You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ndị Ebubeagu anọghị n'Oba Anambra Steeti - Onye ndu Oba

Onye ndu obodo Oba sị o nweghi ndị Ebubeagu nọ n'Obodo ha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Etu ndị ntọrị si tọrọ di na nwụnye ka agbachara akwụkwọ ọhụrụ

    Ndị oji egbe ezu atọrọla yusuf Bashir na nwunye ya Fatima Babangida ọ lụrụ ọhụrụ n'ogbe Shola dị na Katsina steeti.

    Yusuf na Fatima lụrụ onwe ha ọnwa ise garalanụ, na-arahụ ụra n'ụlọ ha mgbe ndị oji egbe ahụ wakporo ha.

    Otu onye bi ebe ahụ kwuru na ndị omekome ahụ wakporo ebe ahụ ruo otu awa tupu ha buru di na nwunye ahụ gbafuo.

    Usman Ayuba bụ nwanne Bashir kwuru na ọdachị a etinyela ndị ezinụlọ ha n'agbagharịa.

    Ayuba kwuru na nwanne ya nwoke bụ mmadụ gbara mbọ ma lụtara onwe ya ụlọ tupu ọ lụọ nwaanyị.

    O kwuru na ndị oji egbe ezu ahụ akpọọla ezinụlọ ha ma gwa ha wete nde narị abụọ narị (N200 million) maọbụrụ na ha chọrọ ka atọghapụ ha.

    Kamgbe afọ ole na ole garalanụ Katsina na-agabiga oke mwakpo n'aka ndị omekome na-egbu ndị mmadụ maọbụ tọrọ ha.

    Gambọ Isa bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii ekwuola na ụlọọrụ ya na-enyocha ka ha mara ihe merenụ kpọmkwem.

  2. Ndị uweojii azọpụtala otu onye n'aka ndị ntọ

    Ndịuweoji Delta steeti azọpụtala otu onye akpọghị aha ya ndị ntọ tọọrọ na Sapele ụbọchị Satọde.

    N’ozi ọnụ na-ekwuru ha bụ Bright Odafe wepụtara, o kwuru na n’ebe Elekere iri na otu nke abalị Satode na ndị otu ha nọ ọrụ nchekwụsịrị ụgbọala Toyota Camrymmadụ atọ nọ n’ime ya, ha jụ ịkwụsị, ha chụwa ha ọsọ, ha hapụ ụgbọala ha gbalaga, hapụ otu onye ha kechiri n’ime ụgbọala ahụ.

  3. Ụnụ asaala chi?

    Igbo ndị ọma nwe m na ndị nwe, ndewoonu!

    Izu a mara n'ụnụ mma!

  4. NDLEA anwụchiela otu ụkọchukwu ji udu mkpụrụ mmiri atọ

    Otu na-alụso ọgwụike ọgụ na Naịjirịa bụ NDLEA anwụchiela otu ụkọchukwu akpọrọ Anietie Okon Effiong maka ibu udu mkpụrụ mmiri atọ echeere na esi mba India bubata.

    Ngalaba ahụ kọwara n'akara Facebook ha na ha chọpụtara ya bụ ọgwụ ike n'ime ụgbọala bu ya mgbe ha na-eme "kwụsị na nyocha" n'okporoụzọ si Umahia gawa Ikot - Ekpene n'ụbọchị Satọde.

    Ha chọpụtakwara na ọ bu na Legọs ka akwakọrọ ya bụ udu mkpuru mmiri n'ime ụgbọala bu ya n'ebe akpọrọ Ojuelegba.

  5. Ọgbaghara dapụtarala n'ọgbakọ PDP ataala isi otu onye, ụlọ

    Komishọna Osun steeti bụ Olawale Olokode ekposaala otu nnyocha pụrụ iche o hiwere na steeti ahụ dịka a rụrụ otu onye n'ime ha aka na mgbagbu a gbaguru otu onye n' ọgbakọ otu PDP nwere na steeti ahụ ụbọchị Satode.

