Alex Pereira anapụla Israel Adesanya ugo ọkaibe UFC championship
Alex Pereira nke Brazil akụnyela Israel Adesanya ụkwụ ọmajiji were nweta mmeri n’asọmpi ọkpọ 'UFC middleweight Championship' ha sọrọ n’abalị Satode na New York, mba Amerịka.
Pereira, onye sọnyerela na nani ọgụ ise na UFC bụrụụ ọkaibe dịka ọ napụrụ Adesanya ihe o ji ama mma kemgbe afọ atọ Adesanya chị ọgbọ dịka ọkaibe UFC.
Israel gbaliri n' agba nke mbụ rue atọ n'asọmpi ahụ mana ọ sọwara ngọngọ n’agba nke anọ dịka Pereira ji ọkpọ e-cheta-e-bewe kụwaa ya agba nke mere ka ogbuasọmpi gbubie ọgụ ahu.
Onye bụdị Israel Adesanya?
A mụrụ Adesanya na Legọs.
O bụkwa onye nwere ikike nwaamala mba New Zealand bụ ebe o toro.
Adesanya enwetala nzere dị icheiche n' ịkpụ ọkpọ.
Ọ ma eme Taekwando,ịgba egwu nakwa nka egwurewu ndị ọzọ.