Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Na Akpọtụ Ugbu A, Ọdọ gaasị na-agba ọkụ na mpaghara Ipaja dị na Legọs

    Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua bụ na ọdọ gassị agbaala n'ebe a na-ere gassị eji esi ihe na mpaghara Baruwa.

    Akụkọ si soshal midia na-egosi ebe ọkụ na-agba.

    Mana amatabeghị ihe kpatara ọkụ a na-akwa ndi o metụtara dịka ndị ọrụ gbata gbata erubeghị ebe ahụ.

    Akụkọ ka na-abịa.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  2. Anyị ga-ahụ na ntụliaka Ondo gara nke ọma - Muhammadu Buhari

    Muhammadu Buhari

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buahrị ekwuola na gọọmentị etinyela ihe niile kwesiri iji hụ na ntụliaka nke Ondo steeti gara nke ọma.

    Ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Naijirịa bụ Femi Adesina kwuru na ọ bụ na ihe onyonyo mgbasa ozi onyeisiala mere maka ndị otu All Progressive Congress ka o kwuru nkea.

    Dịka ọ gwara ndị Ondo steeti ka ọganihu bụrụ ihe ha bu n'obi were mee ntụliaka ha ma sịkwa na Gọvanọ Oluwarotimi Aferedolu kwesiri imeri ya bụ ntụlịaka.

    O kwuru sị " etu o si arụ ọrụ ya nke ọma na-enye m obi ụto".

  3. Gọọmentị etiti amapụtala N653.8 iji kwụsị ozi redio adịgboroja n'ọwụwa anyanwụ

    Gọọmentị etiti amapụtala ihe ruru naira nde narị isii na iri ise na atọ iji hụ na akwụsịrị ozi redio adịgboroja n'ọwụwa anyanwụ.

    Ha ga-eji teknụzụ akpọrọ "Hybrid spectrum" we hụ na nke a bịara na mmezu.

    Nke a pụtara ihe mgbe emechara nzụkọ kwa izuuụka nke otu Federal Executive council bụ FEC n'obi gọọmentị n'Abuja.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Ihe ndị ọzọ amapụtaara ego na ya bụ nzụkọ bụ ijeri naira atọ na ọma iji rụpụta ụgbọ oloko si Pọtakọt gawa Medugiri

  4. Unu abọọla chi

    Soro anyị maka akụkọ niile ga-amasị gị taa

  5. Ngozi Okonjo Iweala eruola agba nke ngwucha n'ịzọ ọkwa onyeisioche WTO

    Ngozi Okonjo Iweala

    Ebe foto si, Okonjo Iweala/Twitter

    Nke na-eru anyị ntị ugbua bụ na onye bụbu Minista okwu ego dị n'aka na Naịjirịa bụ Ngọzị Okonjo Iweala eruola agba nke ngwụcha na ịzọ onye ga-abụ onyeisioche World Trade Organisation (WTO).

    Ndị otu na-eme ya bụ nhọta họtakwara onye Saụt Koria bụ Yoo Myung-hee.

    Ọ bụ mmadụ abụọ a ga-achịpụ ya n'ime mmadụ asatọ malitere ịzọ ya bụ ọkwa ịnọchị onyeisi nke pụrụ apụ n'ọnwa Ọgụst bụ Roberto Azevedo, bụ nke pụrụ otu afọ tupu oge ya eruo.

  6. Ngaghịrịiwe na Saụt Afrịka

    COSATU bụ aha ịchafụ ngalaba azụmahịa mba Saụt Afrịka, agwala ndị otu ha gbaa arụkwaghị m malite taa, iji gosi iwe maka ndị otu ha a chụrụ n’ọrụ, ndị e ji ụgwọ nakwa okwu gbasara mpụ dị iche iche.

    COSATU akatọọla etu gọọmentị ha si buso ọrịa Covid-19 agha dịka ha kwuru na ihe ruru ọrụ nde abụọ furu n’ime ọnwa anọ.

    Ngagharịiwe na Saụt Afrịka

    Ebe foto si, Getty Images

  7. A ga-emechi akwammiri third mainland kpamkpam ruo ụbọchị atọ

    Mmechi akwammiri

    Gọọmentị etiti ekwuola na ha ga-emechi kpamkpam akwammiri third mainland dị na Legọs ruo ụbọchị atọ, malite n'ụbọchị Fraịde ruo ụbọchị Sọnde.

