Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Gọvanọ Ganduje achụọla onye ọrụ ya maka ịkatọ Buhari

    Yakasai na Ganduje

    Ebe foto si, Salihu Tanko Yakasai

    Nkọwa foto, Salihu Tanko Yakasai na Gọvanọ Abdullahi Umar Ganduje

    Gọvanọ Abdullahi Umar Ganduje nke Kano steeti achụọla onye ndụmọdụ ya bụ Salihu Tanko Yakasai maka ide ihe na soshal midia na-akatọ onyeisiala Muhammadu buhari.

    Kọmishọna mgbasa ozi nke Kano steeti, bụ Muhammad Garba, kwuru nke a n'akwụkwọ ozi nke o wepụtara n'ụbọchị Sọnde.

    Dịka ngagharịiwe maka mmekpa ahụ ndị uweojii na-aga n'ihu, Yakasai kwuru na ọ dị nnukwu mwute etu onyeisiala si agba nkịtị mgbe ndị mmadụ na-ekwupụta etu ihe si ara ha ahụ na Naịjirịa.

    O kwuru sị: "Ugboro ugboro, ị gaghị ewepụta naanị nkeji ise iji gwa ndị mmadụ ka ha wetuo obi. Ndị mmadụ i mere njem gaa steeti iri atọ n'isii na-arịọ ha ka ha tụnyere gi vootu. Ihe a na-agbawa obi."

    Ihe Yakasai dere na Twitter

    Ebe foto si, Twitter

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Yakasai gara n'ihu kwuo sị: "Ihe ọbụla ị na-eme na ndụ a, ekwekwala ka olu gi fuo. Kwusie okwu ike megide ihe ọjọọ, kwusie okwu ike banyere ihe i kwenyere na ya. Ekwekwala ka ọkwa ị nọ na ya nwa mgbe nta gbochie gi ịkwụnyere ndị nke gị."

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    Dịka kọmishọna mgbasaozi nke Kano steeti si kwuo, Yakasai akọwaala na ihe o kwuru bụ uche aka ya, ọbụghị ihe gọvanọ Ganduje sị ya kwuo.

    Mana Muhammad Garba kwuru na "dịka onye na-ekwuchitere gọvanọ, ụfọdụ ndị mmadụ agaghị ama mgbe Yakasai na-ekwu uche ya maọbụ mgbe ọ na-ekwuru gọọmentị kano steeti."

  2. England emeriela Belgium n'asọmpi Uefa Nations League

    Rashford

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Rashford ji penariti nye goolu n'asọmpi a

    Mba England ewerela ọkpụ goolu abụọ a satara otu merie mba Belgium n'asọmpi Uefa Nations League.

    Marcus Rashford na Mason Mount bụ ndị nyere goolu abụọ England ji nwee mmeri, ebe Romelu Lukaku nyere otu goolu ndị Belgium.

    Ndị Belgium bụ uzọ nye goolu oge Eric Dier kwaturu Lukaku wee nweta Penariti.

    Mana England nwetakwara penariti nke ha, bụ nke Rashford gbakpuru, tupu Mason Mount enye goolu nke abụọ.

    Mmeri a mere ka England rigoro n'ọkwa nke mbụ n'otu E.

    Lee ka ihe si kwụrụ ugbua:

    Otu E nke Uefa Nations League
  3. Nadal emeriela French Open nke afọ 2020

    Rafael nadal

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Nadal kụpịara Novok Djokovic iji bulie iko French Open nke afọ a

    Rafael Nadal emeriela Novak Djokovic iji turu ugo n'asọmpi tennis French Open nke afọ 2020.

    Nadal ji ọkpụ 0-6 2-6 5-7 wee mrie ya bụ asọmpi.

    Nke a bụ iko French Open nke iri na ise Nadal na-ebuli kamgbe afọ 2005

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    N'ihi mmeri a, Nadal achụkwutala Roger Federer dịka ndị kacha buo iko n'asọmpi Tennis.

