You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ndị Ebubeagu anọghị n'Oba Anambra Steeti - Onye ndu Oba

Onye ndu obodo Oba sị o nweghi ndị Ebubeagu nọ n'Obodo ha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Anwụchiela ụmụnne abụọ a na-eche dịnara otu nwaanyị India n’ike n’afọ 30 gara aga

    Otu nwaanyị kwuru na ụmụnne nwoke abụọ dịnara ya n’ike ugboro ugboro n’ihe ruru afọ 30 gara, nọzị nso inweta ikpe ziri ezi n’okwu ya.

    Nwaanyị a bi na obodo ugwu mba India nke Uttar Pradesh kwuru na ihe a mere mgbe ọ dị naanị afọ 12.

    O kwuru na ndịna n’ike a tụwara ya ime nke mere o jiri mụọ nwa nwoke.

    Ka o si kwuo, e nyefere ezịnaụlọ na-achọ nwa nwa nwoke ahụ ọ mụrụ nke mere ha agụghị onwe ha ruo afọ 13.

    Nwaanyị a kwuru na dịka afọ 13 gachara, nwa ya nwoke a lọgachịtere azụ n’afọ 2020 ma dụọ ya ndụmọdụ ka o wegara ndị uweojii akụkọ ihe mere ya mgbe ọ ka dị na nwata.

    Agbanyeghị na ọ dịghịrị ha mfe, e si ụlọọrụ ndị uweoji bugara ụlọikpe Shahjahanpur okwu a n’ọnwa Febụwarị 2021.

    Ụlọikpe a kwuru enweghị ihe aka ebe ga-egosi ya bụ ndịna n’ike mere n’ihi na ọ mere n’oge tere ezigbo aka.

    Otu onyeisi ndị uweojii n’obodo ahụ bụ Dharmendra Kumar Gupta kwuru na e mechara mee usoro nnyocha ime ahụ mmadụ abụọ a na-enyo n’okwu ma hụ ihe ịgba ama gbara aka ebe na aka ha nwereike ịnọ na ya bụ okwu.

    Na Bekee, nke a bụ usoro ndị ahụike na-akpọ 'DNA test'.

    Ugbua, anwụchiela umunwanne nwoke abụọ a dịka nnyocha okwu a nọzị n’ụlọikpe maka mkpebi nke ịkpeazụ.

  2. Ogbunigwe atụgbuola otu ụkọchukwu ụka alakụba n'Afghanistan

    Ogbunigwe atụgbuola otu ụkọchukwu ụka alakụba bụ Kabul, Afghanistan.

    E kwuru na onye gbapuru ogbunigwe gburu onwe ya dịka o tinyere ya ogbunigwe a n’ime ụkwụ rọba nke Dọkịnta tinyere ya.

    Ndị bi ebe ahụ gwara ụlọ ntaakụkọ Reuters na a na-eche na e gburu nwoke a maka ọ na-akwado agụmakwụkwọ ụmụnwaanyị nke ndị ọchịchị Taliban akwadoghi.

    Otu Islamic State (IS) kwuru na ọ bụ ha mere mwakpo gburu nwoke a ma kọwa na ha mere nke a n’ime ụlọọrụ ya. IS anwabuola n’oge gara aga igbu nwoke a.

    Agbanyeghị na Haqqani ndị ọchịchị Taliban, e kwuru na ọ katọrọ ndị otu IS nọ na-akpa ike na mpaghaara Kohrasan nke mba ahụ.

    Otu onye nwere agba n’ọchịchị Taliban gwara ụlọ ntaakụkọ Reuters na ihe bụ “Ihe mmefu dị ukwuu nye ọchịchị Islamic Emirate nke mba Afghanistan” ma kwuo na ha na-eme nnyocha maka ndị nọ n’isi ya bụ mwakpo.

  3. Gọọmentị etiti enweghi ike ibite N1.1b ịkwụ ASUU ụgwọ

    Gọvanọ Ebonyi steeti bụ David Umahi ekwuola na gọọmentị etiti enweghi ike ibi otu ijeri naịra iji kwụ ASUU ụgwọ e ji ha.

    Ọ sị na ọ ghọtara ihe bụ iwe ASUU mana ọ bụ ihe gọọmentị ga-eji nwayọ nwayọ mee site na nkwekọrịta ha abụọ.

    “Ihe ha na-achọ bụ maka ọdịmma ụmụ anyị, ịwụlite maka ndị nkuzi nakwa ụmụ akwụwkọ. Eee anyị nwereike ibido nwayọ nwayọ iwulite ihe ndị a” ka o kwuru.

