Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Jiri otu nkeji gere akụkọ gbasara mkpamkpa ọrịa coronavirus na mba Afrịka

  2. Anyị ga-akwụsị ibute ngwa nri na Rivas maka ihe e mere ndị Ugwu na Rivas- otu Arewa

    Ụgbọala bu ngwa nri a gbara ọkụ

    Ebe foto si, Usman Tudunwada

    Otu 'Arewa Consultative Forum'(ACF), ngalaba nke Rivas steeti ekwuola na ha ga-akwụsị ibute ihe oriri na Rịvas steeti nakwa mpaghara Ndịda Anyanwụ n'ihi ajọ agwa ndị a na-enyo na ha bụ ndị otu Ipob kpasara ha na steeti ahụ n'ọgbaghara so ngaagharịiwe EndSARS na steeti ahụ.

    Onyeisi otu ACF na Rivas bụ Usman Ibrahim Tunwada gwara BBC Igbo nke na mkparịtaụka ha nwere n'ekwenti,na ihe butere ya bụ mkpebi bụ na ndị Ipob wakporo ndị otu ha gbaa ụgbọala gwongworo ha ji ebu ahịa nakwa ngwahia haa ma gbuo ụfọdụ ndị otu ha.

    Ya were jụọ sị, "kedụ ihe anyị ga-eji na-ebutere ndị na-egbusisi anyị ma na-agba ngwahịa ha ọkụ nri?"

    Na nsonso a, ndị a na-eche na ha bụ ndị otu Ipob wakporo ndị Ugwu na Oyigbo dị na Rivas, mebie ngwahịa ha ma gbaa ụgbọala ha ọkụ na Oyigbo na nsonso a.

    Ka ọ dị ụgbua, enwela ụkọ ụfọdụ ngwa nri na Ndịda-Anyanwụ, ebe ọnụahịa ụfọdu nri dịka ịyabasị gbaliri elu n'ihi ụkọ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  3. Ihe mere e jiri kpụrụ Desmond Elliot n'ọnụ na soshal midia ugbua

    Desmond Elliot

    Ebe foto si, Twitter/LSHA

    Desmond Elliot bụ ome ejije Nollywood a ma ama na-anọchite anya Surulere1 n'ụlọomeiwu Legọs steeti, abụrụla okwu onye ọbụla kpụ n'ọnụ ugbua.

    Elliot sunyere ọkụ n'elu Twitter ka ihe onyonyo ebe ọ na-ekwu okwu n'ụlọomeiwu malitere ifesa.

    N'ihe onyonyo ahụ, Elliot kwuru na "ụmụaka na-eji soshal midia akpa arụ na Naịjiria" dịka ndị mmadụ na-eji ya akpọ mmadụ iyi nakwa ịkparị mmadụ.

    Ọ gara n'ihu kpọọ oku ka ndị ndị a ma ama ibe ya kwụsị ịkwanye ọkụ n'ihe na-eme na soshal midia.

    O kwukwara na a gaghị enwezi Naịjiria ọzọ n'ime afọ ise na-abịa ma ọ bụrụ na e jiri usoro a na-ebute nkewa na-aga n'ihu, ma kpọọ oku ka ndị ụlọomeiwu ibe ya gbaa mbọ hụ ihe e mere maka ya.

    Lee ihe o kwuru n'ihe onyonyo a:

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Ndị gụnyere John Ogu na-agba bọọlụ, Davido na Skales na-eti egwu nakwa ndị ọzọ tinyere ọnụ na ya bụ okwu.

    Lee ihe ndị mmadụ nwere ikwu maka ya:

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    Skip X post, 3

    End of X post, 3

    Skip X post, 4

    End of X post, 4

    Skip X post, 5

    End of X post, 5

    Skip X post, 6

    End of X post, 6

    Skip X post, 7

    End of X post, 7

    Mana ọ rịọla mgbaghara maka ịkpọ ndị mmadụ "ụmụaka" dịka o kwuru na ọ bụ maka ọtụtụ ihe e mebiri emebi ọ hụrụ wutere ya mere o jiri kwuo ihe o kwuru.

    Skip X post, 8
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 8

    Skip X post, 9

    End of X post, 9

    Skip X post, 10

    End of X post, 10

    Skip X post, 11

    End of X post, 11

    Skip X post, 12

    End of X post, 12

    Skip X post, 13

    End of X post, 13

  4. Eji m anya hụ ntị n'aka Coronavirus izuụka abụọ gara aga- Toke Makinwa, 'Ibute ọrịa coronavirus n'enweghị di atọghị m ọchị'

    Toke Makinwa

    Ebe foto si, Toke Makinwa/Twitter

    Onye ọrụ redio a ma ama bụ Toke Makinwa ekwupụtala ihe ọ gabigara dịka ọrịa coronaviris tiri ya ịgba izuụka abụọ gara.

