Unu abọọla chi eee!
Anyị ụkpa ekele anabata unu n'ụtụtụ taa.
Biko a hapụkwala isonye n'ọgbakọ anyị www.bbc.com/igbo maka akụkọ ndị hiri odo.
Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.
Anyị ụkpa ekele anabata unu n'ụtụtụ taa.
Biko a hapụkwala isonye n'ọgbakọ anyị www.bbc.com/igbo maka akụkọ ndị hiri odo.

Ebe foto si, Getty Images
Ọkaikpe Rilwan Aikawa atụhapụla ikpe na-ebo ụmụ nwoke iri anọ na asaa ebubo na ha na-edina onwe ha.
Aikawa kwuru na ndị gbara ha ya bụ ikpe esoghi usoro kwesiri ekwesị.
Ndị gbara ha ikpe abịaghị ụlọukpi maka ya bu ikpe ma ha akpotaghị ndị aka ebe.
Anwuchiri mmadụ iri anọ na asaa a maka ebubo na ha chọrọ ibanye otu ụmụ nwoke na-edina onwe ha kama ụmu nwoke a kwuru na ọ bu ihe mmemme ncheta ọmụmụ ka ha bịara.

Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi eboola ndị otu Ipob na steeti ahụ ebubo ibute ọgbaghara mere na steeti ahụ ụbọchị Monde, abali 26 nke ọnwa Oktoba, afọ 2020.
Umahi kwuru nke a n'ozi ọ gbasara n'ikuku ụbọchị Tuzde kwuru na ọ bụ ndị butere ọgbaghara n'Ebonyi si n'otu obodo dị n'otu otu okpuru ọchịchị dị na steeti ahụ n'aha ndị Ipob.
"Na Monde,abalị 2o Oktoba , ndị wakporo Ebonyi mebie ihe si ebe ọzọ.
"Ụnyahụ bụ Tuzde, 26 Oktoba, ndị bịara bụ ndị Ebonyi si otu obodo n'otu okpuru ọchịchị n'aha ndị Ipob."
Ọ rịọrọ ndị Ebonyi mgbaghara maka mkpamkpa ndị omwekome na ndị agboro kpara na steeti ahụ ma tie ndị ọrụ nchekwa na nddị mmadụ tụnyere ndụ ha n'ọgbaghara ahụ.
O kwere nkwa iti ezinaụlọ ndị agboro merụrụ ahụ maọbụ gbuo n'oge ọgbaghara so ngaghariiwe EndSARS na steeti ahụ.
Ngalaba na-achịkọta ndị ọrụ bụ Nigeria Labour Congress (NLC) nke Imo steeti enyela gọọmentị steeti ahụ ụbọchị iri na anọ (14) imezu ihe ha chọrọ maọbụ chebiri ihe ga-adapụta na ya.
N'ozi e binyere aka nke ha zipuru, ngalaba NLC depụtara ụzọ ihe atọ na ụma ha chọrọ ka gọọmentị mezuo, nke gụnyere:
Ha kwuru na ha akwenyerela gọọmentị ugwu kemgbe ọnwa Febrụwarị, mana ihe ka dị etu ọ dị.
Lee ihe ha kwuru n'uju.


Austin Chilakpu bụ onyeisi ha gwara BBC na kemgbe ọnwa Febrụwarị ka ha na-enwere gọọmentị ndidi ka ha nwee ike ịkwụzu ndị ọrụ na ndị larala ezumike nka ụgwọ e ji ha.

Ebe foto si, Nnia Nwodo
Onyeisi otu ọhaneze bụ Nnịa Nwodo ekwuola na ọtụtụ ndị Igbo akwadoghị okwu ịkpa oke maọbụ nkpusu iwe na ọnụma sị n'aka otu Ipob na onye ndu ha apụta.
Nwodo onye kwuru nke a mkparịtaụka ya na ụlọakụkọ AIT nwere ụbọchị Monde sị na ejighi ibute ọgbaghara mara ndị Igbo.
Ọ sị, “Anụghị ebe Ipob kpọrọ oku ka e mebie akụnaụba ndị Yoruba. Mana anụrụ m ihe Ipob kwuru na-akụsu iwe na ọnụma.
"Achọrọ m ikwu hoohaa na ọtụtụ ndị Igbo akwụnyeghịrị Ipob n'ihe ha kwuru (maka EndSARS). Ọ bụghị omenala anyị."
"Ọ dịka ihe ga-eme na onye Igbo nwere ihe akụ na ihe enwenwe na mpaghara Naijiria dị iche iche."
"O kwuru na ndị gọvanọ Ọwụwa-Anyanwụ ekwuola na ha akwadoghị okwu Ipob kwuru."
N'okwu akụnaụba ndị e mebiri n'ọgbaghara so ngagharịiwe EndSARS, Nwodo kpọrọ oku ka gọọmenti gụkọ ndị e mebiri ihe ha ma gbatara ha ọsọ enyemaka.
Ọ katọrọ etu gọọmenti ji jiri aka ike so ndị ntorobịa na-eme ngagharịiwe maka mkpagbu n'aka ndị uweojii.

