You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Agha Ukraine: Onye enyemaka Zelensky na-ekwu na ihe ruru mmadụ 13,000 anwụọla

Nke so agha malitere n'Ukraine kemgbe Febụwarị mgbe ndị agha Russia malitere iwakpo ha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ihe ndị uweojii kwuru maka nwoke sị na a tọrọ ya n'ụzọ Lekki-Ikoyi, Legọs

    Ndị uweojii Legos steeti ekwuola na ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia nke gosiri otu nwoke pu apa nakwa ọnya ndị na-agba ọbara n’ihu ya ma sị na a tọọrọ ya n’ụzọ Lekki-Ikoyi bụ ụgha

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Benjamin Hundeyin kwuru nke a ma kọwa na nnyocha ha kụchapụrụ ya bụ ebubo ma rịọ nwoke ahụ ka ọ bịa zaa ihe ọ sị mere n’ezie.

    Hundeyin gara n’ihu gwaa ọha ndị mmadụ ka ha ghara ịtụ ụjọ ma na-aga mkpa ha etu ha siri chọọ ma hapụ ige ndị na-ebugharị akụkọ mmanja ntị.

    Cheta na n’ihe onyonyo a malitere ifesa na soshal midia n’izu ụka a gosiri ebe otu nwoke nọ n’ihu ya bụ ihe onyonyo na-akọ ihe etu ndị ọ sị bụ ndị ntọ na ndị omekome siri zube ịtọrọ ya.

    O kwuru na ọ rịọrọ ha ka ọ nye ha ego maọbụ ekwentị ya mana ha jụrụ dịka ha sị na ha ga-ebu ya ma bọkasịa ahụ ya.

    Ya bụ nwoke kwuru na e mechara tọhapụ ya n’ọnụ akwa mmiri Adeniji Bridge dịka o kwuru na e gburu ya mma aghara aghara.

  2. Ụlọọrụ Inec amachiela ịchụ nta vootu n’ụlọ okpukperechi

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka bụ Inec amachiela ndọrọ ndọrọ ọchịchị ịchụnta nta vootu n’ụlọ okpukperechi ọbụla.

    Nke a dị n’akwụkwọ ntuziaka maka usoro ntuliaka ụlọọrụ Inec wepụtara dịka ọ fọrọ naanị ọnwa atọ ka oge ntuliaka ruo.

    Ụfọdụ iwu dị n’akwụkwọ a gụnyere;

    Inec sị ka onye ọbụla na-azọ ọkwa ọchịchị anwakwala anwa gaa n’ụlọ okpukperechi ọbụla ịchụnta vootu.

    Onye akọkwala ibe ya ọnụ maọbụ kwuo okwu akpọmaasị megide ibe ya n’oge achụmnta vootu.

    Onye ejikwala ngwa ọgụ n’ụdị ọbụla aga n’ọgbọ ebe a na-achụnta vootu, naanị ndị nwereike ime nke a bụ ndị ọrụ nchekwa.

  3. Etu ụgbọala si kugbuo ndị ọrụ 'Road Safety' abụọ n'ụzọ Aba

    Ụlọọrụ na-ahụ maka nchekwa okporoụzọ maka ndị njem bụ Road Safety agbarụọla ihu etu ndị ọkwọ ụgbọala si akụgbusi ndị ọrụ ha na-arụ ọrụ n’okporoụzọ.

    Nke a na-abịa dịka ụgbọala gwongworo kugburu ndị ọrụ ha abụọ n’ụzọ si Ikot-Ekpene gawa Aba n’ụbọchị Fraịde.

    Onye na-arụ ọrụ ka onyeisi ụlọọrụ a bụ Dauda Ali Biu katọrọ agwa ndị ọkwọụgbọala a ma ṅụọ iyi na a ga-achọta onye kpara arụọ ma taa ha ahụhụ.

    Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ a bụ Bisi Kazeem kwuru na ọkwọụgbọala ahụ ji ọsọ dị egwu na-agba nke mere na mgbe ọ chọrọ izere olulu dị n’ụzọ ka ọ kụgburu ndị ọrụ ha abụọ.

