Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Mmadụ itoolu anwụọla ka helịkọpta abụọ takọtara isi

    Helịkọpta

    Ebe foto si, EPA

    Ihe ruru mmadụ itoolu anwụọla dịka helịkọpta abụọ bu ndịagha mba Afganịstan merụrụ ahụ, takọtara isi n’obodo Southern Helmandn'ụtụtụ Wenezde.

    Ụfọdụ n'ime ndị nwụrụ bụ ndị a zụrụ azụ n'agha ụgbọelu.

    Ka akụkọ si na mba ahụ si kwuo, ọ bụ nsogbu mmebi injin butere ihe mberede a.

    Mara na ọgụ na-ada aghara aghara n'etiti ndị Taliban na ndịagha gọọmentị na mpaghara ahụ kemgbe ụbọchị ole na ole.

  2. I meela wee bịakwute anyị taa

    Nọnyere anyị dịka anyị na-ewetara gị akụkọ ndị ga-amasị gị ịkọ taa niile.

    Tụọ ute gị.

    Ndeewo.

  3. Ihe i kwesịrị ịma maka otu SWAT ga-anọchi anya SARS

    Muhammed Adamu

    Ebe foto si, NPF

    Onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Muhammed Adamu ehiwela ngalaba uweojii ohụrụ ga-anọchi anya SARS e kposara ekposa.

    Otu a kpọrọ 'Special Weapons and Tactics' (SWAT) ga na-arụ ọrụ ndị SARS e kposara ekposa na-arụ.

    N'ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Frank Mba wepụtara, ọ sị na a ga-eme ndị otu ọhụrụ a nyocha ụbụrụ nakwa ahụike iji mara ma tozuru ịrụ ọrụ ọhụrụ a.

    Ha ga-amalite ọzụzụ n'ụlọ ọzụzụ ndị uweojii niile dị na Naịjịrịa ebe ndị nke si na mpaghara ọwụwanyanwụ na Ndịda ga-eme nke ha na Rivers Steetị.

    E be ndị uweojii si na mpaghara Ọdịdanyanwụ na ugwu ga-enwe ọzụzụ na Nasarawa nakwa Ila-Orangun.

    Gịnị ga-emezi ndị uweojii SARS ugbua?

    Ndị ngalaba SARS

    Ebe foto si, NPF

    What about di disbanded SARS?

    Onyeisi ndị uweojii bụ Muhammed Adamu enyela iwu ka ndị ọrụ SARS niile e kposara ekposa wuchie n'isi ụlọọrụ ndị uweojii n'Abuja maka ajụjụ, nyocha ụbụrụ nakwa nke ahụike.

    Ha ga-agabiga nyocha a tupu a zụgharịa ha ma nabatakwa ha n'ọrụ ndị uweojii.

    Adamu sị na nke a dị n'usoro iwu na-achịkwa ndị uwojii na Naịjirịa, isi 18 amokwu nke 10 nke afọ 2020.

    Ọ sị na ndị ngalaba uwojii a kpọrọ 'Couselling and Support Unit (PCSU) bụ ndị ahazi ọzụzụ ha a.

  4. E zipula ndịagha n'ebe e nwere ọgbaghaara na Tunisia

    E zipụla ndịagha mba Tunisia n’ọgbọ ebe ndị uweojii na ndị ngagharịiwe sọkatara isi na mpaghara ugwu mba ahụ.

    Ọgbaghara a malitere mgbe gọọmentị kuturu ụlọ ebe a na-ere anwụrụ sịga ma gbuo onye nwe ya.

    Praịm mịnịsta mba Tunisia bụ Hichem Mechichi achụọla gọvanọ na-achị nwaobere oge iji belata iwe na-ewe ndị obodo.

  5. Akeredolu enwetela asambodo mmeri ya n'aka Inec

    Gọvanọ Rotimi Akeredolu

    Ebe foto si, TWITTER/AKEREDOLU

    Gọvanọ Ondo Steetị bụ Rotimi Akeredolu na osote ya a họpụtara bụ Lucky Ayedatiwa anatala asambodo mmeri ha na ntuliaka ọkwa gọvanọ Steetị ahụ site n'aka ụlọọrụ Inec.

    Akeredolu natara nke a n'aka kọmishọna Inec n'Ondo Steetị bụ Rufus Akeju n'idi ụlọọrụ a dị n'Akure, isi obodo Ondo.

    Gọvanọ kelere ụlọọrụ INEC maka ịhazi ntuliaka a n'ụdọ nakwa n'ụzọ dị mma n'ụbọchị Satọde.

    O kelekwara ndị ọrụ nchekwa maka ọrụ ọma niile ha rụrụ ịhụ na ntuliaka a gara n'udo.

