Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ọnụọgụgụ ndị a na-ahụ coronavirus n'ahụ ha kwa ụbọchị n'Amerịka arịgoola karịa etu ọ na-eru mbụ

    Onye na-enyocha ọrịa

    Ebe foto si, Reuters

    Coronavirus agwọọla mba Amerịka oke ara, dịka a chọtara ya n'ahụ mmadụ puku iri asatọ na atọ na ụma n'ụbọchị Fraịde, nke bụ mbụ a na-achọta ya n'ahụ mmadụ ole a n'otu ụbọchị.

    Dkt Jerome Adam bụ ọwa ahụ gburugburu nke mba ahụ kwuru na ọ bụ eziokwu na ọnụọgụgụ ndị bu ya na-arị elu, mana ọnụọgụgụ ndị ọrịa a na-egbu kwa ụbọchị adaala n'ihi ụdịrị ọgwụgwụ a na-enye ha.

  2. Ubu asaala Chi?

    Ekele m unu ndị Igbo na ndị ji Igbo ekwu.

    Nnọọ nụ dịka anyị na-amalite iwetere unu akụkọ si mba ụwa nakwa Naịjirịa.

  3. Etu nrụrịtaụka ikpeazu Donald Trump na Joe Biden mere si gaa

    Donald Trum na Joe Biden

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Donald Trum na Joe Biden

    Nrụrịta ikpeazụ tupu e mee ntuliaka onyeisiala mba Amerịka gara nnọọ nke ọma n'abalị Tọzde, dịka onyeisiala Donald Trump na onye na-ama ya aka bụ Joe Biden jiri nwayọọ kwuo okwu.

    Ọtụtụ mmadụ etoola nrụrịtaụka nke a n'ihi na ọ dịghị ka nke mbụ ha abụọ na-akpọrịta onwe ha iyi.

    Nke a bụ nrụrịtaụka nke ikpeazụ ha ga-enwe tupu e mee ntuliaka n'ọnwa Nọvemba.

    Gbasara okwu coronavirus, Joe Biden kwuru na ya ga-atule ịkpọchị obodo ọzọ ka ọrịa ahụ kwụsị ifesa, mana Trump sị na oge eruola iji kpọpee obodo kpam kpam ka ndị mmadụ malite ndụ ha.

    Trump bokwara Biden ebubo na ya na nwa ya na-azụ ahịa n'ụzọ iwu akwadoghi, mana Biden kwuru na nke a bụ asị ma kpọọ Trump ka o gosi ihe akaebe na ọ na-atụ ụtụisi (tax) ya.

    Ka ọ dị ugbua, ihe karịrị mmadụ nde iri anọ na asaa (47 million) atụọlarị vootu site n'usoro nzipu ozi bu 'mail' na Bekee.

    Mana ọnụọgụ a na-ele anya kwesịrị ịtụ vootu karịrị nde narị abụọ na iri atọ (230 million).

    Ọ bụ n'abalị atọ nkeọnwa Nọvemba ka ntuliaka ọkwa onyeisiala mba Amerịka ga-abụ.

  4. Gịnị na-eme n'Oyigbo, Rivers State

    Nyesom Wike

    Ebe foto si, Twittetr/Nyesom Wike

    Nkọwa foto, Nyesom Wike, Gọvanọ Rivas steeti

    Oyigbo, otu obodo dị na Rivers Steeti bụ aha ọtụtụ mmadụ kpụ n'ọnụ na soshal midia n'isi ụtụtụ a.

    Ọtụtụ na-ekwu na ha na anụ ka ụda egbe na-ada aghara aghara kamgbe ime abalị.

    Ụfọdụ tinyere ihe nkiri ebe a na-anụ ka ụda egbe na-ada, ha wee na-ekwu na a na-awakpo ogbe ahụ.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2

    End of X post, 2

    Skip X post, 3

    End of X post, 3

    Onwebeghị onye ma kpọmkwem ihe na-eme n'eziokwu mana ọtụtụ na-akpọ oku ka ndị ọrụ nchekwa gbagara ndị bi na mpaghara ahụ ọsọ enyemaka.

    Oyigbo bụ obodo dị n'oke ala Abia steeti na Rivers steeti.

    Ọgbaaghara dapụtaraburu ebe ahụ n'oge etechabeghị aka dịka akụkọ kwuru na a wakporo ogbe ebe ndị si mpaghara ugwu bi n'ebe ahụ.

    Anya na ntị BBC ka dị n'ihe a na-emenụ iji chọpụtachaa nke merenụ.

