You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Agha Ukraine: Onye enyemaka Zelensky na-ekwu na ihe ruru mmadụ 13,000 anwụọla

Nke so agha malitere n'Ukraine kemgbe Febụwarị mgbe ndị agha Russia malitere iwakpo ha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Nnọọnụ na peeji anyị taa!

    Akụkọ ndị dị mkpa bụ ihe anyị ga na-ewetara unu taa!

    Daalụ nụ maka isonye anyị.

  2. INEC ekwuola ụbọchị ha ga-ebido ịnye ndị mmadụ Voters Card ha

    Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission ahọpụtala ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Disemba ruo ụbọchị iri abụọ na abụọ nke Jenuwarị afọ 2023 dịka ụbọchị ndị mmadụ ga-eji ewere vọters kadị ha.

    Ọ bụ n'akara Twitter ha ka ha depụtara nke a ma sịkwa na ha ebidola ịzụ ndị ọrụ ha dịka ndị si Borno, Taraba na Gombe steeti etu esi eji BVAS na akụrụngwa ndị ọzọ eme ntuliaka.

  3. Ụgbọoloko Abuja-Kaduna ga-ebido ọrụ n'ụbọchị mọnde - NRC

    Nigerian Railway Corporation ekwuola na ha ga-ebido njem n'okporo ụgbọoloko jịkọrọ Abuja na Kaduna steeti n'ụbọchị mọnde.

    Nke sitere n'akwụkwọ ozi ha zịgara ndị ụlọntaakụkọ Channels n'ụbọchị satọde.

    Cheta na ndị omekome tọọrọ mmadụ iri isi n'ọkpọrọ ụgbọoloko a n'ọnwa Maachị afọ a.

  4. A gbaala ụlọọrụ Inec ọkụ n'Orlu dị n'Imo steeti

    Ngalaba na-ahazi ntụliaka na Naịjirịa bụ INEC n’ịchafụ ekwuola na ndị omekome awakpola ma gbaa ụlọorụ ha dị n’Orlu ọkụ.

    Ha kwuru na ndị omekome ahụ tọọrọ ndị na-arụgharị ụlọ atọ n’ime mmadụ asaa ma mechaa tọghapụ ha.

    Kọmịshọna Inec n'Imo steeti bụ Sylvia Agu kwuru na ụlọ nke a gbara ọkụ bụ nke ndị omekome wakpoburu n'oge gara aga a na-arụgharị.

    O kwukwara na mwakpo ahụ kaara ị ka njọ karịa etu ọ dị ma ewezuga ndị uweojii gbataara ha ọsọ enyemaka ozugbo ozugbo.

    Nke a ga-eme ya ugboro anọ n'izuụka anọ a ga-awakpo ụlọọrụ Inec dị na steeti dị icheiche dịka awakpoburu Ogun, Osun nakwa Ebonyi steeti.

  5. Ụtụtụ ọma

    Igbo bụ Igbo deeme nu!

    Nnọọ na peeji anyị taa, biko gba mbọ soro anyị maka akụkọ dị ọkụ na-ewu na mbaụwa taa.

  6. Ọkụ gbara n'ụlọ dị n'Ebonyi Steeti ma mebie ngwa ụlọ ego ruru nde naịra 30

    Ndị mmadụ bi n’ụlọ dị n’okporoụzọ Udensi akwaala arịrị maka ọkụ gbara n’ụlọ ha nke mebiri ngwa ụlọ ego ha ruru nde naịra iri atọ.

    Otu onye bi n’ụlọ ahụ bụ Aleke Samson na-arụ ọrụ Bekee sị na ngwa ụlọ ya nakwa ego ya so na ihe ndị lara n’iyi n’ọkụ ahụ nke ọ sị malitere n’elere otu nke ehihie Fraịde.

    “A kpọrọ m sị na ụlọ anyị na-agba ọkụ. Onweghi ihe ọbụla ewepụtara n’ụlọ ahụ, kama o nweghi onye nwụrụ n’ọkụ a.”

