You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Agha Ukraine: Onye enyemaka Zelensky na-ekwu na ihe ruru mmadụ 13,000 anwụọla

Nke so agha malitere n'Ukraine kemgbe Febụwarị mgbe ndị agha Russia malitere iwakpo ha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Okorie ji ọkọlọtọ Labour Party azọ ọkwa Ebonyi South enwerela onwe ya

    Linus Okorie bụ onye ji okoloto Labour Party azọ ọkwa ụlọomeiwu nke Ebonyi south enwerela onwe ya dịka ndị uweojii nwuchịrị ya maka ebubo ịgba mgbere ọgwụike.

    Ọ bụ ụlọikpe ukwu nke Ebonyi steeti nyere ya ohere ịkwụ ụgwọ ma nwere onwe ya kamgbe otu ọnwa ndị uweojii nwuchiri ya.

    Okorie kelere Gọvanọ Dave Umahi na nwanne ya nwoke bụ Roy Umahi maka mbọ ọ si ha gbara iji hụ na akpọpụtara ya.

    Okorie gwara ndị na-akwado ya sị, " Enweghị onye ọbụla bụ onye iro, ọnye akọla ọnụ maọbụ kparịa onye ọbụla. Ihe mere bụ ihe so ndọrọndọrọ ọchịchị, edoziela ihe niile".

  2. Ụlọikpe atụọla onyeisi ndị uweojii Naịjirịa nga

    Ụlọikpe ukwu nke dị n'Abuja atụọla onyeisi ndị uweojii nke Naịjịrịa bụ Usman Baba nga ọnwa atọ maka ịnupụ isi n'iwu ụlọikpe nyere.

    Nke a bụ iji kwado iwu nke kwuru ka etighachị Patrick Okoli n'ọrụ dịka ụlọikpe kpebiri na-etu o siri laa ezumike nka ezighị ezi kamgbe afọ 2011.

    N'aka nke ọzọ ka Alkali na-ekwu na ọ maghị maka iwu nke kwuru ka etighachi Okoli n'ọrụ ma sị na ọ ga-erubere iwu ụlọikpe nyere isi.

  3. Etu dibia si gbagbuo onye ahịa ya ebe ọ na-anwale ọgwụ ọdieshi

    Ndị uweojii n'Enugwu steeti ejichiela otu nwoke aha ya bụ Odoh Emmanuel maka ebubo na o ji egbe gbagbuo nwoke ọzọ aha ya bụ Onunze Benjamin.

    Ọ bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Ebugwu steeti bụ Daniel Ndukwe kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara n'ụbọchị Tuzde.

    Ndukwe kwuru na ha nwụchiri Odoh Emmanuel n'ụbọchị 16 nke Nọvemba n'obodo Ikemnke dị n'okpuru ọchịchị Isi-Uzo.

    Dịka o si kọwaa, Odoh bụ dibia onye Onunze Benjamin bịakwutere ka ọ gwọọrọ ya ọgwụ ga-eme ka mgbọegbe ghara ị na-abanye ya n'ahụ, nke a na-kpọ ọdịeshi.

    Oge Odoh gwọchara Benjamin ya bụ ọgwụ, o weere egbe a rụpụtara na Naịjirịa gbaa ya iji nwalee ma ọgwụ ahụ ọ na-arụkwa ọrụ.

    Mana oge ọ gbara ya egbe ahụ, Benjamin dara n'ala bụrụ onye nwụrụ anwụ.

    Ndukwe kwuru na ndị uweojii anatala Odoh egbe ahụ ma malitekwa nnyocha na ya bụ okwu.

  4. Etu ụmụokorobịa atọ si zoo n'okpuru ụgbọmmiri si Legọs ruo Spen

    A chọtala ụmụ okorobịa atọ banyere n'okpuru ụgbọ mmiri si Naịjirịa ruo mba Spen, dịka ndị ọrụ nchekwa Spen si kwuo.

    Foto ndị ọrụ 'cosatguards' nke mba Spen wepụtara gosiri ụmụ okorobịa ahụ ka ha nọ n'okpuru nnukwu ụgbọmmiri ahụ ruo abalị iri na otu ọ gbara n'osimiri si Legọs rute Spen, ọ fọdụrụ obere ka ụkwụ ha na-emetụ na mmiri.

    Ndị ọrụ nchekwa ahụ kwuru na ha kpọgara ụmụ okorobịa ahụ n'ụlọọgwụ oge ụgbọmmiri ahụ rutere mpaghara Gran Canaria.