    O kwuru nke a dịka ọ nabatara ndị otu Nigeria Police Trust Fund bịara ileta ya n'obi gọọmentị ya n'Abakaliki.

  4. Ndị aghaelu Naịjirịa egbuola onyeisi ndị Omekome na Kaduna

    Ndị aghaelu Naịjirịa kwuru na ha egbuola otu onyeisi ndị omekome aha ya bụ Alhaji Shanono na Kaduna steeti mgbe ha tụrụ ya mgbọ.

    Ọnụ na-ekwuru ha bụ Edward Gabkwet kwuru nke a ma kwuo na ndị omekome iri na asaa ọzọ so ya nwụ.

    Gabkwet kwuru na ha nwetara ozi na Shanono na ndị otu ya nwere ọgbakọ n'okpuru ụfọdụ osisi n'obodo akpọrọ Ukambo.

    N’otu aka ahụ ndị omekome atọrọla otu nwaanyị na ụmụ anọ ya n’okpuruọchịchị Giwa dị na Kaduna steeti.

    Ndị ezinaụlọ nwaanyị ahụ gwara ụlọntaakụkọ Channels na ọ bụ n’ụlọ ha ka esi tọrọ ha.

  5. Ndewo nu!

    Nnọọ nụ na peeji anyị taa.

    Anyi ji n'aka na ụbọchị gị na-aga ọfụma.

    Biko sonye anyị maka akụkọ ndị dị mkpa na Naịjirịa nakwa mba ndị ọzọ.

  6. A ga-ada onye ọbụla jụrụ ịnabata arịrịọ maka ọlụlụ nha na mba Chad

    Onye ọbụla jụrụ ịnabata arịrịọ ọlụlụ a rịọrọ ya n’obodo Mangalmé nke mba Chad ga-akwụzị ego ịda nha a na-akpọ ‘amchilini’.

    Ụlọikpe ụka alakụba ebe ahụ mere mkpebi a ma sị na nke metụtara ụmụnwaanyị nakwa ụmụnwoke.

    Ụmụnwaanyị mere nke a ga-akwụ bido na dọla iri abụọ na atọ ruo iri atọ na itolu ebe ụmụnwoke ga-akwụ dọla iri na ise.

    Ụmụnwaanyị na-alụ ọgụ ikike dịịrị ndị nwaanyị na mba ahụ amalitela mgbasaozi na soshal midia nke akara ya bụ #StopAmchilini megide iwu a dịka ha kwuru na ya bụ iwu ịda nha megidere iwu mba ha nyere ọbụla ịlụ onye ọ chọrọ.

    Ụlọikpe alakụba a kwuru na iwu a gbadoro ụkwụ n’akwụkwọ nso okpukerechi alakụba bụ Koran.

    Alụmdinanwunye nke aa na-amanye ndị mmadụ bụ ihe na-eme eme ọtụtụ mgbe na mba a nke a sị kachasị emetụta ụmụaka nwaanyị na-erubeghị ogogo agbọghọbịa.

    N’afọ 2015, mba a tinyere iwu megide alụmdinanwunye nke na-alụfu ụmụaka nwaanyị na-etozubeghị. Agbenyeghị nke a, nnyocha ụlọọrụ 'Chad's Institute of Statistics' mere kwuru na pasentị 60 ụmụnwaayị gbara afọ 20 ruo afọ 24 sị na a lụnyere ha di mgbe ha ka dị na nwata.

  7. Langya Virus: Ọrịa ọzọ a chọpụtala na-esi n'anụmanụ efe na mmadụ

    Ndị sayensị na-esi imi n’ala maka ọrịa ọhụrụ si n’ahụ anụmanụ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Chaịna bụ nke ọtụtụ mmadụ buterela.

    Ọrịa a kpọrọ Langya henipavirus ka a hụrụ n’ahụ mmadụ 35 na mpaghara Shandong nakwa Henan nke ọtụtụ n’ime ha nwere ihe mgbama dịka oyi, ike ọgwụgwụ na ọkwara.

    A na-eche na ha butere ọrịa a site n’anụmanụ mana onwebeghi ihe gosiri ha mmadụ nwere ibunye ibe ya.

    Ndị nyocha chọpụtara ọrịa a n’anụmanụ yiri nkapị a kpọrọ Shrew.

    Nchọpụta a dị n’akwụkwọ ndị nyocha si Chaịna, Singapore na Austrelia wepụtara n’ọnwa a.

