Ịbọọla chi
Daalụ dịka ị na-esonye anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị
You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Onye ndu obodo Oba sị o nweghi ndị Ebubeagu nọ n'Obodo ha.
Daalụ dịka ị na-esonye anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị
Praịm minista mba Finland bụ Sanna Marin ekwuola na ya emela nnwale ime ahụ ya maka ọgwụ ike, dịka ka ihe onyonyo ọhụrụ pụtara na-egosi ebe ya na onye otiegwu a ma ama na-agba egwu dị aṅaa n’anya ndị mmadụ.
Sanna Marin gbara afọ 36, nọ n’ọnọdụ oke nkatọ dịka ihe onyonyo ewepụtara na soshal midia gosiri ebe ọ na-agba oringo n’emume oriri na ọṅụṅụ e mere na mba ahụ.
Ụfọdụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-ekwu na e kwesịrị ịnwale ime ahụ ya maka ọgwụike dịka ndị ọzọ rụrụ aka na o nwereike ibu na ọ ṅụrụ ọgwụike n’emume ahụ nke mere o jiri gbaa ụdịrị egwu ọ gbara.
Marin gwara ndị ntaakụkọ n’ụbọchị Fraịdee na ya emeela ule ime ahụ ma na-atụ anya nsonaazụ ule ahụ nke ga-apụta n'izu na-abịa.
O kwusiriike na ọ ṅụghị ọgwụike ọbụla.
Ọ gwara ndị ntaakụkọ na Helsinki, "Emeghị m ihe ọ bụla iwu na-akwadoghị.
Nwada Marin kwuru, sị: "ma mgbe m ka bụ nwata ntorobịa aṅụtubeghị m ụdị ọgwụike ọbụla”.
Ọ sakwara ajụjụ banyere eji oge o kwesịrị ị na-arụ ọrụ na-agba oringo ma kwuo:
“Enwgehị mgbe ọrụ m na-adapụta n’ime abalị bụ mgbe e mere emume a. Enweghị ọrụ na-eduga m n’obi gọọmentị n’ime abalị”
“Emume a egbochighi m ịrụ ọrụ. Ụbọchị ahụ e mere emume a, enweghị nzụkọ gọọmentị ehibere ụbọchị ahụ”
O kwuru na abanyeghị na ọ ma na-esere ya ihe onyonyo ahụ na obi adịghị ya mma etu o siri dapụta n’ọha.
Ọ gara n’ihu kwuo “Ama m na mmadụ niile ghọtara na oge ọrụ na oge mmesapụ ahụ abụghị otu”.
Ụfọdụ bokwara ebubo na e nwere onye susuru ya ọnụ n’emume ahụ mana o kwuru na nke a bụ akụkọ ụgha.
Ngalaba na-ahazi mgbasaozi na Naịjirịa bụ NBC amachiela ihe ruru ụlọ mgbasaozi gụnyere Anambra Broadscasting Service nakwa Imo State Broadcasting service maka iji ụgwọ.
N'ozi ha wepụtara ha kwuru na ọ bụ kemgbe ọnwa Mee ka ha zigaara ndị ahụ ozi ị megharị ikike ha ji malite bụkwa License.
Ha nyere ụlọ mgbasaozi ndị ahụ izuụka abụọ iji mee nke a mana ha sị na o nweghi ndị ghere ha ọnụ.
Ugbua ha enyela ụlọorụ ndị ahụ otu abalị maọbụ elekere iri abụọ na anọ iji gbachi ụlọọrụ ha ma kwụsị mgbasaozi ozugbo.
