Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya
Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Ndi amakaekwu agbabuola onye omeiwu na mba Gana
Ebe foto si, Parliament nke Ghana
Na Ghana akụkọ
na-eru anyị ntị ugbua bụ na ndị omekome gbagburu otu onye omeiwu mba ahụ.
Ndị ajọ mmadụ a gbagburu Ekow Quansah Hayford n'ụzọ
ebe o sị emume ịchụnta votu patị ha alọta n'isiututu Fraịde.
Akụkọ kwuru na ndị amakaekwu mmadụ isii ji egbe nwakporo ya bụ nwaamadị na-anọchị anya ndị Mfantseman ka ọ na-alọta ebe elekere nke mbụ ụtụtụ Fraịde.
Ọbaozi ntaakụkọ ndị Joy Online si na ya bụ nwaamadị kọwaara ha onwe ya tupu ha agbaa ya ọnụ egbe abụọ sị ya na ọ bụ ya bụtere nsogbu dị na Gana.
Redio Citi Fm kwukwara na ha gbakwara draịva ya egbe, mana ọ na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ ugbua. Onweghị ihe metutara mmadụ atọ ndị ọzọ so ha.
Cheta na ntuliaka ndị Gana na-abịa n'ụbọchị asaa nke ọnwa Disemba.
Ụmụnwaanyị emeela ngagharịiwe na Malawi
Ebe foto si, European Photopress Agency
Ọzọ dịka ibe ya,
n'Afrịka, bụ na ndị mmadụ emeela ngagharịiwe maka ihe ha kpọrọ ịkpaoke ụmụnwaanyị
n'owuweọrụ na gọọmentị Malawi.
Ndị mere ya bu ngaghịiwe sị na
onyeisiala ha bụ Lazarus Chakera eweghị ụmụnwaanyị n'ọrụ dịka iwu kwesiri.
Iwu be ha kwuru na ọnweghị ụmụnwoke maọbụ ụmụnwaanyị ga-akarị pasent iri isii n'ọchịchị ebe ha si na ụmụnwaanyị nọ n'ọchịchị erughị pasent iri atọ.
Ndị kpokobara ya bụ ngaghrịiwe bụ ndị Women’s Manifesto Movement sị na onyeisiala ha anaghị eme ihe ha turu anya.
Nke a mere ka onyeisiala ha si njem abali atọ o mere na Tazania gbalata na mberede.
Ụlọikpe na Port Harcourt amaala onye mgbuisi, Gracious David-West, ikpe ọnwụ
Ebe foto si, Other
Ụlọikpe na Port Harcourt, River steeti, ekpebiela ikwugbu ya bụ nwaamadị na-egbu ụmụagbọghọ na họtelụ n'Igweọcha, River steeti.
E kpere David-West ikpe ọchụ n'isi ụmụnwaanyị itoolu ya na ịkpankata igbu onye ọzọ.
Onye okaikpe kpebiri ya bụ ikpe bụ Jọstis Adolphus Enebeli kpebiri na ọ bụ Graciuos David-West gbara afọ iri anọ gburu Maureen Ewuru, Jennifer Nwokocha, Blessing Effiong Linda Warifa Samuel, Dorcas Francis, Kelechi Bridget, Onuoha Rose, Samuel Anthonia Ibe ma kpakwaa nkata igbu Benita Etim.
Ikpe David-West malitere na Pọtakọtụ kemgbe ọktoba 2019 mgbe ndị uweojii kpaara ya aka n'ụbọchị iri na itoolu nke ọnwa ahụ.
Onweghị onye gosiri onwe ya maka ịgwado David-West maọbụ ndị o gburu kemgbe ya bụ ikpe malitere.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post
FBI akụsaala otu chọrọ ịtọrọ Gọvanọ obodo Michigan
Ebe foto si, Ụlọọrụ Antrim County Sheriff
Nkọwa foto, Adam Fox, Brandon Caserta, Daniel Harris, Kaleb Franks, Ty Garbin, Eric Molitor, Michael Null na William Null.
Ngalaba nchekwa na nyocha nke mba Amerịka bụ Federal Bureau of Investigation bụ FBI n'aha ịchafụ ya ekuwola na ha ejidela otu chọrọ ịtọrọ ma wepụ Gretchen Whitmer dịka Gọvanọ steeti Michigan.
Whitmer na-akpasu ọtụtụ ndi mmadụ iwe bụ ndị na-ekwenyeghị na coronavirus dị, dịka o tinyere iwu ụfọdụ si siri ike maka nchekwa coronavirus.
Ndị ọrụ gọọmentị sị na mmadụ isii a bụ ụmu nwoke kpara nkata ijide Whitmer ma kpee ya ikpe adịgboroja maka ebubo imegide mba Amerịka.
