You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Agha Ukraine: Onye enyemaka Zelensky na-ekwu na ihe ruru mmadụ 13,000 anwụọla

Nke so agha malitere n'Ukraine kemgbe Febụwarị mgbe ndị agha Russia malitere iwakpo ha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Etu otu onye agha Naịjirịa siri were ụgbọala kutuo ma gbuo ogbo ya

    Akụkọ na-ekwu na otu onye agha ji amaghị ama gbuo otu onye agha ibe ya na Legọs steeti. Dịka akụkọ a siri kwuo, nwoke onye agha a na-enyo n’okwu a a sị aha ya bụ Abayomi Edun bu ụgbọala ya kutuo onye agha ọkwa ya riri elu na-ahụ maka ego n’ogigie ndị agha nke Nigerian Armed Forces Resettlement Centre (NAFRC), Oshodi ma rie ya elu.

    E kwuru na Audu James bụ onye a kuturu ma ria elu nakwa Edun riri ya elu na-adị na mma.

    Ka ozi si ebe ahụ siri gbaa ama, mmanya nọ na-egbu Edun onye bu ụgbọala ahụ kutuo ogbo ya nọ n’ụzọ na-aga n’akụkụ be ya n’ime ogige ndị agha.

    Ndị nọ ebe ahụ ihe a emee kọwara na ebugara Audu gaa ụlọọgwụ ngwa ngwa ka ya bụ ihe mere mana ebe ahụ ka ọ nọ laa mmụọ.

  2. Ghana arịọla mgbaghara maka ozi ha zipụtaburu banyere ime njem gaa Abuja

    Ụlọọrụ na-ahụ maka mmekọ mba na mba na Ghana ekwuola na ozi ha zịpụtaburu n’ụbọchị Wenezde etozighi etozu n’ihi na a nataghị ikike n’aka ndị isi ụlọọrụ tupu ezipụ ya.

    Ya bụ ozi dọrọ ndị mba ahụ aka na ntị maka ime njem gaa Abuja n’ihi okwu ụjụ mwakpo na-ada ebe ahụ.

    Ozi ahụ depụtakwara na oke egwu dị n’Abuja nke metụtara ọtụtọ ndị mmadụ, mwakpo n’aka ndị ekperima, iyi ndụ egwu, ọghaghara dị iche iche nakwa ihe ndị ọsọ.

    Nchikọta ozi ahụ rịọrọ ndị mba ahụ ka ha mee njem gaa Abuja naanị ma ọ bụrụ n’ihe dị oke mkpa.

    Mana ozi ọhụrụ ha wepụta n’abali Wenezde ahụ kụchapụrụ ihe ndị a niile e dere ma kwuo

    “Anyị amaghị maka ozi ihe egwu ọbụla ga-emetụta ndị mba anyị bi na Naịjirịa”

    “Ụlọọrụ na-ahụ maka mmekọ mba na mba na Ghana na-arịọ mgbaghara maka etu ozi mbụ anyị zịpụtara nwereike isi metụta ndị na-eme njem gaa Abuja n’ụzọ ọjọọ”.

    Cheta na mba Uk, Amerịka, Australia, Germany na Canada zipụtara ozi na nso nso dọọ ndị mba ha aka na ntị ma nye ọtụtụ n’ime ha ohere ịgbapụ Abuja maka okwu na nnyocha ha gosiri na ndị otu a sị bụ ndị oyi ndụ egwu nwereike iwakpo Abuja na nso nso a.

    Cheta na otu ndị agha nnupụisi nke Iswap na Boko Haram na-akpa ike ma na-wakpo ndị mmadụ n’akụkụ mpaghara ugwu Naịjirịa nke Abuja bụ isi obodo Naịjirịa so n’ime ya kemgbe afọ ole m ole.

  3. Iran amaala mmadụ anọ ndị ngagharịiwe ọzọ ikpe ọnwụ

    Amaala mmadụ anọ ikpe ọnwụ na mba Iran maka ebubo "ibu agha megide Chineke" n'ihe metụtara ngaghariiwe a na-eme na mba ahụ megide gọọmentị kemgbe izu ole m ole.

