You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Amerịka egbuola Ayman al-Zawahiri bụ onyeisi otu al-Qaeda

E gburu ya n’isiobodo Afghanistan bụ Kabul n’ụbọchị ụka dịka otu nchekwa mba Amerịka nke CIA wakporo be ya.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chukwunaeme Obiejesi

  1. Israel Adesanya akụpụla Jarred Cannonie mkpụrụ ọkwụrụ n'anya n'asọmpị UFC middleweight championship, Nwaafọr Naịjirịa bụ Israel Adesanya egosila ogbo ya onye mba Amerịka na ọ bụghị mmanwụ a na-akwa aka

    Onye egwuregwu mgba nke Ultimate Fighting Championship a ma ama bụ Israel Adesanya meriri ogbo ya bụ Jarred Cannonie n’asọmpị UFC middleweight championship dịka mmeri a mere ka Adesanya nọsịeike n’ọkwa onye nke mbụ n’asọmpị ahụ ugbua.

    Asọmpị mgba a nke a gbara n’ama egwuregwu mgba nke T-mobile Arena dị na Las Vegas mba Amerịka n’isi ụtụtụ Sọnde mere ya ugboro ise Adesanya na-anọsịke n’ọkwa mmeri a.

  2. O nweghị ụmụaka ọhụrụ nwụrụ n'ụlọgwụ UPTH- Ndị isiụlọgwụ ahụ

    Ụlọọgwụ 'University of Port Harcourt Teaching Hospital (UPTH) dị na Pọtakọt, Rivas steeti ekwuola na o nweghị ụmụaka ọhụrụ na ngalaba p.ụụ iche maka ụmụaka.

    Akụkọ na-efegharị na soshal midia na-ebo ebubo na ụmụaka a mụụ ọhụrụ dị 17 nwụrụ n'ụlọọgwụ ahụ n'ihi na ọkụ latrik adịghị.

    Mana ochisioche komiti ndụmọdụ na UPTH bụ Ọkammụta Lucky Onotai gwara BBC na akụkọ ahụ bụ akụkọ ụgha.

    "Onotai sịrị, "Nke a hụ bụ akụkọ ụgha. O nweghị nwa nwụrụ n'ụlọgwụ a."

    "Ọ bụrụ na ọ bụ eziokwu, Ka ndị na-ekwu nke a, bịa gosi anyị nne ụmụaka ndị ahụ."

    "ọ bụrụ na anyị nwee nsogbu ọkụ, ọ bụghị ihe ọhụrụ , anyị nwere igwe na-enye ọkụ anyị ji arụ."

    Otu nwaanyị aha ya bụ Peace Marcus gwara BBC na ya nwere anọọla n'ụlọọgwụ ahụ otu ọnwa n'ihi na ya nwere nwa a mụkworo amụkwọ, mana ya ahụbeghị nwa ọbụla nwụrụ.

    Ọ sịrị, "O nweghị nwa nwụrụ."

    Igwe ọkụ latrik Naijiria anyụọla mkpamkpam ihe karịrị ugboro anọ kemgbe bido afọ 2022,.

    Ndị ọdị n'aka boro ndị na eyin ndụ egwu bụ ndị ha kwuru naezukọsị akọọrọngwa na ewumewu ọkụ latrik na Naijiria.

  3. Germany ekwetela ịnyeghachị Naịjirịa ụfọdụ akpụrụ akpụ nka ha zufuru n’oge gara aga., Puku kwuru puku ihe akpụrụ akpụ na ọrụ nka ka e weere n'oge mbibi obodo Benin City mgbe ndị ofesi weghara ọchịchị ebe ahụ.

    Minista mgbasaozi na omenala Naịjirịa bụ Lai Mohammed ekelela mba Germany maka nkwekọrịta ọhụrụ ha kwuru na ha ga-eweghachịte nka ọla nchara ndị mba ha zuuru n’ike na Benin n’oge gara aga.

    Mba Germany nyefere ndị nnọchịteanya Naịjirịa na mba ha nka ọla nchara abụọ n’ụbọchị Fraịdee dịka ha kwuru na narị kwuru narị ndị ọzọ ga-eso ya n’oge na adịghị anya mana ha ekwupụtaghị mgbe nke a ga-eme kpọm kwem.

    Ngalaba Prussian Cultural Heritage Foundation kwuru na ha na-atụ anya na ha ga-enwe ike ibiri ụfọdụ nka ndị a n’aka gọọmentị Naịjirịa.

