You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ndị Ebubeagu anọghị n'Oba Anambra Steeti - Onye ndu Oba

Onye ndu obodo Oba sị o nweghi ndị Ebubeagu nọ n'Obodo ha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. NFF atụọla Fifa aka maka ihe mere Super Falcons n'Istanbul

    Otu nlekọta egwu bọọlụ Naịjirịa bụ The Nigerian Football Federation (NFF) akọwala ihe mere ndị Super Falcons ji tọọ n’ọdọ ụgbọelu Istanbul ruo otu abalị.

    Odeakwụkwọ NFF bụ Mohhamed Sanusi kọwara na ọ bụ mehie otu Fifa mere na-ihazị akwụkwọ ikike njem ha mere ha jiri tọọ ruo mgbe ahazịchara ya bụ mehie.

    Sanusi kọwara ihe mere n'okwu uwe ndị Falcons e kwuru na ezughi ezu ma kwuo na enyezuru ndị egwu bọọlụ uwe ha mana ụfọdụ mebiri dịka e wegara ya ebe a na-asara ha ya bụ uwe.

  2. Ogbunigwe Russia tara isi mmadụ 25 n'ụbọchị ncheta nnwereonwe Ukraine

    Ogbunigwe mba Russia atuogbuola mmadụ iri abụọ na abụọ n’Ukraine n’ụbọchị ha na-eme ncheta nnwereonwe ha nakwa ọnwa isii agha ha na Russia malitere.

    Onyeisisala Volodymyr Zelensky kwuru nke a n’abalị Wenezde n’ọgbakọ ya na otu UN nmere ma kọwa na mmadụ iri ise ndị ọzọ merụrụ ahụ.

    Ihe ọdachị a mere n'obodo Chaplyne nke mpaghara ọwụwa anyanwụ mba ahụ.

    Nke a na-abịa dịka Ukraine natara ọtụtụ ozi na Russia nwereike iwakpo ha n'ụbọchị ahụ nke Ukraine gbara mbọ wulite nchekwa ụbọchị ahụ ma kagbuo emume ndị pụrụiche ga-edupụta ndị mmadụ ọha.

  3. Otu onye anwụọla n'ọgụ dapụtara n'asọmpi egwuregwu bọọlụ na Taraba Steeti

    Otu onye anwụọla dịka ọgụ dapụtara n'egwuregwu bọọlụ dị n'etiti obodo abụọ n'asọmpi egwu bọọlụ a gbara n'obodo Nukkai, dị n'Ardo-Kola nke Taraba steeti.

    Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ Abdullahi Usman kwuru nke a ma sịkwa na onyeisi ụweojii nke obodo Ardo-kola sọkwa na ndị eji okwute wakpoo na ya bụ asọmpi.

    O kwukwara na ha anwuchiela ụfodụ ndị dịka ha na-eme nyocha ha.

  4. Anyị agaghị agbape okporougbọoloko Abuja-Kaduna ugbua

    Gọọmenti etiti ekwuola na ha agaghi emepe okporoụgbọoloko si Abuja gawa Kaduna ugbua maka na ọ bụ ihe ọjọọ ka e mere ezinaụlọ ndị ụmụnne ha ka nọ n’aka ndị ntọrị ugbua.

    Minista na-ahụ maka njem bụ Muazu Sambo gwara ndị ntaakụkọ nke a na ngwụcha ọgbakọ ndịisi ọchịchị e mere n’Abuja nke onyeisiala Muhammadu Buhari nọ n’isi ya.

    Ọ sị na gọọmentị ka na-eme nyocha ụdịrị igwe ‘surveillance’ a ga-eji amata ihe ndị na-eme n’okporo oloko dị n’ụzọ ndị a.

    Cheta na ndị ekperima wakporo ụgbọoloko si Kaduna aga Abuja n’ọnwa Maachị afọ 2022, tọọrọ ọtụtụ ndị mmadụ.

    Kamgbe ahụ rute ugbua, a tọhapụ ụfọdụ n’ime ha ebe ọtụtụ ndị ọzọ ka nọ n’aka ndị ntọrị a.

  5. Ngagharịiwe na-aga n'ihu na Saụt Afrịka maka ọnọdụ ihe isiike.

    Puku kwuru puku ndị mmadụ na mba South Africa na-eme ngharịiwe maka etu oke ihe isi ike siri dị na mba ha nakwa etu ọnụ ahịa ihe si dị elu ugbua.

    Otu abụọ n'ime ndị otu ndị ọrụ kachasị na mba ahụ nọ n’isi nghagharịiwe ha dịka ha na-akpọ ya "mgbachị obodo kpam kpam”.