    Aha nnukwu ụgbọ mmiri ahụ bụ Althini II nke hapụrụ ọdọ ụgbọmmiri dị na Legọs wee gbaa ihe karịrị 'nautical mile' 2,700 tupu o rute Las Palmas, Gran Canaria, dịka ndị ọrụ mba Spen si kwuo.

    Nke a abụghị nke mbụ ndị mmadụ na-ezo n'okpuru ụgbọ mmiri si Naịjirịa gaa mba ofesi.

    N'afọ 2010, a chọtara nwatakịrị nwoke dị afọ 14 dịka o zoro n'okpuru ụgbọmmiri bu mmanụ ụgbọala si Legọs rute Gran Canaria, dịka ụgbọmmiri ahụ gabara ihe ruru ụbọchị 15 n'elu osimiri.

    Ọnụọgụgụ ndị njem na-eji ụgbọmmiri si mpaghata Ọdịda Anyanwụ Afrịka gawa Spen, na-arịwanye elu kwa afọ.

    N'afọ 2021, otu 'United Nations' kwuru na ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'ụzọ njem dị otu a ruru 1,126.

  5. Gọvanọ Adeleke achụọla Igwe obodo atọ n'Osun steeti

    Gọvanọ ọhụrụ nke Osun steeti bụ Ademola Adeleke achụọla ndị Igwe obodo atọ na steeti ahụ n’oche eze ozugbo ozugbo.

    Adeleke nke e duru n’iyi ọrụ n’ụbọchị ụka kọwara na ọ bụ iji nyocha ọfụma etu ndị Eze ahụ si banye ọkwa.

    Obodo atọ nke iwu a metụtara gụnyere Ikirun, Iree nakwa Igbajo dịka BBC Yoruba si kwuo.

    N'ime ozi nke ọnụ na-ekwuchitere ya bụ Olawale Rasheed weputara, ọ sị "Ndị Eze niile banyere ọkwa kemgbe ụbọchị 17 nke ọnwa Julaị afọ 2022 ga-akwụsịtụ ọrụ ganye mgbe emechara nyocha".

    Iwu a o nyere bụ mbụ ọ na-enye dịka Gọvanọ gbachikwwara obi eze ndị ahụ ganye mgbe ọ ga-enye iwu ka agbapee ha ọzọ.

    Cheta na tupu o nye iwu a, e nwere ọgbaghara dapụtara n'obodo Ikirun n'etiti ndị na-azọ oche eze obodo ahụ.

  6. Kpachapụ anya maka ndị ohi akpa na mba ofesi – Gọọmentị Naịjirịa

    Gọọmentị etiti adọọla ụmụ Naịjirịa nọ na mba UK, Amerịka na ebe ndị ọzọ aka na ntị maka ndị ohi na-ezu akpa ndị mmadụ na mba ndị a.

    Minista mgbasaozi bụ Lai Mohammed nyere ndụmọdụ a n’ụbọchị Mọnde mgbe ọ na-ekwupụta ọrụ ndị Onyeisiala Muhammadu Buhari rụrụ.

    N’okwu ya “Ozi na-eru anyị ntị na-ekwu na etu e si ezu ngwongwo ụmụ Naịjirịa mere njem gaa mba Amerịka, UK na ndị ọzọ ọkachasị ego na akwụkwọ njem ha na-arị elu.

    “Ndị nke a mere na nso nso a bụ ndị mere njem gaa mba UK, bụ ndị e zuuru ngwongwo ha n’ọdọahịa dị n’okporoụzọ Oxford.

    “Ya mere anyị jiri kpebie ịdụ ụmụ Naịjirịa na-eme njem na Yurope nakwa Amerịka ndụmọdụ, ka ha kpachapụ anya ka a ghara izu ngwongwo ha.”

    Cheta na mba Amerịka na UK dọrọ aka na ntị na ndị oyi ndu egwu nwereike ịwakpọ ụlọakwụkwọ, ụlọahịa nakwa n’ụlọụka dị na Naịjirịa n’ọnwa Ọktoba afọ 2022.

    Mana Gọọmentị Naịjirịa gọnarịrị nke ahụ ma sị na udo dị ka onye atụkwala ụjọ.

