You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ndị Ebubeagu anọghị n'Oba Anambra Steeti - Onye ndu Oba

Onye ndu obodo Oba sị o nweghi ndị Ebubeagu nọ n'Obodo ha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ndị agha Naịjirịa egbuola ndị ESN abụọ n'Imo steeti

    Ndị agha Naịjirịa egbuola ndị otu Ipob abụo n'Orsu dị n'Imo steeti.

    N'ozi ọnụ na-ekwuru ha bụ Onyema Nwachukwu wepụtara, o kwuru na nke a mere site na njikọ aka ndị agha, ndị agha elu, ndị agha mmiri nakwa ndị nchekwa ndị ọzọ.

    Ha kwuru na ha chọtara ndị ahụ dịka ha na-eme ngagharị nnyocha n'okporoụzo si Eke Ututu gawa Ihitte Nansa.

    Ha kwukwara na otu oggbunigwe ha wepụtara gbapụrụ n'ahịa ahụ mana o nweghi onye merụrụ ahụ na ya bụ ihe.

    Ihe ndị ha napụrụ ndị ahụ gụnyere ogbunigwe dị icheiche nakwa ngwa eji agbapụ ya bụ ogbunigwe bụ 'Rocket launcher' na Bekee.

  2. Ndị ọrụ nchekwa Legọs steeti egosila njikere ha maka ịkwụsị ọkada

    Ndị ọrụ nchekwa na Legọs steeti adịla njikere Ịmanye iwu mmachị ọgba tum tum ịgba n'okpuru ọchịchị ọhụrụ abụọ na steeti ahụ.

    Gọọmenti steeti ahụ wepụtara akwụkwọ ọhụrụ nke kwuru na malite n'ụbọchị mbụ n'ọnwa Sepụtemba na a ga-amachi ndị ọgba tumtum ịgba n'okpuru ọchịchị Kosofe, Oshodi-Isolo, Shomolu na Mushin.

    Cheta na a machiri ọgbụgba ọgba tumtum n'okpuru ọchịchị isii n'ọnwa Mee bụ ọkpụrụ ọchịchị Ikeja, Surulere, Eti-Osa, Lagos Mainland, Lagos Island na Apapa.

    Nke a bụ ị ji wulite nchekwa nakwa maka etu ndị ọgba tumtum sịrị tigbuo ma gbaa otu nwoke ọkụ n'ọnwa Mee maka ebubo ego njem ọ mere.

  3. Etu ụmụakwụkwọ abụọ si nwụọ n’ime ụlọ ebe ha bi

    Ụlọakwụkwọ mahadum Kwara State ekwuola na ụmụakwụkwọ ha mmadụ abụọ nwụrụ n’ebe ha bi nke dị na mpụta ime ụlọakwụkwọ ahụ.

    Ọnụ na-ekwuru ụlọakwụkwọ a bụ Saeedat Aliyu gwara BBC na ha ewepụtabeghi ozi banyere dị ka nyocha ka na-aga n’ihu.

    Ọ sị na ọ bụrụ nyocha a zuo oke, na ha ga-ewepụta ozi banyere ọnwụ ụmụakwụkwọ a.

    Kedụ etu ihe a si mee?

    Ozi si n’aka ụlọntaakụkọ kwuru na Tobiloba Daniel na Arewa Abayomi nọcha n’ogogo agụmaakwụkwọ 200 level n’ụlọakwụkwọ a bụ enyi nwoke na nwaanyị.

    Ha abụọ nọ n’ime ụlọ na-akwado maka ule ha kwesịrị ile mgbe ihe ọdachi a mere.

    Otu nwata akwụkwọ na-achọghị ka a kpọọ aha ya sị “Anyị na-eche na ha na-ayị, obi ezughi anyị ike mgbe anyịọ chọpụtara na ha abịaghị ụlọakwụkwọ n’ime ụbọchị atọ.

