You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ndị Ebubeagu anọghị n'Oba Anambra Steeti - Onye ndu Oba

Onye ndu obodo Oba sị o nweghi ndị Ebubeagu nọ n'Obodo ha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. E nyochapụla ọrịa Monkey Pox n’Ebonyi steeti

    Ujọọ ejidela ndị mmadụ n’Ebonyi steeti dịka gọọmentị steeti ahụ zịpụtara ozi na e nyochapụala ọrịa Monkey Pox na steeti ahụ.

    Akwụkwọ ozi Kọmịshọna ahụike na steeti ahụ bụ Daniel Umezuruike zipụtara kwuru “Anyị na natara ozi na e nwere onye a na-enyo bụ ọrịa Monkey Pox n’ụlọọgwụ Alex Ekwueme Federal University Teaching Hospital nke Abakaliki n’ụbọchị 10 nke ọnwa Ọgọst, 2022”

    Ọ gara n’ihu dee “Nwoke a gbara afọ 32 bụ onye ọrụ ugbo nke si obodo Ugwulangwu nke okpuruọchịchị Ohaozara ma biri n’Abakaliki kwuru na ọ mere njem gaa Rivias steeti n’ọnwa Julaị tupu ọ lọgachịte Ebonyi steeti na nso nso a”

    Umezuruike kwuru na ahụike nwoke a na-egosi ihe ịgba ama na o nwereike ibu ọrịa a dịka ahụ mmkpomọkụ, ihe ịvụkashị ahụ mmadụ, olu mgbu, isi ọwụwa, ike ọgwụgwụ nakwa ihe ndị ọzọ.

    O kwuru na nnyocha nke mbụ e mere gosiri na o bughị ọrịa Small Pox bụ nke yiri Monkey pox.

    Akwụkwọ ozi ya kwuru ‘nnyocha nke e mere n’ụlọọrụ NCDC gosiri na nwoke ahụ bu ya bụ ọrịa’.

    Umezuruike kọwara na edugala nwoke ahụ ka ọ nọpụrụ onwe ya iche iji gbochi mefesa ya bụ ọrịa dịka a kpọkuru mmadụ asaa ndị ọzọ ya na nwoke ahụ nkọrọla na nso nso a.

    O kwukwara na n’ime mmadụ 32 ndị a na-enyo maka ọrịa a, naanị nnyocha nke nwoke ahụ bụ ihe gosiri na o bu ya kpọm kwem.

    Nke a na-eme ya steeti nke abụọ n’Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa a na enyochapụta ọrịa a n’ime ya.

    Cheta na ahụla ọrịa a n’ahụ mmadụ anọ ugbua a n’Abịa steeti.

  2. Kenya Elections: Obi ko ndị Kenya n'elu dịka a a ka na-eche mpụtara ntuliaka onyeisiala

    Obi ndị Kenya ko n'elu ma na-ede jiji dịka ọ garala abalị isii kemgbe e mechara ntuliaka ịhọpụta onye ga-abụ onyeisiala ha mana ụlọọrụ ọ dị n'aka akpọpụtabeghị onye meriri.

    Cheta na ngalaba na-ahazi ntuliaka na mba ahụ IEBC kwuburu na ha ga-akpọpụta ntuliaka ahụ n’ụbọchị Satọde maọbụ Ụbọchịụka.

    Oge a na-egbu n'ịkpọpụta mpụtara ntuliaqka mere ka obi kor ọtụtụ ndị Kenya n'elu

    A gụpụtala mpụtara atọ n'ime anọ nke gosiri na ọ bụ osote onyeisiala bụ William Ruto, na-emeri Raila Odinga bụ onye anọghị na gọọmentị mba ahụ..

    Otu ndị na-gba mbọ maka ikike dịrị onye, ndị ọkaiwu na otu ndị ọzọ dị iche iche akpoola ndị Kenya oku ka ha hapụ ihe ọbụla nwere ike ibute tigbuo-zọgbuo.

    N'ụbọchị Satode, a kpọrọ ndị uweojii ka ha bịa na-ebe a nọ ekpokọta mpụtara ntuliaka dịka ndị ọrụ pati chọrọ ikposa ihe a na-eme.

    Ụlọọrụ na-ahụ maka nhazi ntuliaka bụ Independe Election and Boundary Commision(IEBC nwere otuizuụka ịkpọpụta mpụtara ntuliaka ahụ.