Mmadụ isi a bụ Adam Fox, Barry Croft, Kaleb Franks, Daniel Harris, Brandon Casert na Ty Garbin bụ ndị agbara akwụkwọ n'ụloikpe maka ịbụ otu oyi egwu na iso na otu ọjụọ.
Atụmatụ 'World Food Programme' eritela ntụrụgo Nobel Peace Prize nke afọ 2020
Ebe foto si, Reuters
Kọmịtị na-ahụ maka ntụrụgo World Food Programme enyela atụmatụ akpọrọ 'World Food Programme' nturugo ahụ nke afọ 2020.
Ha kwuru na atụmatụ ahaụ gbara mbọ ịkwụsị ndị mmadụ iji agụrụ ebute nkewa na agha n'eitit ndị mmadụ.
Otu onye na-ekwuchitere otu ahụ kwuru na ọ bụ "oge afọ ojuju" dịrị ha.
Echere na atụmatụ ahụ akpọrọ WFP na-enyere ihe ruru nde iri itoolu na asaa aka na mba ụwa ruru iri asatọ na asatọ n'ụwa.
Nturugo ahụ pụtara Krona nde iri.
Ndị na-eme ngagharịiwe egbuola otu onye ụweojii na Delta
Ndị uweojii ebola ndị na-eme ngagharịiwe na Delta steeti ebubo ịgbu otu onye nke ha ma zurukwa otu egbe AK-47.
Ha kwuputara nke a n'akara Twitter ha ma kpoo oku ka ọgbaghara na mwakpo si na ngagharịwe a mapụta kwụsị kpam kpam.
Onyeisi ndị uweojii bụ M.A. Adamu katọkwara mwakpo na mmebi ngwa ọrụ ndị uweojii nke mere n'obodo Ughelli dị na steeti ahụ.
Cheta na ọ bụ ihe onyonyo si n'Ughelli pụta n'ụbọchị satọde gosiri ebe ndị uweojii wakporo otu onye ntorọbịa ma buru ụgbọala ya gbapụ bụ ihe malitere ngagharịiwe na-eme ebe niile na Naịjirịa ugbua.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Nigeria v Algeria ga-akpọtụ taa
Ebe foto si, @nff/Twitter
Ọ bụ taa ka Super Eagles nke Naịjirịa na Desert Foxes nke mba Algerịa
ga-asọkọta mpi n’asọmpị enyi na enyi .
Egwu dike na ibe ya ahụ ga-amalite n’elekere
asaa na nkeji iri atọ nke mgbede na Naịjirịa.
Cheta na akụkọ na-efegharị bu na mmadụ anọ n'ime ndị Super Eagles butere ọrịa coronavirus mana otu na-elekọta bọọlụ na Naịjirịa bụ NFF pụtara kọwaa na ọ bụghị eziokwu.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Kọmịshọna uweojii nke Imo steeti akatọọla onye uweojii tiri ndị na-eme ngagharịiwe ihe
Ebe foto si, Screenshot Twitter
Kọmịshaọna uweojii nke Imo steeti bụ Issac Akinmoyede akatọọla agwa onye uweojii kpara dịka o tiri ndị na-eme ngagharị iwe nke #EndSARS ihe.
Ihe onyonyo gosiri ya bụ onye uweojii ebe ọ mara ndị na-eme ya bụ ngagharịiwe ụra n'ụbọchi Tụzde.
Akinmoyede kwuru na ya bụ agwa abụghị agwa ziri ezi onye uweojii kwesịrị ịkpa.
O kwukwara na ya bu onye uweojii ga-erite ntaramahụhụ dịrị ya maka agwa ọ kpara.
Akinmoyede gwara ndị mmadụ ka ha mee ngaharịịwe ha n'ụzọ ziri ezi.
Ndị na-eme ngagharịiwe maka SARS nọbọrọchi n'ihu Ụlọ Omeiwu Legọs
Ndị na-eme ngagharịiwe maka ngalaba uweojii Bekee kpọrọ "Special Anti Robbery Squad" (SARS na Legọs rarụrụ n'ihu Ụlọ Omeiwu steeti ahụ dị n'Alausa.
Ọtụtụ n'ime ha sị na ha agaghị ala be ha ma ya bụrụ na ha ahụghị isi ihe ha na-achọ.
Dịka ụfọdụ sonyere ngagharịiwe otiegwu RunTown na Falz haziri n'ehi na mpaghara akwa etiti Legọs, ndị nke mere nke ha na mpaghara steeti ahụ Bekee na-akpọ "Legọs Mainland".
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post, 1
Onye na-akpa ọchị eji Mr Macaroni mara so n'ime ndi a rarụrụ n'ezi.