    Ọgbaghara dapụtara n'ọgbakọ wọọdụ nke otu PDP nwere n'obi eze Atapara n' Ede, Osun steeti ụbọchị Satọde tara isi otu onye a ma dịka Ammo Nageghe.

    Kofoworola Babajide, bụ onye omeiwu gwara BBC na na ya rutere n'ọgbakọ hụ ebe otu nwaanyị a kpọrọ ka ya na ndị ọzọ na-adọrịtaụka , ya gbalịị ikpe udo tupu ya pụwa gaswwa ọgbakọ ọzọ n'Osogbo.

    O kwuru na oge uya pụrụ, na ọ nụrụ na onye pati ọzọ ji ohere nghọtahie dị na PDP buru osisi na mma gawa ebe ha na-eme ọgbajkọ ahụ malite ịkụ ndị mmadụ ihe..

    O kwuru na egbe dara , ịba mba karịa nke mere ka ndị uweojii na-agagharị bịa ebe ahụ.

    "A gwara m na oge ndị uweojii rutere ịjụ ihe na-eme, otu nwoke a kpọrọ Nagege na onye nweojii mịị egbe gbarịtawa onwe ha."

    Mana onye uweojii ahụ gbagburu Nagege, ndị uweojii buru ozu ya pụwa.

    Dịka nke a mere , ndị nkwado Nagege ji iwe zọpụ ije gaa gbaa ụlọ onye ndu pati ahụ ọkụ.

    Babajide kọwara na-agbara ihe nile o nwere ọkụ.

    " Nne m anọghị n'ụlọ."

    " Amaghị ma Nna m ọ nwụrụ anwụ n'ọkụ ọgbụgba ahụ ka ha akpụrụ ya were pụwa."

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Opalola Yemisi Olawoyin kwuru n'ozi o wepụtara ụbọchị Satode na Komishona uweojii steeti ahụ kposara otu nnyocha ndị uweojii ahụ ziga ndị nọ na ya na ngalaba ndị ọzọ iji kuziere ndị ọzọ na ndị uweojii steeti ahu agaghị anabata agwa ekwesịghị ekwesị.

    O kwukwara na nnyocha ihe mere ka na-aga n'ihu.

  6. Roseline Chukwuma,Tobi Amusan, Mary Ofili na Grace Nwokocha eriterela Naijiria ọlaedo

    Ụmụnwaanyị Naijiria atọ a; Rosemary Chukwuma, Tobi Amusan, Favour Ofili, na Grace Nwokocha eritelara Naijiria olaedo n'ọsọ mgbochị 100 mita nke mmadụ anọ!

    Ụmụada a mere ihe mmadụ e mebeghị n'Afrịka dịka ha nwetara mmeri a na tịkọmtịkọm 42 na ụma (42.10secs).

  7. Tobi Amusan eritela ọlaedo ọzọ

    Tobi Amusan eritela ọlaedo n’asọmpi Commonwealth Games dịka o mekwara ọzọ ihe mmadụ emebeghị n’asọmpi 'Commonwealth Games'.

    Amusan nwetara mmeri n’ọsọ mgbochi (hurdle ) 100 mita nke ụmụnwaanyị na tikọmkọm iri na abụọ na ọkara (12.30secs).

  8. Buhari: Ndị gburu ndị uweojii na ndị Nijie n'Ọwụwa Anyanwụ ka ata ahụhụ

    Onyeisiala Muhammadu Buhari nọrọ ụbọchị Satọde kpọku ndị isi ụka na ndị ọchịchị obodo n’Ọwụwa anyanwụ ka ha pụta kwugide oke gbuogbuo gbuo na-akpọtụ na mpaghara ahụ.

    Dịka ozi nke ọnụ na-ekwuru ya bụ Garba Shehu binyere aka si kwuo, oku na-abịa dịka e gburu ndị Nijie mmadụ isii na ndị uweojii.

    Ndị omekome wakporo ogige ndị uweojii Agwa communitydị n'Okpuru Ọchịchị Ugwuta n'Imo steeti na nsonso a gbuo ndị uweojii anọ.