    Dịka ụlọ ntaakụkọ Mizan siri kwuo, ụlọikpe ‘Revolutionary courts’ dị na Tehran kwuru na otu n'ime ndị nghagharịiwe ahụ nke ha kpọrọ "ndị ọgba aghara" a na-akpọghị aha ya ji ụgbọala ya kutuo ma gbuo otu onye uweojii.

    Ha bokwara ebubo na a onye nke abụọ bu mma na egbe mgbe anwụchiri ya, ebe nke atọ gbochiri ụgbọala ịgba n’okporoụzọ ma kpatara ndị mmadụ "oke egwu".

    Mizan kwukwara na abalị Tuzde na a mara onye nke anọ ikpe ọnwụ maka na o ji mma me mwakpo n’oge ngagharịiwe.

    Otu na-alụ ọgụ ikike dịịri onye nye ndị mmaọdụ akatọọla ikpe ọnwụ a mara ndị a - nke ngụkọta ya nọzị na mmadụ ise kemgbe Sọnde – ma na-ekwu na mpụtara ikpe a ezighị ezi.

    Onyeisi ụlọọrụ ikike dịịrị onye nke Norway-Iran bụ Mahmood Amiry-Moghaddam, gwara ụlọ ntaakụkọ AFP

    "Ndị na-eme ngagharịiwe enweghị ohere ịnweta ndị ọkaiwu ga-ekwuchitere ha n'oge ajụjụ ọnụ, a nwụchie ha, a na-ata ha oke ahụhụ ma na-amanye ha ka ha mee nkwupụta ụgha n’okwu ihe ndị ha emeghị, ma maa ha ikpe site nkwupụta ụgha ndị a.”

    Agbanyeghị na ụlọikpe ekwupụtaghị aha mmadụ ise a mara ikpe ọnwụ, otu ‘Amnesty International’ kwuru na ozi gbasara ebubo a na-ebo ndị mere ka ndị ụlọọrụ ikike diri onye na-che na ha bụ Mohammad Ghobadlou, Manouchehr Mehman Navaz, Mahan Sedarat Madani, Mohammad Boroughani na Sahand Nourmohammad-Zadeh. .

    Ha kwukwara na ndị a so na opekatampe ihe ruru mmadụ iri abụọ na otu ejidere maka ebubo imegide iwu metụtara nchekwa nke iwu okpukperechi ụka alakụba bụ ‘Sharia’ nyere ka ntaramahụahụ ya bụrụ ikpe ọnwụ. Iwu Sharia na-enye ndị a ikpe ọnwụ site n’usoro ịda iwu a na-akpọ ‘ibu agha megidi Chukwu’ nakwa ‘imetọ uwa’.

    Ihe ruru, ndị ngagharịiwe mmadụ 348 anwụọla dịka anwụchirila ihe ruru mmadụ 15,900 ndị ọzọ kemgbe ndị ọrụ nchekwa malitere ibuso ha agaha ma na-akpọ ha ndị “ọgba aghara”.

  4. ‘O nwereike ịbụ ogbunigwe mba Ukraine dara na Poland’ – Nato

    Jens Stoltenberg bụ odeakwụkwọ otu jịkọrọ ọtụtụ mba Europe bụ Nato n’ịchafụ ekwuola na nnyocha ha na-egosi na o nwereike ịbụ ogbunigwe mba Ukraine bụ ihe dara na Poland na Tuzde ma gbuo mmadụ abụọ.

    Mana o gara n’ihu taa Russia ụta ma kwuo na ọ bụ n'ihi mwakpo Russia n’Ukraine bụ ihe tinyere onye ọbụla n’ọnọdụ a.

    Ukraine n'onwe ya na-aga n'ihu na-ekwu na ọ bụ Russia gbara ogbunigwe ahụ n'ezie.

    Onyeisiala Ukraine bụ Volodymyr Zelensky kwuru na nkwupụta ya n’ihe onyonyo o zipụtara "Enweghị m obi abụọ n’okwu a, ihe a abụghị ogbunigwe anyị.”

    "Ekwenyere m na nke a bụ ngwa agha ndị Russia, dịka ndabere n’ozi ndịagha anyị siri kwuo."