Lee aha ụlọọrụ niile iwu ọhụrụ a metụtara n'uju
1. Silverbird TV (Silverbird Communications Co. Ltd) Network
2. Rhythm FM (Silverbird Communications Ltd) FM Abuja
3. Rhythm FM (Silverbird Communications Ltd) FM Lagos
4. Rhythm FM (Silverbird Communications Ltd) FM Yenagoa
5. Rhythm FM (Silverbird Communications Ltd) FM Port-Harcourt
6. Rhythm FM (Silverbird Communications Ltd) FM Jos
7. Rhythm FM (Silverbird Communication Ltd) Benin
8. Greetings FM (Greetings Media Ltd) FM Network
9. Tao FM (Ovidi CommunicationS Ltd) FM Okene
10. Zuma FM (Zuma FM Ltd) FM Suleja
11. Crowther FM (Crowther Communications Ltd) FM Abuja
12. We FM (Kings Broadcasting Ltd) FM Benin
13. Linksman International ltd Keffi
14. Bomay Broadcasting Services ltd Abuja
15. MITV (Murhi International Group Ltd) Ibadan
16. Classic FM (Pinkt Nigeria Ltd) Port-Harcourt
17. Classic FM (Pinkt Nigeria Ltd) Lagos
18. Classic TV (Pinkt Nigeria Ltd) Lagos
19. Smoot FM (Fenchurch Invest Consortium ltd) Lagos
20. Beat FM (Megalectrics LTD) Lagos
21. Cooper Communications ltd Lagos
22. Splash FM (West Midlands Ltd) Ibadan
23. Rock City FM (Boot Communications ltd) Abeokuta
24. Family FM (Kalaks Investments Nig. Ltd) Ilugun
25. Space FM (Creazioni Nig. Ltd) Ibadan
26. Radio Jeremi (Radio Jeremi ltd) Effurun
27. Breeze FM (Bays Water ltd) Akure
28. Vibes FM (Vibes Communication ltd) Benin
29. Family Love FM (Multimesh Broadcasting Co. Ltd) Port-Harcourt
30. Wave FM (South Atlantic Media ltd) Port-Harcourt
31. Kogi State Broadcasting Corporation
32. Kwara State Broadcasting Corporation
33. Niger State Broadcasting Corporation
34. Gombe State Broadcasting Corporation
35. Lagos State Broadcasting Corporation
36. Lagos DSB
37. Osun State Broadcasting Corporation
38. Ogun State Broadcasting Corporation
39. Ondo State Broadcasting Corporation
40. Rivers State Broadcasting Corporation
41. Bayelsa State Broadcasting Corporation
42. Cross River State Broadcasting Corporation
43. Imo State Broadcasting Corporation
44. Anambra State Broadcasting Corporation
45. Borno State Broadcasting Corporation
46. Yobe State Broadcasting Corporation
47. Sokoto State Broadcasting Corporation
48. Zamfara State Broadcasting Corporation
49. Kebbi State Broadcasting Corporation
50. Jigawa State Broadcasting Corporation
51. Kaduna State Broadcasting Corporation
52. Katsina State Broadcasting Corporation
Ndị uweojii Anambra steeti ekwuola na ha akpụpụla ndị anwụchiri ji foto ọtọ ndị mmadụ amaja ha ụlọikpe.
Ọnụ na-ekwuru ha bụ Tochukwu Ikenga gwara BBC nke a n'ekwentị ma kwuo na ndị ahụ gụnyere ụmụ nwoke abụo na ụmụnwaanyị abụọ ga-azara ọnụ ha.
Ọ sị "ha bụ ndị na-arụ ọrụ n'otu, ha na-edupu ndị nwaanyị so n'otu ha ịrabata ụmụ nwoke, ebe ndị nwoke ga-azọbata ebe ha na ndị ha kpọbatara na-akwado ịme nsoli ma see ha foto ọtọ".
Ọ kọwara na ndị ahụ ga na-amajazi ndị esere foto ọtọ ha, na-achọ ịnapụ ha ego n'ike.
N'inye ndụmọdụ, ọ gwara ndị mmadụ na o nwee onye ji foto ọtọ ha amaja ha, ha kwuputa okwu.
Ikenga sị "ndị mmadụ hie asaa n'anya maka etu ha na nwaanyị maọbụ nwoke si emekọ n'igwe ịntanetị".
Ndewo maka isonye anyị taa.