    “Nke a mere ụfọdụ ndị enyi ha jiri gaa n’ụlọ ha ma chọpụta na ha anwụọla, ha gbakwa ọtọ. Ha na-eche na ọ bụ nsi gburu ha.”

    Ihe ndị uweojii kwuru

    Ndị uweojii Kwara Steeti sị na ọ bụ eziokwu na ihe dị etu a mere.

    Ọnụ na-ekwuru ha bụ Ajayi Okasanmi gwara ndị ntaakụkọ na ọ bụ ndị enyi ụmụakwụkwọ ahụ chọpụtara ha ma gwa ndị uweojii.

    Ọ sị na ha amalitela ime nyocha banyere ya ebe ozu ha dị n’ụlọozu ugbua.

    “ozi bụ na a hụrụ ozu ụmụakwụkwọ abụọ a n’ime ụlọ, ma a gwa ndị uweojii”.

    “ozu ha nọ n’ụlọọzu nke University of Ilorin Teaching Hospital (UITH) ugbua, ebe nyocha na-aga n’ihu.”

  4. ASUU agwaala gọọmentị etiti jiri ego Abacha kwụọ ha ụgwọ

    Otu jikọrọ ndị nkuzi Mahadum bụ ASUU agwala gọọmentị etiti ha si n'ego Abacha kwụo ha ụgwọ.

    Onyeisi otu ahụ bụ Emmanuel Osodeke kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụlọ ntaakụkọ Channels TV nwere ebe ọ na-ebe arịrị maka mmechi Mahadum gọọmentị dị icheiche mechiri kemgbe ọnwa isii.

    O kwuru na gọọmentị kwesiri ị si n'ego ruru nde dọlla iri abụọ na atọ leta ha bụ ndị nkuzi iji gosi na agụmakwụkwọ bụ ihe dị ha mkpa.

    Mana gọọmentị Naịjirịa amapụtala iji ego ahụ rụọ ụzọ si Abuja gaa Kano, ụzọ si Legọs gawa Ibadan nakwa Akwa mmiri Naịja nke abụọ.

    Cheta na mba Amerịka na mba Naịjirịa nwere nkwekọrịta inyeghachi ala Naịjirịa ego ha napụrụ onye chịburu Naịjirịa bụ Sani Abacha.

  5. Osote Onyeisi ndị Ọhaneze ndị Igbo bụ Joel Kraham alaala mụọ ụbọchị Satọde

    Onye bụ Osote onyeisi ndị Ọhaneze ndị Igbo bụ Joel Kroham nwụrụ ụbọchị Satọde ka ọ gbachara afọ 74.

    Obodo ya bụ Upatabo dị n’Okpuruọchịchị Ahoada West dị na Rivers State.

    Ọ rọburu ọrụ dịka ọnye ọrụ Bekee na Ministri n’ahụ maka ego nke steeti ahụ ruo mgbe ọ lara ezumike nke n’afọ 2014.

    Tupu mgbe ahụ gọọmentị steetị ahụ nyere ya nturuugo Justice of Peace na 2007.

    Ọ bụkwa onyeisioche obodo ya bụ Uzugbani Ekpeye.

    Ọ bụbu onye agha mgbe agha Biafra, mere onyeisi ndị Ohaneze ndị Igbo bụ George Obiozor jiri kọwaa ya dịka “nwafo Igbo bụ onye agha zuruoke nakwa onye na-etinye uchu n’ọrụ.

    Tupu ọ nwụọ, Kroham bu okwu gbasara ndị Igbo ịbụ onyeisala Nigeria n’isi.

    Mpụta ikpeazụ ya bụ mgbe ọ gara ịnọchite anya ndị Ohaneze Ndi Igbo na Port Harcourt n’ọnwa Julai 2022.

    Ode akwụkwọ mgbasa ozi Ohaneze ndị Igbo bụ Alex Ogbonnia kwuru na ọ na-ewe Kroham iwe ihụ ebe ndị ụfọdụ na mba mmiri si akpachapụ ma na-agọ na ha abụghị Igbo.

