Ụlọọrụ
na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ The
Independent National Electoral Commission (Inec) akọwala ihe mere e ga-eji were akwụkwọ gụkọ
vootu ntuliaka 2023.
Inec kọwara
na nke a so iwu Naịjirịa.
Ọnụ na-ekwuru
ha bụ Festus Okoye kọwara BBC na “Iwu Naịjirịa banyere nke a doro anya ma bụrụ
ihe gbara n’anwụ. Ọ bụ iwu Naịjịrịa nakwa ihe ntuliaka bụ ‘Electoral act’ ka
anyị ji ahazị ntuliaka 2023”.
Okoye gara
n’ihu kọwara usoro ha ji eme ngụkọ a nke o kwuru iwu Naịjirịa kwadoro.
“Ihe iwu
kwuru bụ na emecha ntuliaka n’ọdọ ntuliaka ọbụla, onye nlekọ ntuliaka ebe ahụ
ga-edebanye ọnụ ọgụgụ vootu patị dị icheiche nwetere n’akwụkwọ a kpọrọ EC8A,
anaghị eji tekụnzụ eme ndebanye a”
“Onye nlekọta
ahụ ka ebinye aka ma tekwa akwụkwọ ahụ akara uli nke njirimara Inec”
Ọ gara n’ihu
kọwa na ndị nnọchịteanya pati niile ga-ebinyekwa aka iji gbaa ama na ihe debanyere
ziri ezi.
E meecha
nke a, onye nlekọta ahụ ga-ejizi akụrụngwa tekụzụ nke Bimodal Voter Accreditation System (BVAS)
were see foto akwụkwọ ahụ were zigara Inec ngụkọ vootu a tụrụ n’odo ntuliaka ahụ”
O kwuru “Ọ bụ na ọba
ozi Inec nke IReV ka a ga-esi zigaa ya bụ ngụkọ”
E meecha nke ahụ,
onye nlekọta ahụ ga-eburu akwụkwọ ahụ, BVAS nakwa ihe ndị ọzọ e ji mee ntuliaka
bugaa n’ọdọ ngụkọ bụ Wọọdụ ma nyefee onye nlekọta ọrụ ngụkọ (collation officer)
akụrụngwa ndị ahụ.
Onye nlekọta ọrụ ngụkọ
ahụ ga-esi n’akwụkwọ ahụ debanye ngụkọ vootu a tụrụ n’ọdọ ntuliaka ndị ọ
na-elekọta n’ime akwụkwọ ọzọ a kpọrọ EC8B.
Naanị e nwee ọgbaghara
maọbụ ngọtaghe na ngụkọ ka onye nlekọta ọrụ ngụkọ ahụ ga-aga na tekụnzụ Inec bụ
Bvas were chọpụta ebe nsogbu siri dapụta.
Cheta na nlekọta nke mbụ
ezigarala Inec ngụkọ site na IRev nke ndị ọrụ Inec nwere ikike ịhụ.