You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Amerịka egbuola Ayman al-Zawahiri bụ onyeisi otu al-Qaeda

E gburu ya n’isiobodo Afghanistan bụ Kabul n’ụbọchị ụka dịka otu nchekwa mba Amerịka nke CIA wakporo be ya.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chukwunaeme Obiejesi

  1. Unu abọọla chi?

    Ndewonu maka isonye anyị n'ụtụtụ a.

    Anyị ga-ewetara unu akụkọ ndị dị mkpa si ala Igbo, Naịjirịa nakwa mba ụwa niile.

    Daalụ nu.

  2. Ndị 'transgender' ga-agbali bọọlụ n'otu ụmụnwoke maọbụ nwaanyị na mba Germany ugbua

    Ụmnwoke gbanwere onwe ha br nwaany mab nwaany gbanwere onwe ya br nwoke nke Bekee kpr 'Transgender', nwereike gbara otu mnwoke mab nwaany bọọl ugbua na mba Germany.

    Otu jikọtara egwuregwu bọọlụ na mba Germany German football association (DFB) kwuru na ọ bụ onye ahụ ka ọ dị n'aka ịhọ ebe ọ ga-agba, mana ha kwuru na nke a emetụtaghị asọmpi Bundesliga.

    Mgbe mbụ, ọ bụ okike onye bu pụta ụwa na ihe o dere n'akwụkwọ njirimara ya ga-ekwu ma onye ahụ ọ ga-agbara otu ụmụnwaanyị maọbụ otu ụmụnwoke.

    Mana kemgbe afọ 2018, ndị mba Germany enweela ohere ịhọrọ ma ha achọrọ ịkpọpụta okike ha n'akwụkwọ njirimara ha.

    DFB kwuru na kemgbe e ji nwee ohere a, ọnụọgụgụ ndị na-achọghị ịkpọpụta okike ha bu pụta ụwa arịala.

    "Nke a metụkwara ndị ọgbabọọlụ, mere o ji dị mkpa itinye iwu doro anya."

  3. Ndị uweojii azọpụtala nwatakịrị dị afọ 16 a ghụrụla mkpụrụanya ya, Ndị uweojii Naịjiria kwuru na onye kpara mkpamkpa a ji aghụghọ inye ọrụ ghọgbuo nwatakịrị ahụ tupu ọ kpaa arụ a.

    Nd uweojii Najiria azptala nwatakr d af iri na isii a ghptara mkpranya ya, n’obodo Dutsen Jari d na Bauchi steeti.

    N’ozi Ahmed Mohammed Wakil bụọnụ na-ekwuru ndị uweojii ziputere, o kwuru na onye ghụrụla anya nwa ahụ ghọgburu ya na ọ chọrọ inye ya ọrụ n’ugbo, mgbe ọ bịara, o were waya na-atọgbu ya tugbu ọ ghụpụ ya anya.

    O kwuru na ndị uweojii akpọgala ya ụlọọgwụ ebe ọ na-anata ọgwụgwọ.

    O kwukwara na ndị uweojii na-enyocha ya bụ ihe, mana o dobeghi anya ma aka ndị uweojii ọ kparala ndị mere ihe a.

  4. Onyeisiala Buhari eruola Kigali maka CHOGM 2022

    Onyeisiala Muhammadu Buhari atụọla ụkwụ na Kigali, isiobodo mba Rwanda ebe ọ ga-esonye nzukọ ndị isi mba ndị nọ n’okpuru Commonwealth a kpọrọ Commonwealth Heads of Government Meeting (CHOGM).

    A ga-eme ya bụ nzukọ bido na 22 ruo 26 nke ọnwa Juun a.

    Ndị so ya mee njem a gụnyere Minista na-ahụ maka mmekọrịta mba na mba bụ Geoffrey Onyeama, Minista nke steeti na-ahụ maka azụmahịa bụ Mariam Katagum nakwa Minista na-ahụ maka Nkwalite ndị mmadụ bụ Sadiya Umar Farouq.

    Amina Mohammed bụ osote onyeisi otu United Nations, sokwa na ndị ga-eso eme nzukọ a.

  5. Abụbụ ọrụ ndị nkuzi mahadum ga ha ebi - Ngige

    Gọọmentị etiti Naịjiria ekwuola na abụbụọrụ ndị nkuzi mahadum na-agba kemgbe ọnwa anọ, ga ha ebi.

    Chris Ngige bụ minista na-ahụ maka Ọrụ kwuru nke a ka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu mgbe ha mechara nzukọ ndị isi ọchịchị gọọmentị, n’ụbọchị Wenezde.

    Ngige kwukwara na ha na-atụ atụmatụ ihibe ụzọ ọzọ a ga-esi na-akwụ ndị otu ọrụ niile dị na mahadum.

