You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ọ bụrụ na Putin bụ nwaanyị, ọ karịghị awakpo Ukraine - Boris Johnson

Boris Johnson ekwuola na ọ bụ ime odogwu nwoke enweghị isi mere Vladimir Putin ji wakpoo Ukraine.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ndị nwụrụ na mwakpo ọgbọ ndị agha dị na Lviv eruola 35

    Ihe ruru mmadụ 35 anwụọla ebe mmadụ 134 merụrụ ahụ na mwakpo ndị Russia wakporo ọgbọ ọzụzụ ndị agha dị na mpaghara Lviv.

    Aka na-achị Lviv bụ Maksym Kozytsky kwuru nke a dịka ọ na-ekwu maka ya bụ mwakpo e ji ogbunigwe mee.

  2. Mmadụ itoolu anwụọla ka a wakporo ọgbọ ndị agha - Aka na-achị obodo Lviv

    Mmadụ itoolu anwụọla ebe mmadụ iri ise na asaa (57) merụrụ ahụ na mwakpo ndị Russia wakporo ọgbọ ndị agha dị n’obodo Lviv na mba Ukraine, dịka Maksym Kozytsky bụ aka na-achị obodo ahụ si kwuo.

    Kozytsky kwuru na Russia tụrụ ihe karịrị ogbunigwe iri atọ (30) n’ọgbọ ndị agha ahụ a na-akpọ Yavoriv, ma kwuo na ha na-agba mbọ ịmenyụ ọkụ na-agba ebe ahụ.

    Ka ọ dị ugbua, ọtụtụ ụgbọala gbatagbata na-aga ebe ahụ inyere aka.

  3. Ụgbọelu ebulatala ndị Naịjiria 301 ọzọ

    Ụgbọelu ọzọ bu ndị Naịjiria si Ukraine agba ọsọ ndụ ha efetuola n’Abuja n’abalị Satọde.

    E si Budapest bụ isiobodo mba Hungary kpọlata mmadụ narị atọ na otu (301) ahụ nke ọtụtụ n’ime ha bụ ụmụakwụkwọ na otu nwatakịrị tọrọ n’obodo Sumy dị na mba Ukraine.

    Ụlọorụ na-ahụ maka ndị Naịjiria bi na mba ofesi bụ Nigerians in Diaspora Commission (Nidcom) dere na Twitter mgbe ụgbọelu ahụ tụrụ ụkwụ na Naịjiria.

    Ha kwukwara na gọọmentị Naịjiria ga-enye ndị a ha kpọlatara otu narị dọla ($100) bụ ego moto, puku naịra ise ha ga-eji kpọọ ezinụlọ ha, nakwa ihe ndị ọzọ.

  4. Ihe ị kwesịrị ịma dịka agha Russia na Ukraine banyere ụbọchị 18

    Dịka a banyere ụbọchị 18 kemgbe Russia wakporo Ukraine, ọtụtụ ihe emeela kemgbe ahụ.

    Lee ebe okwu kwụ ugbua:

