Onyeisiala mba Amerịka
bụ Joe Biden ebinyela aka n’iwu ga-akwalite nchekwa nye atụmatụ ite ime nke ụlọikpe
kachasị mba ha machiri n’izu abụọ gara aga.
Ndị otu ndọrọndọrọ
ọchịchị nke Democrats bụ nke Biden nọ n’ime ya kwenyere ya ọkụ n’ike n’ihi atụmatụ
mmachi ite ime nke ndị ụlọikpe kachasị mba
ha machiri. Ha kwuru na mkpebi okwu esoghị n’ụkpụrụ otu pati ha.
Mkwanye ọkụ a mere
Biden jiri binye iwu ọhụrụ a aka nke mere na nchekwa ga-adịzịrị steeti dị ịcheịche
na mba ahụ chọrọ inye ndị nke ha ohere ite ime.
Iwu a nyere usoro ga-enye
ọha ohere ite ime nke na-adịbughị kemgbe amachiri ite ime na mba ahụ.
Iwu ọhụrụ a nyekwara ụmụwaanyị
nchekwa nakwa ụzọ mgbapụta n’aka ntaramahụhụ ghara eso atụmatụ isi n’otu steeti
gaa steeti ọzọ maka ebumnobi ite ime.
Ihe ndị so iwu a bụkwa
atụmatụ ichekwa ma zookwaa ihe gbasara onye ọbụla nwere atụmatụ ite ime.
Ihe ọzọ bụkwa na
ugbua, iwu emeela ka inweta ọgwụ maọbụ usoro ndị ọzọ mmadụ nwereike iji tee ime
ga-adịkwa mfe etu ọ dị na mbụ.
Biden nyere odeakwụkwọ
nke ihe gbasara ahụike na ọdịmma ndị mmadụ iwu bụ Xavier Becerra ka ọzitere ya akwụkwọ ozi maka mmezu
ihe dị n’akwụkwọ iwu ọhụrụ tupu abalị 30 eruo.
Cheta na Biden ekwuola
ugboro ugboro na ikike ihibe usoro gbochiri maọbụ kwado ite ime dịịrị ndị
omeiwu mba ahụ.
N’okwu ya, “Dịka ọ dịịrị
ndị omeiwu ime iwu ndị a, nke dịịrị m bụ ịhụ na m chekwara ikike ahụike ụmụnwaanyị
nakwa ikike ha ite ime n’ụzọ iwu mba anyị kwadoro na nke na-agaghị egbu ha”
Biden na-ekwu nke ka
izu abụọ gachara mgbe ụlọikpe kachasị mba ha tụharịrị iwu nyebụrụ ndị mba ahụ
ikike ite ime kemgbe afọ 1973 ma mmachịe ya.
Dịka ụlọikpe a mere
mkpebi a, ọpekatampe, steeti itoolu amachịela ihe niile gbasara ite ime na
steeti ha kpam kpam.
Steeti ndị a nyere
ohere iti ime ka ọ bụrụ naanị ma ndụ nne dị ime ọmụmụ anọ n’ọnọdụ ize ndụ.
Biden nyekwara iwu ka ọkaiwu
gọọmentị etiti nakwa ndị otu ikpe nke obi gọọmentị ya nyere ndị na-agba mbọ
inyere ndị mkpebi ụlọikpe kachasị mere aka.