    O kwuru na ọ dị mkpa ka a hapụ Ukraine ka o sonye na nyocha nke ogbunigwe ahụ gbara n'otu ugbo dị na Przewodow, nke nọ n’ihe dịka kilomịta asaa nso okeala ha.

    Ukraine hibere nchekwa ikuku pụrụiche n’ụbọchị Tuzdee mgbe Russia tuchapụrụ oke ogbunigwe nke a na-eche kachi ibu kemgbe mwakpo ha n’Ukraine malitere n’ụbọchị 24 nke ọnwa Febụwarị.

  5. Ọkwa onyeisiala m na-azọ abụghị maka okpukperechi - Tinubu gwara CAN

    Aka chịburu Legọs Steeti bụ Bola Tinubu akọwaara ndị otu 'Christian Association of Nigeria' ihe kpatara o ji họrọ osote ya bụ Kashim Shettima, onye bụkwa onye okpukperechi 'Islam' dịka ya onwe ya bụ Tinubu bụkwa onye alakụba.

    Tinubu kwuru nke a n'ọgbakọ ya na ndị otu CAN nwere taa bụ Wenezde n'Abuja.

    O kwuru na ya bụ onye kwenyere na onye ọbụla nwere ikike ịhọrọ okpukperechi ọbụla dị ya mma.

    "Ana m azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa, ọbụghị n'ihi okpukperechi kama ọ bụ irube isi n'iwu Naịjirịa. Ya mere m ji ekele ụnụ maka ịkpọ m oku maka mkparịtaụka a," Tinubu kwuru.

    "Ekwenyere m na ọ dị mkpa gọọmentị inye onye ọbụla ohere okpukperechi dị ya mma, dịka m mere na Legọs steeti site n'inyeghachi ụlọakwụkwọ dị icheiche n'aka ndị ụka nwe ya. Onweghị mgbe m ji chụpụ ndị mmadụ na Legọs."

    "Ihe mere m ji họrọ Shettima dịka osote m bụ n'ihi oke mkpa chere Naịjirịa n'ihu ugbua, maka na ama m na Shettima bụ ezigbo onye ndu dịka o gosipụtara mgbe ọ bụ gọvanọ na Borno steeti."

    "Achọrọ m gọọmentị na-aga n'ihu, ọ bụ ya mere m ji họrọ Shettima."

    "Ọ gaara adịrị mụ mfe ịhọrọ onye okpukperechi Christ, mana nke ahụ abụghị isi okwu. Anyị nwere ọtụtụ mkpa na-echere anyị aka mgba nke na-abụghị ihe okpukperechi ga-eme, kama ọ chọrọ onye kacha mara ọrụ."

    N'okwu nke ya, onyeisi CAN bụ Achbishọpụ Daniel Okoh kwuru na ihe ha ji kpọọ ndị na-azọ ọkwa onyeisiala oku bụ iji nye ha ohere ka ha bịa kọwaa etu a ga-esi gboo ọtụtụ mkpa na-echere Naịjirịa aka mgba ugbua.

    "Dịka otu jikọrọ ndị okpukperechi Kraịst, anyị kwenyesiri ike n'obodo a bụ Naịjirịa, ma na-ekpekwa ekpere oge niile maka ịdịkọnotu, udo na ọganihu n'ime ya," Daniel Okoh kwuru.

  6. Naịjirịa na Pọtụgal ga-ezute onwe ha n'asọmpi enyi na enyi

    Ndị otu 'Super Eagles' nke Naịjirịa na ndị otu bọọlụ mba Pọtụgal ga-ezute onwe ha n'asọmpi enyi na enyi n'elekere asaa na ọkara nke uhuruchi ụbọchị Tọzde, Nọvemba 17, 2022.

    Pọtụgal ga-eji asọmpi a kwadoo nke ọma maka iko mbaụwa nke ga-amalite n'ụbọchị Sọnde na mba Qatar.

    Naịjirịa agaghị eso n'asọmpi a, otu bọọlụ nke mba Ghana gbapụrụ Naịjirịa n'asọmpi ntozu oke maka iko mba ụwa afọ 2022.

    Pọtụgal ga-ezute mba Ghana, Uruguay na South Korea n'otu H nke asọmpi a.