    Federer ebuola iko iri abụọ, Nadal ebuola iri abụọ, ebe Djokovic buru iri na asaa.

    Ndị ọkaibe na Tennis
  4. Etu ihe mberede ụgbọloko na ụgbọala si taa isi mmadụ 18

    Mberede ụgbọloko na ụgbọala

    Ebe foto si, Reuters

    Ụgbọala Bus na ụgbọloko sọkọtara isi na Thailand, gbuo mmadụ ruru iri na asatọ ma merụọ ọtụtụ ndị ahụ.

    Ihe mberede a mere n’ụtụtụ ụbọchị Sọnde n’ebe ji kilomita iri ise dị nso na mpaghara ọwụwanyanwụ Bangkok.

    Ndị uweojii Thailand sị na ndị nọ n'ime ụgbọala a na-aga n'ụlọokpuruchi ịga mechie obubu ọnụ Buddhist.

    Foto si ebe ahụ na-egosi ka ụgbọala a sọgharịrị n'akụkụ ya dịka ọ kpọkasịchara n'okporo ụgbọloko ahụ.

    Ndị ọrụ gbata gbata sị na ha chọrọ iji ngwaọrụ 'crane' ebupụta ụgbọala ahụ.

    Mmadụ dị iri isii nọ n'ime ụgbọala ahụ na-eme njem mgbe ihe mberede a mere dịka gọvanọ mpaghara ahụ bụ Maitree Tritilanond si kwuo.

    Praịm minista mba Thailand bụ Prayut Chan-O-Chan ezigala ozi iti aka n'obi ma kpọọ oku ka e mee nyocha ọfụma.

    Ihe mberede ụkporoụzọ na-emekarị na mba, nke a abụghị mbụ.

    N'ọnwa Maachị afọ 2018, ihe karịrị mmadụ iri na asatọ nwụrụ ebe ọtụtụ merụrụ mgbe ụgbọala hapụrụ ụzọ ma sọnye isi n'osisi na mpaghara ọwụwanyanwụ Thailand.

  5. Ọtụtụ mmadụ etinyela aka n'akwụkwọ ka Amerịka machie ndị ọchịchị Naịjirịa ịbata mba ha

    Ndị na-eme ngagharịiwe maka mkposa SARS
    Nkọwa foto, Ndị na-eme ngagharịiwe maka mkposa SARS

    Mmadụ karịrị puku iri etinyela aka n’akwụkwọ mkpesa e degara mba Amerịka ka ha kwụsị ndị ọchịchị Naịjirịa ịbata Amerịka ma ọ bụrụ ha ekposaghị ngalaba uweojii SARS.

    Ntinyeaka n’akwụkwọ a malitere n’ụbọchị Fraịde dịka ọkpụkpọ oku ka e kposaa ngalaba uweojii na-arị elu.

    Onye malitere ya bụ onye ntaakụkọ Farida Adamu

    Cheta n’ọnwa gara aga na mba Amerịka kwuru na amachiela inye ụfọdụ ndị ịbata mba ha n’iyi agwa ha kpara na ntuliaka ọkwa gọvanọ Bayelsa na Kogi Steetị n’afọ 2019.

    N’otu aka ahụ ka ndị a kpọrọ oku ka gọọmentị mba Amerịka machikwuo ndị ọchịchị Naịjirịa ịbata Amerịka ruo mgbe ha ga-ekposa ngalaba uweojii SARS.

  6. Nwakpo n'ike bụ nsogbu kachasị emetụta nwata nwaanyị - FIDA

    Mwakpo ụmụaka ụmụnwaanyị

    Dịka taa bụ ụbọchị ncheta nwata nwaanyị n'ụwa a kpọrọ 'International Day of Girl Child' otu jikọtara ụmụnwaanyị ọkaiwu etinyela ọnụ na nsogbu ụmụnwaanyị na-agabiga ọkachasị ụmụaka.