  7. Ka a kwụsị inyocha ekwentị, kọmputa na ndị nwere 'Tinted glass' n'Imo Steeti - Kọmịshọna ndị uweojii

    Site na mkpesa na arị ibe ya elu n'Imo Steeti, ọkachasị n'aka ndị ntoroọbịa, kọmịshọna ndị uweojii steeti a bụ Mohammed Ahmed Barde adọọla ndị uweojii aka na ntị ka ha kwụsị agwa inyocha ekwe ntị ndị mmadụ, kọmputa ha, ma kwụsịkwa ịna ndị ugegbe ụgbọala ha di oji akwụkwọ ikike nke a.

    N'otu aka ahụ ka ọ dọkwara ndị ntoroọbịa aka na ntị ka ha rubere iwu obodo isi ma kwuo ka ha kwụsị iji wakịrịwakịrị dị oji ekpuchi ugwegbe ụgbọala ha. Mana o kwuru na ọ bụ naanị ndị ọ bụ ụlọọrụ rụrụ ụgbọala ha tinyere ya ugegbe ojii nwere ikike inya na-ejighị akwụkwọ ikike.

    O kwuru ka ndị isi ndị uweojii mpaghara dị iche iche na steeti ahụ hụ na ndị nọ ha n'okpuru rubere isi na ya bụ iwu. O kwukwara na onye uweojii ọbụla dara iwu a ga-ata ahụhụ diiri ya.

  8. Ndị uweojii anwuchiela ndị e chere bụ ndị ntọ sị na nga gbaa ọsọ maka ebubo ịtọrọ onye ọzọ

    Ndị uweojii anwuchiela Okechukwu Edison na Sunday Morrison maka ebubo iji egbe zuo ohi na ịtọrọ otu nwaanyị bụ ọkaiwu na Rịvas steeti.

    Olumuyiwa Adejobi bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii steeti ahụ kwuru na ha na-achọbu mmadụ abụọ a achọ dịka ha siri na nga dị n'owerri Imo steeti rie mbọmbọ ọsọ n'ụbọchị ise nke ọnwa Aprel afọ 2022.

    O kwukwara sị, "ọ bụ n'ụbọchị iri nke ọnwa Nọvemba afọ 2022 ka ha nwuchịrị mmadụ abụọ a na Rumuola nke dị na Pọta-Kọtụ".

    Adejobi kọwara na mmadụ abụọ nọ na nga eche ụbọchị ikpe ha maka ebubo ịtọrọ mmadụ ma sịkwa na ha anọọla n'ụlọ nga a afọ iri na otu.

    Ọ gara n'ihu sị, "kama na ha gbara ọsọ dịka ndị oji egbe wakporo ụlọmkpọrọ ahụ ma jiri ogbunigwe gbakaa ụlọaja nke nyere ndị nọ na nga ohere ịgba ọsọ".

  9. Ndị nchekwa azọpụtala mmadụ itoltu n'aka ndị ntọ

    Kọmịshọna nchekwa na ọdịmma obodo nke Kaduna Steeti bụ Samuel Aruwan ekwuola na ndị nchekwa nke Operation Forest Sanity azọpụtala mmadụ itolu dịka ha wakporo ogige ndị omekome n'okpuruọchịchị Chikun dị na Kaduna Steeti.

    Aruwan kwukwara na ndị nchekwa napụtara ndị a ehi iri itolu ha zuuru ma sị na ha ga-enyefe ya n'aka ụlọọrụ Kaduna State Livestock Regulatory Authority iji mata ndị nwa ha.

    Nyocha na-aga n'ihu chọpụtara ọgbatumtum nke ndị omekome hapụrụ gbaa ọsọ na mpaghara ugwu Bawa Rkasa na steeti ahụ.

  10. Amnesty Int'l akatọọla nnwuchi Aminu Adamu maka ịkato Aisha Buhari, Ụmụ Naijiria na-eti mkpu ka atọhapụ Aminu

    Ụlọọrụ Amnesty International akpọọla oku ka a tọhapụ nwata akwụkwọ mahadum gbara afọ 23 e ji eji maka ịkatọ nwunye onyeisiala Naijiria bụ Aisha Buhari.

    Akụkọ kwuru na ndị ọrụ nchekwa nwuchiri Amunu Muhammad bụ nwata akwụkwọ mahadu Federal University of Duste n'izu gara aga maka ide na soshal midia na ọ bụ ego Naijiria mere Aisha Buhari ji buo ibu karịa ka ọ dị na mbụ.

