You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ndị Ebubeagu anọghị n'Oba Anambra Steeti - Onye ndu Oba

Onye ndu obodo Oba sị o nweghi ndị Ebubeagu nọ n'Obodo ha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Asuu adọtịkwuola abụbọ ọrụ ha

    Otu jịkọrọ ndị nkuzi mahadum na Naịjirịa bụ Academic Staff Union of Universities (Asuu) adọtikwuola abụbọ ọrụ ha na-agba kemgbe ụbọchị 14 nke ọnwa Febụwarị , 2022.

    Nke a so ọgbakọ ndị isi otu a mere n’Abuja ụbọchị Mọnde.

    Ndị otu a ekwubeghị ọnwa ole ha na-adọtikwu abụbọ ọrụ ha ruo.

    Iwe Asuu so mkpesa ha sị ha meere nye gọọmentị etiti nke gụnyere:

    • Ka gọọmentị kwụọ ha ụgwọ mgbakwụnye a kpọrọ 'Earned Academic Allowance'.
    • Ka gọọmentị tinyekwuo ego n'agụmaakwụkwọ.
    • Ka gọọmentị gbanwee usoro ịkwụ ha ụgwọ a kpọrọ 'Integrated Personnel Payroll Information System' (IPPIS) ka ọ bụrụzie 'University Transparency and Accountability System' (UTAS).

    Ruo taa, Asuu na gọọmentị ka na asọkọtampị n’okwu ndị a.

  2. Ụlọikpe ukwu dị n’Abuja akụchapụla mkpesa ka a kpụpụ Abba Kyari mba Amerịka

    Ụlọikpe ukwu dị n’Abuja akụchapụla mkpesa gọọmentị etiti ka a kpọga Abba Kyari bụbụ osote kọmịshọna ndị uweojii mba Amerịka maka okwu nrụrụaka nọ n’isi ya

    Ọkaikpe Inyang Ekwo kwuru na ọ kụchapụrụ ya bụ ikpe nke ọkaiwu gọọmentị etiti bụ Abubakar Malai wetere n’ihi mkpesa ya ezughị oke.

    Cheta na gọọmentị etiti kwupụtaburu mmasị ha ịziga Kyari mba Amerịka ka ọ zara ọnụ ya n’ebubo ndị uweojii nke ngalaba Federal Bureau of Investigation nwere n’isi ya na otu nwoke ha ji eji bụRamon Abbas, (Hushpuppi).

    Ebubo a kọwara na Kyari na Hushpuppi rụkọrọ ọrụ mee mpụ.

    Ndị uweojii Naijịrịa kwụsịrị Abba Kyari ọrụ nwamgbe nta n’ihi ebubo ibu ọgwụ ike ngalaba NDLEA bụpụtara n’isi ya.

    Akụkọ ka na-abịa.

  3. Ndị omekome na-eyi m egwu - Paul Pogba

    Paụl Pogba etiela mkpụ sị na ndị omekome na-eyi ndụ ya egwu ma na-achọ ịnapụ ye ego n'ike.

    Ọ bụ n'akwụkwọ ozi onye ọkaiwu Pogba wepụtara n'ụbọchị sụnde ka o kwuru nke a.

    Nke a na-eme dịka nwanne ya bụ Mathias Pogba na-ekwu na ọ nwere ihe ọ ga-ekughe maka Paul Pogba ga-atụ ndị ụwa n'ọnụ.

    Mathias mere ihe onyonyo n'akara Instagram ya were sị na enwere ihe ndị otu bọolụ mba Fransi, ndị otu Juventus na ndị na-akwado Paul Pgba kwesịrị ịma maka ya.

  4. Ụgbọ mmiri agha mba Amerịka agafeela oshimiri mba Taiwan

    Ndị agha mmiri mba Amerịka ekwuola na ụgbọ mmiri ha abụọ esila oshimiri mba Taiwan gafee.

