You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ọ bụrụ na Putin bụ nwaanyị, ọ karịghị awakpo Ukraine - Boris Johnson
Boris Johnson ekwuola na ọ bụ ime odogwu nwoke enweghị isi mere Vladimir Putin ji wakpoo Ukraine.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Anya Russia dịzị n'iweghara mpaghara Ọwụwa Anyanwụ na Ndịda mba Ukraine - Zelensky
Onyeisiala Ukraine bụ Volodymyr Zelensky na-ekwu na echiche ndị Russia bụ etu ha ga-esi merie ma weghara mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nakwa Ndịda Ukraine.
Nke a na-abịa dịka akụkọ kwuru na ndị agha Russia gbara ọsọ gbabaa Belarus, dịka ndị agha Ukraine yiri ha egwu na mpaghara Ugwu.
Ndị agha Russia enwenwughị ike iweghara obodo Kyiv nke dị na mpaghara ugwu n'ihi ike ndị Ukraine kpara.
Mana BBC achọpụtakwala ihe akaebe gosiri ime mpụ agha (war crimes) na mpaghara Bucha bụ ebe ndị agha Russia si gbaa ọsọ.
Onye ntaakụkọ BBC hụrụ ozu ndị nkịtị e kefere aka n'azụ tupu a gbagbuo ha, ụfọdụ ka a gbara egbe n'isi.
Ndị agha mba Russia ejirila nwayọ na-amịpụ na mpaghara ugwu mba Ukraine
Onyeisiala Ukraine bụ Volodymyr Zelensky na-ekwu na ha chọpụtara na ndị agha Russia ji nwayọ na-amịpụ na mpaghara ugwu mba ha.
Nke a na-abịa dịka ndị agha Ukraine kwechiiri ma buso Russia agha n'ụzọ ha atụghị anya na mpaghara ahụ.
Mana Zelensky na-adọ ndị agha ya aka na ntị na nnukwu agha ka chere ha n'ihu na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Donbas na Kharkiv.
"Ukraine ewegharala ọtụtụ obodo na mpaghara Ugwu nakwa Ọwụwa Anyanwụ Kyiv, mana ndị agha Russia jisi ike gbabanye n'obodo Belarus," nke a bụ dịka ngalaba 'Institute of War' si kwuo.
Ha kwukwara na Russia nwere ike iweghara obodo Mariupol n'ụbọchị olemole na-abịanụ, n'agbanyeghị na ọtụtụ ndị agha ha na-anwụ.
Russia na-atule atụmatụ ha ji alụ agha na Ukraine, n'ihi na ọ mịtabeghị mkpụrụ dịka ha si chee,
Ụtụtụ ọma
Ụnụ asaala chi. Nke a bụ etu ọnọdụ si kwuru ugbu a n'agha na-ada n'etiti Russia na Ukraine.
Achụọla mmadụ abụọ ndị isi agha mba Yukren maka ebubo mgba okpuru
Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky achụọla mmadụ abụọ bụ ndị isi agha mba ahụ maka ebubo ịgba mgba okpuru.
Ọ bụ n'ozi o ziri n'abalị ka o kwuru nke a.
O kwuru sị, “Enweghị m ohere ndị mgba okpuru ugbua, kama a ga-ata ha ahụhụ etu o kwesịrị”.
Ọ kpọrọ aha mmadụ abụọ a ma sị na ha emebiela iyi agha ha ṅụrụ ịkwado ma chekwa ndị mba Yukren, ma sị na a ga-anapụ ha ọkwa elu ha ji.
Unu abọọla chi
Soro anyị taa maka akụkọ ga-amasị gị gbasara agha na-ada na mba Yukren
Anaghị agwa Putin eziokwu maka Yukren- Ndị nchọpụta mba Briten
Onye na-ahụ maka nchekwa mba Briten bụ Jeremy Fleming ekwuola na njem ọ mere na mba Ọstralịa sị, " ndị agha Rọshịa enweghị ngwa ọgụ ma na obi na-ada ha mba- ha anaghị eme ihe a sị ha mee, ha na-emebi ngwa ọrụha ma gbatuo ụgbọelu ha na mberede".
O kwukwara sị na ndị ndụmọdụ Putin na-atụ ụjọ ịgwa ya ezikwu ihe na-eme.
Fleming sị," Ihea pụtara ihe niile ndị ọchịchị mba ndịda anyanwụ dọrọ Putin na-ahụ ya dịka agha nke onwe ya kama ọ bụ ndị aka ha dị ọcha na-anwụ na Yukren ya na ndị agha mba Rọshịa".
Unu asaala chi!
Soro anyị taa maka akụkọ gbasara agha Yukren na Rọshịa dịka ọ na-agbawa
Russia na Ukraine na-enwe mkparịtaụka na mba Turkey
Mkparịtaụka n’etiti Russia na Ukraine na-aga n’ihu ugbua na mba Turkey iji kwụsị ọgụ ha na-anụ na mba ha.