    Ọ sị, "Kroham abụghị onye na-agọlahụ agbụrụ ya, kama, ọ gara agha Biafra, buru mgbo n’ahụ lọta, ma na-ekwuputasi agburu ya ike ruo n’ọnwụ.”

    Obiozor kwara arịrị maka ọnwụ Kraham maka ezigbo mmadụ na ntụkwasa obi ya n’ihe gbasara ọdịmma ndị Igbo.

    O zigara ndị ezinaụlọ ya ozi iti aka n’obi.

  6. 'Ọgbaghara n'ada n'APC Enugu na-achọ itisa ha'

    Ụlọíkpe mkpeagharí dị na Ịbadan ewezụgala ya bụ ikpe ụlọikpe nta mara ụlọọrụ DSS sí ka ha kwuo Sunday Igboho ego dí ijeri Naíra iri abụọ maka ịwakpo ụlọ ya.

    Ọkaikpe nọ i'isi ya bụ ikpe bụ Muslim Hassan sí na ya bụ ikpe ezighi ezi ma ọlí.

    Ndí nwere agba n'otu All Progressive Congress nke Enugu steeti akpọọla oku ka e wepụrụ ha onyeisioche pati nke steeti ahụ bụ Ugochukwu Agbara ngwangwa.

    Onyendu ndị mere ya bụ njem bụ Ken Nnamani bụbu onyeisi oche Sineti Naịjirịa.

    Ndị ọzọ so mee ya bụ njem mkpesa gụnyere General J.O.J. Okoloagu; Senator Ayogu Eze, Gbazuagu Gbazuagu, nakwa onyeisioche uloomeiwu steeti ahụ na mbụ bụ Eugene Odo.

    Ndịọ ọzọ bụkwa Ifeanyi Nwoga, Onyemuche Nnamani, na onyesis ọrụ ndị Voice of Nigeria, VON, Mazi Osita Okechukwu.

    N'akwụkwọ ha dere ha ji gaa isi ụlọọrụ ha n'Enugu ha kpọrọ "Buhari House", ha dere sị, " arịrịọ ịzọpụta APC Enugu na ndagwurugwu nke ọ na-achọ ịdaba". Ha sị na nsogbu malitere n'APC Enugu mgbe Ugochukwu Agballa si azụụlọ were ọchịchị onyeisioche ha na ntuliaka imeụlọ ha mere na steeti ahụ.

    Ya bụ akwụkwọ dekwara sị, "cheta na mgbe gara aga, onye bụbu Gọvanọ steeti ahụ bụ Sullivan Chime na ndị ọzọ mere ngagharịiwe maka otu Ugochukwu Agbala siri mapụta dịka onyeoche pati ahụ nakwa na maazi Agballa abụbụghị onye otu Pati ha.

    Ha kwukwara na "mgbe Maazi Agballa pụtara dịka onyeisioche pati ahụ, ụfọdụ ndị isi sị ka e nye ya ohere dịka pati ahụ chọrọ onye ọhụrụ nwereike ikpokota ha. Nke a mere ha jiri nye ya asambodo mmeri. Mana ugbua doola anya na Mazi Agballa amaghị ihe ọ na-eme site n'ibọ ụbọ n'isi ndị akwadoghị nhọpụta ya. Nke a mere o jiri kposaa ndị isi pati ahụ, họpụta ndị nke ya. Otua ka o si akparị onye obula, ma ndị so tinye ya n'ọchịchị. Ọchchị akaike ya mere ka ọtụtụ mmadụ n'apụ na Pati. Nke a nwereike ibute ọdịda patị na Enugu steeti".

