You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Amerịka egbuola Ayman al-Zawahiri bụ onyeisi otu al-Qaeda

E gburu ya n’isiobodo Afghanistan bụ Kabul n’ụbọchị ụka dịka otu nchekwa mba Amerịka nke CIA wakporo be ya.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chukwunaeme Obiejesi

  1. Lee nkwekọrịta Rọshịa na Yukren nwereike ịzọpụta mba ụwa n'ụkọ 'ọka'

    Mba Rọshia na Yukren enweela nkwekọrịta ka mba Yukren ree ọka na ihe ndị ọzọ yiri ya dịka ọnọdụ agha na mba Yukren gbochiri ha ịgba mgbere nri ndịa nke butere ụkọ ụfọdụ ihe eji eme achịcha na mba ụwa niile.

    Nkwekọrịta a ga-enye ohere ka nde pụrụ nde nrị ndị a tọrọ atọ na mba Yukren ga-enweike gaa mba ndị ọzọ.

    Kama mba Yukren ekweghị ka ha na mba Rọshịa tinyeaka n'akwụkwọ nkwekọrịta n'otu ebe ma jụkwa ka ha na ndị mba Rọshịa nọrọ n'otu tebulu oge a na-akpa nkata a.

  2. Ị bọọla chi

    Daalụ dịka i sonyere anyị taa

  3. Ụlọikpe ukwu ekwuola ka akpụga Ahmed Idris ụlọ mkpọrọ Kuje

    Ụlọikpe kachasị n’Abuja enyela iwu ka ejichie onye bụbu ọgụego ukwu Naịjirịa bụ Ahmed Idris nakwa mmadụ atọ ọzọ n’ụlọ mkpọrọ.

    Cheta na akpụpụrụ ha ụlọikpe make ebubo izupu ego karịrị otu nari ijeri naira nke ha gọrọ na ha ezughi.

    Aha ndị atọ ọzọ e so kpụpụ ụlọikpe bụ Olusegun Akindele, Mohammed Usman nakwa ụlọọrụ Gezawa Commodity Market and Exchange Limited.

    Ọkaiwu Idris bụ Chris Uche rịọburu ụlọikpe ka enye Idris ikike ịsi n'ụlọ na-abịa ụlọikpe n'ihi na EFCC ji akwụkwo njem ya.

    Ọ rịọkwara na kama a ga-akpụpụ ya Kuje, ka akpọnye ya ndị EFCC mana ọkaikpe Adeyemi Ajayi egeghi ya ntị.

    E bụgharịrị ikpe ya rue ụbọchị 27 nke ọnwa Jụlai.

  4. Gọọmentị Naịjirịa ezigarala ezinaụlo Chima Echefu ozi itiakan'obi

    Gọọmentị Naịjiria esila na ngalaba na-elekọta ndị Naịjirịa bi n'ofesi bụ NIDCOM zigara ezinaụlọ otu nwoke Naịjirịa nwụrụ na mba Saụt Afrịka ozo itiakanobi.

    Onyeisi ngalaba ahu bụ Abike Dabiri Erewa gwara ezinaụlọ Echefu na ezi nyocha na-aga n'ihu gbasara ọnwụ nwoke ahụ bụ nke ndị ohi gbagburu n'ọdọahịa ya dị na Saut Afrịka.

    Onye nnọchite anya ngalaba ahụ bụ Andrew Idi gara leta ezinaụlọ nwoke ahụ ma na-enye aka ịbulata ozu ya na Naịjriị ili ya.

    Dabiri Erewa gwakwara gọọmentị ndị Saụt Afrịka ha gba mbọ hụ na enyochapụtara ndị gburu Echefu ma mee ka ọ ghara ịdị ka ọnwụ ndị Naịjirịa ndị ọzọ nwụrụ na nkịtị.

    Michael Chima Echefu bụ onye na-azụ ahịa na Saụt Afrịka tupu ọ nwụọ. Ọ hapụrụ nwunye ya bụ Ugochi Echefu na ụmụ atọ.