N'agbanyeghi na ha sị na ndị uweojii bịara buru oche, ngwa egwu nakwa mkpuchi miri ha jiri nọdụ ebe ahụ, ndị ntoroọbịa a sị na ha ga-anọdụ ruo oge chi foro.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post, 4
Unu asaala chí
Igbo bụ Igbo! Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị.
Etu e si kpọọ nwafọ Naịjirịa ọkụ na mba Libia
Ebe foto si, Getty Images
Ụmụnwoke atọ batara n'ụlọọrụ ebe nwafọ Naịjirịa na-arụ ọrụ, wụọ ya mmanụ ụgbọala n'ahụ ma mụnye ya ọkụ dịka ministry ime obodo mba Libia si kwuo.
Otu United Nation sị na nke a mpụ na-enweghi isi megide ndị mbịarambịa na na Libia.
Ozi si n'aka ministry ihe na-em n'obodo n'ụbọchị Wenesde sị na a nwuchiela mmadụ atọ bụ ndị Libia e che na aka ha dị ogbugbu nwoke a.
Ha sị na ọ bụ onye akaebe kọwara etu ụmụnwoke a si bata ebe ahụ ma wakpoo ma mụnye nwoke ahụ ọkụ.
A mabeghi mpaghara onye a kpọrọ ọkụ si na Naịjirịa.
Donald Trump sị na ya agaghi eso mee nrụrịtaụka ya na Joe Biden kwesiri ime Ọktoba 15
Ebe foto si, Reuters
Onyeisala Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ya agaghi eso mee nrụrịtaụka ya na Joe Biden ga-eso mee n'izu ụka na-abịa.
Ngalaba na-ahazi nrụrịtaụka kwesiri ime n'ụbọchị 15 nke Ọktoba kwuru na Trump na Biden agaghị anọ na otu ebe mee nrụrịtaụka ha dịka Trump ka na-arịa coronavirus.
Ọ bụ na mkparịtaụka ya na ụlọ ntaakụkọ Fox news nwere ka maazị Trump kwuru na ya agaghị "egbu oge na-eme nrụrịtaụka otu onye.
Trump si na ịnọ n'ihu kọmpụta enweghị isi. "Ha ga-achabi okwu gị...anaghị m eme nrụrịtaụka ịntanetị."
Ndị achụmta vootu Trump sị na ọ bụ ịchụnta vootu ka ọ ga-eme n'oge ahụ.
Nrụrịtaụka Trump na Biden mere atụghị ọtụtụ mmadụ ụtọ makana ha malitere ịkparị onwe ha.
Onyeisiala Naịjirịa enyela Ụlọ Omeiwu akwụkwọ bọọjetị nke 2021
Ebe foto si, @BashirAhmaad
Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari enyela ndi Omeiwu mba ahu akwụkwọ mkpata na mefu nke 2021.
Tupu Buhari enye ndị Omeiwu akwụkwọ onyeisi ndi Omeiwu Ukwu bụ Ahmad Lawan sị na a ga-achabi ndị na-anọ n'ime ụlọ omeiwu maka nje coronavirus.
Ọ bụ naịra 379 ka gọọmentị sị na a ga-eji gbanwee dọla na bọọjetị a.
Ha sikwa na a ga-eji agbọ mmanụ erere dọla 40 hazie bọọjeti a.
Ọ bụ naịra 305 igote otu dọla ka e ji mee nke afọ gara aga, dịka e tinyere ego mmanụ agbịdị ka dọla 57 nke otu agbọ mmanụ.
Naịjirịa na-emepụta agbọ nde 2.18 kwa ụbọchị n'afọ 2019 mana ọ bụ nde 1.86 ka a na-empụta kwa ụbọchị.
Buhari kwuru na ọ bụ mmepe obodo ka ha ga-etinye n'uchu na bọọjetị nke 2021 a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post, 2
Buhari sị na akụnaụba Naịjirịa nwere ezigbote nsogbu sitere na coronavirus, mana agbanyeghi nke a o mere ọfụma karịa mba ndi ọzọ.
Ọ sịkwa na e nwere olieanya na akụnaụba mba ahụ agaghị eme ọfụma dịka afọ 2020 na-abịa na ngwụcha.
Buahri sị na gọọmnetị ya na-agba mbọ ị hụ ndụ dịrị Naịjirịa mfe.
Ọ sị na a ga-ebite ego ji kwalite bọọjetị a ruo ịtarị naịra anọ na ụma.
