You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ọ bụrụ na Putin bụ nwaanyị, ọ karịghị awakpo Ukraine - Boris Johnson

Boris Johnson ekwuola na ọ bụ ime odogwu nwoke enweghị isi mere Vladimir Putin ji wakpoo Ukraine.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Unu asaala Chi?

    Ndewoo ụnụ Igbo ndị nwe m na ndị nwe!

    Ka anyị kulienu n'ije ị ma ka ihe siri kwụrụ taa n'ọgụ Rọshịa na Yukren.

    Anyị apụọ!

  2. Russia akwụsịla inye mba Poland na Bulgaria gasị ha, Russia so na mba kacha emepụta gasị nakwa mmanụ agbidi n'ụwa nke mba abụọ nwere ndabere na ya.

    Ụlọọrụ mba Russia bụ Gazprom nke na-emepụta gasị nakwa mmanụ agbidi kwuru na ha akwụsịla inye mba Poland na Bulgaria gasị ha n'ihi ọjụjụ ha jụrụ iji ego ruble bụ ego mba Russia zụrụ gasị ha

    Otu jịkọrọ ọtụ mba na Europe bụ European Union (EU) na-ekwu na Rọshịa na-eji gasị nakwa mmanụ agbidi emekpa mba ndị na-akwado Ukraine ahụ.

    Bulgaria na-ebo Gazprom ebubo ịkụsa nkwekọrịta ha, ebe Poland na-ekwu nwereike ịchọ ụzọ jigide onwe ha n’ọnọdụ a.

    EU na-enwe mkparịtaụka gasị maka ụzọ enyemaka ngwa ngwa n’ọnọdụ a dịka ha kwuru na ha nwere atụmatụ ga-enyere aka nwa mgbe nta.

    Cheta na Russia so na mba kacha emepụta mmanụ agbidi nakwa gasị nke ọtụtụ mba na-adabere mana ọnọdụ agha na-ada na-emetụta mepụta nakwa nkesa ya bụ ihe.

  3. Ukarine ekwuola na ọtụtụ ndị mmadụ nwụrụ na mwakpo ụgbọoloko Russia mere, Mwakpo ahụrụ adaala na Ukraine, leekwa ihe gọọmentị ha na-ekwu

    Ndị ọchịchị ebe mba Ukraine ekwupụtala na ọtụtụ ogbunigwe ndịagha Russia adaala n'ọdụ ụgbọoloko ọdịda anyanwụ na mpaghara etiti Ukraine.

    Onyeisi mpaghara etiti Vinnytsia zitere ozi site na Telegram na e nwere ndị nwụrụ anwụ nakwa ndị merụrụ ahụ n'ebe ahụ, n’ọdụ ụgbọoloko nke Zhmerynka na Kozyatyn.

    Serhiy Borzov ekwughị mmadụ ole nwụrụ mana o kwuru na ndị Russia na-anwa ịkụtụ "akụrụngwa dị oke mkpa n’obodo ndị a".

    Ụgbọ okporo ígwè ndị Ukraine akagbuola ma chegharịa ụgbọ ha na mpaghara ọdịda anyanwụ na etiti dịka mwakpo ahụ mechara.

  4. ‘Agbanyeghị na Russia na-anyụ Ukraine ịkpawụ, ha anaghị emerị agha a’ – Mba Amerịka, Amerịka na-egosi ha nkwado nye mba Ukraine dịka ụfọdụ ndị isi ọchịchị ha agaala ga-zute onyeisiala Ukraine.

    Onye odeakwụkwọ steeti mba Amerịka bụ Antony Blinken na odeakwụkwọ nchekwa mba Amerịka bụ Lloyd Austin abatala Kyiv maka mkparịtaụka ha na Onyeisiala mba Ukraine bụ Volodymyr Zelensky, dịka otu onyendụmọdụ onyeisiala Ukraine siri kwuo. Obi gọọmentị mba Amerịka bụ White House agbabeghị ama maka njem a.