    • Ihe ruru ndị agha Ukraine 1,300 anwụọla kemgbe agha a bidoro, dịka Volodymyr Zelensky bụ onyeisiala mba Ukraine si kwuo
    • Ndị agha mba Russia ka na-awakpo obodo Mariupol dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ mba Ukraine. Foto otu ụlọọrụ mba Amerịka ji satalaịt sete n'ụbọchị Satọde gosiri na ọtụtụ ụlọ ndị nkịtị dị n'obodo ahụ alaala n'iyi n'ihi ogbunigwe a tụrụ ebe ahụ
    • Ndị isi Ukraine kwuputekwara na ndị agha ha ahapụla obodo Volnovakha, bụ ebe ha sị mebicharala kpam kpam
    • Mana n'obodo Melitopol bụ ebe ndị agha Russia wakporola, ndị obodo ahụ ekweghi ha zuru ike dịka ha mere ngagharịiwe n'ihi ntọrọ ha tọrọla aka na-achị ha Mayor Ivan Fedorov, bụ nke Onyeisiala Zelensky sị bụ "mpụ agha"
    • Ndị isi Ukraine na-ekwu na ndị agha mba Russia kwara mgbọ n'ụgbọala bu ụmụnwaanyị na ụmụaka si otu obodo dị nso isiobodo Kyiv apụta, nke gburu mmadụ asaa n'ime ha. Moscow bụ isiobodo Russia ekwubeghi ihe ọbụla gbasara ebubo a e boro ha
    • Ndị ọrụ nchekwa okeala mba Poland ekwuola na ihe karịrị mmadụ otu nde na puku narị isii (1.6m) esila mba Ukraine gbata ọsọ ndụ na mba ha kemgbe agha a bidoro n'ụbọchị 24 nke ọnwa Febrụwarị 2022
    • Onyeisiala Emmanuel Macron nke mba France ekwuola na Onyeisiala Vladimir Putin nke mba Russia anaghị eme ahụ ka onye chọrọ ịkwụsị agha ha busoro Ukraine. O kwuru nke a na mkparịtaụka ruru nkeji 75 ya na ndịisiala mba Germany na Russia nwere
    • Osote minista mmekọrịta mba na mba nke Russia adọọla ndị Westị aka na ntị na ụgbọala ndị na-ebugara ndị agha mba Ukraine ngwa agha nwereike ịbụ "ihe ndị agha Russia ga-achụrụ gawa".
  5. Ị bọọla chi?

    I meela wee biakwute anyị taa.

    Ndụ mmiri ndụ azụ.

    Ya gaziere gị ụbọchị taa, Iseee!

  6. Ka chi foo nụ

  7. Amerịka etinyela aka n'akwụkwọ iji ego dị nde $200 kwado Ukraine n'agha

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden ejirila ọkpụrụkpụ ego dị nde dọla narị abụọ ($200) kwado Ukraine maka ịgote ngwaagha, dịka White House kwuru.

    Nke wegotara ego niile Amerịka tinyegoro n'agha ihe ruru otu ijeri dọla na ụma abụọ ($1.2b) kemgbe o malitere na 2021.

    Onye kwuru ihe a bụ onye ọrụ na White House.

    Ha ga-eji ego ahụ zụta ngwaagha dị iche iche site n'aka Amerịka, ọzụzụ ndị agha nakwa agụmakwụkwọ ha.

    Ngwaagha ndị a gụnyere ojiisi aghọ mgbo Bekee kpọrọ anti-armour, egbe e ji agbatụ ụgbọelu na ọbere ngwaagha ndị ọzọ.

    Nke a na-abịa mgbe ụlọmeiwu ha tinyechara aka n'akwụkwọ maka ịnye Ukraine ego ruru ijere dọla iri na atọ na ụma isii maka iji gotere ndị mmadụ ihe enyemaka.

    Ukraine etinyela ọtụtụ ngwaagha ndị Europe na US tụkọtaara ha n'ọrụ kemgbe agha a.

  8. Ihe ọhụrụ mịnịsta mba UK kwuru gbasara agha na-ada n'Ukraine

    Mịnịsta ndị agha mba Ukraine edeela ihe ọzọ n'ọba nzikọrịta ozi Twitter ya gbasara ihe ọhụrụ mere n'Ukraine.

    Ọ kwuru na ọ bụ eziokwu na Onyeisiala mba Russia bụ Vladimir Putin ekwetala na ya na-akpọbata ndị woputara onwe ha ịlụrụ ha agha dị 16,000 ndị si Middle East abata.

    Nke na-abaịa dịka ọ pụtaburu ihe na Russia chọrọ ịkpọbata ndị ọrụngo agha ndị si Russia ga-eso lụọrọ ha agha.

    Russia kwetakwara na ha na amanyezi ndị mmadụ amanye ka ha soro lụọ agha a.

    Minista ndị agha Uk ahụ kwuru na ka ịke na-agwụ Russia bụ ka na-achọ ụzọ ndị ọzọ ha ga-eji nyeaka na ya bụ agha.