    Nke a na-eme dịka mba Chaịna na Taiwan na-elerịta onwe ha anya ọjụọ kamgbe onye omeiwu mba Amerịka bụ Nancy Pelosi gara njem nleta na mba Taiwan.

    Njem nleta a were Chaịna iwe nke mere ka ha gosi ike ndị agha ha na mpaghara mba Taiwan.

    Iwe Chaịna hiwere isi n'ihi na ha ekwetaghị na Taiwan bụ mba nọọrọ onwe ya kama ha na-ahụ ya dịka otu mpaghara mba Chaịna.

    N'aka nke ọzọ ka Amerịka na-ekwu na ụgbọ mmiri ha ndị a na-egosi na ekwesịghị inwe mgbochi ime njem n'oshimiri bụ nke mmadụ niile.

  5. Emeela akwam ozu Jos Eduardo dos Santos taa

    Emere akwamozu Jose Eduardo dos Santos onye chịrị mba Angola afọ iri atọ na asatọ taa n'isi obodo Luanda.

    Santo nwụrụ na mba Spen n'ọnwa Julai afọ 2022.

    Dịka ọ siri n'ọchịchi pụọ, eboro ya enuno nrụrụaka na imegide ikike dịịrị onye mgbe ọ nọ n'ọchịchị.

  6. NDLEA anwuchiela onye na-azacha ihe bụ onyeisi otu na-atụ ọgwụike

    Ngalaba na-ebu agha megide ọgwụ ike bụ ‘National Drug Law Enforcement Agency’(NDLEA), anwụchiela onye na-azachasị ihe na ọdọụgbọelu 'Murtala Muhammed International Airport' dị na Legọs, maka ịbụ onyeisi ndị na-ebu ọgwụike.

    A nwụchiri Ohiagu Sunday,gbara afọ 38, onye Orlu- West n’Imo steeti n’abalị 23 nke ọnwa Ọgọstụdịka a nwụchichara otu onye na-achọ ifepụ gawa Dubai aha ya bụ Obinna Jacob Osita bụ onye a hụrụ aka igbo atọnke o zoro n’akpa akpụ, garị nakwa ịsha.

    Nnyocha NDLEA mere gosiri na Osita gbara afọ 42, onye okpuru ọchịchị Oyi dị n’Anambara steeti bi Dubai, gobiri Ohiagu ka ọ kwara ya ụzọka ya gafere n’enweghị nsogbu ọbụla n’Ọdọụgbọelu MMIA oge tupu aka akpara ya.

  7. Anyị ka na-achọ ndị ji okwute tụgbuo Deborah Samuel - Ndị uweojii Sokoto steeti

    Ndị uweojii Sokoto steeti ekwuola na ha ka na-achọ ndị gburu Deborah Samuel bụ onye e ji okwute tụgbuo n’ọnwa Mee maka ebubo ikwutọ okpukperechi.

    Sanusi Abubakar bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ, kwuru sị na ndị ha nwụchiburu mbụ abụghị ndị tụgburu ya, kama na ha so kwanye ọkụ na ngagharịiwe mere mgbe ahụ.

    Abubakar kwuru na ndị ahụ a nwụchiri ka nọ na mkpọrọ, dịka ụlọikpe si nye iwu.

    O kwukwara na ha ka na-ama imi n'ala ịchọta ndị kpara ya bụ mkpamkpa, na obi kara ya na ha ga-achọta ha ma kpụpụ ha ụlọikpe.

  8. Unu achụrụla nta vootu gaa n'ụlọụka na ebe ofufe ndị ọzọ - Inec

    Dịka ọ fọrọ otu ọnwa ka a malite achụmta vootu, Independent National Electoral Commission (Inec) adọọla ndị na-azọ ọkwa aka na ntị ka ha ghara ịchụ nta vootu n’ụlọụka na ụlọalakụba.

    Inec dọkwara aka na ntị ka ha ghara iji ekpo na-ajalite ndị nkwado ha ga-agbakọ n'ọgbọ ebe a na-achụ nta vootu, dịka e si emebu na mbụ.