    O kwuru na ihe mberede ahụ metụtara mmadụ asatọ, abụọ n’ime ha nwụrụ pịị, abụọ merụrụ ahụ ebe anọ enweghi mmerụ ahụ ọbụla.

    Onyeisi ụlọọrụ a tiri ezinaụlọ ndị ọrụ nwụrụ anwụ aka n’obi ma kwee nkwa na-aka ga-akpara ndị ọkwọụgbọala dara iwu okporoụzọ.

  4. Vladimir Putin etiela ndị nne ụmụ ha nwụrụ n'agha aka n'obi

    Onyeisiala mba Russia bụ Vladimir Putin etiele ezinaụlọ ndịagha mba ha na-alụ agha na mba Ukraine aka n’obi ma ndị nwụrụ ma ndị ka dị ndụ.

    Putin kwuru nke a na nzukọ ya na ụfọdụ ndị nne ruru isi na asaa nwere n’ụlọ ya dị n’akụkọ Moscow na Fraịde.

    Putin gwara ezinaụlọ ndị a na ọ maara ihe ha na-agabiga kama na ọ gaghị akpọghachinwu ụmụ ha ndị nwụrụ anwụ.

    “Achọrọ m ka unu mara na mụ onwe m na ndị ndu mba anyị maara ihe unu na-agabiga.”

    Ọ gwara otu onye nne na nwa ya “emezuola ebumnobi ya” na “ọnwụ ọ nwụru abụghị n’efu”.

    Nke a na-abịa dịka ọtụtụ ndị nne ndịagha mba Rọshịa na-ekwu na e zipụrụ ụmụ ha n’ihu agha na-enyeghi ha ezi ọzụzụ maọbụ ezi ngwa agha nakwa uwe nchekwa maka oyi.

    Ihe ruru ndị agha Rọshịa mmadụ otu puku narị nakwa ndị agha Ukraine otu ọnụọgụgụ ahụ anwụọla maọbụ merụọ ahụ kamgbe agha ahụ malitere na 24 Febụwarị, 2022 dịka onyeisi agha mba Amerịka bụ Mark Milley si kwuo.

  5. Ụkọ mmanụ ụgbọ nwereike ịdị ruo oge Ekeresimesi - IPMAN

    Otu jikọtara ndị na-ere mmanụụgbọala na Naịjirịa bụ IPMAN n’ịchafu ekwuola na ụkọ mmanụụgbọala dị ugbua nwere ike ịnọ ruo oge Ekeresimesi.

    Onyeisi otu nke mpaghara South West bụ Tajudeen Adigun sị na ihe kpatara ya bụ nammanụụgbọala ụlọọrụ NNPC na-ebubata n’oge anaghị ezu ikesa mmadụ niile.

    Cheta na nso nso, a malitere inwe kpachi kpachi n'ọdọ ebe a na-ere mmanụ ụgbọala, ọkachasị na Legọs nakwa Abuja.

    Nke a mere ọtụtụ ndị na-ere mmadụ ụgbọala a ji ebuli ego ya elu site n'ihe dịka otu narị naịra na iri asaa gawa ihe ruru narị naịra abụọ maọbụ karịa.

    Adigun kwuru na ihe na-ebute ụkọ mmanụ a bụ ụkọ ụgbọmmiri a kpọrọ 'daughter vessels' e ji ebupụta mmanụ ụgbọala e bubatara na Naịjirịa site n'oke osimmiri.

    Ọ kwuru site n'etu mmiri si taa ugbua, na nnukwu ụgbọmmiri bụ 'mother vessels' na-ebu mmanụ agaghị erutenwu nso ọfụma nke mere na a ga-eji ụgbọmmiri nta 'daughter vessel' ebute mmanụ ndị a nso.

    Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụrụ na e gboghi nsogbu ndị a na ụkọ mmanụ ụgbọala a ga-erucha ngwụcha ọnwa Disemba.

