You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Amerịka egbuola Ayman al-Zawahiri bụ onyeisi otu al-Qaeda

E gburu ya n’isiobodo Afghanistan bụ Kabul n’ụbọchị ụka dịka otu nchekwa mba Amerịka nke CIA wakporo be ya.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chukwunaeme Obiejesi

  1. Ihe karịrị mmadụ nde 10 ọhụrụ agbatala PVC ha na Naịjirịa

    Ihe karịrị mmadụ nde iri na ụma narị anọ ọhụrụ agbatala PVC ha na Naịjirịa dịka ndị ọrụ Inec kwuru ụnyaahụ bụ Mọnde.

    Otu a ka o siri gbata kwuru ụnyaahụ bụ izu iri na otu nkemgbe a malitere ya bụ ịgbata kadị.

    Ngụkọ ya gosiri na mmadụ nde iri, narị anọ na isi asatọ na asaa, narị itoolu na iri asaa na abụọ (10,487,972) bụ ndị ọhụrụ nke mmadụ nd nde asatọ, narị isii, iri atọ na otu, na narị isii, isi itoolu na isii (8,631,696) bụ ndị gbatazugoro nke ha.

    Ọnụọgụ ndị gbatara nke ha na intanetị bụ 3,250,449 ebe ndị ji okpa ha gaa gbata bụ 5,381,247.

    Ya bụ ọnụọgụ e nweputere na-egosi na ụmụnwaanyị gbatara akwụkwọ a ji ihe karịrị otu narị karịa umunwoke.

    Ụmụnwaanyị bụ 4,339,006; ụmụnwoke bụ 4,292,690; ndị nkwarụ bụ 67,171 ebe ndị ntorobịa di 6,081,456.

  2. A hụrụ ozu mmadụ 46 n'okeaka Amerịka na Mexiko

    A hụrụ ozu ihe dịka mmadụ iri anọ na isii (46) n'ụgbọala Trọkụ na San Antonio,Texas dị n'Amerịka bụ nke onye nwe ya hapụrụ rie mbọmbọ ọsọ.

    Onyeisi ọrụ mmenyụọkụ n'ebe ahụ sị na e bugara mmadụ iri na isii (16) nke gụnyere ụmụaka anọ ụlọọgwụ.

    A na-eche na ọ bụ okpomọkụ gburu ndị ahụ maka na ikuku abataghị n'ime ya bụ ụgbụọala.

    Ya bụ ụzọ San Antonio dị Kilometa narị abụọ na iri ise (250km) sitere Amerịka gawa Mexiko bụ ụzọ ama ama maka ahịa iwu a na-ebu ebe ahụ.

    Ndị mgbere mmadụ na-etinyekarị ndị ha bu n'ụgbọala Trọkụ bụ ndị ha butere n'ụzọ ime obodo bụ ndị enweghị akwụkwọ ikike e ji abata Amerịka.

    Onyeisi ndị ọrụ mmenyụọkụ ebe ahụ bụ Mayor Ron Nirenberg sị na "ebunobi ha bụ na ha ga-achọta ezigbo ndụ maka na ha nwere mmadụ ebe ahụ".

    O kwuru na ndị ọrụ ya gara ebe ahụ n'elekere isii mgbede ụnyaahụ mgbe a gbaara ha ama maka ozu mmadụ a hụrụ ebe ahụ.

    O kwuru na "ya bụ ihe gbagwojuru anyị anya, maka na onweghị onye tụwara anya ụdịrị ihe ahụ".

    O kwukwara na ya bụ ụgbọala bụ ndị ahụ bụ nke ọnye nwe ya hapụrụ gbapụ ọsọ enweghị ezigbu ntụ onyi n'ime ya.

  3. Ụnụ asaala chi e. Ndụ nwoke, ndụ nwaanyị. Ndụ mmiri, ndụ azụ. Taa bụ Afọ. Afọ ga-ewetara anyị ihe ọma o!

  4. Aka akparala otu n'ime ndị gburu Ahmed Gulak n'Imo Steeti

    Ndị uweojii Imo Steeti sị ha anwuchiela otu n’ime ndị a na-enyo enyo gburu Ahmed Gulak nke All Progressive Congress (APC), e gburu n’Imo Steeti.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Michael Abattam kwuru nke a mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n’ụbọchị Mọnde n’Owerri.