  3. Ndeewonu, Igbo ndị ọma!

    Ụnụ asaala chi?

    Ndụ mmiri, ndụ azụ!

  4. Etu ihe ruru mmadụ 41 si nwụọ n’otu ụlọụka n’Egypt maka ọkụ ọgbụgba

    Opekatampe, ihe ruru mmadụ 41 anwụọla dịka ọkụ ọgbagba nke a na-eche ọkụ latirk kpalitara butere nzọgbu ndị mmadụ n’ụka Coptic Abu Sifin nke mba Egypt.

    Ndị ọrụ nchekwa gwara ụlọ ntaakụkọ Reuters na mmadụ 5000 nọ na-aka ụka mgbe ọkụ ahụ malitere.

    E kwuru na ọkụ a kuchiri ụzọ ebe ndị mmadụ nwereike isi gbapụ nke mere mgbapụ jiri ghara ịdị mfe.

    Ndị ọrụ gbata gbata mmenyụ ọkụ ebe ahụ kwuru na ha emenyụọla ya bụ ọkụ.

    Ruo ugbua, amabeghị kpọm kwem ihe butere ọkụ ọgbụgba.

    Onyeisiala Abdel Fattah al-Sisi ezịpụtala ozi iti aka n’obi nye ezinaụlọ ndị ihe ọdachị a metụtara dịka gọọmentị kwuru na ha amalịtela nnyocha ima etu ihe a siri mee n’ezia.

  5. Ndị ntọ tọọrọ Fada chọrọ ka e nye ha N50m

    Ndị ntọ tọrọ ụkọchukwu Katolik chọrọ ka e jiri ego gbara isi yaNdị ntọ tọọrọ otu ụkọchukwu ụka Katolik ekwuola ka e nye ha nde naira iri ise iji gbara isi ụkọchukwu ahụ.

    A tọọrọ Fada Chinedu Nwadike n’ Umunneochi dị n’Abia steeti dịka o si mahadum ‘Spiritan University’ dị na Nneochi ebe ọ na-arụ ọrụ na-aga Enugwu n’okporoụzọ awara awara si Okigwe gawa Enugwu ụbọchị Fraide. Otu onye metụtara Fada Nwadike anyị achọghị ịkpọ aha ya kwupụtara na nke a bụ nke ugboro abụọ ụkọchukwu ahụ na-adanye n’aka ndị ntọ.

    Mbo BBC Igbo gbara ịnụta oul ndị uweojii amịtaghị mkpụrụ dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abia steeti bụ Geofrey Ogbonna azaghị ekwentị ya rue oge akụkọ pụtara.

    Okporoụzọ Okigwe gwawa Enugu bụ ebe nto na mpụ ndị ọzọ na-arị elu.

    Na nsonso a ndị omekome a na-enyo mana ha mechara tọhapụ ya ka ndị ụka ya kwụchara nde otu narị.

  6. 2023: Ndị ntorobia Igbo wezuganụ sọ-m-bu-eze-ga-akwụ-ọtọ - Ohaneze

    Otu Ohaneze adụọla ndị ntorbia Igbo ọdụ ka ha wezụga ịkpa oke agbụrụ dịka ntuliaka 20223 na-atunye n'ụkwụ,

    Ndumọdụ Ohaneze na-abịa dịka otu ndị ntorobịa a kpọrọ " Coalition of South East Youth Leaders (COSEYL). dọrọ ndị na-akwado Bola Ahmed Tinubu aka na ntị ka a ghara ịhụ ụkwụ ha n' Ọwụwa Anyanwu."

    Otu ahụ kwuru na "ụfọdụ ndị n'ala Igbo ohere ị na-akwado nwoke taara nchara n'ụzọ abụla ụzọ ịbụ onyeisiala Naijria..".

    Mana n'ozi nke ọnụ na-ekwuru otu Ohaneze bụ Alex Ogbonnia binyere aka ma wepụta ụbọchị Satọde, Ohaneze kwuru na n'ezie onye maọbụ otu ọbụla nwere ikkike ikwu uche tya, mana ikike kwesịghị imegide ikike ndị ọzọ.

    : "Ọnye ọbụla na-azọ ọkwa onyeisiala nwere ikike ịga-achụm nta vootu na mpaghara nile dị na Naijiria.

