa.

  10. Ndị uweojii anwụchịela nwaanyị a na-enyo maka izuru nwa agbataobi ya n’Anambra, Eziokwu apụtala ihe dịka nwaanyị kwuru na o zubeburu ire nwata a.

    Aka akparala otu nwaanyị a sị zuuru nwa ndị agbataobi ya gbara naanị afọ atọ n’Anambra steeti taa bụ Mọnde.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga kwuru na nwaada Chinwe Umegbaka gbara afọ iri abụọ na itoolu gọburu na ọ maghị ihe a, mechara kwupụta na o zuuru nwata ahụ n'ihi na ọ chọrọ iji ya gbaa mgbere.

    O kwuru na nnyocha ka na-aga n’ihu maka okwu a ugbua.

    O kwukwara na na ha e burula nwa a nyefee nne na nna ya.

    Akwụkwọ ozi Ikenga kọwara na nwaanyị a a na-enyo n’okwu izuru nwata a bụ onye Isinkwo Abaomege nke okpuruọchịchị Onicha n’Ebonyi steeti.

  11. Ndị omekome agbaala ụlọọrụ Inec dị n'Enugwu ọkụ

    Ngalaba Inec ekwuola na ndị ha amabeghị ndị ha bụ agbaala ụlọorụ Inec dị n'okpuruọchịchị Igboeze North ọkụ n'etiti abalị ụbọchị Satọde.

    N'ozi onyeisi ha bụ Festus Okoye binyere aka na ya, ha kwuru na ndị ahụ gbara igbe ntuliaka 748 nakwa ebe ntuliaka 240 ọkụ n'agbanyeghi na ndị ọrụ mmenyụọkụ e si Nsukka zipu bịara nwaa ike ha.

    Okoye kwuru na ekpesala ihe a mere n'aka ndị uweojii ka ha mee nyocha banyere ya dịka ha na-agba mbọ ịchọpụta ọnụọgụgụ igwe ndeye aha nakwa PVC nke ọkụ agbaghị.

    "Mwakpo a bịara dịka a ka na-edenye aha iji nweta PVC na-echekasị anyị" ka o kwuru n'ozi ahụ.

  12. Ihe mere na agaghị m ekwe ịbụ osote Peter Obi - Kwankwaso

    Rabiu Kwankwaso nke pati NNPP ekwuola ihe mere na ọ gaghị abụli osote Peter Obi na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjiria n’okpuru Labour Party.

    Kwankwaso bụbu gọvano Kano steeti, kwuru na ọ bụ eziokwu na ndị mmadụ na-akpọ oku ka ya na Obi bụbu gọvanọ Anambra steeti bịakọta ọnụ maka ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjiria n'afọ 2023.

    Kwankwaso na-azọ ọkwa onyeisiala n'okpuru pati New Nigeria People’s Party (NNPP), kwuru na ọ ga-abụli osote onyeisiala mmadụ n'ihi na enweghi ihe ọ na-arụ ugbua, mana ọ gwara ụlọntakụkọ ChannelsTV na ọ gaghị abụli osote onye Ọwụwa Anyanwụ.

    O kwuru na nke a bụ n'ihi na ọ ga-ara onye Ugwu ọbụla ahụ ịtụnyere onye ọbụla si na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ vootu n’ihi ihe na-eme na mpaghara ahụ gbasara nchekwa nakwa ịchọ nnwereonwe. O kwuru sị "ndị Ugwu na-atụ vootu kwenyere na ọ ga-akara ya mma na Naịjiria dị n'otu".

    O kwuru na ọ ga-akara Obi na-efe ọkọlọtọ ndị Labour Party (LP) mma ịbịa bụrụ osote ya, n'ihi na "ndị Ugwu na-atụ vootu ekpebiela onye ha ga-atụnyere - nke bụ NNPP - enweghi onye ga-agbanweli ya."

    Kwankwaso gara n'ihu kwuo na ya na Obi nwere ike ịrụkọ, mana ọ ga-abụ naanị ma Obi kwenye ịbụ osote ya.

  13. Ndị omekome atọrọla ndị Fada abụọ n'Edo steeti

    Ndị uweojii akọwala na atọọrọ Fada abụọ n'Edo steeti n'abalị ụbọchị satọde n'okporpụzọ si Benin gawa Auchi na steeti ahụ.

