Ka chi foo nụ
Rahụ nụ duu, ka ọ dị echi
You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Boris Johnson ekwuola na ọ bụ ime odogwu nwoke enweghị isi mere Vladimir Putin ji wakpoo Ukraine.
Rahụ nụ duu, ka ọ dị echi
Ndị ọrụ gbatagbata na-arụsị ọrụ ike ịzọpụta ndị mmadụ dịka ogbunigwe dara n'ogige ndị agha mba Yukren nke dị na ọdịda obodo Mykolaiv.
Ndị ọrụ a na-ekwu na ha adọpụtala opekete mpe ozu mmadụ iri ise ma na-ekwu na ha amaghị mmadụ ole ka tọrọ n'ime aja ụlọ dara ada.
Otu onye ọrụ gbata gbata aha ya bụ Maxim gwara ndị ntaakụkọ AFP na opekete mpe ndị agha mmadụ narị abụọ na-ehi ụra na ya bụ ogige mgbe ogbunigwe dara.
Obodo Mykolai dịịrị ndị agha mba Rụshịa oke mkpa dịka ha sị mpaghara ọdịda anyanwụ awakpo mba Yukren dịka ndị agha mba Yukren na-egbochi ndị nke Rụshịa ị ga n'ihu.
Volodomyr Zelensky bụ onyeisiala mba Ukraine akpọọla oku ka ha na Russia kpaa maka udo na nchekwa "na-egbughi oge".
O kwuru na ọ bụ naanị ohere Russia nwere iji belata ihe ndị ha mebiri site na "mmehie" ha mere mgbe ha wakporo Ukraine.
Gordon Brown bụbu praịm minister mba Briten akpọọla oku ka a kpụpụ onyeisiala Vladimir Putin nke mba Russia n’ụlọikpe mbaụwa ma kpee ya ikpe maka mwakpo ọ wakporo Ukraine.
Brown esonyela na ndị agụmakwụkwọ, ndị ọkaiwu na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị 140 binyere aka n’akwụkwọ, na-akpọ oku ka e jiri usoro Nuremberg e ji kpee ndị mpụ agha Nazi nke Agha Mbaụwa nke Abụọ, kpee Putin ikpe.
Ụlọikpe Mbaụwa bụ International Criminal Court (ICC) amalitela nnyocha Putin maka ebubo mpụ agha a na-ebo ya, mana ụfọdụ na-ekwu na ike ICC nwere apụchaghị ime ihe niile.
Chi taa ga-efotere gị naanị ihe ọma. Iseee!
Nọnyere anyị ebe a dịka anyị na-ewetara gị akụkọ gbasara agha na-eme na Ukraine.
Onye nnọchiteanya mba Amerịka n'otu United Nations, ekwuola na mba ndị nọ n'Afrịka ekwesịghị ịbụ ụsụ (na-abụghị anụ elu maọbụ anụ ala) n'ihe gbasara agha Ukraine.
Linda Thomas-Greenfield gwara BBC na ntuliaka nke General Assembly (mba niile dị n'ụwa) e mere n'izu abụọ gara aga maka ihe gbasara ịkatọ mwakpo Russia wakporo Ukraine, mba 17 dị n'Afrịka mere ka ụsụ ?(ha ekweghi akwado maọbụ katọọ), ebe asatọ ọzọ ekweghi atụ vootu maọlị.
Thomas-Greenfield kwuru na e nweghi ihe dịka ịbụ ụsụ, na ọgbaghara a abụghị naanị maka agha alụghị alụ dị n'etiti mba ndị West na Russia.
O kwukwara Amerịka ga-akwado Saụt Afrịka n'atụmatụ ha ikpe udo n'etiti Russia na Ukraine.
Turkey ekwuputela ihe ndị Russia kwuru na ọ ga-ewe ha iji kwụsị mwakpo ha na-awakpo mba Ukraine.