    Ndị Naịjirịa ga-eso gbaa asọmpi a:

    Ochee bọọlụ: Maduka Okoye, Francis Uzoho, Adebayo Adeleye

    Ndị na-agba azụ: William Ekong, Olisa Ndah, Calvin Bassey, Kevin Akpoguma, Chidiebube Duru, Tyronne Ebuehi, Bruno Onyemaechi, Bright Osayi Samuel

    Ndị na-agba etiti: Joseph Ayodele-Aribo, Alex Iwobi, Wilfred Ndidi, Frank Onyeka, Oghenekaro Etebo

    Ndị na-agba ihu: Moses Simon, Samuel Chukwueze, Ademola Lookman, Terem Moffi, Paul Onuachu and Emmanuel Dennis

    Ndị Pọtụgal ga-eso gbaa asọmpi a:

    Ochee bọọlụ: Diogo Costa, Jose Sa, Rui Patricio

    Ndị na-agba azụ: Diogo Dalot, Joao Cancelo, Danilo Pereira, Pepe, Ruben Dias, Antonio Silva, Nuno Mendes, Raphael Guerreiro

    Ndị na-agba etiti: Joao Palhinha, Ruben Neves, Bernardo Silva, Bruno Fernandes, Joao Mario, Matheus Nunes, Otavio Monteiro, Vitinha, William Carvalho

    Ndị na-agba ihu: Andre Silva, Cristiano Ronaldo, Goncalo Ramos, Joao Felix, Rafael Leao, Ricardo Horta

  7. Ndị omeiwu Ekiti Steeti enwetala onyeisi ọhụrụ

    Ndị omeiwu Ekiti Steeti ahọpụtala Gboyega Aribisogan, na-anọchite anya Ikole 1, dịka onyeisi ọhụrụ ha.

    Cheta na onye bụbụ 'Speaker' nke ụlọomeiwu Ekiti Steeti bụ Funminiyi Afuye lara mmụọ n'ụbọchị 19 nke ọnwa Ọktoba afọ 2022.

    N'ọgbakọ ndị omeiwu ahụ nwere taa bụ Wenezde, Nọvemba 16, Aribisogan meriri Olubunmi Adelugba, iji bụrụ onyeisi ọhụrụ.

    Tupu oge a, Aribisogan bụbu onyeisi kọmiti na-ahụ maka ngalaba agụmakwụkwọ n'Ekiti Steeti.

  8. Sineti Naịjirịa enyela CBN nkwado ka a gbanwee akwụkwọ Naịjirịa

    Ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa enyela ụlọakụ etiti nkwado ka ha gaa n'ihu gbanwee akwụkwọ ego N200, N500 na N1000.

    Cheta na onyeisi CBN bụ Godwin Emefiele kwuru na mgbanwe akwụkwọ ego a ga-amalite n'ụbọchị 15 nke ọnwa Disemba.

    N'ọgbakọ ndị Sineti n'ụbọchị Wenezde, ụfọdụ ndị omeiwu kwuru na atụmatụ mgbanwe akwụkwọ ego naịra dị mma, mana oge ụlọakụ etiti nyere maka ya pere mpe.

    Ụfọdụ n'ime ndị omeiwu ahụ jụkwara etu atụmatụ a ga-esi metụta ndị nkịtị na-enweghị akara ọbego ụlọakụ, nakwa etu ọ ga-esi metụta ọnọdụ akụnụba Naịjirịa na mgbali elu ọnụego ngwaahịa.

    Ndị omeiwu a chọrọ ka Godwin Emefiele kọwakwuoro ha nke ọma maka ihe ndị a niile.

    N'ihi nke a, ndị omeiwu a nyere kọmiti ha na-ahụ maka ọrụ ndị ụlọakụ iwu ka ha tinye anya nke ọma n'atụmatụ a CBN wepụtara ma hụ na ọ taghị ụmụ Naịjirịa ahụhụ oge ọ ga-amalite ọrụ.

  9. Sierra Leone etinyela ya n'iwu ụmụnwaanyị oke otu n'ime atọ ndị omeiwu mba ahụ

    Ụlọomeiwu mba Sierra Leone etinyela n'iwu mba ahụ na ụmụnwaanyị ga-abụ oke otu n'ime atọ ndị omeiwu mba ahụ nakwa ndị kaụnselọ ha.

