You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Agha Ukraine: Onye enyemaka Zelensky na-ekwu na ihe ruru mmadụ 13,000 anwụọla

Nke so agha malitere n'Ukraine kemgbe Febụwarị mgbe ndị agha Russia malitere iwakpo ha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ọkụ agbagbuola ndị njem 14 na Kano

    Ngalaba na-ahụ maka nchekwa n'okporoụzọ bụ Federal Road Safety Corps ekwuola na ọkụ gbagburu mmadụ 14 na-eme njem n'ihe mberede okporoụzọ mere n'ụzọ Gaya-Wudil dị na Kano steeti.

    Onyeisi FRSC nke Kano bụ Zubairu Mato, onye gbara ama kwuru na ya bụ ọdachi mere n'ime obodo Rege dị n' Antukuwani,n'okporoụzọ si Kano gawa Gaya n'ebe Elekere Asaa nke ụbọchị ụka dịka ụgbọala bọọsụnwere akara GML 102 TA nke ụlọrụ njem Kano Line si Gombe steeti na ụgbọala Jeep sukọtara isi.

    Mato kwuru na mmadụ 13 nwụrụ ozugbo ebe ihe ahụ mere , ebe mmadụ isii merụụ ahụ mana otu onye n'ime ha mechara nwụọ n'ụlọọgwụ.

  2. A tụọla Hushpuppi mkpọrọ afọ 11 maka ime 'yahoo-yahoo'

    Ụlọikpe dị na mba Amerịka atụọla otu nwa afọ Naijiria a ma ama dịka Hushpuppi n'Instagram, nga afọ 11 na ụma maka iji intanetị zuo ego ndị mmadụ na mbaụwa.

    Hushpuppi, onye ezi aha ya bụ Ramon Abbas, na-esiri ndị Amerika nakwa ndịọ ọzọ si mba ofesi ọnya o ji anapụ ha akatamkpo ego dịka ụlọrụ FBI si kwuo.

    Nwa amadị ahụ nna ya na-agba taxi, nne ya na-agba mgbere na-egosi ọgaranya n'ihu akwụkwọ ọbaozi ya n'Instagram bụ ebe o nwere mmadụ nde abụọ na ụma asatọ (2.8 m) na-eso ya.

    Ọkaikpe kpere ya bụ ikpe na Los Angeles, nyekwara iwu ka ọ kwụọ mmadụ abụo n'ime ndị o gwuru wayo dọla 1,732,841 (£1,516,182).

    Hushpuppi ga-anọ ọnwa 135 na mkpọrọ etiti nke mba Amerịka.

    Gụọ ya n'uju ebe a

  3. Ntuliaka 2023: Olukayode Ariwoola eduola ndị otu ikpe mkpesa maka ntuliaka 2023 iyi ọrụ.

    Onyeisi ndị okaikpe bụ Jọstịs Olukayode Ariwoola eduola ndị otu kpe mkpesa maka ntuliaka 2023iyi ọrụ.E mere emume a n’ụbọchị Mọnde n’ogigie National Judicial Institute (NJI) dị n'Abuja.

    Dịke e duchara ndị a iyi ọrụ, Ariwoola dọrọ ndị a aka na ntị ma gwa ha ka ha ghara iji ọrụ ha mere ihe egwuregwu ma kwukwa na ọ gaghị anabata ụdịrị mmehie aka nakwa agwa na-ezịghị ezi ọbụla n’ọrụ ha.

    Emume ahụ a malitere ọgbakọ ọzụzụ ha aga eme ruo abalị anọ bụ nke ga-akwụsị n’ụbọchị Tọọzde.

    Ndị bịara emume a gụnyere Onyeisi Ụlọikpe Mkpegharị, Jọstịs Monica Dongban-Mensem; Onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa nke Independent National Electoral Commission (Inec), bụ Mahmood Yakubu; nakwa ndị ọkaikpe ndị ọzọ nke Ụlọikpe Mkpegharị.

    Onyeisi ụlọọrụ Inec kwuru na ha anatala mkpesa maka okwu ruru 600 si na ntuliaka ime ụlọ pati dị iche iche mere n’ebe mbido afọ a.

  4. Ihe gọọmentị Naịjirịa kwuru maka ịme njem n’okporo ụgbọoloko Abuja-Kaduna ọzọ

    Gọọmenti etiti Naịjirịa ekwuola na ụgbọoloko nke Abuja-Kaduna ga-amalite ịgba n'okporoụzọ ụgbọoloko dị ebe ahụ n'ọnwa Nọvemba a dịka ha kwụsịbụrụ nke a nwa mgbe nta kemgbe ọnwa Maachị.