    Buhari,onye katọrọ ọgbụgbụ ndị mbịara mbịarana ndị ọrụ nchekwa kwuru na ọ ga-eme ile iji hụ na aka kpara ma taa ndị aka ha dị n’ọnwụ ahụ ahụhụ dịka ọ dị n’iwu.

    Ọ sịrị, “Ndị ma ndị mere ihe a, rụọrọ anyị ha aka.”

    Ọ gara n’ihu kasie ezinaụlọ ha na gọọmentị mba Nijie obi maka ọnwụ ha.

  9. Ndewoonu!

    Ụnụ asaala chi!

    Ka izuụka mara Igbo mma!

  10. Israel - Gaza: Ụfọdụ mmadụ anwụọla n'egbeigwe Izrel na-atụ na Gaza

    Minstri ahụike mba Palestine ekwuola na ihe ruru mmadụ iri na ise ndị mba Palestine anwụola n'ebe akpọrọ Gaza Strip ebe ndị agha mba Izrel na-agba egbe igwe.

    Otu nwata dị afọ ise, ụmụ nwaanyị nakwa ndị ọgụ PIJ gụnyere onyeisi ha bụ Tayseer Jabari so na ndị nwụrụ.

    Mba Izrel n'onwe ha na'ekwu na ogbunigwe mba Palestine ruru narị atọ tụrụ ala ha kemgbe ụbọchị Fraịde.

    Ha kwukwara na ha anwụchiela mmadụ iri na itoolu so n’otu mba Palestine kpọrọ onwe ha Islamic Jihad.

    Nke a bụ ọgụ kachasị njọ maliterela n’etiti mba Palestine na ala Izrel kemgbe afọ 2021 ha lụrụ ọgụ abalị iri na otu

  11. Chaịna enyela mba Amerịka na ezinụlọ Nancy Pelosi mmachị

    Chaịna ejirila iwe nye Nancy Pelosi, onyeisi ụlọomeiwu mba Amerịka mmachị ma kagbuo mmekọ ha na mba Amerịka n’ọrụ nchekwa na ibuso mbụ agha n’ụwa nakwa ọrụ ndị ọzọ.

    Mmachi Chaịna na-enye Pelosi ga-emetụtakwa ezinaụlọ ya.

    Nke a na-abịa dịka Pelosi gara Taiwan agbanyeghị na Chaịna dọrọ ya aka na ntị ka ọ ghara ime ya bụ njem.

    Chaịna na-eche na mba Amerịka mara aka n’ihu mgbe Pelos bịara Taiwan bụ ala na-asị na ha nnwerela onwe ha n’aka mba Chaịna bụ bụrụ mba nke onwe ha ebe Chaịna na-ahụ ha ka mpaghara ebe ha ga-eweghachị ọchịchị na nso nso a.

  12. Unu asaala chi?

    Anyị ekeele unu o.

    Ndewonụ!

  13. Otu onye uweojii anwụọla dịka a sị na ndị agha Naịjirịa tigburu ya

    Otu onye uweojii Naịjirịa anwụọla dịka a na-ebo ebubo na ndị agha Naịjirịa tiri ya na ndị ogbo ya ndị uweojii ọzọ ihe n’ụbọchị Wenezde.

    Otu onye ọzọ n’ime ndị a e tiri ihe nọ n’ọnọdụ ọ dị ndụ ọnwụ ka ma n’ụlọọgwụ e bugara ya.

    Ka akụkọ siri kwuo, ọgbaghara kpalitere ọnwụ nwoke a dapụtara mgbe ndị agha Naịjirịa bu ụgbọala bọọsụ ha n’agba n’ụzọ Lagos-Badagary expressway ebe kpachị kpachị ụzọ gbochiri ha.

    E kwuru na ụfọdụ ndị agha wụturu ma malite ịgba mbọ kwaa ụzọ, mgbe ha ruru n’ihu okporoụzọ ahụ ha zutere ndị uweojii a ka na-arụ ọrụ ịkwa ụzọ ahụ.