    Na nsonso a, akwụkwọ akụkọ anyị achọghị ịkpọ aha ya wepụtara ozi nke ha sị "si n;aaka otu COSEYL) nke kwuru na achọghị ịhụ Ahmed Bola Tinubu nkE AOC maọbụ ndị na-akwado ebe ha na-achụ nta vootu na mpaghara n'Ọwụwa Anyanwụ."

    O

  7. A na-enyozi onye eche sụrụ Salman Rushdie mma maka ebubo ịnwa igbu ọchụ

    A na-enyozi otu nwoke a sị sụrụ onye na-ede akwụkwọ a ma ama bụ Salman Rushdie mma n’otu emume e mere na mba Amerịka n’ụbọchị Fraịde enyo maka ebubo ịnwa igbu ọchụ

    Onye ọkaiwu na New York Steeti kwuru na anwụchiri Hadi Matar gbara afọ 24 ma ghara ịtọhapụ ya ka o siri n’ụlọ na-abịa ikpe nọ ya n’isi ugbua.

    Cheta na n’ụbọchị Fraịde Mazị Matar ji ọsọ wụbata n’ogbo ebe a na-eme emume a wee wakpo Rushdie na onye na-agba ajụjụ ọnụ na mmemme nke otu ngalaba ụlọakwụkwọ mere.

    Rushdie kwuru na ya chere “enweghị nsogbu ọbụla nọ na ndụ” na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụ nwere n’izu abụọ gara aga tupu a sụọ ya mma.”

    Nwoke a na-ede akwụkwọ nweterela ọtụtụ ihe nrite nọzị n'ọnọdụ dị oke dịka a wakpochara ya n’emume e mere na mba Amerịka n’ụbọchị Fraịde.

    E kwuru na dịka nwoke a na-anata ọgwụgwọ n’ụlọọgwụ ugbua na ọ nọ n’ọnodụ ọjọọ ma nwee ike ịghara ịhụ ụzọ ọzọ maka etu mwakpo a siri metụta ya.

    Ndị bịara emume rụrụ aka na ndị hazịrị ya emezughị ihe ha kwesịrị ime ka e chekwa ogige ahụ nakwa nowke ahụ.

    Ugboro ugboro, nwoke a anatala ozi mmaja nke gụnyere ndị sị ha ha chọrọ igbu ya n’ihi ihe ọ dere n’akwụkwọ nke anọ ya akpọrọ ‘The Satanic Verses’ nke ụfọdụ ndị ụka Alakụba hụrụ dịka mkparị nye okpukperechi ha nakwa Chukwu.

    Cheta na dịka otu afọ gachara mgbe Rushdie wepụtara akwụkwọ ya ahụ na-akpata okwu, onye ndu kachasị elu na mba Iran bụ Ayatollah Khomeini kpọrọ oku ka e gbuo Rushdie. O kwere nkwa inye onye ọbụla gburu ya dọla nde atọ (£2.5m) nke a bụ iwu a kpọrọ ‘Fatwa’ nke bụ iwu onye ndu okpukperechi Alakụba nyere.

  8. Ndị Taliban akụsaala ngagharị ụmụnwaanyị Afghanstan nwara ime

    Ndị ọchịchị Taliban n’Afghanstan akụsaala ngagharịiwe ụmụnwaanyị mba ahụ mere n’isi obodo Kabul dịka ndị ngagharịiwe a kwuru na ha chọrọ achịchị (nri), ikike ịrụ ọrụ nakwa nnwereonwe n’aka ọchịchị aka ike

    Ndị Taliban gbaliri egbe elu ma chụsa ụmụnwaanyị a ruru iri anọ, ma jichie ekwentị ha.

    Nke a na-abịa dịka ụbọchị 15 nke ọnwa Ọgọst ga-eme ya otu afọ ndị ọchịchị Taliban weghara ọchịchị na mba ahụ.

    Otu onye n’ime ndị ngagharịiwe a gwara BBC na “Ha etighi anyị ihe etu ha siri emebu n’oge gara aga”

    “Naanị egbe ka ha gbaliri elu were chụsaa anyị”

    “Dịka anyị na-alụ ọgụ ikike dịịrị ụmụnwaayị ihe anyị chọrọ bụ opekatampe ka ndị a mepeere ụmụ anyị ndị nwaanyị ọnụ ụzọ ụlọakwụkwọ”

    Kemgbe ndị Taliban weghara ọchịchị na mba a, ha enyela iwu dị iche iche metụtara nnwereonwe ụmụnwaanyị nke gụnyere igbochi ha n'ọtụtụ ọrụ gọọmentị, agụmakwụkwọ sekọndrị na ime ngagharị ruo ebe ọbụla gafere kilomita 70 na-enweghị onye nlekọta nwoke ọbụla so ha.