    Gịnị bụ ọrịa Langya henipavirus ọhụrụ a?

    Ọrịa LayV so n’otu n’ime hepavirus so n’ogogo zoonotic nwereike isi n’anụmanụ fee na mmadụ.

    Ọrịa ndị a kpọrọ zoonotic juru eju mana e bidoro lebawara ha anya kamgbe corovirus malitere.

    Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa n’Amerịka sị na ọtụtụ ọrịa ndị na-apụta ọhụrụ na-efefe ugbua na-esi n’anụmanụ.

    United Nation adọọla mbaụwa aka na ntị na ụdịrị ọrịa ndị a ga-amụbawanye maka etu e si emetụ ndụ ụmụanụmanụ n’ọhịa.

    Ụfọdụ ọrịa zoonotic nwere ike igbu mmadụ gụnyere nje Nipah nke si n’Asia, nje Hendra bụ a hụrụ n’ịnyịnya na mba Austrelia.

    Ndị ọzọ bụ nje henipavirus a hụrụ na shrew, ụsụ nakwa oke.

  8. A tọhapụla mmadụ asaa ọzọ so na ndị a tọọrọ n'ụgbọoloko Kaduna

    Mmadụ asa ọzọ n’ime ndị ahụa tọọrọ n’ụgbọoloko na Kaduna n’ụbọchị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Maachị enwerela onwe ha.

    A tọhapụrụ ndị a n’ụtụtụ Wenezde dịka ha nọrọ ụbọchị otu narị iri atọ na ise n’aka ndị ekperima tọọrọ ha.

    Otu n’ime ndị so na-akpa maka ntụhapụ ha gwara ụlọọrụ ntaakụkọ Channels TV na mmadụ isii n’ime ha so n’ime otu ezinaụlọ gụnyere nne, nna na ụmụ ha anọ.

    Onye ọzọ so ndị a bụ otu nwaanyị gbara afọ iri isii bụ onye a sị ha tọhapụrụ maka ọnọdụ ọjọọ nke ahụike ya.

    Dịka ọ dị ugbua a tọhapụla mmadụ iri anọ na abụọ ebe mmadụ iri atọ na ise ka nọ n’aka ndị a.

    Cheta na ndị oyi ndụ egwu nọọrọ n’ụbọchị 28 Maachị wakpo ụgbọoloko ha ma tọọrọ ọtụtụ mmadụ.

  9. Enweghị mgbe m jiri kwado Peter Obi - Nana Akufo-Addo

    Onyeisiala mba Gana bụ Nana Akufo-Addo ekwuola na enweghị mgbe o jiri kwado Peter Obi onye na-azọ ọkwa onyeisiala Naijirịa na ntuliaka a ga-eme n'afọ 2023.

    Ọ bụ dịka ọ na-ewu na soshal midia na Akufo-Addo na-akwado Peter Obi.

    O kwuru sị, " Nke a bụ asị, aka ọrụ ndị omekome".

  10. Mba Mozambik amachiela ise ihe onyonyo n'ebe mberede mere

    Mba Mozambik amachiela ndị mmadụ ise ihe onyonyo n'ebe ọbụla ihe mberede mere na mba ahụ tupu a kpọọ ndị ọrụ gbata gbata.

    Atụmatụ a bụ iji gbanwee agwa ndị na-esekarị ebe maọbụ ndị ihe mberede mere.

    Ndị dara iwu a ga-akwụ ụgwọ ruru otu narị ụgwọ opeketempe mba ahụ nke bụ $125.

    Iwu a ga-adịire ma ọ bụrụ na nyocha gosiri na onye mere ihe onyonyo a akpọghị ndị ọrụ gbata gbata.

  11. EFCC anwụchiela ndị ntorobia 31 a na-enyo maka ikwu wayo intanet n'Enugwu

    Aka ngalaba na-abu agha megide nrụrụaka bụ EFCC n'ịchafụ akparala ndị ntorobia mmadụ 31 maka ebubo iji ịntaneti ekwu chamdum n'Enugwu steeti.

    Ọ nụ na-ekwuru ndị EFCC bụ onye gbara ama n'ozi o wepụtara ụbọchị Weenezde kwuru na a kwụchiri ndị a n'ebe ha zoro eme nke a na Meniru Agbani Road nakwa Diamond Estate dị n'Enugwu.