  6. Mụ na Peter Obi bụ nwanne, o nweghi ihe na-esere anyị - Gọv. Soludo

    Gọvanọ Chukwuma Soludo nke Anambra Steetị ekwuola na o nweghi esemokwu ọbụla dị n’etiti ya na Peter Obi ji aha Labour pati azọọkwa Onyeisiala Naịjirịa.

    Soludo kwuru na ya na Obi bụ nwanne na oge na-adịghị anya na ha ga-anọkọọnụ ma kpazie olu n’okwu ndọrọ ndọrọọchịchị.

    Cheta na Soludo na Obi zutere na nso nso mgbe ha gara emume ịtụ mmamma nke Bishọp Paulinus Ezeokafor n’ụka ST. Patricks Katọlik dị n’Awka.

    Soludo kwuru “onweghi ihe na-esere mụ na Obi, o nweghi onye naara nwunye ibe ya, ihe mere bụ na uche anyị banyere ndọrọ ndọrọ dị iche. O nweghi ihe ọzọ.

    “Maka ndị na-asị na ma riri aka azụ iji katọọ, ha biko wete ya bụ ego ka anyị were rụọ ụzọ. Ọ bụrụ na m na-eri aka azụ akaara m ịbụ ide ji ego ugbua.

    “N’ihe banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị mụ na Obi ekwekọrịta ịnọkọ n’izụụka ole na-abịa ka anyị gbazie olu banyere okwu. Anyị ga-emete ya ọfụma. Anambra bụ nke mmadụ niile.”

  7. Igbo ndị ọma e ji eme ọnụ unu abọọla chi?

    Daalụ nụ maka nkwado unu.

    Ngwa butezie oche ka anyị gbaa gị ụkwụ n'eze maka ihe na-eme n'ụwa na ngwụcha izuụka a.

  8. Gọọmentị mba Uganda emechiela ụlọakwụkwọ n’ihi ọrịa ebola

    Gọọmentị mba Uganda emechiela ụlọakwụkwọ ha taa bụ Fraịde 25 Nọvemba 2022 dịka ọ fọrọ izuụka abụọ ka agụmaakwụkwọ nke afọ a kụrụọnụ maka ezumike Ekeresimesi.

    Ha kwuru na mkpebi imechi ụlọakwụkwọ n’oge a bụ iji belata mfesa ọrịa Ebola na-anyụ ha ịkpakwụ ugbua.

    Mkpebi a mgbagwojuru ọtụtụ ndị mmadụ anya maka na gọọmentị kwuburu na udo dị ka onye ọbụla atụla egwu banyere ọrịa a.

    Cheta n’ihe dịka ọnwa abụọ, mmadụ iri ise na ise anwụọla site n’ọrịa ọjọọ a. A na-echekwa na ihe ruru mmadụ iri abụọ anwụbuola n'ọrịa tupu gọọmentị achọpụta.

  9. O nweghi onye ọbụla na-azọ ọkwa Onyeisiala anyị na-akwado - CAN

    Otu jikọtara ndịụka Kraịst na Naịjirịa bụ Christain Association of Nigeria (CAN) ekwuola na o nweghi onye ọbụla n’ime ndị na-azọọkwa Onyeisiala Naịjirịa ha na-akwadọ.

    Onyeisi ha bụ Achịbishọp Daniel Okoh kwuru nke a dịka ha na ndị na-azọọkwa a nwechara mkparịtụka pụrụiche na nso nso a.

    O kwuru na mkpebi a ha mere bụ maka nnabata onye ọbụla na-agbanyeghi agbụrụ, okpukperechi nakwa mpaghara onye ọbụla si.

    O kelekwara ndị niile na-azọ ọkwa a maka ịbịa zaa ndị ụka Kraịst oku mgbe a kpọrọ ha, ma kọwaa na nnukwute ọrụ cheere onye ọbụla ga-emeri n’ime n’ihu.