    Otu a kpọọ 'International Federation of women lawyers sị na nsogbu kachasị emetụta nwata nwaanyị bụ idina ya n'ike (Rape) n'ime nsogbu ndị ọzọ.

    Ha kpọrọ oku ka steetị niile tinye iwu ga-enye aka belata ụdị arụ a a na-akpa megide ụmụnwaanyị n'obodo.

    Onyeisi otu a nke ngalaba Ebonyi Steetị bụ Grace Iheanacho Chima gwara ndị ntaakụkọ nke a n'Abakiliki, sị na a nwe ọtụtụ akụkọ banyere mwakpo ụmụaka nwaanyị dị n'ogogo ọnwa itoolu ruo afọ asaa kwa ụbọchị.

    Ọ sị na na-akpatakarị nke a bụ enweghi ezi ọzụzụ na nlekọta site na nne na nna mụrụ ụmụaka ndị a, na e kwesịrị ịkwụsị ya tupu obodo a laa n'iyi.

    Iheanacho sị ihe ọzọ a na-ema ụmụaka nwaanyị gụnyere; ịtụ ha mgbere, ịkpagbu ha, enyeghi ha ezi ọzụzụ n'ụlọakwụkwọ, ịnye ọrụ siri ike, ịlụnye ha di na nwata, ịkpasị ha oke na ije ndị ọzọ.

    Ọ kpọrọ oku ka gọọmentị lebara ụmụaka ụmụnwaanyịa anya n'ụzọ zuruoke iji kwụsị arụ ndị a a na-akpa megide ha.

  7. Igbo bụ Igbo, unu abọọla chi?

    I meela n'isonyere anyị n'ụbọchị gara aga.

    Anyị ji ụkpa ekele anabata unu n'ụbọchị taa.

  8. Ka chi fo nụ

    N'ebe a ka anyị ga-eweta mgbasaozi nke taa n'isi njedebe.

    Ka ọ dịnụ echi.

  9. Ọ bụghị anyị gburu onye nwụrụ na ngagharịiwe n'Ogbomoso - Ndị uweojii

    Mohammed Abubakar

    Ebe foto si, Ndị uweojii Naịjirịa

    Nkọwa foto, Onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Abubakar

    Ndị uweojii n'Oyo steeti ekwuola na ọbụghị ha gburu nwata nwoke ahụ nwụrụ na ngagharịiwe n'Ogbomosho.

    Cheta na Gọvanọ steeti ahụ kwuru na ọ bụ mgbọ tụgburu nwata nwoke a aha ya bụ Jimoh Isiaq.

    Mana onụ na-ekwuru ndị uweojii na Oyo steeti bụ Olugbenga Fadeyi kwuru na ndị otu ya nọ mgbe ihe na-eme kwuru na ha agbapụghị kama otu ọnụ egbe.

    Dịka ụlọọrụ ntaakụkọ News Agency of Nigeria si kwuo, Fadeyi kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o nyere ndị ntaakụkọ.

    O kwuru sị: "Ndị uweojii nọ ya mgbe ngagharịiwe a na-eme kwuru na ha agbapụghị kama otu ọnụ egbe."

    "Anyị hapụrụ ndị ahụ na-eme ngagharịiwe ruo ihe karịrị otu awa, mana ụfọdụ n'ime ha chọziri ịwakpo ụlọọrụ anyị."

    "Ọ bụ oge ahụ ka ndị uweojii ji gbaa anwụrụ ose (tear gas) iji chụsaa ha, mana anyị agbaghị egbe ọbụla.

    Otu dị icheiche, tinyere Amnestry International kwuru na ọnwụ Jimoh Isiaq dị ndị uweojii n'isi.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  10. Mgbọ ndị uweojii atụgbuola otu onye na ngagharịiwe n'Oyo steeti

    Ndị uweojii

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ọ bụghị ndị nọ na onyonyo a ka akụkọ a na-ekwu maka ya

    Otu onye aha ya bụ Jimoh Isiaka alaala mmụọ dịka mgbọ ndị uweojii tụrụ ya oge a na-eme ngagharịiwe n'obodo Ogbomoso dị n'Oyo steeti.

