You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Agha Ukraine: Onye enyemaka Zelensky na-ekwu na ihe ruru mmadụ 13,000 anwụọla

Nke so agha malitere n'Ukraine kemgbe Febụwarị mgbe ndị agha Russia malitere iwakpo ha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Etu e si sụgbuo nwafọ Igbo dị afọ 17 na mba UK

    Ndị uweojii Cambridgeshire akpọpụtala aha nwata gbara afọ iri na asaa (17yrs) a sụgburu na mba UK.

    Ha kwuru na ndị kpara arụ a maara ama sụgbuo Jesse Nwokejiobi n’ụbọchị Satọde 19 Nọvemba afọ 2022.

    Ha kwuru na ha a kpọrọ ha oku n’ebe a kpọrọ Logan’s Meadow, ebe nlereanya dịka ọ fọrọ nkeji iri ka ọ kụọ elekere atọ nke ehihie na Satọde ahụ.

    Ndị uweojii ruru ebe ahụ ma chọpụta na Nwokejiobi anwụọla pịị n’ebe ahụ.

    A nwuchiela ụmụaka ndị nwoke atọ nke abụọ n’ime ha dị afọ iri na anọ (14yrs) ebe otu ọzọ dị iri na asaa (17yrs) bụ ndị a na-enyo enyo gburu Nwokejiobi.

    A ga-eme nyocha ahụ nwata a n’ụbọchị Wenezde

    Onye uweojii bụ Adam Gallop sị na ‘Anyị maara na ọtụtụ ndị nọ n’obodo na-ekwu maka ihe a mere, nke gụnyere foto na ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia.

    “Arịrịọ anyị bụ ka ndị nne na nna gwa ụmụaka ha okwu ma gbaa ama ma ọ bụrụ ozi dị mkpa dapụta.”

    A tọhapụla ụmụaka abụọ n’ime ndị a mana ha ga-alọghachị n’ụlọọrụ ndị uweojii n’ọnwa Febụwarị ebe otu onye ka nọ n’aka ndị uweojii ugbua.

  2. Etu nwoke si jiri agụụ kwụgbuo nwunye ya na Yobe steeti

    Ndị uweojii Yobe steetị sị ha na-enyocha ọnwụ otu nwaanyị a sị na di ya kpọchiri n’ime ụlọ na-enyeghi ya nri ruo oge dị anya.

    Nwaanyị bụ onye aha ya bụ Saddiya Salihu nwụrụ n’ụlọọgwụ dị na Kano na ngwụcha izuụka dịka a zọpụtachara ya n’ụlọ di ya na mpaghara Nguru nke steeti ahụ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Yobe, bụ Dungus Abdulkarim gwara BBC na a nwụchiela di nwaanyị a bụ Ibrahim Bature na a ga-akpụpụ ya n’ụlọikpe ngwa ngwa e mechara nyocha.

    E boro Bature ebubo ịkpọchi nwaanyị a ji ụmụanọ n’ime ụlọ n’ọnọdụ ọjọọ na-adịghị ọcha, naanị mmanya a kpọrọ “kunu” ja ọ na-enye mgbe ọbụla ọ chọrọ nri.

    Nwoke a gọnarịrị ebubo ndị a.

    Akụkọ kwuru na o kweghi ka ndị mmadụ banyer n’ime ụlọ ebe nwunye nọ. Ọ bụ nne nwunye ya chọtara ha n’ụlọ bụ onye gbara ama mgbe ọ chọpụtara ọnọdụ ọjọọ nwunye ya nọ.

    Ọnwụ nwaanyị a akpalite okwu n’ọha, dịka ụfọdụ ụmụnwaanyị na-akpọ oku ka e nye nwaanyị a ikpe ziri ezi.

  3. Alaọmajijiji egbuola mmadụ 56 n'Indonesia

    Alaọmajiji mere n’agwaetiti Java nke Indonesia egbuola mmadụ iri ise na isii ma merụọ ọtụtụ narị mmadụ ahụ.

    Alaọmajiji a nke ogogo ya dị ise na ọma mere n’obodo Cianjur dị na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Java.