    Naijirịa na ọtụtụ mba ndị ofesi na-enwe mkparịta ụka maka ịweghachịte nke nchara e si Benin zufu buga mba Europe dị iche iche ma na-ezube iwu ụlọ ngosi ihe mgbe ochie nke Bekee na-akpọ ‘museum’ Benin nke Edo steeti, ebe a-atụ anya na a ga-edobe ha.

    Cheta na n’ọnwa Nọvemba 2021 na mba France wegachịtere nka 26 ha sị si Benin ebe mba Briten wegachịtere nka abụọ na mbido afọ 2021.

  4. ‘A ga-eji okwute tugbuo ụmụnwoke atọ dinara ụmụaka nwoke abụọ n’ike’ - Ụlọikpe Sharịa, Bauchi, Ụmụ nwanne abụọ e diinara n'ike enwetela mmeri n'ihu ụlọikpe Sharịa dị na Bauchi steeti.

    Otu ụlọikpe Sharịa dị n’obodo Ningi nke Bauchi Steeti ekpebiala na a ga-eji okwute tugbuo ụmụnwoke atọ maka inye ụmụaka nwoke abụọ ọgwụ ike ma dina ha n’ike.

    Mkpebi a pụtara ihe n'ọha n’ụbọchị Fraịdee dịka nnyocha gosiri na ụmụaka abụọ a dị afọ 10 na afọ 12 bụ ụmụ nwa nne.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Sharịa bụ Adamu Dankafi gbara ama nke a ma kọwa na ụlọikpe a mere mkpebi a n'ụbọchị Wenezde.

    Mkpebi a bụ n'hi iwu Sharịa anabataghị ndịna n’ike na ụmụnwoke na ụmụnwoke inwe mmekọ.

    Dankafi kọwara na anwụchịrị mmadụ atọ a n’obodo Gwada n’ọnwa Mee dịka nne na nna ụmụaka kwuru na ụmụ ha gbaara ama ha na ndị a nyere ha ọgwụ ike were diina ha.

  5. Ukraine enyela iwu ka ejichịe ụgbọ mmiri mba Russia bu ngwa nrị agafee mba ha, Russia eweteghị na ha zuru ngwa nri mba Ukraine agbanyeghị na ejichela ụgbọ ha.

    Gọọmentị mba Ukraine enyela iwu ka eijichie ụgbọ mmiri mba Russia bu ngwa nrị dịka osikapa, ọka na ndị ọzọ zubere igafee ọnụ mmiri mba ha dị na mpaghara Berdyansk.

    Gọọmentị Ukraine boro ebubo na ya bụ ụgbọ mmiri akpọrọ ‘Zhibek Zholy’ bụ nke ndị mba Russia.

    Ha kwukwara na ngwa nri ndị ahụ bụ nke Russia zuuru n'akụkụ mba ha ebe ndị ha wegharala ọchịchị.

    Russia eweteghị na ya bụ ebubo kwuru na ha zuru ngwa nri mba Ukraine agbanyeghị na ejichela ụgbọ ha.

    E kwuru na ụgbọ a zubere iburu ngwa nri ndị a gaa akụkụ ọnụ mmiri mba Turkey nke Karasu.

    O debeghị anya ebe ya bụ ụgbọ si mana Ukraine na-arụ aka na kemgbe Russia jiborola akụkụ mba ha n’ike kemgbe agha malitere, ha na na-ezu ngwa nri ha ma na ebupụ ya.

    Cheta na mba Ukraine so na mba ụwa kacha akọpụta ngwa nrị ndị dịka osikapa, ‘wheat’, ọka na ndị ọzọ.

    Ozi njem ụgbọ mmiri a gbara na soshal midia dịka Gọvanọ mba Russia họpụtara ka ọ nọọr n’elu ọchịchị mpaghara ndị a ejiboro bụ Yevhen Balytskyi zipụtara ozi ya site na akara Telegram ya.

    Balytskyi kọwara na ngwa nri ruru Tọọnụ 7,000 ka ya bụ ụgbọ mmiri bu.

  6. Ukraine War: Ọgbunigwe ndị Russia tụrụ na Odesa egbuala mmadụ 21

    Ọpekata mpe, ihe ruru mmadụ iri abụọ na otu anwụọla n'aka ogbunigwe Russia tụrụ n'obodo Odesa dị na mpaghara ọdịda anyanwụ Ukraine.