    Akụkọ kwuru na ndị agha ahụ ji iwe malite iti ndị uweojii ahụ ihe ma napụ ha egbe ha dịka ha bupụrụ mmadụ abụọ n’ime ndị a.

    Ndị agha a ruru 30 dịka e si kwuo si ọzụzụ ha na-eme na Legọs na-alọta.

    Dịka mmadụ abụọ ahụ ndị agha bupụrụ nwetere onwe ha n’ụlọọgwụ ebe na-anata ọgwụgwọ, Orukpe Monday lara mmụọ n’ihi mmerụ ahụ so ihe e tiri ya.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs steeti bụ Benjamin Hundeyin gwara BBC na ha ndị agha Naịjriịa na-enwe mkparịtaụka maka ihe a sị mere.

    O kwukwara na ha na-agba mbọ inwetaghachi ngwa ọgụ ndị a e kwuru ndị agha napụrụ ndị a.

    Hundeyin kwuru na ndị uweojii Naịjirịa ezigarala ezinaụlọ nwoke a ozi ọnwụ ya dịka ha na-agbazị mbọ ili ya ugbua.

    Ndị agha Naịjirịa gbara ama na ihe a mere n’ezie. Ọnụ na-ekwuru usuu ndị agha nke 81 Division bụ Olaniyi Osoba kwuru na ihe a mere ndị mwute ma kwuo na ha amalitela nnyocha ịma etu ya bụ ihe siri mee n’ezie.

    Osoba kwuru na onye ọbụla ahụrụ na aka ya nọ n’okwu ihe a mere ga-ata ahụhụ nke iwu Naịjirịa kwadoro.

    Ndị agha Naịjirịa agaala njem mgbaru n’isi ụlọọrụ ndị uweojii na Legos steeti.

  14. Ndị ọrụ nchekwa obodo akụsasịala ọdọ ndị 'unknown gunmen' n'Anambra

    Njikọ aka ndị ọrụ nchekwa obodo nakwa ndị ọrụ nchekwa nktịtị achọpụtala ma wakpo ogige ndị unknown gunmen dị n'Ụkpọ n'okpuruọchịchị Nnewi Saụt dị na Anambra steeti.

    Ọ bụ ụlọ mgbasaozi nke aka na-achị steeti ahụ bụ Chukwuma Soludo wepụtara nke a n'akara Facebook ha.

    Ngwa ndị achọpụtara n'ebe ahụ gụnyere mgbọrọgwụ, atịkpa, ekike ndị agha, ụgbọala dị icheiche nakwa ụfọdụ ndị otu ahụ anwụchiri.

  15. Nabata nkwekọrịta a, ma tọhapụ Brittney Griner – Amerịka

    Mba Amerịka agwaala mba Rọshịa ka ha nabata atụmatụ a ga-eji tọhapụ Britnney Griner bụ onye a tụrụ nga afọ itolu na mba Rọshịa maka izubata ọgwụ ike.

    Ọ bụ dịka Griner kwetara na o ji mmanụ Igbo.

    Ọnụ na-ekwuchitere White House bụ John Kirby kwuru na atụmatụ a abụghị ihe eji egwu egwu.

    N'aka nke ọzọ ka ụlọ ntaakụkọ ndị nọ na mba Amerịka na-ekwu na atụmatụ a dịka ọ bụ nwaafọ Rọshịa bụ Viktor Bout nọ na nga n'aka Amerịka ka ha chọrọ iji gbanwee Brittney Griner nke Rọshịa ji ugbua.

  16. Chaịna amachiela Nancy Pelosi na ezinụlọ ya

    Mba Chaịna amachiela onye omeiwu mba Amerịka bụ Nancy Pelosi na ezinụlọ ya maka njem nleta ọ bịara na mba Taiwan.

    Mịnịsta na-ahụ maka mmekọ mba Chaịna na mba ndị ọzọ bụ Wang Yi kwuru sị, "Pelosi mekpara ugwu Chaịna nwere dịka mba nọọrọ onwe, ọ metụtara nkwenye nke 'Otu Chaịna' ma metụta udo na ọdịmma mpaghara Taiwan".