    Ihe onyonyo si na soshal midia gosiri ka ụfọdụ ụlọ dara ma bụrụ aja wụsasịa n’okporoụzọ.

    Ndị ọrụ gbata gbata sị na dọrọ ndị mmadụ aka na ntị na ọzọ nwereike ime ma kwuo na ọnụọgụgụ ndị nwụrụ nwereike ịrị elu.

    Ebe ihe a mere bụ ebe ọtụtụ ndị mmadụ bi ma nwereike inwe mbuze, tinyekwara ụlọ ndị na-esighi ike arụchara ebe ahụ.

    Ndị ọrụ gbata gbata na-agba mbọ ịzọpụta ndị tọrọ n’ime ụlọ ndị a dara ada ebe ha zọpụtara otu nwaanyị na nwa ya.

    Gọvanọ mpaghara West Java bụRidwan Kamil gwara ndị ntaakụkọ na ọ bụ eziokwu na mmadụ iri ise na isii nwụrụ.

    O kwuru na “ndị merụrụ nakwa ndị nwụrụ ka nwereike ịrị elu maka na e nwere ọtụtụ ndị ka tọrọ n’ebe ihe a mere”.

  4. Ndị uweojii Enugwu steeti agbagbuola mmadụ abụọ a na-enyo bụ ndị Ipob

    Mmadụ abụọ a na-eche bụ ndị otu Indigenous People of Biafra (IPOB), anwụọla ebe ha na ndị uweojii na-akwakọrịta mgbọ n’Enugwu steeti.

    Daniel Ndukwe bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ, kwuru nke a n’ozi o ziputere na Sọnde, dịka o kwuru na ya bụ ihe mere n’obodo Inyi dị n’Oji-River, n’ụbọchị Fraịde.

    O kwuru na a na-eche na aka ndị otu Ipob ahụ dị n'ogbugbu e gburu Gabriel Onuzulike bụbu onyeisioche Okpuruọchịchị Oji-River na Elvis nwanne ya nwoke, bụ ndị zutere ọnwụ ha n'ụbọchị Fraịde, 18 nke ọnwa Nọvemba 2022.

    Ndukwe kwuru na ndị uweojii "chụrụ ọsọ, jide ndị omekome a ma kwakọrịta mgbọ n'obodo Inyi, dị n'otu Okpuruọchịchị ahụ, dịka ha nọ na-achọ ịmịbanye Anambra steeti.

    "Ka anyị na-akwakọrịta mgbọ, ndị uweojii meriri ha, nke butere ọnwụ mmadụ abụọ n'ime ndị omekome ahụ ,ma mee ka ndị ọzọ jiri ọsọ gbabanye n'ime ọhịa, nke ọtụtụ n'ime ha bu mgbọ tụrụ ha n'ahụ."

    A natara egbe abụọ na ọtụtụ mgbọ, ụgbọala Onuzulike ha gbagburu, ụgbọala ha ji bịa kpaa mkpamkpa, ekwentị abụọ nakwa ihe ndị ọzọ n'aka ndị ahụ gbapụrụ ọsọ, dịka ndị uweojii si kwuo.

  5. Twitter enyeghachila Trump akara obaozi ya

    Ụlọọrụ ọbaozi Twitter ewechighala akara ọbaozi aka chịburu mba Amerika bụ Donald Trump ụbọchị Satọde.

    Nke a na-abịa dịka ha mechara onye-kwu-uche-ya nke mmadụ nde iri na ise tụrụ vootu kwuo ka e weghachi akara ahụ.

    Twitter mechiri akara obaozi Trump n’ọnwa Jenụwarị afọ 2021 dịka igwe mmadụ wakpochara ụlọomeiwu mba ahụ dịka Twitter na-atụ uche na ụdị ozi Trump ji akara ya ezipu nwere ike ịkpalite tigbuo-zogbuo.

  6. Otu nwoke egbuola nne nwunye ya maka ịchọpụta na ọ na-emetọ nwanne nwunye ya

    Otu nwoke egbuola ọgọ ya nwaanyị maka na ọ chọpụtara na ọ na-edina nwanne nwunye ya dị afọ 14 n'Akodo dị na Legọs steeti.