    Nwamadị a a kpọrọ Anosike Chimobi bụ onye okpuruọchịchị Ahiazu Mbaise nke Imo steeti.

    Abattam sị na o teela ha chọwara Chimaobi, kamgbe otu afọ ha gbuchara Gulak.

    E gburu Gulak bụbu onye enyemaka Onyeisiala Goodluck Jonathan n’ụbọchị iri atọ nke ọnwa Mee, afọ 2021, mgbe ọ gara Imo steeti.

    Ọ sị na Chimobi gbara ọsọ mgbe ndị otu ya na ndị uweojii kwatara egbe dịka e gburu mmadụ ise n’ime ha.

    Ndị oji egbe so ya n’azụ site n’ụlọ ndina ya dị n’Owerri ruo obodo Umueze Obiangwu dị na Ngor-Okpala bụ ebe ha gbagburu ya mgbe ọ na-aga n’ọdọụgbọelu Sam Mbakwe.

    Mgbe Chimobi na-agwa ndị ntaakụkọ okwu, ọ sị na o soghi gbuo Gulak kama na ọ bụ ya bu ndị oji egbe ahụ n’ụgbọala.

    Ọ sị na ndị ahụ yiri ya egwu ka o buru ha n’ụgbọala ma ọ bụghị ya ha e gbuo ya.

  5. South Africa amachiela ire mmanya na-aba n'anya n'ụlọ awantilo

    N'Afrika, gọọmentị mba South Africa amachiela ire mmanya na-aba n'anya n'ụlọ awantịlọ ha niile dị na mba ahụ.

    Nke a na-abịa dịka ihe ruru ụmụaka iri abụọ na otu nwụrụ n'otu ụlọ awantịlọ na-akpọrọ Enyobeni Tavern ụbọchị Satọde.

  6. Otu jịkọtara ndị niile nwetere ọkwa ịzọ ọchịchị onyeisiala Naịjiria na Pati niile dị n'ala Igbo bụ NFSEP ewepụtala Peter Obi ka ọ nọchite anya ha

    N'aka ọzọ,otu ndị niile ritere ọkwa ịzọ ọkwa onyeisiala na Pati dị ichechi n'Ala Igbo kpọrọ onwe ha National Forum for South East Presidency, NFSEP, ahọpụtala Peter Obi dịka onye ga-anọchite anya ha na ntuliaka 2023.

    Pati ndị a gụnyere ZLP, NRM, ADC, APGA, na LP sị na ndị otu ha niile na Naịjirịa ga-akwado Peter Obi na ya bụ ntuliaka.

    Mpụtara ya bụ mkparịtaụka ha nwere gosiri na ka ihe siri kwuru na ya bụ nzukọ:

    • Dan Nwanyanwu (ZLP): 2%
    • Okwudili Nwa-Anyajike: (NRM)
    • Dumebi Kachikwu (ADC): 5%.
    • Peter Umeadi(APGA): 16%
    • Peter Obi(LP): 73%

    Ha dere n'akwụkwọ mkpebi ha sị " maka nkwekọrịta a, anyị achịkọtala nkwado anyị niile chịnye Peter Obi

  7. Fake news: Gọvanọ Anambra steeti bụ Chukwuma Soludo ekwuola na aka ya adịghị na ya bụ ebubo na-efegharị na soshal midia gbasara Peter Obi

    Odeakwukwo mgbasazi nke Gọvanọ Anambra steeti agwala ndị mmadụ ha ejikwala ya kporo ihe bụ asịrị ndị mmadụ na-akụ gbasara ihe ha si na Chukwuma Soludo kwuru maka Peter Obi.

    Christian Aburime onye tinyereaka na ya abụ akwụkwọ sị na ọnweghị mgbe Soludo ji sị na ha Peter Obi agaghị enweta ọkwa onyeisiala Naịjirian.

    Abumrime sị na ya bụ asịrị bụ ọrụaka ndị osochiegbu.

    Akụkọ pụtara na ngwụcha izuụka gara aga ne-egwu na Soludo sị na Peter Obi na Pati ya bụ Labour Party agaghị achịta aja na ndọrọndọrọ ọchịchị onyeisiala Naịjirịa.

