You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Amerịka egbuola Ayman al-Zawahiri bụ onyeisi otu al-Qaeda

E gburu ya n’isiobodo Afghanistan bụ Kabul n’ụbọchị ụka dịka otu nchekwa mba Amerịka nke CIA wakporo be ya.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chukwunaeme Obiejesi

  1. Etu nkịta American Bully XL siri tagbuo otu nwaanyị na Briten

    Otu nwaanyị dị afọ 43 alaala mụọ n'ụbọchị Frịde dịka nkịta a na-akpọ American Bully XL tagburu ya n'ụbọchị Frịde.

    Mbọ nille ndị ọrụ gbata gbata iji zọọ ndụ nwaanyị ahụ lara n'efu.

    E nwekwara nwoke ọzọ nkịta ndị a dị abụọ wakporo ma merụọ ya ahụ n'aka, afọ ma n'ihu ya.

    Ndị uweojii South Yorkshire ebe ya bụ ihe mere kwuru na ha egbubeghị ya bụ nkịta.

    E nwere ụfọdụ nkịta amachiri mmadụ ịnwe na mba Briten ma American Bully XL esoghị na ndị amachiri.

    E nwere agbụrụ nkịta anọ amachiri namba Briten nke gụnyere Pitbull Terrier, Japanese Tosa, Dogo Argentina na Fila Brasileiro.

    Ya bụ nkịta American Bully XL gburu otu nwa ọhụrụ dị ọnwa iri na asaa n'ọnwa maachị 2022 ma gbuo kwa otu nwatakịrị nwoke dị afọ iri n'ọnwa Disemba afọ 2021.

  2. BBC Africa Eye expose: Akpụgala nwoke Chaịna ji oke agbụrụ akpa ego mba Malawi

    Mba Zambia akpọgala nwoke Chaịna mba Malawi ka ọ zara ọnụ ya maka ebubo ịkpa oke agbụrụ na iji ụmụaka kpaa ego n'ụzọ ezịghị ezi.

    Lu ke bi na mba Malawi mgbe nyocha BBC Africa Eye kwuru na ọ na-eji ụmụaka ime obodo mba ahụ eme ihe onyonyo nke ụfọdụ n'ime ha na-egosi ịkpa oke agbụrụ.

    A na-ere ihe onyonyo a ihe dịka $70 na sọshal Midịa ndị Chaịna na ebe ọzọ n'ịntanetị.

    Kama Lu ke na-ekwu na enweghị ihe onyonyo na-emetọ n'ụzọ ọbụla ọ mere.

    O kwuru na ọ mere ihe onyonyo ndị a iji gụziere ndị ime obodo Malawi maka omenala ndị Chaịna.

    A nwuchiri Lu ke na mba Zambia ma rịe ya ngha maka ịbata mba ahụ n'ụzọ ezighị ezi.

  3. Kachifoonụ

  4. Osote onyeisiala, Yemi Osinbajo gara ụlọọgwụ maka ịgwọ ọrịa n'ukwụ ya

    Osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo ekwuola na ya gara ụlọọgwụ maka ịgwọ ihe mere ya n'ụkwụ mgbe ọ na apịa Squash, Onye enyemaka ya bụ Laolu Akande kwuru.

    Akande kwuru nke a ụbọchị Satọde ebe o kwuru na onyeisi ya bụ Yemi Osinbajo ga-aga ụlọọgwụ ịwa ọkpa ya maka ahụ o meruru n'egwuregwu Squash.

    Ọ sị na Dọkịnta ya ga-akọwara ndị mmadụ ka ihe siri kwụrụ ma ọ mechaa.

    Ọ sị na, "osote onyeisiala bụ Osinbajo nọ n'ụlọọgwụ taa maka ịwa ahụ maka oke ahụ mgbu na-enye ya nsogbu maka ahụ o meruru n'egwurugwu squash".

    Osinbajọ mechakwara tinye ya na Twitter ya.

  5. Catholic priests kidnapped: Ndị ntọ atọrọla ndị ụkọchukwu Katọlik abụọ ọzọ

    Ndị ntọ atọrọla Fr. John Mark Cheitnum na Fr. Donatus Cleopas, bụ ụkọchukwu ndị ụka Katọlik, na Kaduna steeti.

