You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ndị Ebubeagu anọghị n'Oba Anambra Steeti - Onye ndu Oba

Onye ndu obodo Oba sị o nweghi ndị Ebubeagu nọ n'Obodo ha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Asuu adọtịala abuboọrụ ha ruo izu ụka anọ ọzọ

    Otu jịkọrọ ndị nkuzi mahadum bụ Academic Staff Union of Universities (Asuu) adọtịala abụbọ ọrụ ha na-agba ruo izu anọ ọzọ.

    Onyeisi otu a bụ Emmanuel Osodeke kwuru nke a taa bụ Mọnde dịka ọ kọwara na nke a bụ iji nye gọọmentị ohere ọzọ imezu nkwa ndị ha kwerela ha.

    Osodeke kwuru na ndị otu mere nzukọ gbatagbata n’ụbọchị ụka n’Abuja maka nke a.

    Cheta na e mechiri mahadum ndị nọ na Naịjirịa n’ihi ndị nkuzi nke otu Asuu malitere abụbọ ọrụ ha n’ụbọchị 14 nke ọnwa Febụwarị, 2022.

    Asuu na-agba ya bụ abụbọ ọrụ maka ọnọdụ ọrụ ndị nkuzi mahadum nakwa etu ha sịrị gbajọọ imezu nkwa ndị Asuu sị gọọmentị etiti kwere ha nke gụnyere ibuli ego ụgwọ ọnwa ha.

    Dịka Asuu na gọọmentị nọ na-asọkọtaisi n’okwu ihe ndị a, onyeisiala Muhammdu Buhari pụtara n’izu abụọ gara aga kwuo na ọ na-enye Minista agụmakwụkwọ nke Naịjirịa bụ Adamu Adamu na Chris Ngige bụ Mịnịsta na-ahụ maka ndị ọrụ Bekee na Naịjriịa iwu ka ha hụ na ha kwụsịrị abụbọ ọrụ Asuu ma dajụọ iwe ha.

    N’izu gara aga, otu ndị ọrụ na Naịjirịa bụ Nigerian Labour Congress (NLC) pụtara n’igwe n’akụkụ Naịjirịa niile mee ngagharịiwe iji gosi nkwado ha n’abụbọ ọrụ Asuu n’agba.

    Onyeisi NLC bụ Ayuba Wabba kwuru na ‘Ọ dị mwute na ụmụ ndị ọchịchị na Naịjirịa na-aga ofesi maka agụmakwụkwọ ha ebe ụmụ ndị nkiti nọ n’ụlọ maka abụbọ ọrụ Asuu’.

  2. PVC Registration: N'Abuja ndi mmadụ pụtara ka ha denye aha taa

    Ọtụtụ ndị mmadụ pụtara n'Abuja isiobodo na Naijiria ịmata ma ha aga-enwe ohere idebanye aha maka ntulika taa bụ abalị mbụ nke ọnwa Ọgustụ, afọ 2022.

    Onye ntaakụkọ anyị gagharịrị n'Abuja kwuru na ọ hụrụ ihe ruru mmadụ 20 n' ọdọ ndebanye aha Inec dị na Dutsen Alhaji dị n'Abuja.

    Ọ sịrị," Ihe dịka mmadụ 20 nọ na-eche na-ele anya na ndị ọrụị Inec ga-abịa dịka ha kwere nkwa ụnyahụ mana o nweghị onye n'ime ha a hụrụ."

    N'ụlọọrụt Inec dị na Garki Area10,dịkwa Abuja, mmadụ ole na ole bịara maka PVC mana ndị nche ogige ụlọrụ ahụ chụchghara ha azụ., sị ha na ndebanye aha kwụsịrị ụnyahụ bụ ụka.

    Cheta na ohere ndebanye aha mechiri na Naijiria nile n'abalị 31 nke ọnwa Julai dịka Inec si nye ntuziaka.

  3. PVC registration : 'Anyị chọrọ ka Inec gbatia oge maka idenye aha'

    Dịka abalị 31 nke ọnwa Julai afọ 2022 bụ oge ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka nyere maka idenya aha, ọtụtụ ụmụ NAijria akpọọla oku ka Inec gbatie oge ha nyere maka nke a.

    Oge onye ntaakụkọ anyị gara n'ụlọọrụ Inec ụbọchịụka ị hụ ka ihe si aga, Ọ hụụ ọtụtụ ndị mmadụ bịara idenye aha ha.

    Otu onye kpọọ onwe ya, Christiana Okoronkwo kwuru na " Abịara m taa idenye aha m, abaịala m ebe ọtụtụ ugbioro mak=na enwenwughị m ike idenye aha n'ihi igwe mmadụ juru ebe a."

    Ọ ga-aka mma ma Inec gbatia oge ha nyere ka ndị ọ masịị nwee ike idenye aha ha."

    Onye ọzọ bịakwara idenye aha ya kwuru na ndebanye aha na-aga nke ọma mana ọtụtụ denyebeghị aha ha."

    "Achọrọ m ka Inec gbatie oge ha ka ndị mmadụ were nwee ike ịtụ bvootu na ntuliaka na-abịa.

    Mana otu onye achọghị ka a kpọọ aha ya boro ebubo na ụfọdụ ndị ọrụ Inec na-ana aka azụ iji zaa ụfọdụ ndị mmadụ ngwangwa nke o kwuru bụ ihe butere na ọ naghị aga dịka o kwesịrị.

  4. A rụọla Cyril Ramaphosa aka n'ebubo nrụrụaka na mpụ

    Ebubo nrụrụaka na mpụ adapụtala n’isi Cyril Ramaphosa bụ onyeisiala mba Saụt Afrịka dịka ụlọọrụ na-ebuso mpụ agha na mba ahụ bụ Public Protector si kwuo.

    Ebụbọ a kwuru na Ramaphosa si n’ụzọ iwu akwadoghị ma kwụọ ụgwọ aka azụ ịhụ na atọọrọ ma nwụchịe ndị a na-enyo zupụrụ ego ruru nde dọla anọ n’ụlọọrụ ugbo ya na 2020.

    A na-enyokwa etu o siri nweta ego ruru etu a nke nọ n’ụlọọrụ ugbo ya.

    Ebubo bu ụzọ pụta ihe n’ọnwa Juun mgbe Arthur Fraserbụbu onyeisi ngalaba nchekwa nke State Security Agency na mba ahụ kwupụtara ihe a asị mere n’ọha.

    E kwuru na Ramaphosa kpụrụ ụkwụ n’ala ugboro ugboro ịbịa zara ọnụ ya n’ụlọọrụ ndị Public Protector dịka ha kporo ya oku.

    Cheta na okwu aka chịbụrụ mba ahụ bụ Jacob Zuma ka nọ n’ụlọikpe maka ebubo nrụrụaka na mpụ gụnyere ibupụ ego gọọmentị n’ụzọ na-ezighị ezi.

    Otu pati African National Congress (ANC) bụ pati onyeisiala Ramaphosa nọ n’ime ya kwesịrị ịkpọpụta aha onye ga-azọrọ ha ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2024 na nso nso, anya ọha na-ele ịhụ ihe ga-eme dịka ebubo a dapụtarala n’isi ya.

  5. Ndewoonu!

    Igbo ndị ọma, nke onye chiri ya zere!