    “Ndị nọ mgbe o mere sị na ọkụ a malitere n’igwe ọkụ latrik .

    “Achọrọ m ka gọọmentị gbatara anyị ọsọ enyemaka, anyị amaghizi ihe anyị ga-eme maka na ihe furu n’ọkụ a karịrị nde naịra iri atọ.

    Akụkọ kwuru na otu nwata dị afọ iri na otu gaara ịnwụ n’ọkụ ahụ dịka ọ nọ na-ehi ụra, ewezuga nwanne ya nwaanyị bịara zọpụta ya.

    Onyeisi ụlọọrụ mgbanyụ ọkụ n’Ebonyi Steeti bụ Raphael Ibiam sị na ha anataghị ozi ọsịsọ na tupu ha na-erute na ọkụ ahụ agbachaala ihe niile nọ n’ụlọ ahụ.

  7. Steetị ndị na-emepụta mmanụ agbidi ga-anata ego dị Tarịị naịra 1.7 (Trillion)

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari inyela ikike ka a kwụọ steetị ndị na-emepụta mmanụ agbịdị ego dị otu tarịị naịra na ụma asaa bụụgwọ gọọmentị etiti ji ha.

    Steetị itoolu ndị a gụnyere Abia, Akwa Ibom, Bayelsa, Cross River, Delta, Edo, Imo, Ondo na Rivers.

    Ọ sị na ego a bụ pasentị iri na atọ gbapụtara n’ego mmanụ agbịdị, atụmatụ Subsidy nakwa SURE-P nke si n’afọ 1999 ruo afọ 2021.

    Onyeisiala Buhari sị na o mere nke a iji kwanyere steeti ndị a ugwu na-agbanyeghi pati ọbụla ha nọ na ya.

    Ọ sị na a kwụọla ego dị ijeri narị naịra isii na ijeri iri abụọ na ise (N625B), na a ga-akwụ ndị fọrọ afọ mgbe oge ha ruru.

  8. Agha Ukraine: Onye enyemaka Zelensky na-ekwu na ihe ruru mmadụ 13,000 anwụọla

    Ihe ruru ndịagha Ukraine mmadụ 13,000 annwụọla kemgbe Russia malitere ibuso ha agha, nke dịka otu onyeọchịchị ebe ahụ siri kwuo.

    Mykhailo Podolyak, onye ndụmọdụ Onyeisiala Ukraine bụ Volodymyr Zelensky, kwuru na agbata ndịagha 10,000 ruo 13,000 anwụọla ugbua n’agha a.

    Ukraine anaghị ekwupụtakarị ọnụọgụgụ ndị nwụrụ anwụ n’agha a nke mere okwu Podolyak jịrị bụrụ ihe dị ụkọ dịka ọha ndị mmadụ na-eche ka enweta ozi maka nke a n’aka ndịagha mba ahụ.

    N'ọnwa Juun, e kwuru na ndịagha Ukraine nọ agbata 100 ma ruo 200 na-anwụ kwa ụbọchị.

    N'ọnwa gara aga, otu n’ime ndịisi agha mba Amerịka bụ Mark Milley, kwuru na ihe dịka ndị agha Russia mmadụ 100,000 nakwa ndị agha Ukraine mmadụ 100,000 anụwọla maọbụ bụrụ ndị merụrụ ahụ kemgbe mmalite agha ahụ.

    N'ozi si n’ihe onyonyo onyeisi EU bụ Ursula Von der Leyen kwuru n’ụbọchị Wenezde, na e gburu ndịagha Ukraine 100,000. Agbanyeghị, onye na-ekwuchitere otu EU Commission mechara kọwaa na ọ mere mmehie dịka ọnụọgụgụ ahụ bụ ngụkọ na ndị nwụrụ nakwa ndị merụrụ ahụ.

    Nnyocha na ngụkọ BBC News n’ebe etiti ọnwa Juun, chọpụtara na ndị nkiti 3600 nwụrụ n’agha oge ahụ. A na-atụ anya na ọnụọgụgụ a arịla elu karịa.