    Dịka Rev. Fr. Emmanuel Uchechukwu Okolo si ziputa n'ozi, a tọrọla ụkọchukwu abụọ a mgbe o ji ebe nkeji 45 gafee elekere ise nke mgbede n'ụbọchị 15 nke Julaị 2022, na-eteghi aka ha rutere n'ụka Christ the King Katọlik dị na Yadin Garu dị n'Okpuruọchịchị Lere nke Kaduna steeti.

    O kwuru na ha nọ na-aga emume n'ụlọụka dị na Gure, tupu a tọrọ ha.

    Ndị Dayọsis nke Kafanchan gara n'ihu rịọ ka ndị mmadụ ghara iji aka ha mee ihe iwu akwadoghi dịka a na-agba mbọ ịzọpụta ha na-enweghi nsogbu ọbụla.

  6. PDP agwala ụlọikpe kagbuo ndọrọndọrọ Bola Ahmed Tinubu na Peter Obi ma ọ bụrụ na...

    Pati People's Democratic Party (PDP) agbaala All Progressives Congress (APC) na Labour Party akwụkwọ n’ụlọikpe ukwu dị n’Abuja, na-arịọ ụlọikpe ka ha mee ka ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (Inec) gbochie Bola Ahmed Tinubu na Peter Obi iji Kashim Shettima na Datti Baba-Ahmed itichi ndị ha họpụtaburu dịka osote ha.

    PDP gwakwuru ụlọikpe ka ha kagbuo ndọrọndọrọ Tinubu na Obi ma ọ bụrụ na ha jụ iji Kabiru Masari na Doyin Okupe - bụ ndị ha họpụtaburu - mere osote ha.

    Ha rịọrọ ụlọikpe ka ha machie Inec itichi ndị Tinubu na Obi ji mere osote.

    PDP kwuru na ihe ha ji eme mkpesa a bụ na enweghi ihe dị ka onye 'biko jidere m ọkwa a' (placeholder) n'iwu Naịjiria.

  7. Unu abọọla chi?

    Daalụ maka ibịakwute anyị n'ụtụtụ a.

    Nọnyere anyị dịka anyị na-ewetara gị akụkọ ndị ga-amasị gị ịkọ taa.

    Ya gaziere gị.

  8. Ka chi foo

    Daalụ díka i sonyere anyị taa...rahụ nụ duu!

  9. Mwakpo oke agbụrụ na-arí elu na mba Saụt Afrịka ọzọ - UN

    Ndị nyocha UN adọọla aka na ntị na mwakpo ndị mbịarambia na mba Saụt Afrịka arịwala elu ma sị ka etibere ya anya.

    Ha kwuru na ngagharịiwe a na-akpọ 'Operation Dudula' na-ekpuchi mmekpaahụ a na-eme ndị mbịarambia na mba ahụ.

    E ji ya bụ Operation Dudula gbaa ụlọ ndị mbịarambia nwere na ọdọ ahịa ha ọkụ, ebe egburu ụfọdụ n'ime ha.

  10. A ga-akwụsị ịdebanye aha maka ntuliaka 31 Julaị, 2022 - INEC

    Ngalaba ntuliaka bụ INEC n’ịchafụ ekwuola na ha adọtịala ụbọchị a ga-akwụsị ndebanye aha ndị ntuliaka eruo ụbọchịọ iri atọ na otu nke ọnwa Julaị 2022.

    Ọ bụ onye na-ahụ maka mgbasaozi INEC bụ Festus Okoye kwuru nke a ma sị na ha ga-eme ya site elekere ụtụtụ itolu nke ụtụtụ ruo elekere ise nke mgbede site ụbọchị mọnde ruo Sụnde.

  11. Ndị agha mba Togo arịọla mgbaghara maka etu ha siri gbuo ndị ntorobịa asaa na-amaghị ama, Ndị agha mba Togo kere nkwụcha n’ọrụ nchekwa ha kemgbe ọnwa Mee, 2022 mgbe ndị ndị agha nnupụisi wakporo ha.