    Festus Okoye bụ ọnụ na-ekwuru Inec kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụlọntaakụkọ Punchng nwere, dịka ọ na-ekwu ka ha gharakwa ịkọ ndị mmadụ ọnụ maọbụ kpọọ ha iyi dịka ha na-achụ nta vootu.

    O kwuru na mpaghara 92 nke iwu ntuliaka (Section 92 of the Electoral Act) kwuru "na ọ bụ iwu na a gaghị eji ịkpọ iyi maọbụ okwu akpọmasị gbarụọ ịchụ nta vootu n'ụzọ nwere ike ikpasu iwe n'ụzọ ofufe, agbụrụ maọbụ nkwenye onye."

  9. Etu ndị uweojii Bauchi siri chọta nwaada dị afọ 17 furu na Legọs kemgbe Tọọzde

    Ndị uweojii achọtala otu nwata nwaanyị gbara afọ 17 furu na Legọs steeti dịka a hụrụ ya n’ime Bauchi Steeti.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Bauchi steeti bụ Ahmed Wakil kọwara na nwa a furu kemgbe ụbọchị Tọọzde.

    O kwuru na nwaada si be ha pụọ n’ụbọchị Tọọzde (25/08/2022) dịka e ziri ya ozi ka ọ wegara otu enyi ezinụlọ ha ntutu isi Bekee n’Ikorodu.

    Ozi Wakil kwuru ‘Ọ banyere ụgbọala bọọsụ n’akụkụ ụlọ ha ma nweta onwe ya na Bauchi steeti’.

    Ozi ọhụrụ ndị uweojii zịpụtara taa bụ Satọdee kọwara na nne na nna nwata nwaanyị a bịala kpọrọ nwa ha dịka ha na-eme nnyocha n’okwu ofufu ya.

  10. Ndị agha achụọla mmadụ abụọ a na-enyo n’okwu ọnwụ Sheikh Goni Gashua n’ọrụ

    Ndị agha Naịjirịa achụọla ndị otu abụọ a na-enyo n’okwu ogbubu Sheikh Goni Gashua, dịka ha kwuru na ha ga-enyefezị ha n’aka ndị uweojii ka a kpụpụ ha ụlọikpe.

    A kpụtara aha mmadụ abụọ dịka Lance Corporal John Gabriel and Lance Corporal Adamu Gideon.

    Onye nlekọta otu ndị agha Naịjirịa nke 241 Reece battalion, Nguru, Yobe bụ Lt Col. Ibrahim Osabo kwuru na nnyocha ha na ndị uweojii jịkọrọ aka mee gosiri na aka mmadụ abụọ a adịghị ọcha.

    Ozi ndị agha kwukwara na ha chụrụ mmadụ abụọ n’ọrụ maka ịhapụ ịrụ ọrụ ha nakwa innpụisi n’usoro iwu ndị agha Naịjirịa.

    Cheta na akụkọ pụtara na mbido ọnwa a na e gburu otu ụkọchukwu ụka Alakụba bụ Sheikh Goni Aisami-Gashua.

    Akụkọ kwuru na ụkọchukwu a nọ na-eme njem site na Gashua gawa Kano mana otu ụgbọala bọọsụ soro ya ma wakpoo ya.

    E kwuru na ihe a mere n’ebe ụtụtụ ụbọchị ahụ.

    Ndị uweojii na Yobe steeti mechara nwụchie ụfọdụ ndị a na-enyo nke gụnyere ndị agha abụọ a achụrụ n’ọrụ ugbua.

    Onyeisiala Muhammadu Buhari katọrọ ogbugbu onye ụkọchukwu a mgbe akụkọ a pụtara ihe.

  11. Etu idemmiri si memina mmadụ 1000 kemgbe Juun na Pakistan

    Praịm Minista mba Pakistan bụ Shehbaz Sharif agwaala puku kwuru puku ndị mmadụ bi n’akụkụ mba ahụ no so mmiri ka ha si n’ebe obibi ha gbapụ n’ihi etu idemmiri si anyụ ha ikpakwụ ebe ahụ.