Minista agụmaakwụkwọ bụ Adamu Adamu agwala ụmụakwụkwọ ka ha atazila gọọmentị etiti ụta maka mmechi ụlọakwụkwọ na ọ bụ ndị nkuzi ka ha ụta dịịrị.
Mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n’Abuja na Tọzde, Adamu sị ka ụmụakwụkwọ kpụpụ ndị nkuzi n’ụlọikpe maka idosa ha n’ụlọ kamgbe.
Adamu gara n’ihu kwuo na gọọmentị agaghị ekwete n’ihe ndị nkuzi chọrọ nke bụ ka a kwụọ ha ụgwọ ọnwa isii ha gbara abụbụọrụ.
Na nke a bụ ahụhụ ha ga-ata maka agwa kpara bụ ịgba abụbụọrụ.
Ihe ASUU sara gọọmentị
N’otu aka ahụ ndị nkuzi bụ ASUU siri ọnwụ na ha agaghị anabata atụmatụ ịkwụ ụgwọ nke gọọmentị chọrọ ime a kpọrọ Consolidated University Academic Salary Structure (CONUASS).
Onyeisi ha bụ Emmanuel Osodeke sị na nke ha chọrọ bụ nke a kpọrọ ‘University Salary Structure (USS).’
Ha gara n’ihu kwuo na gọọmentị ga-akwụ ha ụgwọ ọnwa isii ndị ahụ ha gbara abụbụọrụ tupu ha malitekwa ọrụ
Dịka ọ dị ugbua, ngalaba abụọ ndị a enwebeghi nkwekọrịta banyere atụmatụ ndị a.
Ihe mberede ọkụ ọgbụgba nke mere n’ahịa Ubani dị n’Umuahia Abia steeti etinyela ọtụtụ mmadụ n’ọnọdụ echeta ebewe.
Ọkụ a gbara n’ụbọchị Tuzde, abalị iri na isii nke ọnwa Ọgọst metụtara ụlọahịa ruru anọ n’ahịa ahụ, mana ọ bụ otu n’ime ha ka ọ kacha metụta.
Chukwudi Elowo gwara BBC Igbo na ọ bụ ụlọahịa nna ya bụ Goddy Elowo ka ya bụ ọkụ gbariri.
O kwuru na onweghị onye nwere ike ịkọwa ihe kpatara ọkụ ahụ.
“Nna m zụchara ahịa ebe a n’ụbọchị ahụ lawa, mana o teghị aka o rutere ụlọ, a kpọọ ya n’ekwentị ntị na ụlọahịa ya na-agba ọkụ,” Chukwudi kwuru.
“Tupu ọ na-agbarute, ihe niile agbariela, mana ndị ọzọ nwere ohere ịzọpụta ngwaahịa ha tupu ọkụ abanye n’ụlọahịa nke ha.”
“Ngwaahịa lara n’iyi ebe ruru nde naịra iri na abụọ maọbụ karịa (N12 million).”
Chukwudi kwuru na nna ya agbagotela n’afọ, ma bụrụkwa na ahụ esichaghị ya ike.
N’ụbọchị Wenezde, kọmishọna azụmahịa n’Abia Steeti bụ John Okiyi-Kalu zigara onye nnọchiteanya ya bụ Michael Egwu ka ọ gaa leta ndị ọkụ ahụ metụtara.
Na njem ahụ, Egwu kasiri ndị ngwaahịa ha lara n’iyi obi, ma kwa ha nkwa na gọọmentị ga-agbatara ha ọsọ enyemaka.
Otu jikọrọ ndị ọrụ ọkụ Latrik na Naịjirịa bụ 'National Union of Electricity Employees (NUEE) akwụsịtụla abụbụ ọrụ ha malitere n'ụbọchị Wenezde, abalị iri na asaa nke ọnwa Ọgọst 2022.
Ọ bụ onyeisi otu a bụ Joe Ajaero gwara ndị ntaakụkọ nke a dịka ha na gọọmentị etiti nwechara ọgbakọ n'Abuja.