    Ndị agha mba Togo ezipụtala ozi arịrịọ na-ekwu na ha amaghị ama gbuo mmadụ asaa a sị bụ ndị ntorobịa n’abali Satọdee.

    Ozi ha kọwara na ha chere na ndị a bụ ndị agha nnupụisi nke otu alakụba na-akpa ike ebe ahụ.

    N’akwụkwọ ozi a nke ọchịagha mba a bụ Dadja Maganawe binyere aka, ha kwuru na ọ bụ ụgbọ elu agha nke nọ n’ọrụ nchekwa ebe ahụ n’.

    Abalị ahụ bụ ihe gburu ndị a. Ka e si kwuo, ndị a e gburu dị ebe afọ 14 ruo afọ 18.

    Ụlọọrụ ntaakụkọ ndị nọ n’ebe mpaghara Savanes kọwara na ndị ntorobịa ahụ si emume ndị ụka Alakụba nke Eid al-Adha.

    Ndị agha mba Togo kere nkwụcha n’ọrụ nchekwa ha kemgbe ọnwa Mee, 2022 mgbe ndị ndị agha nnupụisi wakporo ndị agha mba ha ma gbuo mmadụ asatọ n’ime ha n’akụkọ oke ala ha na mba Burkina Faso.

  12. Ka chi foo

    Daalụ dịka ị sonyere anyị taa...rahụ nụ duu

  13. Nwunye mbụ Donald Trump bụ Ivana Trump anwụola n'afọ 73, Ivana Trump, nwunye mbụ Donald Trump na nne nke ụmụ ya atọ, anwụọla afọ 73.

    Nwunye mbụ Donald Trump bụ Ivana Trump anwụola n'afọ iri asaa na atọ dịka dị ya depụtara n'akara Soshal Midia ya bụ Truth Media.

    A mụrụ Ivana Trump na Czech Republik.

    Ọ lụrụ Donald Trump n'afọ 1977.

    Ha gbara alụkwaghịm n'afọ 1992.

    Ha mụrụ ụmụ atọ bụ Donald Jr, Ivanka na Eric Trump

    Di ya Donald Trump bụ aka chịbụrụ mba Amerịka dere na soshal midia maka ya sị “Ọ bụ nwaanyị mara ezigbo mma, bụrụ ezigbo mmadụ biri ndụ ọtụtụ na-eṅomị”

    Akụkụ na-ekwu na ahụrụ ozu nwunye Trump ka ọ tọgbọọ n'akụkụ steepụ n'ụlọ ya New York.

    Amabeghị ihe gburu ya mana a na-eche na ọ nwereike ịbụ na ọ dara ada.

    Donald na Ivana Trump bụ ndị ama ama mpaghara New York nke Amerịka n’ebe oge1980s na 1990s. Mgbasa ha dịka di na nwunye kpalitere ọtụtụ okwu n’etiti ndị mmadu.

    Ka alụmdinanwuye ha kwasachara, nwaada Trump gara n'ihu hibe ụlọọrụ ebe a na-ere ma na-emepụta ngwaahịa ntacha, akwa na ihe ịchọ mma ndị ọzọ.

    N'akwụkwọ ọ dere n'afọ 2017 bụ "Raising Trump", o kwuputara na ọ bụ ya bụ onye zụrụ ụmụ ha kpọ kwem. Ọ kọwara etu o siri mee mkpebi maka agụmakwụkwụ ha, egwuregwu ha, njem ha mere na ndụ ha nakwa ihe ndị ọzọ.

    Ụmụ ya zịpụtara ọtụtụ ozi na soshal midia na-etu ya maka ndụ o biri.

  14. Nkwado ntụliaka ọkwa gọvanọ Osun steeti ebirila ọkụ

    Ọtụtụ ihe na-eme n'ụlọọrụ Independent National Electoral commission dị n'Osun steeti dịka steeti ahụ na-kwado ime ntụliaka ọkwa gọvanọ na Julai 16, 2022 (Satọde a na-abịanụ).