    Ha nyekwara iwu na ụmụnwaanyị Afghanistan ga na-eyi mkpuchi ihu ụka alakụba nke akwụsịrị dịka iwu n’ihe karịrị afọ iri.

    Nwaanyị ọbụla jụrụ irube isi, ga-anata nataramahụhụ nke gụnyere na enwereike ịkpọga onye nwoke ọbụla na-elekọta ya n'ụlọ mkpọrọ ruo ụbọchị atọ.

    Enweela obere ngagharịiwe oge ụfọdụ n'ime afọ a gara aga, mana ndị Taliban na-akụsa ụdịrị atụmatụ oge niile.

  9. Gọvanọ Lalong arịọla mgbaghara maka ihe o kwuru banyere Poopu Francis

    Gọvanọ Plateau steeti bụ Simon Lalong arịọla mgbaghara maka okwu ya banyere Poopu Francis ụka Katọlịk nke butere ọtụtụ nkatọọ n’aka ndị okpukperechi Kraịsti ọkachasị ndị ụka Katọlịk.

    Cheta na Lalong onye a họpụtara dịka onyeisi achụmnta vootu nye Bola Tinubu na Kashim Shettima nke All Progressives Congress (APC) sara ndị rụrụ ya aka na ọ na-akwụnyere ndị ụka alakụba na Poopụ Francis agwaghị ya na ihe o mere dị njọọ.

    Ndị mmadụ katọrọ Lalong na o kwesighị ịkpọtụ aha Poopu Francis n’okwu ha dịka ha kwuru na nke a bụ mkparị. Ọtụtụ kọwara na enweghị ihe jịkọrọ Poopu Francis na atụmatụ ndọrọndọrọ ọchịchị ya dịka a malitere ịrọ ụka Katọlịka na Naịjirịa ka akwụsị ya ọrụ dịka onye nwere ọkwa Knight n’ụka ahụ ngwa ngwa.

    Lalong zịpụtara ozi ma rịọ Poopu Francis nakwa ndị isi ụka Katọlịk arịrọ dịka o kwuru na ebumnobi ya abụghị ka ọ kparịa ha.

    Cheta na nhọpụta Bola Ahmed Tinubu họpụtara Kashim Shettima kpalịtere ọtụtụ okwu ọkachasị n'aka ndị ụka Kraịstị ndị kwuru na mmadụ abụọ si otu okpukperechi ekwesịghị ịzọkọ ọkwa onyeisiala na osote ya na Naịjirịa n'ihi na nke a gosiri mkpapụ.

  10. Etu otu nwoke si gbagbuo mmadụ 11 n'esemokwu ezinụlọ

    Mmadụ anwụọla site n'esemokwu ezinụlọ dapụtara na Cetinje dị na Montenegro.

    Ndị ọnụ na-eru n'okwu kwuru na otu nwoke malitere gbawa egbe, gbagbuo mmadụ atọ si n'ofu ezinụlọ ma bido gbawa ndị na-agara onwe ha egbe.

    Otu nne nwaanyị na ụmụ ya abụọ binyere nwoke ahụ gbapụrụ egbe nwụchara na ya bụ ọdachị.

    Mwakpo ahụ biri mgbe onye nkịtị ọzọ were egbe gbabuo nwoke ahụ na-agba ndị mmadụ egbe agharaaghara.

    Ndị ọnụ na-eru n'okwu kwuru na ka nwoke ahụ gbagbuchara mmadụ atọ ya na ya so biri n'ụlọ, o si ebe ahụ pụọ ma gbaa mmadụ asaa na-agara onwe egbe ahụ ọ ka ji n'aka.

    A mabeghị ihe mere nwoke ahụ ji gbawa ndị mmadụ egbe nke werekwuru ndụ ya.

    Mmadụ isii ọzọ na-anata ọgwụgwọ n'ụlọ ọgwụ ugbua.

    Prime Minister Dritan Abazovic kwuru na gọọmenti ewepụtala ụbọchị atọ iji ru uju maka ọdachị a.

    Cetinje bụ ebe ihe bụbụ isi obodo nọ n'ime ndagwụrụgwu nwere oke ugwu gbara Podgorica okirikiri.