    Iwe ndị a na-eme ngagharịiwe a gụnyere ọnụ ahịa ọkụ latrịk, mmanụ ụgbọala, nakwa enweghị ọrụ.

    A na-atụ anya na ụzụ ngagharịiwe a ga-atụ na mpaghara Cape Town na Pretoria.

    Nnyocha na-egosi na ihe ruru otu n’ime atọ ndị mmadụ bi na Saụt Afrịka enweghị ọrụ dịka nkụda akụnụba so mmụbawanye ọrịa Covid-19 n’ụwa na agha Ukraine na Russia na-anyụ ha ịkpakwụ.

    Iji kụsa ngagharịiwe a, gọọmentị mba a etiela iwu onye na-arụghị ọrụ agaghị anata ego ụgwọ ọnwa mana ndị a gbara isi akara na ngagharịiwe.

  6. Ukraine na-eme ncheta nnwereonwe nakwa ọnwa isii Rọshịa malitere iwakpo ha

    Mba Ukraine na-eme emume ncheta ụbọchị ha nwetere nnwereonwe taa nke ha malitere ime kemgbe afọ 1991.

    Taa mekwara ya ọnwa isii mba Rọshịa malitere ibuso Ukraine agha.

    N’ihi agha na-ada na mba ahụ ugbua, nchekwa riri elu maka ụjọ mkwapo n’aka ndị agha Rọshịa.

    Gọọmentị mba Amerịka ekwuola na a na-atụ anya na ndị Rọshịa nwereike ịwakpo Ukraine dịka a na-eme emuma.

    Onyeisiala mba Ukraine bụ Volodymyr Zelenskyy aṅụola iyi ịhụ na ha weghara ọchịchị ọzọ na mpaghara mba ahụ ebe ndị agha Rọshịa werela ọnọdụ ọchịchị n’ime ya.

    Cheta na ihe mụnyere ọkụ n’ụjọ ndị mba Ukraine na nso nso a bụ ogbunigwe a tụrụ aghara aghara na mpaghara Crimea ebe mba Rọshịa jibidoro nakwa ogbugbu otu onye Rọshịa a ma ama bụ Daria Dugina.

    Ndị mba ahụ anaghị eme ọtụtụ ngagharị etu ha siri emebụ. Gọọmentị Ukraine machịrị emume ọha banyere ụbọchị ncheta maka agha na-ada ebe ahụ.

    Ọtụtụ ndị isi ọchịchị n’ụwa ejirila ohere a zịtere Ukraine ozi na-ekwu na ha kwudoro ha dịka Rọshịa na-awakpo ha. Nke a gụnyere Praịm Minista Briten bụ Boris Johnson, Onyeisi Kọmịshọna otu EU bụ Ursula von der Leyen, onyeisi ụlọome iwu Briten bụ Roberta Metsola, Onyeisiala mba Germany bụ Olaf Scholz, onyeisiala mba Finland, Latvia, Lithuania naMoldova wdgz.

  7. Mba China agbagharala ego ha binyere mba 17 dị n'Afrịka

    Mba China ekwetela ịgbaghara ụzọ ego 23 ha binyere mba 17 dị n’Afrịka.

    N’otu aka ahụ, ha kwekwara nkwa isi n’ọbaego ha dị n’otu International Monetary Fund (IMF) nye ụfọdụ mba dị n’Afrịka ijeri dọla iri ($10m).

    Wang Yi bụ minista mmekọrịta mba China na mba ndị ọzọ, kwuputere maka mgbaghara a na nzukọ ha mere n'izu gara aga a kpọrọ Forum on China-Africa Cooperation (FOCAC).

    Ha ekwughi mba ndị ji ha ụgwọ a ha na-agbaghara, nke ha ji ekwu nwaego ole ha sị na ego ha binyere mụtara na ngwụcha afọ 2021.

    Chetakwa na China kagburu ihe ruru ijeri dọla atọ na ụma ụfọdụ mba Afrịka ji ha, n'afọ 2019.

  8. Mba Amerịka eweghachịtala nde dọla iri abụọ na atọ ($23m) n'ego Abacha zupuru

    Gọọmentị Naịjiria na mba Amerịka ekwekọrịtala iweghachịta nde dọla iri abụọ na atọ ($23m) si n’ego Sani Abacha chịburu Naịjiria zupuru.

    Ka ha na-ebinye aka n'akwụkwọ nkwekọrịta n'Abuja n'ụbọchị Tuzde, Abubakar Malami bụ ọkaiwu gọọmentị etiti, kwuru na gọọmentị etiti ga-etinye ya bụ ego n’ọrụ atọ gụnyere akwammiri Naịja nke abụọ nakwa ụzọ Abuja-Kaduna.