    Mịnịsta njem na Naịjirịa bụ Mu’azu Sambo kwupụtara nke a n’ụbọchị Mọnde ka ọ na-eme mkwupụta ọrụ ha rụrụla na ministri ya n’Abuja.

    O kwuru na e tinyela nchekwa zuru oke n’okporo ahụ iji hụ na nchekwa dịịrị ndị njem mana o kwupụtaghị kpọm kwem ụbọchị ha ga-amalite ọrụ ọzọ.

    Sambo kwuru na mịnịstrị ahụ amụrụla akọ zuru oke site na mwakpo ahụ mere n'ọnwa Maachị nke butere nkwụsị ọrụ ụgbọoloko n'ụzọ Abuja-Kaduna.

    Mịnịsta ahụ kwukwara na etinyela usoro nchekwa metụtara ime nnyocha bugharị ndiị njem n'okporo ụgbọoloko ahụ ngwa ngwa.

    Dịka o si kwuo, usoro a ga-enye onyeisiala Muhammadu Buhari, ụlọọrụ ndị ụgbọ njem metụtara nakwa ndị ọrụ nchekwa ohere ịhụ ihe na-eme n’okpuru ahụ.

    Ụlọọrụ na-ahụ mka ụgbọoloko Naijiria bụ ‘Nigerian Railway Corporation’ (NRC) kwụsịrị ọrụ ụgbọ oloko n'ụzọ ahụ ka ndị a sị bụ ndị otu Boko Haram wakporo ụgbọoloko ndị njem na Kaduna n’ụbọchị 28 nke ọnwa Maachị, 2022.

    Ndị omekome ahụ ji ogbunigwe gbawa okporo ụgbọoloko ahụ ma tụba ogbunigwe n’ime ụgbọ ahụ, gbuo ụfọdụ ma tọọrọ ihe karịrị mmadụ iri isii. Mwakpo a kpatara ọtụtụ nkatọ nakwa iwe site n’aka ndị Naịjirịa nakwa ndị mba ọzọ.

    Ndị omekome ahụ mechara, tọhapụ oke ikpeazụ na ndị ahụ na tọọrọ n’ụbọchị ise nke ọnwa Ọktoba, 2022.

    Cheta na otu jịkọrọ ezinụlọ ndị a tọọrọ mwere ngagharịiwe ugboro ugboro iji gosi gọọmentị iwe ha maka ndị be ha e ji ruo ọnwa ole m ole.

  5. A nwara m ịzọpụta ndị nwụrụ na mberede ụgbọelu Tanzania

    Otu onye na-akụ azụ na mmiri Lake Victoria bụ ebe mmadụ 19 nwụrụ n'ọdachị ugboelu akọwaala ihe ọ hụrụ mgbe o ruru ebe ahụ.

    Majaliwa Jackson na ndị ọkụ azụ ibe ya ruru mmadụ atọ ji amara ụgbọ ha kụwa glassị iji nyere ndị nọ n'ụgbọelu aka rịpụta.

    Jackson kọwara na ọ nwara ịzọpụta ndị ọkwọ ụgbọelu abụọ tọrọ n'ime ụgbọelu mana ọ fọrọ obere ihe ka ọ nwụọ mgbe nke a mere.

    Mgbe ọ na-akọwara BBC etu ihe si mee, ọ sị "e ruru m ebe ahụ onye ọkwọụgbọelu tọrọ n'ime ejiri ntuziaka sị m kụwaa glassị, e nyere m anyụ iji kụwa ya bụ glassị mana otu onye kwụsịr m"

    "Ọzọ anyị anwaaa iji eriri adọye ụzọ ụgbọelu ahụ mana eriri dọbiri kụọ m n'ihu nke mere ka m kubie ma tetazie hụ onwe m n'ụlọọgwụ" ka o kwuru.

    Ndị ọkwọụgbọelu abụọ ahụ so na mmadụ 19 nwụrụ na mberede ụgbọelu ahụ mere na Tanzania n'ụbọchị ụka.

  6. A ga-eme akwamozu mmadụ 19 nwụrụ na mberede ụgbọelu na Tanzania taa

    Taa ka a ga-eme akwamozu mmadụ iri na itoolu nwụrụ oge ụgbọelu bu ha danyere n’osimiri Lake Victoria, na mba Tanzania n’ụbọchị ụka.

    Kassim Majaliwa bụ praịm minista mba ahụ, ga-edu ndị mmadụ n’iru uju na nkwanye ugwu ikpeazụ na ya bụ emume a ga-eme n’ọgbọegwuregwu nke Bukoba.

    Albert Chalamila bụ Kọmishọna mpaghara ahụ, kwuputere nke a n'ozi o ziputere.

    Cheta na ọ bụ mmadụ 24 ji ndụ ha pụta n'ime mmadụ 43 nọ n'ime ya bụ ụgbọelu nke ụlọọrụ Precision Air.