    Onye kwuru nke a bụ onysisi nchịkọta ọrụ bụ Joshua Popoola n'ụbọchị Wenesde.

    Ọ sị na ọ bụ ka o nwe ndị ọrụngo ohere ịrụcha ọrụ ha nke ọma n'akwammiri ahụ.

    Ebe mmechi a na-emetutaghị bụ ụzọ si Adekunle gawa Iyana Oworo.

    Cheta na e mechiri otu ọkara akwammiri a n'ụbọchị 24 ọnwa Julaị ka e nwee ike rụọ ya ọrụ n'ime ọnwa isii.

  8. Keyamo arịọla ndị uweojii ka ha tọhapụ nwaamadị ahụ ha jidere maka ịse ihe onyonyo onye SARS gburu mmadụ na Delta steeti

    Minista okwu ọrụ dị n'aka nke nta bụ Festus Keyamo arịọla ndị uweojii ka ha tọhapụ ya bụ nwaamadị sere ihe onyonyo gosiri onye SARS gburu mmadụ n'Ughelli na Delta Steeti.

    Keyamo sị ndị uweojii ha tọhapụ ya Nicholas Makolomi maka na ya bụ ihe onyonyo ọ sere nyereaka ịnyopu ya bụ arụ onye uweojii ahụ mere.

    Ya bụ ihe onyonyo Nicholas weputere mere ka ndị mmadụ chọo igbu otu onye uweojii anọghị n'ọrụ aha ya bụ Ohwovwiogor Fidelis n'ọdọụgbọala dị na Ughelli. Ọ kwa ndị ezigbo mmadụ ndị ọzọ zọpụtara ya bụ nwoke n'aka ọnwụ. Ya bụ ihe onyonyo pụtara na Satọde gara aga.

    Ndị uweojii na-ebo Nicholas ebubo ịkpalite ọgbaaghara, ịgbasa ozi ụgha nakwa ihe ndị ọzụ bụ nke ha sị na ha ga-akpụpụ ya ụlọikpe.

    Keyamo sị ndị uweojii ha gbahapụ ebubo niile ahụ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  9. 'A nabatala m akwụkwọ ikpe ndị uweojii Naịjiria zitere m'- Ikedi Ohakim

    Ikedi Ohakim

    Ebe foto si, Ikedi Ohakim Facebook page

    Alloy Ejimako bụ Ọkaiwu Ikedi Ohakim bụ gọvanọ chiburu Imo steeti ekwuola na ha anatala akwụkwọ ikpe ahụ si n'aka ndị ụlọọrụ uweojii Naijirịa, na ha ga-asa ya n'oge na-adịghị anya.

    Mbọ niile anyị gbara ịnụta n'ọnụ ndị uweojii Naịjirịa kpụrụ n'ala dịka ọnụ na-ekwuchitere ha bụ Frank Mba azaghị ekwenti ya.

    Alloy Ejimako

    Ebe foto si, Alloy Ejimako

    Alloy Ejimako

    Ebe foto si, Alloy Ejimako

  10. UAE ga-amalite ịnye ndị Naịjirịa akwụkwọ njem n'Ọktoba 8

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Minista na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Hadi Sirika ekwuola na mba United Arab Emirates ga-ebido ịnye ndị Naịjirịa akwụkwọ ikike njem site n’echi bụ ụbọchị asatọ nke ọnwa ọktoba.

    Cheta na mba UAE kwụsịburu ịnye ndị ala Naịjirịa akwụkwọ ikike njem mgbe ha gbapechara nke mere ka mba Naịjirịa machie ụgbọelu mba ahụ ị datu ebe ọbụla na Naịjirịa.

    Ị kwadoola akpa njem gị?

  11. Naịjirịa na mba mba ndị ọzọ ebinyela aka na nkwekọrịta njem ụgbọelu

    Onyeisiala Muhammadu Buhari ebinyela aka na akụkọ nkwekọrịta n'etiti mba Naịjirịa na mba anọ ndị ọzọ gụnyere Rwanda, Amerịka nakwa Moroko.

    Nke a ga-eme ya mfe mba ndị a ị bubata mmadụ na ngwa ahịa na mba ọbụla so denye aha na ya bụ akwụkwọ nkwekọrịta.