  5. Donald Trump akpọọla ekwu nkụ na ọnweghị ajọ ihe ya mere maka mmehie ndị otu ya na Capitol

    Onye bụbu onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump akpọọla ekwu nkụ na ya agaghị arịọ mgbaghara maka ajọ agwa ndị otu ya kpara na Capitol n'afọ agara aga.

    Nke a na-eme dịka kọmitii na-eleba anya ajọ agwa ndị otu ya kpara ọnwa Jenụwarị 2021.

  6. A ga-amanye ndí uweojii ka ha kpụpụ Bola Tinubu ụlọikpe

    Ụlọikpe ekwetala ka Onyeisi ndị uweojii kpụpụ Bola Tinubu, onye ji ọkọlọtọ APC azọ ọkwa onyeisiala ụlọikpe maka ihe ha sị na ọ bụ akwụkwọ adịgboroja ka ọ nyere Inec mgbe ọ zọrọ ọkwa Gọvanọ nke Legọs steeti.

    Ya bụ ikpe ụlọikpe kpebiri ụnyaahụ bụ ndị Incorporated Trustees of Center for Reform and Public Advocacy gbara ya bụ akwụkwọ.

  7. Ukraine na Russia ga-etinye aka n'akwụkwọ taa maka ịrewe wheat

    Taa bụ Fraịde ka mba Russia kwe ka Ukraine etinye aka n'akwụkwọ ịkwe ka Ukraine malite ire mkpụrụ wheat site n'oke osimiri nke Black sea.

    Ndị kpokobara ya bụ ọgbakọ ga-eme na Istanbul bụ ndị Turkey na UN.

    Ya bụ agha Ukraine na Russia na-alụ kemgbe Febụwarị 2022 etinyela ụwa n'oke ụganị nkere mere ọnụahịa nrị jiri rịe elu.

    Ya mere ya bụ nkwekọrịta jiri baa oke uru dịka ihe ruru nde iri abụọ tọrọ n'ogige nchekwa n'Odesa.

    Mịnịsta na-ahụ maka mba ofesi nke mba Ukraine kwetere na ya bụ nkwekọrịta ga-aga n'ihu taa na Turkey dịka otu onye omeiwu ha na-adọ aka na ntị ka ndị be ha kpachara ya.

  8. Peter Obi arịọla ụlọikpe ka ọ kụchapụ akwụkwọ PDP gbara ya

    Onye ji ọkọlọto Labour party azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa bụ Peter Obi arịọla ụlọikpe ukwu dị n'Abụja ka ọ kụsaa ya bụ akwụkwọ otu pati PDP gbara ya maka iji Datti Baba-Ahmed dochie Doyin Okukpe dịka Osote ha.

    Cheta na izụ gara aga ka PDP gbara ya bụ akwụkwọ n'isi Labour Party, APC nakwa Inec na-ekwu na ọ nweghị ihe dịka ịnọchite anya mmadụ na ndọrọndọrọ ọchịchị.

  9. Aka akparala otu nwaamadị gbapụrụ n'ụlọmkpọrọ Kuje

    Aka akparala onye agha adígboroja so gbapụ ọsọ n'ụlọ mkpọrọ dị na Kuje ndị omekome wakpọrọ n'ụbọchị ise nke ọnwa Julaị. Kọmishọna ndị uweojii n'Adamawa steeti bụ Sikiru Akande sị na e jidere Abubakar Mohammed n'ụzọ ka ọ na-aga obodo ya dị na Bama, Borno steeti.

  10. Unu anọọla e! Anyị na-ekele unu

  11. Gọọmentị etiti na-etule ịmachi ọgba tumtum

    Gọọmentị etiti na-etule ugbua ịma ma ha a ga-amachi ọgba tumtum nakwa ngwụputa ala kpam kpam na Naịjirịa iji wulite ọnọdụ nchekwa.