    Gọvanọ steeti ahụ bụ Seyi Makinde kwupụtara nke a n'akara Twitter ya na mgbede Satọde.

    O kwuru na aka ike nakwa mmekpa ahụ ndị uweojii na-emeka ụmụ mmadụ na Naịjirịa bụ nnukwu ihe mwute.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Makinde kwukwara na mmadụ asaa ọzọ merụkwara ahụ na ngagharịiwe ahụ; aha abụọ n'ime ha bụ Abdulrasaq Olawale na Oluwadamilare Gbolohunmi.

    O kwuru sị: "Ngagharịiwe a egosila na ndị iwu Naịjirịa nyere ikike ichekwa ụmụ mmadụ anaghị eme nke a."

    "O gosikwala mkpa ajụjụ anyị na-ajụ kamgbe dị, nke bụ ihe kpatara na ndị gọvanọ enweghị ike ịchịkọta ndị uweojii nọ na steeti ha."

    Makinde gara n'ihu kpọọ oku ka ndị ntorobịa steeti ahụ wetuo obi maka ihe a merenụ n'ihi na ọ gwala onyeisi ndị uweojii Oyo steeti bụ Nwachukwu Enwonwu, na ndị isi ọrụ nchekwa ndị ọzọ ka ha bịa kọwaara ya ihe kpatara ọnwụ nwata nwoke ahụ.

    Ihe onyonyo ndị mmadụ tinyere na Twitter gosiri na e liela ya bụ nwata nwoke dịka usoro okpukperechi ndị alakụba si dị.

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

  11. Ngagharịiwe maka SARS eruola mba Canada

    Ndị na-eme ngagharịiwe

    Ebe foto si, Twitter Screengrab

    Ụmụ Naịjirịa bi na mba Canada sonyekwara ndị nọ na Naịjirịa na-eme ngagharị iwe ma na-akpọ oku ka gọọmentị mechie ngalaba ndị uweojii a kpọrọ Sars.

    Ihe onyonyo e tinyere na Twitter gosiri ebe ha jicha ọkọlọtọ Naịjirịa ma na-ekwe ukwe njirimara Naịjirịa bụ 'National Anthem'.

    ọtụtụ n'ime ha na-etikwa mkpu ka gọọmentị mechie SARS n'egbughị oge.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  12. SARS: Mba Sweden etinyela ọnụ katọọ aka ike ndị uweojii na Naịjirịa

    Carl Michael Gräns

    Ebe foto si, Twitter/@cmgrans

    Nkọwa foto, Carl Michael Gräns bụ onye na-anọchite anya mba Sweden na Naịjirịa, Ghana nakwa Cameroun

    Mba Sweden ekwuola na ha anaghị akwado mmekpa ahụ ndị uweojii na-emekpa mmadụ na Naịjirịa.

    Ha kwuru nke a dịka ihe onyonyo na-apụta na soshal midi etu ndị uweojii si eji aka ike achụsasị ndị na-eme ngagharịiwe.

    N'ozi ha zipụrụ n'akara Twitter ha, ụlọ nnọchite anya mba Sweden na Naịjirịa kwuru na ha agaghị akwado mkpagbu ikike dịịrị ndị mmadụ ine ngagharịiwe ma kwuo uche ha.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Nke a na-abịa dịka akụkọ na-ekwu na ndị uweojii gbagburu otu onye aha ya bụ Jimoh Isiaq n'obodo Ogbomosho nke dị n'Oyo steeti.

    Ụlọọrụ na-ahụkwa maka ikike dịịrị onye bụ Amnesty International, tinyekwara ọnụ ma kwuo na ọ bụ ndị uweojii gburu onye ahụ.