O kwuru na ha akwụsịla abụbụ ọrụ ahụ ruo izuụka abụọ, iji nye ohere ka ha na gọọmentị nwekwuo mkparịtaụka gbasara ihe na-ewe ha bụ ndị ọrụ iwe.
"Izuụka abụọ eteghị aka, ọ bụrụ na gọọmentị emeghị ihe ọbụla n'ime oge, anyị ga-amalitekwa ya bụ abụbụ ọrụ," Ajaero kwuru.
Ụmụ Igbo, unu asaala chi.
Daalụ dịka ị na-esonyere anyị maka mgbasaozi nke taa.
Ka anyị zọpụ njem ngwangwa.
Ọkụ aṅyụọla pịị n’Abia, Anambra, Ebonyi, Enugwu nakwa Imo Steetị dịka ụlọọrụ Enugu Electricity Distribution Company agbaala abụbụọrụ.
Nke a dị n’ozi Emeka Ezeh bụ ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ EEDC wepụtara n’ụbọchị Wenezde.
Nke a na-abịa dịka otu jikọtara ndịọrụ Latrik na Naịjirịa bụ National Union of Electricity Employees (NUEE) na ogbo ha bụ Transmission Company of Nigeria (TCN) kwụsịrịọrụ n’ihi ụgwọ ha sị gọọmentị etiti ji ndịọrụ ha.
Ezeh sị n’ihi nke a na ha agaghị ewebata ọkụ n’igwe ọkụ a kpọrọ ‘feeders’ nke metụtara ndị Ọwụwa Anyanwụ.
Ọ gara n’ihu kwuo na mkparịtaụka n’etiti ndịisi ọrụ ọkụ Latrik na gọọmentị na-aga n’ihu iji weghachite ọkụ.
Ọ rịọkwara ndị mmadụ ka ha gbadoo anya ka ndị ohi ghara iji ohere ahụ gaa zuo akụrụngwa na-enye ọkụ latrik n’ogbe ha.
Nke a ga-emetụtakwa mpaghara ndị ọzọ na Naịjirịa dịka ụlọọrụ ndị na-enye ọkụ ebe ndị a so na ndị ọrụ ọkụ latrik.
Na mba Kenya, ntuliaka e mere na mba ahụ na nsonso a atụlitela ọtụtụ ụmụnwaanyị n’ọkwa dị elu dịka gọvanọ na senatọ n’ụfọdụ mpaghara.
Susan Kihika meriri dịka gọvanọ Nakuru county, Anne Waiguru dịka gọvanọ Kirinyaga County, Gladys Wanga dịka gọvanọ Homabay County na Kawira Mwangaza maka Meru County.
Ndị ọzọ bụ Fatuma Achani meriri na Kwale County, Wavinya Ndeti meriri dịka gọvanọ Machakos.
N'otu aka ahụ, Agnes Kavindu Muthama na Tabitha Karanja nwetara ọkwa Senetọ, ebe Joyce Kamene Kasimbi na Liza Chelule nwetara ọkwa ndị nnochiteanya n’Ụlọomeiwu Nta.
Ụnụ emere agha?
Mkparịtaụka gọọmentị etiti na ndị nkuzi mahadum Naịjirịa bụ Academic Staff of Universities (ASUU) mere na Tuzde amịtaghị mkpụrụ ọbụla.
Nke a pụtara na abụbụọrụ ndị nkuzi a na-agba kamgbe ọnwa isii ga-aga n’ihu.
Ndị nkuzi a na kọmitii gọomentị etiti hiwere nke ọkammụta Nimi Briggs nọ n’isi ya nwere nzuko n’Abuja iji gboo nsogbu abụbụọrụ a.
Akụkọ kwuru na o nweghi ihe ọhụrụ ndị kọmitii Briggs ji bịa na mkparịtaụka ahụ.
Kama ha bịara na-arịọ ndị nkuzi ka ha biko kwụsị abụbụọrụ, kwee nkwa na a ga-etinye mkpesa ha n’akwụkwọ mkpata na mmefu nke afọ 2023.