    Cheta na otu jikọtara ndị nkuzi mahadum nke a kpọrọ Academic Staff Union of Universities (Asuu) malitere ịgba abụbụọrụ n'ọnwa Febrụwarị afọ 2022, mgbe gọọmentị emezughi ihe ha na-achọ n'aka ha, ọkachasị ebe ọ metụtara nkwekọrịta ha mere n'afọ 2009.

  6. Ị bọọla chi?

    Anyị na-anabata gị n'ọgbakọ anyị n'ụtụtụ a.

    Ka ụbọchị taa maara gị mma.

    Ndeewo.

  7. Ụlọọgwụ ụgbọmmiri amalitela ọrụ na Legọs steeti

    Gọọmentị Legọs ehibela ụlọọgwụ ụgbọmmiri iji nye aka n'ọnọdụ gbatagbata ahụike maka ndị bi na mpaghara osimiri na steeti ahụ.

    Ha kpọrọ nke a 'Floating Clinic Boat' na bekee, bụ nke sitere na njikọ aka nke ngala ahụike nakwa ngalaba na-ahụ maka nje osimiri.

    Ụgbọ mmiri ahụ nwere ngalaba anọ; 1) Ebe ọkwọ ụgbọ mmiri na-anọ (2) ngalaba ebe a na-edebe ndị ọrịa (3) ngalaba ebe dọkịta na-anọ , na (4) ngalaba nke ndị nọọsụ.

    Onye ji ọkwa 'permanent secretary' nke mịnịstrị ahụike bụ Olusegun Ogboye, kwuru na ụgbọmmiri ahụ ga-enyekwa aka n'ịgba ọgwụ mgbochi covid, polio, na ọrịa akpata na mpaghara ndị dị n'elu osimiri.

    Ọ kọwara na ụgbọmmiri ahụ ga-enwe ndị ọrụ ahụike abụọ n'ime ya oge niile, iji nyere ndị ọbụla nwere ọnọdụ gbatagbata aka.

    "Ngwangwa mmadụ kpọrọ akara ekwentị anyị maka ọnọdụ gbatagbata ahụike, ụlọọgwụ ụgbọmmiri anyị ga-aga bute onye ahụ ebe ọbụla ọ nọ," Ogboye kwuru.

  8. A gụpụtala ozu onye NYSC n'ụgbọmmiri kpuru na Bayelsa Steeti, Ndị uweojii sị na agụpụtala ozu mmadụ ise ugbua

      • Onye dere ya, Karina Igonikon
      • Ndị mere akụkọ a, BBC Pidgin, Port Harcourt

    Otu National Youth Service Corps, NYSC, nke Bayelsa steeti ekwuola na ọ bụ eziokwu na a gụpụtala ozu otu nwaada na-efe ala nna ya na steeti ahụ, so na ndị nwụrụ mgbe ụgbọmmiri kpuru na mpaghara Ijaw Saụt na ngwụcha izuụka a.

    Ọnụ na-ekwuru NYSC na steeti ahụ bụ Matthew Ngobua gwara BBC Pidgin na ha amalitela usoro ha ga-esi zie ezinaụlọ nwaada ahụ ozi, ma kwuo na ha ebugala ozu ya n'ụlọozu dị na Federal Medical Centre, n'isiobodo Yenegoa.

    Akụkọ kwuru na ya bụ ihe mberede ụgbọmmiri mere n'elu mmiri Otuan-Ayama, n'ụbọchị 18 nke ọnwa Juun 2022, n'ihi ọnọdụ ihu igwe ọjọọ nakwa ahụchaghị ụzọ ọfụma.

    Ụfọdụ ndị obodo Ayama kwuru na ha chọtara ozu mmadụ abụọ - nwaada nke NYSC na otu onye ichie dị afọ 70 bụ onye obodo Otuan - n'abalị Sunday, ebe o sere n'elu mmiri nso ebe ihe mberede ahụ mere.

    Onyeisioche otu jikọrọ ndị ọrụ osimiri na Bayelsa steeti bụ Ipigansi Ogoniba, kwukwara na a chọtara ozu ndị a, ma kwuo na ha achọtabeghi ozu ụmụaka abụọ nọkwa n'ụgbọmmiri ahụ.

    O kwuru na e nyefeela ozu abụọ ọzọ ha chọtara n'aka ezinaụlọ ha ka ha nwee ike lie ha.

    Domo Timi bụ nwa onye ichie ahụ a chọtara ozu ya, kwuru na ha adọnyela ozu nna ha n'ụlọozu Niger Delta Teaching Hospital dị n'Okolobiri.

    Ndị uweojii Bayelsa steeti sị na ha achọtala ozu mmadụ ise ebe ha ka na-eme nnyocha ịma ma aka ọkwọụgbọ ahụ ọ dị n'ihe mere.

  9. Nnọọ!

    Anyị na-anabata gị n'ọgbakọ BBC Igbo.

    Ka ụbọchị taa maara gị mma.

    Iseee!