    Nke so na nkwa ha kwere n'-achụmta vootu n'afọ 2018.

    Ihe ọ fọrọ ugbua bụ ka onyeisiala mba ahụ bụ Julius Bio binye aka n'iwu ahụ.

    Ugbua, mba ahụ nwere naanị ụmụnwaanyị 19 n'ime ndị omeiwu 146 n'ụlọomeiwu ha.

  10. Ogbunigwe a na-arụ Russia aka na ha tụrụ adaala na Poland

    Mmadụ abụọ anwụọla dịka ogbunigwe a na-ebo Russia ịtụ dara n’akụkụ mba Poland nke nọ sọ oke ala Ukraine n’ụbọchị Tuzde mana Russia ekwuola na ọ bụghị ha tụrụ ya.

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Bin ekwukwala na o dichaghị ka ọ bụ Russia tụrụ ya bụ ogbunigwe dịka ndị isi ọchịchị ụwa na-akpo oku ka e hie asaa n’anya na nnyocha ebe ya bụ ogbunigwe si.

    Minista nchekwa mba Russia gbara ama na aka ha adịghị na ya bụ ihe ma boo ebubo na ndị na-ekesa akụkọ a ma ụma ekesa ya iji kpalite ọgbaghara dịka onyeisiala Poland bụ Andrzej Duda kwuru na enwebeghị ihe ịgbama ọbụla gosiri ebe ya bụ ogbunigwe si kpọm kwem.

    Cheta na mba Russia tụrụ otu ogbunigwe a na-ekwu kacha ibu n’Ukraine n’ụbọchị Tuzde dịka ya bụ ogbunigwe metụtara akụkụ isi obodo Ukraine bụ Kyiv ma gbuo opekatampe otu onye.

  11. Russia ejila iwe jụ oku ka ha kwụọ ụgwọ ihe agha mebiri na Ukraine

    Mba Rọshịa ajụla ikwụ ụgwọ ihe agha ha na-ebu mba Yukren mebiri dịka e kpebiri na ọgbakọ United Nation nke ndị isi ala mba dị iche iche nwere.

    Onụ na-ekwuru mba RọshịaDmitry Peskov kwuru na mba dị dị n’Ọdịọ̄a Anyanwụ Yurọp na-achọ izu ha ohi anyaọcha, na ha agaghị enye ohere ka ha weghara akụ Rọshịa nwere na mba ndị ọzọ.

    Mkpebi United Nation nke mba 94 n’ime 193 binyere aka bụ “ Rọshịa ga-ata ahụhụ nile metụtara iwu maka ndajọ nile nakwa ihe mmebi n’ile ha metara.

    Mkpebi ahụ gụnyere alo ka ndị mba ndị dị n’otu UN nyere Yukren aka idekọ ihe akaebe megide Rọshịa.

    Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky nabatara mkpebi.

    Onye nnnọchite anya RỌshịa n’ọgbakọ UN bụ Vassily Nebenzia kwuru na mkpebi ahụ bụ nkịtị nkịtị ma bo mba ndị dị n’Ọdịda Anyanwụ Yurop ebubo ime ka nsogbu dị n’etiti Rọshịa na Yukren kawanye njọ.

    Mba 14 gụnyere Rọshịa, Iran na China akwadoghị mkpebi ahụ e nwere n’ọgbakọ Ukwu United Nations, ebe ndị ọzọ atụnghị vootu ma ọlị. Na-agbanyeghị na n’Oktoba mba 143 katọrọ Rọshịa maka mwakpo Yukren.

  12. Ndewoonụ o!

    Ndeewoo, Igbo ndị ọmma, anyị ji eje mba!

    Taa mara ụnụ nile mma!

  13. G20 Summit: Okwu nri, ịkpa udo bụ okwu akpụ n'ọnụ n'ọgbakọ a

    Ọgbakọ G20 na-aga n'ihu ugbua na Bali, Indonesia, ihe ọtụtụ ndị isi mba dị iche iche bịara ọgbakọ ahụ na-ekwu bụ etu a ga-esị hụ na e gboro nsogbu ụkọ ihe oriri nke agha Rọshịa na-ebu Ukraine butere.

