Onyeisi otu World Health Organization (WHO) bụ Tedros Ghebreyesus, ekwuola na ahụhụ ndị mmadụ na-ata na mpaghara Tigray nke mba Ethiopia karịrị nke na-eme na Yukren.
O kwuru nke a dịka ọ na-akwa arịrị na ya enweghị ike inyere ọtụtụ ndị ikwu na ibe ya tọrọ na mpaghara Tigray aka, n'ihi na gọọmentị Ethiopia ekewapụla mpaghara ahụ na mmekọrịta ha na ndị mba ụwa.
Ọgụ malitere na mpaghara Tigray n'ọnwa Nọvemba afọ 2020 dịka ndị mpaghara chọrọ isi n'Ethiopia kewapụ ma bụrụ mba nke aka ha.
Ghebreyesys, onye si na mpaghara Tigray, gwara ndị ntaakụkọ okwu n'ụbọchị Wenezde, ma kwuo na ya amaghị ọnọdụ ụmụnne ya nọ n'ụlọ ugbua, maka na ha enwebeghị mkparịtaụka ọbụla.
"Enwere m ọtụtụ ikwu na ibe ebe ahụ. A chọrọ m izigara ha enyemaka ego na ihe ndị ọzọ, mana enweghị m enwe ike ime ya. Amaghị m mmadụ ole n'ime ha ka dị ndụ maọbụ ndị nwụrụla anwụ," Ghebreyesus kwuru.
"Ekwuola m ya ugboro ugboro na ihe na eme na-Yukren erughị chaachaa ka ihe na-eme na Tigray, mana enweghị onye na-ekwu maka ya."
"Gịnị kpatara nke a? Ọ bụ n'ihi ụcha ndị Tigray kpatara ụwa ji gbachi nkịtị?"
Gọọmentị Ethiopia ewepụla ikike ịkpọ oku ekwentị nakwa ịntaneetị na Tigra kamgbe 2020.
Puku kwuru puku mmadụ anwụkwaala na mpaghara ahụ kamgbe agha bidoro, ebe ọtụtụ nọ na mkpa ihe oriri.
Otu UN ekwuola na ha enweghị ike ibuga ihe enyemaka na mpaghara Tigray maka na gọọmentị Ethiopia ekweghị ha, mana gọọmentị na-ekwu na ọ bụ maka ọgụ a na-alụ kpatara ndị ọrụ enyemaka enweghị ike ịga ebe ahụ.
Otu 'World Food Programme' kwuru na ọkara n'ime mmadụ nde ise na ụma ise nọ na Tigray nọ na nnukwu mkpa ihe ha ga-eri, ma ọ bụghị ya, ọ bụ ọnwụ chere ha n'ihu.