    Otu nwatakịrị so n'ihe nwụrụ na ya bụ ogbunigwe Russia tụbọrọ chi n'obodo ahụ dịka ndị ọrụ Ukriane kwuru.

    Ndị ọrụ gbatagbata, DSNS, sị na mmadụ 16 nwụrụ n'ime nnukwu ụlọ ogogo ya ruru itoolu ha gbaturu na Serhiyivka.

    Ha gbukwara mmadụ ise ọzọ na ya nwata n'ogige a na-enwe aṅụrị.

    Russia atụọla ọtụtụ ogbunigwe n'obodo mepere emepe n'Ukriane n'abali ọlemaole gara aga..

    Ụbọchị Fraịde ka ọnụ na-ekwuru Russia bụ Dmitry Peskov gọrọ chiele aka elu na ha anaghị agbagbu ndị nkịtị.

    Otu onye gbara afọ 60 bụ Yulia Bondar kọwara ka o siri mee, " anyị nụrụ ụda ogbunigwe atọ...na ntabi anya, ogige ahụ a na-enwe aṅụlị agwụla".

  7. Ndị ọmekatara ihe pụọ ụjọ egbuola ndị agha Naịjirịa

    Ndị agha Naịjirịa ekwuola na ndị ọmekatara ihe pụọ ụjọ gburu ụfọdụ ndị otu ha, amabeghị ole ha dị mgbe ha na ha kwakọrịtara mgbọ na Niger steeti ụbọchị Wenezde.

    Onyema Nwachukwu bụ ọnụ na-ekwuru ndị agha Naịjirịa sị na ihe a mere mgbe ndị otu ha gara ịza oku gbatagbata n'okpuruọchịchị Shiroro ebe a sị na ndị omekome ahụ weghaara otu mpaghara ebe a na-egwuputa akụ ọnatarachi.

  8. Otu jikọrọ ndị ọrụ na-akwado ịgba abụbụọrụ ịdọ gọọmentị etiti aka na ntị

    Otu jikọrọ ndị ọrụ na Naịjirịa bụ NLC ekwuola na ha ga-agba abụbụ ọrụ otu ụbọchị iji dọọ gọọmentị etiti aka na ntị maka ihe na-eme n’obodo.

    Ihe ha kachasị metụta na ya bụ ọnọdụ nchekwa na-akawanye njọ nakwa abụbụ ọrụ ndị nkuzi mahadum gbara kemgbe ọnwa Febụwarị.

    Onyeisi otu ahụ bụ Ayuba Wabba kwuru na oge eruola a ga-eji ngwangwa tinye anya n'ọnọdụ ahụ dịka o si metụta Naịjirịa.

    Ọ sị "Taa anyị ka na-ekwu okwu, mmadụ Diesel bụzị narị naira asaa ka a na-ere otu lita. O nweghi etu a ga-esi kwe ka ihe dirị gawa otu a".

    Ha ekwubeghi ụbọchị ọ bụ kpọm kwem ha ga-agba abụbụ ọrụ ahụ.

  9. Ngalaba INEC adọtikwuola oge enyere iji nweta PVC

    Ngalaba na-elekọta ntuliaka bụ Inec adọtịkwuola oge ha nyere ndị mmadụ ga-eji nweta PVC e ji eme ntuliaka.

    Ha kwuputara nke a n'ozi ha tinyere na akara Twitter na soshal midia ndị ọzọ mana ha ekwubeghi mgbe ya bụ ihe ga-ebi.

    Ihe ọzọ pụtara n'ozi ahụ bụ na ha nyere site n'ụbọchị mbụ rue ụbọchị iri na ise dịka oge paatị dị icheiche ga-eji wepụta aha ndị na-azọ ọkwa gọvanọ nakwa ụlọomeiwu steeti n'okpuru ha.

  10. Ndị ụkọchukwu emeela ngagharịiwe na Kaduna maka ogbugbu ndị otu ha

    Ndị ụkọchukwu na Kaduna steeti emeela ngagharịiwe maka oke ogbugbu a na-egbu ha n'ala Naịjriịa niile.

    Ha ji ohere akwamozu otu onye otu ha egburu n'ubi na Kaduna bụ Vitus Borogo mee ngagharị iwe a.

    Archbishop diocese Kaduna bụ Matthew Man-oso Ndagoso kwuru na ọ dị zi ka ha bụ ndị ụkọchukwu ụlọụka Katọlik abụzị ndị a na-achụ achụ ka anụ nta.

