You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ọ bụrụ na Putin bụ nwaanyị, ọ karịghị awakpo Ukraine - Boris Johnson

Boris Johnson ekwuola na ọ bụ ime odogwu nwoke enweghị isi mere Vladimir Putin ji wakpoo Ukraine.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Russia si na ọkụ mebiri nnukwu ụgbọmmiri agha ha

    Mịnịtri na-ahụ maka nchekwa na mba Rọshịa ekwupụtala na ọkụ gbakapụtara oke ụgbọmmiri ọgụ a kpọrọ Moskva mebie ya ebe ọ dị ụkwu. na osimiri 'Black Sea'.

    Ha ekwughị ihe butere ọkụ ọgb ụgba ahụ.

    Mana mba Ukraine na-ekwu na ọ bụ ogbunigwe ha kpọrọ 'Nrptune' ha gbara ụgbọmmiri agha ahụ mebiri ya

  2. Ndewoonu!

    Ígbo bụ Igbo, ụnụ asaala chi?

    ụbọchị taa maara anyị mma!

  3. Aga m na-awakpo Ukraine na-aga n'ihu - Putin

    Onyeisiala mba Russia bụ Vladimir Putin aṅụọla iyi na ọ ga na-awakpo mba Ukraine ma ọ bụrụ na ha emeghi ihe mba chọrọ.

    Na mpụta ihe Putin pụtara na nso nso a, ọ sị na mkparịtaụka udo ha mba Ukraine na-eme etiela aka na tipa bu aja, ma sị na mwakpo ha na-aga dịka o kwesịrị.

    Mana onye ọrụ gọọmentị Ukraine gwara ndị ntaakụkọ Reuters na mkparịtaụka ka na-aga n'ihu.

    Okwu Putin a bụ nke mbụ ọ na-ekwu kamgbe ihe karịrị otu izuụka.

    Putin mụtaziri ịmakpuru na-apụtachaghị ezi na nso nso na-abụghị etu ọ dị na mbụ mgbe agha malitere.

    Putin sị na o nweghi ihe ọzọ ọ ga-emenwu maọbụ ịwakpo mba Ukraine, iji chekwaa ndị na-asụ asụsụ Russia bi n'Ọwụwa Anyanwụ Ukraine.

    Mba Russia na-ebo Ukraine ebubo igbu ọchụ megide ndị na-asụ asụsụ Russia bi n'Ọwụwa Anyanwụ Ukraine.

  4. A chụpụla ụmụaka ruru nde anọ n'ụlọ ha na Ukraine - United Nation

    Otu United Nations sị na ụmụaka ruru nde anọ agbaala ọsọ ndụ si n'ụlọ dị na mba Ukraine kamgbe izuụka isii mba Russia wakporo ha.

    Ha sị na ọnụọgụgụ ụmụaka nwụrụla n'agha ahụ eruola otu narị na iri anọ na abụọ, mana ha sị na o nwere ike ịkarị.

    Onye dịrektọ ngalaba UNICEF bụ Manuel Fontaine ka si mba Ukraine lọta sị na ụmụaka ruru 4.8million ka a chụpụrụla n'ụlọ ha nwa obere oge a.

    Ọ sị na ọnọdụ a ka njọ n'obodo Mariupol na Kherson, ebe mmiri ọṅụṅụ na-adịghị, gburu gburu ya adịghị ọcha nakwa ebe nri na-adịghị.

    Ebe onye nnọchiteanya Ukraine na United Nation bụ Sergiy Kyslytsya, sị na Russia kpọọrọ ụmụaka karịrị 121,000 site na Ukraine ma na-achọ ịde akwụkwọ iji kọrọ ha.

    Mana Fontaine sị na o nweghi ihe akaebe gosiri ebubo ndị a mana UNICEF ga-eleba ya anya.

  5. Njem ndịisi okpukperechi ga-eme na Ukraine

    Ndịisi otu okpukperechi dị iche iche ga-aga mba Ukraine na Tuzde iji dọnyere ndị mwakpo mba Russia metụtara ukwu.

    Ndị a gụnyere ndị Monk, ndị Rabbi, ndị Imam, ndị Buddhist, ndị Hindu nakwa onye bụbu ArchBishọp nke Canterbury bụ Rowan Williams.

    A na-atụ anya na ha ga-ezute ndị gbara ọsọ ndụ si na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ukraine gawa Ndịda Anyanwụ n'obodo Chernivtsi.

