Ukraine war: Ndị nkịtị tọburu n' ụlọọrụ igwe Azovstal apụtachaala, apụchaala
A zọpụtala ndị nkịtị nile gụnyere ndị okenye, ụmụnwaanyị na ụmụaka tọburu n' ụlọọrụ mmepụta igwe bụ Azovstal nke dị na Mariupol, Yukren dịka mba ahụ na Rọshịa si maa n'ọkwa.
Mgbapụta ahụ bụ otu United Nation na Red Cross haziri ya mana ha ewepụtabeghị ozi nke ha banyere ya.
Ndị agha Yukren ka kwechiri na ebe ahụ , ha ekweghị enye ohere ka ndị Rọshịa weghara ya.
Rọshịa wakporo ụlọọrụ ahụ kemgbe izuụka ole na ole gara aga, na-achọ ka ndị agha Yukren chiliere ha aka elu.
A mabeghị ebe a kpọgara ndị azọpụtara mana osote onye Praiminista mba Yukren bụ Iryna Vereshchuk kwuru na e mechala ọrụ ịzọpụta ndị mmadụ .
N'oge gara aga, ọ na-ewe abalị ole na ole tupu ndị a gbapụtara erute ebe ndị agha Yukren ji.
Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky sịrị na ihe karịrị ndị nkịtị dị 300 ka a zọpụtara n'ụlọọrụ mmepụta igwe ahụ mana Mịnịstrị nchekwa mba Rọshịa kwuru na ọ bụ mmadụ 51 ka a kpọpụtara n'abalị atọ.
Zelensky kwuru na a na-agba mbọ ịkpọpụta ndịagha na Mariupol.