Mkparịtaụka malitere n’ihe dịka elekere iri na abụọ nke ehihie Tuzde ma wee ihe dịka awa atọ na-enweghi ihe a kpatara.
Kedụ ihe ASUU chọrọ n’aka gọọmentị etiti?
Cheta na ASUU malitere abụbụọrụ izuụka anọ n’ụbọchị 14 Febụwarị.
N’ụbọchị 14 ọnwa Maachị, ha gbatịrị abụbụọrụ ahụ ruo ọnwa abụọ ka gọọmentị nwee ike mezuo ihe ha na-achọ.
Ha gara n’ihu gbatịa ya ruo izuụka iri na abụọ n’ụbọchị 9 Mee, mana kamgbe ahụ ha ka nọ n’abụbụọrụ a.
Ha chọrọ bụ ọdịmma ndị nkuzi, inwogharị ọnọdụ mahadum na Naịjirịa nakwa nwereonwe ngalaba agụmaakwụkwọ.
Ihe bụ isi isekpu ntị n’abụbụọrụ a bụ agwụghị ụgwọ inwogharị agụmaakwụkwọ nke dị n’ọnụ ego otu tarị naịra na ụma (N1.1 trillion).
Mana gọọmentị etiti ekwuola na ha ejighi ego ịkwụ ụgwọ ahụ ma sị na ọnụego mmanụ agbịdị adakpọọla n'ọchịchị onyeisiala Muhammadu Buhari.
E nwere nkwekọrịta ahụ kamgbe afọ 2009.
Ihe ọzọ bụ usoro e ji akwụ ndị nkuzi ụgwọ. Gọọmentị chọrọ iji usoro a kpọrọ Payroll and Personnel Information System (IPPIS).
Mana ndị nkuzi sị ha chọrọ ka e jiri usoro a kpọrọ University Transparency and Accountability Solution (UTAS).
Anyị ji obi ọcha na-anabata unu n'ọgbakọ anyị nke taa.
Kọmịshọna ahụike n’Abia steeti bụ Joe Osuji gbara ama nke a ma kwuo na nchịkọta ndị enyochapụtarala ọrịa n’ahụ ha na steeti ugbua a bụ mmadụ itoolu.
Cheta na n’izu gara aga, a hụrụ ọrịa a n’ahụ mmadụ anọ na steeti ahụ.
E kwuru na na ọ bụ n’okpuruọchịchị anọ ka a hụrụ ọrịa nke bụ Umuahia North, Umuahia South, Ikwuano nakwa Aba North.
Gọọmentị Abịa steeti kọwara na ha agbaala mbọ mee ihe niile ha kwesịrị ime maka izipụtara ozi banyere ọrịa a nakwa etu ha ga-esi echekwa onwe ha.
Ozi gọọmentị kwukwara na edupụla ndị a a hụrụ ọrịa n’ahụ ha ka ha nọpụrụ onwe ha iche iji gbochie mfesa ya ma kpọkuoo ndị niile nọọrọ ha nso na nso nso iji nnyocha ahụ ha ma ha ebu ya bụ ọrịa.
Ozi Osuji kọwara na nnyocha ahụ ndị a nọ ndị bu ọrịa a nso gosiri na ụfọdụ n’ime ha ebughị ọrịa Monkey Pox ebe a na-eche mpụtara nnyocha ndị ọzọ ugbua.
Cheta na a hụrụ ọrịa a n’ahụ otu nwoke n’Ebonyi steeti n’izu a ebe otu ahụike ụwa nke World Health Organization (WHO) kpọpụtara aha ọrịa a dịka ọrịa ụwa kwesịrị ilebara anya ngwa ngwa.
Akụkọ si ahịa Ogbaku nke Owerri, Imo steeti taa bụ Tuzde ụbọchị 16 nke ọnwa Ọgọstụ na-ekwu na ndị ojigbe wakporo ahịa ahụ ma gbaa otu nwoke onye na-agba ọgba tum tum egbe.