    A malitere kewe ngwa ọrụ ndị a ga-eji mee ya bụ ntụliaka na-abịanụ n'okpuruọchịchị ruru iri atọ n'elekere abụọ na ụma nke ehihie a.

    Ọkammụta Ganiyu Raji gwara BBC Igbo na mkparịtaụka ha mere n'Osogbo na ụlọọrụ ha adịla njikere ime ntụliaka ziri ezi.

    Raji kwuru na mmadụ ruru pasenti iri asa na isii bụ iohe debara aha n'akwụkwọ ma nweta PVC nke bụ pasenti kacha na ntụlaiaka emerela na Naịjirịa.

    O kwuru na Inec emeela ihe niile o nwerike iji hụ na enweghị nsogbu emecha-emecha dapụtara na ntụliaka ọkwa gọvanọ na-abịa na Osun steeti ụbọchị Satọde.

  15. Ihe ndị uweojii kwuru maka mkpamkpa kpara n'Ụmụahịa, Abia Steeti taa.

    Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Abia Steeti bụ Geoffery Ogbonna gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo na ha nụtara ozi na enwere onye gara n'ụlọakụ were ego ndị omekome na-achụ ọsọ n'ụbọchị Tọzd.

    Kama O kwuru na ndị uweojii gbochiori ha imezu uche obi ha.

    O kwuru sị,"Kamgbe ya bụ ihe mechara, anyị na-achụ ndị omekome a ọsọ. Anyị natara ozi na ha batara obodo, ya mere anyị jiri gbochie ha ime uche obi ha".

    O kwuru na ha napụtara ha otu egbe AK47 na ụgbọala Toyota Corrola na-achọa uhie uhie.

    Akụkọ na-ekwu na ndị ojiegbe ezu wakporo otu onye sịọ ụlọakụ apụta 'Aba Road' nke dị nso Obi Gọvanọ Abia Steeti n'ụbọchị Tọzde.

    Otu onye akaebe na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na ndị uweojii na-achụ ndị omekome a ọsọ site Aba Road ruo FMC junction.

    O kwuru na ndị omekome a tinyere isi Factory Road ebe ụgbọala ha ji agba ọsọ na ụgbọala ọzọ takọrọ isi.

    O kwuru sị, " otu onye n'ime ndị ahụ mapụtara were gbawa egbe iji chụsaa ndị mmadụ".

    Dịka o siri dị, mgbọ egbe ndị a tụrụ otu nwaanyị na-ere ọpụpa na nwata akwụkwọ Nọzụ.

    Ha abụọ nọ n'ụloọgwụ anata ọgwụgwọ ugbua, kama a ga-awa onye nke na-ere ọpụpa ahụ dịka mgbọ tụrụ ya n'afọ.

    Ugbua ndị uweojii na ụgbọala anọrọla ebe dị iche iche iji hụ na ha jidere ndị a.

  16. Olarenwaju Omiyinka (Baba Ijesha) ga-anọ na nga afọ ise - Ụlọikpe

    Ụlọikpe maka ịda iwu nke Legọs steeti atụọla Olarenwaju Omiyinka eji Baba Ijesha mara nga afọ iri na isii.

    Kama ọ ga-anọkọ ha niile ọnụ nke mere na ọ bụ afọ ise ka ọ ga-anọ na nga.

    Ikpe gosiri na ọ dara ebubo anọ n'ime ndị ebubo eboro ya.

    Ebe atụhapụru ebubo abụọ n'ihi na ọkaikpe kwuru na ndị na-ebo ya ebubo egosighị ihe ịgbaama siri ike maka ya bụ ebubo.

  17. Rishi Sunak emeriela agba nke mbụ na ntuliaka ịhọpụta Praịm Mịnịsta UK ọhụrụ

    Ntuliaka imeụlọ iji họpụta onye ga-abụ onyeisi ndị otu 'Conservatives' n'ụlọ omeiwu mba United Kingdom amalitela.

    Cheta na ọ bụ onye meriri ntuliaka a ga-eweghara ọchịchị n'aka Boris Johnson dịka Praịm mịnịsta ọhụrụ nke UK.

