Israel Adesanya akụpụla Jarred Cannonie mkpụrụ ọkwụrụ n'anya n'asọmpị UFC middleweight championship, Nwaafọr Naịjirịa bụ Israel Adesanya egosila ogbo ya onye mba Amerịka na ọ bụghị mmanwụ a na-akwa aka
Onye egwuregwu mgba nke Ultimate Fighting Championship a ma ama bụ Israel Adesanya meriri ogbo ya bụ Jarred Cannonie n’asọmpị UFC middleweight championship dịka mmeri a mere ka Adesanya nọsịeike n’ọkwa onye nke mbụ n’asọmpị ahụ ugbua.
Asọmpị mgba a nke a gbara n’ama egwuregwu mgba nke T-mobile Arena dị na Las Vegas mba Amerịka n’isi ụtụtụ Sọnde mere ya ugboro ise Adesanya na-anọsịke n’ọkwa mmeri a.