Nke a bụ mbụ mba abụọ a ga-ezute n'ihu n'ihu kamgbe izuụka abụọ.
Ebe ha na-enwe mkparítaụka bụ na Dolmabahce bụ ụlọrụ onyeisiala Turkey bụ Erdogan dị n'Istanbul.
Ndị nnọchiteanya Russia nakwa nke Ukraine nọkọtara ọnụ n'elu tebulu toro ogologo ebe onyeislala Erdogan agwala ha okwu nke butere ịkụ aka.
Mana ndị mmadụ na-eche na ya bụ ọgbakọ agaghị achịta mkpụrụ ọbụla.
Erdogan kwuru na o na-ewute ya na ọgu a abala izu ụka ise ya mana na-ekwu na etu mba ya si bụrụ ọyị mba abụọ a mere ka ọ kpe udo n'etiti ha.
N'ọnụ ya, "nkwụsị ọdachị a dị unu abụọ n'aka."
Turkey so n'otu North Atlantic Treaty Organisation(Nato) .
Unu asaala chi ee!
Anyị na-amalite njem iwetere unu akụkọ ndị gbara ọkpụrụkpụ si n'ọgụ dara n'etiti Russia na Ukraine ka otu ọnwa gachara.
Ndewonu!
Ndị na-ekwuru Abramovich na-ebo ebubo na enyere ya nsi, Akụkọ ọhụrụ adapụtala n'isi Roman Abramovich bụ onye nwebụ otu bọọlụ Chelsea enyerela ọtụtụ mmachị maka mwakpo Russia na Ukraine
Otu n’ime ndị ọnụ na-ekwuru Roman Abramovich bụ onye ọgaranya mba Russia nwebụ otu bọọlụ Chelsea enyerela ọtụtụ mmachị maka mwakpo Russia na-eme n’Ukraine ekwuola na ọ dị ka enyere Abramovich nsi n’ebe mbido ọnwa Maachị a.
E kwuru na nke a mere dịka ya na ndị ọkpe udo mba Ukraine nwechara mkparịtaụka udo.
Ha ekweghị kwuo ma e nwere ndị ọzọ enyere ya bụ nsi maọbụ ebe ebubo inye nsi a si pụta.
Ụlọọrụ ntaakụkọ nke Wall Street Journal ekwubuola na mmadụ atọ gara mkparịtaụka udo na Kyiv lọtara nwebe nsogbu ahụike dịka: Anya ịcha ọbara ọbara, ụfụ anya, mkpụchapụ elu ahụ ha nakwa aka ha.
Ha kwuru na ahụike Abramovich adatughịzị ugbua dịka ya bụ ime mere izu ụka ole m ole gara aga.
Ọ ga-aga n’ihu na-esonye mkparịtaụka udo a maka atụmatụ ịkwụsị agha Russia na-ebuso Ukraine.
‘Atọrọla’ puku kwuru puku ndị mmadụ n’obodo Mariupol – Praịm minista Ukraine, Ndị agha Russia ka na-akpa ike n'Ukraine ọkachasị n'obodo Mariupol
Praịm minista mba Ukraine bụ Inna Sovsun ekwuola na ndị agha Russia ‘atọrọla’ ma jibido ndị mba ha ruru puku nari iri abụọ bụ ndị bi n’obodo Mariupol.
Mariupol so n’obodo mba Russia kacha awakpo n’agha ha na-ebuso mba Ukraine maka na ọ nọ n’ikpere mmiri dị mkpa na mpaghara ahụ.
Agbanyeghị na ụfọdụ ndị mmadụ agbapụla ebe ahụ, ndị ọchịchị mba ahụ ekwuola na ndị agha mba Russia jibidoro ihe ruru mmadụ 160,00 dịka ha enweghị ike ịgbapụ n’ihi na ndị agha Russia gbara ebe ahụ ogige.
Sovsun kwuru na Mariupol nọ n’ọnọdọ “dị egwu” ugbua ma kwukwa na ndị agha Russia ebanyewala mpaghara Donbas.
Mwakpo Russia na-eme na Ukraine eriela mba ahụ ọtụtụ ego karị ijeri dọla narị ise, Otu onye nọ n'ọchịchị mba Ukraine ezipụtala ozi ọ sị bụ ngụkọ ihe agha na-ada ebe ahụ na-erị ha ugbua
Agha Russia na-ebuso Ukraine eriela Ukraine ego ruru ijeri dọla narị ise, iri isii na anọ na ụma ($564.9bn). Ego ndị a bụ ngụkọ ego ụlọ, ụlọọrụ dị ịcheịche, ihe e ji ebi ndụ n’obodo nakwa nkwụsị azụmahịa na mba Ukraine.