    Minista na-ahụ maka omenala na mgbasaozi bụ Lai Mohammed gwara ndị ntaakụkọ na Naịjiria ga-agbado ụkwụ na nkwekọrịta a ma rite uru gbasara mwulite ọdịmma ndị mmadụ nakwa akụnaụba obodo.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  12. Okwu Gọvanọ Uzodinma na atụmatụ ya niile bụ nke 'Ben Johnson' - Rochas Okorocha

    Rochas Okorocha

    Ebe foto si, FACEBOOK/ROCHAS

    Rochas Okorocha bụbu gọvanọ Imo steeti esila n'ọnụ onye ndụmọdụ ya maka mgbasa ozi bụ Sam Onwuemeodo zahachi ebubo irifu ego ruru Naịra otu nari ijeri na iri na isii.

    O kwuru ka Gọvanọ Hope Uzodinma wepụta nchọpụta nzụkọ nyocha nke ọkaikpe Benjamin Iheaka bụ onyeisi oche nke ga-egosi ebe ya bụ ego siri fuo ka ụwa niile were anya ha hụ.

    O kwukwara ka Gọvanọ Uzodinma kwuo ije ojirila Naịra nde ijeri otu narị na iri na itolu nke sị n'ọba ego gọọmentị etiti na Naịra ijeri isii na ụma nke ISOPADEC.

    Okorocha gwara Gọvanọ Uzodinma ka ọ teta n'ụra n'ihi na o ji ndị ọrụ ụgwọ ma ya mara kwa na ọ bụghị ịchụgharị Okorocha bụ ọrụ ọ ga-arụrụ ndị Imo steeti.

  13. Laycon meriri Big Brother Lockdown eritela ụlọ, ego, na ọkwa gọọmenti

    Laycon na gọvanọ Ogun steeti

    Ebe foto si, Ogun state government twitter page

    Olamilekan Agbelesebioba eji Laycon mara na Big Brother eritela ụlọ, naira nde ise, ọkwa dịka onye nnọchiteanya ndị ntoroọbịa n’aka gọvanọ Ogun steeti bụ ebe o si.

    Gọvanọ Ogun steeti bụ Dapo Abiodun depụtara n’akara twitter ya ihe nile a Laycon ritere bụ iji too agwa ọma ọ kpara na amamihe o gosiri ụwa niile n’elu onyonyo ọha na-ekiri.

    Gọvanọ Abiodun kwuru na Laycon gbadoro anya agbanyeghị ọnwụwa na mkpasuiwe niile biara ya n’ihe nkiri Big Brother Lockdown.

    O kwuru na nke a gosiri na akwụkwọ ọ gụrụ abụghị ihe efu.

    Gọvanọ Abiodun jikwa ohere a wee kwupute na Ogun steeti na-ahazi ebe ndị na-eme egwuregwu nakwa ndị na-ese ihe ga-ezukọ iwulite ọnatarachị ha.

    Laycon, gọvanọ Abiodun na ndị ọrụ ya

    Ebe foto si, Ogun state government twitter page

  14. Kọntena esila Chaịna batawa Onitsha!

    Ụgbọmmiri bu Kọntena

    Ebe foto si, @Ianreneville/Twitter

    Akụkọ na-ekwu na kọntena bụ ibu abatala ọdọ ụgbọ mmiri nke dị n'Onisha.

    Ọ bụ ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala na soshal Midịa bụ Bashir Ahmed tinyere nke a na Twitter ya.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Gụọ ihe ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu maka ya.

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    Skip X post, 3

    End of X post, 3

    Skip X post, 4

    End of X post, 4

  15. Ndị otu oyi egwu atọhapụla onye ọrụ gbata gbata na onye ndọrọndọrọ ọchịchị ha tọrọ.

    Sophie Petronin

    Ebe foto si, Liberons Sophie/Facebook

    Nkọwa foto, Sophie Petronin nọ n'aka ndị ntọ kamgbe ọnwa Desemba

    Ezinụlo Sophie Petronin gbara afọ iri asaa na anọ bụ onye ndị otu oyi egwu nke alakụba tọrọ ekwuola na onwerela onwe ya.

    Ha kwuru na o bidola njem ịloghachị isi obodo Mali bụ Bamako.

    A tọrọ ya ebe ọ na-arụọrụ enyemaka na mpaghara ugwu nke Gao.