    N’ozi Blinken zipụtara n’ụbọchị Sọnde, o kwuru na ọ bụ eziokwu na Russia na-anwaisiike imebesi akụkụ Ukraine mana atụmatụ agha ya na-akpụ afọ n’ala.

    Lloyd Austin, onye so mee njem a gaa Kyiv, kwuru na mba Amerịka chọrọ ịhụ na ikike agha mba Russia datụrụ.

  5. Mwakpo Ukraine ka bụ mbido ihe chere mba ndị dị ya n'agbataobi- Zelensky

    Onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky ekwuola na Roshia chọrọ iweghara mpaghara Ndida mba ahụ iji nye mpaghara Transnistria na-achọ ịdọpụ na mba Moldova.

    Zelensky sị na Rọshịa chọrọ ịwakpo mba ndị ọzọ, na mwakpo Yukren.

    Ministri na-ahụ mba ndị ọzọ gosiri "oke nchekasị" maka ihe onyeisiagha mba Rọshia kwuru.

    Ha kwuru Moldova bụ mba "na nkwenye na enweghị mba ha kwụnyere bụ ihe na mba nile gunyere Rọshịa kwesịrị ịkwanyere ugwu."

  6. Unu etetela eee?

    Igbo ndị, ọma, ụbọchị taa maara anyị mma o!

  7. World Bank: Agha Ukraine emebiela ihe dị ọnụego $60b na ebe agha ahụ kwụ ugbua

    Ụlọakụ mbaụwa, bụ 'World Bank' na Bekee ekwuola na ụlọ na ihe ndị ọzọ a na-ahụ agha e mebirila na Ukraine eruola ijeri dọla iri isii($60bn).

    Nke a agụnyeghị ihe ndakpọ akụnaụba mba ahụ maọbụ ego a na-emefu na ịlụ ya bụ ọgụ.

    Dịka onyeisi ụlọakụ ahụ bụ David Mapass si kwuo n'ụbọchị Tọzde, ego a a na-eme ga-arị elu karịa dịka ọgụ ahụ si na-aga n'ihu.

    Lee ihe ise ndị ọzọ dị mkpa ka ị mata maka ebe agha Yukren kwụ ugbua:

    • Onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky gwara ọgbakọ ụlọakụ mbaụwa World Bank na IMF na Yukren chọrọ enyemaka ego dị ijeri dọla asaa ($7bn)kwa ọnwa.
    • Yukren kwuru na mba Rọshịa jụrụ ha ahapụ ịkwa mgbọ ụbọchị ezumike Easter nke mba ahụ.
    • Ihe onyonyo nke igwe satelite setara gosiri na ndị Rọshịa na-eli ozu ndị Yukren n'igwe mana BBC enweghị ike ịchọpụtara onwe ya ma nke abụ eziokwu ,Rọshịa ekwbeghị ihe ọbụla maka nke a n'ọha.
    • Onyeisiala Mba Amerịka bụ Joe Biden ekwuola na ha ga-enye Yukren ngwagagha ego ya dị nde dola narị asatọ( $800m) nke gụnyere egbe kajara akana drone.
    • Onyeisiala mba Briten bụ Boris Johnson agbaala ama na ha na-enye ụfọdụ ndị agha Yukren ọzụzụ pụrụ iche etu esi etinye ụgbọala agha e bunyere ha maka iluso Rọshịa ọgụ n'ọrụ.
  8. Igbo, ekelee m ụnụ!

    Anụ bụ ụzọ nụrụ mmiri ọma!

    O ruola n'omume. Bia soro anyị zọpụ ije akụkọ agha Rọshịa na Yukren taa!

  9. Russia ga-akwụsị iwakpo Ukraine ma ha kagbuo atụmatụ isonye Nato, Russia ekwuola etu e nwereike isi kwụsị agha ha na Ukraine

    Russia ekwuola na agha ha ga-ebi ma ọ bụrụ na Ukraine kwụsị atụmatụ ha ịchọ iso otu jịkọrọ mba welitere isi bụ Nato

    Otu onye n’ime ndị isi agha mba Russia bụ Alexey Polishchuk kwuru nke a ma kọwa na atụmatụ agha ha na-aga nke ọma dịka o kwuru na ha ga-aga n’ihu na ya bụ agha.