    " Amaghị ebe m siri bute coronavirus."

    "Eso m mee ngagharịiwe EndSARS mana nke abụghị na m na-ekwu na ọ bụ ebe m si nweta ọrịa a."

    O kwuru na ya nwere njirimara ọrịa ịba mana egwu mere ya ka ya kpọọ onye ọrụ NCDC ha bịa nnyocha ahụ mana ha ahụghị coronavirus.

    O kwuru na ya ṅụrụ ogwụ ịba mana ka abalị atọ ya ṅụchara ọgwụ ịba ahụ, ahụmgbu na njibi ahụ bịara karịa nke mere ya ji nweekwa nnyocha ọzọ nke gosiri na ya nwere ọrịa coronavirus.

    O kwuru na mgbe ya na-agabiga ihe ahụ, na ihe kachasị ya njọ bụ oke echiche n'ihi na ya na-atụ egwu ọnwụ.

    O kwuru na ibute ọrịa coronavirus n'enweghị di atọghị ọchị.

    Toke kpọrọ ụmụ Naijiria oku ka ha kee nkwụcha ọkachasị ugbua ọrịa cornavirus bidokwara ikesa ọzọ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  5. Akụnaụba Naịjirịa agaghị ebunwu coronavirus ma ọ kpawa ike ebe a ọzọ - Buhari

    Onyeisiala Naịjiria bụ Muhammadu Buhari adọọla ndị mmadụ aka na ntị sị ka ha gbaa mbọ hụ na ọrịa ozuruụwaọnụ bụ Covid-19 amalitekwaghị ịkpa ike ọzọ na Naịjiria.

    N'ozi o zipuru na Twitter, o kwuru na akụnaụba mba Naịjiria a akachabeghi aka ibunwu mmechi obodo ọzọ ma ọ bụrụ na ọrịa a malite inye nsogbu ọzọ etu o si na mba dị iche iche ugbua.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  6. Ọma mma amagbuole mmadụ na Frans maka egbe ọnụ okpukperechị Alakụba

    Ozi na-eru anyị ntị n'ụtụtụ a bụ na onye ọma mma amagbuole otu onye ma merukwa ọtụtụ mmadụ ahụ na Nice dị na mba Frans.

    Onyeisioche okpuruọchịchị ebe ya bụ ihe mere bụ Christian Estrosi sị na-ejidere otu onye ana enyonyo maka mpụ a.

    Ọgbaaghara na mba Frans

    Ebe foto si, Christian Estrosi

  7. Etu ihe mberede okporoụzọ si taa isi ụmụakwụkwọ n'Awgu

    Ụgbọala ụlọakwụkwọ

    Ebe foto si, Nwabueze Nwonwu

    Ihe mberede okporoụzọ mere na njikọ ụzọ nkwọ dị n'obodo Awgu, Enugwu Steetị ataala isi ọtụtụ ụmụakwụkwọ ọtakara na praịmarị.

    Nke a mere mgbe ụmụakwụkwọ Holy Family nke ụka katọlik dị n'Awgu si ụlọakwụkwọ na-alọta ka otu ụgbọala ukwu kụrụ ụgbọala 'bus' bu ụmụakwụkwọ a.

    Ndị hụrụ ka ihe ji mee

    Ebe foto si, Nwabueze Nwonwu

    Anya hụrụ ka o ji mee bụ Nwabueze Nwonwu sị na o mere n'ebe elekere anọ nke ehihie ụbọchị Wenesde, 28 Ọktoba, 2020.

    Ọ sị na ụgbọala 'bus' ahụ bu ụmụkwụkwọ ruru iri abụọ ebe ihe ruru mmadụ atọ n'ime ha nwụrụ pịị 'ihe mberede a, ebe ọtụtụ ndị merụrụ ahụ.

  8. Gọvanọ Wike amachiela Ipob kpam kpam na Rivas Steetị

    Governor Nyesom Wike/Facebook

    Ebe foto si, Governor Nyesom Wike/Facebook

    Gọvanọ Nyem Wike nke Rivas Steetị etinyela aka n'akwụkwọ iwu machiri ndị 'Indigenous People of Biafra' (IPOB) kpam kpam na steetị ahụ.

    O kwuru nke a na Wenesde dịka ọ na-agbasaozi ma sị na steetị ya bụ nke agbụrụ niile.