  7. Kenya agbaala nkwekọrịta ha na China nwere n'afọ 2014 n'anwụ

    Minista na-ahụ maka njem na mba Kenya bụ Kipchumba Murkomen, agbaala n’anwụ akwụkwọ nkwekọrịta maka ụgbọoloko ha na mba Chaịna nwere n’afọ 2014, ka ọtụtụ afọ e zoro ya ezo gachara.

    O mere nke a iji mezuo nkwa William Ruto bụ onyeisiala ọhụrụ mba ahụ kwere na ndị mba ahụ ga-ama ihe dị na ya bụ nkwekọrịta ha na Chaịna nwere, dịka ndị mmadụ na-ajụ maka ya kemgbe.

    N'ozi o ziputere n'ụbọchị ụka, Murkomen kwuru na o kesaala ya bụ akwụkwọ nkwekọrịta nye ndị isi n'ụlọomeiwu mba ahụ nakwa ndị ntaakụkọ.

  8. Presidential town hall meeting: Atiku, Tinubu abịaghị ọgbakọ Arise TV kpọrọ, Peter Obi, Kwakwanso , Kola Abiola bịara

    Ụfọdụ ndị Naịjiria gara nrụrịtaụka ndị na-azọ ọkwa onyeisiala nke Arise TV hibere n’abalị ụbọchịụka jụrụ na ndị na-abụghị ndị na-azọ ya bụ ọkwa agaghị ekwu okwu.

    Bola Tinubu nke APC na Atiku Abubakar nke PDP, naani Peter Obi nke Labour party, Rabiu Kwankwaso nke NNPP na Kola Abiola nke PRP gaara nrụrịtaụka nke ụlọọrụ ntaakụkọ Arise na otu na-akwalite ọchịchị onyekwuoucheya bụ Centre for Democracy and Development, (CDD).

    Gọvanọ Delta Steeti bụ Ifeanyi Okowa mabụrụkwa osote Atiku na ntuliaka 2023 nọchitere anya Atiku bụ onye gara njem mba ofesi

    Ọnụ na-ekwuru otu achụmvootu Tinubu bụ Ọkaiwu Festus Keyamo, kwuru na ihe mere na Tinubu abịaghị bụ ụlọntaakụkọ redio na TV kpọrọ ya oku nrụrịtaụka karịrị akarị, na ọ chọghị ọ za ụfọdụ oku, ya ahapụ ndị ọzọ.

  9. Mmadụ 19 anwụọla ka ụgbọelu dara n'ike na Tanzania

    Ụgbọelu mba Tanzania bu ndị njem adaala n'ike danye na mmiri Lake Victoria, dị n'obodo Bukoba, gbuo opekata mpe mmadụ 19 n'ụbọchịụka.

    N'ime mmadụ 43 nọ n'ụgbọelu ahụ, mmadụ 24 ka azọpụtara na ndụ, dịka ụlọọrụ nwe uụgbọelu ahụ bụ Precision Air si kwuo.

    Ọkwọụgbọelu ugboelu ahụ abụọ dị ndụ mana Praim minista mba ahụ kwuru na o nwere ike ha anwụọlarị.

    Ụgbọelu ahụ dara na nso ikperemmiri dị nso n'ebe nkwụsị ọdọụgbọelu dị n'obodo Bukoba.

    Ndị gbatagbata banyere n'ime mmiri were gụpụta ndị tọọrọ n'ime ụgbọmmiri ahụ danyere na mmiri.

    Otu onye aha ya bụ Abdul Nuri nọ n'ọdọụgbọelu ahụ na-eche ịlaghachi n'obodo Dar es Salaam,hụrụ ụgbọelu ahụ ka na-etinye isi na mmiri ezu ahụ kachasị n'Afrịka.

    "Ọ tụrụ anyị n'anya. Egwu jidere ndị mmadụ, ụfọdụ na-ebe akwa, ụfọdụ na-eti mkpu."

    "Na mpaghara ebe e si abata abata, ndị mmadụ nwekwara obi mmapụ - ọtụtụ n'ime ha bịara ịnabata ndị nke ha na-alọta."

    Nuri na ndị ọkụazụ bụ ụzọ rute ebe ọdachi ahụ mere kpakwara.

    Ha gwara ya na ha gbalịị banye n'ime ụgbelu ahụ oge otu n'ime ndị ọrụ ụgbọelu ahụ gbapere ụzọ azụ. ka ụgbọelu ahụ dachara.

    Ọdachi ahụ nke mere ebe elekere 8:50 bụ ajọ ọnọdụ ihu igwe ka a sị butere ya.

    Ndị ọrụ gbatgbata ji eriri kpụrụ ụgbọelu ahụ kpụta ya na nso ikpere mmiri.

