Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Chibuike Amaechi na-eleta ọrụ ụzọ oloko si Legọs gawa Ibadan ugbua

      • Onye dere ya, Chiagozie Nwonwu
      • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo
    Amaechi ebe ọ nọ na Yaba

    Minista na-ahụ maka njem bụ Chibuike Rotimi Amechi nọ na Legọs ugbua ebe ọ gara njem nleta etu ọrụ si aga n'ụzọ oloko si Legọs gawa Ibadan.

    Ya ndị na-elekọta ya bụ ọrụ bu ụzọ gaa n'ọdọụgbọoloko nke dị na Yaba tupu ha-esi ebe ahụ gawa nke dị n'Agege na mpaghara Legọs

    Lee photo etu o si aga dịka anyị si hụ ya.

    Amaechi ebe ọ nọ n'Agege
    Amaechi n'ọdọ ụgbọoloko Iju

    Ọ gakwara n'ọdọụgbọoloko nke dị n'Iju dị na mpaghara mpụta Legọs.

    Cheta na Amaechi kwere nkwa na gọọmentị etiti na-akwado ịgbape njem ụgbọoloko nke ga-esi nke si Legọs gawa Ibadan dị n'Oyo steeti.

    Ọ bụ ya bụ ọrụ ka ọ bịara Legọs ịleta ma marakwa ebe arụrụ ya be.

    Ụzọ ụgbọoloko a ka na-arụ arụ
  2. Mmadụ 212 ebutela coronavirus ọzọ na Naịjirịa

    Ngalaba na-ahụ MAKA mgbochi ọrịa na Naịjirịa bụ "Nigeria Centre for Disease Control" (NCDC) ekwuola na nnyocha ọhụrụ ha mere gosiri na mmadụ 212 ọhụrụ ebutere coronavirus ọzọ.

    Nke a butere ndị ọrịa ahụ fesarala mmadụ 61,194.

    Mmadụ 52,304 n'ime ha agbakeela ma laa be ha ebe mmadụ 1,119 lara mụọ site n'ọrịa a.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  3. Ụtụtụ ọma ụmụ Igbo

    Daalụ nụ maka ịsonye anyị taa.

    Anyị ga-ewetara unu akụkọ niile dị mkpa gbasara ihe na-akpọtụ na Naịjirịa na mba ndị ọzọ.

  4. I meela wee nọnyere anyị taa

    Ụbọchị nta ka anyị chụọ n'owere nchị.

  5. Gere akụkọ gbasara coronavirus n'otu nkeji

  6. Zabaleta awụsala ọwa n'ịgba bọọlụ

    Zabaleta

    Ebe foto si, Twitter/Zabaleta

    Pablo Zabaleta bụ nwaafọ Argentina gbaara Manchester City na West Ham bọọlụ awụsala ọwa.

    Zabaleta dị afọ iri atọ na ise gbara bọọlụ afọ iri na asatọ ma bulie ọtụtụ iko.

    N'ozi o wepụtara n'elu Twitter ya, o kelere nd mmadụ maka nkwado ha nyere ya n'ime afọ 18 ahụ ọ gbara bọọlụ, ma kelekwa ndị klọb, ndị otu ya n'egwuregwu bọọlụ, ndị nchịkọta niile chịkọtara ya nakwa ndị ọzọ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  7. Idemmiri achụpụla ndị mmadụ n'obodo Unagboke Inyimagu dị n'Ebonyi steeti

    Ọtụtụ ezinaụlọ dị n'obodo Unagboke Inyimagu dị n'Abakaliki dị n'Ebonyi steeti na-achọ ebe ha ga-edebe isi ha dịka oke idemmiri nyere ha ọsọ n'ụlọ ha.

    Mmiri tojuru n'ọtụtu ụlọ gụnyere ụlọụka nakwa ụlọakwụkwọ dị n'obodo ahụ.

    Aha onyonyo, Etu idemmiri si chụpụ ndị Unagboke dị n'Ebonyi steeti

    Onyeisi ụlọakwụkwọ praịmarị Unagboke bụ Oriakụ Bosa Clement, kwara arịrị sị na ha anaghị aganwu akwụkwọ n'ihi oke idemmiri a, ma kwuo na ha ataala ezigbo ahụhụ.

