Mkparịtaụka Naira Marley na Frank Mba e nweela mkparịtaụka n'elu instagram maka FSARS

Ebe foto si, Naira Marley Instagram
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Naịjirịa bụ Frank Mba na otiegwu ama ama bụ Naira Marley na-enwe mkparịtaụka gbasara mmegide Federal Special Anti-robbery squad(FSARS) na-emeso ụmụ Naịjirịa.
Lee ihe ha kpara maka ya:
- Mba kwuru na ha e jighị mmachị FSARS inyocha ekwenti na kọpmụta ụmụ Naịjirịa n'okporoụzọ egwu egwu
- Naira Marley kwuru na ya achọghịzị ka ndị otu FSARS na-amaja ụmụ Naịjiịa maka uwe ha yi n'ahụ maọbụ udiri isi ha kpụrụ
- Frank Mbah kwuru na ọ chọrọ ka ụmụ Naịjirịa ghara iji ozi ọhụrụ a ha zipuru n'ikpeazu maka mmachị ngagharị ọrụ FSARS gwu egwu.
- O kwuru na o nweghị onye uweojii kwesiri ị na-eyi akwa nkịtị eme ọrụ ya
- Mba kwuru na sọsọ ndị ga-anagharị ugbua bụ ndị uweojii a kpọrọ "Rapid Response Team"
- O kwuru ka ndị Naịjirịa na-etinye akwụkwọ mgbe ọbụlka ohere pụtara n'ụlọ ọrụ ndị uweojii maka iwee ndị madụ n'ọrụ, ka ha wee sonye n'ime oke ha n'imezi ihe mebiri emebi na ngalaba ahụ
- O kwukwara na ọ bụrụ na ụmụ Naịjirịa hụ onye uweojii na-akpa agwa ọjọ, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe gị omume site ya n'onyonyo zitere ndị uweojii.
Ihe mere Naira Marley ji yigharịa ngagharaiwe ọ chọbụrụ ime
Azeez Adeshina Fashola eji Naira Marley mara agwala ụmụ Naịjirịa ha agaghị emezi ngagharịwe gbasara mmegide ụfọdụ ndị otu Federal Special Anti-robbery squad(FSARS) na-emeso ụmụ Naịjirịa.
O kwuru na nkea bụ makana o nwere ọtụtụ mgbanwe a na-eme ugbua. N'okwu ya. "dịka ndị Marlian anyị bụ, anyị ga-enye ha otu izu ụka iji hụ mgbanwe ndị a , emeghị etu a, anyị ga-aga n'ihu mee ngagharịwe."
O jikwa ohere ahụ kwuputa na ya na onụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Naịjirịa bụ Frank Mba ga-enwe mkparịtaụka n'elekere iri na otu nke ụtụtụ Ọktoba 6,2020.
Ndị uweojii apụtabuola kwuo na ha anụla mkpesa ndị ntoroọbịa na-eme gbasara agwa ọjọ ụfọdụ ndị FSARS na-akpaso ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1

End of X post, 2

Ebe foto si, Naira Marley twitter
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3

End of X post, 4