    Nke a pụtara ihe dịka onyeisiala Muhammadu Buhari na ndị isi ọrụ nchekwa nwechara nzụkọ taa n’Abuja.

  12. Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden ebutela coronavirus

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden edopula onwe ya iche ugbua dịka nyocha gosiri na ọ bụ ọrịa coronavirus.

    Onyeisiala Biden dị afọ 79 agbazuola ọgwụ mgbochi ya niile ma gbaso abụọ ọzọ akpọrọ 'booster' na Bekee.

    Ụlọorụ ya ekwuola na ọ ka ga na-arụ ọrụ ya dịka o na-edopu onwe ya iche mana o nwere obere ngosi ọrịa ahụ.

    Enyochakwara nwunye ya bụ Jill Biden mana o buteghi ya.

  13. Ka ọ dị echi

    Daalụ nụ maka isonye anyị taa.

    Gbanụ mbọ bịakwa ọzọ echi

    Ka ọ bọọ.

  14. Ndị na-emepụta achịcha Bekee na-akwado ịgba abụbụ ọrụ

    Ndị na-arụpụta achịcha Bekee a ma dịka 'Bread' ekwuola na ha ga-agba abụbụ ọrụ abalị anọ maka ọnụ ngwa ọrụ ha na-arị elu.

    Flour e ji eme achịcha ahụ nakwa mmanụ ọkụ Diesel eji enye ngwa ọrụ ọkụ so n'ihe ndị kachasị rị elu.

    Emmanuel Onuorah bụ onyeisi otu ahụ kwuru na ụfọdụ n'ime ha achụọla ndị ọrụ ha maka oke ahụhụ ha na-ata n'ọrụ ha.

    Ugbua ha na-akpọ gọomentị oku ka ha wepu ụgwọ ụtụ isi n'elu 'Flour' a na-ebubata na Naịjirịa bụ pasentị iri na ise.

    Abụbụọrụ ha kwesiri ịbụ naanị abalị anọ mana Onuorah kwuru na ọ ga-adị rue ebighebi maọbụrụ na o nweghi ihe gọọmentị mere maka nsogbu ha.

  15. Ngalaba NCDC ekeela nkwụcha maka ọrịa Marburg

    Ngalaba NCDC nke Naịjirịa ekwuola na ha ekeela nkwụcha banyere ọrịa Marburg dịka achọtara ya na mba Gana

    Ha kwuru na ndị ọrụ ahụike azụrụ azụ dị njikere dịka awụlitere ngwa nnyocha ha iji kwụsị ma gwọọ kama otu onye bu ọrịa ahụ.

    Rue ugbua, o nwebeghi kama otu onye bu ọrịa ahụ achọtara na Naịjirịa mana ha ezipula ozi site n'akara Twitter ha ịgwa ndị mmadụ mụta maka ọrịa ahụ ma chekwaa onwe ha.

  16. NFF akọwaala ihe mere ha ji jide ndị Super Falcons ụgwọ

    Ngalaba bọọlụ Naịjirịa akọwaala na ọ bụ nsogbu ịgbanwe ego nakwa izuputa ego na Naịjirịa bụ ihe ji nkịta ọnwụ n’ịkwụ otu Super Falcons ụgwọ.

    Nke a na-abịa dịka otu bọolụ ụmụnwaanyị jụrụ ịpụta ọzụzụ ha taa maka ụgwọ ọnwa na ụgwọ ihe ndị ọzọ e ji ha.

    N'ihe onyonyo ha wepụtara n'akara Facebook, onyeisioche ha bụ Ibrahim Guso kọwara na ha ndị ọgba bọọlụ ụmụ nwaanyị enweela nzụkọ gbasara ya bụ ihe.

    "Obi dị mmadụ niile ụtọ maka etu ụmụnwaanyị anyị si agba" ka o kwuru.