  5. O nweghị mgbe m nyere iwu ka e mebie akụnaụba ndị Yoroba- Nnamdi Kanu

    Nnamdi Kanu

    Ebe foto si, Getty Images

    Onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu ekwuola na ọ bụghị ya ziri ndị gara mebie ihe akụ na ihe enweenwe ndị Yoruba na Legọs steeti dịka ụfọdụ akụkọ na-efegharị na soshal midia na-ekwu.

    "E mere m mgbasaaozi ezie, mana ndị chabiri ya bụ ndị chọrọ itinye nghọtahie na'etiti ndị chọrọ nnwereonwe."

    O nweghị mgbe m kwuru ka ndị mmadụ gaa weghara ihe ndị Yoroba."

    "Ihe mere bụ iwe ihe mere na Lekki kụzuru ndị ntorobịaụ ha gawa mebiwe ihe."

    Kanu kwuru ọ bụ "ndị ozi gọọmenti etiti" bụ kpara ya bụ nkata.

    O rụkwara ahụ aka sị na ọ bụ ka butere ntisa n'etiti Nnamdi Azikiwe na Obafemi Awolowo ma na-achọka itisa ndị Igbo na ndị Yoroba ugbua.

    Kanu kwuru nke na 'ehihie Tozde na mkparịtaụka mberede nke Ụlọọrụakụkọ Njenje Media TV haziri n'igwe okwu 'Zoom' nke Femi Fani Kayode bụbbu Minista njem ụgbọelu nọkwa na ya.

    Kanu toro ndị ntorobịa Naijiria maka ịpụta mee ihe

  6. "Nwoke na nwoke ịlụ onwe ha adịghị njọ" - Pope Francis

    Pope Francis

    Ebe foto si, Reuters

    Onyeisi ndị ụka kathọlịk bụ pope Francis ekwuola na n'uche obi ya, na nwoke ịlụ nwoke ibe ya maọbụ nwaanyị ilụ nwaanyị ibe ya adịghị njọ.

    O kwuru na ndị dị etu a kwesịrị ịnwe ezịnụlo n'ihi na ha niile bu ụmụ Chinkeke.

    Na nkọwa ya ka o kwuru na ndị a kwesịrị ịgba akwụkwọ dịka iwu ikike dịrị onye siri dị.

    Ma kwuo na ekwesiri ịwepụta iwu kwadoro ha ịlụ onwe ha.

    Ọ bụ na ihe onyonyo Evgeny Afineevsky mere ka Pope Francis kwuputara nke a.

  7. Manchester United emekwaala ya ọzọ na Paris

    Rashford

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị Manchester United ji ọkpụ goolu abụọ asataghị asata merie ndị Paris St Germain nke mba Fransị oge ha abụọ zutere n'asọmpi Uefa Champions League n'abalị Tuzde.

    Nke a echeterela ndị mmadụ etu Man Utd si merikwaa PSG na be ha n'asọmpi a afọ abụọ gara aga.

    Ọ bụ Man Utd bu ụzọ nyete goolu n'agba nke mbụ oge Bruno Fernandez gbakpu penariti e nyere ha.

    Anthony Martial ji aka ya nye onwe ha goolu iji saara PSG n'agba nke abụọ.

    Mana Marcus Rashford gosiri ihe o ji bụrụ odogwu oge o nyere goolu ọzọ oge ọ fọdụrụ nkeji olemole ka asọmpị ahụ bịa na njedebe.

    Man Utd bụzi ndị nke abụọ n'otu G nke asọmpi 'Champions League afọ a; RB Leipzig bụ ndị nke mbụ dịka ha jikwa ọkpụ goolu abụọ a saghị asa merie ndị otu Istanbul Basaksehir.

    Lee ka asọmpi 'Champions League' ndị ọzọ a gbara n'abalị Tuzde si gaa:

    Zenit St Petersburg 1 - 1 Club Bruges

    Dynamo Kyiv 0 - 2 Juventus

    Chelsea 0 - 0 Sevilla

    Rennes 1 - 1 FK Krasnoda

    Lazio 3 - 1 Borussia Dortmund

    Barcelena 5 - 1 Ferenvárosi

    RB Leipzig 2 - 0 Istanbul Basaksehir

  8. Ụnụ abọọla chi

    Igbo ndị ọma, ụnụ abọọla chi.

    Ndewo dịka ị na-esonyere anyị taa.

  9. Daalu maka ịnọnyere anyị taa, Ka ọ dị echi

    Ụbọchị nta ka anyị chụọ n'Owerre nchị, ka chi foo!

  10. Kedụ otu Mbappe ga-ahọrọ n’afọ ọzọ na-abịa?

    Kylian Mbappe

    Ebe foto si, Getty Images

    Ọgba boolu ndị otu Paris Saint Germain bụ Kylian Mbappe dịka ọ chọzighị ịnọ n’otu ahụ ma nkwekọrịta ya na ha bịa na njedebe.