  8. Ọgbakọ G7 na-etinye ọnụ n'agha Ukraine

    Onyeisiala mba Ukraine bụ Volodymyr Zelensky arịọ na ndị otu aka ji akụ G7 ka ha biko zitekwuoro ya gwa agha ọkacha ka Russia ji iwe tụọ ha ogbunigwe na ngwụcha ịzụụka a. Zelensky sị na eziteghiri ha ngwa agha ndị a ngwangwa ga-eme ka Russia kaa obi na-ibuso ha agha na-arịọka ka ha nyekwuo Russia mkpachị dị ike.

    Opiike ịdọaka gbasara ogbunigwe na-ada na Kyiv dịka Onyeisiala mba Ukraine be Volodymr Zalalensky akwado ịgwa ndị otu G7 okwu.

    Ya bụ oke ịkwa mgbọ alọghachila azụ na Kyiv na mpaghara ndịda anyanwụ mba ahụ ugbua.

    Ya bụ ogbunigwe Russia malitere ịtụsi ike na Kyiv kemgbe ụbọchị ụka gburu otu onye.

  9. Atọhapụla ndị ụkọchukwu anọ ndị ntọ ji kemgbe ọnwa Mee

    Ụka Katọlịki na Sokoto steeti ekwuola na a tọhapụla ndị otu ha ndị ntọ ji eji kemgbe ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Mee. Fada ndị ahụ a tọhapụrụ bụ Stephen Ojapa, Oliver Okpara, Hassan Hassan na Ummie Hassan.

    N'akwụkwọ onyeisi mmgbasaozi ndị ụka ahụ bụ Chris Omotosho zitupara ụnyaahụ, bụ ebe ha nọ kwuputa nke a, ọ kelere ndị mmadụ maka nkwado ha, ekpere na ihunanya niile ha nyere ha.

  10. Unu asaala chi e! BBC Igbo na-ekele ụnụ taa bụ Mọnde Orie ụbọchị iri abụọ na asaa

  11. Agha Rọshịa busoro Ukraine so n'okwu a kpụ n'ọnụ dika ọgbakọ G7 malitere

    Otu jikọrọ mba ndị welitere isi n’ụwa a kpọrọ G7 amalitela ọgbakọ ha ugbua na mba Germany.

    Ya bụ ọgbakọ ga-adị abalị atọ, ya bụ na ọ ga-akụrụ ọnụ n'ụbọchị Tuzde, abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Jun 2022.

    Akụkọ na-ekwu na okwu a kpụ n'ọnụ nke ndị otu a ga-akpa maka ya bụ ọgụ Rọshia na-aluso Ukraine.

    Cheta na Rọshia sobu n'otu G7 mana a chụpụla ha kamgbe ha wakpochara Ukraine.

    Mba ndị ọzọ nọ na G7 bụ: Canada, France, Germany, Italy, Japan, United Kingdom, Amerịka na otu European Union.

  12. Ihe ruru mmadụ iri abụọ anwụọla n'ụlọ oriri na nkwarị dị na mba South Afịrịka.

    A hụrụ ozu ihe karịrị mmadụ iri abụọ n'Enyobeni Tavern bụ aha ụlọ oriri na kwarị ahụ ebe akụkọ na-ekwu na ọtụtụ mmadụ merụrụ ahụ n'ebe ahụ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii ebe ahụ gwara ndị ntaakụkọ na ụlọọrụ ha ka na-enyocha ihe kpatara ọnwụ ndị ahụ nakwa mmerụ ahụ ndị ọzọ merụrụ.

    Ọtụtụ ndị ọrụ gbatagbata juputere n'ụlọ oriri na nkwarị ahụ nke ime abalị dị n'Eastern Cape province.

    Ndị ezinụlọ ndị nke nwụrụlanụ enwetebegh ị ohere ịhụ ozu onye nke ha ebe ndị bi n'obodo ahụ ekwuola ka emechie ebe ahụ.

    Kọmịshọna ndị uweojii bụ Nomthetheleli Lilian Mene gwara ụlọọrụ mgbasaozi SABC na ọ na-eche na ọ bụ nzọgbu nzọgbu gburu ndị ahụ nwụrụ na Tavern ahụ.

    Ụlọọrụ BBC amabeghị nke bụ eziokwu kpọmkwem gbasara akụkọ ndị a.

