Joe Biden afebatala mba Poland maka atụmatụ inyere Ukraine aka, Mba Amerịka na-agba mbọ inyere mba Ukraine aka dịka Russia na-awakpo ha
Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden agaala mba Poland dịka ya na onyeisiala mba ahụ bụ Andrzej Duda ga-enwe mkparịtaụka banyere etu ha ga-esi nyere mba Ukraine aka.
E kwuru na Biden ga-aga leta mmadụ nde abụọ gbara ọsọ ndụ ha gbaba mba Poland na njem a.
Ugbua Biden na ndị minista mba Ukraine abụọ na-enwe mkparịtaụka.
Ọ febatara mba Poland bụ mba agbataobi Ukraine n'ụbọchị Fraịdee.