    Mpaghara Sindh so n’ebe ihe a dị egwu na-eme dịka e kwuru na mmiri na-ezozi ugboro asatọ karịa etu o si ezobụ.

    Nke a na-abịa dịka kemgbe ọnwa Juun ihe ruru otu puku ndị mmadụ anwụọla n’ihi idemmiri ebe ndị ọsọ gbapụrụla ma na-acho ebe ha ga-ebi maka nke a.

    Sharif kwuru na ihe a “akarịala etu ha siri tụọ anya ya” ma kọwa na oke idemmiri a emetụtala ihe ruru nde mmadụ iri atọ na atọ bi ebe ahụ, nke a bụ pasentị iri na ise ndị bi na mba a.

  12. Ụmụnwaanyị atọ ndị uweojii kpụpụrụ ụlọikpe maka ire ụmụ ejima ma gbuo nne ha.

    Ndị uweojii Enugwu steeti akpụpụla ụmụ nwaanyị atọ ụlọikpe maka ebubo na ha rere ụmụ ejima nde naịra atọ ma gbuo nne ha.

    Ọ bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii steeti ahụ bụ Daniel Ndukwe depụtara nke an'akwụkwọ ozi o zipụtara.

    Ọ dere sị, "anwụchịrị mmadụ atọ maka ịkpa nkata ree ụmụ ejime amụrụ ọhụrụ ma gbuo nne ha dịka ọ chọpụtara na ego enyere ya pere mpe karịa ihe ha rere ụmụ ya".

    Ndukwe kwukwara na ọ bụ n’ụbọchị ise nke ọnwa oktoba ka ya bụ Ikpe ga-ebido.

  13. CBN ewepụtala Nde $265 a ga-akwụ ụlọọrụ ụgbọelu

    Central Bank of Naijirịa bụ ụlọakụ kachasị na Naijirịa bụ CBN ewepụtala nde dọla narị abụọ na iri isii na ise a ga-akwụ ụlọọrụ ndị na-eme njem ụgbọelu na Naijirịa.

    Nke a bụ dịka ọtụtu ụlọọrụ ndị a si mba ofesi na-achọ ịkwụsị ime njem na Naijirịa maka ego eji ha ebe CBN na-ekwu na ha akpachịghị ha ịwepụ ego ha na Naijirịa kama ha chọrọ ka were ya n’ụzọ ziri ezi.

  14. I bọọla chi!

    Daalụ dịka ị na-esonye anyị taa maka akụkọ nille ga-amasị gị

  15. Ndị uweojii Imo steeti sị na ha akụsasịala ọgbọ ndị Ipob/ESN, gbuo mmadụ ise n'ime ha

    Nd uweojii Imo steeti awakpoola ma ksasa ebe ha s b ebe nd Ipob/ESN na-ezo n’obodo Izombe d n’okpuru chch Ugwuta, na steeti ah.

    Ha kwuru na ha gburu mmadụ ise n’ime ndị otu ahụ ka ha na ha kwakọrịtara mgbọ na mgbede Tọzde 25 nke ọnwa Ọgọstụ 2022, ma napụta ha ọtụtụ ngwaagha, uwe ndị uweojii, uwe ndị agha nakwa ọkọlọtọ Biafra.

    Ha kwuru na ha natara ozi maka mkpamkpa otu ahụ na-akpa, mere ka ha wuchie.

    Ndị uweojii kwuru na ha napụtara ọtụtụ egbe gụnyere 'pump action' atọ, egbe arụrụarụ isii nakwa ogbunigwe anọ.

    Ha kwukwara na ha hụrụ mbe anọ ka dị ndụ, otu akpụkpọụkwụ ndị uweojii, akwa na-acha ọbara ọbara nakwa ụfọdụ ọgwụike.