  9. Ụlọikpe enyela iwu ka emegharịa ntuliaka otu APGA n'Abia steeti

    Ụlọikpe ukwu dị n’Abuja akagbuola ntuliaka nke otu APGA mere n’Abia steeti n’ọnwa Mee ma kwuo ka e megharịa ya ọzọ.

    Binta Nyako bụ ọkaikpe ji ikpe ahụ kwuru na ihe akaebe gosiri na e nwere nrụrụaka na ntuliaka ochie ha mere.

    Nyako nyekwara otu APGA naanị abali iri na anọ iji hazigharị ma mee ntuliaka ọhụrụ iji nọchi anya nke mbụ e mere.

    Mkpebi a bụ mpụtara akwụkwọ Chikwe Udensi gbara mgbe e mechara ntuliaka ahụ na-ekwu na o kwenyeghi na ya.

    Greg Ibe bụ onye meriri na ntuliaka e mere n'ọnwa Mee mana Udensi gwara ụlọikpe ka akpọpụta aha nke ya dịka onye meriri maọbụ enye iwu ka emegharịa ya bụ ntuliaka.

  10. Ihe IPOB kwuru maka onye a sị bụ onye ESN ndị uweojii nwuchiri na Katsina

    Otu na-achọ nwereonwe Biafra bụ Indigenous People of Biafra (IPOB) ekwuola na ọ bụghị onye ọrụ nchekwa Eastern Security Network (ESN) ha ka ndị uweojii Katsina steeti nwuchiri ma gbaa n’anwụ.

    Emma Poweful bụ ọnụ na-ekwuru otu a kwuru nke a n’akwụkwọ ozi o wepụtara ma katọọ agwa ọjọọ ọ sị na ndị uweojii na-akpa iji metọọ aha IPOB.

    Ọ sị na ihe a ndị uweojii na-eme bụ iji bute ọgbaghara nwereike ibute ogbugbu ndị Igbo bi na mpaghara Ugwu.

    O kwuru na mkpagbu gọomentị Naịjirịa na ndị uweojii na-akpa ndị ESN na mpaghara Igbo ezurughi ha nke mere ha jiri buru ya gawazie mpaghara Ugwu.

    Powerful gara n’ihu kwuo na ESN enweghi ebe ọzọ ọrụ ha dị na-abụghị ichekwa mpaghara ala Igbo gbaa gburugburu.

    Cheta na ndị uweojii Katsina Steeti gbara otu nwata dị afọ 19 n’anwụ ma kwuo na ọ bụ onye otu ESN ha nwuchiri na steeti ahụ.

    Ha sị na aka nwamadị bụ Davis Uchenna bụ onye e ji Ibrahim Muhammed maara dị n’izu ohi, ịtọrọ mmadụ nakwa mpụ ndị ọzọ dị iche iche.

    Ndi uwojii sị na a nwuchiri ya na Katsina steeti n’ụbọchị 2 nke ọnwa Nọvemba, 2022. Na o ji ọnụ ya gbaa ama na ọ bụ onye ESN si n’Oji River nke Enugwu Steeti.

  11. Ndị uweojii anwụchiela nwaanyị echeere bepụrụ nwa ya isi

    Ndị uweojii Cross River steeti anwụchiela otu nne maka ebubo ịbepu nwa ya dị ọnwa iri isi n’ebe ahụ.

    O mere n'ebe akpọrọ Ugep dị n'okpuruọchịchị Yakurr dị na steeti ahụ n'ụbọchị Tuusde.

    Ha kwuru na ndị obodo ahụ gbakọtara ka ha tie nwaanyị ahụ ihe tupu ha anwụrụ ya gaa n’ụlọorụ ha.

    Ha kwukwara na ha na-enyocha nwaanyị ahụ mụrụ ụmụ abụọ isi ịmata maka ọnọdụ ahụike ụbụrụ ya ma nedokwa ya anya.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Irene Ugbo gwara BBC na ha amalitela nyocha banyere akụkọ nwaanyị ahụ.