    Ha dekwara na, "O dokwara anya na ndị Pati a enwepụlarị aha ya n'akwụkwọ kemgbe ụbọchị iri na itoolu nke Ọgụstụ 2022. Ha ji ohere ahụ kwọkụọ ndị otu kọmitii "National Working Committee ka ha gbata ọsọ bị zọpụta Pati ahị site na ịchụpụ Ugo Agballa n'ọkwa"..

  7. Unu asaala chi. Ndụ nwoke, ndụ nwaanyị. Taa bụ Afọ. Afọ biko wepụrụ anyị ajọ ihe.

  8. Anyị kwesịrị ime ọsịsọ kwụsị abụbụọrụ ndị ASUU – Osinbajo

    Osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo ekwuola na e kwesịrị ime ọsịsọ kwụsị abụbụọrụ ndị nkuzi mahadum bụ ASUU na-agba ugbua.

    O kwuru nke a mgbe ndị Gọvanọ nọ n’okpuruọchịchị pati All Progressive Congress kpọtụụrụ ya n’ụlọọrụ ya dị n’Abuja na Tuzde.

    Ndị gọvanọ a bịara ikele ya maka ụkwụ awara ya na etu o si gbakee n’ụlọụlọọgwụ n’ọnwa gara aga.

    N’okwu ya “Anyị kwesịrị ịrụkọ ọrụ ọnụ maka nsogbu ndị chere anyị n’ihu gụnyere agụmaakwụkwọ na akụnaụba, anyị kwesịrị ileba ha anya ma mee ya ọsịsọ.”

    Ndị gọvanọ bịara njem ahụ gụnyere, Gọvanọ Atiku Bagudu nke Kebbi Steeti; Kayode Fayemi nke Ekiti Steeti; Simon Lalong nke Plateau Steeti; Babajide Sanwo-Olu nke Lagos Steeti; Muhammad Badaru Abubakar nke Jigawa Steeti; Abdulrahman Abdulrazaq nke Kwara; Abubakar Sani Bello nke Niger State na ndị ọzọ.

  9. Etu ndị uweojii mba Madagaska siri gbuo mmadụ 19 gbasara nwatakịrị aṅarị

    Mmadụ iri na itolu anwụọla ebe mmadụ iri abụọ na otu merụrụ ahụ dịka ndị uweojii mba Madagaska gbara ndị na-eme ngagharịiwe egbe n'ụbọchị mọnde.

    Ọ bụ dịka ndị mmadụ ji iwe chọọ ibanye n'ụlọọrụ ndị uweojii mgbe ha nụrụ na e ji ndị echere tọọrọ nwatakịrị aṅarị ma gbuo nne ya nọ n'ụlọorụ ndị uweojii.

    Ụlọntaakụkụ AFP na-ekwu na ihe ruru mmadụ narị ise ji mma chọrọ iji ike banye n'ụlọọrụ ndị uweojii ahụ.

    Onyeisi ndị uweojii bụ Andry Rakotondrazaka kwadoro ndị uweojii ahụ ma sị na ha mere ya iji chekwaa onwe ha dịka ha gbalịrị ịhụ na ihe akawanyeghị njọ.

    Dịka o siri dị, ebidola nyocha maka ihe mere.

    Amabeghị maka nwatakịrị a atọọrọ kama ndị ọrụ gọọmentị na-ekwu na ndị omekome gburu nne ya.

    A na-achụ ndị aṅarị n'ụfọdụ mba dị n'Afrịka maka nkwenye na akụkụ ahụ ha na-ebute ihu ọma na ego.

  10. Angola election: Onyeisiala Joao Lourenco nke Angola emeriela agba nke abụọ ya

    Onyeisiala mba Angola bụ Joao Lourenco emeriela na ntuliaka iji nweta ohere ịchị mba ahụ afọ ise abụọ ọzọ bụ agba nke abụọ ya dịka ngalaba na-ahazi ntuliaka mba ahụ si maa n'ọkwa.