    "Anyị nwere ihe niile megide atụmatụ na omume otu Ipob bụ ndị a kpọrọ otu na-eyi ndụ egwu na Rivas Steetị, ka o kwuru.

    "Ihe a bụ otu gọọmentị Naịjirịa nakwa nke mpaghara ọwụwanyanwụ machirila ọrụ, atụmatụ nakwa ọrụ ha dịka otu na-eyi ndụ egwu.

    "Ya mere m ji tinye aka n'akwụkwọ iwu ga-ahụ na a machiri atụmatụ Ipob kpam kpam na Rivas Steetị, o nweghi ihe ga-egbochi anyị ịhụ na e mere iwu."

    N'otu aka ahụ gọvanọ Wike buliri mmachi onye apụla n'ezi o tinyere na ụfọdụ mpaghara steetị ahụ gụnyere Mile 1,Mile 2, Ilabuchi, Ikokwu na ebe ndị ọzọ.

    Ọ sị na mmachi ka dị n'okpuruọchịchị Oyigbo ebe ahịa Ikokwu ka mechiri emechi.

    Gọvanọ Wike kwukwara na ọ machiela iji ọgbatumtum 'keke Napep' eme njem n'okporoụzọ ndị gbapụtara ihe na steetị ahụ.

  9. Igbo ndị ọma unu abọọla chi?

    Ekele ọma ka anyị ji anabata unu n'ụbọchị taa.

  10. Nkeji Coronavirus

  11. Amerịka ajụla ịkwado Ngozi Okonjo-Iweala maka ọkwa onyeisi WTO

    Ngozi Okonjo-Iweala

    Ebe foto si, Presidency

    Ọtụtụ akụkọ na-ekwu na a họpụtala Ngozi Okonjo-Iweala dịka onyeisi otu 'World Trade Organisation', nmana nke a abụchaghị eziokwu.

    Mba Amerịka ekweghị enye Okonjo-Iweala nkwado maka ya bụ ọkwa, kama ha kwadoro onye ya na ya na-azọ ya bụ Yoo Myung-hee onye Saut Korea.

    Dịka iwu WTO si dị, mba niile so n'otu ahụ ga-akwadorịrị otu onye tupu onye ahụ abụrụ onyeisi, ma ọ bụghị otu a, mara na a ga-emezi ntuliaka iji họpụta onyeisi.

    Ha dị mba otu narị na iri isii na anọ (164) mebere otu WTO, mana naanị Amerịka jụrụ ịkwado Okonjo-Iweala.

    Ọ bụrụ Okonjo-Iweala nwetara nkwado nke mba Amerịka taa, a gaara akpọpụta aha ya dịka onyeisi ọhụrụ nke WTO.

    Mana ka ọ dị ugbua, a ga-echezi ruo mgbe WTO ga-enwe ọgbakọ n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Nọvemba iji mara onye ga-emeri ntuliaka ahụ.

    Lee etu onye ntaakụkọ BBC bụ Andrew Walker si kọwaa ya:

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  12. Ọkụkọ egbuola onye uweojii ebe ọ na-ebụso ndị na-ehibe ọgụ ọkụkọ agha

    Ọgụ ọkụkọ na ọkụkọ

    Ebe foto si, GETTY IMAGES

    Ọkụkọ atụgbuola onye uweojii nọ na mba Philippine ebe ọ na-alụso ndị na-ehibe ọgụ ọkụkọ na ọkụkọ n'obodo Samar.

    Ọkụkọ ahụ ji ihe dịka mma na-ebe ebe a na-amakwụye n'ụkwụ ọkụkọ na-anụ ọgụ wee chawa akwara ọbara dị na mpata ụkwụ uweojii Christine Bolok.

    Nke a mere ka ebuga ya ụlọọgwụ mana ọ nwụrụ tupu e ruo ụlọọgwụ.

    A machiri ọgụ ọkụkọ na ọkụkọ n'obodo ahụ kamgbe ọrịa coronavirus dapụtachara na mba ahụ.

    Tupu coronavirus adapụta, a na-ekwe ka ọgụ ọkụkọ gaa n'ihu na mba ahụ n'ikpo ọgụ iwu kwadoro ụbọchị ụka nakwa oge ezumike dịka ụlọọrụ mgbaza ozi "Philippine News Agency(PNA) si depụta.

    Onyeisi ndị uweojii n'obodo ahụ bụ Colonel Arnel Apud kwuru na nke a bụ oge mbụ n'ime ọrụ uweojii ruru ruo afọ 25 ọ na-ahụ udiri ajọ chi a ịdakwasa onye ọrụ ya.