  11. Ndakpọ ala mere n'Ebonyi achụpụla ezinụlọ karịrị 65

    Gọọmenti Ebonyi ekwuola na ha ga-akpọpụ ezinụlọ kaịrị iri isii na ise ndakpọ ala metụtara ebe ha bi dị n'Ogwuma Edda n'okpuruọchịchị Afikpo South.

    Ha si na ga-enyeaka ịme ka nzọpụta gọọmenti etiti n'ewete ebe ahụ malite ozigbo.

    Gọvanọ Dave Umahi na-achị steeti ahụ kwuru nke a mgbe ọ na-agagharị imata ihe ndị ndakpọ ala mere n'izu uka abụọ gara aga mebiri.

    Umahi kwuru na ọ bụ akwụkwọ nkịtị ka o degara onyeisiiala Muhammadu Buhari, kwuru na ọrụ mkpocha na nrụgharị nke gọọmenti etiti kwadoro ga-amalite n'ụbọchị Mọde na-abịanụ.

    O tiri ndị niile ọdachị a metụtara ụlọ ha aka n'obi, ma gwa Dọkịta Eni Uduma Eni bụ onyeisioche okpuruọchịchị Edda ka o nyecha ha niile ebe ha ga-edowegodu isi ruo mgbe arụchara ya bụ akụkụ ndakpọ ala mebisiri.

    Cheta na ndakpọ ala mere n'obodo Ogwuma dịketere akwammiri Iyere Edda dị n'okpuruọchịchị Afikpo South.

  12. Lee akwụkwọ nzuzo ole FBI jichiri n'ụlọ Donald Trump

    Ụlọọrụ FBI ejichiela akwụkwọ nzuzo karịrị iri na otu na bee aka chiburu Amerịka bụ Donald Trump dị na Florida n’izụ ụka a.

    Akwụkwọ ndị a gụnyere nke nwerike ibute ọgbaghara na nchekwa mba Amerịka.

    Trump gọrọ ụkwụ na aka ya na ya bụ akwụkwọ abụghị nke nzuzo.

    Nke a bụ oge mbụ a na-aga n'ụlọ aka chiburu Amerịka ime udiri nyocha ahụ dịka a na-agba ajụjụ ọnụ maka mpụ.

    Ọ bụ otu ọkaikpe gosiri ọhaneze ya bụ akwụkwọ nzuzo nke gunyere akwụkwọ nyere ndị FBI ikike ị ga n'ụlọ Trump dị na Mar-a-Lago,

    Iwu mba Amerịka megidere mwepụ akwụkwo nzuzo dịka onye nọ n'ọchịchị.

    Trump welitere ntaramahụhụ ya bụ agwa mgbe ọ bụ onyeisiala ịgụnye ị ga nga ruo afọ ise.

  13. Unu abọọla chi?

    Sonyere anyị dịka anyị ga na-ewetere ụnụ akụkọ dị ọkụ ka o si dị ọkụ.

  14. Asụọla Salman Rushdie mma n'olu

    Ode akwụkwọ Salman Rushdie nọn'ọnọdụ ọdị ndụ ọnwụ ka mma dịka otu nwoke sụrụ ya mma n'ahụ ma n'olu n'obodo Chautauqua, New York, mba Amerịka.

    Ọ bụ dịka ọ na-ekwu ọkwụ n'ụlo akwụkwọ Chautauqua ka awakporo ya.

    Anwuchiri otu nwoke bụ onye wakporo Rushdie.

    Eji ụgbọelu helịkọpta bụga ya ụloọkwụ dịka awakpo chara ya.

    Onye bụ Salman Rushdie

    Salman Rushdie bụ ode akwụkwọ eji akwụkwọ ọ dere n'afọ 1988 nke ọ kpọrọ 'Satanic Verses' were mara.

    Ndị okpukperechi alakụba anabataghị ya bụ akwụkwọ ma sị na o kwujọrọ okpukperechi ha.

    Onye bụbu onye ọchịchị mba Iran bụ Ayatolla Khomeini nyere iwu akpọrọ Fatwa nke dị ka ikpe ọnwụ n'isi Rushdie.

    Mmadụ iri ise na itolu nke gụnyere ndị gbanwere ya bụ akwụkwọ n'asụsụ ọzọ na ndị na-eme nghariiwe maka ya bụ akwụko.

    Rusdie gara na nzuzo afọ itolu maka nsogbu akwụkwọ a butere.