    "Ihe ndị a gosiri na Naịjirịa abụrụla mba dara ada" ka o kwuru mgbe ọ na-enye okwuchukwu maka onye nwụrụ.

  11. Nnọọ nụ na peeji anyị!

    Igbo bụ Igbo unu apụtala ụtụtụ?

    Akụkọ ndị anyị kwadoro unu taa kpụ ọkụ.

    Nọgide nu ebe a ịchọpụta ya.

  12. Ụlọikpe dị n’Abuja atọhapụla Ameerah Sufyan zipụrụ ozi ụgha maka ntọrọ ya ma nye ya ohere pụrụiche, Nwaada Sufyan agaghị aga nga maka nsogbu ụbụrụ isi ọ nwere mana ọ ga-anata ntaramahụhụ ndị ọzọ.

    Ụlọikpe Majịstratị n’Abuja atọhapụla nwaada Ameerah Sufyan bụ onye zịpụrụ ozi ụgha site na soshal midia ya na a tọrọ ya na mmadụ 16 ndị ọzọ n’Abuja na nso nso a.

    Ntọpụ nwaada a bụ naanị ma ya na ndị be ya e mere ihe atọ ụlọikpe ahụ depụtara nke gụnyere na nna ya ga-ebinye aka n’akwụkwọ maka ntọhapụ ya, na ọ ga-aga ụlọọgwụ nata ọgwụgwọ maka nsogbu ọgụgụ isi ya, nakwa na ọ ga-ezigara osote kọmịshịna Abuja bụ Auwal Ibrahim akwụkwọ ịgba ama na ọ na-anata ọgwụgwọ ma na-aṅụzụ ọgwụ ya n’uju kwa ọnwa rụọ ọnwa 12.

    Ọkaikpe nọ n’isi ikpe a kwuru na akwụkwọ nnyocha ahụike otu ikpe nke JCA Idachaba wetere n’ụlọikpe gosiri na ọgụgụ isi nwaada Sufyan ezuchaghị oke ya mere na ọ meghị ihe ọ mere n’anya ọcha.

    Cheta na na mbido ọnwa a nwaada Sufyan zịpụtara ozi site n’akara Twitter ya na ndị yi akwa ndị uweojii tọrọ ya na mmadụ 16 ndị ọzọ n’Abuja.

    E merecha hụ ya n’otu ụlọọwgụ dị na Legọs steeti.

    Otu onye ikpe na-ekpechitere nwaada Sufyan bụ Idachaba rịọrọ ka enye nwaada a ohere mgbaghara pụrụiche n’ihi ọ nweturu obere nsogbu ụbụrụ isi dịka akwụkwọ nnyocha ahụike ya siri gosi.

    Arịọrọ Idachaba gbadoro ụkwụ n’akụkụ akwụkwọ iwu Naịjirịa nke akara 44 nke kwuru na ndị nwere nsogbu ụbụrụ isi nakwa ụmụaka enweghị ike ịga nga mana ga-anata ntaramahụhụ ndị ọzọ.

    Ọkaiwu nwaada Sufyan bụ Chinyere Moneme kwuru na obi dị ya mma maka mkpebi ụlọikpe a mere n'okwu a.

  13. Russia ka nwere atụmatụ ijibido ọtụtụ mpaghara Ukraine – Ngalaba oke amamihe mba Amerịka, Russia na ahazigharị atụmatụ agha ha dịka ndị agha Ukraine na-akụsa ndị agha ha

    Ngalaba nnyocha na oke amamihe nke ndị agha mba Amerịka ekwuola na onyeisiala mba Russia bụ Vladimir Putin ka nwere atụmatụ ịjibido ọtụtụ akụkụ Ukraine.

    Ndị isi ọrụ nchekwa mba Amerịkana-ekwu na agbanyeghị na agha dị n’etiti Russia na Ukraine emetụtala ndị agha mba Russia nke ukwuu na Russia ka nwereike iji nwayọ nwayọ jibido ọtụtụ akụkụ Ukraine.

    Onyeisi ngalaba oke amamihe mba Amerịka bụ Avril Haines kwuru na agha a nwereike ịga n’ihu ruo oge tere aka.

    N’ọnwa Maachị, nnyocha otu a gosiri na mba Russia hazigharịrị atụmatụ agha ha ka ha jibodo mpaghara Donbas dịka atụmatụ ha ijibido mpaghara Kyiv na obodo ndị ọzọ na mba ahụ achịtaghị aja.