    O kwukwara na atụmatụ Ukarine isonye Nato na metụta oke ala Russia na Ukarine mana ọ kọwaghị etu o.

  10. Agụụ ga-anwụ ụwa Ịkpakwụ n'ihi agha Ukraine

    Mwakpo Rọshịa wakporo Yukren na-ekposa etu e si ekesa nri n’ụwa dịka mba abụọ a na-akọpụta ụzọ out ụzọ na ụzọ atọ ‘wheat a na-eri n’ụwa gbaa gburugburu.

    N’izu gara aga , Onyeisiala mba India bụ Narendia Modi gwara onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden na India dị njikere ibunye mbaụwa nri dịka ọnụahịa osikapa na wheat na-arị elu n’ihi agha Rọshịa na Yukren.

    India bụ mba nnke abụọ kachasị akọpụta osikapa na ‘wheat’ n’ụwa ma bụrụkwa ndị kachasị ere ya ọnụ ala. N’ọnwa Eprelu ha nwere osikapa na ‘wheat nde tọnụ iri asatọ na anọ (74 million tonnes).

    Mana o doghị anya ma India aga-azọnwu ụwa. Ndị emegịghị ọfụma n’afọ a, ebe e nwekwata ụkọ fatịliza.

    Na nsonso a, onyeisi ụlọakụ mba ụwa’World Bank bụ David Malpass kwuru na nsogbu ga-adị dịka ọnụahịa nri gbaliri n’ihi agha Rọshịa na Yukren.

    Malpass gwara BBC na mkparịtaụka na na-agbanyeghị na e nwere nri edotara ebe ọ dị ukwuu nke ga-ezu ụwa iri mana inweta nri ndị a ebe ọ dị mkpa ga-ara ahụ dịka mba ndị na-emepe emepe jicha akatakpo ego n’ụgwọ, ebe ọnụahịa mmanụ ụgbọala na ọkụ há na-arị elu

    Ọ sịrị, “Ihe ruru pasent 60 mba ndị enweghị ka ọ ha ha ugbo nọ n’a nnukwu ụgwọ maọbụ na-achọ ịdanye na nnukwu ụgwọ.”

  11. Ndewoonu, ndị be anyị

    Ụnụ asaala chi? Ndụ mmiri , ndụ azụ.

    Sochie anyị maka akụkọ ka ihe siri kwụrụ na mwakpo Rọshịa wakporo Yukren.

  12. Ihe karịrị mmadụ 100,000 ka nọ n'ime obodo Mariupol

    Gọọmentị mba Ukraine na-ekwu na ha nwere olileanya ịkpọpụ ndị nkịtị ruru puku isii n'obodo Mariupol taa bụ Wednesday.

    Onye ji ọkwa 'Mayor' nke obodo mariupol bụ Vadym Boichenko kwuru na ihe karịrị mmadụ 100,000 ka nọ n'obodo ahụ.

    Boichenko kwuru na ha na mba Russia nwere nkwekọrịta imepe okporoụzọ ebe ndị nkịtị ga-esi pụọ, mana o nweghị ntụkwasị obi na Russia ga-erube isi na nkwekọrịta a.

    Cheta na Russia na Ukraine enwebuola nkwekọrịta maka ịhapụ ka ndị nkịtị chọrọ ịpụ na Mariupol pụọ, mana ya bụ nkwekọrịta mechara onweghị isi.

  13. Naanị awa olemole ka anyị nwere, bịanụ nyere anyị aka - Ndị agha Ukraine nọ Mariupol

    Onyeisi ndị agha mba Ukraine na Mariupol akpọkuola mba ụwa ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka.