    Roman William gwara BBC Radio Four nke a na mkparịtaụka ha nwere n'izuụka gara aga ma sị na 'enwere mkpesi siri ike' sị ka a chụpụ ụlọụka ndị dị na Russia site n'otu ụlọụka ndị ọzọ dị n'uwa maka akatọghị ogbugbu a na-egbu ndị aka ha dị ọcha.

    Pope Francis nke katọlik kwadoro njem nleta ahụ ma sị na nke a bụghị oge ịkpa nkịtị, kama ọ bụ iji ikike kwuo okwu sị ka a kwụsị "ọchụ a a na-egbu".

  6. Ka e were oge emume Easter a kpee udo n'etiti Russia na Ukraine - Pope Francis

    Onyeisi ụka Katọlik n'ụwa bụ Pope Francis arịọla ka e were ohere emume Easter mee udo n'etiti Russia na Ukraine.

    O kwuru nke na St. Peter's Square dị na Rome oge a na-eme ofufe 'Palm Sunday' nke ndị ụka na-eme iji gosi njem mmeri Jesus Kraịst mere na Jerusalem tupu a kpọgbuo ya n'obe.

    Cheta na mba Russia na Ukraine nọ n'agha nke malitere kamgbe ụbọchị iri abụọ na anọ nke ọnwa Febụwarị, afọ 2022.

  7. Praịm minista mba Briten ezutela Onyeisiala mba Ukraine

    Mba Briten ekwela nkwa iziga ụgbọala agha a kpọrọ 'armoured vehicle' ruru 120 nakwa ngwaọgụ na-egbochi ogbunigwe na mba Ukraine iji nyere ha aka n'ọgụ ha na mba Russia.

    Praịm minista ha bụ Boris Johnson kwuru nke ahụ mgbe ọ gara Kyiv bụ isiobodo Ukraine izute onyeisiala ha bụ Volodymyr Zelensky.

    Ọtụ onye na-ekwuru ya sị na nke a bụ iji dọnyere Ukraine ukwu n'agha ahụ.

    Njem a na-abịa dịka Johnson kwere nkwa iji ego dị otu nde naarị paund (£100) mkwadoo Ukraine na ngwa agha ka ogbunigwe gbachara n'ogige ndị gbara ọsọ ndụ.

  8. Russia ahọgharịala onyeisi agha ha

    Mba Russia ahọgharịala ndị isi agha ha na-ahazi ihe na-eme n'ọgbọ ọgụ.

    Ha tinyere Gen Alexander Dvornikov ka ọ bụrụ onyeisi agha ha na Ukraine.

    Dịka otu onye welitere isi n'ọrụ na mba ndị mepere emepe achọghị ka a kpọ aha ya siri gwa BBC, ihe gbasara ịlụ agha na Syria doro Dvornikov bụ onye na-achịkọtabu ndịagha Russia mpaghara nke Adịda Anyanwụ Russia,

    Ọ kọwara na nke a bụ iji chịkọta otu ndị agha Russia nile bụ ndị na-emebu onye na nke ya, onye na nke ya n'agha Ukraine.

    Kemgbe Russia malitere agha ha megide Ukraine abali 44 gara aga, ha enwenwughị ike iweghara obodo Kyiv tupu ha tinye anya n'obodo Dobas.

  9. Russia sị na agha Ukraine apụọla ha ihe

    Dịka ọgụ Russia na-alụ na Ukraine banyere abalị, 44, ọnụ na-ekwuru gọọmentị mba ahụ bụ Dmitry Peskov kwuru na ọọ taala isi ọtụtụ ndị agha ha.

    Pesvkov gwara ụlọntaakụkọ 'Sky News' na ọ bụ “nnukwu ihe mwute nye ha”.

    O na-ele anya na ebumnaobi Russia ibu agha ahụ ga-emezu n’abalị ole na ole na-abịa.

    Okwu Peskov na-abịa ka otu United Nations Human Right Council mapụrụ mba ahụ n’otu ahụ ụbọchị Wenezde.

    Mba 63 n’ime 193 tụrụ vootu ka a taa Russia ahụhụ ahụ n’ihi ebubo imegide ikike dịịrị onye nke e boro ndị agha Russia na Ukraine.

    Peskov gọọrọ na ọ bụghị eziokwu na ndị agha ha na-emeka ndị nkịtị ahụ na Ukraine.

