Ndewonu ndị nke anyị
Unu asaala chi? Ya gaziere unu taa.
You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
E gburu ya n’isiobodo Afghanistan bụ Kabul n’ụbọchị ụka dịka otu nchekwa mba Amerịka nke CIA wakporo be ya.
Chukwunaeme Obiejesi
Unu asaala chi? Ya gaziere unu taa.
Ụbọchị nta ka anyị chụọ n'owere nchị.
Ka chi bọọ
Ụlọọrụ Nigerian National Petroleum Corporation (NNPC) nke nọbu n'okpuru gọọmentị Naịjiria abụrụla ụlọọrụ nọrọ onwe ya bido n'ụbọchị 19 nke Julaị afọ 2022.
Onyeisiala Muhammadu Buhari gosiputara njirimara ọhụrụ ha bụ Nigerian National Petroleum Corporation Limited, n'Abuja taa.
Gọọmentị Naịjiria na-enwe olileanya na mgbanwe a ga-eme ka ndị mba ofesi bịa tinyekwuo ego ha n'ahịa mmanụ agbịdị.
Onyeisiala Buhari kwuru na ya bụ NNPCL ga-abawanye n'uru nye ihe karịri ihe mmadụ nde narị abụọ bụ ndị Naịjiria.
N'afọ gara aga, e debanyere iwu ọhụrụ mere ka ụlọọrụ ahụ nọrọ onwe ya, ka ihe karịrị afọ 20 a malitere ịnwa ya gafechara.
Naịjiria bụ otu n'ime mba ndị kacha emepụta mmanụ agbịdị, mana ndị mba a na-ekwu na ha eritebeghi ezigbo uru n'akụnaụba o butere.
Ndị ntọ mmadụ agbagbuola otu n'ime ụkọchukwu abụọ ha tọrọla na Kaduna steeti, ka ha narachara ego mgbapụta ya.
N'ozi ụlọụka Katọlik ziputara, ha kwuru na a chọtara ozu Rev. Fr. John Mark Cheitnum n'ụbọchị Tuzde, 19 nke ọnwa Julaị afọ 2022.
Onyeisi otu jikọtara ndị ụka Kraịst bụ Christian Association of Nigeria (CAN) nke Kaduna steeti, gwara BBC na ndị ntọ ahụ narala ego mgbapụta, ma tụọrọ ndị wetere ego ahụ aka ebe ha ga-ahụ ozu ya.
Ndị ntọ ahụ tọhapụrụ Rev. Fr. Donatus Cleopas, bụ ụkọchukwu nke abụọ ha tọrọla n'obodo Yadin Garu n'ụbọchị Fraịde, 15 nke ọnwa Julaị 2022.
O dobeghi anya ihe mere ndị ntọ ahụ ji gbuo ụkọchukwu Cheitnum.
Kemgbe ọnwa Mee afọ 2022, a tọrọla ọtụtụ ndị ụkọchukwu - ọtụtụ n'ime ha bụ ndị ụka Katọlik - na mpaghara Naịjiria dị iche iche, ma gbuo ihe ruru atọ n'ime.
Otu jikọtara ndị nwere nkwarụ n'Abịa steeti emeela ngagharịiwe n'isiobodo Umuahia dịka ha tụrụ ute nọrọ n'ọnụụzọ ụlọomeiwu steeti ahụ ihe ruru awa abụọ na-eche ka a bịa zaa ha oku.
Ha kwuru na e kwesịla ibufe akwụkwọ ọdịmma ndị nkwarụ (Disability Bill) nke a tụlitere n'ụlọomeiwu ahụ kemgbe ihe ruru afọ atọ.
Ha sị na mbufe ya bụ akwụkwọ ka ọ bụrụ iwu ga-enye ha ụdịrị ikike niile rukwara ndị ọzọ na steeti ahụ.
Oriakụ Christiana Onyemauwa bụ otu nwaanyị gwara onye ntaakụkọ BBC okwu n'ebe ahụ ha gbakọrọ, kwuru na ha enwetabeghi oke ruru ha kemgbe afọ ole na ole, kama na ọ bụ nkwa e kwere ekwe a na-emezughi emezu ka ha na-enweta.
Iheanyichukwu Israel bụ onye na-ahụ maka ọdịmma otu ahụ, gwara onye ntaakụkọ BBC na mbufe iwu a ga-agbanwe ndụ ha n'ebe o metụtara ime ha ka e mere ibe ha na steeti ahụ.
Ichie Ezeji, gwara onye ntaakụkọ BBC na ha agaghị agbasa maọbụghị ma e tinyere ọnụ n'okwu kpọtara ha ebe ahụ, o kwukwara na ha bu ngwongwo (nke onye ntaakụkọ BBC hụrụ) ha ga-ejinwu nọruo ụbọchị ole na ole ma ọ bụrụ na ndị omeiwu jụ ịtụpụrụ ha ọnụ.
Princess Ngozi Nwaguru bụ onyeisi ụmụnwaanyị n'otu ahụ, kwuru na ndị otu ha enweghi ọrụ na ihe ndị ọzọ e ji elekọta ndụ, ma kwuo na ọ dị ezigbo mkpa na e bufere akwụkwọ ahụ n'ụlọomeiwu.