    N'ozi Amnesty Int'l wepụtara Ụbọchịụka, otu ahụ siri,boro ebubo na-anuchiri nwa amadi ahu tiee ya ihe ma jụ ya ihu ezinaụlọ ya nakwa ọkaiwu ya.

    Ozi ahụ sịrị, "Amnesty International na-akatọ nnwuchi a nwuchiri Aminu."

    " Ezinaụlọ na ndị enyi kwuru na a nwụchiri ya na-enyeghị ya ohere ka ya na ndị ezinaụlọ ya na ndị ọkaiwu ya kpaa.

    "A kụrụ ya ihe ma meekpakwa ya ahụ n'ụzọ ndị ọzọ."

    Ka ọ dị ugbua, aha Aisha Buhari na-ewu na soshal midia na Naijiria dịka ndị ntorobia na-akatọ ya ma na-akpo oku ka a tọhapụ nwa amadi ahụ bụ onye ezinaụlọ ya na-ekwu na enyeghị ha ohere hụ ya anya kemgbe ọ bara n'aka ndị ọrụ nchekwa.

    Ndị ma Aminu na-arịọ ka a tọhapụ ya ka o nwee ohere lee ule mahadum ha ga-amalite n'abalị ise nke ọnwa Disemba afọ a.

    Ha na-ebukwa ebubo mmekpa ahụ.

  11. Lee ego ole a ga-eji arụ '4th Mainland Bridge'

    Njịkọ ụlọọrụ atọ apụtala dịka ụlọọrụ gọọmentị Legọs steeti họpụtara nwereike ịrụ akwa mmiri 4th Mainland.

    Ọ bụ ụlọ ntaakụkọ Reuters kwuru nke a ma sị na ọ bụ ijeri dọla abụọ na ụma ka a ga-eji rụọ ya bụ akwa mmiri.

    Ọ bụ Jubril Gawat bụ onye na-ekwuchitere gọvanọ Legọs steeti kwuru nke a ma sị na otu n'ime ụlọọrụ ndị a si mba Portugal ebe abụọ ndị nke ọzọ si mba Chaịna.

    Ogologo akwa mmiri a ga-eru 37KM ma nwee kwa ebe a na-anara ụtụisi atọ nke bụ Tollgate n'okwu bekee.

  12. Gọvanọ Adeleke amachiela ọba ego gọọmentị Osun Steeti.

    Gọvanọ ọhụrụ Osun Steeti bụ Ademola Adeleke amachiela ọba ego gọọmentị Osun Steeti dịka educhara ya n'iyi ọrụ taa bụ sụnde.

    Nke a so na iwu ọhụrụ ndị ọ nyere dịka gọvanọ ọhụrụ steeti ahụ.

    Ọ nye kwara iwu ka ehiwe nzụkọ ga-eme nyocha ihe niile gọọmentị nwere ma weghachị kwa ha.

    Iwu ọzọ abụrụ ka ehiwe nzụko nke ga-eleba anya ma nyocha ọkwa na ọrụ dị iche iche nke gọọmentị nọbu n'ọchịchị mere site n'ụbọchị iri na asaa nke ọnwa July gbadawa.

    Ọ bụ na mgbasa ozi o mere mgbe ọ ṅụrụ iyi ọrụ ya ka o kwuru ma sị, " mbọ niile a gbara iji hụ na gọvanọ hiwere nzụkọ ga-ahụ maka inyefe ọchịchị etu iwu siri kwado amitaghị mkpụrụ ọbụla".

    Ụfọdụ ihe ndị ọ rụtụrụ aka bụ etu gọvanọ pụrụ apụ bụ Gboyega Oyetola siri jiri ọsịsọ mee ụfọdụ ndị Oba n'ụzọ megidere usoro iwu eji echi mmadụ Oba.

    Adeleke ji ohere a kwuo na ọ ga-emezi ebe niile gọọmentị pụrụ apụ mere ikpe ezighịezi.

  13. A tụọla otu nwoke mkpọrọ maka inwe PVC 101

    Ụlọikpe Majie dị na Sokoto atụọla otu nwoke a kpọrọ Nasiru Idris mkpọrọ otu afọ maka inwe akwụkwọ atụmvootu PVC dị otu narị na otu maka ịda iwu ntuliaka.

    Ọnụ na-ekwuru Inec bụ Festus Okoye bụ onye gbara ama kwụkwara na ndị uweojii Kano steeti akpụpụla nwoke ọzọ ụlọikpe maka inwe PVC 367.