Aka na-achị Legọs steeti bụ Babajide Sanwo-Olu, enyeela ntụziaka ka emepe mkapmkpam ahịa niile dị na steeti ahụ.
N'akwụkwọ mgbasaozi nke Kọmishọna na-ahụ maka ihe na-eme n'ime obodo bụ Wale Ahmed wepụtara ụbọchị Tuzde, o kwuru na ahịa niile mama nke nri ma na ndị ọzọ enweela ohere impe kwa ụbọchị.
Cheta na gọọment tinyeburu ụbọchị ahịa nri na-azụ iche ma tinyekwa ụbọchị ngwa ndị ọzọ na-abụghị nri na-azụ iji mgbochie nkesa ọrịa coronavirus.

Ebe foto si, Getty Images
Kọmishọna mgbasa ozi gọvanọ Rivers State bụ Paulinus Nsirim ekwuola na gọọmenti Rivers State agaghị atụpụrụ onye ndu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu ọnụ maka okwu naira nde 100 o tinyere n'isi gọvanọ Nyesom Wike.
Ọ kwuru na ọ ka na-agbagoju ya anya etu ndị ntaakụkọ si buru akụkọ ahụ na-efesa ma na-achọ ka ha nụ n'ọnụ gọọmenti Rivers State gbasara ya.
Cheta na Gọvanọ Nyesom Wike nke Rivas Steetị enyela ndịisioche okpuruọchịchị dị na steetị ahụ iwu ka ha nwuchie ndị Ipob niile nọ n'okpuruọchịchị ha.
Nke a na-abia dịka nso nso a na ọgbaghara dapụtara n'Oyigbo dị na steetị ahụ n'etiti ndị Ipob na ndị ọrụ nchekwa ebe Ipob fere ọkọlọtọ ha.

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọomeiwu mba Amerịka ahọpụtala Amy Coney Barett dịka onye ga-anọchi n'ọkwa nke Ruth Bader Ginsburg hapụrụ mgbe ọ nwụrụ.
Nke a mere n'ime naanị otu izuụka tupu e mee ntụliaka ọkwa onyeisiala na mba ahụ.
Ndị otu Republican tụnyere vootu ihe pụtara 52-48 iji meri otu Democrats na-achọghị ka o rite ya bụ ọkwa.
Onye bụ Amy Coney Barett?

Ebe foto si, Reuters

Ebe foto si, Gọvanọ Nyesom Wike/Facebook
Gọvanọ Nyesom Wike nke Rivas Steetị enyela ndịisioche okpuruọchịchị dị na steetị ahụ iwu ka ha nwuchie ndị Ipob niile nọ n'okpuruọchịchị ha.
O dọrọ aka na ntị na onyeisioche ọbụla hapụrụ ndị Ipob ka fee ọkọlọtọ ha n'okpuruọchịchị ga-anata ntaramahụhụ.
Wike kwuru nke a mgbe ya na ndịisioche okpuruọchịchị, ndịisi obodo, ndị ntoroọbịa na ndị obodo nwere mkparịtaụka na Pọtakọtụ na Mọnde.
Ọ sị na Rivas Steetị bụ obodo udo na-anabata onye ọbụla na-agbanyeghi agbụrụ onye ahụ si pụta na ha agaghị anabata ka Ipob mebie steetị ya.

Ebe foto si, Gọvanọ Nyesom Wike/Facebook
"E nwere otu a sị na-eyi ndụ egwu a kpọrọ Ipob". Ọ bụghị m kpọrọ ha ndị oyi ndụ egwu, ọ bụ ụlọikpe kpọrọ otu na-eyi ndụ egwu.
Wike nyekwara iwu sị ka a majakwala onye Igbo ọbụla na-aga mkpa ya n'ụzọ ziri ezi na-enweghi nsogbu ọbụla.
Cheta na nso nso a na ọgbaghara dapụtara n'Oyigbo dị na steetị ahụ n'etiti ndị Ipob na ndị ọrụ nchekwa ebe Ipob fere ọkọlọtọ ha.
Ọ bụ ebe a ka anyị dopuru iche ịwetara unu akụkọ ndị dị mkpa taa.
Jisinuike sonye anyị na-eleghi anya n'azụ.
Yagazie.
Igbo ndị ọma, ka anyị wụsa ọwa ebe a.
Soro anyị echi maka akụkọ ga-amasị gị.