    Nke a abụghị mbụ mba Amerịka na-eweghachịte ego Abacha zupuru; ha weghachịtara nde dọla 308 ($308m) n'afọ 2020.

    Mba Swizaland weghachịtekwara nde dọla 723 ($723m) n'afọ 2006.

  9. Gọvanọ Soludo amachiela ịchịgharị ehi n'ụzọ n'Anambra steeti

    Gọvanọ Chukwuma Soludo nke Anambra steeti amachiela ịchị ehi agagharị n’okporoụzọ na gburugburu steeti ahụ.

    O kwuru nke a ka ya na ndị Anambra State Cattle Menace Committee mechara nzukọ n'obi gọọmentị ya n'Awka, na ngwụcha izuụka gara aga.

    Soludo kwuru na n’agbanyeghi na e tiri iwu mmachi a kemgbe afọ gara aga, na a ka na-achịgharị ehi na steeti ahụ.

    Ọ gara n'ihu kwuo na a ga-amalite ịnwụchi onye ọbụla dara iwu site n’ọnwa Septemba.

    "Ugbua anyị nwere iwu machiri ịchị ehi na-agagharị, a gwala ndị nchekwa ka ha malite ịnwụchi ndị dara iwu a".

    Cheta na Willie Obiano bụbu gọvanọ Anambra steeti binyere aka n'iwu mmachi nchịgharị ehi a kpọrọ "Cattle and Other Livestock Open Grazing Prohibition and Ranches Establishment Bill of Anambra steeti" n'afọ 2021.

  10. Ndị mmadụ ghọtahiere ihe anyị kwuru makai usoro ntuliaka-Inec

    Ngalaba na-ahazị ntuliaka na Naijiria bụ Inec n’ịchafụ ekwuola na ndị mmadụ ghọtahiere ozi si na mkparịtaụka ọnụ na-ekwuru ha na otu ụlọntaakụkọ nwere na nsonso a.

    N’akwụkwọ ozi nke Festus Okoye binyere aka ma wepụta Ụbọchịụka, o kwuru na iji igwe mee ntuliaka ga-adịgide dịka ọ dị na ntuliaka e mere n' Ekiti na Osun steeti n'afọ 2022.

    Nkọwa a na-abịa dịka akụkọ fegharịrị ụbọchịụka na Inec ga-eme ntuliaka n'aka, na ọ bụghị n'igwe.

    Mana Okoye kwuru na ntuliaka ga-adị ka ọ dị n'Ekiti na Osun bụ ebeb e ji igwe 'BVAS ' were mee ntuliaka n'ọdọ atụmvootu.

    Ozi Inec kwuru sị, "Anyị chọrọ ịgwa ụmụ Naijiria na iji igwe ezipụ mpụtara ntuliaka adịla adị agaghị akwụsị ya."

    " Ọ na-enye aka ịhụ na-agbara ihe nile n'anwụ dịka ndị mmadụ na-atụ vbootu n'ọdọ atụmvootu."

    "A gaghị agbanwe ya maọbụ hapụ ya."

  11. Ndeewonụ!

    Igbo bụ Igbo, ụnụ asaala chi!

  12. Ka chi fo nu.

    Anyị ga-ahụ unu echi.

    Echi ga-aka mma.

    Cheta gụọ akụkọ ndị mere taa n'ebe a.

  13. A kagbuola iwu megidere ụmụnwoke ịdịna ụmụnwoke na Singapore

    Mba Singapore akagbuola iwu megidere ụmụnwoke ịdịna ụmụnwoke nakwa ụmụnwaanyị ịdịna ụmụnwaanyị.

    Praịm minista mba ahụ bụ Lee Hsien Loong kwuru nke a n’ihe onyonyo gbara n’ụlọntaakụkọ mba ahụ.

    Nke a na-abịa dịka okwu ikagbu iwu a kpalịtere ọtụtụ nrụrụtaụka kemgbe afọ ole m ole gara aga.

    Ndị na-alụ ọgụ ikike dịịrị onye nye ndị na-edịna ndị ụdịrị okike ha kwuru na mkpebia bụ “Mmeri nye ụmụ ụwa niiile”.

    A maara mba maka ụkpụrụ na-abụghị nke mmesapụ ahụ, mana n’ọdịnsọ a, ọnụ ọgụgụ ndị na-ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ iwu megidere ndịna nwoke na nwoke nke akara 377A.

    Singapore ga-eme ya mba nke anọ n’Asia na-akwụnyere ndị na-edina ndị okike nyiri nke ha. Ndị ọzọ bụ mba India, Taiwan na Thailand.