Agha a emebiela okporoụzọ ogologo ya ruru kilomịta puku asatọ (8,000 km) nakwa ọtụtụ ụlọ.
Osote Praịm minista mba Ukraine bụ Yulia Svyrydenko kwuru ihe ndị a na social midia ya.
Agbanyeghi na mba Russia na-ekwu na mwakpo ha bụ nke pụrụiche nye ndị agha mba ndị ofesi dị ịcheịche akatọọla Russia ma kwuo na okwu ha abụghị eziokwu.
A na-achọ ụzọ aga esi gbapụta ndị bi n'obodo Mariupol dị n'Ukraine, Ndị agha mba Russia agbaala Mariupol ogige ma na-awakposi obodo ahụ ike
Onyeisi obodo Mariupol bụ Vadym Boichenkona-arịọ na ndị bi ebe ahụ chọọ ụzọ gbapụ ngwa ngwa.
Ndị bi ebe ahụ nọ n’ọnọdọ ọjọọ pụrụiche dịka ha enweghịzị ọkụ latrịk, ha enweghị mmiri, ụkọ nrị na-arị ibe ya elu nakwa ihe ndị ọzọ e ji ebe ndụ.
Boichenko ekwuola na ụgbọala bọsụ 26 apụtala ibupụ ndị bi ebe ahụ mana ndị agha mba Russia enwebeghị ha gafee.
E kwuru na ndị agha mba Russia agbala obodo ahụ ogige.
Ihe ruru mmadụ 160,000 ka tọrọ n’ime obodo a ugbua.
Ka ihe dị ebe ahụ, ndị ọrụ gbata gbata nke International Committee of the Red Cross (ICRC) kwuru n’oge gara aga na ihe enwebeghị ike banye obodo ahụ bugara ha akụrụngwa enyemaka, nrị, ọgwụ nakwa ihe ndị ọzọ dị gọọmentị mba Ukraine na mba Russia enwebeghị nkwekọrịta maka inye ha ohere igafee n’ụzọ dị mfe.
Russia agọla na ha anaghị emegbu ndị nkiti mana na ọ dị n’aka mba Ukraine ikwe ka ha nwee nkwekọrịta maka ihibe usoro mbata na ọpụpụ obodo ahụ nke dị mfe.
Mariupol bụ obodo n’ikpere mmiri mba Ukraine so n’ebe mwakpo Russia na-eme n’Ukraine kacha kpụrụ ọkụ n’ọnụ.
Obodo dị mkpa n’agha a dịka ọ nọ n’ihu mmiri ma bụrụkwa ebe mbata na ọpụpụ mba Ukraine.
Ka chi foo
Ka ọ dị echi ndị be anyị...Rahụ nụ duu
Yukren adịla njikere ịkpa maka ị nọọrọ onwe ha
Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky ekwuola na otu n'ime ihe ha kwadoro ime maka ịweta udo n'etiti ha na mba Rọshịa nwereike ịgụnye ị nọorọ onwe ha nke pụtara na ha abụghị anụ elu maọbụ anụ ala.
Zelensky kwuru nkea na mkparịta ụka ya na ụlo ntaakụkọ nọọrọ onwe nke mba Rọshịa nwere.
Ị bọọla chi?
Ka ụbọchị taa maara gị mma.
Ka chi foo nụ
Ka ọ dị echi, chetakwa soro anyị...Ndewo
Ụmụaka nọ n'obodo Mariupol enweghị nri oriri - Osote onyeọchichị Mariupol
Sergey Orlov bụ osote onye ọchịchị obodo Mauriopol ekwuola na agụrụ na enweghị mmiri ọṅụṅụ ebidola igbu ndị mmadụ.
O kwuru sị, " ụfọdụ na-anwụ maka enweghị nrị maọbụ ọgwụ...ọtụtụ ndị nne enweghị nrị ha ga-enye ụmụ ha, kedụ ihe ndịa ga-eme ụmụ ha? amaghị m".
Mariupol nọ na mwakpo n'aka ndị mba Rọshịa kamgbe Rọshịa wakporo mba Yukren.Emebiela ọtụtụ ụlọ ebe Orlov na-ekwu na agbariela 70% ụlọọgwụ ha nwere.
Ọkaiwu gọọmentị mba Ukraine na-enwe na ụmụaka 136 anwụọla na mwakpo Russia na-eme mba ha, O kwukwara na ụmụaka karịrị 190 emerụọla ahụ n'agha a
Ọkaiwu gọọmentị mba Ukraine bụ Iryna Venediktova ekwuola na mwakpo Russia na-eme na mba ha ataala isi ụmụaka otu narị, iri atọ na isii O kwukwara na ihe ruru ụmụaka otu nari, iri itolu na itolu emerụọla ahụ n’agha a, ebe BBC ka na-agba mbọ inyocha ọnụ ọgụgụ ndị a ima ma ha eziri ezi