  9. Putin adịghị njikere íkwụsị agha a - Ndị isiọrụ French

    Mgbe ndị isiala French bụ Emmanuel Macron, onye nke Gernamy bụ Olaf Schulz na onye nke Russia bụ Vladimir Putin nwere mkparịkaụka ekwentị taa, ihe ha chọpụtara bụ na Putin adịghị njikere ịkwụsị agha na-ada n'Ukraine, dịka ụlọọrụ ntaakụkọ Reuters kwuru.

    Ndị isilala mba abụọ ahụ kpọkwara Putin ọzọ na-ekwentị ịgwa ya na ịkwụsị agha a bụ naanị ihe ga-eme ka e gee ya ntị.

    Onyeisiala mba France kpọkwara Putin onye ụgha maka ịkwa ndị ntaakụkọ APF na ọ bụ Ukraine ji ya bụ agha emetọ ndị mmadụ.

    Tupu nke a eme, Macron agwabuola Putin ka ọkwụsị ya bụ agha ọ na-ebuso Ukraine, ọkachasị na Mariupol, ka ọ were nyeaka ịbubatara ndị mmadụ ihe enyemaka.

    Mmiri ọṅụṅụ na ọkụ adịghị na Mariupol kemgbe ụbọchị ole ma ole maka ya bụ agha.

  10. Ihe ị kwesịrị ịma maka ụbọchị 17 nke agha Russia na Ukraine, Nke a bụ nchịkọta ihe ndị merelanụ dịka o mezuru ụbọchị 17 Russia wakporo Ukraine

    • Na mba Amerịka ka Onyeisiala Joe Biden kwuputere mmachi ọhụrụ ndị ha machiri Russia, nke gụnyere mmachi ntụbata mmanya a kpụrụ a chịa ndị mba Russia, anụmanụ si na mmiri ha (Bekee kpọrọ seafood) nakwa dayamọnd.
    • O kwukwara na Amerịka ga-agụnyekwu ụfọdụ aha n'ime ndị akpa ego Russia (Bekee kpọrọ oligarch) a ga-amachi akụnaụba ha.
    • Biden dọkwara aka na ntị na Nato na Russia ịma onwe ha aka n'ihu ga-ebute "Agba Mbaụwa nke atọ". o kwuru nke a dịka ọ na-ekwu na Amerịka agaghị eziga ndị agha ịlụ agha na mba Ukraine.
    • O dere na Twitter sị "Ka m kwuo ya ka o doo anya, Anyị ga-eji ike niile na ịdịnotu nke Nato chekwaa akụkụ niile bụ ebe Nato dị, mana anyị agaghị alụso Russia agha na Ukraine. Nato na Russia ịma onwe ha aka n'ihu ga-ebute Agha Mbaụwa nke atọ."
    • Site na nnyocha na nchọpụta Ministrị Nchekwa nke mba UK mere, Russia ejirila mịsaịli ikuku wakpoo obodo Lutsk na Ivano-Frankivsk dị na mpaghara Ndịda Anyanwụ Ukraine, n'ime awa 24 gara aga.
    • A sị na otu ihe onyonyo fesarala na soshal midia, nke NEXTA bụ ndị Belarus na-ama aka sokwa kesaa, gosiri ebe e si n'otu ụlọ adọpụta Ivan Federov bụ aka na-achị obodo Melitopol dị na mpaghara ọwụwa-anyanwụ Ukraine. Onyeisiala Zelensky kwuru na ya bụ ntọrọ a tọrọla ya bụ "mpụ megide ọchịchị onye kwuo uche ya".
  11. Unu abọọla chi?

    Ka chi foro taa, ọ ga-efotere gị ihe ọma o, Iseee.

    Nọnyere anyị dịka anyị na-ewetara gị akụkọ gbasara mwakpo Russia wakporo Ukraine abalị 17 gara aga.

    Ụwa chị obi n'aka eche mgbe ya bụ mwakpo malitere n'ụbọchị 24 nke ọnwa Febrụwarị ga-ebi.