    Haines kwusiriike na atụmatụ Putin bụ ịhụ na ha jiboro ọtụtụ akụkụ mba Ukraine dịka ọ gara n’ihu kwuo na atụmatụ a agaghị adịrị ha mfe na nso nso a.

    Dịka Russia na-agba mbọ ijibido mpaghara Donbas, Putin ekwuola na ndị agha Ukraine gburu ọtụtụ ndị agha nke ha aghara aghara na mpaghara ahụ.

    Agbanyeghị nke a, ndị agha mba Russia ejibodola obodo Severodonetsk dị na mpaghara ahụ.

    Nwaada Haines kwukwara na dịka atụmatụ Russia anaghị aga etu ha siri chee, na ugbua na ha na-ahazigharị atụmatụ ha iji ụzọ ndị ọzọ dị iche iche were buso Ukraine agha nke gụnyere iji intanetị agbasa ozi ugha megide Ukraine.

    O kwuru ihe ndị a n’ụbọchị Wenezde dịka ndị isi otu Nato kwusiriike na ha ga-aga n’ihu kwudoro mba Ukraine n’agha a.

  14. Alụmdinanwunye Funke Akindele na di ya bụ JJC Skillz akwasaala, Alụmdinanwunye ndị a ma ama abụọ gbarala afọ isii kwasara na nso nso n'ihi nsogbu "na-enweghi ngwọta"

    Di onye ejije Nollywood a ma ama bụ Funke Akindele ekwuola na alụmdinanwuye ya na nwunye ya akwasala.

    JJC Skillz depụtara n’akara Instagram ya na ha abụọ kpebiri ịgawara onwe ha.

    N’ozi ya o dere: “Mgbe alụmdinanwuye anyị na-aga n’ihu anyị mekọrọ ọtụtụ ihe ọma ọnụ ma mmụọ ụmụ abụọ maramma”

    Ọ gara n’ihu kwuo na afọ abụọ gara aga taara ha ezigbo akpụ dịka di na nwunye.

    JJC Skillz kwukwara na nsogbu dị n’etiti ya na nwunye enweghịzị ngwọta.

    O dere: “Ama m na anwara m ike m imezi nsogbu dị n’etiti anyị mana ọnọdụ anyị enweghịzị ngwọta”

    O kwukwara na ọnwa atọ gara aga, na nwunye ya bụ nwaada Akindele gwara ya si n’ụlọ ha pụọ, ewezuga emume AMVCA ha abụọ gakọrọ ọnụ, ha abụọ enwebeghị ike nọkọọ n’udo.

    JJC Skillz kwukwara “Ana m ezịpụta ozi a ka o doo ọha anya na anyị abụọ na-ebizi ndụ anyị n’iche n’iche”

    Ka ọ dị ugbua, Funke Akindele etinyebeghị ọnụ n’okwu a.

    Akụkọ ka na-abịa.

  15. Ferdinand Marcos Jr: Eduola ya n'ọkwa onyeisiala Philippines, ọ ga-anọchịanya Duterte, Sara Duterte, bụ nwa onyeisiala na-apụapụ ka a na-anabata dịka osote onyeisiala.

    E duru Ferdinand Marcos Jr n'iyi ọrụ dịka Onyeisiala ọhụrụ ndị Philippine na mmemme na Manila, o meririla Onyeisiala na-achịachị bụ Rodrigo Duterte.

    Na mmemme ịṅụ iyi ọrụ, ọ dịka nlọghachịte azụ ndị ezinaụlọ Marcos na ndọrọọchịchị ndị mba Philipines, dịka achụpụrụ ha n'ọchịchị site na ngosi iwe ndị mmadụ n'afọ 1986.

    Maazị Marcos nke abụọ - nke a kpọrọ Bongbong - meriri ntuliaka site nke ahgụghị azụ ya anya n'ọnwa gara aga (May).

    Maazị Marcos nke abụọ ṅụrụ iyi ọrụ n'elekere 12 (bụ elekere 0400GMT) na nnukwu mmemme na National Museum.

    Nwunye ya na ụmụ ya nwoke atọ nọ ya n'akụkụ ka o si eferela ndị mmadụ aka ma na-achịtụ ọchị ka ọ na-ekiri ndị na-eme mmemme ndị agha na mmegharị ahụ dị icheiche.

    N'okwu ya nke mbụ ya, o kelere mmadụ niile maka inye ya nkwado ha ihe ọ kpọrọ ""Ọ bụrụla m ihe ukwuu kacha na ntọala ọchịchịonyekwuouche ya ndị mba Philippine."