    O kpeere ha ekpere ọganihu na nchekwa dịka ha na-achụnta vootu n’ime ọnwa atọ na-abịa abịa ma kwee nkwa na ndị CAN ga na-ekpe ekpere maka ntuliaka udo.

  10. Anyị ka nọ na APC mana anyị ga-akwado Peter Obi - Babachir Lawal

    Babachir Lawal, onye bụbu odeakwụkwọ gọọmentị etiti, ekwuola na ya na ndị okpukperechi Christ nọ na pati 'All Progressives Congress' ga-akwado Peter Obi nke 'Labour Party' na ntuliaka ọkwa Onyeisiala Naịjirịa na 2023.

    O kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụlọ ntaakụkọ Channels nwere n'uhuruchi ụbọchị Tọzde.

    Lawal kwuru na ihe mere ha agaghị akwado onye pati ha bụ Bola Tinubu, bụ maka na ọ họọrọ onye okpukperechi alakụba bụ Kashim Shettima dịka osote ya, ebe ya onwe ya bụ Tinubu bụkwa onye alakụba.

    Ọ kọwara na ndị alakụba abụọ ịzọ ọkwa onyeisiala na osote ya bụ ihe mkparị na ịkpa oke megide ndị okpukperechi Christ na Naịjirịa.

    Ọ gara n'ihu kwuo na ha bụ ndị okpukperechi Christ nọ na APC agaghị apụ na pati ahụ n'agbanyeghị na ha anaghị akwado Tinubu na Shettima.

    Lawal kwukwara na mmekpa ahụ nke ndị otu Christ na-agabiga na mpaghara Ugwu Naịjirịa karịrị akarị.

    "Iji maa atụ e nwere mahadum 27 na mpaghara Ugwu Naịjirịa, mana naanị ise n'ime ha ka onye otu Christ bụ onye isi na ya," Lawal kwuru.

    "N'Adamawa steeti nke bụkwa steeti ebe ndị otu Christ ka n'ọnụọgụgụ, enwebeghị onye otu Christ bụụrụ 'Vice Chancellor' n'ime ihe karịrị afọ 40."

  11. Ụlọikpe achụọla Tonye Cole nke APC ịzọ gọvanọ Rivers steeti

    Ụlọikpe ukwu dị na Pọtakọtụ achụpụla Tonye Cole dịka onye ga-anọchi anya pati 'All Progressives Congress' na ntuliaka ọkwa Gọvanọ Rivers Steeti na 2023.

    Ọkaikpe Emmanuel Obile kwuru na Tonye Cole etozughị etozu iso zọọ ya bụ ọkwa.

    Ọ bụ otu Peoples Democratic Party (PDP) wepụrụ mkpesa n'ụlọikpe ma kwuo na usoro ntuliaka imeụlọ nke ndị APC esoghi usoro iwu nchịkọta ntuliaka.

    PDP kwukwara na Tonye Cole bụ nwa afọ mba UK nke pụtara na o kwesịghị ịzọ ọkwa ọchịchị na Naịjirịa dịka iwu si dị.

    Na mkpebi ya n'ụbọchị Tọzde, ọkaikpe Obile kwenyeere PDP na Tonye Cole etozughi ịzọ ọkwa gọvanọ, n'ihi na ntuliaka imeụlọ wepụtara ya esoghi usoro iwu.

    Obile nyere ngalaba na-ahazi ntuliaka bụ Inec iwu ka ha kachapụ aha Tonye Cole n'akwụkwọ ndị ga-eso zọọ ọkwa na ntuliaka 2023.

    Cheta na APC esoghi zọọ ọkwa gọvanọ na Rivers Steeti n'afọ 2019, n'ihi na ụlọikpe kagburu ntuliaka imeụlọ ha mere n'afọ ahụ maka na o soghi usoro iwu.

  12. Ego ezufuru ezufu: Anyị eweghachitela otu ijeri dọla kemgbe ọchịchị Buhari malitere – Malami

    Naịjirịa kemgbe ọchịchị onyeisiala Muhammadu Buhari malitere n’ọnwa Mee 2015 ruo taa.