    Mbappe, onye dị afọ iri abụọ na otu na-agbara mba Fransị bọọlụ, sonyere otu PSG kemgbe afọ 2017.

    Mana dịka ọ dị ugbua, kepukepu na-ekwu na ọ bụ otu Liverpool na Real Madrid ka anya ha dị n’ahụ ya ịnwale ma ha a ga-azụta ya.

    Amabeghị otu Mbappe ga-ahọrọ n’ime otu abụọ ndị a.

    Son Heung Min

    Ebe foto si, Getty Images

    N’aka nke ọzọ otu Tottenham na-akwado ịtinyeso ego n’ụgwọ ọnwa ọgba bọọlụ ha bụ Son Heung-min iji me ka ọ dọtịkwuo oge ya n’otu ahu.

  11. Ka ọ dị nụ echi!

    Daalụ bụ maka isonye anyị.

    Echi ga-aka mma!

  12. Virgil van Dijk: Liverpool ha alaala na mgbuka?

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Ụfọdụ na-ekwu na egwu ejidela ndị otu Liverpool dịka onye ndu ha na onye na-agba azụ bụ Virgil van Dijik merụrụ ahụ n'ikpere ya dịka ha zutere ndị otu Everton nsonso a.

    Dijik na-ekwu na ọ ga-anwa ike ya iji hụna ọgbakere ma bido asọmpị n'oge na-adịghị anya.

    A ga-awa ya ụkwụ nke mere na amabeghị mgbe ọzọ ọ ga-enweike ịgba bọọlụ ọzọ.

    Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ọnọdụ a

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    Skip X post, 3
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 3

    Skip X post, 4

    End of X post, 4

    Skip X post, 5

    End of X post, 5

  13. A nwụchiela mmadụ 25 maka igosi asambodo covid-19 adịgboroja

    Nnyocha Covid-19

    Ebe foto si, AFP

    N’afrịka, ndị uweojii mba Uganda anwụchiela ndị njem iri abụọ na ise a na-enyo maka igosi asambodo nnyocha covid-19 adịgboroja.

    E jidere iri abụọ na atọ n’ime ha ka ha na-akwado ime njem n’ọdọụgbọelu Entebbe dị nso isiobodo Kampala, ebe a nwụchiri abụọ ndị ka batara abata.

    Mara na mba Uganda ka mepere okeala ha na mba ndị ọzọ n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọktoba, ka ọnwa isii ha ji buso mfesa ọrịa coronavirus agha gachara.

    Ugbua, ha na-ana ndị njem akwụkwọ gosiri na ha ebughi ọrịa covid-19, site na nnyocha e mere na-akarịghị ụbọchị ise tupu onye ahụ emee njem.

    Ndị njem na-abata n'ime mba ahụ kwesịkwara iweta akwụkwọ gosiri na ha ebughi ya bụ ọrịa n'ime ụbọchị atọ tupu ha abanye ụgbọelu ga-ebulata ha.

    Ka ọ dị ugbua, mmadụ 10,590 ebutela ọrịa coronavirus na mba ahụ, ebe mmadụ 97 nwụrụla n'ime ha.

  14. Igbo ndị ọma ka ọ dị nụ echi

    Hie nụ ụra n'udo ma chete soro anyị echi.

  15. Igbo ndị ọma anyị ji eme ọnụ

    Nnọọnụ na peeji anyị taa!

    Anyị amalitela iwetere unu akụkọ dị iche iche na-ekpo ọkụ n'ala Igbo nakwa mba ụwa niile.

  16. Igbo ndị ọma ebe a ka anyị ga-awụsa ọwa nke taa

    I meela n'isonye anyị taa, ka ọ dị echi.

  17. Manchester City ewerela Arsenal gụrụ akara atọ dị ọkụ

    Arsenal na Machester City

    Ebe foto si, Premier League/Twitter

    Manchester City gosiri Arsenala ihe nwoke ji kara ibe ya dịka ha ji oru ọkpụ goolu a na-asataghị otu merie ha n'asọmpi Premier League.

    Goolu a si n'aka Raheem Sterling na nkeji 23' n'ọkara nke mbụ n'asọmpi.

    Arsenal nwara ike ha dịka dimkpa ha bụ mana Manchester City ekweghi ha nyeta goolu.

    N'otu ahụ Manchester City gbalịkwara inye Arsenal goolu ọzọ mana ha jụwara isi ruo mgbe asọmpi a gwụrụ na nkeji 90'.

    Ugbua Arsenal bụ ndị ise ebe Manchester City bụ ndị iri n'ogogo tebụlụ.