  15. Etu onye uweojii si gbagbuo ibe ya ma merụọ ndị ọzọ ahụ

    Akụkọ na-ekwu na otu onye uweojii gbagburu otu onye ibe ya ma merụọ mmadụ anọ ndị ọzọ ahụ.

    Nke a mere n’abalị Wenezde 10 Ọgọstụ, 2022 n’okporoụzọ dị n’obodo Agwa-Ejemekwuru nke okpuruọchịchị Oguta, Imo Steeti.

    Otu onye uweojii gbaara onye ntaakụkọ ama sị onye uweojii gbagburu ibe si na ngalaba Ambassador Tactical Unit nke n’Egbema, ebe ndị uweojii ihe mere si na ngalaba ‘Surveillance Unit’ nke isiụlọọrụ ndị uweojii.

    Ndị uweojii a ji ụgbọala bus na-ebughi akara maọbụ agwa e ji mara ndị uweojii mgbe ndị uweojii ibe ha wakporo ha.

    Nke a mere ndị uweojii ibe ya ji gbawa ha egbe na-amaghị ama chere na ha bụ ndị oji egbe chọrọ ịwakpo ụlọọrụ ndị uweojii dị n’Ogboakụ.

    Akụkọ sị na tupu ihe a eme na ndị uweojii a nwetere ozi na ndị ojiegbe na-abịa ịwakpo ha, nke mere ha jiri zoo na-eche ndị a.

    Mana mgbe ụgbọala bus ahụ bu ndị otu ha rutere, ha malitere gbawa ha egbe chere na ọ bụ ndị ojiegbe.

    Otu onye uweojii nwụrụ ebe mmadụ anọ ndị ọzọ merụrụ ahụ. Dịka ka ọ dị ugbua, ndị agú merụrụ anatala ọgwụgwụ ebe e tinyela ozu nke nwụrụ anwụ n’ụlọozu.

    BBC Igbo kpọrọ Micheal Abattam bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti maka akụkọ a mana ọ zabeghi tupu akụkọ a apụta.

  16. Ndị uweojii anwuchiela otu onye yi uwe ndị uweojii na mmadụ ise ọzọ

    Ndị uweojii nke Imo steeti anwuchiela mmadụ isii nke otu n'ime ha yi uwe nchekwa mgbọ ndị uweojii.

    Ọ bụ ọnụ na-ekwuchitere ha bụ Michael Abattam kwuru nke a n'akwụkwọ ozi ọ depụtara.

    A na-eche na ọ bụ otu n'ime uwe ndị uweojii ndị omekome gburu n'ụlọọrụ ndị uweojii dị n'obodo Agwa ka onye a yi.

    Ha kwuru na ọ bụ dịka ha natara ozi na ndị omekome gbara ọsọ mgbe ndị uweojii wakporo ndị omekome n'obodo Izombe na Agwa na akwụsị ndị na-eme njem n'okporoụzọ achọ ndị bụ ndi uweojii.

    Abattam depụtara na ha napụtara ndị a ngwa ọgụ nke gụnyere egbe Pump action, egbe ọka abụọ, mgbọ egbe iri abụọ na ise na mma dị nkọ iri na anọ

  17. Joshua Dariye ọ chọrọ iji aha Labour Pati azọ ọkwa Sịnetọ na Plateau Steeti?

    Ọtụtụ ndị na-ahụ maka ikike dịịrị onye akatọọla Joshua Dariye bụbu gọvanọ Plateau Steeti si na nga pụta maka atụmatụ ya iji aha Labour Pati azọ ọkwa Sịnetọ na steeti ahụ.

    Ha sị na ọ bụ ihe ọjọọ onye ụlọikpe mara ikpe ma tụọ nga n’ihi izu ego karịrị otu ijeri naịra ịpụta ịbịa ịzọ ọkwa n’obodo.

    Cheta na Dariye ka si n’ụlọ nga pụta ebe ọ nọchara ihe ruru afọ dịka gọọmentị Onyeisiala Buhari gbaghaara ya.

    O rughi otu izuụka nke a mere, e kwuwala okwu ịzọ ọkwa sịnetọ ga-anọchi anya Plateau Central n’ụlọomeiwu.

    Kepukepu na-ekwu na atụmatụ ịnabata ya na Labour Pati ka o were ọkọlọtọ ha zọọ ọkwa na-abịa na mmezu chọrọ ịnabata na Labour Pati.