    Igwe Emmanuel bụ otu okenye nọ n'obodo ahụ kwuru sị na oke idemmiri a si n'akwammiri a na-arụchaghị arụcha dị nso ebe ahụ, ma na-akpọku gọọmentị ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka.

    Idemmiri Ebonyi steeti
    Idemmiri Ebonyi steeti
    Idemmiri Ebonyi steeti
    Idemmiri Ebonyi steeti

    Igwe obodo ahụ bụ Sunday Nwokpuru kwuru na ugbo ọ kọrọ ji, osikapa na akpụ ruru ala 100 lara n'idemmiri a, dịka o kwukwara na mmiri a achụpụla ndị mmadụ n'ụlọ.

    Obasi Peter bụ onyeisi ndị ntorobịa n'obodo ahụ kpọkuru gọọmentị ka ọ gbatara ọsọ enyemaka.

  8. Ndi ọrụ gọọmentị na Mali emeela ngagharịiwe maka ndị otu ha a nwụchiri

    Narị kwa narị ndi ọrụ gọọmentị na mba Mali mere ngagharịiwe n'isi mba ahụ bụ Bamako iji kpọọ ka atụghapụ ndị ọrụ ọchịchị ime obodo ndị oji egbe ji.

    Ndị a na-eme ngagahrịiwe gara ụlo ọrụ Praịm Minista mba ahụ ga-enye akwụkwọ ha dere mkpesa ha.

    Ha sị na ihe karịrị mmadụ iri na-arụ ọrụ n'okuru ọchịchị ime obodo nọ n'aka ndị oji egbe.

    N'izuụka gara aga, ndị oji egbe a tụghapụrụ otu onye na-arụ ọrụ enyemaka si mba Frans.

    Nwaanyị a aha ya bụ Sophie Pétronin dị afọ 75. Ha tughapukwara onye zọbụru ọkwa onyeisiala mba ahụ bụ Soumaïla Cissé, 70,

    Ntughapụ ndi so n'ime nkwekọrịta ndi oji egbe a na gọọmentị mba ahụ gụnyere ịtụghapu ndị otu ha ruru 100 no n'aka gọọmentị Mali.

  9. Ọgbakọ ndị gọvanọ agbarụrụọla ihu maka etu e ji wepụta SWAT

    Ọgbakọ ndị gọvanọ Naịjirịa a kpọrọ "Nigeria Governors’ Forum" (NGF) na Bekee gbawala onyeisi ndị uweojii Naịjirịa bụ Mohammed Adamu na oge oji wepụta ngalaba ọhụrụ a kpọrọ "Special Weapons and Tactics Team" (SWAT) adabaghị ma ncha.

    Aka na-achịgasị steeti dị iche iche a kwuru nke a dika Maazị Adamu na-akọwara ha ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa dika ha na-eme nzukọ nke 18 ha n'elu ịntanetị.

    NGF, n'ozi onyeisi ha bụ Kayode Fayemi nke Ekiti steeti binyere aka, sị na ha tinyere ọnụ n'ọtụtụ ihe na-eme na Naịjirịa ọkachasị ngagharịiwe na-ame maka mkpagbụ a na-ebo nagalaba Bekee kpọrọ "Special Anti-Robbery Squad" (SARS) naka nwị uweojii ọzọ.

    Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu nke Legọs dekwere nkwekọrịta ha nwere na Nzukọ ahu n'akara Twitter ya dịka ọ na-ekwu na ha kwenyere n'ihe ndi ntoroobịa na-eme.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Fayemi n'onwe ya tinyere akwụkwọ ozi ha n'akara ya

  10. Nzụkọ gọọmentị etiti na ASUU amịtabeghi mkpụrụ

    Ụmụ akwụkwọ Mahadum

    Ebe foto si, Getty Images

    Akụkọ na-ekwu na gọọmentị etiti ekweela ịmapụta ego ruru ijderi irii atọ iiji kwụ ndị nkuzi mahadum ụgwọ.

    E kwukwara na gọọmentị etiti kwere nkwa ịmefu ego ruru ijeri iri abụo n'iwulite ngalaba agụmakwụkwọ na Naịjirịa.

    Nke a pụtara ihe dịka gọọmentị etiti nakwa otu ndị nkụzị Mahadum nwechara nzụkọ imeụlọ.