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    BBC achọpụtachabeghị ihe merenụ kpọmkwem, mana ya bụ akụkọ ka ga-abịa.

    Ndị uweojii ekwubeghịkwa ihe ọbụla gbasara ya.

  13. Ezenwaanyị Elizabeth etunyela Rashford ugo pụrụ iche

    Marcus Rashford
    Nkọwa foto, Marcus Rashford

    Ezenwaanyị Eliza etunyela ọgba bọọlụ ndị Manchester United bụ Marcus Rashford ugo pụrụ iche maka mbọ ọ gbara inye ụmụaka onweghị ka ọ ha ha nri, n’oge a kpọchiri obodo maka ọrịa covid-19.

    Nturu ugo bụ nke Bekee kpọrọ ‘Member of the Order of the British Empire’ (MBE).

    Rashford tinyere ego ya ma kpọkwaa oku ka ndị mmadụ tụkọta ego iji na-enye ụmụntakịrị nri.

    Dịka a malitere ịgbape obodo obere obere, Rashfor gakwara n'ihu n'atụmatụ ahụ ma rịọkwaa gọọmentị ka ha tinye aka.

    Oge Rashford malitere atụmatụ a, o bu n'obi na ndị mmadụ ga-etinye aka tụkọta otu narị puku paụnd (£100,000), mana ka ọ dị ugbua, ego a tụkọtara agafeela nde paụnd iri abụọ (£20 million).

  14. Burna Boy etinyela ọnụ n'okwu maka ịkwụsị SARS

    Burna Boy

    Ebe foto si, Instagram/Burna Boy

    Otiegwu aha ya na-ewu n'ụwa niile bụ Burna Boy etinyela ọnụ ya n'okwu gbasara mmekpa ahụ ndị uweojii na-emekpa ndị mmadụ na Naịjirịa.

    Nke a na-abịa dịka ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ ya maka ịgbachị nkịtị kamgbe ngagharịiwe malitere ịrị ibe ya elu maka nke a.

    O kwuru na ya agaghị agbachị nkịtị gbasara nke a n'ihi na ya bụ ihe jọgburu onwe ya.

    Burna Boy gara n'ihu kwuo sị: "Ihe kacha m mkpa ugbua bụ ka ndị ka e mechie ngalaba ndị uweojii a bụ SARS."

    "O doro m anya na ihe a na-emebu na mbụ bụ ịgbanwe aha ha, nye ha aha ọhụrụ, mana ugbua, ihe anyị chọrọ bụ ka e mechie ya kpamkpam."

    Burna boy kelere ndị niile sonyere na ngagharịiwe na-aga n'ihu na steeti dị icheiche na Naịjirịa ugbua.

    O kwukwara na ya ga-ewepụta ego iji nyere onye ọbụla merụrụ ahụ na ngagharịiwe a aka.

    Ọ gakwara n'ihu kwuo na ya ga-emepe ngalaba ga-enye aka ịkuziri ndị na-eto eto maka ntọala Naịjirịa nakwa Afrịka.

    Burna Boy kpọpụtara aha ụfọdụ ndị akụkọ kwuru na ha nwụrụ n'aka ndị uwe ojii ma kwuo na agaghị echefu aha ha.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  15. Ndị uweojii ejirila egbe kụsasịa ndị na-eme ngagharịiwe na Ogbomosho

    Ihe onyonyo pụtara na soshal midia na-akọwa na ndị uweojii ji mgbọ egbe chụsasịa ndị na-eme ngagharịiwe maka mkagbụ ha na-ebo ndi uweojii SARS n'Ogbomosho di n'Oyo steeti.

    Otu onye nọ oge ihe mere gwara BBC na mgbo egbe tụrụ otu onye mana ya akpọrọla ya gaa ụlọ ọgwụ.

