Nsogbu enweghị mmanụ ụgbọelu ga-anọte aka - Hadi Sirika
Mịnịsta njem ụgbọelu na Naịjirịa bụ Hadi Sirika ekwuola na olileanya ọbụla adịghị maka mgbe nsogbu enweghị mmanụ e ji akwọ ụgbọelu ga-abịa n’isi njedebe na Naịjirịa.
Sirika kwuru nke a n’ọgbakọ ya na ndị ọrụ ụgbọelu nwere n’Abụja n'ụbọchị Tuzde, ma kọwaa na nsogbu a ga-anọte aka maka na Naịjirịa anaghị emepụta mmanụ e ji akwọ ụgbọelu.
"Nsogbu gbasara mmepụta mmanụ agbịdị zuru ụwa nille ọnụ. E nwere ụkọ mmanụ ụgbọelu n'akụkụ ụwa niile, ma n'Amerịka ma na New Zealand," Sirika kwuru.
"Ya bụ nsogbu ka njọ na Naịjirịa n'ihi na anyị anaghị emepụta ya bụ mmanụ e ji akwọ ụgbọelu."
Sirika kọwakwara na ihe ọzọ mere ya bụ nsogbu ji akawanye njọ bụ maka ụkọ dọla, bụ ego e ji azụta ya bụ mmanụ ụgbọelu.
O kwuru na gọọmentị na-agbalị ike ha ịma ihe a ga-eme maka nsogbu a, "mana ọ bụghị ihe ga-akwụsị taa maọbụ echi".