Wisdom Kalu Okechukwu, bụ onyeisi ọtu ndị nwere nkwarụ na steeti ahụ kwuru na ya bụ iwu ataala nchara n'ụlọomeiwu ahụ kemgbe a tụlitere ya.
Enyinnaya Madumere, onye nwere nkwarụ ma bụrụkwa onye ndụmọdụ pụrụ iche nye onyeisi ụlọomeiwu steeti ahụ, kwuru na ọ gbaala mbọ ịhụ na e bufere iwu a mana o nwebeghi isi, ma kwuo na ha agaghị enye nsogbu.
Onye ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla gbatara akwụkwọ mmasị abụọ maka ịzọ ọkwa ọchịchị, na-ada iwu nke e nwere ike iji tụọ ya mkpọrọ afọ abụọ.
Mike Iginni, onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka Resident Electoral Commissioner (REC) n'Akwa Ibom steeti nakwa otu ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (Inec) kwuru nke a dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ Channels TV okwu n’ụbọchị Tuzde.
O kwuru na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ịgbata akwụkwọ mmasị n'ụzọ abụọ bụ ịda iwu dị n'okpuru iwu Electoral Act nke afọ 2022.
Ya bụ iwu dị n'okpuru mpaghara 115 (D) nke Iwu ntuliaka ahụ kwuru sị, "onye ọbụla binyere aka n'akwụkwọ mmasị maọbụ akwụkwọ mpụtara dịka onye na-azọ ọkwa n'ihe karịrị otu mpaghara nnọchiteanya ọchịchị, n'otu ntuliaka, dara iwu ma nwee ike ịga nga afọ abụọ.
Vladimir Putin bụ onyeisiala mba Russia agaala mba Iran, n’ihe bụ njem ofesi nke abụọ ọ na-eme kemgbe o du mba ya wakpoo Ukraine n'ọnwa Febrụwarị.
Putin zutere Ebrahim Raisi bụ onyeisiala mba Iran n’isiobodo Tehran, dịka ọ ka ga-ezute Recep Tayyip Erdogan bụ onyeisiala mba Turkey.
Ihe ha ga-akpa gụnyere mkpụrụnri, Syria nakwa esemokwu ha na Ukraine.
Ya bụ njem nleta bụ ohere ịgbawanye mgbọrọgwụ n'ime enyi dị n'etiti ha na Iran - bụ otu n'ime naanị ndị enyi mba ofesi ka kwụdoro Russia.
Unu asaalachi? Ka ụbọchị unu gara unu nke ọma.
Gọomentị Naịjiria ekwuola na ha edebanyela aha ihe ruru nde mmadụ 85 maka inweta akara njirimara a kpọrọ National Identification Number (NIN).
Dịka Onyeisiala Muhammadu Buhari si kwuo "Anyị edebanyela aha ihe karịrị nde mmadụ 85 n'ọba aha NIN ugbua.
"Ya bụ ọrụ ga-aga n'ihu, maka ịgba ezigbo mgbọrọgwụ n'ihe gbasara njirimara ndị mmadụ n'ịntanetị, maka nchekwa na mmụbawanye akụnaụba nke Naịjiria."
Ministrị ahụike steeti Borno ekwuola na ọrịa Monkey pox eselitela isi na steeti ahụ.
Dkt Lawi Mshelia bụ onyeisi ngalaba ahụike ọha na steeti ahụ, kwuru na enwere mmadụ anọ a na-enyo bu ha bụ, mana ụlọọrụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) ekwuola na mmadụ atọ n’ime ha bu ya bụ ọrịa n’ezie.
Gọọmentị Kano steeti ekwuola na ha amachiela keke a ma dịka 'Adaidata Sahu' ịgba na steeti ahụ ma ọ kụọ elekere 10 nke abalị.
N'ozi Muhammad Garba bụ kọmishọna mgbasaozi na steeti ahụ ziputara, o kwuru sị na ha mere mkpebi a ka ha mechara nzukọ gbasara nchekwa n'ụbọchị Mọnde.
O kwukwara na ọ bụ n'ihi ikwalite nchekwa na steeti ahụ mere ha ji tinye iwu a.
Ya bụ mmachi ga-emetụta ọtụtụ ndị mmadụ dịka ọ bụ otu ụzọ ndị mmadụ kacha eji agagharị na steeti ahụ.
Onyeisi ndị uweojii Naịjiria bụ Usman Alkali Baba, enyela iwu ka e nyochaa otiegwu Habeeb Okikiola a ma dịka Portable, n'ihi ebubo na ọ bụ ya hibere otu nzuzo a na-akpọ 'one million boys' na 'Ajah Boys' bụ otu nyụrụ ụfọdụ akụkọ Legọs anya n'afọ ole na ole gara aga.
Usman gwara kọmishọna uweojii nke Legọs steeti ka o nyochaa ya bụ okwu bụ nke Portable kwuru n'ihe onyonyo o tinyere na soshal midia ya ma mechaa hichapụ.
