Ụlọíkpe mkpeagharí dị na Ịbadan ewezụgala ya bụ ikpe ụlọikpe nta mara ụlọọrụ DSS sí ka ha kwuo Sunday Igboho ego dí ijeri Naíra iri abụọ maka ịwakpo ụlọ ya.
Ọkaikpe nọ i'isi ya bụ ikpe bụ Muslim Hassan sí na ya bụ ikpe ezighi ezi ma ọlí.
Ndí nwere agba n'otu All Progressive Congress nke Enugu steeti akpọọla oku ka e wepụrụ ha onyeisioche pati nke steeti ahụ bụ Ugochukwu Agbara ngwangwa.
Onyendu ndị mere ya bụ njem bụ Ken Nnamani bụbu onyeisi oche Sineti Naịjirịa.
Ndị ọzọ so mee ya bụ njem mkpesa gụnyere General J.O.J. Okoloagu; Senator Ayogu Eze, Gbazuagu Gbazuagu, nakwa onyeisioche uloomeiwu steeti ahụ na mbụ bụ Eugene Odo.
Ndịọ ọzọ bụkwa Ifeanyi Nwoga, Onyemuche Nnamani, na onyesis ọrụ ndị Voice of Nigeria, VON, Mazi Osita Okechukwu.
N'akwụkwọ ha dere ha ji gaa isi ụlọọrụ ha n'Enugu ha kpọrọ "Buhari House", ha dere sị, " arịrịọ ịzọpụta APC Enugu na ndagwurugwu nke ọ na-achọ ịdaba". Ha sị na nsogbu malitere n'APC Enugu mgbe Ugochukwu Agballa si azụụlọ were ọchịchị onyeisioche ha na ntuliaka imeụlọ ha mere na steeti ahụ.
Ya bụ akwụkwọ dekwara sị, "cheta na mgbe gara aga, onye bụbu Gọvanọ steeti ahụ bụ Sullivan Chime na ndị ọzọ mere ngagharịiwe maka otu Ugochukwu Agbala siri mapụta dịka onyeoche pati ahụ nakwa na maazi Agballa abụbụghị onye otu Pati ha.
Ha kwukwara na "mgbe Maazi Agballa pụtara dịka onyeisioche pati ahụ, ụfọdụ ndị isi sị ka e nye ya ohere dịka pati ahụ chọrọ onye ọhụrụ nwereike ikpokota ha. Nke a mere ha jiri nye ya asambodo mmeri. Mana ugbua doola anya na Mazi Agballa amaghị ihe ọ na-eme site n'ibọ ụbọ n'isi ndị akwadoghị nhọpụta ya. Nke a mere o jiri kposaa ndị isi pati ahụ, họpụta ndị nke ya. Otua ka o si akparị onye obula, ma ndị so tinye ya n'ọchịchị. Ọchchị akaike ya mere ka ọtụtụ mmadụ n'apụ na Pati. Nke a nwereike ibute ọdịda patị na Enugu steeti".
Ha dekwara na, "O dokwara anya na ndị Pati a enwepụlarị aha ya n'akwụkwọ kemgbe ụbọchị iri na itoolu nke Ọgụstụ 2022. Ha ji ohere ahụ kwọkụọ ndị otu kọmitii "National Working Committee ka ha gbata ọsọ bị zọpụta Pati ahị site na ịchụpụ Ugo Agballa n'ọkwa"..