    Nwoke ahụ a kpọghị aha ya, gbara afọ 38 gburu ọgọ ya nwaanyị dịka nwaanyị ahụ gwara ya na ọ ga-ahụ isi imetọ o metọrọ nwa ya nwaanyị.

    Dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legọs steeti bụ Benjamin Hundeyin si kwuo, nwoke ahụ gbukwara onye hụụ ya ka ọ na-egbu nwaanyị ahụ tupu aka kpara ya.

    Hundeyin kwuru na e wegala ozi ahụ na ngalaba pụrụ iche na-enyocha mpụ maka nyocha na ịkpụpụ nwoke ahụ ụlọikpe.

  7. Ohaneze adọnyerela Peter Obi ukwu

    Otu Ohaneze ekwupụtala nkwado ha nye onye na-azọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2023 n’aha Labour Party bụ Peter Obi nkwado.

    Ohaneze kwuru n’ozi ha nke ọnụ na-ekwuru otu ahụ bụ Alex Ogbonnịa binyere aka ma wepụta Ụbọchịụka, na e lebe anya onye oke ruru, ịkwụba aka ọtọ na nkwado na otu 'Southern and Middle Belt Leaders Forum (otu jikoro Afenifere, Pandef nakwa Middle Belth Forum), nke Chief Edwin Clarke bu onye ndu ha na Ohaneze nwere nkwenye na Peter obi ga-ejikọ ụmụ Naijiria ọnụ ma wetara ndị na-eto eto olileanya.

    Ozi ahu kwuru si, "Nkwado Ohanaeze na-enye Obi agbadoghị ụkwụ nani na nkwenye e mee nwa ka e mere ibe ya na ikpenkwụmọtọ, ihe Obi rụrụ na obi bụ olile anya Naijiria ga-adị mma."

    "Nkwado Obi na-enwe n'elu, n'ala bụ ihe akaebe megide ajọ ọnọdụ Naijiria."

    "Ndị mmadụ ji Obi egosi na ike ka ihe si aka agwụla ha."

    "Ọ bụ nkwugide mmegbu,ụbịam, enweghị ọrụm, nrụrụaka na ajọ ihe dị iche iche ghọrọla ihe e ji mara Naijiria."

    Ohaneze gara n'ihu kwuo na nkwado a pụrụ iche ndị mmadụ na otu dị iche iche na-enye Obi bụ iji kụsaa ewumegwu ji ụmụ Naijiria n'olu.

  8. Ndewoonu o!

    Ndewoonu , ndị be anyị!

  9. Rishi Sunak agaala njem nleta na mba Yukren

    Praím mịnịsta mba Briten bụ Rishi Sunak agaala njem nleta na mba Yukren.

    Gọọmentị mba Briten weere ohere njem a kwee nkwa inye mba Yukren ngwa ọgụ ọnụ ego ya ruru nde pawụnd iri ise maka agha ha na Rọshịa na-alụ.

    Nke a bụ mbụ Rishi Sunak na-aga mba Yukren kamgbe ọ banyere dịka praịm mịnịsta Briten.

  10. Mba Amerịka enyeghachila Naịjirịa ego ọzọ ha sị Sani Abacha zupụrụ

    Gọọmentị mba Amerịka ekwuola na ha enyeghachila gọọmentị Naịjirịa nde dọla iri abụọ na ụma isii ha si bụ ego aka chibụrụ Naijirịa bụ Sani Abacha zupuru.

    Nke a mere ka ọnụ ọgụgụ ego niile Amerịka nyehachiri Naịjirịa ha sị na Abacha zupụrụ ruo nde dọla narị atọ na iri atọ na abụọ na ụma anọ.

  11. Mmadụ abụọ anwụọla dịka ụgbọelu na gwongworo sukọtara isi

    Ndị ọrụ mmenyụ ọkụ abụọ anwụọla dịka otu ụgbọelu kpọkanyere isi na gwongworo, n’ọdọụgbọelu Jorge Chavez dị na Lima, isiobodo mba Peru.