    Onye ndụ ndị nkuzi bụ Biodun Ogunyemi kwuru na ọ ga-ebugara ndị otu ya nkwa ndị gọọmentị kwerela ka amara ma ọ masịrị ha tupu e nwee nkwekọrịta ọbụla.

    Adọtịkwuru nzụkọ ahụ rue ụbọchị iri abụọ na otu n'ọnwa Ọktoba.

  11. Twitter nwere nsogbu n'abali Tọzde: Lee ihe mere

    Ọtụtụ mmadụ na Naịjirịa malitere iti mkpu na akara Twitter ha adịghị emekpe n'ọnụ ụtụtụ taa.

    Ndị mmadụ malitere ikwu na onwereike bụrụ na gọọmentị Naịjirịa agbachiela ya bụ ogige ịntanetị.

    Mana, ihe mere bụ na Twitter nwere nsogbu na tecknuzu ha ji arụ ọrụ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Ha si na ha na-agba mbọ ịhụ na mmadụ niile wetere ohere imepe akara Twitter ha na nsogbu adịghị.

    Ha kwukwara na ha ahụbị̄ghị ama na ọ bụ ndi mmadụ wakporo ha ma kpata ihe a mere.

    Ọ bụ site n'elekere iri nke abalị ka ụfọdụ ndi malitere kwuwe na ha anaghị abanwu akara Twityter ha NA naịjirịa.

    Mana ugbua, ọtụtụ sị na ọ gbapeela.

  12. Unu efoola chi?

    Anyị ji n'aka na unu tetara ọfụma!

    Dọnyerenu anyị taa maka akụkọ ndị dị ọkụ ka o si dị ọkụ.

  13. Ka chi bọọ

    I meela wee nọnyere anyị taa.

    Ka chi bọọ.

  14. Ndị kpuruisi mere ngagharịiwe n'Enugwu steeti

    Ndị kpuruisi emeela ngagharịiwe n’Enugwu steeti iji gwa gọọmentị na obi adịghị ha mma etu ha si gbaghapụ ha n'ihe gbasara ọdịmma ha na steeti ahụ.

    Ha mere emume taa bụ ụbọchị e ji echeta mkparaọcha nke na-eme ka ije dịrị ndị kpuru isi mfe.

  15. Naịjirịa bụ sọsọ mba n'Afrịka Amerịka gụpụrụ n'atụmatụ 'visa lottery nke 2022

    Ọkọrọtọ Amerịka

    Ebe foto si, Getty Images

    Mba Amerịka amachiela ndị Naịjirịa isonye n'atụmatu eji anabata ndị mmadụ na mba ahụ a kpọrọ 'visa lottery nke 2022.

    Ọ bụ na webụsaịtị gọọmentị Amerịka ka e tinyere ya na Tọzde.

    Akwụkwọ ahụ dị peeji 19 Bekee kpọrọ "2022 diversity immigrant visa program (dv-2022)".

    Ọ sị: “N'Afrịka, ndị Naịjirịa etozughị insonye mee ịgba chaa chaa visa nke afọ a."

    Mana, ndị si mba Afrịka ndị ọzọ tozuru isonye n'atụmatụ a.

    Gọọmentị Donald Trump na-agbasi mbọ ike ịkwụsịtụ ndị mmadụ isi ofesi bata Naịjirịa.

  16. Gọvanọ Obiano achụọla James Nwafor n'ọrụ

    Gọvanọ Obiano

    Ebe foto si, Facebook/ABS

    Gọvanọ Willie Obiano bụ aka na-achị Anambara steeti achụọla James Nwafor bụbu onyeisi otu Special Anti-Robbery Squad (SARS) Awkwuzu n'ọrụ dịka onye enyemaka pụrụiche ya.

    Don Adinuba bụ kọmishọna mgbasaozi nke Anambara steeti gwara BBC Igbo nke a n'ekwentị.

    Nke a na-eso okwu Gọvanọ Obiano gwara ndị bu ngagharịiwe maka nkwụsị SARS garuo n'obi gọọmentị n'ụtụtụ Tọzde bụ Ọktoba 15, na a ga-anapụ Nwafor ọrụ ya ma kwuo ka a gbaa ya akwụkwọ n'ụlọikpe.