    Ndị ahụ gụnyere ;Daniel Chukwuemeka, Okechukwu Chisom, John Chizoba, Benard Uguochukwu, Nwobodo Christian, Nwiba Chukwuemeka, Eze Ani Ifechukwu, Chikwe James, Emmanuel Chukwuebuka, Ezugwu Chidera, Friday Daniel, Destiny Ekene, Prosper Nnachetam, Justice Chinedu na Bright Chimezie.Ndị ọzọ bụ: Ezugu Nkejika, Echi Ikechukwu, Udeh Emeka, Charles Kosisochukwu, Ojinaka Smith, Ekene Chukwuebuka, Efe Samuel, Goodness Ifeanyi, Victory Anointing, Uche Egbo, Onuigbo Kingsley, Okakpu Chukwuemeka, Nnamdi Odo, Mbah Emmanuel, Collins Nweke na Jason Obi.

  12. Ọchịagha Irabor ekwela ndị Naịjirịa nkwa na ntuliaka ga-aga n'ihu

    Onyeisi ndị ọrụ nchekwa niile na Naịjirịa bụ Ọchịagha Lucky Irabor ekwela ndị Naịjirịa nkwa na ntuliaka afọ 2023 ga-aga n’ihu.

    Irabor gwara ndị ntaakụkọ nke a mgbe ọ na-aza ajụjụ ha jụrụ ya n'isi ụlọọrụ ndị ọrụ nchekwa n'Abuja

    O kwuru nke a dịka ndị mmadụ na-atụ ụjọ ma ntuliaka a ga-aga n'ihu n’ihi ọnọdụ nchekwa na-akawanye njọ n’obodo.

    "Anyị ga-anwa ike anyị niile n'ihụ na o nweghi ihe ga-egbochi ntuliaka (afọ 2023) ị me" ka o kwuru.

  13. Igbo, anyị ekelee!

    Ụnụ asaala chi?

    Egbe bere,ugo bere!

  14. Onyeisiala Nana Akufo-Adoo agọọla na o zigaara Tinubu ozi

    Onyeisiala mba Gana bụ Nana Akufo-Addo ekwuola na ọ bụghi eziokwu na o zigaara Bola Ahmed Tinubu ozi sị ya nye Peter Obi ohere ịchị Naịjrịa ma ya bụ Tinubu gaa gwọọ onwe ya ọrịa.

    O depụtara nke a n'akara Twitter ma kọwaa na ọ bụ akụkọ ụgha nke eziokwu adịghị ya chaachaa.

    Akufo-Addo kwuru na ọ bụghị ya ga-emebi mmekọ ọma dị n’etiti mba ya bụ Gana na Naịjirịa.

  15. Unu abọọla chi?

    Njepụ niile ị ga-eme taa ga-abara gị uru, iseeeee.

  16. Buhari na-ata Igbo na-ata ahụhụ ndakpọ nchekwa ụta maka ọnọdụ a- Ohaneze

    Otu Ohaneze akatọọla onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari maka ibo na nsogbu ndakpọ nchekwa n'Ọwụwa Anyanwụ si ndị ndu obodo na ndị isiụka n’aka.

    Okwu Buhari a so ogbugbu e gburu ndị Nijie isi na ndị uweojii anọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwu na nsonso a dịka Buhari kwuru na ndị ndu Igbo gbara nkịtị ghara ikwugide mkpamkpa na-akpa n’Ọwụwa Anyanwụ.

    N’ozi ọnụ na-ekwuru Ohaneze bụ Alex Ogbonna ya binyere aka ma wepụta ụbọchị Monde, Ohaneze kwuru na kwamgbe nsogbu nchekwa dapụtara na ha na-ekwugide ya ma kpọọ ndị ọrụ nchekwa oku ka ha nwụchie ndị aka ha dị na ya taa ha ahụhụ dịka iwu si kwuo mana ha anaghị eme nke a.

    Ohaneze gara n'ihu sịrị, " Ị gaghị ata Igbo ụta maka na ndị ọrụ nchekwa dara n'ọrụ ha ịchọpụta ndị omekome"

    “E nwee nsogbu nchekwa n’Ọdịda Anyanwu Ugwu, e lee ya anya dịka nsogbu Naijiria.”

    “ E nwee nsogbu n’Ọwụwa Anyanwụ e bo ya na ndị ndu ụka na ọchịchị obodo ala Igbo anaghị ekwugideoke ogbugbu mmadụ.”

    Ha rụtụrụ aka na “Igbo bụ ndị e ji ime enyi mmadụ n'ebe abụla ebe mara,a ọdachi dagidere ndị mbịara “mbịara nọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ bụ ihe mwute so ndakpọ nchekwa na mpaghara a.”