    Michael Abaattam bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na ndị uweojii atọ merụrụ ahụ na ya bụ mwakpo, mana ha anatala ọgwụgwọ.

    Abattam kwuru na e zigala ọtụtụ ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ n'obodo ahụ iji chekwaa ha, ma kwuo na ha na-etinye uchu n'ịnwụchi ndị otu ahụ riri mbombo ọsọ.

  16. Ihe na-eme na mpaghara Tigray n'Ethiopia karịrị nke na-eme na Yukren - Onyeisi WHO

    Onyeisi otu World Health Organization (WHO) bụ Tedros Ghebreyesus, ekwuola na ahụhụ ndị mmadụ na-ata na mpaghara Tigray nke mba Ethiopia karịrị nke na-eme na Yukren.

    O kwuru nke a dịka ọ na-akwa arịrị na ya enweghị ike inyere ọtụtụ ndị ikwu na ibe ya tọrọ na mpaghara Tigray aka, n'ihi na gọọmentị Ethiopia ekewapụla mpaghara ahụ na mmekọrịta ha na ndị mba ụwa.

    Ọgụ malitere na mpaghara Tigray n'ọnwa Nọvemba afọ 2020 dịka ndị mpaghara chọrọ isi n'Ethiopia kewapụ ma bụrụ mba nke aka ha.

    Ghebreyesys, onye si na mpaghara Tigray, gwara ndị ntaakụkọ okwu n'ụbọchị Wenezde, ma kwuo na ya amaghị ọnọdụ ụmụnne ya nọ n'ụlọ ugbua, maka na ha enwebeghị mkparịtaụka ọbụla.

    "Enwere m ọtụtụ ikwu na ibe ebe ahụ. A chọrọ m izigara ha enyemaka ego na ihe ndị ọzọ, mana enweghị m enwe ike ime ya. Amaghị m mmadụ ole n'ime ha ka dị ndụ maọbụ ndị nwụrụla anwụ," Ghebreyesus kwuru.

    "Ekwuola m ya ugboro ugboro na ihe na eme na-Yukren erughị chaachaa ka ihe na-eme na Tigray, mana enweghị onye na-ekwu maka ya."

    "Gịnị kpatara nke a? Ọ bụ n'ihi ụcha ndị Tigray kpatara ụwa ji gbachi nkịtị?"

    Gọọmentị Ethiopia ewepụla ikike ịkpọ oku ekwentị nakwa ịntaneetị na Tigra kamgbe 2020.

    Puku kwuru puku mmadụ anwụkwaala na mpaghara ahụ kamgbe agha bidoro, ebe ọtụtụ nọ na mkpa ihe oriri.

    Otu UN ekwuola na ha enweghị ike ibuga ihe enyemaka na mpaghara Tigray maka na gọọmentị Ethiopia ekweghị ha, mana gọọmentị na-ekwu na ọ bụ maka ọgụ a na-alụ kpatara ndị ọrụ enyemaka enweghị ike ịga ebe ahụ.

    Otu 'World Food Programme' kwuru na ọkara n'ime mmadụ nde ise na ụma ise nọ na Tigray nọ na nnukwu mkpa ihe ha ga-eri, ma ọ bụghị ya, ọ bụ ọnwụ chere ha n'ihu.

  17. Russia na-emebi 'gas' ha nwere n'agbanyeghị na ụkọ gas na-arị elu na Yurop

    Nnyocha egosila na mba Rọshia na-emebi ọtụtụ gas ha nwere n'agbanyeghị na ya bụ gas na-akọ ụkọ, ọnụ ahịa ya a na-arịkwa elu na mba Yurop dị icheiche.

    Ndị ọkachamara kwuru na ha chọpụtara na ụlọọrụ 'gas' nke mba Rọshịa nwere n'ọdị nso okeala ha na Finland na emefu ọtụtụ gaasị site n'ịkpọ ha ọkụ nke a na-akpọ 'gas flaring' na bekee.