    Ọgụ ọkụkọ na ọkụkọ

    Ebe foto si, Getty Images

  13. Ka ụkọchukwu onye Anglican si bụrụ onyeisiala mba

    Ụkọchukwu Ramkalawan

    Ebe foto si, W RAMKALAWAN

    Ọ bụghịzi akụkọ na ụkọchukwu Wavel Ramkalawan meriri ntụliaka mba Seychelles nke afọ 2020.

    E duru ya n'ihi ọrụ oche onyeisiala n'ụbọchị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Oktoba, 2020.

    Dịka onye ụkọchukwu ọ bụ, ozi onyeisiala Ramkalawan bụkarị maka udo, nnagide, na arịrịọ ka ndị mba Seychelles jịkọta aka ọnụ maka idi n'otu mba ahụ nakwa ịkwụsị adighị n'otu esemokwu were ọtụ afọ ndọrọndọrọ ọchịchị butere.

    Mmeri ụkọchukwu a tụrụ n'anya makana ọ bụ otu pati na-achị mba ahụ kamgbe afọ 1977.

    Nke a bụkwa ugboro isii ọ na-pụta azọ ọkwa onyeisiala, ije ọ malitere kamgbe afọ 1998.

    Gọọmenti di iche iche akatọọla ya maka ụfọdụ ihe ọ na-ekwu n'ebe o na-enye okwuchukwu n'ụlọụka ya.

    N'agbanyeghị ihe ndị a niile, ụkọchukwu Ramkalawan kwuru na otu ihe na-edu ya n'ugboro ise o na-enweteghị oche onyeisiala bụ okwu Nelson Mandela(onye na-ekwuchitere ndị mmadụ ọnụ ha) nwụrụlanụ, " Onye mmeri bụ onye na-arọ nrọ na anaghịọ awụsa ọwa ya."

    Wavel Ramkalawan ji pasenti 54.9% merie Danny Faure nwetere vootu 43.5%

    Ebe foto si, Getty Images

  14. Juventus na Barcelona ga-akwata ya n'abalịa

    Ronaldo

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ronaldo gbaara Juventus ikpeazụ n'ụbọchị iri abụọ na asaa nke Septemba bụ ebe o nyere Roma goolu abụọ bụ nke ha sachara

    N’egwuregwu, Juventus na Barcelona ga-ama okaibe na asọmpi nke Champions League na-elekere asatọ nke abalịa.

  15. Etu ndị amaghị ama si gbuo nwaanyị dị ime n'Ezinifite ka o si ahịa na-alọta.

    Ụmụada Uga dị n'Anambra Steetị eburula ngagharịiwe na mkpesa gaa n'Ezinifite maka ada nwaanyị dị ime e gburu ka o si ahịa na-alọta.

    A sị na nke a mere na Satọde ụbọchị iri abụọ na anọ nke ọnwa Ọktoba, 2020.

    Nwaanyị a bụ onye Uga, a lụrụ n'Ezinifite dị ime ọnwa atọ mgbe ndị a maghị ndị ga bụ gburu ya.

    Nke a mere ndị ada ibe ya ji si n'Uga bịa mgbaru n'Ezinifte ebe a lụrụ ya.

    Mbọ BBC Igbo gbara inwete ozi n'aka ndị uweojii banyere nke a amịtaghị mkpụrụ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra bụ Haruna Mohammed azaghị ekwentị ya.

  16. A na-achọ nwaanyi tufuru nwa ya n'ọdọugbọelu dị na Qatar

    Ọdọụgbọelu Qatar

    Ebe foto si, Reuters

    N’ofesi, gọọmenti mba Qatar sị na ha ga-etinye anya na ya bụ nyocha emere ịchọpụta nwaanyị tufuru nwaọhụrụ ya n’ikpo ahịhịa n’odougboelu dị na Doha ụbọchị abụọ nke ọnwa Ọktoba.

    Dịka ọtụtụ na-agbarụ ihu maka ya bụ nyocha, ndị ọrụ ọdọugboelu ahụ sị na-ebumnaobi ha bụ ka ha chọpụta nwaanyị kpara ya bụ arụ.

    Ha kpọbara ụmụnwaanyị niile nọ na ụgbọelụ iri n'otu ebe ịme nyocha ka ha mara onye mụrụ ya bụ nwa.

    Ndị ọrụ ahụ rịọkwara mgbaghara maka ya bụ ihe ha mere mana na-ekwu na ha ebughị n'obi ịkpasụ ndị mmadụ iwe.

    Ndị gọọmentị ha sị na ha ga-eme nyocha ịmata ka ndị ahụ siri mee ya bụ nyocha.

    Ụgbọelụ ahụ si Qatar aga Australia.