  6. Etu e si gbuo Alexander Nwogu na mba Amerịka

    Alexander Nwogu

    Ebe foto si, Instagram/ Alexander Nwogu

    Dịka o ji ọkara gafee elekere mbụ nke isi ụtụtụ n'ụbọchị ise nke ọnwa Ọktoba ka ndị uweojii mba Amerịka gbatara inyere Alexander Nwogu aka, mana isi ya apụtaghị.

    Ndị uweojii obodo Washington DC bụ ebe nwaamadi a zutere ọnwụ ya, kọwara na ha hụrụ Nwogu ka ọ tọgbọrọ ka a gbachara ya egbe n'otu ọdọ mmanụ-ụgbọala, mgbe ha rutere.

    Dịka ha si kwuo, ndị ọrụ gbatagbata chọpụtara na ndụ apụọla ya n'ahụ.

    Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii obodo ahụ ewepụtala puku dọla iri abụọ na ise ($25,000) ha ga-akwụ onye ọbụla nwere ozi ga-enyere ha aka ịchọta ma nwụchie onye maọbụ ndị kpara arụ a.

    Nwogu dị afọ 23 mgbe ọ nwụrụ, ka nwetara ọrụ n'ụlọọrụ Ernst & Young, ebe o kwesịrị ibido ọrụ n'izu a.

    Ọ bụ onye Mbaise dị n'Imo steeti.

    Ndị mahadum ebe Nwogu ka gụchara akwụkwọ n'ọnwa Mee nke afọ 2020 a bụ Virginia Tech, dere ozi iti aka n'obi n'ihi ọnwụ ya n'elu Twitter ha.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  7. Buhari ahọpụtala Lauretta Onochie dịka kọmishọna INEC

    Lauretta Onochie

    Ebe foto si, Twitter/Laurestar

    Onyeisiala Muhammadu Buhari ezigala aha Lauretta Onochie bụ onye enyemaka ya pụrụ iche n'ihe gbasara soshal midia, n'aha ndị ọ chọrọ ka e mee kọmishọna ndị Independent National Electoral Commission (Inec).

    Onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Sinetọ Ahmad Lawan gụpụtara aha Onochie na mmadụ atọ ndị ọzọ dịka ndị onyeisiala Buhari denyere aha ha n'ozi o ziputara.

    O wepụtara aha Onochie dịka onye ọ chọrọ ka ọ na-achịkọta Inec na Delta steeti.

    Ndị ụlọomeiwu ukwu ga-enyocha ha mara ma ha etozuru ya bụ ọkwa.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  8. Super Eagles na Carthage Eagles ga-akwata ya taa

    Ndị otu Super Eagles nke Naịjirịa na Carthage Eagles nke Tunisia ga-ezute n’asọmpi enyi na enyi taa.

    Egwuregwu a a ga-agba na mba Austria ga-amalite dịka o ji ọkara gafee elekere asaa nke abalị.

    Cheta na Ọljiria ji otu goolu asaghị asa merie Naịjirịa n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Nọvemba a.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  9. Ị bọọla chi?

    Ọfọ anyị na-agọrọ gị n'ụtụtụ a bụ na ị ga-ebi ogologo ndụ n'ahụ isi ike.

    Iseee!

    Nọnyere anyị dịka anyị na-ewetara gị akụkọ ndị ga-amasị gị ịkọ taa niile.

  10. Amalitela ime Ọkaikpe Amy Coney Barrett nnyocha n'ulọomeiwu Amerịka

    Amy Cony Barrett

    Ebe foto si, Reuters

    Onye Onyeisiala Donald Trump họpụtara ịnọchịte anya Ruth Bader Ginsburg bụ Amy Coney Barrett si na obi di ya mma etu e si họpụta ya maka ọrụ a.

    O kwuru nke a dịka a malitere ikwu okwu banyere ọkwa ahụ onyeisiala Trump sị na ọ ga-arịgoro n'ụlọ Omeiwu ukwu nke Amerịka.

    Ndị Omeiwu nọ patị Demokrat achọghị ikwu okwu itinye mmadu n'oche ahụ dịka ha sị na ọ na-abịa n'oge ntuliaka iji họpụta onye ga-achị mba ahụ.

    Barrett dị afọ 48 si na ya ga-akwụwa aka ya ọtọ ma ya na-ekpe ikpe ya.

    O buru na Barrett rigoro n'oche ahụ dịka a na-atụ anya, ọ ga-eme ya onye nke isii bụ onye pati Repọblịkan nọ n'ụlọikpe kachasị n'Amerịka.

    Ndị pati Demokrat di mmadu atọ.