    Cheta na ọtụtụ mba Yurop bụ n'aka mba Rọshịa ka ha si azụta mmanụ agbịdị nakwa gaasị.

    Ụfọdụ n'ime ha, ọ kacha Jamanị, ekwuola na ha ga-akwụsị ịzụ gaasị n'aka Rọshịa n'ihi mwakpo Rọshia wakporo mba Yukren.

    Ha kwuru na ha agaghị na-enye Rọshịa ego nke ha ga-eji na-azụrụ ngwaọgụ ma na-emekpa Yukren ahụ.

    O ruola ọnwa isii ugbua Rọshia ji malite ịwakpo Yukren.

    Ndị ọkachamara kwuru na ọ bụrụ n'oge mbụ, ọ bụ Jamanị ka Rọshia gaara eresị gaasị ndị a ha na-emebizi ugbua.

    Onye na-anọchite anya Jamanị na mba UK gwara BBC na ọ bụ maka na enweghịzi ndị na-ekwe azụrụ gaasị n'aka Rọshịa mere ha ji ala ya n'iyi.

    Mana ndị ọkachamara na-ekwu na ịkpọ gaasị ọkụ adịghị mma maka ihu eluigwe maka na ọ na-ewepụta ikuku 'carbondioxide' nakwa ntụ 'soot' nke na-eme ka ekpomọku ihu eluigwe na-akawanye njọ.

  18. Ka ndị Naijirịa zeere mpaghara ugwu mba Cyprus - Abike Dabiri-Erewa

    Onyeisioche ngalaba na-ahụ maka ndị Naijirịa nọ mba ofesi bụ Abike Dabiri-Erewa adọọla ndị Naijirịa aka na ntị ga ha zeere mpaghara ugwu mba Cyprus.

    Ọ gwara ndị ntaakụkọ nke a n'ụbọchi Tọzde ma sị na ha na-nweta ozi na egbuola ọtụtụ ndị Naijirịa na mpaghara ahụ.

    O kwuru na gọọmentị Naijirịa enweghiike itinye ọnụ n'ọgbaaghara na-ada na mpaghara ahụ n'ihi na mba ụwa niile ahụghị mpaghara ahụ dịka nke nọọrọ onwe ya.

  19. A ga-echi nwaafọ Naijirịa bụ Bishọp Peter Okpaleke Kadịnal

    A ga-edu Bishọp Peter Okpaleke nke ụka katọlị n’Ekwulobia n’iyi ọrụ dịka Kadịnal ụka katolịk n’ụbọchị satọde.

    Okpaleke ga-eso n'ime mmadụ iri abụọ ahọpụtara a ga-echi Kadịnal na St Peter's Basilica n'ụbọchị Satọde.

    Okpaleke ga-abụ onye nke ise bụ nwaafọ Naijirịa echirila echichi Kadịnal.

  20. Mba Amerịka akwanyerela Deborah Samuel ugwu maka ogbugbu e gburu ya

    Mba Amerịka akwanyerela Deborah Emmanuel bụ nwata akwụkwọ e gburu na mahadum dị na Sokoto ugwu maka ebubo na ọ kwara ọkpukperechi Alakụba emu.

    Nke a na-abịa dịka Amerịka na-eme emume ụbọchị ncheta maka ịkwanyere ndị e gburu n’ihi okpukperechi ugwu.

    Ụlọọrụ ‘International Religious Freedom’ kwuru “maka otiti ihe, ịma ogwute nakwa ịgba Deborah Samuel ọkụ n’ebubo ịkpọ asị. Anyị na-akwanyere ya ndụ ya ugwu dịka anyị na-agba mbọ ịkwụsị ụdị mwakpo ndị a.”

    Ọnwụ Deborah nwụrụ n’ọnwa Mee nakwa nwuchi mmadụ abụọ a sị so gbuo ya butere ọgbaghara na Sokoto steetị nke mere e ji tinye ọnọdụ onye apụla ezi.