    Obiano kwuru na ọ na-anụ maka mmegbu ndị SARS na-eme ndị ntorobịa na Naịjirịa, ma too Onyeisiala Muhammadu Buhari ike maka ikposa SARS dịka ndị ntorobịa si chọọ ma gee atụmatụ anọ ha wepụtara maka imezi ngalaba ndị uweojii.

    Obiano gara n'ihu kwuo na ọ ga-ehibe otu ga-elebanye anya n'ihe banyere akụkọ mmegide ndị SARS a megidere ndị mmadụ n'afọ ole na ole gara aga.

    Ọ họpụtara otu nke Ọkaikpe V.N Umeh nọ n'isi ya bụ ndị ọ sị ga-ekpokọta ihe ha chọpụtara n'afọ 30 na-abịa.

    Ndị ga-esonye na ya bụ ọgbakọ gụnyere:

    • Ndị na-anọchite anya otu ụmụakwụkwọ Anambara steeti
    • Ndị isi na-anọchite anya ndị ntorobia si na Sinetorial Zoonu atọ dị na steeti ahụ
    • Otu onye na-efe ala nna ya na steeti ahụ
    • Onye ga-anọchite anya ndị ntorobia nke Ohaneze Ndigbo
    • Onyeisioche ndị ụka Kraịst na steeti ahụ
    • Onye na-anọchite anya Achibishọpụ nke Katọlik Dayọsis Ọnịcha
    • Onye na-anọchite anya ndị ichie n'Anambara steeti

    WDGZ.

    O kwuru na otu a ga-enyocha ebubo oke ogbugbu a na-ebo James Nwafor oge ọ bụ onyeisi SARS n'Awkwuzu.

    O kwuru na ọ bụrụ na a chọpụta na ikpe mara ya, na a ga-akpụpụ ya ụlọikpe.

    Gọvanọ Obiano gakwara n'ihu gwa Kọmishọna uweojii steeti ahụ na ya nyochagharịa ndị niile ndị uweojii ji eji na steeti ahụ, iji hụ na ikike dịịrị onye ọbụla rutere ha oge ọbụla.

  17. Gịnị bụ Anonymous?

    Ndị otu na-awakpo ọdọ ịntaneti a kpọrọ Anonymous ekwuola na ha awakpoola ọtụtụ website gọọmentị Naịjirịa iji kwado ndị na-eme ngagharịiwe na mba ahụ.

    N'ozi ha tinyere n'akara Twitter ha, otu eji ụdịrị agwa mara n'ụwa dum si na ha na-akwado ngagharịiwe na Naịjirịa.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Kedụ ndị bụ Anonymous

    Ndị otu a enweghi ihe maọbụ onyeisi.

    Mkpụru okwu ha ji aga bụ "anyị dị igwe", nke ha ji atụ aka na ọtụtụ mmadụ so n'otu ha.

    Dịka ha enweghị ndị ọchịchị, onye ọbụla nwereike sio na ya so n'otu a.

    Nke mekwara ka ndị so otu a nwee ebumnuche dị iche iche, nke mere ha enweghị olileanya otu.

    Mana, ha bụ ndị na-agba mbọ maka ndị ji aka ike achịgbụ ndị mmadụ.

    Ha na-eji ịnara ndị mmadụ ogige ịntanetị ha eme ihe a.

    Ọ bụ ihu nwoke a kpọrọ Guy Fawkes, bụ onye wuru ewu maka akwụkwọ Alan Moore dere a kpọrọ V for Ventetta.

    N'akwụkwọ ahụ, otu nwoke na-eyi ihu ahụ dịka ọ na-agba mbọ ịkwatu gọọmenti nrụrụaka karịrị na ya.

  18. Ndị agha etinyela ọnụ n'okwu ngagharịiwe END SARS

    TY Buratai

    Ndị agha Naịjirịa adọọla ndị na-eme ngagharịiwe aka na ntị ma kwuo ha kwụsị ịme ngagharịiwe.

    Ha kwukwara na ha aghaghị ịchekwa ọchịchị onyekwuoucheya ma o rue na ya.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  19. Unu abọọla chi?

    Nnọọ nụ, soro anyị na peeji anyị taa maka akụkọ ndị dị mkpa n'ụwa niile.

  20. Ka chi foonụ