    Ọkaiwu gọọmentị etiti na mịnịsta na-ahụ maka ikpe ziri ezi bụ Abubakar Malami kwupụtara nke a n'ụbọchị Wenezde dịka e mechapụrụ ọgbakọ imeụlọ gọọmentị bụ ‘Federal Executive Council (FEC)’ n’obi gọọmentị nke Abuja.

    O kwuru e tinyela akụ ndị eweghachitere n'akụkụ dị iche iche maka nkwalite akụnaụba Naịjirịa ọkachasị iji gboo mkpa mbelata ịda ogbenye na Naịjirịa.

    O kwupụtakwara na ọgbakọ ahụ enyela nkwado ka ebipụta akwụkwọ atụmatụ mgbochi nrụrụaka iji buso ya agha ma mgbochi nke a mkpa mkpa na Naịjirịa.

    N'otu aka ahụ, Malami kwupụtara nchegbu gọọmentị etiti na-enwe maka okwu ndị a sị na-agbakwụnye agba agba ego n’elu akwụkwọ mmefu ego Naịjirịa, ma kwusiike na a ga-enyocha okwu a dị ngwa ngwa.

  13. Peter Obi bụ mkpụrụobi na anụahụ ndị Igbo – Ohaneze ndigbo

    Otu Ohanaeze Ndigbo asaala okwu otu jịkọrọ ndị mpaghara ugwu bụ Nothern Elders Forum nke na-ekwu “Anyị amaghi ebe ndị Igbo kwụ n’okwu inye Peter Obi nke Labour Party nkwado”

    “Mba anyị ji anya ahụ ihe na-eme, ọ bụrụ na Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa akwụdọghiri Obi, ha atakwana onye ọbụla ụta n’ọdịnihu.”

    Ohaneze ndigbo site n’ọnụ na-ekwuru ha bụ Alex Ogbonnia sara okwu a kwuo:

    “Obi bụ mkpụrụobi na anụahụ ndị Igbo.”

    “Ọwụwa Anyanwụ Naijiria maọbụ n'ikwu ya n'ụzọ ka mma, ndị Igbo na-akwadosiike n'azụ nwa anyị nwoke bụ Peter Obi. Enweghị ihe ọ bụla na-adọpụ uche anyị n’okwu a ọbụladị otu ndị pere na-egosi ya nleghara anya bụ ndị site n'enyemaka soshal midia che na ọ nwere ihe e ji ha maọbụ ikike ha kpọrọ.”

    “Ohanaeze agaghị eso ndị na-emegide ọchịchọ mkpokọta ndị Igbo na-enwe nrụrịtaụka... Nkwado Ohanaeze nyere Obi abụghị n'ihi na ọ bụ onye Igbo dị ka Baba -Ahmed kwuru n'ụzọ ziri ezi, nkwado anyị nye Obi taa bụ maka ọrụ ọma dị egwu ọ rụrụ ndị nke nye dịka gọvanọ; àgwà ịdị umeala n'obi, àgwà ịma mma nakwa ịnwe ọgụgụ isi zuru oke nke na-akpalite mmụọ ọha n’ụzọ ọma.”

    Nke a na-abịa dịka ụfọdụ ndị isi ọchịchị n’ala Igbo nyere Peter Obi nkatọ na nso nso a.

  14. Ndị ekperima 'bandit' chọrọ ka e jiri akwụkwọ naịra ọhụrụ kwụọ ha ụgwọ

    Ndị ekperima bandits atọrọla mmadụ anọ n’obodo Kolo dị na Gusau, Zamfara steeti ma kwuo na a ga-eji akwụọ naịra ewepụtara ọhụrụ kwụọ ha ụgwọ tupu ha atọhapụ ndị ahụ.

    Ụlọ ntaakụkọ Channels TV kwuru na ndị ekperima ahụ kwuru na a ga-akwụ ha nde naịra iri tupu ha atọhapụ ndị ahụ, ma mechaa butuo ya ruo nde naịra ise.