    Okoye, onye kwuru nke a n'ozi mgbasaozi o zitere BBC Igbo ụbọchịụka kwuru na oge na-adịghị naya na Inec ga-ewepụta ozi maka ụbọchị ndị usoro ndị denyere aha maka atụmvootu ga-esi anata Kaadị PVC ha.

  14. E duola Ademola Adeleke n'iyi ọrụ dịka Gọvanọ Osun steeti

    Taa ka e duru Ademola Adeleke nke PDP iyi ọrụ dịka gọvanọ Osun steeti n’ emume e mere n’ama egwuregwu Osogbo City Stadium.

    Mana aka chịburu steeti ahụ bụ Gboyega Oyetola nke APC kwuru na oge Adeleke ga-epe mpe dịka ya ga-esi n’ụlọikpe laghachi n’ọkwa ahụ.

    Cheta na Adeleke meriri Oyebola bụbụ aka na-achị steeti ahụ na ntuliaka Gọvanọ steeti ahụ e mere n'abalị 16 nke ọnwa Julai afọ 2022.

  15. Ọ buru na Ojukwu dị ndụ ọ gaghị agba nkịtị n'okwu Nnamdi Kanu- Bianca

    Nwunye Emeka Odumegbu Ojukwu, onye ndu Biafra bụ Bianca Ojukwu akpoola oku ka a tọhapụ onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu.

    Bianca Ojukwu, onye kwuru nke a n' ọgbakọ maka ncheta Ojukwu nke e mere n’Owere ụbọchị Satode kwuru na ọ bụrụ na Ojukwu dị ndụ na ọ gara akpo oku ka a tọhapụ Nnamdi Kanu.

    Ọ tụrụ arịrị maka ụkọ ndị ndu n'Ọwụwa Anyanwụ nakwa etu itigbuo zogbuo si were ọnọdụ na mpaghara ahụ.

    " Ọ bụ oge dịka ugbua ntuliaka 21023 na-abịa nso ka o were anyị anya na anyị nwere ụkkọ ndị ndu n'Ala Igbo."

    " Ihe anyị nwere bụ ndị akaghị obi nke ha na-ekwe ntụkwasịobi."

    “Anyị ahụbeghị oke ogbugbu mmadụ ka ụdị anyị na-ahụ n'ala Igbo ugbua, ọbụladi n'oge Agha."

    O kwuru na ihe kpaatara nke abụ enweghị olile anya, enweghị ọrụ nakwa enweghị ihe ọbụla gọọmentị etiti rụụ n'Ọwụwa Anyanwụ.

    " Gịnị mere anyị ji ahụ ihe ndịa? Ọ bụ n'ihi na ụmụntorobia Igbo legharịa anya, ihe ha na-ahụ bụ ala ụkpọrọ, enweghị olileanya,."

    "N'Ọwụwa Anyanwụ , enweghị ufuru Gọọmentị Etiti, enweghị ọrụ."

    " Ihe nile adakpọọla, ọbụghị nanị akụnaụba dakpọrọ, ọnọdụ nchekwa."

    " Ọbụladị n'orụugbo, ndị amaghị ndị ha bụ anọchiela ugbo anyị."

    “Anyị na-echeta Ojukwu taa maka na ọ gaara ekwuru ndị nke ya."

    " Ojukwu gaara akpo oku ka a tọhapụ Nnamdi Kanu."

    "Ya mere ana m akpo oku ka a tọhapụ Nnamdi Kanu."

    "Naanị na Naijiria ka gọọmentị na-ajụ ige ntị n'ihe ụlọikpe kwuru."

    Tohapụ ya n'ihi na o nweghị mba naejichi ụmụamala ya."

  16. Ndị uweojii anwụchiela nwata dị afọ 12 maka ịtọrọ nwa gbara afọ atọ

    Ndị uweojii Bauchi steeti anwụchiela nwata nwoke gbara afọ iri na abụọ maka ị tọrọ otu nwata dị afọ atọ kpọ ndị mụrụ nwa ahụ na-ana ha otu narị naira na iri isi iji gbara isi nwa ha.

  17. Sultan atụọla arịrị maka ndị Fulani na-etinye aka na ntọ, 'banditry'

    Sultan nke Sokoto bụ Alhaji Muhammad Sa’ad Abubakar, arịọla ndị otu ochiehi a kpọrọ, Miyetti Allah, ka ha nye aka na mbọ a na-agba ikwusị nsogbu nchekwa a na-enwe na Naijiria ugbua.