    N'ozi mmeri ya, Lourenço nke otu pati MPLA kwuru na "Obi dị ya mma" etu ntuliaka si gaa mana pati so ya n'azụ bụ Unita kwuru na ha anabataghị mpụtara ntuliaka ahụ.

    Otu European Union akpookuola ndị ọ dị n'aka ka ha lebanye anya na mkpesa pati anọghị na gọọmentị n'ụzọ doro anya.

  11. Naịjirịa ga-akwụsị ịtụbata mmanụ ụgbọala n'afọ 2023

    Mele Kyari bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka mmanụ agbidi na Naijirịa bụ NNPC n'ịchafụ ekwuola na Naijirịa ga-akwụsị ịtụbata mmanụ ụgbọala na ihe ndị ọzọ yiri ya n'afọ 2023.

    Ọ bụ na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụku nwere n'Abuja n'ụbọchị tuzde ka o kwuru nke a.

    Nke a bụ dịka Kyari na-atụanya na oke passenti iri abụọ NNPC nwere na ụlọọrụ mgbanwe mmanụ agbidi nke Aliko Dangote na-arụ na Legọs steeti ga-enyere ha aka ma kwụsị ntụbata mmanụ ụgbọala na Naijirịa.

  12. Ụlọikpe akagbuola ijeri naịra 20 a sị ka DSS kwụọ Sunday Igboho

    Ụlọikpe mkpegharị dị n’Oyo Steeti nọọrọ n’ụbọchị Tuzde kagbuo ikpe sị ka ụlọọrụ nchekwa DSS kwụọ Sunday Igboho na-achọ nwereonwe Yoruba Nation ijeri dọla iri abụọ (N20bn) maka ịwakpo ụlọ ya.

    Ụlọikpe a kachapụkwara ikpe kwuru na mwakpo e mere n’ụlọ Igboho megidere iwu, sị na ụgwọ ahụ a sị ka a kwụọ ya ezighi ezi.

    Ọkaikpe Muslim Hassan sị na ụkọikpe kpeburu ikpe na mbụ ekwesighi ikpebi ọnụego ihe ndị e mebiri n’ụlọ Igboho na-eme nyocha ọbụla.

    Ọ bụ ọkaiwu gọọmentị, ụlọọrụ nchekwa State Security Services wepuru ikpe ahụ ọkaikpe Ladiran Akintola kpere n’ụlọikpe mkpegharị.

  13. Ndị Eze Anambara steeti ekpebiela inye aka kwụsị mkpagbu ndị ajadu

    Otu ndị jịkọrọ ndị eze ọdịnala n'Anambara steeti akatọọla tigbuo-zogbuo nile megide ụmụnwaanyị na ụmụaka ụmụwaanyị na steeti ahụ.

    Ha kwuru nke a n'ọgbakọ otu a nke Bekee kpọrọ 'Anambra State Council of Traditional Rulers' nwere n' Ọka isiobodo Anambara steeti na nsonso a ha kpebiri ibu agha megide ya n'obodo ndị ha na-achị.

    Na mkpebi ha kwekọrịtara n'ọgbakọ ahụ nke odeakwụkwọ otu ahụ bụ Donatus Orjika binyere aka, ha kwuru sị,"Dịka ha mechara ọgbakọ ha kwuru sị,"Anyị ekwechirila ikpochapụ omenala megidere ụmụnwaanyị ajadu, ịnapụ nwaanyị ala na akụ ndị ọzọ, ịmage nwata nwaanyị ilụchu di, ji nwaanyị agba mgbere na omenala ndị ọzọ megidere ọdịmma ụmụnwaanyị.agwa ndị ọzọ."

    Ọwụwa Anyanwụ bụ mpaghara e nwere ọtụtụ omenala e ji akpagbu ụmụnwaanyị na ndị ajadu nke gunyere anapụ ha ikike inwe ụlọ maọbụ ala, ịmanye ụmụaka ụmụnwaanyị ịlụ di na-erughị eru na mmegbu ndị ọzọ.