  12. Ukraine na-atụ anya na ha ga-agbapụta ndị nkiti tọọrọ ebe agha na-ada n’ụbọchị Fraịdee

    Gọọmentị mba Ukraine na-ekwu na ha na-agba mbọ igbapụta ndị nkiti tọrọ na mba ha dịka agha ka na-ada ebe abụ taa bụ Fraịdee.

    Osote Prịam minista mba ahụ bụ Iryna Vereshchuk kwuru na ga-emepee ụzọ mgbapụ na mpaghara dị ịcheịche ruru 12 taa.

    Ukraine agbapụtara puku kwuru puu ndị mmadụ kamgbe agha malitere ọkachasị site n’atụmatụ usoro enyemaka ndị mmadụ bụ “Humaniterian corridors” na Bekee, mana enweela ọtụtụ mbọ ndị dara ada, n'ihi na nkwekọrịta nkwụsịtụ agha nwa mgbe nta bụ “ceasefire” na Bekee na-adebeghi ire.

    Minista nchekwa Ukraine ekwuola na egbuola ndị nkiki mba ha karịa ndị agha n’agha a Ndị agha Rọshịa egbuola ndị nkịtị Ukraine karịa ndị agha mba ahụ n'ime izu abụọ kemgbe mbuso agha Rọshịa malitere.

    Minista nchekwa Ukraine bụ Oleksii Reznikov kwuru nke a ma kọwa "Achọrọ m ka a nụ akụkọ mkpa mkpa a na mba ụwa niile."

    Okwu ya na-abịa dịka ndị agha Rọshịa na-abanyewazi na ọtụtụ mpaghara dị ịcheịche na mba ahụ dịka agha a na-amụbawanye.

  13. Mba Saut Afrịka ga-ekpe udo n'agha Yukren - Ramaphosa

    Onyeisiala Cyril Ramaphosa sị na akpokuola Saut Afrịka iji kpeeikpa udo n'etiti agha Rọshịa na Yukren.

    Maazị Ramaphosa na ya na onyeisiala Rọshịa Vladimir Putin, kwuru okwu n'ụbọchị Tọọzde mana Ramaphosa ekwupụtaghị onye kpọrọ ya oku a.

    O kwuru na ya na Vladimir Putin nwere mkparịtaụka n’ụbọchị Tọọzde ebe ọrịrọ ya ka ha soro ụzọ udona mkparịtaụka na-ịkwụsị agha na-ada n’Ukraine.

    "Onyeisiala Putin kerele anyị maka ka anyị si kwụrụ n'etiti esemokwu ha. Anyị kwenyere ebe anyị kwụ nke ga-enya aka kpee ikpe udo. Site na mmekọrịta anyị na mba Rọshịa ma bụrụkwa na anyị so n'tu Brics so ihe mere ha ji wee kpọbata anyị ikpe ikpe udo a.

    Leekwa ihe Maazị Ramaphosa dere n'akara Twitter ya:

    O tinyekwuru na ọsịsa Saut Afịka n'agha Rọshịa na ndị Yukren egosighị na ha ekwenyeghị n'ikikere ndị mmadụ.

  14. Mmadụ 123 si mba Ukraine gbaa ọsọ ndụ ha maka agha alọtala Naịjirịa

    Otu narị na iri abụọ na atọ (123) bụ ndị Naịjirịa ọzọ gbapụrụ mba Yukren n'ihi agha Rọshịa na-ebuso Yukren alaghachila Naịjirịa taa bụ Fraịdee.

    Ha ji ụgbọelu Air Peace nke nwere ndebanye aha 9HSLF laghachi Naijiria n'ọdụ ụgbọelu Nnamdi Azikiwe dị n'Abuja.

    Ndị batara n'ebe ihe dịka elekere otu nke isi ụtụtụ ụbọchị Fraidee.

    Ngalaba na-ahụ maka ihe mberede na Naijịrịa bụ National Emergency Management Agency (Nema) ndị ụlọọrụ gọọmentị ndị ọzọ dị mkpa so na ndị nọ nabata ndị a.