    Serhiy Volyna mere ihe onyonyo ma zigara ndị ntaakụkọ na-ekwu ndị agha Russia agbaala ha okirikiri.

    Volyna kwuru sị: "Nke a bụ ozi ikpeazụ anyị na-ezigara mba ụwa. O nwere ike ịbụ ozi ikpeazụ anyị ga-ezipu n'ụwa a."

    "Anyị nwere naanị ụbọchị maọbụ awa olemole fọdụụrụ anyị."

    "Anyị agaghị achịliri ndị Russia aka elu, anyị na-agwa ndị ọchịchị mbaụwa ka ha chọọ ụzọ kpọpụ anyị ebe a kpọga anyị mba ọzọ."

    "Ndị agha ndị iro anyị karịrị anyị n'ọnụọgụgụ mmaji kwuru mmaji. Ma ụgbọelu ha, ma ndịagha ala ha, ma igwe e ji akwa mgbọ, ha karịrị anyị."

    "Ndị otu anyị merụrụ ahụ, ọnọdụ ha dị njọ. Ha nọ n'otu ebe dị n'okpuru ala, onweghị ọgwụgwọ ha na-enweta."

    Mariupol bụ nnọọ obodo mba Russia na-achọsị ike ka ha weghara na kamgbe ha wakporo mba Ukraine.

    N'izuụka gara aga, onyeisiala Ukraine bụ Volodymyr Zelensky gwara BBC na ihe karịrị mmadụ puku iri abụọ anwụọla kamgbe Russia malitere ịkwa mgbọ na Mariupol.

  14. Daalụ dịka ị na-esonye anyị taa

    Akụkọ niile dị mkpa gbasara agha Yukren.

  15. Kedụ ihe ndị merela na Ukraine na ngwụcha izuụka a?

    Praịm minista mba Ukraine bụ Dmytro Kuleba ekwuola na ndị agha Russia ekpebiela ịgbari obodo Mariupol n’ala na-agbanyeghi ihe ọ ga-efu.

    Ọ sị nke a na-abịa awa ole na ole Russia nyechara ndị agha Ukraine ohere ịwụsa ngwa agha mana ha jụrụ ajụ..

    Kuleba sị na-agbanyeghi iwu ahụ, na ndị agha Ukraine ka fọrọ ebe ahụ ga-alụ ọgụ ruo n’isi ya.

    N’aka nke ọzọ agwala ndị Ukraine bi n’obodo Luhansk dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ka ha kwakọrọ pụọ dịka onyeisi obodo ahụ bụ Sergei Gaidai si kwuo.

    Ọ sị na anya ndịagha Russia nọzi n’ịkpachi obodo Luhansk na Dinetsk nke so mpaghara Donbas ebe a na-emepụta unyiri na igwe.

    Putin bụ oyeisiala mba Russia sị na mpaghara ndi nwere onwe ha site na Ukraine tupu agha amalite.

    Mana ndị agha Ukrain na-akwado onwe ha maka mwakpe mba Russia nwereike ime ebe ahụ.

  16. Ozi emume 'Easter': Pope Francis arịọla ka udo chịa n'Ukraine, Pope Francis ejirila ohere 'Easter' zipụta ozi udo nye mba ndị ụwa ọkachasị n'Ukraine

    Dịka ndị okpukperechi Kraịstị na-eme emume ncheta mbilite n'ọnwụ Kraịstị nke ndị Bekee na-akpọ 'Easter',

    Ozi emume Easter Pope Francis zipụtara n’ụka St Peter's nke Rome arịọla ka udo chịa n’Ukraine

    Pope katọrọ ọgbaghara na ogbugbu ndị mmadụ mwakpo Russia na-eme n'Ukarine kpalitere.

    Cheta na n’izu gara aga, o kwuru na a kpọ ya oku ọrụ udo na ọ ga-amasị ya iza ma gaa njem ruo mba Ukraine maka mkparịtaụka udo ebe ahụ.