    Mana Auwal Musa Rafsanjani nke ụlọọrụ ‘Transparency International’ na Naịjirịa sị na nke ekwesighi ime, na ọ pụtara na agha a na-ebu megide mpụ aghọọla ihe ụmụaka.

    Ọ sị na otu n’ime ndị mere e ji hapụ Dariye bụ maka ọnọdụ ahụike ya, mere ka o lekwasị anya na mgbake ya karịa ịsị na ọ chọrọ ịzọ ọkwa.

    BBC kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru Labour Pati na Naịjirịa bụ Yunusa Tanko, ọ sị na ọ maara maka okwu a.

    Ọ sị na a kpọtụụrụ Labour Pati maka atụmatụ Dariye ịzọ ọkwa, mana oge mmadụ ịpụta zọọ ọkwa emechiela.

    Kama na ohere ka dị ileba anya n’okwu ma hụụ ka e nwereike isi mee ya ma ọ bụrụ na iwu kwadoro ya.

    Kamgbe okwu dapụtara, Joshua Dariye n’onwe ya apụtabeghi kwuo ihe ọbụla banyere ya.

  18. Akpụpụghị m Atiku Abubakar n'ụlọikpe ọbụla - Nyesom Wike

    Gọvanọ Rivers Steetị bụ Nyesom Wike agọọla ụkwụ na aka ya, sị na ọ kpụpụghị Atiku Abubakar ji ọkọlọtọ PDP azọ ọkwa onyeisiala na Aminu Tambuwal bụ gọvanọ Sokoto steeti n'ụlọikpe.

    Mgbe ọ na-ekwu okwu n'emume ịgbape isiụlọọrụ ndị omeiwu na Pọtakọt, Wike sị na anya ya dị n'ime ka ọchịchị onye kwuo uche ya ruo ndị Rivers steeti aka.

    N'okwu ya "Ndị mmadụ akpọọla m sị na m kpụpụrụ Atiku n'ụlọikpe,"

    "Achọrọ m ikwu ya gbowam na agaghị m ụlọikpe. Achọrọ m ikwu ya ka ndị Naịjirịa mara. Agbachịla m nkịtị. A Achọrọ m inye ndị steeti m onyinye ọchịchị onye kwuo uche ya."

    "Onye akpọla ma aha ma ha daa na ntuliaka.

    "Ọ bụrụ na m chọrọ ịga ụlọikpe, ọ gaara abụ n'ime izuụka abụọ.

    "Ọ bụ ndị nkwado onye na-azọ ọkwa na-eme ihe ndị a. Ka ụwa nụrụ olu m. Ọ bụ ha na-eme ihe iji metọọ aha m.

    "Anyị kwesịrị ị na-ekwu okwu ka etu anyị ga-esi merie ntuliaka."

    Cheta na akwụkwọ pụtara na Tọzde nke a hụrụ n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja sị na Nyesom so ndị kpụpụrụ Atiku, Tambuwal na Inec n'ụlọikpe.

    Ha gwara ụlọikpe ha nye ya ikike dịka onye meriri ntụlika imeụlọ nke otu PDP nke emere n'ọnwa Mee.

    N'ikpe ahụ nke ya na nwoke akpọrọ Newgent Ekamon so ya tinye n'ụlọikpe ha gbara Atiku Abubakar, otu PDP nakwa INEC akwụkwọ.

    Wike na-ekwu ka ụlọikpe nyochaa ma inye Atiku vootu ndị Aminu Tambuwal nwetara na ntuliaka ahụ adara iwu .

    Nyesom Wike, Atiku Abubakar, Aminu Tambuwal, Bukola Saraki na ndị ọzọ bụ isi ahụrụ kwaba okpu nke otu PDP zọrọ ntuliaka imeụlọ ahụ.

    Dịka agụkọchara vootu Atiku nwetara 371, Wike nwetara 237, ebe Bukola Saraki nwetara 70.

    Mgbe emechara ya bụ ntuliaka imeụlọ, Nyesom Wike pụtara kwuo na o kwụ Atiku n'azụ nakwa na mmeri ya bụ ihe dị mma.

  19. Nnọọ nu na peeji anyị taa

    Akụkụ dị ọkụ ka o si dị ọkụ bụ ihe anyị na-ewetara unu taa.

    Chee aka ghọrọ anyị

  20. Kachifonụ

    Ya gaziere unu.

    Anyị ga-ahụ echi.