    Gee ihe ndị ọzọ o kwuru n'uju ebe a

  17. Sri Lanka enwetala onyeisiala ọzọ

    N'ofesi, ndị omeiwu Sri Lanka ahọpụtala onyeisiala ọzọ aha ya bụ Ranil Wickremesinghe agbanyeghị na ndị mmadụ amachaghị ya.

    Ranil ji vootu otu narị na iri atọ na anọ (134) merie Dullus Alahapperuma bụ onye nwetere naanị vootu iri asatọ na abụọ (82).

    Cheta na e nyere Prịam Minista ọzọ bụ Gotabaya Rajapaksa ọsọ maka amaghịeme.

  18. 'Uzuọkụ Europe agaghị ala ngwangwa' - UN

    N'ofesi, UN World Meteorological Organization agbala ama na ọkụ na uzuọkụ nke ji Europe eghekpọ ugbua agaghị ala ngwangwa.

    Peterri Taalas bụ otu onyeisi ha kwuru nke a maka oke ọkụ na uzuọkụ karịrị centigrade iri anọ na-eghe ndị mmadụ ka garị na Europe n'ụdị ha ahụbeghị mbụ.

  19. Onyeisiala Muhammadu Buhari enyela iwu ka e bie abụbụ ọrụ ndị Asuu ozugbo ozugbo

    Onyeisiala Muhammdu Buhari enyela minista agụmakwụkọ bụ Adamu Adamụ nakwa Ogbo ya na ahụ maka ndị ọrụbụ Chris Ngige iwu ka ha bie abụbụ ọrụ ndị Asuu n'izu abụọ.

    Cheta na abụbụ ọrụ ndị Asuu eruola ọnwa asaa ebe ha na-esi ọnwụ ka etinyere ego n'ụgwọ ọnwa nakwa ka edozie ụlọakwụkwọ.

    Mana, otu ndị nkuzi mahadụm bụ Asuu n'ịchafụ akpọọla egwo nkụ na ha agaghị akwụsị ya bụ abụbụ ọrụ ha gbawara nkemgbe ọnwa isii.

    Onyeisi ndị otu a bụ Emmanuel Osodeke kwuru n'Abuaj ụnyaahụ na Minista ọrụ bụ Chris Ngige ji ha eti epele.

  20. ‘Ndị Dibịa ọdịnala niile nọ n’Anambra ga-ebenyezi aha ha n’akwụkwọ’ – Gọọmentị Anambra steeti, Gọọmentị Anambra steeti agbarụọla ihu nye ụfọdụ ndị dibịa na steeti ahụ dịka e kwuru ha nyere ndị omekome aka

    Ihe apụọla n’egwu n’Anambra steeti dịka gọọmentị steeti ahụ zipụtara n’ụbọchị Tuzde nye ndị dibia niile nọ na steeti ahụ.

    Ozi a nke Kọmịshọna mgbasaozi bụ Paul Nwosu binyereaka depụtara:

    “Gọọmentị ma ọrụ ọma ndị Dibia ọdịnala na-arụ ọkachasị n’okwu ọgwụgwọ ahụike ndị mmadụ nakwa ihe ndị ọzọ mana ụfọdụ n’ime ha na-enyere ndị omekome aka site n’ịgwọrọ ha nsi ha ji echekwa onwe ha”

    Nwosu gara n’ihu kwuo na ọ bụ nnyocha ha mere na nso nso mere ha ji mee mkpebi a.

    O kwuru: “Ọ ga aka mfe inwuchie ndị dibia na-etinye aka n’ụdịrị ihe ọjọọ ndị a ma ọ bụrụ na ha niile debanye aha ha”

    Cheta na Anambra steeti so na steeti Ọwụwa anyanwụ Naịjirịa ebe enweghi nchekwa na-enye nsogbu.

    Na ọdịnso a, anwụchịela ụfọdụ ndị dibia e kwuru na-enyere ndị omekome aka n’ọrụ ọjọọ ha.