    Onyeisiala mba India bụ Naverenda Modi kporo oku ka a chịsa ngwa agha laghachi na ịkpa udo na Yukren.

    N'ọgbakọ pụrụ icher e mere maka nchekwa ihe oriri na na nzukọ G20, Modi tụrụ arịrị na usoro e si ekesa ihe n'ụwa adakpọọla n'ihi nsogbu mgbanwe ihu igwe, ọrịa Covid-19 nakwa agha na-aga n'ihu na Yukren.

    Modi sịrị,“Na Sernturi gara aga, ndị ndu ụwa oge ah a lụchara Agha Ụwa nke Abụọ kpebiri na udo ka mma. Ugbu a o ruela oge nke anyị."

    N'ụbọchị Monde, Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden kwuru na ya anaghị ele anya na nghọtahie dị n'etiti Amerịka na Chaina, na agaghị ekwe ọgụ 'Cold War' ọhụrụ. ebe onyeisiala Chaina bụ Xi dọrọ Amerịka aka na ntị ka ha ghara imekarị onwe ha nn'okwu Taiwan.

    Ọgbakọ G20 na-abịa dịka Chaina na mba Amerịka na-ese okwu banyere Taiwan. Chaina na-ekwu na Taiwan so bụrụ ebe ha nwe mana Taiwan na-ahụ onwe ha dịka mba kwụrụ onwe ya.

    Gịnị bụ G20?

    G20 pụtara 'Group of Twenty" na Bekee.

    Ọ bụ otu njịkọrọ mba 20 gụnyere: Ajentina, Ọstrelia, Brazil, Kanada, Chaina, Fransị, Jamini, India, Indonesia, Italy, Japan, Repụlik nke Korea, Mexico, Rọshịa, Saudi Arabia, Saụt Afrika, Tọki, Briten, Amerịka nakwa otu 'European Union'.

  14. Ụnụ asaala chi?

    Igbo mma mmanụ!

    Onye biri, ibe ya biri.

  15. Mmadụ isii anwụọla n’ogbunigwe gbara na Turkey

    O pekata mpe mmadụ isii anwụọla, ebe mmadụ 81 merụ®ụ ahụ n’ogbunigwe gbara n’ebe na-ekwokarị egwo na Instabul, isiobodo Turkey.

    Ogbunigwe ahụ gbara n’ebele ka o ji Elekere iri nabụọ gafee Elekere anọ nke Ehihie ụbọchị ụka n’ebe Taksim Square.

    A nwụchiela otu onye a na-enyo n’aka ya dị na ya bụ ọdachi dịka minista na-ahụ maka ihe na-eme na ụlọ nke mba ahụ bụ Suleyman Soylu si kwuo.

    O bokwara otu Kurdistan Workers' Party (PKK) ebubo na aka ha dị na ime mere. PKK bụ otu nnupisi na-akpo oku ka e si na Turkey kewapụta mba ndị Kurd.

    Minista na-ahụ maka ikpe na mba ahụ Bekir Bozdag gwara ndị ntaakụkọ mmba ahụ na o nwere out nwaanyị dọnọrọ ala n’oche ihe karịrị nkeji 40,bilie pụọ nwa oge tupu ogbingwe ahụ gbaa.

    Onyeisiala Turkey bụ Recep Tayyi Erdogn kwuru na a ga-atarịrị ndị aka ha dị na ya bụ ihe ahụhụ.

    Onye ntaakụkọ BBC nọ ebe ahụ bụ Orla Guerin, kwuru na ndị uweojii akwụjuola n’ebe okporo Istiklal Street, ma gbochie ya ka mmadụ ghara ịga. , ebe ụgbọelu helikọpta na-efeghjarị dịka ndị ụgbọ enyemaka ahụike (ambulance nabịa na-apụ.,

    Ndị nwere ọdọahịa nan so ebe ahụ kwụcha n’ọnụ ọdọahịa na mgbagwoju anya. Dịka ihe mere ka gbara ọtụtụ gharịị.

    Otu onye nọ nso ebe ihe mere kwuru sị, na ọgbaghara dara ka ya bụ ogbunigwe dara.