N'ehihie Tọzde ka onyeisiala mba Russia bụ Vladimir Putin kpọrọ Onyeisiala mba Turkey Tayyip Erdogan n'ekwentị, ebe ọ gwara ya ihe ndị Russia chọrọ kpọmkwem maka ikpe udo n'etiti ha na Ukraine.
Gịnị ka Russia chọrọ?
Russia chọrọ ihe dị agba abụọ. Agba nke mbụ gụnyere
Agba nke abụọ gụnyere:
Putin chọrọ ka ya na Zelensky zute n'ihu na ihu mee nzukọ ikpe udo tupu ha ekpebie ndị nke a, Zelensky ekwetekwala ime nke a.
Ihe ndị Putin chọrọ n'agba nke a metụtara ihe gbasara Donbas dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ Ukraqine, nke ụfọdụ n'ime ha kewapụrụla na Ukraine ma na-ekwu na ha bụ ndị Russia, nakwa ihe gbasara ebe Crimea kwụ.
Ka ụbọchị Eke a ketere anyị ihe ọma, iseeee!
Nọnyere anyị taa dịka anyị na-ewetara gị akụkọ ndị ị kwesịrị ịma gbasara ihe na-eme na Ukraine.
Ụbọchị taa ga-awara anyị ọjị o. Iseeee!
Obi mapụrụ nwokorobịa gbara afọ iri abụọ na asaa (17) bụ Ottah Abraham ụbọchị ahụ ndị Russia malitere ịwakpọ Ukraine.
O ji ekwent ya dee, "a chọrọ m iso gaa agha".
Ya bụ nwaamadị bi n'otu nkwenkwe ọnụụlọ ihe ruru kilomite puku asatọ n'ụma na-ebe agha ahụ dị,
Nwaamadị a gụrụ Philosophy na mahadum so n'ụmụ Afrịca sị mba dị iche iche dịka Nigeria, Kenya, Senegal, South Africa na Algeria sị na ha chọrọ pụta soro buso Russia agha n'Ukraine maka oke agụ na enweghị olileanya dị n'ụlọ.
Ọ gwara BBC na, "ama m na ọ bụ agha. A makwa na agha abụghị egwụ ụmụazị. Mana ọ ka mma ịnọ n'ihu agha Ukraine karịa ịbi na Naịjrịa".
" Ha nwereike ịhapụ m ka m biri be ha mgbe agha biri, a ga-ama m ka onye soro buso ndị ilo ha agha".
Ihe ruru mmadị nde atụọ na ụma bụ ndị mba ọzọ edenyelarị aha maka iso Ukraine buso Russia agha kemgbe Volodymyr Zelensky rịọchara ndị mbaụwa ka ha bịa soro nyere ha aka na ya bụ agha.
Gọọmentị Ukriane emeela ya ka ọ dị mfe ịbata mba ahụ maka ndị nweburu ọzụzụ ịlụ agha ma nyekwa egoole aga-akwụ ndị dị otu chọrọ iso buso Russia agha, mana ha ekwubekwaghị ka a ga-anabata ndị ahụ na be ha mgbe agha a biri.
Kereti Usoroh sị na uche ya adịghị n'ego a ga-akwụ ya maọbụ ibụ onye mba ahụ mgbe agha bere.
Ọ sị, "A nọ m mma ebe a ugbua. Ọ bụrụ na m chọrọ ị Eruope, ọ bụ maka akwụkwọ, ọ bụghị maka agha".
" Nke a bụ maka itigbu onye ji ike ya arụgbụ ndị ọ kariri, onye mmegbu. Ị mejọ otu onye bụ ịmejọ ọha".
Arịrịọ onyeisiala Ukraine bụ Zalensky rịrịọ meturu ọtụtụ mmadụ n'obi mere ha jiri ju na Embasi ha n'Abuja ịnata akwụkwọ ikeke e ji eje mba ahụ.
