Kemgbe e nupụrụ ndịagha Rọshịa na Kyiv, isiobodo Yukren, na ngwụcha ọnwa Maachị, a hụla ozu mmadụ 1000, na mpaghara Bucha, ọtụtụ n'ime ndị a bụ ndị e liri n'ini emighị emi.
Onye ntaakụkọ BBC bụ Sarah Raisford mere nchọpụta ihe mere n'ogige ebe ụmụaka na-aga akwụkwọ n'oge ezumike bụ ebe a na-enyocha ugbua dịka ebe mpụ mere.
O kwuru na e gburu ndị nkịtị karịrị 1000 n'otu ọnwa ndị agha Rọshia ji mpaghar ahụ mana ọ bụghị ogbunigwe maọbụ 'shelling' gburu ha, kama na ndị agha Rọshịa tụrụ ihe karịrị mmadụ 650 ndị nkịtị egbe ma gbagbuo ha n'anya ọcha.
Otu nwoke gbara afọ 34 aha ya bụ Volodymyr Boichenko bi nso ọdọụgbọelu ebe ndịagha Rọshịa fe4turu ịbata kwatu gọọmentị Yukren so na ndị o metụtara.
Nwanne ya nwaanyị bụ Aliona Mykytiuk gbara ọsọ ndụ rịọ nwanne ya nwoke ka ha gbapụ mana o kweghị.
Volodymyr abụghị onye agha mana ọ gwara nwanne ya nwaanyị na ya chọrọ ịnọrọ nyere ndị nọ na mkpa aka; ndị agbataobi ọkachasị ụmụaka nri na mmiri.
Nke a bụ oge ogbunigwe mere ka ọ hịa ahụ ndị mmadụ ịpụta na 'bunker' ebe ha zoro dịka ogbunigwe na-ada.
Ikpeazụ Aliona nụrụ olu Volodymyr bụ n'abalị asatọ nke ọnwa Maachị oge ha kwuru , ya asị ya atụla uche 'mana egwu dị n'olu ya" dịka Aliona si kwuo.
Ka ọ gachara abalị anọ, ndị agbataobi hụụ nso Promenystyi, a ma dịka " Camp Radiant", mana a hụkwaghị ya ọzọ.
Na Maachị, ọgụ na Kyiv kara aka , n'obodo Bucha, ọ kpụ ọkụ n'ọnụ .
Ka ndịagha Rọshịa pụchara na mbido Eprelụ, ọ tụụ ụwa n'anya dịka a hụụ ozu ndị bi na mpaghara ahụ ka ha tọgbọcha n'okporoụzọ.
Ozu Volodymyr so na ọzụ ndị ahụrụ.