    N'agba nke mbụ nke ntuliaka ahụ e mere n'ụbọchị Wenezde, Rishi Sunak, onye rụburu ọrụ dịka Chancellor mba ahụ, meriri.

    Sunak nwetara vootu 88 iji turu ugo, mana ọ pụtaghị na ọ bụ ya ga-abụ Praịm Mịnịsta ọhụrụ.

    Ndị omeiwu asatọ bụ ndị kwupụtara mmasị ha iso zọọ ọkwa onyeisi ndị otu 'Conservatives'.

    Dịka e mechara agba nke mbụ nke ntuliaka, mmadụ abụọ vootu ha kacha nta ga-apụ na ya bụ ndọrọndọrọ.

    Otu a ka ha ga-esi na-apụ ruo mgbe ha fọdụrụ naanị mmadụ abụọ.

    A ga-emezi ntuliaka zuzugbe ebe ndị pati 'Conservatives' niile ga-esi n'ime mmadụ abụọ a họpụta otu onye ga-abụ onyeisi ha nakwa Praịm Mịnịsta ọhụrụ.

    N'agba nke mbụ ntuliaka nke e mere na Wenezde, Nadhim Zahawi na Jeremy Hunt ka vootu ha kacha nta, nke pụtara na ha apụọla na ya bụ ndọrọndọrọ.

    Kemi Badenoch, nwa afọ Naịjirịa nọ n'ụlọ omeiwu UK, nwetara vootu iri anọ.

    Agba nke abụọ ga-adị taa bụ Tọzde.

    A ga-akpọpụta aha onye ga-anọchi Boris Johnson n'abalị ise nke ọnwa Sepụtemba afọ a.

  18. Ị saala chi

    Igbo mụrụ nze mụọ ọzọ, ụnụ asaala chi.

    Taa bụ ahịa afọ, dịka ndị Igbo si agụkọ ụbọchị.

    Ka ụbọchị taa wetara gị chi ọma.

    Ngwa ka anyị gbapụ ya ọsọ na mgbasa ozi nke taa.

  19. Oke mmiri zoro na Legọs ataala isi mmadụ asaa nke gụnyere ụmụaka atọ

    Ngalaba gbata gbata bụ NEMA n'aha ịchafụ ekwuola na mmiri zoro n'ụbọchị Frịde (Julai 8) na Satọde (Julaị 9)butere ide mmiri nke tara isi mmadụ asaa.

    Ha kwukwara na ha zopụtara mmadụ asatọ.

    Ụmụaka atọ a nwụrụ bụ otu Nne na nna ji ha atọ.

    Akụkọ na-ekwu na ọ bụ mgbe ụmụnne abụọ n'ime ha chọrọ ịzopụta nwanne ha nke obere dịka ọ danyere n'ide mmiri ka mmiri ahụ buru ha atọ.

    Ha kwuru na ya bụ ihe mere n'obodo Oke Isagun, Agbado Oke, n'okpuru ọchịchị Oko, Legọs steeti.

    Ndị obodo ya bụ ihe mere gwara NEMA mgbe ha mere ngaghrị nleta na e nwere ụmụaka anọ mmiri ahụ chọrọ ịburu mana ndị obodo zopụtara ha.

  20. E zurula mgbanukwu ntụrụugo e nyere Nelson Mandela

    Ndị uweojii mba Saụt Afrịka ebidola ịchọ ndị a na-enyo enyo na ha zuru mgbanukwu ntụrụugo Sugar Ray Leonard nyere Nelson Mandela.

    Ya bụ mgbanukwu nọ n'ọnụ $3,000 bụ n'ụlọ ndede ihe ochie maka Nelson Mandela ka ndị omekome si zuru ya.

    Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii bụ Dimakasto Sello ekwuola na ha ebidola nyocha ha.

    Ndị na-elekọta ya bụ ụlọ kwuru na ọ bụ dịka Mandela pụtachara na nga ka n'afọ 1990.

    Ọ bụ mgbe Mandela gara ị hụ ndị nyere ha aka oge ha na-alụ ọgụ nwereonwe n'aka ndị ọcha ka Sugar Ray Leonard nyere ya mgbanukwu ahụ.