Odeakwụkwọ otu ndị ntorobịa obodo ahụ bụ Justice Nwafor gbara ama ihe a a sị mere ebe ahụ.
Nwafor kwuru na e bubula ozu nwoke ahụ n’ọdụ ahịa ahụ ugbua ma zigara ndị uweojii nke Ogbaku Divisional Police Headquaters ozi ihe a mere.
“Anyị ebegarala na ndị uweojii ọgba tum tum ya ugbua”
Otu onye ọzọ nọ ebe ahụ ihe a eme mee na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara onye ntaakụkọ anyị etu ya bụ ihe siri mee kpọm kwem. O kọwara na ndị ojiegbe ahụ bu ụgbọala Sienna wụbata n’ahịa ahụ ma nalite imaja onye ọgba tum tum ahụ.
O kwuru “Ndị a batara ahịa ma si nwoke a e kwuru na aha ya bụ Chima ka o sonye ụgbọala ha ngwa ngwa mana o kweghị sonye ha”.
“Dịka ọ jụrụ isonye ha, ha ji iwe gbaa ya egbe ugboro atọ ma gbalie egbe elu aghara aghara”.
Mgbọ BBC Igbo gbara ịnụ olu ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Imo steeti bụ Michael Abattam amịtaghị mkpụrụ ruo ugbua.
Nwoke mba Kenya na-elekọta otu ọdọ atụmvootu dị na mba ahụ anwụọla n’isi obodo ha bụ Nairobi.Ụlọọrụ ntuliaka mba ahụ gbara ama ofufu nwoke a n’ụbọchị Fraịde.
Akụkọ kwuru na ezinaụlọ Daniel Musyoka zịpụtara ozi na ha na-achọ ya kemgbe ụbọchị Fraịde mgbe ọ gara ọrụ ngụkọ vootu na ntuliaka e mechara na mba ahụ.
Ndị uweojii kwuru na a hụrụ ozu Musyoka n’ime oke ọhịa dị n’obodo Loitoktok.
E kwuru na ndị ọchị ehi hụrụ ozu ya ma nnyochapụta ọtụtụ apa yiri ihe dịka nke onye a tara oke ahụhụ nwee gbuo.
Ụmụnwaanyị Musyoka ndị nke nwaanyị abụọ gbara ama na ozu ahụ bụ nke nwanne ha.
Kọmịshọna ndị uweojii na Nasarawa steeti bụ Rahman Nansel ekwuola na ndị omekome atọrọla Kọmịshọna mgbasaozi steeti ahụ bụ Yakubu Mohammed Lawal.
Akụkọ kwuru na e si na be ya dị na Nasarawa Egon tọrọ ya n’abalị ụbọchị Monde n'etiti ịkwa mgbọ.
Nansel kọwara na mgbe ha nụrụ nke a, ha zipuru ụfọdụ ndị ọrụ ha gaa gbaa ebe ahụ ogige ma chekwaa ya.
Kepu kepu na-ekwu kwa na atọọrọ nwa Lawal nke nwoke mgbe awakporo ụlọ ha.
Ka o si kwụrụ ugbua, ndị uweojii na-ekwu na ha amalitela nnyocha iji chọpụta ebe nwoke ahụ nọ ma zọpụta ya.
Ngalaba ndekọ na ngụkọ nke Naịjirịa bụ National Bureau of Statistics ekwuputala na ọrịrị ọnụ ahịa Naịjirịa ejirila otu 1.82% rịa elu n’otu ọnwa
Ọrịrị ọnụ ahịa ahụ nọzị na 19.64% karịa ebe ọ nọbu otu ọnwa gara aga bụ 18.60% n'ọnwa Juun afọ a.
Ngụkọ ahụ gosikwara na ngụkọ nke otu afọ nọzị na 16.75% karịa 16.30 ọ bụbụ n'ọnwa Julai afọ 2021.
Akụkọ ndi dị mkpa na Naịjirịa nakwa mba ụwa niile ka anyị ga-ewetara gị taa.
Chee ka ghọrọ ya.