  11. 'Biko ụnụ ekwela ka ndị ajọ mmadụ were ohere ngagharịiwe a mebie ihe' - Sanwo-Olu

    Ndị ngagharịiwe na Legọs

    Ebe foto si, @jidesanwoolu

    Gọvanọ Legọs steeti bụ Babajide Sanwo-Olu arịọla ndị na-eme ngagharịiwe na Steeti ahụ ka iwe ha dị ọkụ dajụọ dịka ọ mere njem itiaka n'obi ebe ahụ. Sanwo-Olu sị na ọnwụ nwaamadị ahụ na Surulere ha ya bụ Ikechukwu Ilohamauzo gbara afọ iri ise na ise metutere ya ma na-arịọ igwemmadụ nọ ebe ahụ ka ha ghara ịpụta ngagharịiwe echi maka na Gọọmentị na-elebe anya n'iwe ha.

    Ọ gwara ha nwee ndịdị maka na ya na onyeisiala Muhammadu Buhari ga-ahụ echi itinye ọnụ n'okwu maka iwe ha.

    Ọ kwekwara ha nkwa na ndị ọrụ SARS niile gburu mmadụ maọbụ taa ndị mmadụ ahụhụ n'efu ga-anata ụgwọ ọrụ ha n'ụlọikpe.

    O kwuru na ọ kwụ ndị na-eme ngagharịiwe n'azụ maka na iwe ha ziiri ha mana ha biko doo doo doo kwusilata ya bụ ngagharịiwe echi dịka ana elebe anya ịma ụzọ ka mma iji gboo ya bụ ọgụ.

    Sanwo-Olu kwekere nkwa na-aga atọhapụ ndị niile ndị uweojii ji eji maka ngagharịiwe a n'abalị a.

  12. 'Onyeisi ndị uweojii enyela m ikike ihibe kọmiti ga-elebe anya na nhazi ọhụrụ ndị uweojii' - Davido

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Otiegwu bụ Davido na ndịisi ndị uweojii zutere na mkparịta ụka taa bụ ebe ha kwuru maka ngagharịiwe na-akpọtụ na Naịjirịa kemgbe abalị ise.

    Davido sị na ihe ha kpatara na ya bụ nzụkọ bụ na onyeisi ndị uweojii nyere ya ikike ka ọ ga hibe kọmiti nke ya iji nyochaa ma ya bụ nhazi ọhụrụ ha sị na ha ga-eme n'ọrụ ndị uweojii ọ dịka ka ha kwuru.

    Ụmụntorobịa Naịjirịa na-eme ngagharịiwe iji gosi obi ọjọọ ha nwere be ndị ọrụ uweojii, ọkachasị ndị otu SARS bụ ndị ha na-ebo na ha na-agbagbu ndị mmadụ aghara aghara, eleghị anya n'azụ.

    Onyeisiala Muhammadu Buhari apụtakwala kwuo na-ekposaala ndị otu ahụ ma kwekwa nkwa ịhazigharị ya bụ otu mgbe na-abịa n'ihu.

    Mana nke ahụ emeghị ka ya bụ ngagharịiwe beleta.

    Kama agbagburu otu onye na Surulere, Legọs, gbajie onye ọzọ ukwu ka ya bụ ngagharịiwe na-aga n'ihu na mpaghara ahụ.

  13. Ndị na-eme ngagharịiwe na Lekki egeghi Gọvanọ Sanwo-Olu ntị

    Sanwo-olu

    Ebe foto si, @gboyegaakosile

    Aka na-achị Legọs steetị bụ Babajide Sanwo-Olu gara ebe ndị mmadụ na-eme ngagharịiwe na mpaghara Lekki dị na Legọs dịka atụmatu ahu gbara ụbọchị isii.

    Ka oruru ebe ahụ, Sanwo-olu mere ka ọ kwuo okwu mana ndị nọ ebe ahụ ekweghi ịnụta ihe ọ na-ekwu.

    Ha malitere ịkwa ya emo na-asị ya "ihere, ihere, ihere".

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Sanwo-olu mechara kwuo okwu ma sị na ha na-eme ihe ndị na-eme ngagharịiwe chọrọ ka ha mee.

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

  14. Ụlọomeiwu Edo steeti achụpụla onyeisi ha

    Francis Okiye

    Ebe foto si, Facebook/FrancisOkiye

    Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na ndị ụlọomeiwu nke Edo steeti achụpụla onyeisi ha bụ Francis Okiye n'oche ọchịchị.

    Nchụpụ ya na-abịa dịka onyeisi pati kacha n'ụlọomeiwu ahụ bụ Henry Okhurobo kwulitere okwu ka a chụpụ ya n'ihi ihe ọ kpọrọ "aka ike n'etu o si achị".

    Ndị omeiwu itoolu n'ime iri nọ mgbe e mere nzukọ a binyere aka n'akwụkwọ ka a chụpụ ya.

    Ha gakwara n'ihu duo Marcus Onobun na-anọchite anya ndị Esan West n'ụlọomeiwu steeti n'iyi ọrụ dịka onyeisi ọhụrụ.

