You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Agha Ukraine: Onye enyemaka Zelensky na-ekwu na ihe ruru mmadụ 13,000 anwụọla

Nke so agha malitere n'Ukraine kemgbe Febụwarị mgbe ndị agha Russia malitere iwakpo ha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ụlọikpe enyela iwu ka ndị uweojii nwuchie onyeisi ngalaba NAMA

    Ụlọikpe elu etiti nke nọ na Legọs Steeti enyela iwu ka a nwuchie Mathew Pwajok bụ onyeisi ngalaba National Airspace Management Authority(NAMA) maka inupụisi n'iwu ụlọikpe nyere.

    Nke a bụ ebubo nke na-ekwu na Pwajok nupụrụ isi n'iwu ụlọikpe nyere nke kwuru ka ọ bịa n'ụlọikpe n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Julai ma jiri akwụkwọ gbasara ikpe a na-ekpe bịa.

    Ọ bụ ọkaiwu ukwu bụ Olalekan Ojo gwara ụlọikpe nke a ma sị na agbanyeghị akwụkwọ oku ụlọikpe nyere Pwajok, na o nụpụrụ isi ma jụwaa isi ị bịa ụlọikpe.

    Nke mere ka ọkaikpe Babs Kuewunmi nye kọmịshọna ndị uweojii nke Legọs steeti na onyeisi ndị uweojii nke Naijirịa iwu ka ha hụ na akpọtara Pwajok ụlọikpe.

  2. EFCC anwụchiela onye na-azọ oche ụlọomeiwu Kogi steeti ji N326m n'ego nkịtị

    Ha jidere Yusuf Atumeyi ebe o ji naira nde narị atọ na ụma nakwa dọlla otu puku narị na iri anọ n’ime akpa kwuru akpa.

    Ndị ọzọ anwụchiri n'atụmatụ a gụnyere Abdulmalik Femi bụbu onye ọrụ ụlọakụ nakwa onye akpọrọ Joshua Dominic.

    EFCC kwuru na o ruola ọtụtụ ọnwa kemgbe ha na-enyocha ndị ahụ anwụchiri n'ọru mbupu ego nakwa ihe ndị ọzọ ha na-arụ.

    Anapụtakwara ndị ahụ ụgbọala ọkwụọtọekeneze abụọ n'ebe ejichiri ha na Gueens Estate dị na Gwarinpa n'Abuja.

  3. Unu abọọla chi

    Daalụ dịka i ga-anọnyere anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị

  4. Etu ndị uweojii si nwụchie otu nwaamadi a na-enyo na ọ bụ onye ohi n’Imo steeti

    Ndị uweojii n’Imo steeti anwụchịela otu nwoke a na-enyo na ọ bụ onye ohi n’Umuayata, dị n’Oguta Imo steeti ma natakwa ya ọtụtụ egbe, mgbọegbe na ngwa ọgụ ndị ọzọ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Michael Abattam na ndị otu nwaamadị ahụ gbara ọsọ oge ndị uweojii wụchiri ebe ahụ.

    Ozi ya kwuru na ndị uweojii gbara mbọ wụchie ebe ahụ dịka a gbara ha ama na ndị otu a na-ezu ohi ebe ahụ.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ya bụ nwaamadị gbara ọtụtụ ama na ọ bụ onye ohi nakwa etu ya ndị otu ya si anapụ ndị mmadụ ihe n’ike n’akụkụ okpuruọchịchị Oguta.

  5. Ọkụ agbaala n'ahịa Tejuosho dị na Legọs

    Ihe mberede ọkụ ọgbụgba mere n'ahịa Tejuosho dị na mpaghara Yaba na legọs n'ụbọchị Tuzde, Nọvemba 1, 2022..

    Ọ bụ na ngalaba ahịa ahụ ebe a na-ere akwa na ihe e ji akwa akwa ka ya bụ ọkụ si malite, dịka onyeisi ngalaba mgbanyụ ọkụ nke Legọs steeti bụ Adeseye Margaret si kwuo.

    O kwughị ma e nwere onye nwụrụ maọbụ merụrụ ahụ na ya bụ ọkụ.

    Ka ọ dị ugbua, ndị ọrụ gbatagbata ka nọkwa n'ahịa ahụ na-agba mbọ ịgbanyụ ya bụ ọkụ.

    Nke a na-abịa dịka e nwekwara ihe mberede ọkụ ọgbụgba na mpaghara Victoria Island nke Legọs n'ụbọchị Tuzde a kwa.

    Akụkọ na-ekwu na mmadụ anọ tufuru ndụ ha n'ọkụ nke a.

  6. Etu ọkụ si gbagbuo ndị mmadụ na Victoria Island, Legọs

    Ndị uweojii Legọs steetị ekwuola na ọkụ gbagburu ndị mmadụ ma merụọ ụfọdụ ndị ọrụ ha ahụ na mpaghara Victoria Island (V.I) Legọs.

    N'ozi ha wepụtara n'akara Twitter, ha kwuru na ọkụ ahụ gbara n'ebe a na-akpọ Adeola Odeku n'ụtụtụ Tuzde.

    A matabeghi ihe butere ya bụ ọkụ maọbụ mmadụ ole nwụrụ maọbụ merụọ ahụ n'ihi ya.