    Chaịna na-ahụ Taiwan dịka mpaghara si na Chaịna kewapụ onwe ya nke ha kwuru kwesịrị ịlọghachi dịka mpaghara nọ n'ime mba Chaịna.

  17. Onye uweojii egbuola ndị omekome atọ wakporo ụlọ ya.

    Otu onye uweojii egbuola mmadụ atọ n'ime ndị omekome wakporo ụlọ ya nke dị n'Aforukwu, Orogwe dị na mpaghara owerri, Imo Steeti.

    Ọ bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii steeti ahụ bụ Michael Abatam depụtara nke a ma sịkwa na ndị omekome a dị ọtụtụ were bịa ịwakpo ụlọ onye uweojii a.

    Abatam kwuru na ndị a wufere ogige aja ụlọ onye uweojii a kama ha zutere ihe ha atụghị anya ya dịka onye uweojii ahụ ji mgbọ egbe were mee ha ọbịa.

    Abatam dere sịkwa na ọ bụ ndị omekome a wakporo otu ụlo dị n'Orogwe, Imo Steeti ma gbuo mmadụ asaa n'ụbọchị mọnde.

  18. Unu abọọla chi

    Daalụ dịka i sonyere anyị taa maka akụkọ ga-amasị gị ịkọ taa niile

  19. Gọọmenti Benue Steeti ehiwela otu nchekwa ọhụrụ

    Gọvanọ Benue Steetị bụ Samuel Ortom ehiwela otu nchekwa ọhụrụ na steeti ahụ bụ ndị a kpọrọ 'Benue State Community Volunteer Guards'.

    Ọ sị na ọrụ ndị a ga-abụ ichekwa gburu ime obodo niile dị na steetị ahụ nakwa ibuagha megide ndị ntọrị na ndị ọchịehi na-eyi ndụ egwu.

    Ortom kwuru nke a mgbe ọ na-edu mmadụ narị ise bụ ndị otu n'iyi ọrụ dịka ha natachara ọzụzụ ha n'ụbọchị 4 Ọgọstụ 2022.

    Ọ gara n'ihu kwuo sị n'iyi ọdịda gọọmentị etiti ichekwa obodo mere o jiri tụlee iwu nchekwa a kpọrọ Benue State Vigilantee Law nke afọ 2000.

    Ọ sị na ha kpatụrụ aka n'iwu ahụ iji nye ndị a ikike ibu ụfọdụ ngwa ọgụ maka iche gburu gburu steetị ahụ.

  20. Agbaala ụlọ ndị mbịarambịara ọkụ agharaaghara na Saụt Afrịka maka ebubo ndịna n’ike

    Ndị mmadụ ejirila iwe wakpoo ma gbaa be ndị mbịarambịara ọkụ n’obodo Kagiso nke mba Saụt Afrịka maka okwu ịdịna ụmụmwaanyị asatọ n’ike dapụtara ebe ahụ n’izu gara aga.

    Ndị mbịarambịara ndị a nke ọkankụ ha bụ ndị na-egwupụta ọnatarachị n’ala nọ n’isi ebubo ndị a na-atụ aka n’okwu ndịna n’ike a.

    Onyeisiala Cyril Ramaphosa akatọọla ihe a mere ebe ahụ dịka ndị uweojii mba ahụ ji ụgbọala ha na ụgbọelu ha wụchịe ebe ahụ ma gbapụta ndị mmadụ.

    E kwuru na ndị uweojii gbara egbe rọba aghara aghara iji chụsa ndị a ji iwe na-agba be ndị mmadụ ọkụ.

    Akụkụ dapụtakwara na otu onye nwụrụ n’akụkụ ebe ahụ mana amabeghị ma ọ bụ ọgbaghara bụ ihe gburu onye ahụ.

    Ndị uweojii nwụchịrị ọtụtụ ndị n’ebe ahụ ma kwuo na a na-eche ozi mpụtara nnyocha ime ahụ ndị mmadu nke sayensị kpọrọ ‘DNA test’ ime ndị aka nọ na ya bụ okwu ndịna n’ike n’ezie.