    Mana otu onye ezinụlọ ndị ahụ a tọọrọ kwuru na ndị ekperima ahụ sị na ha achọghị ego ochie, kama ọ bụ ego ọhụrụ ka a ga-eji kwụọ ha ụgwọ iji hapụ ndị ahụ ha ji.

    Ndị ekperima ahụ sị na ha ga-eche mgbe ọbụla ndị ahụ ji nweta ego ọhụrụ ahụ tupu ha atọhapụ ndị be ha.

    Cheta na ọ bụ taa bụ Wenezde, Nọvemb 23, 2022, ka Onyeisiala Muhammadu Buhari gosipụtara ọha obodo akwụkwọ ego naịra ọhụrụ nke ụlọakụ etiti Naịjirịa megharịrị.

    Onyeisi ụlọakụ etiti bụ Godwin Emefiele kwuru na mmegharị akwụkwọ ego N1000, 500 na 200 ga-enye aka belata ọtụtụ ego dị n'aka ndị mmadụ na Naịjirịa kama ịdị n'ụlọakụ.

  15. A mụọla ejima abụọ site na mkpụrụnwa ‘embryo’ etinyere n' igbe njuoyi afọ iri atọ

    Rachel Ridgeway, nwaanyị ji ụmụ anọ na di ya bụ Philip Ridgeway mụrụ Lydia Ann na Timothy Ronald n’abalị iri atọ n’otu n’ ọnwa Oktobana Tennesse dị na mba Amerịka.

    A na-eche na nke a bụ mkpụrụnwa kachasị nọ n’ige njụoyi e jirila tụọ ime ma mụta nwa dị ndu.

    Mkpụrụnwa ahụ bụ nke otu di na nwunye gbara afọ 50 na afọ 34.

    Ha doweburu ya n'ụlọ nchekwa ruo afọ 2007 tupu ha nyefee ya otu ụlọọrụ ebere 'National Embryo Donation Center' (NEDC)' iji nmere ndị ọzọ ọ dị mkpa ọgọ'.

  16. US shooting:Nwoke agbagbuola mmadụ 10, gbuo onwe ya

    Otu nwoke agbagbuola mmadụ ruru iri na ọdọahịa Walmart dị na Chesaake dị na Virginia, na mba Amerịka.

    Nwoke ahụ a na-eche bụ onye na-elekọta ọdọahịa ahụ wụchara ndị n'ọdọ ahịa ahụ gbagbuo onwe ya.

    Ozi nke obodo Chesapeake wepụtara na Twitter kwuru sị, "Ndịuweojii kwuru na onye jie gbe gbagbagburu ndị mmadụ na Walmart".

    E kwughị karịa otu a, mana otu onye uweojii kwuru na opekata mpe mmadụ 10 nwụrụ ,ebe ọtụtụ merụrụ ahụ.

  17. Nnamdi Kanu apịala Malami akwụkwọ ikpe ọhụrụ

    Onyendu otu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu agbaala ọkaiwu gọọmentị etiti bụ Abubakar Malami akwụkwọ ọhụrụ maka okwu ntetọ aha ya.

    Ọkaiwu Kanu bụ Aloy Ejimakor kwupụtara nke a n’akara Twitter ya ma kọwa na ego Kanu na-ana maka okwu ntetọ aha bụ ijeri naịra 20 maka ego iti aka n’obi,

    Ejimakor kọwakwara na ntetọ aha a bụ okwu na Malami sị na Kanu gbara ọsọ ma ghara iso usoro ikpe nke isi n’ụlọ na-abịa ikpe ya.

    Ọ gara n’ihu degara Malami:

    “Cheta mpụtara ikpe nke ụlọikpe ukwu dị n’Abia steeti (n’ụbọchị 19 nke ọnwa Jenụwarị, 2022), okwu gị banyere onye m na-anọchite bụ ụgha, o gosiri atụmatụ obi ọjọọ, nke a bụ ihe ụwa niile gụrụ ma hụ na-eche na ọ bụ agwa a ka onye m na-anọchịte kpara”

    Ejimakor kwukwara na chọrọ ka Malami zipụta ozi arịrịọ mgbaghara ma tinye ya n’akwụkwọ akụkọ abụọ na Naịjirịa ka ụwa nụrụ.