Gọọmentị Zamfara steeti achụola otu Emir n'ọrụ nwa mgbenta maka ịchi otu nwoke echere bụ onye ntọ echichi na steeti ahụ.
O chiri nwoke ahụ aha ya bụ Adamu Aliero onyeisi ndi Fulani bi ebe ahụ bụ 'Sarkin Fulani' n'asụsụ ha.
Akụkọ kwuru na nke a bụ iji hazie okwu udo a na-ekpe n'etiti ndị omekome na ndị bi ebe ahụ mana ndị mmadụ na-ekwu na okwu udo ndị ekpeburu enweghi isi.
Anya hụrụ ebe ihe mere gwara BBC na ụfọdụ ndị omekome nakwa ndị ọrụ gọọmentị gara ya bụ emume na mgbede ụbọchị Satọde.
Mana gọọmentị steeti ahụ gbarụrụ ihu maka ihe a mere, ha wepụtara ozi kwuru na ha amalitela nnyocha banyere ihe mere.
Mba Zambia akpọlaala nwoke mba Chaina ji ụmụaka akpa oke agbụrụ n'onyonyo o mechaara ree mba Malawi ka ekpee ya ikpe.
A nwuchiri Lu Ke mgbe ndị mba Zambia chọpụtara na ọ banyere obodo ha n'ụzọ ezighi ezi n'ọnwa Juun.
Ọkaiwu na-anọchi anya ya bụ Thabo Chakaka Nyirenda gwara BBC na ọ bụ eziokwu na akpọlaala nwoke ahụ mba Malawi ma kwuo na ọ ga-aga ụlọikpe n'ụbọchị Monde iji zaara ọnụ ya.
Lu Ke na-agọ ebubo niile eboro ya na-ekwu na ihe onyonyo ya ndị ụmụaka seere bụ iji wulite omenala mba Chaịna n'Afrịka.
Mba Chaịna n'onwe ha ekwela nkwa ịmachi mkpaso ndị Afrịka oke agbụrụ kpam kpam n'Intaneti ha dịka akụkọ a pụtachara.
Mba Ghana ezigala mmadụ iri itolu na asatọ ka nọpụrụ onwe ha iche dịka enyochapụtara nje ọrịa Marburg n’ahụ mmadụ abụọ na mba ahụ.
E kwuru na mmadụ abụọ anwụọla n’ebe mpaghara Ashanti dịka ọrịa ọhụrụ a malitere mfesawa n’akụkụ ụwa dị ịcheịche na nso nso a.
Nke a bụ ugboro abụọ ọrịa a na-efesa na mpaghara ọdịdaanyanwụ Afrịka dịka o fere na mba Gini n'afọ 2021.
Daalụ maka isonye anyị na peeji anyị taa.
Ka izuụka a maara gị mma.
Ka ọ dị echi, ka chi foo
Ụgbọleu bụ ngwa agha aga mba Bangladesh adaala ma kpọkasịa na mba Greece.
O gburu mmadụ asatọ niile nọ n'ime ya.
Ya bụ ụgbọelu si Serbia aga Jordan dara n'ụbọchị satọde na mpaghara dị nso Kavala.
Dịka o siri dị ndị ọkaibe ogbunigwe na nke ogbunigwe atọm anaghị abịa ebe ụgboelu a dara nso tupu nyocha egosi na ihe niile adịla mma.
Gọọmentị mba Greece agwala ndị bi na mpaghara ahụ ka ha nọrọ n'ime ụlọ ha.
Onyeisiala Muhammadu Buhari ebunyela Ademola Adeleke bú onye ritera mmeri na ntuilaka Gọvanọ ndị Osun steeti ụkpa ekele maka mmeri ya.
Buhari bụ onye dere nke a n'akara Twitter ya ụbọchị ụka sị na ndị Osun ewerela vootu kwuo ụche ya.
Onyeisioche otu Christian Association of Nigeria nke Kaduna Steeti bụ John Joseph Hayap ekwuola na ndị ntọ tọọrọ ndị ụkochukwu abụọ na Kaduna steeti ekwuola ego ole ha chọrọ tupu ha atọhapụ ha.
Cheat na-atọọrọ ụkọchukwu John Mark Cheitnum na Donatus Cleopas n'obodo Yadin Garu dịka ha si emume ụka alọta.
Kọmịshọna ndị uweojii steeti ahụ bụ Ayoku Yekini kwuru na ndị uweojii na-achụsị ndị ahụ ọsọ ike iji jide ha.
Hayap kwuru na ndị ntọ a sị ka-enye ha nde Naịra iri ise (50,000,000) ma mchaa wetuo ya nde naira iri anọ (40,000,000).
Kamgbe ọnwa Mei ihe ruru mmadụ iri na abụọ bụ ndị ụkọchukwu ọkachasị nke Katolịk bụ ndị atọọrọla.
Egbuola mmadụ abụọ n'ime ha ebe ndị ọzọ bụ ndị a na-atọhapụ ma akwụọ ụgwọ n'isi ha.