Ebe foto si, Twitter/HeartlandFC
A malitela ịkwụ ndị otu Heartland FC ụgwọ ọnwa ndị e ji ha kemgbe ọnwa ole na ole gara aga.
Solomon Onu bụ ọnụ na-ekwuru klọb ahụ gwara BBC Igbo n'ekwentị na a kwụọla ha ihe ruru ụgwọ ọnwa ọnwa anọ.
O kwuru na e nwee ndị a ka ji ụgwọ ugbua, na ọ ga-abụ ndị ụlọakụ ha nwere otu nsogbu maọbụ abụọ, maọbụkwanụ ndị enwebeghi ike ịbata bịa denye aha ha maka ịnara ego ha, n'ihi na o so n'otu iwu e wepụtara tupu a kwụọ ya bụ ụgwọ (na onye ọbụla ga-ejiri aka ya denye aha ya nakwa ihe njirimara ndị ọzọ tupu a kwụọ ụgwọ a).
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post

Ebe foto si, PA Media
Ndị agha batara n'ụgbọmmiri e ji ebu mmanụ a na-enyo na ndị omekome jichiri, nwụchiri mmadụ asaa n'ebe a kpọrọ Isle of Wight na mba Briten, n'abalị Sọnde.
E nyefere mmadụ asaa ahụ e che na ha bụ ndị Naịjirịa na-achọ ikike a na-enye ndị gbara ọsọ ndụ, n'aka ndị uweojii Hampshire.
E nweghi ihe mere mmadụ 22 na-arụ na ya, dịka ụgbọmmiri ahụ mechara kwụsị njem na Southampton.
Ndị nwe ụgbọmmiri ahụ bụ Navios Tanker Management, kwuru na ụjọ tụwara onye na-achịkọta ụgbọmmiri ahụ ka ọ hụrụ etu ndị ahụ si na Legọs zobata n'ụgbọmmiri ahụ si na-enye nsogbu.


Ụlọorụ na-ahụ maka ule SSCE nke na-aga ihu ugbua akwụsịla ule niile rue mgbe amabeghị n'ụbọchị ụka.
Ọnụ na-agbasara ụlọọrụ ahụ ozi bụ Azeez Sanni kọwara na ha mere nke a n'ihi ọgbaghara na nsogbu nchekwa nke si na ngagharịiwe END SARS dapụta.
Ha kwuru na ule a ga-amalite ọzọ mgbe o doro anya na ihe niile laghachiri etu o si dị mbụ.

Ebe foto si, Reuters
Lee Kun-hee bụ onyeisioche Samsung alakwurula ndị nna nna ya.
Kun-hee dị afọ iri asaa na asatọ mgbe ọ nwụrụ, nyere aka ịzụlite obere azụmahịa nna ya nwere ruo ebe ọ nọ ugbua, mere ya ide kacha jide ego na mba Saụt Koriya.
Ụlọọrụ Forbes depụtara ya dịka onye kacha nwe akụ na ụba na mba Saụtụ Korịa dịka ego ya na-chụ ogo pound 16 billion($21bn).
Ndị ụlọọrụ Samsung kwuru na Lee nwụrụ taa bụ ụbọchị ụka October 25,2020 mana ha edepụtaghị ihe butere ọnwụ ya.
Obi nkoropu o nwere kamgbe afọ 2014 mere ka ọ bụrụ onye a na-elekọta anya mgbe ọbụla.
Ihe mere Lee ka ọ bụrụ onye ama ama bụ mgbe ọ gwara ndị ọrụ Samsung n'afọ 1993 ka ha gbanwe ihe niile belụsọ nwunye ha na ụmụ ha.
Nke a mere ka Samsung gbaa ekwenti ruru otu narị na iri ise(150,000) ọkụ.
Nke onye chiri ya zere dịka anyị ga-ewetere ụnụ akụkọ dị ọkụ ka o si dị ọkụ na Naịjirịa na akụkụ ụwa niile.
Soro anyị!
Ya gaziere gị, Onye a hụrụ taa sị hụkwa ya echi...Isee!