Chaịna atụọla ogbunigwe n’akụkụ mba Taiwan dịka Pelosi si ebe ahụ pụọ
Dịka onyeisi ụlọomeiwu mba Amerịka bụ Nancy Pelosi si Taiwan pụọ n’ụbọchị Wenezde, Chaịna atụọla ogbunigwe n’akụkụ mba ahụ nke so n’usoro ọzụzụ ndị agha ha malitere n’ebe ahụ mgbe ozi ọbịbịa Pelosi dapụtara.
Mba Taiwan kwuru na Chaịna tụnyere ogbunigwe 11 n’ime oke osimiri nọ na mpaghara Ugwu nakwa mpaghara ndịda mba ha.
Mba Japan kwukwara na ise n’ime ndị ogbunigwe a tụrụ danyere n’oke osimiri nọ na mba ha ma kpọọ oku ka ya bụ ọzụzụ ndị agha Chaịna na-eme kwụsị ngwa ngwa.
Cheta na Chaịna anabataghị ọbịbịa Pelosi na Taiwan dịka ha kwuru na ọ ga-etinye nsogbu n’okwu ha na ọchịchị Taiwan.
Chaịna na-ahụ Taiwan ka mba si na mba ha kwewapụ nke ha nwere olileanya na ha ga-eweghara ọchịchị ya bụ mba.
Dịka Taiwan na-ahụ onwe ya dịka mba nwererela onwe ha n’aka Chaịna kemgbe afọ 1950, Amerịka anaghị ahụ ha etu a mana ha na mba Amerịka nwere ọtụtụ mmekọrịta nke gụnyere iresi Taiwan ngwa agha ha ji echekwa onwe ha.