    Onye ahụ zitere BBC ihe onyonyo gosiri ebe a ba-acho ịzọ onye bu akpa yiri nke mgbọ egbe.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Ọnu na-ekwuru ndị uweojii n'Oyo steeti Fadeyi Olugbenga gwara BBC na onweghi onye ọbụla ha gbara egbe, ma kwụọ na ọ bụ anwụrụ anya mmiri ka ha jiri kụsasịa ndị a na-eme ngagharịiwe.

  16. Emebiela ọtụtu ihe dịka ọgbaghara dara n'etiti ndị Awụsa na Yoroba n'Ikorodu dị na Legọs

    Mpaghaara obodo Igbo-Olomu dị n'Isawo-Agric nke di n'okpuru ọchịchị Ikorodu, na Legọs steeti chiobi ha n'aka dịka ọgbaghara dara n'ebe ahụ ụbọchị Fraịde.

    Onye ntaakụkọ BBC bi n'ogige ihe a na-me kwuru na ebe niile juru oyi ugbua dịka ndi mmadụ nọ na-ezere isi ha n'ime ụlọ ha.

    Akụkọ na-ekwu na nsogbu a malitere n'ụbọchi Monde dịka ikorobia ụfọdụ si agbụrụ abụọ a lụsịrị onwe ya ọgụ n'ebe ahụ.

    Ugbua, ọkụ ndị a na-ese okwu mụnyere agbaala ọtụtụ ọdọ ahịa.

    Ikorodu
    Nkọwa foto, Ndi mmadụ nọcha n'ime ulọ ha eze isi ha maka ọgbaghara a dara na Fraịde
    Nsogbu Ikorodu
    Nkọwa foto, Onye ntaakụkọ BBC si na ebe niile di juo ugbua

    Ihe onyonyo ndi mmadụ tinyere na soshal midia na-egosi oge ọgbaghara ka dị ọkụ, dịka nke a etinyere na Twitter n'ụbọchị Tọzde.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  17. Algeria adụnyela Naịjirịa otu ọnụ akara n'asọmpi enyi na enyi

    Super Eagles nke Naịjirịa

    Ebe foto si, Super Eagles/Twitter

    Otu egwuregwu bọọlụ mba Ọjerịa ji otu ọkpụ goolu anasataghị merie ndị Super Eagles nke Naịjirịa n'asọmpi enyi na enyi ha gbara na Fraịde.

    Goolu a bịara n'ime nkeji isii a malitere asọmpi a site n'aka Ramy Bensebaini nke Ọjerịa.

    Naịjirịa nwara ike ha ịsa goolu a mana ndị Ọjerịa fooro ntụtụ taa sị na nke a agaghị eme, ebe na Naịjirịa kwechikwara nke ga.

    Nke a bụ asọmpi mbụ oche goolu ndị Naịjirịa bụ Maduka Okoye na-amalite.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  18. Agwaala onyeisi ndi uweojii ka ọ mee ihe maka SARS - Buhari

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari kwuru na ya na onyeisi ndi uweojii bụ Muhammed Adamu zutere n'obi gọọmentị n'Abuja maka okwu ngalaba uweojii a na-akpọ SARS.

    Buhari sị na ya agwaala maazị Adamu ka ọ gbaa mbọ lebanye anya n'okwu ndị ntoroọbịa na-eme ngagharịiwe na-eme banyere mmekpa ahụ ha na-ebe ndị ọrụ uweojii SARS.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Buhari sị na ya enyela iwu ka anwụchie onye uweojii ọbụla aka ya dị n'ajọ ihe ndị a na-ebo ndị SARS.

    Ọ rịrịọ arịrịọ ya ndi mmadụ nwee ume ala dịka ha na-eme ngagharịiwe n'udo.

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

  19. Unu asaala chi?

    Anyị na-enye unu ekene pụrụ iche dịka unu na-esonye anyị taa.

    Akụkọ pụrụiche ga-esi ebe ruo unu aka.

    Ya gazie.

  20. Ka chi fo

    Ụmụ Igbo, anyị ga-akwụsị ebe a taa.

    Ka chi fo nụ.