    "Anyị chọrọ ị mata ihe ga-eme ka nwaanyị ahụ mee udiri ihe a o mere" ka o kwuru.

  12. Mba China ewepụla ụfọdụ usoro mmachi maka ọrịa Covid-19

    Mba China ewepụla ụfọdụ usoro mmachi ndị ha tinyere maka mgbochi mfesa ọrịa covid-19 ebe ahụ dịka igwe mmadụ malitere ime ngagharịiwe na mba ahụ megide iwu ndị a

    Ndị mmadụ gosiri iwe ha agbanyeghị na a nwụchiri ụfọdụ n’ime ha n’ihi ọkụ a sị gbagburu mmadụ iri n’otu ụlọ nke ha enweghị ike gbapụ n’ihi usoro mmachi nghagharị ndị mmadụ maka ọrịa a.

    Ọtụtụ mpaghara ndị dị na Shanghai na Guangzhou, obodo ebe ọrịa covid na-arị elu, so na-ebe ekwepụrụ usoro mmachi ndị a n’ụbọchị Tọọzde

    Osote onyeisiala mba ahụ kwupụtakwara na mba ahụ nọ “n’ọnọdụ ọhụrụ ugbua.”

    Nke dị iche n’atụmatụ mmachi tara akpụ niile mba China tinyere maka ọrịa a.

  13. Etu e si hụ ọgwụike n’ahụ ndị nsọ ‘Monk’ niile bi n’otu ụlọ ndị nsọ

    Ndị ọchịchị mba Thailand ekwuola na otu obere ụlọ nsọ ebe ndị nsọ nke okpukerechi ụka Buddhist (Monk) na-anọ na mba ahụ abụrụala ebe na-enweghị ndị nso dịka a a chụpụrụ ha niile na ahụrụ ọgwụ ike oge e mere nnyocha ime ahụ, n’ahụ ha niile.

    A hụrụ ọgwụike n’ahụ ha dị nsọ anọ, nke gụnyere onyeisi ụka ha, oge enyochara ime ahụ ha. Ọgwụ ike a hụrụ n’ahụ ha bụ ‘Methamphetamine’.

    Ụlọ nsọ a dị na mpaghara ugwu nke Phetchabun tọgbọzị chakoo dịka onye ọrụ gọọmentị si gwaa ndị ntaakụkọ.

    Otu onye ọchịchị n’akụkụ Boonlert Tintapthai nke mba ahụ kwuru na e mechara ziga ndị nsọ ndị ahụ niile n'ụlọọgwụ ma si ebe ahụ ziga ha ebe a na-agwọ ndị ụtọ ọgwụike tọbanyerela n’ụbụrụ.

    Nnyocha ime ahụ a na-abịa dịka mba a na-eme ọtụtụ atụmatụ achụmnta igbochi ọṅụṅụ nakwa ịzụ ahịa ọgwụike.

  14. Ụlọikpe enyela iwu ka a nwụchie onyeisi ndịagha Naịjriịa bụ Faruk Yahaya

    Ụlọikpe Ukwu dị nọ na Minna, isiobodo Niger Steeti, enyela iwu ka a nwụchie onyeisi ndịagha Jenaralụ Faruk Yahaya maka nlelị iwu ụlọikpe anya.

    Ndị ọzọ e nyekwara iwu ka a nwụchie gụnyere Olugbenga Olabanji bụ onye na-ahụ maka ọzụzụ nke ọkwa ya bụ ‘Commandant Training and Doctrine Command’maka mmejọ yiri nke onyeisi ya.

    Ọkaikpe Halima Abdulmalik kwuru na iwu a sochiri mkpesa e wetara n'ihu ụlọikpe na ha dara iwu nke akụkụ akwụkwọ ụlọikpe steeti ahụ bụ ‘Niger State High Court Civil’ n’usoro iwu ahụ ebipụtara n’afọ 2018.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ha abụọ ga-anọ n’ụlọ mkpụrụ ruo mgbe e mechara mkpebi n’okwu nlelị iwu anya nke a sị ha mere n’ikpe e kpere n’ụbọchị 12 nke ọnwa Ọktoba 2022.

