Ọ bụghị eziokwu na a tụọla Hushpuppi mkpọrọ afọ 11
Akụkọ na-efegharị na soshal midia taa bụ Fraịde, Nọvemba 4, na-ekwu na ụlọikpe mba Amerịka atụọla nwaamadi Naijiria aha ya bụ Ramon Abbas, onye e ji Hushpuppi mara, mkpọrọ afọ iri na otu.
Mana ya bụ akụkọ abụghị eziokwu.
BBC Pidgin kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ Ọkaiwu kachasị na steeti California nke mba Amerịka bụ Mrozek Thom, o wee kwuo ụlọikpe atụbeghị Hushpuppi mkpọrọ.
Mrozek kwuru sị: "Akụkọ ahụ abụghị eziokwu. Ekpebibeghi afọ ole ọ ga-anọ na mkpọrọ, mana e tinyela ụbọchị a ga-ekpebi ihe gbasara ya. Ọ ga-abụ n'ụbọchị Mọnde na-abịanụ."
Ụbọchị Mọnde ahụ ga-abụ abalị asaa nke ọnwa Nọvemba, 2022.
Mana ebee ka akụkọ a na atụọla Hushpuppi mkpọrọ afọ 11 si malite?
Akụkọ a malitere ifesa oge onye ntaakụkọ aha ya bụ Kemi Olunloyo wepụtara ya n'akara Twitter ya n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Nọvemba.
Ọ bụ ebe ahụ ka ya bụ akụkọ si malite ifesa, n'agbanyeghi na BBC edeela akụkọ ma kọwaa na ụlọikpe ekwubeghị kpọmkwem afọ ole Hushpuppi ga-anọ na mkpọrọ.
Onye bụ Huspuppi?
Ramon Abbas maọbụ Hushpuppi bụ onye a ma ama na soshal midia, ọ kachasị n'Instagram n'ihi etu o si egosi akụnụba ya.
N'oge ahụ ndị mmadụ che na ọ bụ onye ojiegoachụego, mana ọ bụ mgbe ndị uweojii mba United Arab Emirates jichiri ya, ka o doro ndị mmadụ anya na ọ bụ ohi ịntaneetị ka nwa amadị ahụ na-ezu.
E jidere Hushpuppi n'ọnwa June afọ 2020 ma bo ya ebubo na o zuru nde kwuru nde dọla ndị mmadụ na mba Amerịka.
Na Julaị 2020, gọọmentị mba UAE kpụgara ya mba Amerịka ka e kpee ya ikpe.
Hushpuppi kwetara n'ezie na ya zuru ohi oge a kpụtara ya n'ụlọikpe, mana ụlọikpe yigharịrị ụbọchị a ga-atụ ya mkpọrọ.