Ebe foto si, @BashirAhmaad
Ebe foto si, @BashirAhmaad
Ebe foto si, @BashirAhmaad
Etu ngagharị iwe EndSARS si aga na Legọs
Ndị mmadụ na-eme ngagharị iwe a si ka ekpochapụ ngalaba SARS, Dị uweojii ji akaike egbochi ndị na-eme ngagharịiwe n'Owere
Ọ bụ iwepu ngalaba uweojii akpọrọ SARS ka ndị mmadu kpụ n'ọlụ ugbua na Naịjirịa.
Ugbua, ndị mmadụ na-eme ngagharị iwe n'Abuja nakwa Owere asị ka gọọmentị kagbuo ndị uweojii a na-akpọ SARS.
n'Abuja ọ bụ onye zọrọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka gara aga bụ Omoyele Sowere nọ n'isi ngagharị iwe ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post, 1
Ngagharị iwe a na-emekwa na Legọs dịka ndị mmadụ na-ekwusi ike na ha achọghịzị SARS.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post, 2
No Owere, ihe onyonyo na-efegharị na Soshal midia gosiri ka otu Onye uweojii aha ya bụ Obioma O. Obi ebe ọ mara otu nwaanyi so eme ya bụ ngagharịiwe ura.
Ya bụ ihe onyonyo gosiri ọgbaaghara na-eme ebe ahụ dịka ndị mmadụ na-egbo ya bụ onye uweojii wepụtara egbe ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post, 3
Ndị uweojii azọpụtala Bisola Ajayi a tọrọ n'ụbọchị Satọde
Ebe foto si, Bisola Ajayi
Bisola Ajayi bụ onye ọkaiwu dị afọ iri abụo na ise nke a tọọrọ n'ihu be ya na Rivas steeti enwerela onwe ya.
Ndị ụweojii pụrụiche na-alụso ndị ntọ agha bụ ndị tọghapụrụ ya na onye ọzọ n'ime ọhịa ukwu dị na Etche na steeti ahụ.
Ndị uweojii kwukwara na ha anwụchiela mmadụ abụọ n'okwu a gụnyere otu onye na-azụ ahịa egbe.
Cheta na ezianụlọ Bisola malitere ịti mkpu enyemaka n'elu soshal midia mgbe a tọọrọ ya n'ihu be ya ma gbaa nne ya egbe n'abalị ụbọchị satọde.
Mba Mali atọhapụla Praịm Minịsta ha kpọchiri na nga
Ebe foto si, Getty Images
Gọọmentị mba Mali atọghapụla ndị ndọrọndọro ọchịchị na ndị agha ha kpọchiri mgbe ndị agha napụrụ ndị nkịtị ọchịchi n'ọnwa Ọgụst afọ 2020.
NDị atọhapụrụ gụnyere praịm mịnịsta ha bụ Boubou Cisse.
Etu ọ dị ugbu a, ndị a atọhapụrụ ga-anọ nsọ maka mgbe ọbụla ụloikpe chọrọ ka ha bia.
Ọ bụ n'ụbọchị Mọnde ka ndị agha ahụ weharịrị ọchịchị hiwere goọmentị nwa mgbe nta ma tinye ndị isi ndị agha n'ebe ọchịchi gụnyere nchekwa, nchịkọta mpaghara na idozi obodo.
Mpaghara ọdịda anywanwụ nọ na nzụkọ ECOWAS ewepụla mmachi ha machiri mba Mali dịka ndị agha ahụ bidoro atụmatụ ịnyehachi ndị nkịtị ọchịchi.
Ihe mere na mkparịtaụka Mike Pence na Kamala Harris
Ebe foto si, Getty Images
Ndị na-achọ ịbụ osote onyeisiala mba Amerịka bụ Mike Pence (nọ na ya bụ ọkwa) nakwa Kamala Harris (so Joe Biden azọ ya bụ ọkwa) enweela mkparịtaụka.
Coronavirus na ihe so ya nakwa etu Trump si hazie ya bụ ọrịa mgbe ọ batara mba Amerịka so na ihe ndị mmadụ abụọ ji dọrịta ụka.
Harris katọrọ ọchịchị Trump ma kwuo na ọ bụ ọchịchị kachasị kụ afọ n'ala kemgbe mba ha bidoro.
Ebe Mike Pence zaghachiri ya na usoro otu Democrats wepụtara iji lụso ọrịa coronavirus agha bụ nke ha zutere ezute nke pụtara na ha echepụtaghị ya n'aka nke ha.
Harris bokwara ọchịchị Trump ebubo maka ọrịa coronavirus ma kwuo na ha "ma maka ya kemgbe ma gaa n'ihu na-atụrụ ndị mmadụ asị".
Okwu kachasị tụ ndị mmadụ n'anya na ndọrịtaụka a bụ mgbe ijiji besara n'elu isi Mike Pence ma nozue ebe ahụ ihe ruru nkeji abụọ tupu o fepụ.