    Ọnụ na-ekwuru ha bụ Chidi Nwabuzor kpọrọ aha Fada abụọ ahụ dịka Fr. Udo Peter nakwa Philemon Oboh.

    Kọmịshọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Abutu Yaro kwuru na o zipụla ndị ọrụ ya ozi ịchọpụta na ịzọpụta ndị ahụ a tọọrọ.

    Cheta na naanị otu izu gara aga ka atọọrọ ma gbuo Fada ọzọ na steeti ahụ aha ya bụ Christopher Odia mgbe ọ nọ n'ụzọ a ga ịka ụka.

    Ndị omekome gbukwara Fada ọzọ na Kaduna steeti bụ Vitus Borogo mgbe ha wakporo ubi ebe ọ nọ nke mere ka ndị otu ya mee ngagharịiwe n'akwamozu ya n'ụbọchị Tọzde izu ụka gara aga.

  14. Onye ojiegbe agbagbuola mmadụ atọ, merụọ anọ ahụ na Copenhagen

    Otu onye ojiegbe agbagbuola mmadụ atọ ma merụọ anọ ndị ọzọ ahụ, n’ime otu ụlọahịa kachasị ibu n’isiobodo Copenhagen nke mba Denmark.

    A nwụchiela otu nwamadi dị afọ 22 a na-enyo maka ya bụ mwakpo mere na 'Field’s Mall' n’abalị Sọnde, abalị atọ nke ọnwa Julaị 2022.

    Ndị uweojii kwuru na ndị nwụrụ na ya bụ mwakpo bụ ụmụaka mba Denmark abụọ dị afọ 17 na otu onye mba Rọshịa dị afọ 47. Mmadụ anọ ndị ọzọ gụnyere ndị Denmark abụọ na ndị Sweden abụọ na-azọ ndụ ha n'ụlọọgwụ.

    Onyeisi ndị uweojii bụ Soeren Thomassen, kwuru na nwamadị ahụ kpara arụ a nwere ọrịa ụbụrụ isi, na e nweghi ihe gosiri na ọ bu n'obi iyindụegwu.

    Ya bụ nwamadi ga-azara ọnụ ya n'ihu ọkaikpe n'ụbọchị Mọnde.

    Mette Frederiksen bụ Praịm Minista mba ahụ, kwuru na ọ bụ ajọ ọdachi mere mba Denmark, ma kwuo na ọ na-arịọ ndị mba ahụ ka ha kasie onwe ha obi ma kwalite mmụọ onye ọbụla n'ajọ oge a.

    Ya bụ mwakpo mere dịka mba Denmark na-eme emume ihibe otu atọ nke mbụ nke asọmpi ndị ịnyịnya igwe a kpọrọ Tour de France, n'ihe bụ mbụ ha na-ehibe ya na mba ha.

  15. Ị bọọla chi?

    Anyị na-anabata gị n'ọgbakọ anyị n'ụtụtụ a.

    Nọnyere anyị taa maka akụkọ ndị ga-amasị gị.

    Ya gaziere gị.

  16. Asọmpi AFCON agaghị adịzị na 2023 - CAF

    Otu na-ahazi egwuregwu bọọlụ n'Afrịca bụ 'Confederation of African Football' (CAF) ekwuola na asọmpi 'African Cup of Nations' (AFCON) agaghị adịzị n'afọ 2023.

    CAF kwuru na nke a bụ maka iko mba ụwa 'Fifa World Cup' a ga-agba na ngwụcha afọ a na mba Qatar.

    Onyeisi Caf bụ Patrice Motsepe kwuru na onweghị oge ọzọ ga-adaba itinye asọmpi AFCON na 2023.

    "Ọ ga-ara ahụ ịhụ oge a ga-etinye ya. Naanị na Jenụwarị ka o nwere ike ịdaba, mana ndị otu egwuregwu, ọ ga-ebu ha aka," Motsepe kwuru.

    "Asọmpi Afcon ga-adịzi n'afọ 2024."

    Cheta na asọmpi Afcon na-adịbu n'ọnwa Jenụwarị na Febrụwarị, mana Caf kwuru na ha ga-ebupu ya tinye ya ihe dịka ọnwa Julaị oge afọ bọọlụ gwụchara.

    Mana chetakwa na asọmpi iko mba ụwa nke afọ a dabara n'ọnwa Nọvemba ruo Disemba.