  14. Inec akọwala ihe mere a ga-eji were akwụkwọ gụkọọ vootu na ntuliaka 2023

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ The Independent National Electoral Commission (Inec) akọwala ihe mere e ga-eji were akwụkwọ gụkọ vootu ntuliaka 2023.

    Inec kọwara na nke a so iwu Naịjirịa.

    Ọnụ na-ekwuru ha bụ Festus Okoye kọwara BBC na “Iwu Naịjirịa banyere nke a doro anya ma bụrụ ihe gbara n’anwụ. Ọ bụ iwu Naịjịrịa nakwa ihe ntuliaka bụ ‘Electoral act’ ka anyị ji ahazị ntuliaka 2023”.

    Okoye gara n’ihu kọwara usoro ha ji eme ngụkọ a nke o kwuru iwu Naịjirịa kwadoro.

    N’okwu ya:

    “Ihe iwu kwuru bụ na emecha ntuliaka n’ọdọ ntuliaka ọbụla, onye nlekọ ntuliaka ebe ahụ ga-edebanye ọnụ ọgụgụ vootu patị dị icheiche nwetere n’akwụkwọ a kpọrọ EC8A, anaghị eji tekụnzụ eme ndebanye a”

    “Onye nlekọta ahụ ka ebinye aka ma tekwa akwụkwọ ahụ akara uli nke njirimara Inec”

    Ọ gara n’ihu kọwa na ndị nnọchịteanya pati niile ga-ebinyekwa aka iji gbaa ama na ihe debanyere ziri ezi.

    E meecha nke a, onye nlekọta ahụ ga-ejizi akụrụngwa tekụzụ nke Bimodal Voter Accreditation System (BVAS) were see foto akwụkwọ ahụ were zigara Inec ngụkọ vootu a tụrụ n’odo ntuliaka ahụ”

    O kwuru “Ọ bụ na ọba ozi Inec nke IReV ka a ga-esi zigaa ya bụ ngụkọ”

    E meecha nke ahụ, onye nlekọta ahụ ga-eburu akwụkwọ ahụ, BVAS nakwa ihe ndị ọzọ e ji mee ntuliaka bugaa n’ọdọ ngụkọ bụ Wọọdụ ma nyefee onye nlekọta ọrụ ngụkọ (collation officer) akụrụngwa ndị ahụ.

    Onye nlekọta ọrụ ngụkọ ahụ ga-esi n’akwụkwọ ahụ debanye ngụkọ vootu a tụrụ n’ọdọ ntuliaka ndị ọ na-elekọta n’ime akwụkwọ ọzọ a kpọrọ EC8B.

    Naanị e nwee ọgbaghara maọbụ ngọtaghe na ngụkọ ka onye nlekọta ọrụ ngụkọ ahụ ga-aga na tekụnzụ Inec bụ Bvas were chọpụta ebe nsogbu siri dapụta.

    Cheta na nlekọta nke mbụ ezigarala Inec ngụkọ site na IRev nke ndị ọrụ Inec nwere ikike ịhụ.

  15. Ọ hịara m ahụ ịsị na onwe m juru m afọ- Anthony Joshua

    Anyamiri juru otiọkpọ Anthony Joshua dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu ka e merichara ya n'asọmpi 'World Heavyweight' ya na Oleksandr Usyk nke Yukren gbara na Saudi Arabia ụbọchị Satode.

    Usyk meriri Jọshua onye sọrọ mpi ahụ n'aha mba Briten.

    Oge a jụ ya ajụjụ na ọgụ ahụ biri ihe o chere maka etuiu o siri gaa, Joshua ji olu akwa sị, " O siri ike m, o zsiri m ezi ike ikwu na onwe m juru m afọ."

    " Ihe a na-ewute m n'ime mkpuruobi m."

    Okwu gbadoro nwa amadi ahụ, o were aka ya abụọ kpuchie ihu ya ma kulaa ume elu dịka onye na-arụrụ ya ọrụ mgbasaozi bụ Eddie Hearn zara ajụjụ so ya.

    Johua eritela ọlaedo nke Olympic n'afọ 2012 ma merikwa n'ọtụtụ asompi ndị ọzọ.

    A kụpụkwala ya n'asọmpi ọkaibe n'ụwa atọ n'ime ise o sorola.

  16. Two Nigerians: A kụọla Anthony Joshua na Kamaru Usman isi aba okpu n 'asompi ọkpọ

    ụmụafọ Naijiria bụ ọkpọka n'iti ọkpọ gbara ọbara ka ume ha ha mana ọ mịtarị ha mkpụrụ n'asompi ha nwere ụbọchị Satode.