    “ Ahụrụ m ọtụtụ ndị mmadụ ka ha na-agbagharị, ndị merụrụ ahụ ji ọsọ agbaga ụlọọgwụ.”

  16. Ụnụ asaala chi

    Igbo ndị ọma anyị ji biri, ụnụ asaala chi?

    Soro anyị n'ebe maka akụkọ ndị mkpa taa.

  17. Otu nwoke onye mba Iran biri n’ọdụ ụgbọelu mba France ruo afọ 18 anwụọla

    Nwoke a aha ya bụ Mehran Karimi Nasseri malitere ibi n’ime ọdụ ụgbọelu nke Paris n’afọ 1988 maka okwu nọ n’etiti mba ya na mba ahụ banyere ikike ya ibi maọbụ mme njem ebe ahụ.

    Ihe nwoke a gabigara n’oge obibi ya n’ime ọdọ ụgbọelụ Roissy Charles de Gaulle mkpalitere mmụọ ọtụ nke mere e ji nwere akụkọ ndụ ya mee ejije n’afdọ 2014 bụ ejije a kpọrọ “The Terminal” nke onye ejije Hollywood a ma ama bụ Tom Hanks so mee.

    Otu onye na-arụ n’ụlọọrụ ọdọ ụgbọelu ahụ gwara ndị ntaakụkọ AFP na e mechara ya Nasseri ikike ibi na mba France mana ọ lọghachịtere biri n’ime ọdọ ụgbọelu bụ ebeo mechara nwụọ ọnwụ chi ya.

    Amụrụ Nasseri n’afọ 1945 na mpaghara Khuzestan nke mba Iran, mana ọ batara mba Europe izizi ya ịchọ nne ya.

    Ọ nọrọ afọ ole na ole na Belgium, ebe a chụpụrụ ya ma chụpụkwa ya na mba ndị ọzọ gụnyere UK, Netherlands na Germany maka enweghị akwụkwọ ikike njem nke mbata na ọpụpụ ziri ezi.

    Dịka o nweghi ike mezuo atụmatụ ime njem ya, ọ wụbara mba France, ebe o oji ọdụ ụgbọelu mba ahụ mere ebe obibi ya.

    Akụkọ ndụ ya na etu o siri biri n’ebe ahụ ratara ọtụtụ ndị mmadụ nke gụnyere onye na-ahazị ejije Hollywood bụ Stephen Spielberg, dịka ọ ji ndụ ya mere ejije.

    Mgbe e wepụtara ejije ahụ n’ọha, ndị ntaakụkọ malitere iwuju n’ime ọdụ ụgbọelu ahụ dịka ha na-agba nwoke ahụ ajụjụ ọnụ.

    N'agbanyeghị na e nyere ya ikike ibi na mba France dịka onye ịgbara ọsọ ndụ n’afọ 1999, ọ nọrọ n'ọdụ ụgbọelu ahụ ruo 2006, mgbe a kpọgara ya n'ụlọọgwụ ka e gwọọ ya ihe na-arị ya.

    O ji ego o nwetara n’ihe ejije ahụ biri n'ụlọ mbikọ na nsọ ebe ahụ dịka akwụkwọ akụkọ mba France bụ́ Libération siri kwuo.

    Mazị Nasseri laghachiri n'ọdụ ụgbọ elu izu ole na ole gara aga, ebe o bi ruo mgbe ọ nwụrụ, onye ọrụ ọdụ ụgbọ elu kwuru.

    Ahụrụ ya na ọtụtụ puku euro n'aka ya, otu onye ọrụ gọọmentị siri kwuo.

  18. Ihe dịka ogbunigwe gbapuru na Turkey egbuola ihe ruru mmadụ anọ

    Gọvanọ obodo Turkey ekwuola na opekatampe, mmadụ anọ anwụọla dịka ọtụtụ mmadụ merụrụ ahụ ebe ihe dịka ogbunigwe gbara n’Istanbul.

    Ebe ihe a gbara bụ ebe ọtụtụ ndị mmadụ na-agbakọ ma na-agbafekwa n’obodo ahụ.