    Brigadier Kinana gwara ndị ntakụko na ndị ahụ nwụrụnụ bụ ndị ntoroọbịa dị afọ dị n'ogo iri na asatọ na iri abụọ.

    Mịnister ndị uweojii na South Afịrịka bụ Bheki Cele agawala ebe ahụ ọdachị a mere iji nyere ndị ọkammụta aka na nyocha ha na-eme dịka Oscar Mabuyane bụ onyeisi ogbe ebe ihe a mere si kwu.

  13. Nhọpụta osote m mgbe m zọrọ ọchịchị onyeisiala bụrụ m nnukwu nzọghe ụkwụ- Obasanjo

    Onye chịburu Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo atụọla arịrị maka ịhọpụta onye bụ osote ya mgbe ọ zọrọ ọchịchị.

    O kwuru nke a n'ọgbakọ ebe o nyere ụmụakwụkwọ ndụmọdụ gbasara ọchịchị ọ gara n'Abeokuta dị n'Ogun steeti.

    Obasanjo onye meriri ntuliaka onyeisiala n'afọ 1999 nakwa 2003, họpụtara Atiku Abubakar dịka osote ya.

    N'ọnụ ya, chineke mara na akpkpachaghị m anya wee zọghie ụkwụ n'ịhọpụta osote m, ya mere chukwu ji zọọ m."

    Atiku Abubakar bụ onye ji ọkọlọtọ Peoples Democratic Party azọọ ọkwa onyeisiala na ntụliaka nke afọ 2023 na-abịanụ.

    N'ime onyonyo ebe Obasanjo kwuru okwu a, ọ sị na ọ bụ eziokwu na ọ zọghiela ụkwụ ọtụtụ mgbe mana chukwu zọchara ya site mpụtara ha niile.

    N'ọnụ ya, a gaghị m asị na m zọghiebeghị ụkwụ, a zọghiela m ụkwụ ọtụtụ mgbe.", Obasanjo kwuru na onyonyo ahụ.

  14. Gọọmenti Zamfara agwala ndị steeti ya ka ha zụta egbe ha ji echekwa onwe ha

    Gọọmenti Zamfara steeti dị na Naịjirịa ekwuola na ha agwaala ndị bi na steeti ahụ ka ha kwado izụta egbe ga-enyere ha aka ichekwa onwe ha n'aka nsị omekome.

    Ibrahim Dosara bụ kọmịshọna na-ahụ maka mgbasaozi depụtara nke ahụ n'akwkwụ ọzọ o kesara n'ụbọchị Satọde nke kwukwara na gọọmenti Zamfara agwala ndị bi na steeti ahụ chọrọ egbe, ka ha degara onyeisi ndị uweojii steeti ahụ akwụkwọ.

    Ibrahim depụtakwara na steeti ha na-akwado imepe ngalaba ga na-anabata mkpesa gbasara mwakpo ndị omekome makana mkpamkpa ha na-akpa na-enye ọrụ ụgbọ nsogbu na Zamfara.

    Gọọmenti Zamfara ekwuola na ha ga-ewepụta ndị nchekwa ruru narị abụọ tinyekwuoro ndị na-arụbụ ọrụ n' ogbe iri na itoolu dị na steeti ahụ.

    Ha gakwara n'ihu machie ụfọọ̄ụ ahịa n'ogbe ahụ ma gwa ndị ọrụ nchekwa ka ha gbagbuo onye ọbụla ha hụrụ n'elu ọgba tumtum n'ogbe ndị amachiri ha.

  15. Ndí omekome egbuola onye ụkọchukwu Katọlịk ọzọ na Kaduna

    Archdiocese Katọlịk dị na Kaduna edepụtala maka ọnwụ Rev. Fr. Vitus Borogo, onye ha kwuru nwụrụ n'aka ndị omekome wapkoro Prison Farm, Kujama dị n'okporoụzọ gawara Kaduna-Kachia ụnyahụ bụ June 25,2022.

    Tupu ọnwụ ya, Fr Vitus dị afọ iri ise mabụrụkwa onyeisioche Nigerian Catholic Diocesan Priests Association (NCDPA), dị na Kaduna.

    Archbishop Kaduna bụ Most Rev. Matthew Man-Oso Ndagoso etiela ezinụlọ Fr Vitus nakwa "NFCS Family" nke Kaduna Polytechnic aka n'obi.