    Ndị ọzọ biara ọgbakọ ahụ nke Women Aid Collective(WACOL) hiwere site na nkwado Ford Foundation na mịnịstrị na-ahụ maka ụmụnwaanyị gụnyere Ọkammụta Joy Ngozi Ezeilo (OON), Ọkammụta Offornze Amucheazi, SAN,Ọkammụta Ogugua Ikpeze na Ọkammụta Stella Okunna na ọtụtụ otu ndị na-agba mbọ maka ikike dịrị onye.

  14. Aka ndị ụlọụka na ndị Alakụba dị n'ozuzu mmanụ agbịdị na Naịjirịa - NNPC

    Ụlọọrụ Nigerian National Petroleum Company (NNPC) Limited ekwuola na ọ bụ ọrụ gọọmentị, ndị ndu ụka Kraịst na Alakụba na-ezu mmanụ agbịdị ndị Naịjirịa.

    Onyeisi ụlọọrụ a bụ Mele Kyari boro ebubo a n’Abuja mgbe ọ na-agụpụta ihe ministri ha rụrụla nke a na-eme kwa izuụka.

    Ọ sị na a na-ahụkaarị mmanụ agbịdị ndị a e zuru ezu bụ n’ụlọụaka, ụlọ alakụba, na ha na ụfọdụ ndị mwakpo okporo mmanụ na-arụkọ ọrụ.

    “Mgbe ọkụ gbara n’okporo mmanụ agbịdị anyị, anyị chọpụtara na ụfọdụ n’ime ha banyere n’ụlọ ndị mmadụ, gụnyere n’ime ụlọụka nakwa ụlọ alakụba.”

    “Nke a pụtara na aka mmadụ niile dị na ya, o nweghi ka mmadụ ga-esi buru ụgbọala jupụtara na mmanụ agbịdị ka onye ọbụla ghara ịhụ ya.”

    Kyari sị na ọ bụ n’ihi ozuzu mmanụ ndị a mere o ụlọorụ ndị na-emepụta mmanụ agbịdị anaghị arụ ọrụ ọfụma.

  15. Serena Williams ejirila mmeri malite asọmpị ikpeazụ ya

    Ọpịa Tennis a ma ama bụ Serena Williams ejirila mmeri malite asọmpị US Open nke ikpeazụ ya.

    O meriri Danka Kovinic n’ọkara abụọ ha zutere onwe ha n’obodo New York nke mba Amerịka.

    Ha zutere onwe ha ugboro abụọ dịka Williams meriri Kovinic 6-3 nakwa 6-3 na ya bụ asọmpị.

    Ọtụtụ ndị nkwado ya pụtara ikele ya ma sorokwa ya see foto n'ọdọ egwuregwu ahụ.

  16. Unu abọọla chi?

    Nnọọnụ na peeji anyị taa.

    Chee aka ghọrọ akụkọ niile dị mkpa na Naịjirịa nakwa mba ụwa niile.

  17. Ihe ndị uweojii kwuru maka ozu mmadụ 23 a hụrụ n'Edo Steeti

    Ndị uweojii Edo steeti ekwuputala ihe ha chọpụtara dịka ha mechara nyocha ha maka ozu mmadu iri abụọ na atọ a hụrụ n'ụlo dị na Asoro slope,Uzebu Quarters nke dị na Benin. Edo Steeti.

    Ọ bụ na mkparịtaụka ha na ndị ntaakụkọ nwere n'ụbọchị mọnde ka onye kwuchitere ndị uweojii steeti ahụ bụ Olawore Oluwole kwuru nke a.

    Nke mbụ Oluwole kwuru bụ na ụlọ a hụrụ ozu ndị a abụghi ebe gọọmentị nyere ikike ka e chekwaa ozu.