    Ministrị ahụike mba ahụ kwuru na a na-agwọ ndị njem iri abụọ nakwa otu onye ọrụ mmenyụ ọkụ maka ahụ ha merụrụ, dịka ha kwuru na enweghi onye njem maọbụ ndị ọrụ ụgbọelu ahụ nwụrụ.

    Ka ọ dị ugbua, a kwụsịla ụgbọelu isi n'ọdọụgbọelu ahụ efepụ, ruo n'ehihie Satọde a.

    Onyeisiala mba ahụ bụ Pedro Castillo, tiri ezinaụlọ ndị ọrụ mmenyụ ọkụ ahụ aka n'obi.

    O kwuru sị "Ana m eti ezinaụlọ Angel Torres na Nicolas Santa Gadea, ndị ọrụ mmenyụ ọkụ obi kara nwụrụ n'ihe mberede a.

    "Ana m eche maka ha ma na-ekpere ha ekpere. Ana m ekpe ekpere ka ndị merụrụ ahụ gbakee."

  12. Ụlọikpe sị na aka Babachir Lawal dị ọcha n’ebubo izu ego dị nde 544 EFCC boro ya

    Ụlọikpe ukwu dị n’Abuja ekwuola na aka Babachir Lawal bụbu odeakwụkwọ gọọmentị etiti dị ọcha n’ebubo izu ego dị nde narị naịra ise na nde iri anọ na anọ nke ụlọọrụ EFCC boro ya na ndị ọzọ.

    Ọkaikpe Charles Agbaza kwuru na EFCC enweghi ezi ihe akaebe gosiri na aka Lawal na ndị otu maara etu ego ahụ si mie ala.

    O kwuru na mmadụ iri na otu ụlọọrụ EFCC kpọtara ka ha gbaa akaebe megide Lawal na ndị ọzọ ekwughi ihe chịtara aja n’akaebe ha gbara.

    Ha kwuru na EFCC egosighi na Lawal so n’otu Presidential Initiative for North East bụ ndị nyere ọrụ ngo maọbụ ndị nyochara ya bụ ọrụ ngo.

    N’ihi nke a, Ọkaikpe Agbaza sị ka a tọhapụ Babachir Lawal, nwanne ya bụ Hamidu Lawal, Suleiman Abubakar, Apeh Monday na ụlọọrụ ọzọ.

  13. Agaghịzị ekpe Nwaeze Mohammed Bin Salman ikpe ugbua maka ọnwụ Jamal Khashoggi - US

    Mba Amerịka ekpebiela na agaghị ekpe Nwaeze Mohammed Bin Salman ikpe maka ogbugbu onye ntaakụkọ Jamal Khashoggi.

    Agbanyeghị na ngalaba nyocha mba Amerịka kwuru na ha chere na ọ bụ Salman nyere iwu ka egbuo Khashoggi n'ọnwa oktoba afọ 2018, kama gọọmentị Amerịka na-ekwu na agaghị enweike ikpe ya ikpe ọbụla ugbua dịka ọ bụrụla Prọ́ịm Mịnịsta mba Saụdi Arabia.

    Ọ bụ maka iwu Diplomatic Immunity ka mgbebi a gbadoro ụkwụ.

    Ọ bụ onye khashoggi chọrọ ịlụ bụ Hatice Cengiz gbara akwụkwọ n'ụlọikpe n'ebubo na ọ bụ Salman nyere iwu ka e gbou Khashoggi.

  14. Agbapeela ụlọakwụkwọ ndị ọkaiwu na Rivas Steeti

    Taa ka a gbapere ogige ụlọakwụkwọ ebe a na-azụ ndị ọkaiwu bụ nke Gọvanọ Rivas Steeti bụ Nyesom Wike rụrụ ọhụrụ na Portharcourt ma nyefee n'aka ngalaba na-ahụ maka ikpe nkwụmọtọtọ na Naịjirịa.

    Ọkaiwu ukwu Naịjịrịa bụ Abubakar Malami nọchiri anya Onyeisiala Muhammadu Buhari na ya bụ emume ma tokwaa Wike maka ọrụ ọma ya.