    Ọkaikpe Abdulmalik yigharịrị ikpe a ruo ụbọchị asatọ n’ọnwa Disemba bụ ụbọchị aga ekpezie ya bụ ikpe.

    Nke a na-abịa dịka n'ọnwa Nọvemba, ọkaikpe Mobolaji Olajuwon nke ụlọikpe ukwu dị n'Abuja nyere iwu ka a nwụchie onyeisi ndị uweojii Naịjirịa (IGP) bụ Usman Baba ma tụnye ya na mkpọrọ ọnwa atọ maka inupụrụ iwu ụlọikpe nyere isi ma lelịa ụlọịkpe ahụ anya.

  15. Gọvanọ Okezie Ikpeazu ebinyela aka n'iwu ga-enye ụmụnwaanyị ikike iketa oke n'akụnụba nna ha

    Gọvanọ Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu akwadola ma binyeaka n'akwụkwọ iwu ọhụrụ na steeti ahụ ga-enyeụmụnwaanyị ikieke ịketa oke ma nweta akụnaụba n'ezinaụlọ nna ha.

    Ọ kọwara na iwu a nwere ike itinye steeti ahụ n’ụzọ ọma nke a hụbeghị mbọ ma kwalite mmepe obodo nakwa atụmatụ etinyere ndị nwoke, etinyere ndị nwaanyị.

    Ikpeazu mere nke a n'obi gọọmentị ya dị n'Umuahia bụ isiobodo steeti ahụ dịka o kwuru na ọchịchị ya ga-aga n’ihu na-ewepụta echiche ọhụrụ na ezi uche ga-abara ọha ndị mmadụ uru na steeti ahụ.

    Ọ gakwara n’ihu katọọ etu ọha si emekpa ụmụnwaanyị ahụ n’ụzọ ọjọọ dị iche iche.

    Abia steeti nọ n'ime Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa nke so n'akụkụ Naịjirịa ebe ụmụnwaanyị anaghị eketa oke na'akụnụba ọbụla na be nna ha.

  16. Farmgate: Ndị ụlọomeiwu Saụt Afrịka nwereike ịchụtu Onyeisiala Cyril Ramaphaosa n'oche

    Ndị ụlọomeiwu mba Saụt Afrịka nwereike imalite usoro nchụpụ onyeisiala ha bụ Cyril Ramaphosa n’oche ya n’oge adịghị anya dịka mpụtara nnyocha okwu banyere nrụrụaka metụtara ya nọ n’aka ha ugbua.

    Kemgbe ọnwa Juun ka a malitere ibo Ramaphosa ebubo ikpuchi agbagba ego e ruru $4m (£3.3m) a sị e zuuru n'ụlọọrụ ugbo ya dịka a sịkwa na ọ tọọrọ ma gobie ndị mere nke a iji kpuchie agba agba ego ahụ n’ihi na ọ kwesịghị inwe ụdịrị ego ahụ dịka onye ọchịchị.

    Akuko a gbara n’ọha nke a na-akpọ 'Farmgae' nke si n’aka otu kọmiti kwụrụ onwe ya ehibere maka nnyocha ya achọpụtala na Ramaphosa megburu iwu ndị nọ n’ọkwa oche ọchịchị mba ahụ ma nweeike megide iwu mgbochi nrụrụaka ha.

    Ọ gọnarịla ime ihe ọjọọọbụla, ma kwuo na ego ahụ sitere n'ire anụmanụ enyi ọhịa a na-akpọ ‘Buffalo’.

    E nyeferela ndị omeiwu ihe nchoputa a bụ ndị ga-enyocha ya ma kpebie ma ha ga-ebido itinye akwụkwọ ịchụpụ ya n’ọkwa ahụ n'izu na-abịa.