    Sa’ad Abubakar , onye kwuru nke a n’emume idu n’iyi ọrụ ndị isi otu Miyetti Allah a họpụtara ọhụrụ n’Abuja na nsonso a kwuru na ọ bụrụ na ọ bụghị ndị Fulani si mpaghara dị iche iche bata Naijiria, na ọnọdụ nsogbu nchekwa ugbua bụ ebe e nwere ndị ntọ na ndị ekperima Bekee kpọrọ 'banditry' agaghị adị.

    Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na anyị ma akụkọ etu ndị Fulani si si mpaghara dị iche iche n’ụwa, anyị akaghị ịnọ nọ ọnọdụ anyị nọ ugbua .”

    “Onye ọbụla ma na ndị Fulani na-esi ebe A ga n’ebe B.Ha na-aga n’ọhị a nakwa n’obodo, ebe n’ile, ha na-arlaụrịte nwaanyị,. Anyị bụ ndị na-achọ udo.Kedụzị ka anyị si rute n’ọnọdụ a anyị nọ ugbua na-ahụ ịhụ ụmụ anyị bụ na-etinye aka na ntọ na-ekperima (banditry) (ọ bụghị ha nile bụ ndị Fulani)?”

  18. Ndewoonụ, Igbo ndị ọma!

    Igbo mma mmanụ o!

    Ndewoonụ o!

  19. A nwụchiela otu nwoke a sị dịnara nwata dị afọ ise n'ike ma dịnagbuo ya

    Ndị uweojii n’Ogun steeti anwụchiela otu nwoke gbara afọ 36 a sị na-edịna ụmụnwoke ibe ya dịka a na-ebo ya ebubo na ọ dịnara otu nwatakarị nwoke dị naanị afọ ise n’ike ma dịnagbuo ya n’obodo Ogijo nke steeti ahụ.

    Ha kwuru na nwoke a a na-enyo n’okwu a kwupụtara na ọ bụ nwoke na-edịna nwoke ibe ya n’ezie ma gbaa ama na ọ dịnagidere nwata nwoke ahụ n’ike tupu ọ nwụọ.

    Ya bụ nwoke kwukwara na gwuru ala n’akụkụ ọhịọ nọ nso be ya ma lie ozu nwatakịrị ahụ.

    Kọmịshọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ CP Lanre Bankole etinyela anya n’okwu a ma nye iwu ka ndị ngalaba na-ahụ maka nnyocha pụrụiche n’okwu ọnwụ mee nnyocha zuruoke na ya bụ okwu ọnwụ nwata ahụ.

  20. Ndị China amalite ngagharịiwe megide mmachi ngagharị ndị mmadụ maka ọrịa Covid-19

    Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia na-egosi na ndị mba China apụtala na-eme ngagharịiwe megide mmachi ngagharị ndị mmadụ maka ọrịa Covid, dịka ọkụ gbagburu mmadụ iri n’otu ụlọ.

    Ndị ọchịchị na Urumqi ekwela nkwa iwepụ iwu mmachi ndị a n'agbanyeghị na ha na-ekwu na enweghị mgbe ha ji gbochie ndị mmadụ ịgbanarị ọkụ ọgbụgba ahụ.

    Otu onye n’ime ndị bi n’akụkọ ụlọ ahụ gwara BBC na egbochiri ndị mmadụ ịgbapụ n’ihe usoro mmachi China tinyere maka mfesa ọrịa a mana ụlọ ntaakụkọ ndị mba a na-ekwu na nke a abụghị eziokwu.

    E mere mmachi ndị a kemgbe ọnwa Ọọgụst nke afọ a.

    Ndị ọchịchị Urumqi zipụtara ozi na-arịọ mgbaghara pụr iche n’ụbọchị Fraịde ma na-ekwe nkwa inye onye ọbụla hapụrụ ọrụ nlekọta na nchekwa obodo ya ntaramahụhụ.

    Ihe onyonyo fesara na soshal midia n’abalị Fraịde gosiri ka ndị bi ebe ahụ pụtara n’igwe ma nyirichaa mkpuchi ime ha na-ezukọ n’abalị ahụ na-agụ egwu, na-enwe nrụrịtaụka nye ndị ọchịchị ha ma na-eme ngagharịiwe maka ọnwụ ndị a.