    Mbọ nwaafọ Naijiria bụ Anthony Joshua gbara iji nweta mmeri n’asọmpi ọkaibe n'ọkpọ ‘World Heavyweight’ gbalahụrụ ya ọzọ dịka Oleksandr Usyk nke Ukraine meriri ya n'ọkpọ ha tiri na Jeddah, mba Saudi Arabia ụbọchị Satode.

    N'aka nke ọzọ, Kamaru Usman nke Naijiria nwara oko ya mana Leon Edwards nke mba Briten meriri ya n’asọmpi ọkpọ 'UFC 278 Welterweight' ha sọrọ n’Amerịka ụbọchị Satode.

    Usman onye meriburu Edwards afọ asaa gara aga kwuru ka e merichara ya na ndị bụ dike na-ada oge ụfọdụ mana ha na-eji iwe ekulitekwa.

  17. Unụ asaala chi?

    Igbo bụ Igbo, mma mma nụ o !

  18. Etu mwakpo ndị al-Shabab si taa isi mmadụ 12 na Somalia

    Ihe ruru mmadụ 12 anwụọla dịka ndị agha nnupụisi nke otu al-Shabab wakporo otu ụlọ ndịna n’isi obodo mba Somalia bụ Mogadishu.

    Akụkọ na-ekwu na ọgụ ka na-ada ebe ahụ dịka ụfọdụ ụlọọrụ ntaakụkọ mba ahụ na-akọwa ha ndị nwụrụ ebe ahụ nwereike ịkarị 12.

    Ndị agha nnupụịsi ahụ gbapuru ogbunigwe e kwuru nwereike ịkarị abụọ n’ezi ụlọ ndịna ahụ tupu ha awụba n’ime ya.

    Amabeghị mmadụ ole ha dị mana ha ka jibidoro ndị nọ ebe ahụ.

    Ndị ọrụ nchekwa agbapụtala ọtụtụ ndị e jibidoro mana ọtụtụ ka tọrọ n’ime ụlọ ahụ.

    Otu onyeọrụ nchekwa mba ahụ aha ya bụ Mohammed gwara ụlọ ntaakụkọ Reuters na ọ bụ mmadụ 12 ka ha gụtarala nwụrụ.

    Otu websaịt a na-eche bụ nke ndị otu al-Shabab gbara ama na ọ bụ ha mere mwakpo a.

    Onyeisis ụlọọgwụ ukwu nke Mogadishu bụ Dọkịnta Mohamed Abdirahman Jama kwuru na ha nabatara ihe ruru mmadụ 40 merụrụ ahụ na mwakpo a nakwa mwakpo ọzọ mere n’isi obodo Somali.

    Oteela otu al-Shabab bụ otu nwanne nke al-Qaeda na gọọmentị etiti Somalia na-alụ ọgụ.

    Otu al-Shabab a ewegharala ọchịchị n’ọtụtụ mpaghara ndịda na etiti mba Somalia.

    Na nso nso a, ha enweelaike ịgbatị ikike ha ruo mpaghara Mogadishu bụ ebe ndị gọọmentị maka ọchịchị.

  19. Onyeisiala Naijirịa ekwela nkwa iluso izu ohi mmanụ agbidi ọgụ

    Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buhari ekwuola na ọ ga-akwalite nchekwa na Naijirịa niile iji kwụsị izu ohi mmanụ agbidi.

    Ọ bụ n'akwụkwọ ozi ọwepụtara ka Buhari kwuru sị, " Ndị na-ezu mmanụ agbidi agaghị enwe ebe ozuzo ọbụla, njịkọ aka anyị na ndị mba gbara anyị gburu gburu ga-enye aka kwụsị ha".

    Nke a na-eme dịka agha mmiri mba Equatorial Guinea jidere ụgbo mmiri na-ebu mmanụ agbidi ga-eru barel nde atọ si Naijirịa gbaa ọsọ n'ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Ọgụst.

  20. Atọhapụla mmadụ anọ ọzọ atọọrọ n'ụgbọ oloko na Kaduna Steeti

    Ndị omekome wakporo ụgbọ oloko si kaduna na-aga Abuja n'ọnwa maachị afọ 2022 atọhapụla mmadụ anọ ọzọ so n'ime ndị ha tọrọ.

    Ọ bụ Tukur Mamu bụ otu n'ime ndị so enyere aka na nkata ịkpọpụta ndị a kwukwara na otu n'ime ọchịagha ndị omeome a na-akwado ịlụ Azurfa Lois John bụ otu n'ime mmadụ iri abụọ na atọ ka nọ n'aka ndị ntọ a.