    Oriakụ Abike Dabiri-Erewa bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka ọdịnamma ndị mba Naịjirịa bi n'ofesi na ndị ụlọọrụ ha kwuru na ha mnyekwara ha nyemaka igotere ha sim kaadị nakwa puku naịra ise ha ji azụ ego ekwenti iji kpọọ ndị ezinụlọ ha.

    Otu n’ime ndị a lọtara bụ nwatakiri a ka ku n’aka.

    Ngụkọ gọọmentị Naịjirịa gosiri na ihe uru mmadụ 5000 nọ n’Ukraine tupu agha amalite.

    Naịjirịa na-agba mbọ ịkpọlata ndị mba ha niile chọrọ ịlọta dịka agha Russia na-ebuso Ukraine ka na-aga n’ihu.

  15. Volodymyr Zelensky akpụchapụla akụkọ Rọshịa iji ngwaagha kemịcalụ buso ha agha

    Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky ekwuola na akụkọ kwuru na Russia chọrọ iji ngwaagha Kemịkal buso ha agha bụ akụkọ ụgha.

    O kwukwara na ha ngwa anwa mee ya na ha ga-anata ntaraahụahụ pụrụiche.

    N’akụkọ yiri ya, ndị isi ọchịchị mba Amerịka ekwuola na akụkọ ahụ bụ ihe na-akpa ọchị dịka ha kwuru na nke a bụ akụkọ mmaja ma kwuo na Russia enweghị ya bụ atụmatụ ma ncha.

  16. Ụtụtụọma ndị ọma!, Ngwụcha izu a agaghị abụ ngwụcha ọganihu anyị.

  17. Mmachi a machiri Russia ga-ebute oke ọnụahịa mmanụ, nri - Putin

    Onyeisiala mba Russia bụ Vladimir Putin ekwuola na mmachi mba ndị mepere emepe nyere megide ha maka iwakpo Ukraine ga-ebute oke ọnụahịa mmanụ na nri na mbaụwa.

    Dịka ụlọntaakụkọ AFP si kwuo, Putin kwuru n’ụbọchị Tọzde na “Ọnụahịa ha arịwala elu, mana ọ bụ anyị butere nke a.”

    Ha agbakọghị ọfụma. Ọ baghị uru na ha na-ata anyị ụta.”

    Ọ gara n'ihu kasie ndị Russia obi maka ihe ụkọ ndị ha na-agabiga, ma kwuo na ọ ga-emecha mara ha ahụ.

  18. Lavrov si na ndị mmadụ na mba ndị Yukren ka ndị agha Yukren jiri zoo onwe ha

    Minista na-ahụ maka mmekọrịta mba na mba nke Rọshịa bụ Sergei Lavrov sị na ndị agha mba Yukren na-ezo n'azụ ụmụnwaanyị na ụmụaka.

    O kwuru nke a mgbe ya na minista ogbo ya na Yukren nwere mkparịtaụka na mba Turkey.

    Ọ sị na says ha "kwuru ihe ndị enyi ha dị na Tọkị so ha kpaa n'ikpe udo ha gakọrịtara".

    O kwuru ugboro ugboro na "ndị nkịtị ka ndị agha Yukren jichiri" nke ọ kọwara bụ "agha okeala ha". Ọ sị na ha ji ha gbochie onwe ha.

    Lavrov si na Rọshịa ka mepere okporo ụzọ enyemaka mmadụ maka ndị nkịtị.

  19. Otu nwata anwụọla n'ogbunigwe a tụrụ n'ụlọọgwụ ndị Rọshịa tụrụ ogbunigwe ha

    Osote Meyọ obodo Mariupol dị na ndịda Yukren dịka ha gwara BBC, na mmadụ atọ - gụnyere otu nwa ntakịrị - ka ya bụ ogbunigwe ahụ gburu mgbe ndị agha Rọshịa tụrụ ogbunigwe ahụ n'ụbọchị Wenezde.