    Ihe o ji dị otu a bụ maka na ọnwa Jun/Julaị, bụ oge e jibu enwe asọmpi a na mbụ, bụ oge nnukwu ekpomọkụ na Qatar.

    Afcon bụ asọmpi e ji ama mba bụ ọkaibe n'egwuregwu bọọlụ n'Afrịka.

    Mgbe ikpazụ e nwere asọmpi a bụ malite n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Jenụwarị ruo ụbọchị isii nke Febrụwarị afọ 2022.

    Ọ bụ Senegal buliri ya bụ iko n'afọ a.

  17. 'Foto na-efegharị na soshal midia maka onye na-azọ ọkọlọtọ Naịjirịa ukwu abụghị nwa Peter Obi' Onye enyemaka

    Onye enyemaka Peter Obi na ọrụ mgbasaozi bụ Valentine Obienyem ekwuola na ya bụ fofo na-efegharị na soshal midia, ha sị na ọ bụ nwa Peter Obi bụ onye na-azọtọ ọkọlọtọ Naịjirịa abụghị nwa Peter Obi.

    Obienyem sị na nke a bụ ọrụaka ndị oso chi egbu.

    O zisara ozi a na WhatsApp ụbọchị ụka na-ekwu na "ụbọchị niile ndị mgbagha a na-esiwanye ike n'arụrụala ha.

    Nke pụtara ugbua bụ izisa foto ha sị na ọ bụ nke nwa Peter Obi bụ onye yi uwe Biafra na-azọ ọkọlọtọ Naịjirịa ukwu. Anyị chọrọ iji ohere a kwuo na ya bụ nwatanwoke abụghị nwa Peter Obi bụ onye a zụrụ nke ọma na nkwanye ugwu nakwa irube isi.

    Oseloka Obi dị fiti isii n'ogo, ebe nwaamadị ahụ dị fiti ise.

    Ndị mgbasa ozi Peter Obi na-arịọ ndị niile na-azọ ọkwa nakwa ndị nsonso ha ka ha jiri nwaanyo welata aka ma dowe iwu na-achị ndọrọndọrọ ọchịchị".

  18. Etu ndị mmadụ siri jiri iwe kugbuo mmadụ abụọ a na-enyo n’okwu ohi n’Aba, Aba, Abịa steeti so n'akụkụ Naịjirịa ebe azụmahịa kachasị bụkwa ebe enweghị nchekwa na-enye nsogbu dịka ohi so n'ihe na-echere ndị ahịa aka mgbe.

    Akụkọ si Aba, Abia steeti dapụta na-ekwu na ndị mmadụ ji iwe n’ụbọchị Satọdee kugbuo mmadụ abụọ a na-enyo burukwa ndị a sị nọ n’isi atụmatụ ohi na-arị elu n’akụkọ mpaghara Market Road, nke Aba.

    Ndị bi ebe ahụ gwara BBC Igbo na mmadụ abụọ ndị ọzọ n’ime ndị otu a a na-enyo n’okwu a gbara ọsọ dịka ndị ahịa nọ ebe ahụ jịdere ndị nke ọzọ.

    Otu n’ime ndị nọ ebe ahụ ihe a mee na-achọghị ka akpọọ aha ya kwuru na “Ndị a nwara izuru ekwentị otu nwoke n’akụkụ ụka Christ The King Catholic Church nọ nso okporoụzọ Asa nke okpuruọchịchị Aba South.”

    “Atụmatụ ha kpụrụ afọ n’ala dịka ndị mmadụ tịpụrụ mkpu ma chụwa ha ọsọ”

    Ọtụtụ ndị ọzọ gwakwara BBC Igbo okwu, boro ebubo na ndị a bụ ndị na-akpa nkata ohi dị ịcheịche ezurula n’akụkụ ụzọ Ehi, Cameroon road nakwa okporoụzọ Port Harcourt road na nso nso.

    Onye ntaakụkọ BBC Igbo gara ebe ahụ hụrụ ihe fọrọ n’ozu ndị a nke ndị mmadụ kụkasịrị ma tinyere n’akpa dịka a na-echezị ka ndị ọrụ mkpocha bịa bupụ ozu ha.

    Mbọ niile BBC Igbo gbara ịnụta olu ndị uweojii Naịjirịa na steeti ahụ maka ihe a mere amịtabeghị mkpụrụ.