    Ali Yerlikaya kwuru n’akara Twitter na ya bụ ihe gbara mere n’ebe etiti ehihe n'okporoụzọ dị ọdụahịa nke mpaghara Taksim Square.

    Amabeghị ihe kpatara ya bụ ihe gbawara dị ogbunigwe dịka n'ọtụtụ ndị mmadụ setere ya n’ihe onyonye ha ma na-ekesa ya na soshal midia ha ugbua.

    Ndị ọrụ gbatagbata awụchiela ebe ihe a mere.

    Onye ntaakụkọ BBC n’ebe ahụ bụ Orla Guerin, kwuru na enwere nnukwu ndị uw ojii nọzị akụkụ ebe ahụ gburugburu ọkachasị n’ama Istiklal Street, bụ nke agbachiri ụzọ ya ugbua.

    Ụgbọelu helịkọpta nọ na-efegharị n'elu ebe ahụ dịka ụgbọala eji egbu ndị ihe ọdachị zutere na-agagharị ebe ahụ maka ndị ya bụ ihe ọdachị metụtara.

    Cheta na ọkporoụzọ a nke na-azụ ahịa na-ejupụtakarị n’ime ya bụ ebe otu onye nyi ogbunigwe n’ahụ gbapuru ya ma gbuo onwe ya ebe ahụ n’afọ 2016.

    Akụkọ ka na-abịa.

  19. Ụgbọelu agha abụọ akụkatala isi ọnụ na Dallas mba Amerịka

    Ụgbọelu agha abụọ eji lụọ agha ụwa nke abụọ akụkọtala isi ọnụ n'emume ngosi ndị ụgbọelu e mere na Texas steeti nke US, ma gbuo mmadụ isii.

    N’ihe onyonyo gbara na soshal midia, a hụrụ ka ụgbọelu abụọ ahụ kụrụ onwe ha dịka otu gbajiri nke ọzọ n’ụzọ ọkara abụọ. Ihe ononyo ahụ gosikwara ka otu n’ime ha gbapụrụ dịka ogbunigwe ma nwuru ọkụ ka ọ na-akụ n'ala.

    Otu n'ime ụgbọelu ahụ bụ nke ụdịrị ‘Boeing B-17 Flying Fortress’- so emee ngosi ikuku e mere maka ụbọchị ncheta ndị agha aka ochie n’akụkụ Dallas.

    Ndị ọrụ gbatagbata nke mmenyụ ọkụ kwuru na ọ nweghị onye mmerụ ahụ n'etiti ndị mmadụ nọ n'ala na-agba ya bụ emume nkiri.

    Otu onye ọkaikpe si mpaghara Dallas bụ Clay Jenkins dere n’akara Twitter ya n’ụbọchị Sọnde:

    "Dịka onye nyocha ahụike anyi si kwuo, enwere ọnụọgụ mmadụ isii nwụrụ site na ihe ọdachị ahụ mere ụnyaahụ.”

    Otu ndị ọkwọ ụgbọelu nke Allied Pilots Association kwuru na Terry Barker na Len Root – bụ mmadụ abụọ n'ime ndị otu ha n’oge gara aga - so na ndị nwụrụ n'ihe mberede ahụ.

    Otu onye nọ ebe ihe a mere bụ Chris Kratovil – nke so n’ime agbata 4,000 na 6,000 ndị mmadụ gbakọtara emume ahụ na Satọde - gwara BBC na ọ hụbeghị ka igwe mmadụ nọ na-enwe aṅụrị si daa juu n’otu ntabi anya.

  20. Akụkọ na anyị na-enyocha Tinubu bụ akụkọ ụgha-Inec

    Ụlọọrụ gọọmentị na-ahazị ntuliaka bụ Inec ekwuola na akukọ na-efegharị nke kwuru na ha na-enycha onye na-azọ ọkwa onyeisiala n’aha otu APC bụ okpotokpo asị.

    Inec kwuru na akụkọ ahụ na-efegharị kwuru na Inec na ụlọikpe mba Amerịka jikọrọ aka na-enyocha ma mkpebi e nyere ka Tinubu ka ọ kwụghachi goomenti mba ego a si si na ire ọgwụ ikeo megidere iwu ntuliaka Naijiria bụ ọrụ aka ndị ọchọnganoko.