  18. Ndịagha Naịjirịa sị ha ga-amalite emume a kpọrọ 'Ọchị Agụiyi' na Naịjirịa niile

    Ndịagha Naịjirịa

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndịagha Naịjirịa ekwuola na ha ga-amalite atụmatụ a kpọrọ 'Ọchị Agụiyi' bụ Crocodile Smile na bekee n'ebe niile na Naịjirịa.

    Ozi a si d n'akwụkwọ si n'aka ọnụ na-ekwuru ndịagha na Naịjirịa bụ Sagir Musa.

    Emume a nke bụ ihe ha na-adị emekarị kwa ngwụcha ọnwa anọ afọ ọbụla ga-amalite n'ụbọchị 20 ọnwa Ọktoba ruo ụbọchị 31 nke ọnwa Disemba afọ 2020.

    Ha sị emume a ga-agbakwasị ụkwụ n'ibuagha megide mpụ na-eme n'ịntanet iji nyocha ma chọpụta mgbasaozi akụkọ maọbụ echiche ọjọọ na-eme n'elu ịntanet.

    Ndịagha Naịjirịa

    Ebe foto si, Getty Images

    Ha sị na nke a ga-abụ mbụ ndịagha mba Afrịka ga-eme emume ga-ebuagha megide mpụ n'ịntanet.

    Ha kwukwara na ọ ga-enyocha inyochapụta ndị Boko Haram batarala n'obodo dị na mpaghara ugwu nakwa ebe ndị ọzọ na Naịjirịa.

    Ha kwere ngwa na ọ bụ maka udo na ọganihu ndị Naịjirịa ka na-achọ ma rịọ ka ụmụ Naịjirịa kwadoo ha n'oge niile ha ga-eme ya bụ emume.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  19. Chelsea akpọrọla ụkwụ ọcha n'aka Southampton

    Chelsea na Southampton

    Ebe foto si, Premier League/Twitter

    Southampton fooro ntụtụ taa ma sị na Chelsea agaghị emeri ha n'asọmpi Premier League dịka ha ji ọkpụ goolu atọ atọ gbaa onwe ha onye lawa onye lawa.

    Chelsea malitere inye goolu abụọ na nkeji 15' na 28' site n'aka Timo Werner bụ onye nyere goolu abụọ a.

    Danny Ings nke Southampton sara otu goolu na nkeji 43' tupu ọkara mbụ apịachie ọnụ.

    N'ime ọkara nke abụọ, na nkeji 57' Che Adams mezuru ya goolu nke ndị Southampton.

    Na-egbughi oge, Kai Havertz nyere ndị Chelsea goolu nkeji 59' iji mee ya nke atọ.

    Mana Jannik Vestergaard nke Southampton mere ka odo Chelsea anya na ha mụ anya site n'inye goolu nke atọ ha na nkeji 90'.

    Nke a mere ka a ga-asị na Chelsea na Liverpool tetere ụra n'otu akwa ndina dịka ha abụọ enweghi ike merie n'asọmpi ha gbara taa.

    Ugbua Chelsea bụ ndị isii n'ogogo tebụlụ Premier League.

    Chelsea na Southampton

    Ebe foto si, Premier League /Twitter

  20. Ọ bụ na mma agha Liverpool anaghị aghọzi nkọ?

    Everton na Liverpool

    Ebe foto si, Premier League/Twitter

    Otu egwuregwu Everton ekweghi ka Liverpool ṅụrụ mmiri tọgbọ iko n'asọmpi Premier League ha gbara nke ha ji ọkpụ goolu abụọ abụọ si onye laba.

    Liverpoo bu ụzọ nye goolu na nkeji 3' site n'aka Sadio Mane mana Everton sara mgbe Michael Keane nyere goolu na nkeji 19'.

    Otu egwu abụọ ndị kwechiri na onweghi onye ga-emeri ibe ya ruo na nkeji 72' mgbe Mohamed Salah nyere goolu ọzọ.

    Na-egbughi oge, Dominic Calvert-Lewin saara ndị Everton goolu na nkeji 81' nke gbawara obi ndị Liverpool.

    Mana ebe obi Liverpool nọzi gbaa riri bụ mgbe ogbu pịpịrọ gụpụrụ goolu Jordan Henderson yere na nkeji 90' ma sị na ọ bụ nke a kpọrọ "offside".

    Kamgbe a malitere asọmpi Premier League nke afọ a, Liverpool ahụbeghi gbaa, ọ dịzi ka mma agha ha ọ nwụọla nkọ.

    Ha ji akara iri nọrọ n'ogogo abụọ na tebụlụ Premier League ebe Everton ji akara iri na atọ bụrụ ndị mbụ.