    Ihe karịrị mmadụ iri na asaa ka ya bụ ogbunigwwe a merụrụ ahụ, ebe ụfọdụ n'ime ha bụ ụmụnwaanyị di ime.

    "A ma m na ha ma kpọmkwem na ebe a bụ ụlọọgwu, nke a emela ya ụlọọgwụ nke atọ ha na-agbari na Mariupol," Sergei Orlov gwara BBC.

    Ọ sị na ụlọọgwụ nwere akwa ruru narị atọ 300 enyefere ịgwọ ndị na-arịa ọrịa kovid nke e jiri ogbunigwe gbarie n'ụbọchị garaaga, makwa ebe ha na-edowe ọbara na Mariupol.

    "Ama m na ebe ndị a bụ ebe ndị ha maama chọ igbari," Orlov kwukwara.

    Ndị ụlọọrụ na-ahụ maka ahụike na mba ụwa bụ World Health Organization ekwuola na ọ hụla akaebe kpọmkwem ebe ndị emebiri ụlọọrụ ahụike 18 kamgbe nwakpo a bidoro.

    Rọshịa ka na-ekwusi ike na ndị agha ebupụchala ndị ọrụ ahụike na ndị na-arịa ọrịa tupu ha tụọ ogbunigwe.

    Volodymyr Zelensky bụ onyeisala Yukrene katọrọ ihe a mere ma kwuo na nke a bụ ihe mkpa mkpa ọjọọ n’agha.

    Ndị mba Russia atụọla ogunigwe n’ụlọọgwụ ndị nne na ụmụaka eku n’aka dị na mpaghara Mariupo nke mba Ukraine.

  20. Nwunye onyeisiala ndị Ukraine akpọọla oku ka ndị mbaụwa kwado atụmatụ anụnụebe, "no fly zone"

    Nwunye onyeisiala Ukraine bụ Olena Zelenska ekwuola okwu mbụ ya kemgbe agha malitere be ha site akwụkwọ ọ biputaara ndị mbaụwa.

    N'ime ya bụ akwụkwọ, ọ kọwara ahụhụ ndị mmadụ na-ata n'agha, ọkachasị ụmụaka na ụmụnwaanyị.

    Ọ kpọpụtakwara ụmụaka ndị ya bụ agha metutara n'ụzọ puruiche.

    Ọ dere sị,

    Nwaada Alice gbara afọ asatọ bụ onye nwụrụ na Okhtyrka ka nna ya oche na-achọ ịzọpụta ya.

    Polina na nna ya na nne ya nwụrụ na Kyiv maka ogbuigwe a tụrụ ebe ahụ.

    Arseniy gbara afọ iri na anọ (14) bụ nke mpekele igwe ogbunigwe tugburu. Ụgbọala gbatagbata enweghị ike ịbịa ọsịsọ buga ya ụlọọgwụ maka oke ọkụ na-agba ebe ahụ.

    Ọ sị na, "a kpọpụtara m aha ụmụaka a maka mgbe ndị Russia na-agọ na ọ bụghị agha ka na-ebuo Ukraine".

    Ọ kelere ndụ mbaụwa na ndị agbataobi ha bụ ndị nwere ezigbo obi ịnabata ndị na-agba ọsọ ndụ.

    O jikwa ohere ahụ chetere ndị mbaụwa mkpa ọdị ihewe atụmatụ anụnụebe, "no fly zone" dịka dị ya rịọburu.,

    Nato ajụla atụmatụ a maka na ọnwewreike ịme ka agha a gbasaa Europe niile.

    Ọ sị na, "anyị chọrọ ka ndị ọchịchị dị n'aka mechiere anyị igwe, hapụzịa ka anyị lụwa ya n'ala. E ji akwụkwọ a m dere ekwu na agha ụnụ hụrụ abụghị agha naanị Ukraine, ọ bụ agha dị n'obiọkpa Europe, bụ nke dị nso n'oke ala ha"."Ọ bụru na anyị akwụsịghị Putin bụ onye ọ na-agụ agụụ ịmalite agha nuklie, mara na-ezumike adaghịrị ụwa niile".