  15. Ihe ruru ụmụaka 2,400 na-anwụ kwa ụbọchị na Naịjirịa maka erighị nri zuru oke

    Onyeisi otu UNICEF na-ahụ maka nrị zuruoke na Naịjirịa bụ Nemat Hajeebhoy ekwuola na ihe ururu ụmụaka otu narị na anwụ kwa awa ọbụla na Naịjirịa maka erighị nrị zuruoke.

    Ọ bụ na emume nke ngalaba National Council on Nutrition nke osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo bụ onyeisi oche ha hazịrị ka o kwuru nke a n'ụbọchị tọzde.

    Hajeebhoy kwuru sị, " Otu n'ime ụmụaka atọ na Naịjirịa anaghị eri nri zuruoke. Naịjirịa bụ onye mbụ n'Afrịka ma bụrụ onye nke abụọ n'ụwa niile na mba ndị ụmụka aha anaghị eri nrị zuruoke.".

  16. Nancy Pelosi ekwuola na ọ ga-aritu n’ọkwa ọchịchị ụlọomeiwu mba Amerịka

    Nancy Pelosi, onye bụ onyeisi ndị pati Democrats n'ụlọomeiwu Amerịka ruo ihe dịka ebe afọ iri abụọ, ekwupụtala na ọ kwụsịrị n'ọrụ ahụ.

    Pelosi dị afọ 82 bụ onye Democrat kachasị ike n’ụlọomeiwu ha nakwa nwaanyị mbụ rụrụ ọrụ dịka onyeisi ụlọ omeiwu mba ahụ.

    Ọ ga-aga n'ihu na-anọchiteanya mpaghara California n’ụlọ omeiwu mba ahụ ugbua.

    Nke a na-abịa dịka a na-atụ anya na ndị Republican ga-eweghachi ọchịchị a nke ụlọ ahụ na-esote ntuli aka nke etiti oge.

    Dịka Kevin McCarthy nke pati Republican nwetere mmeri nhọpụta pati ahụ dịka onye na-ekwuru ha a na-atụ onye na o nwereike inweta oche ahụ Pelosi nọbụ na ya.

    Oriakụ Pelosi gwara ndị ntaakụkọ ụlọomeiwu ahụ n’ụbọchị Tọọzde

    "Agaghị m eche na otu ụbọchị m ga-esi n’ịbụ ọrịakụ nkiti na-ebode ụlọ m ruo ọkwa ịbụ onyeisi ụlọọmeiwu”

    "Agaghị m azọ ọkwa ochichi n’otu Democratic n’oge ịzọ ọkwa na-abịa abịa, oge eruola mgbe ọgbọ ọgbara ọhụrụ ga-edu otu Democratic.”

    Pelosi ga-anọ n’ọkwa ya ruo Jenụwarị 2023 mgbe ọgbakọ ọhụrụ ga-amalite ịchị, ọ ga-anọkwa n'oche ọ malitere ịnọ n’afọ 1987 ruo Jenụwarị 2025.

  17. Elon Musk agbachịdola ndị ọrụ Twitter ụzọ ruo izu na-abịa abịa

    Onyeisi ọhụrụ ụlọọrụ Twitter bụ Elon Musk agbachiela ụzọ ụlọọrụ ahụ ruo izu na-abịa abịa dịka ozi tụrụ ndị ọrụ ya n’anya nke o zigara ha n’ụbọchị Tọọzde siri kwuo.

    Ozi ya dere na aga agbape ya bụ ọnụ ụzọ n’ụbọchị 21 nke ọnwa Nọvemba, 2022 agbanyeghị na ọ nyeghi ebumnobi ya na mgbachi ọnụ ụzọ a.

    Nke a na abịa dịka o nyere ndị ọrụ ya iwu ịrụ ọrụ ruo ogologo awa maọbụ hapụ ọrụ ha kpam kpam n’izu gara aga nke kpara ọtụtụ jiri gbaa arụkwaghim.