  17. Ndịuweojii anwụchiela nwoke gburu onye binyere ya ego ka ọ ghara ịkwụ ụgwọ

    Otu nwoke gbara afọ 40 egbuola onye gbanyere ya mbibi n’Ibadan , Oyo steeti.

    Ndị uweojii steeti ahụ kpụpụtara nwa amadi ahụ a kpọrọ ‘William’ n’ọha n' ụbọchị Monde n’Eleyele, Ibadan.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojiisteeti ahụ bụ Adewale Osifeso kwuru na Williams gburu nwoke ahụ ji gbalahụ ịkwụ ya ụgwọ ba buru ụgbọala o jiri biri ego ahụ gbalaga.

    William kwụpụtara na-ya naonye o ji ụgwọ bụ ahụ a kpọrọ Rufus Olayinwola, na-adọrịta okwu maka ụgwọ ya ji ya ka ya kwara ya akan’aja , ọ daa nwụọ.

    N’okwu ụgbọala o buru, “ William sịrị, “ Nke a bụ ụgbọala nke isi m na-eji ebiri ego nke nwoke biri rere were ego biri ya ma nye m ego mara n’elu ya.”

    “ Achọghị m ka ụgbọala ahụ fulahụ , ya mere m ji were ego ego gakwuru ya ka m kwụbilata nkem ji ya mana o kweghị .”

    “Nke a mere ka mụ na ya dọrịtawa ụka , m kwaa ya n’aja, ọ nwụọ, m buru ụgbọala m.”

  18. Ndewoonu!

    Igbo maanụ mma!

  19. Ndị omekome awakporo okporoụzọ 'Airport' dị n'Abuja?

    Ụfọdụ ndị na-akwọ ụgbọala n'Abuja etiala mkpu maka ọgbaghara dapụtara n'okporoụzọ 'airport' dị n'Abuja taa bụ ụbọchị asatọ nke ọnwa August.

    Ihe onyonyo na-efegharịnụ na twitter gosiri ka anwụụ ọkụ na-pụ n'otu akụkụ okporoụzọ ahụ, dịka ụfọdụ ndị ọkwọụgbọala kwusiri ụgbọala ha n'ike ma ụfọdụ chịghara azụ ka ha wee ghọtacha ihe na-emenụ kpọm kwem.

    BBC chọpụtara na ka otu awa gachara ihe ahụ mere, ndị mmadụ amalitela gawa okporoụzọ na-enweghị ọgbatauhie ọbụla.

    Kalu Emetu bụ onye okwuokwu ụlọọrụ Vehicle Inspection Office (VIO) kwuru na ndị ọkada anaghị anụ ihe ma ncha makana ha amachiela ha ịgba n'okporoụzọ , mana ndị ọkada enweghị ihe ha ji idọ aka na ntị ahụ eme.

    N'ọnụ ya, "ndị 'taskforce" na-ejichi ọgbatumtum ha mere ha ji bido mewe ngaghariwe iji kwụsị ya bụ atụmaatụ."

    Ndị bi ebe ahụ ekwuola otu ihe a ndị uweojii na-ekwu na na okporoụzọ ahụ nke dọkọtara obere obodo dịgasị n'akụkụ ya dịka Aco, Lugbe nakwa Kuje agawala siriri werere.

  20. Ihe gọọmenti Naịjirịa kwuru maka mba UK iweghachị ihe nka ha wepụrụ

    Ụlọọrụ "Nigeria's National Commission for Museums and Monuments" anabatala mkpebi ngalaba Britein na-achịkọta ihe mgbe ochie, iweghachite ihe nka e zuru mgbe gboo na mba Naịjirịa na 19th century, n'ihe akpọrọ oche eze Benin mgbe gboo.

    Babatunde Adebiyi bụ ọkaiwu ngalaba NNCMM gwara BBC na ọ na-eche na a ga-akpọsa ya bụ ihe nka ruru iri asaa na abụọ n'ihu ụwa niile ka ha hụ.

    N'ụbọchị ụka ka ụlọọrụ Horniman Museum dị na London kwuru na ọ bụ ihe ziri ezi ka eweghachị ihe nka ndị ahụ ebe e si wete ya bụ Naịjirịa.

    Ihe nka ndị ahụ gụnyere okwute bronze nke bụ igodo e ji agbape ụlọ eze Benin n'oge gboo.

    Adebiyi kwuru na Naịjirịa na ụlọ ebe ndewe ihe nka America nakwa Glasgow enwela nkwekọrịta na aga eweghachịte ihe nka ha zuru na Naịjrịa n'afọ a.