  18. Igbo ndị ọma unu abọọla chi?

    Ka taa mịtara unu niile mkpụrụ ọma.

    Leekwa akụkọ ndị dị mkpa ịgụ taa.

  19. CBN ga-ewepụta akwụkwọ naịra N1000, N500 na N200 ọhụrụ n'ụbọchị Wenezde

    Onyeisi ụlọakụ etiti bụ Godwin Emefiele ekwuola na Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-egosi ọha mmadụ akwụkwọ naịra ọhụrụ N1000, N500, na N200 echi bụ Wenezde, Nọvemba 23, 2022.

    Emefiele kwuru nke a n'ọgbakọ 'Monetary Policy Committee' nke a na-enwe kwa ọnwa n'isi ụlọọrụ ụlọakụ etiti dị n'Abuja.

    O kwuru na Buhari ga-egosipụta ego ochie a n'ọgbakọ ya na ndị mịnịsta ya na-enwe ụbọchị Wenezde ọbụla nke a na-akpọ 'Federal Executive Council Meeting'.

    Cheta na Emefiele kwuburu na ọ bụ n'ụbọchị 15 nke ọnwa Disemba ka ha ga-ewepụta akwụkwọ naịra ọhụrụ ahụ, mana n'ọgbakọ ahụ nke e nwere taa bụ Tuzde, o kwuru na "anyị agaghị echezi ruo ụbọchị iri na ise nke Disemba".

    Ọ gara n'ihu dọọ aka na ntị na ụlọakụ etiti agaghị ebugharị ụbọchị ha kwuru na akwụkwọ ego nke ochie ga-akwụsị ịdị ire, ya bụ n'ụbọchị 31 nke ọnwa Jenụwarị 2023.

    "Malite n'oge anyị mara ọkwa maka mgbanwe akwụkwọ ego a n'ọnwa ọktoba, ruo ọnwa Jenụqarị 2023, ọ karịrị ụbọchị 100. O zuorola onye ọbụla chọrọ ịga tinye ego ochie ya n'ụlọakụ iji nata akwụkwọ ego nke ọhụrụ mgbe ọ ga-apụta," Emefiele kwuru.

  20. Ụlọikpe enyela iwu ka Inec malitekwa ndebanye aha n'akwụkwọ ntuliaka

    Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja enyela ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka bụ Inec iwu ka ha malitekwa ndebanye aha n'akwụkwọ ntuliaka ruo mgbe ọ ga-afọdụ ụbọchị 90 tupu ntuliaka 2023.

    Ọ bụ ọkaikpe Inyang Ekwo nyere mkpebi a n'Abuja taa bụ Tuzde, Nọvemba 22, dịka otu anya aha ya bụ Anajat Salmat na mmadụ atọ ndị ọzọ wetara mkpesa n'ụlọikpe maka nke a.

    Ekwo kwuru na iwu Naịjirịa kwuru na ndebanye aha n'akwụkwo ntuliaka ga-agagide n'ihu ruo ụbọchị 90 tupu ntuliaka ọbụla.

    O nyekwara Inec iwu ka ha hụ na ndị niile debanyere aha ha n'akwụkwọ ntuliaka ga-enweta akwụkwọ ikike ịtụ vootu nke a kpọrọ 'voters card na bekee, ma soro tụọ vootu na 2023 ma ọ bụrụ na ha chọọ.

    Cheta na Inec kwụsịrị ndebanye aha n'akwụkwọ ntuliaka n'ụbọchị 31 nke ọnwa Julaị, dịka ha kọwara na ọ bụ iji nwee ohere bipụta akwụkwọ ikike ịtụ vootu nke mmadụ niile debanyere aha ha, dịka iwu ntuliaka si kwuo.