  17. Russia ezigarala Amerika na mba ndị so ya ozi ịdọ aka na nti

    Mba Rọshịa edegarala mba Amerika na mba ndị ọzọ na-akwado haa akwụkwọ ma dọọ ha aka na ntị ka ha ghara ibunye mba Yukren ngwaọgụ.

    N'ozi dị ibe akwụkwọ abụọ nke Moscow degara Washinton nke batara aka ụfọdụ ụlọntaakụkọ ndị Amerika, Rọshịa dọrọ Amerịka na Nato aka na ntị si na ngwaọgụ ha na-ezite bụ ịgbanye mmanụ n'oku na-enwu n'agha ha na Yukren ma kwuo na "ihe ndị a tụghị anya" ga-eso ya.

    Ozi ahụ nke ụlọnnọchite anya Rushịa na mba Amerịka zigara nglaba nchekwa Amerịka ụbọchi Tuzde na-abịa dịka ozi na Amerịka na-achọ izigara Yukren ngwaọgụ gbapuru.

    Onyeisala Amerka bụ Joe Biiden binyere aka n'akwụkwọ ka Amerịka zigara Yukren ihe enyemaka agha dị nde dọla 800m nke gụnyere ngwaagha ọnọebedịanya-agbapụ ike a kpọrọ 'howitzers' iji hụ na ike ọgụ ndị Yukren ruru nke ndị Rọshịa.

  18. Ụgbọmmiri agha Russia ekpuola n'oke osimiri

    Dika Mịnịstrị nchekwa siri kwuo, ụgbọmmiri aha ha a kpọrọ Moskva, nke ogbunigwe gbara ụbọchị Wenezde ekpuola na mmiri.

    Ozi si ministri ahụ kwuru na ọ bụ ebiri mmiri dabidoro dịka a kpụ Moskva aga n'ikperemmiri mere o jiri kpuo.

    Ugbọagha ahụ e ji agba ogbunigwe nke na-ebu ndị ọrụ mmadụ 510 bụ njirimara ike agha mba Rọshịa bụ ụzọ n'ọịgụ ha na-alụ megide Yukren.

    Mba Ukraine kwuburu na ọ bụ ha gbara ọgbụnigwe n'ụgbọmmiri ahụ mana Rọshịa ekwughị ihe ọbụla banyere mwakpo ahụ.

    Kama ha kwuru na ọkụ butere ọgbụgba ngwa agha ha nwere n'ụgbọmmiri ahụ. ma kwukwa na ha zọpụtaara ndị ọrụ nọ n'ụgbọmmiri agha ahụ tinye ha n' obere ụgbọmmiri ndị ọzọ. Ha ekwughị karịa otu a.`

    Dịka Michael Petersennke ụlọmmụta maka mmiri nke mba Rọshịa a kpọrọ 'Russia Maritime Studies' gwara BBC naza Mọskva bụ "ogwu na-adụ Yukren n'akụkụ" kemgbe Rn̄ọshịa maliitere mwakpo Yukren.

  19. Ukraine sị na-e jichiri mmadụ 300 n'ụlọakwụkwọ Yahidne

    Mịnịstrị na-ahụ maka nchekwa na mba Yukren ekwuola na e jichiri ihe ruru mmadụ 300 n'okpuru ụlọakwụkwọ 'Yahidne school' dị mpaghara Ugwu mba ahụ ịzụụka anọ.

    N'ozi ha wepụtara n' igwe okwu Twitter, kwuru na ndị agha Rọshịa kpụrụ ndị obodo na Yahidne n'ugwu

    Chernihiv, ebe a sị na mmadụ 18 nwụrụ.

    BBC enweghị ike ike ịnyocha mara na ihe ndị nchekwa ha kwuru.

    Yogita Limaye bụ onye ntaakụkọ anyị gara Yahidne kwuru na ndị obodo kwuru na a tụnyere mmadụ 130 n'otu ọnụụlọ kpara akpa(700 sq ft)

    Social embed from twitter

  20. Ndi be anyị, ụnụ asaala chi?

    Ndụ mmiri, ndụ azụ!