  10. Canada ga-akpọ onye nnọchita anya Russia oku gbasara ndị e gburu na Busha, Ukraine

    Mịnịsta na-ahụ maka mba ofesi na Canada bụ Mélanie Joly sị na ha ga-akpọ onye nnọchite anya Russia na Canada ka ọ bịa zara ọnụ ha gbasara ozu ndị mmadụ a hụrụ na Bucha, akụkọ Kyiv bụ otu n'ime ebe ndị Russia gbachiri n;ike.

    Obi adịghị ndị ụbaụwa mma gbasara ya bụ ogbugbu ndị mmadụ mere ebe ahụ.

    Joly kwuru na'ọgbakọ ndị mịnịsta ha mere na Brussels mgbe ha na-eleba anya na ụdịrị mkpachị ha ga-enye Russia " arụ mere na Bucha".

    Ọ sị na ya agwala osote ya ka ọ gbaa mbọ hụ na onye nnọchita anay Russia na Canada bụ Oleg V Stepanov hụrụ foto si Bucha na Irpin pụta.

    Na mbido, ụzọ ụka a, Canada kpachiri mmadị itoolu ndị Russia na ndị Belarus maka ịwakpo Ukriane.

  11. Russia akatọọlaa amụma ịwepụ ha n'otu UN Human Rights Council

    Russia akatọọla amụma a chọrọ iji chụpụ ha n'otu UN Human Rights Council nke a chọrọ ịme taa bụ Tọzde maka ebubo ịgbu ọchụ n'obodo ndị ha kpachiri n'Ukraine, dịka Bucha.

    Onye nnọchita anya ndị Russia na UN bụ Gennady Gatilov sị na ha ga-ahụ ndị ọbụla aka ha dị na ya bụ amụma ka ndị iro.

    Ọ bụ mba Amerịka tụtara ya bụ alọ kemgbe ihe onyonyo na-egosị ndị mmadụ a sị na Russia gburu n'ebe ndị ha kpachịrị n'Ukraine.

    Ihe a chọrọ iji wepụ Russia na ya bụ otu bụ mba ikpo abụọ n'ime atọ, n'ime mba dị iri anọ na asaa (47) sọ na ya bụ otu.

    Gatilov sị na ọbụrụ na ahapụ mba Nato ka ha chụpụ ha n'otu ahụ na ọ ga-eme ka ha chakpo mba ndị ọzọ anya n'ihe gbasara ikike dịịrọ onye n'ụwa niile.

  12. Ọtụtụ ndị mmadụ agbapụwala ọsọ ndụ na Donbas dị na Ukraine

    Ọtụtụ ndị mmadụ agbapụwala ọsọ ndụ na Donbas dị na Ukraine dịka gọọmentị mba ahụ gbaara aha ama na Russia chọrọ iweghara Donbas dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ukraine.

    Dika agha ahụ bara abalị 41, Ndị agha Uktaine kwuru na ndị ogbo ha ndị Russia na-agbalị ịkwatu nchekwa niile dị na mpaghara DoneskHa kwuru na ha chọkwara iwere Mariupol kpamkpam.

    Nke a na-abịa dịka mba Amerịka gbara ama na ndịagha Russia apụọla na Kyiv.

  13. Unu asaala chi ee! Ndụ nwoke, ndụ nwaanyị. Taa bụ Eke. Eke biko ketere anyị ihe ọma oo!

  14. Foto Satilịt na-ekwu na ndị Rọshịa gburu ọchụ na Yukren

    Onyeisi obodo Bucha dị na mba Yukren bụ Anatoly Fedoruk gwara BBC na ndị agha Rọshịa gburu ndị nkịtị narị atọ na iri abụọ mgbe batara n’obodo ahụ.

    O kwuru sị, “ahụrụ m ụgbọala ndị nkịtị na-agba ọsọ ndụ nke ndị agha Rọshịa gbagburu ndị niile nọ n’ime ya”.

    Kama ndị nnọchite anya mba Rọshịa na-ekwu na ọbụghị eziokwu na ndị agha ha gburu ọchụ na obodo Bucha dị na mba Yukren.

    N'aka nke ọzọ ka ihe onyonyo igwe Satilịt nke ụlọọrụ Maxar dị n'Amerịka nke BBC nyochara na-egosi ozu ndị mmadụ nọ n'ụzọ n'obodo Bucha n'ụbọchị iri na itolu nke ọnwa Maachị.