    Ndị otu oyi egwu a tọhapụkwara Soumaila Cisse bụ onye zọbụrụ ọkwa onyeisiala mba ahụ.

    Akụkọ na-ekwu na ntọhapụ a mere dịka ndị gọọmentị mba ahụ tọhapụrụ ihe karịrị mmadụ otu narị bụ ndị agha Jihad iji gbara isi mmadụ abụọ a.

    enwebeghị ihe gọọmentị kwuru maka ihe a niile.

  16. Unu asaala Chi!

    Soro anyị taa maka akụko ihe na-eme n'ụwa niile.

    Ya gaziere gị taa!

  17. Ụnụ emeela

    Igbo ndị ọma, anyị abịala n'isi njedebe mgbasaozi nke taa.

    Ka ọ dịnụ echi.

    Ndewo

  18. Akụkọ na a wakporo ndị uweojii n'Enugwu bụ okpotokpo asị - Kọmishọna Uweojii

    Ụlọ ndị uweojii

    Kọmishọna ndị uweojii n'Enugwu Steetị bụ Ahmad AbdurRahman ekwuola na na o nweghi ụlọ ndị uweojii awakporo n'Enugwu.

    Nke a dị n'akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru uwojii n'Enugwu Steetị bụ Daniel Ndukwe wepụtara bụ nke sị n'akụkọ a sị na awakporo ma gbuo ndị uweojii isii bụ asị ọcha.

    Ụlọ ndị uweojii

    Kọmishọna gwara ọhanaeze na ndị Enugwu ka ha gbaa akụkọ ụgha a nkịtị na ọ bụ aka ọrụ ndị obi ọjọọ na ndị na-achọghị ọ ga n'ihu.

    Ọ gara n'ihu nye iwu ka enyochaa ma chọpụta ndị malitere akụkọ ụgha ma taa ha ahụhụ ruru ha.

    N'ikpeazụ ọ gwara ndị bi n'Enugwu ka ha gaa n'ihu n'ime mkpa dịịrị ha ma na-erubeisi n'iwu na-achị obodo.

  19. Davido achụọla Lil Frosh maka ịkụza nwaanyị anya

    Lil Frosh na Davido

    Ebe foto si, Instagram/@lhilfrosh

    Nkọwa foto, Lil Frosh na Davido

    Onye oti egwu a ma ama bụ Davido achụọla nwa ọrụ ya a kpọrọ Lil Frosh maka ịkụza enyi ya nwaanyị anya.

    Ụlọọrụ ya a kpọrọ Davido Music Worldwide (DMW) sị na ha mere nke a site na nyocha ha mere banyere agwa Lil Frosh kpara.

    Ha sị dịka iwu na-achị otu iti egwu ha sị dị na ha anaghị anabata ụdị akparama agwa.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Cheta na akụkọ pụtara n'ụbọchị Mọnde maka etu Lil Frosh si akụ enyi ya nwaanyị ihe tinka na-akụ pan.

    Onyonyo nwa agbọghọ ahụ pụtara na soshal midia nke gosiri ya ebe o bu anya ikputu.

    Ndị mmadụ malitere ịkpọ oku ka ndị uweojii nwuchie ya bụ nwaokorobịa ma kpụpụ ya ụlọikpe.

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    Otu onye aha ya bụ @dahtgirl_ajex na Twitter tinyekwara ihe onyonyo na-egosi ebe Lil Frosh na-arịọ enyi ya nwaanyị mgbaghara dịka ọ kụchara ya ihe.

    Skip X post, 3
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 3

    Lil Frosh bụ nwata nwaokorobịa a mụrụ n'afọ 1998 na Legọs.

    Ọ gụrụ akwụkwọ elementịrị nakwa sekọndịrị na Legọs, mana ọ gabeghi mahadum.

  20. Idemmiri enwerela ọnọdụ na Umueze Aman dị n'Anambra steeti

    Idemmiri

    Ebe foto si, Eucharia

    Nke na-eme ugbua bụ na oke idemmiri sitere n'oke mmiri ozizo anọchiela ezi na ụzọ dị na ụfọdụ ebe n'Umueze Anam dị n'Anambra steeti.

    Ndị ọrụ gbata gbata n'Anambra steeti bụ Anambra State Emergency Management Agency agbarala ndị niile bi na-ogbe ahụ ama ka ha gbaa ọsọ ndụ ha mgbe oge ka dị.