    Ọ fọrọ otu ọnwa ka Ramaphosa sonye n'ọgbakọ ga-ekpebi ma ọ ga-azọrọ pati ya bụ African National Congress (ANC) ọkwa onyeisiala nke abụọ n'afọ 2024. Akụkọ nrụrụaka a nwereike imebi atụmatụ ọchịchịRamaphosa ọzọ dịka ọ rịgọrọ n’ọkwa n’ihi ọha hụrụ ya dịka onye megidere atụmatụ nrụrụaka ọbụla.

    ANC ga-enwe nzukọ na ndị isi ha na Tọzdee, ebe a na-atụ anya na a ga-atụle okwu a.

  17. Ndị gọvanọ ka a ga-ata ụta maka ụbịam na-arị elu na Naịjirịa - Gọọmentị etiti

    Gọọmentị etiti na-ekwu na ọ bụ ndị gọvanọ steeti dị icheiche ka a ga-ata ụta maka ọnọdụ ụbịam na-akawanye njọ na Naịjirịa.

    Clement Agba bụ Mịnịsta nta na-ahụ maka bọjeetị na nhazi obodo kwuru nke a dịka Onyeisiala Muhammadu Buhari nwechara ọgbakọ n'Abuja, taa bụ Wenezde.

    Agba kwuru na dịka ngụkọ si gosi, ọnụọgụgụ ndị ụbịam na Naịjirịa karịrị na mpaghara ime obodo ndị na-emepeghị emepe.

    O kọwara na ọ bụ gọọmentị steeti dị icheiche ka ọ dịịrị ịhụ na ọnọdụ obibi ndụ n'ime obodo ndị a na-akawanye mma, maka na ọ bụ n'ime obodo ndị a ka e si akọpụta ihe oriri nke ndị mmadụ bi na mpaghara ndị mepere emepe na-eri.

    "Ihe mere ụbịam ji arị elu bụ na ndị gọvanọ na-eleghara ime obodo anya, ma tinye uche ha naanị na mpaghara ndị mepere emepe," Agba kwuru.

    "Anyị kwesịrị ị na-agwa ndị gọvanọ ka ha kwụsị ịrụ ọdụ ụgbọelu maọbụ 'flyover' n'ebe na-adịghị mkpa, kama ka ha rụọ okporoụzọ banyere ime obodo dị icheiche iji nye aka ka ndị ọrụ ugbo na-ebupụta ihe ubi ha mepụtara."

    Cheta na ụlọ ngụkọ Naịjirịa bụ 'National Bureau of Statistics' kwuru na ọnụọgụgụ ndị dara nnukwu ụbịam na Naịjirịa ugbua karịrị nde 133.

    Nke a pụtara na pasentị 63 ndị bi na Naịjirịa dara ụbịam n'ụzọ dị icheiche nke bekee na-akpọ 'multidimensional poverty'.

  18. Onyonyo gosiri ebe Tinubu na Joe Biden nọ abụghị eziokwu - APC

    Otu achụmnta vootu nke aka chịburu Legọs steeti bụ Bola Tinubu ekwuola na onyonyo na-efesa na soshal midia ugbua nke na-egosi ebe Tinubu na onyeisiala Amerịka bụ Joe Biden na-enwe ọgbakọ, abụghị eziokwu.

    Onye kwuru nke a bụ Bayo Onanuga onye bụ onyeisi otu achụmnta vootu Tinubu maka ọkwa onyeisiala Naịjirịa ọ na-azọ na ntuliaka 2023.

    Onanuga kwuru na foto ahụ bụ nke adigboroja nke ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị kpọrọ Tinubu asị na-ekesa iji metọọ aha ya.

    Tupu ndị APC enye nkọwa gbasara foto ụgha a, ọtụtụ ndị mmadụ amalitela ikesa ya bụ foto na twitter.

    Otu onye aha ya bụ Kennedy Nosa na Twitter kesara foto adịgboroja a n'abalị ụbọchị Tuzde, ebe ndị kesara ya site n'akara twitter ya karịrị mmadụ puku iri.

    Mfesa akụkọ ụgha dị icheiche abụrụla ihe na-eme kwa mgbe kwa mgbe dịka a na-akwado ntuliaka na Naịjiria.