    Ozi a Musk wepụtara dọkwara ndị ọrụ ya aka na ntị na-ekwu:

    “Biko gaa n'ihu na-agbaso iwu ụlọọrụ a site n’ịghara ịgbasa ozi banyere ihe nzuzo na-eme n’ime ụlọọrụ anyị n’ọha maọbụ na soshal midia nakwa ebe ndị ọzọ.”

    Cheta na dịka Musk kwupụtara maka ndị ọrụ ya ịrụ ọrụ ruo ogologo awa n’izu gara aga, ọ kọwara na ndị na-ekweghi debanye aha na nkwekọrịta a ruo ụbọchị Tọzdee 17 Nọvemba ga-enweta ụgwọ nchụpụ ọnwa atọ.

    Na mbido ọnwa a, ụlọọrụ Twitter n’okpuru ọchịchị Musk kwuru na ọ na-ebelata ihe dịka 50% nke ndị ọrụ ya dịka ha chụrụ ndị mmadụ n’ọrụ aghara aghara.

    Ndị ọrụ Twiiter gbara arụkwaghịm na-ejizi isiokwu jịkọrọ na n’akara Twitte bụ #LoveWhereYouWorked nke pụtara ‘Ịhụ ebe ị na-arụ n’anya’ ezipụta ozi banyere ọpụpụ na ihe ndị ọzọ na-eme na Twitter dịka ha na-apụ.

    Musk zipụtara ozi na Twitter nke gosiri ebe a na-eli ụlọọrụ Twitter n'ala.

  18. Gianni Infantino ga-abụkwa onyeisi otu Fifa ọzọ

    Onyeisi otu Fifa bụ Gianni Infantino ga-azọọkwa onyeisiala otu ahụ ugboro atọ na-enweghịịma aka ọbụla.

    Infantino nọchịrị Sepp Blatter dịka onyeisi otu a kamgbe afọ 2016.

    Blatter bụbu onyeisi otu Fifa afọ 17 tupu achụpụ ya maka ebubo nrụrụaka.

  19. Ụlọakụ Naịjirịa niile ga-ebido ịrụ ọrụ ụbọchị satọde - CBN

    Ụlọakụ etiti bgụ Central Bank of Nigeria ekwuola ka ụlọakụ niile nọ na Naịjirịa bido ịrụọrụ n'ụbọchị satọde ruo ụbọchị iri atọ na otu nke ọnwa Jenụwarị afọ 2023.

    Ha kwuru na nke a bụ maka ndị chọrọ iwebata ego ochie ha dịka CBN kwuru na ha na-ewepụta ego ọhụrụ n'ụbọchị iri na ise nke ọnwa Disemba afọ a.

  20. Lee ụzọ Nyesom Wike kwuru ọ ga-esi kwado Peter Obi n’achụmnta vootu ya

    Gọvanọ Nyesom Wike nke Rịvas Steeti ekwola n’emume mmepe ọrụ ọhụrụ ọ mere n’ụbọchị Tọọzde na ọ ga-enyere Peter Obi nke Labour Party aka n’atụmatụ achụmnta vootu ya site na izitere ya ngwa ọrụ dị ịcheịche.

    O kwuru nke a n’emume mmepe okporoụzọ ọhụrụ ọ rụchapụrụ n’akụkụ Nkpolu-Oroworokwo

    O kwuru “Mgbe ọbụla ị chọrọ ịme achụmnta vootu na Rịvas steeti, gwa m ka m zitere gị ngwa ọrụ”

    Obi na osote ya bụ Datti Baba-Ahmed gara emume a e mere na steeti ahụ natara ọtụtụ nabata dịka ndị nkwado ha kwụjuru ebe ahụ.

    ụ na ha chọọ ka ha kwado onye ji aha pati ahụ azọ ọkwa onyeisiala Naịjrịa 2023 bụ Atiku Abubakar.

    Wike onye otu People Democratic Party (PDP) kwuru na Peter Obi nwere ihe niile onye kwesịrị ịchị Naịjriịa kwesịrị inwe.

    Cheta na kemgbe ọnwa ole na ole, Wike na ndị gọvanọ anọ ndị ọzọ na PDP arịọla Iyorchia Ayu ka ọ gbaa arụkwaghịm dịka onyeisi oche PDP ma ọ bụr