  15. Unu abọọla chi

    Daalụ dịka unu sonyere anyị taa maka akụkọ dị mkpa maka agha Yukren

  16. Foto si n'agha mba Yukren

    Lee ụfọdụ foto na-egosi ihe na-eme na mba Yukren dịka agha bidoro maka mwakpo mba Rọshịa.

  17. Egbuola ma taa ihe karịrị ndị nkịtị 300 ahụhụ n'obodo Bucha - Volodymyr Zelensky

    Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky ekwuola na ndị agha mba Rọshịa egbuola ma taa ihe karịrị ndị nkịtị 300 ahụhụ n'obodo Bucha.

    BBC enweghị ike ịchọpụta ma nkea ọ bụ eziokwu.

    Zelensky kwuru na ọnụ ọgụgụ a ga-arịgọ dịka ha ka na-eme nyocha ha.

    Ọ sị, " Anyị na-enweta ozi na ọnụ ọgụgụ ndị arụ a metụtara ga akarị n'obodo Borodyanka na obodo ndị ọzọ anapụrụ ndị agha Rọshịa".

    O kwuru na ihe ndị obodo achụpụrụla ndị agha Rọshịa dịka Chernihiv, Sumy na ụfọdsụ mpaghara Kyiv karịrị ihe ha hụrụ n'aka ndị Nazi afọ 80 gara aga.

  18. Unu asaala chi e! Ndụ nwoke ndụ nwaanyị taa bụ Afọ.

    Soro anyị maka akụko niile gbasara agha Yukren etu ọ ga-amasị gị. Ya gaziere gị

  19. Nke a bụ nchịkọta okwu gbasara agha Russia nke Mọnde, Orie

    A kpọrọ okwu onyeisiala Ukraine bụ Volodymyr Zelensky n'ọgbakọ Grammy Award nke iri ise na anọ (64th) e mere na Las Vergas.

    Ọ sị na " ndị egwu mba anyị na-iyị afe igwe e ji eze mgbo karịa iyi akụrotu eji aga ọgbakọ oriri Bekee kpọrọ "tuxedos"..

    Ha na-aga ụlọọgwụ agụrụ ndị ahụ esichaghị ike egwu, ma ndị anaghị anụ ihe ha na-agụ. Mana egwu ha na-agụ na-aba ndị ahụ ime".

    Ọ gwara ndị bịara emume ahụ na ndi be ha na-alụ agha ichekwa ndụ ha, ọgụ ịhụnanya, nakwa iti mkpu itgara a na-eti, mana ogbunigwe ndị Russia na-enweta egwu n'ogbe".

    Ọ gwara ha sị, Kwadonụ anyị n'ụzọ ọbụla, mana agbala nkiti. Mee ka egwu unu jụpụta ebe niile".

    • Onyeisiala mba Ukraine bụ Volodymyr Zelensky akatọọla mba Russia na-ebo ha ebubo ịkpochapụ agbụrụ ha.
    • Ọ sị na ndị Ukraina achọghị ka Russia kpagbuo ha maọbụ kpachie ha.
    • Ndị agha Ukraine sị na ha enyopuola na Russia achọwala ịji nzuzo kpọbata ndị agha ha dopuru iche dịka ha kwuburu na ha agaghị eme otu ahụ.
    • Mnistry ndị agha nke mba Ukriane egwuola na ndị agha Russia ji aghụghọ akwado maka ịwakpo obodo ọzọ dị n'akụkụ Donbas.
    • Ha na-ekwu na ndị agha Russia amalitela ịga mpaghara ahụ, mana BBC enweghị achọpụtabeghị ma nke a ọ b eziokwu.
  20. Onyeisiala ọhụrụ mba Hungary akatọla Zelensky kpọo ya onye nnupuisi

    Prime Minister mba Hungary emeriela ntuliaka ịchị mba ahụ nke ugboro anọ ya.

    Viktor Orban katọrọ Onyeisiala mba Ukraine bụ Volodymyr Zelensky na ndị ọnụ na-eru n'okwụ na Brussle kpọọ ha ndị "nnupuisi".

    Agbanyeghị, Hungary na anabata ọtụtụ ndị Ukraine gbara ọsọ ndụ be ha maka na ha na Ukraine nwere okeala.

    Orban sị na ya achọghị itinye aka n'ọgụ ndị Russia na Ukraine, ya mere ha jiri jụ ịnye Ukraine ngwaagha maka ha nabatara ndị na-agba ọsọ ndụ.

    Ọ bụghị taa ka Zelensky katọwara Orban na usoro ọchịchị ya.