  16. Otu gwongworo adapịala ụgbọala na ọtụtụ ụlọahịa n'Aba

    Otu gwongworo bụ ngwa e ji arụ akwa emebiela ọtụtụ ụlọahịa nakwa ụlọoriri dị na Rivers Layout n'okpuruọchịchị Aba South n'Abia steeti.

    Akụkọ kwuru na ụgbọala ukwu ahụ mịpụrụ ọkwọ ụgbọala n'aka ma kụpịa ụlọahịa ahụ ndị dị nso n'ụzọ.

    O nweghi onye nwụrụ n'ọdachi ahụ mgbe akụkọ a na-apụta mana ndị nọ nso n'ebe ahụ na-agbalị ịkpụpụ gwongworo ahụ.

  17. Unu abọọla chi?

    Anyị na-anabata unu na-asị unu nnọọ na peeji anyị taa.

    Chebiri anyị maka akụkọ ndị dị mkpa ka o si metụta gị.

    Ụbọchị gaziere gị nke ọma.

  18. Jan 6 hearings: Ihe iribaama onye rụburula Donald Trump kọọrọ ndị ikpe maka ya, Ruo ugbua, ndị ụlọomeiwu Amerika na-enyobaanya na ngagharịiwe e mere n'ụbọchi Jenụwarị 6, 2021, o nwere ihe ndị mmadụ anụbeghị. Ya bụ olu onye dịịrị Onyeisiala Donald Trump nso nwereike ịgwa ndị mmadụihe na-eme na White House tupu makwa mgbe ya bụ mwakpo mere.

    Cassidy Hutchinson, bụ onye ọrụ na White House Chief of Staff Mark Meadows gwara ụlọikpe ihe ndị mmadụ na-achọ ịnụ. Ihe ọ gwara ndị na-ekpe ikpe gosiri mkpamkpa niile Trump kpara gunyekwara ebido niile e boro Trump na ọ chọrọ ịnapụ ya aka ụgbọala n'ihi na ọ gwara ha ka ha kpọga ya Capitol mgbe ha jụrụ, ọ sị na Onyeisiala Trump na ọkwọ ụgbọala bụ onye ọrụ nchekwa bụ onye ọrụ secret service bidoro zọwa aka ụgbọala maka na ọ chọrọ iji aka ya nyaa onwe ya gaa Capitol.

    Nwaanyị ọma Hutchinson gbakwara aka ebe na Maazị Meadows gwara ha na o chere na "ihe ga-adịkwa njọ ma akpachaghị anya". Ọ sịkwa na Donald Trump onwe ya ma na ndị nsonso ya ga-agbakọ n'ụtụtụ ahụ n'akụkụ White House ji egbe maka na ndị ọrụ nchekwa Secret Service officers chụrụ ha gaa Capitol.

  19. Ụtụtụ ọma ụmụ Igbo!!!, Ihe ọma niile unu na-achọ ka unu ga-enweta taata

  20. Ihe ruru mmadụ atọ anwụọla ebe ndị ọzọ meruru ahụ n'ụgbọoloko chipuru na obodo Missouri n'Amerịka

    Ihe ruru mmadụ atọ nwụrụ ebe ọtụtụ ndị ọzọ mere ahụ ebe ụgbụoloko chipuru n'obodo Missouri dị na mba Amerịka.

    Ya bụ ụgbọoloko bụ ihe ruru mmadụ 243 site Los Angeles na aga Chicago mgbe o chipuru n'okporo ya n'akụkụ Mendon.

    Mpakara ya bụ ụgbụoloko asaa bụ ihe chipuru n'okporo mgbe ọ fọrọ nkeji iri na asatọ ka ọ kụọ elekere mbụ nke ehihie.

    Ndị ọrụ gbatagbata agawalarị ebe ahụ ịzọ ndụ.

    Otu jikọtara ndị ọrụ ụgbọoloko ebe ahụ bụ Amtrak sị na "otu ụgbọala kwuchiri ya bụ ụgbọ ụzọ n'ebe ahụ".

    Ndị ọrụ nchekwa na Missouri sị na ọ bu mmadụ abụọ nọ n'ụgbọ ahụ na otu onye nọ n'ụgbọala nwụrụ.

    Ndị ọrụ ambulansi ebe ahụ sị na mmaọ̄ụ iri na ise meruru ahụ.