  15. Ndị nkuzi achụpụla ụmụakwụkwọ n'Abuja

    Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na ndị nkuzi achụpụla ụmụakwụkwọ praịmarị na klaasị n’Abuja.

    Otu ndị nkuzi bụ Nigeria Union of Teachers nke Abuja, bụ ndị chụpụrụ ụmụaka a, dịka ha kwuru sị na ha mere nke a n’ihi na ndị isioche mpaghara ahụ ajụla ịkwụ ha ụgwọọnwa opekatampe nakwa ụgwọ ndị e jibu ha.

    A hapụrụ ka ụmụ sekọndrị nke nta nọrọ n'ụlọakwụkwọ, n'ihi na gọọmentị Abuja akwụọla ndị nkuzi nke ha ụgwọ.

    Cheta na Stephen Knabayi bụ onyeisi otu ndị nkuzi a gwara ndị otu ya ka ha ghara ịlaghachị n'ụlọakwụkwọ mgbe ọbụla gọọmentị nyere iwu ka ụlọakwụkwọ mepee.

    O kwuru na ebe Federal Capital Territory Administration (FCTA) maliterela ịkwụ ụgwọ opekatampe a, mpaghara isii ndị ọzọ nọ n'okpuru Abuja ajụla ịkwụ ụgwọ a.

    Mara na FCTA site n'ọnụ Minista ndị FCT bụ Malam Muhammad Musa Bello, kwuru ka ụlọakwụkwọ mepee taa bụ ụbọchị 12 nke ọnwa Ọktoba, mana ha kwuputere na ha akagbuola agba nke atọ nke Bekee kpọrọ "Third term", ma dọkwaa ndị ụlọakwụkwọ abụghị nke gọọmentị aka na ntị ka ha ghara ịna ndị mmadụ ego ụgwọ akwụkwọ maka agba nke a kagburu.

  16. LA Lakers ebuliela Iko NBA nke ugboro 17

    Ndị Los Angeles Lakers bụ otu egwuregwu nkata na mba Amerịka ebuliela iko NBA nke ugboro iri na asaa.

    Lakers meriri Miami Heat 106-93 iji bulie ya bụ iko.

    Mara na Lakers nke Lebron James nyere aka bute iko a, chere afọ iri ọzọ tupu iko a erute ha aka ọzọ.

    Chetakwa na Kobe Bryant nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu helịkọpta n'ụbọchị Jenụwarị 26 nke afọ 2020 a, ka na-atụ bọolụ n'afọ 2010 bụ mgbe ikpeazụ aka ha metụrụ ya bụ iko.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    James na onwe ya ritekwara "ọkacha agba nke asọmpi"

    Skip X post, 3
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 3

    Ndị na-atụrụ Lakers bọọlụ kwuru na ha gbara mbọ ibute iko a ka ha nwee ike jiri ya kwanyere Bryant tụrụ otu ahụ bọọlụ afọ 20, ugwu.

    Skip X post, 4
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 4

    Skip X post, 5

    End of X post, 5

  17. Ị bọọla chi?

    Ka ụbọchị taa maara gị mma o! Iseee!

    Nọnyere anyị taa ka anyị wetara gị akụkọ ga-amasị gị ịkọ taa niile.

  18. 'Achọrọ m iji egwuregwu 'gymnastics' gaa Olimpiks - Stephanie

  19. Ka chi fonụ

    Ụmụ Igbo, anyị ga-akwụsị ebe a taa.

    Ka ọ dị echi.

  20. Mmadụ anọ anwụọla n'ụlọ dara ada na Legọs

    Ụlọ dara ada

    Ebe foto si, Lasema

    Nkọwa foto, Mmadụ asatọ ka azọpụtara n'ime ụlọ a

    Mmadụ anọ, gụnyere ụmụnwoke atọ na otu nwaanyị, anwụọla n'ụlọelu ogogo atọ dara ada na mpaghara Obalende na Legọs steeti.

    Onyeisi ngalaba gbatagbata nke steeti ahụ bụ Nosa Okunbor kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o zigaara ndị ntaakụkọ.

    Nwoke a so n'otu n'ime ndị a zọpụtara

    Ebe foto si, Lasema

    Nkọwa foto, Nwoke a so n'otu n'ime ndị a zọpụtara

    O kwuru na ya bụ ihe mere oge ọ fọrọ nkeji iri abụọ ka ọ kụọ elekere isii nke mgbede ụbọchị Sọnde.

    Site n'enyemaka ndị mmadụ, a zọpụtara mmadụ asatọ n'ime ya bụ ụlọ, ma buru ha gawa ụlọọgwụ.

    Mmadụ asatọ bụcha ụmụnwoke.