Ihe ndị uweojii kwuru maka nwoke sị na a tọrọ ya n'ụzọ Lekki-Ikoyi, Legọs
Ndị uweojii Legos steeti ekwuola na ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia nke gosiri otu nwoke pu apa nakwa ọnya ndị na-agba ọbara n’ihu ya ma sị na a tọọrọ ya n’ụzọ Lekki-Ikoyi bụ ụgha
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Benjamin Hundeyin kwuru nke a ma kọwa na nnyocha ha kụchapụrụ ya bụ ebubo ma rịọ nwoke ahụ ka ọ bịa zaa ihe ọ sị mere n’ezie.
Hundeyin gara n’ihu gwaa ọha ndị mmadụ ka ha ghara ịtụ ụjọ ma na-aga mkpa ha etu ha siri chọọ ma hapụ ige ndị na-ebugharị akụkọ mmanja ntị.
Cheta na n’ihe onyonyo a malitere ifesa na soshal midia n’izu ụka a gosiri ebe otu nwoke nọ n’ihu ya bụ ihe onyonyo na-akọ ihe etu ndị ọ sị bụ ndị ntọ na ndị omekome siri zube ịtọrọ ya.
O kwuru na ọ rịọrọ ha ka ọ nye ha ego maọbụ ekwentị ya mana ha jụrụ dịka ha sị na ha ga-ebu ya ma bọkasịa ahụ ya.
Ya bụ nwoke kwuru na e mechara tọhapụ ya n’ọnụ akwa mmiri Adeniji Bridge dịka o kwuru na e gburu ya mma aghara aghara.