    Lee ihe ndị ọzọ gbara okpụrụkpụ ha chọpụtara

    • Aha onye ha na-enyocha maka ozo ndị a bụ Gabriel Otu.
    • Mazi otu amụghị etu e si echekwa ozu, ọ bụ onye enyemaka ebe a na-echekwa ozu.
    • Ọ nweghị ikike asambodo gọọmentị na-enye ụlọọrụ ndị na-echekwa ozu.
    • Ha chọtara akwụkwọ gọomentị jiri nye ikike ka a rụọ ụlọ nchekwa ozu ma ọ bụghị ebe ahụụrụ ozu ndị a.
    • A hụru ozu iri abụo na atọ nke otu n'ime ha enweghị isi. Nke a megidere iwu mpụ nke 329.
    • E nwere ihe ndị dịka ihe eji eme ihe mụọ nke gosiri na enwere ihe ọzọ a na-eme ebe ahụ, ezipụla ya bụ ihe ndị ahụrụ ka enyochaa ya.
  18. 'Fuel Subsidy' ga-adịgide ruo etiti afọ 2023

    Gọọmentị Naijirịa ekwuola na ego mgbakwunye eji ewetuta ọnụ ego mmanụ ụgbọala bụ Subsidy na bekee ga-adị ruo etiti afọ 2023.

    Mịnịsta na-ahụ maka akụnụba Naijirịa bụ Zainab Ahmed kwuru na gọọmentị na-atụta aro ka ewepụta tarị naịra atọ na ụma dịka ego mgbakwunye maka mmanụ agbidi ruo afọ 2023.

    Ọ bụ dịka ya na nzukọ ndị omeiwu nta na-ahụ maka akụnụba obodo nwere nzụkọ ka o kwuru nke a.

  19. Etu ụzụ ndị mmadụ si gbakọọrọ Peter Obi na Rabiu Kwankwaso na ngwụcha izu a

    Dịka oge achụmnta vootu maka ntuliaka 2023 ji ọsọ abịa, ọtụtụ ndị nkwado pati dị icheiche amalitela ngagharị iji gosi nkwado ha nye ndị ha nweere mmasị.

    N’akụkụ Naịjirịa dị icheiche, ngwụcha izu a gosiri nkwado ndị mmadụ na etu ha si nwee olileanya nye ntulịaka na-abịa abịa.

    Ụzụ ndị mmadụ gbara na Borno steeti n’ụbọchị Satọdee dịka ọtụtụ ndị mmadụ pụtara gosi nkwado ha nye Rabiu Kwankwaso nke otu pati New Nigeria People's Party (NNPP) ebe puku kwuru puku ndị mmadụ gbakọtara na Port Harcourt, Auchi, Makurdi nakwa Afikpo gosi nkwado ha nye Peter Obi nke otu Labour Party.

    Agbanyeghị na Obi nọ na Rome maka emume idu Bịshọp Peter Okpaleke iyi ọrụ dịka Kadịnal, ozipụtara ozi nye ndị nkwado ya.

  20. Etu ọkụ si gbaa ụlọọrụ gaasị nọ nso isi ụlọụka RGGC

    Ụlọọrụ gaasị no nso isi ụlọụka The Redeemed Christian Church Of God (RGGC) nke dị n’okporoụzọ Lagos - Ibadan gbara ọkụ.

    Otu onye nọ ebe ahụ ihe a mee gwara BBC na otu ụgbọala tanka bu mmanụ suru ụlọọrụ ahụ na-amaghị ama nke kpalitere ọkụ ahụ.

    Ọkụ gbara metụtara ihe ruru tanka atọ bu gaasị ndị nọ nso ebe ahụ.

    E nweghị onye ọkụ a gbagburu mana o merụrụ ụfọdụ ndị nọ ebe ahụ.

    Ndị ọrụ gbata gbata menyụ ọkụ nke Ogun steeti, Lagos steeti, nakwa ụka RCCG jịkọrọ aka ọnụ menyuo ya bụ ọkụ n’oge.