    Akụkọ ka na-abịa.

  19. Ogbunigwe egbuola ihe ruru mmadụ atọ n’oke ala Russia na Ukraine, Ihe ọdachị a metụtara ọtụ ụlọ ma kụsaa ebe obibi ndị mmadụ ebe ahụ.

    Akụkọ na-ekwu na ọpekatampe, ihe ruru mmadụ atọ anwụọla dịka ogbunigwe gbara n’obodo Belgorod nke mba Russia dị nso oke ala Russia na Ukraine

    Ozi si n’aka gọvanọ Vyacheslav Gladkov gbara ama nke a dịka e kwuru na ihe ọdachị a metụtara na kụsasịa ọtụtụ ụlọ ndị mmadụ bi ebe ahụ.

    O kwuru na ya bụ ihe kụsara ụlọ 11 ebe ọ metụtara ama obibi 29.

    Gladkov kwukwara na ogbunigwe gbara akpalịtela nchekwa nke akụrụngwa elu.

    BBC enwebeghị ike chọpụta ma nyocha kpọm kwem ozi a sị si n’akara Telegram gọvanọ Gladkov.

    A ka na-eche ka Ukraine kwuo okwu maka ihe a asị mere n’obodo Belgorod.

    Cheta na Russia wakporo ma malite ibuso Ukraine agha n’ụbọchị 24 nke ọnwa Febụwarị 2022.

    Nke a bụ dịka Ukraine kwupụtara atụmatụ ha isonye otu jịkọrọ mba ụwa dị ịcheịche a na-akpọ Nato.

    Russia ka na-aga n’ihu na-ekwu na mba agbataobi ha bụ Ukraine isonye otu a ga-emetụta nchekwa nke ha n’ihi ha na mba ndị Nato anaghị adị na mma.

    Ngụkọ na-egosi na ọpekatampe, ihe ruru mmadụ ndụ 12 agbapụla Ukraine maka mwakpo na agha a.

    Iji kwudoro mba Ukraine, ọtụtụ mba ndị nwere agba n’ụwa dịka mba Amerịka, Briten, France na ndị ọzọ ezigarala mba Ukraine ngwa agha iji gosi na ha na-adonyere ha ukwu.

    Mba ndị a enyekwala Russia ọtụtụ mmachị na ntaramahụhụ dịka ha na-ekwu na ha akwadoghị mwakpo Russia na-eme n’Ukraine.

  20. Mba Central African Republic ewepụtala ego teknụzụ 'cryptocurrency' nke ha akpọrọ ‘sango’, CAR esochiela mba El Salvador n'azụ dịka ndị egwu teknụzụ anaghị atụ ma ncha.

    Onyeisiala mba Central African Republic (CAR) bụ Faustin Archange Touadéra ga-ezịpụta ozi taa site n’akara soshal midia dị ịcheịche banyere nke a.

    Cheta na mba a wepụtara iwu ọhụrụ n’ọnwa Eprel nke kwuru na mba ga-amalite jiri ego teknụzụ cryptocurrency ọhụrụ were na-azụzị ahịa.

    Ụjọ ọtụtụ ndị mmadụ mgbe ozi a pụtara bụ etu mba ga-eji mezụọ atụmatụ a dịka ego teknụzụ nke ụwa kacha mara bụ ‘Bitcoin’ kpụrụ afọ n’ala ruo pasentị 20 n’ọnwa gara aga.

    Marakwa na ihe karịrị pasentị mmadụ 90 na mba enweghị ohere iji intanetị mee ihe ọbụla n’ihi ya bụ ihe erụbeghị ha aka.

    Iji nyere aka wetere ndị mba ha intanetị ha ga-eji were na-azụ ahịa teknụzụ, mba CAR na mba agbataobi ha bụ mba Cameroon enwela nkwekọrịta ọhụrụ ịkee akụrụngwa eji ekesa ịntanetị na mpaghara dị ịcheịche akpọrọ ‘fiber optic network’.

    Atụmatụ nkesa a ga-amalite n’afọ 2023.

    CAR ga-abụ mba nke abụọ na-enye ndị mba ha ikike iji ego teknụzụ nke crypocurrency were zụọ ahịa.

    Mba mbụ n’ụwa mere nke a bụ mba El Salvador.