Ndị Rọshịa agaghịzị enweta Facebook n'uju ya
Rọshịa ekwuola na ndị be ha agaghịzị etinye Facebook n'ọrụ n'uju na be ha maka otu o sị akpachi ọrụ mgbasaozi na be ha.
Ndị ọrụ nchekwa ndị mgbasaozi na Rọshịa bụ Roskomnadzor sị na Facebook ajụla iweli mmachị ha machiri ụlọọrụ ntaakụkọ ndị be ha bụ RIA news agency, defence ministry's Zvezda TV, na akara nwaududo gazeta.ru na lenta.ru.
Nick Clegg bụ osote onyeisi ndị ọrụ Meta nwe Facebook sị na ha agaghị akwụsị inyocha ụlọọrụ mgbasaozi anọ ahụ.
Ọ bụghị taa ka Mosco malitere ikechi ọnụ ụlọọrụ mgbasaozi.
O dobeghị anya ihe mkpachịa Rọshịa kpachiri Facebook ga-apụta.
Ha emebuola ka Twitter na-akpu akpu.