    Archdiocese Kaduna site n'akwụkwọ ozi Rev Fr Christian Okewu Emmanuel bụ onye ozi ha, depụtara na ha ga-ekwupute maka akwamozu Fr. Vitus n'oge na-adịghị anya.

    Anyị ka na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ ndị uweojii gbasara ọnwụ Fr Vitus.

  16. Ụtụtụ ọma Igbo ndị ọma!

    Nke onye chiri, ya zere.

    Sonyere anyị n'ụtụtụ a dịka anyị ga na-ewetara gị akụkọ gbara ọkpụrụkpụ si ala Igbo, Naịjirịa, nakwa mba ụwa dị iche iche.

  17. Taiwo Awoniyi esonyela otu Nottingham Forest

    Ọgbaa bọọlụ Super Eagles bụ Taiwo Awoniyi esonyela otu Nottingham Forest nke mba Ingland.

    Kepu kepu na-ekwu na ọ bụ nde paunds iri na asaa na ụma ka Nottingham kwụrụ otu egwu bọọlụ Union Berlin iji zụta ya.

    Dịka nkwekọrịta nke o binyere aka na ya kwuru, Awoniyi ga-anọ na Nottingham Forest rue afọ ise.

  18. Ndị uweojii eboola otu nwoke ebubo ịgbụ ọchụ na mba Norway

    Ndị uweojii na mba Norway ebola otu nwoke dị afọ 42 ebubo ịgbu ọchụ nakwa iyi ndụ egwu dịka ọ wakporo ọtụtụ ebe n’isi obodo mba ahụ bụ Oslo.

    Mwakpo ahụ tara isi mmadụ abụọ ma merụọ mmadụ iri abụọ na otu ahụ n'ụzụ ụtụtụ ụbọchị Satọde.

    Akụkọ kwuru na anụrụ ụda egbe n'ebe atọ gụnyere otu ụlọ egwu bụ ebe ndị LGBTQ+ na-agbakọwa.

    Otu ahụ na-akwadobu ịnwe mmemme ha taa mana dịka ọ dị ugbua ha akagbuola ya.

    Ndị uweojii kwuru na ha nwere akaebe gosiri na ọ bụ ikpaso oke agbụrụ butere mwakpo ahụ.

  19. Otu Amotekun anwụchiela ndị echeere wakporo ụlọụka St. Francis n'Ondo steeti

    Ndị nchekwa ala Yoruba bụ Amotekun anwụchiela ndị e cheere wakporo ụlọụka dị n’Owo, Ondo steeti

    Onyeisi otu nchekwa ahụ bụ Adetunji Adeleye gwara BBC na ha ka na agba ndị ahụ ajụjụọnụ ma kwuo na ha napụrụ ha otu ụgbọala bu ngwa ọgụ dị icheiche.

    Amotekun bụ otu nchekwa nke Gọvanọ ndị mpaghara ọdida anyanwụ hibere iji chekwa steeti ha n'afọ 2020 dịka ọnọdụ nchekwa ọjọọ na-arị ibe ya elu n'ebe ahụ.

    Otu nchekwa ahụ kwesiri ị nyefe ndị ahụ n'aka ndị uweojii ime ha nnyocha ma kpụpụ ha ụlọikpe n'ihi na ndị Amotekun enweghi ikike ime ihe ndị a.

  20. Anyị bụ ndị omeiwu agaghị agbahapụ Ike Ekweremadu - Smart Adeyemi

    Omeiwu Smart Adeyemi ekwuola na ya na ndị omeiwu ọzọ kwụ Ike Ekweremadụ n’azụ ma kwuo na ụfọdụ n’ime ha na-anwa i zigara ya ozi.

    Cheta na Ekweremadu na nwunye ya nọ n’aka gọọmentị mba Briten bụ ndị a nwuchiri maka ebubo na ha chọrọ iwepu akụkụ ahụ mmadụ.

    Adeyemi gwara ụlọntaakụkọ Channels nke a na mkparịtaụka ya na ha nwere n'ụbọchị Fraịde.

    Peter Obi bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha otu Labout Party bụ onye zigara Ekweremadu na ezinaụlọ ya ozi nkwado maka ihe mere.

    Dino Melaye bụ onye ndọrọndọrọ ọzọ sị na ya kwụ Ekweremadu n'azụ.