    BBC nwere ngalaba a na-akpọ 'Disinformation Unit' na bekee, ndị ọrụ ha bụ ịgba akụkọ ụgha ndị a n'anwụ ma depụta nke bụ eziokwu.

  19. A ga-eji olundị na-akụziri ụmụakwụkwọ ihe na praịmarị - Gọọmentị etiti

    Mịnịsta agụmakwụkwọ bụ Adamu Adamu ekwupụtala iwu ọhụrụ nke gọọmentị etiti tinyere gbasara iji asụsụ ndị wee na-akụzi ihe n’ụlọakwụkwọ praịmiarị niile na Naịjirịa.

    Dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n’Abuja taa bụ Wenezde, Adamu kwuru na ọ ga-abụzi iwu iji asụsụ olundị wee na-akuziri ụmụakwụkwọ ihe malite na praịmarị nke mbụ ruo nke isii.

    A ga-ejikwa ngwakọta asụsụ olundị nakwa asụsụ bekee wee na-akụzi ihe n'ụlọakwụkwọ sekọndịrị nke nta, dịka Adamu si kọwaa.

    Adamu kwuru na iwu a bụ iji chekwaa asụsụ dị icheiche a na-asụ na Naịjirịa ka ha ghara ịnwụ, dịka nnyocha gosirila na asụsụ 29 anwụọla na Naịjirịa n'ọdị nso a,

    Ọ gara n'ihu kọwaa na iwu ọhụrụ a amalitela ịdị ire ugbua, mana ọ ga-ewe obere oge tupu gọọmentị ewepụta akwụkwọ nakwa ihe ndị ọzọ e ji akụziri ụmụaka ihe n'asụsụ olundị ha.

  20. A machiela ụmụakwụkwọ ịmakụ onwe ha nakwa iwu ọhụrụ ndị ọzọ na Polytechnic Ibadan

    Ụlọakwụkwọ mahadum Polytechnic nke Ibadan amachịela ndị nne na-enye nwa ara ibubata ụmụ ha na Klassị n’ụlọakwụkwọ ahụ.

    Iwu ọhụrụ ha kwukwara na anaghị anabatakwa ụmụakwụkwọ dị ime ka ha biri n’ebe obibi nke ụlọakwụkwọ ahụ dịka ha kwukwara na agaghịzị anabata ndị mmadụ n’ụlọakwụkwọ ịmakụ onwe ha.

    Ha machịkwara ndị mmadụ ibu dada, ise akara ọbụla n’ahụ ha nke Bekee na-akpọ ‘Tattoo’ nakwa ịkpọpu ahụ ha n’ụzọ ọbụla.

    Ọnụ na-ekwuru ụlọ ọrụ ahụ bụ Adewole Soladoye gwara BBC na ụmụ aka a ka ku n’aka nwereike ibute ihe ndọpụ uche nye ndị ọzọ n’ime klaasị. “Ọ dịrị ha ịmụ ụmụ, mana ha kwesịrị ịkpọga ha n'ụlọ ebe a na-edobe ụmụaka bụ ‘Creche’. Anyị na-ahapụ naanị ụmụnwaanyị dị ime ka na-abịa ma na-ala ụlọ ha, nke bụ iji hụ na ha natara enyemaka ma nsogbu dị. Ọ dị mkpa ịkwalite ụkpụrụ ọma maka ụmụ ụmụ anyị na-abịa n'ihu.”

    Ka ha si kwuo, onye ọ bụla dara iwu 23 ọhụrụ ndị ha bipụtara nwereike ịnwe opekatampe nkwụsị agụmakwụkwọ nwa mgbe nta ruo otu agba ‘semester’.

    Ụlọakwụkwọ ahụ na-adọkwa ụmụakwụkwọ ha aka na ntị na-ekwu na ọ bụ naanị ndị gụrụ akwụkwọ nke ọma na ndị gosiri agwa ziri ezi ka a ga-enye asambodo ma ha gụchaa akwụkwọ.