Ukraine rachara asọmmiri ha maka ndị chọrọ ịlụ agha
Mba Ukraine lechere anya ihe ndị isi mba Afrịka siri jụ na ndị nke ha agaghị eso bịa lụọ agha, sizia mba na ha agahị enyezí ụmụ Afrịka ohere ịbịa sonnye na ya bụ agha.
"Naịjirịa anaghị akwado ndị mmadụ ịlụrụ ndị ọzọ agha".
Bohdan Soltys, bụ onye nnọchite anya mba Ukraine na sị na mba ahụ agaghị akwụ onye ọbụla chọrọ ịga agha ebe ahụ ụkwọ, na ihe onye ọbụla gatara bụ n'isi ya.
A nwụchịelama kpụpụ ụlọikpe, onye ntaakụkọ mere ngagharịiwe n’ihe onyonyo TV mba Russia ogeụlọntaakụkọ mba Russiana-agbasa akụkọ ụwa n’ụbọchị Mọnde.
Marina Ovsyannikovawụbatara n'azụ onye ntaakụkọ na-enye akụkọ buru akwụkwọ e dere 'Kwụsị agha n'Ukraine' , ozimgbasaozi Russia na-ezi maka agha ha na-ebuso Ukraine bụ akụkọ ụgha.'
Site n'ozi o zipụtara n'akara Twitter ya, a hụrụ ebe ọ nọ n'ụlọikpe mba ahụ dịka e kwuru n'ikpe nọ ya n'isi bụ na ọ dara bụ iwu ime mmeme ọ nataghị ikike ya mee.
Na mbụ, anyị gwara unu na e nwere ihe jikọrọ Chelsea na ndị ji ego dịka Roman Abramovich mana ọ wuchịrị na Moscow, dịka Reuters.
Reuters kọwakwara na o mere njem ya site ọdọụgbọelu Ben Gurion n'Izrel - e nwekwara foto ya a hụrụ ebe ahụ.
Amachịrị Abramovich na mba UK n'izu nke gara aga maka etu o si wee mara onyeisiala Rọshịa bụ Vladimir Putin, ndị otu mba Yurope bụ EU esorokọla. Mana ọ sị na enweghị ihe jikọrọ ya na Putin.
Taa emeela ya ụbọchị nke 20 Russia wakporo Ukraine.
Lee ebe ihe kwụ ugbua a n'etiti mba abụọ a:
Otu onye mba Amerịka so na ndị kacha bụrụ ọgaranya na mba ụwa bụ Elon Musk amaala Onyeisiala mba Russia bụ Vladimir Putin aka ka ọ pụta n’ọha ka ha lụsa ya ọgụ.
Musk onye na-akwado ma onye zigarala mba Ukraine ihe enyemaka ugboro ugboro n'oge mwakpo a na-eme na mba ha kwuru nke a site n'akara Twitter.
Agbanyeghi na Putin asabeghi okwu a Musk kwuru, ndị mmadụ na-eche na mpụtara ọgụ ahụ ga-ekpebi ma agha Russia na Ukraine a ga-aga n’ihu.
Ndị agah Rọshịa agbariela ọdọ ngwa aga n'ụlọọrụ na-emepụta ọkụ latịk
Akụkọ si n'igwe Telegram egosila na ndị agha Rọshịa agbariela ọdọ ngwa aga n'ụlọọrụ naenye ọkụ latịk dị na Zaporizhzhya.
Ozi ọzọ si na ụlọọrụ nuklịa na Yukren dị n'Energoatom, sị na amatabeghi ihe ọkụ a mebiri ugbua.
Ụbọchị Maachị 4 ka Rọshịa jirila ogbunigwe were ụlọ ọrụ nuklịa ndị Yukren.
Ụlọọrụ a dị na 550km ndịda isiobodo Kyiv, n'akụkụ mmiri Dnieper, na-ebipụta ọkụ latrịk ruru pasenti 20% ọkụ ndị Yukren.
Kedụ ihe merela n'okwu a n'ụtụtụ Mọnde a?