  17. Mpụtara ule Waec agaghịzị apụta taa

    Ndị uleakwụkwọ

    Ndị ọrụ West African Examinations Council ekwuola na ya bụ mpụtara ụleakwụkwọ kwesiri ịpụta taa agaghịzị apụta maka ọgbatauhie so ngagharịiwe emere na Naịjirịa.

    Waec sị na ọ bụzị n’izuụka na-abịanụ ka ya bụ mpụtara ga-apụzi.

  18. Josep Maria Bartomeu agbaala arụkwaghịm na Barcelona

    Josep Maria Bartomeu

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisi Barcelona bụ Josep Maria Bartemeu agbaala arụkwaghịm ka ndị nkwado ha kwanyere ya ọkụ n’ike ka ọ pụọ agbanyeghị na ọ nabatala isonye na European Super league.

    Oteela ndị nsonso Barcelona chọwara ka Bartomeu pụọrọ ha kemgbe ya na Lionel Messi malitere ịnwe nsogbu.

    Bartomeu banyere Barcelona kemgbe afọ 2014 dịka onyeisi ha ridara ụbọchị Tuzde ya na ndị isiọrụ ndị ọzọ.

    N'okwu ikpeazụ ya, Bartomeu sị na Barca amalitela ịkwado maka Super league tupu ọ pụọ bụ nke ọ sị na ọ ga-enyere ha aka ịkpata ego n'ọdị n'ihu.

    N'izu gara aga ka BBC kwuru na amụma na-aga n'ihu maka ịmalite Lig ọzọ akpọrọ Super League ndị otu egwubọolụ nwere agba n'Uropu ga-eso gbaa bụ nke a ga-etinye ijeri pound anọ na ụma isii.

    Cristiano Ronaldo agaghị eso Juventus gbasị Barcelona bọọlụ na Champions League taa makana ọ ka bu coronavirus.

  19. Ndị ekperima abanyela ọrụ izu ohi site na ngagharịiwe a na-eme na Philadelphia

    Ndị uweojii Steeti Philadelphia dị n'Amerịka ekwuola na ndị ekperịma abanyela ọrụ izụ ngwahịa ndị mmadụ nke abalị abụọ site na ogbugbu ndị otu ha gburu nwaokorobia onyeisi ojii.

    Ha sị na a agbagburu Walter Wallace maka na ọ jụrụ ịtọgbọ mma o ji n'aka mgbe ha bịara ijide ya.

    Ndị ụmụnna Wallece sị na isi adịchaghị ya bụ nwaadị gbara afọ iri abụọ na asaa mma.

    N'abalị Tuzde ka ndị uweojii dọrọ ndị ogbe Port Richmond aka na ntị ka ha chaa n'ụzọ maka ndị ekperima banyere ọrụ izu ngwaahịa ndị mmadụ.

    Ndị ọrụ gbata gbata dọkwara ndị mmadụ aka na ntị ka ha baa ụlọ maka ya bụ ọgbaaghara si ngagharịiwe banye ihe ọzọ.

    Ọrụaka ndị ekperima na ngagharịiwe Philadelphia

    Ebe foto si, Reuters

  20. Buhari ahọpụtagharịala Mahmood Yakubu dịka onyeisi INEC ruo afọ ise ọzọ

    Mahmood Yakubu onyeisi Inec

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala Muhammadu Buhari ahọpụtagharịala Mahmood Yakubu dịka onyeisi ụlọọrụ 'Independent National Electoral Commission (INEC) ruo afọ ise ọzọ.

    Onye ndụmọdụ pụrụiche Buhari na mgbasaozi bụ Femi Adesina wepụtara ozi a ma sị na nke a ga-abụ agba nke ikpeazụ Yakubu ga-eji ọkwa a n'ozi e zigara onyeisi ndị Sịnetị bụ Ahmad Lawan.

    Ọ sị na na nhọpụta a dị n'usoro iwu na-achị Naịjirịa nke afọ 1999 dịka a ghazigharịrị.

    Mana ọ sị na ọ dizi n'aka ndị ụlọomeiwu ukwu ịnabata nhọpụtagharị Yakubu.

    Onyeisiala Buhari họpụtara Yakubu n'ọkwa n'ọnwa Nọvemba afọ 2015, n'ime ọnwa isii o merichara ntulaiaka onyeisiala.

    Kamgbe Yakubu naara Attahiru Jega ọkwa onyeisi Inec, ọ haziela ọtụtụ ntuliaka na Naịjirịa gụnyere ntuliaka ukwu n'afọ 2019 e ji họpụtagharịa Onyeisiala Buhari.