  10. Ndewoonụ, Igbo ndị ọma

    Igbo ndị ọma na-eso anyị, ndewoonụ!

    Ụbọchị taa, maara ụnụ mma!

    Iseeee!

  11. COP27: UN adọọla aka na ntị maka ajọ mgbanwe eligwe dịka ọgbakọ ha na-amalita n'Ijipt

    Odeakwụkwọ ugwu nke ọgbakọ United Nations adọọla aka na ntị maka ajọ mgbanwe eligwe chere ụwa n'ihu ugbua nke ọ sị na-akawanye njọ.

    Antonio Guterres dọrọ ka na ntị a n'ọgbakọ COP27 malitere na Ijipt bụ ụka nke ndị isiala mba dị otu narị na iri abụọ (120) ga-abịa itinye ọnụ n'okwu etu a ga-esi kwụ ya bụ onye ukwu wara.

    Guterres sị a ekpomọkụ nke afọ asatọ gara aga kacha njọ.

    Mba ndị a ga-etinye ọnụ n'okwu gbasara ihe ha ga-eme iji gbochie ya bụ ajọ ihe nke mmetọ ihu eligwe nwereike ibutere mmadụ.

    Onyeisi ya bụ ọgbakọ COP27 bụkwa minista ndị Ejipt na-ahụ maka mba ofesi bụ r Sameh Shoukry rịọrịọ ndị bịara ya bụ ọgbakọ ka ha ghara ikwe ka oke agụụ na ụkọ ọkụ nke agha Ukren na Rọshịa butere bụrụ ọgbauhie nye mkpebi gbasara nkwa ha nwere maka idozi ihu eligwe.

    Ọ sị, "ọ dịara anyị niile bịara ọgbakọ a na Sharm el-Sheikh igosi na anyị maara ọrụ cheere anyị n'ihu nakwa mkpebi anyị imezu ya".

    UN's World Meteorological Organization gbara ihe niile ọtụ nke gụnyere ehi niile e kwesiri ịme ka ihe dị mma.

    Maazi Guterres zipuru ozi n'ihe onyonyo ebe ọ kpọrọ ya bụ akwụkwọ nchọpụta Global Climate Report 2022 "Usoro ọdachị nke ihu eligwe".

    A ga-eme ọgbakọ a izuụka abụọ.

  12. Soludo etiela ndị mbuze metutere n'Oko aka n'obi síte na-ịnye ha N30M

    Gọvanọ Chukwuma Soludo nke Anambra steeti enyela ndị mbuze metutara n'Oko dị n'Okpuru ọchịchị Orumba ọkpụrụkpụrụ ego dị nde Naịra iri atọ maka inyere ha aka.

    Soludo, onye hiwara kọmitii ga-ewepụta ụzọ a ga-esi memila nsogbu mbuze kpamkpam, sị na ya bụ njem ya mere mepere ya anya maka ọnọdu ndị obodo ahụ.

    Ndị nọ na ya bụ kọmitii bụ ndị Ezeobodo, ndị "Town Union President" nakwa ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu na gburugbur ebe ihe ndi a metutara.

    Ọ na ya ụ egọ ọ nyere ha bụ ka nwere na-enyere onwe aka tupu nchọpụta kọmitii ahụ apụta ihe gbasara etu a ga-esi chụọ ya bụ mbuze ọsọ ụkwụ eruala.

    Gọvanọ gakwara Umuchu, Iburugbu na-akụkụ ebe ya bụ mbude metutara n'UMuneze.

    Ọ kwere ndị ebe ahụ na ndị ọrụ ga-amalite ọrụ n'ụzọ ebe ahụ iji mee ka ụzọ dị mma maka ndị n'alọta emume Ekeresimesi.

  13. Ihe goomentị Naịjịrịa kwuru maka okwu ịkwụ ndị Asuu ọkara ụgwọọnwa

    Gọọmentị Etiti agọọla ebubo na ha kwụrụ ndị nkuzi mahadum ọkara ụgwọọnwa n’ọnwa Ọktoba dịka otu jịkọrọ ha bụ Academic Staff Union of Universities (Asuu) siri kwuo,

    Ọnụ na-ekwuru minsitri na-ahụ maka ọrụ bụ Olajide Oshundun kwuru na ọ bụ abalị ole ndị nkuzi a so otu Asuu rụrụ ọrụka a kwụrụ ya ụgwọ dịka usoro iwu ịkwụ ụgwọọnwa.

    Ozi ministri ahụ kwuru hoo haa na ọ bụ naanị ndị gbara bọọlụ ga-aracha oroma.

    Nke a so ebubo otu Asuu zịpụtara na gọọmentị etiti kwụrụ ha naanị ọkara ụgwọ ọnwa ha n’ọnwa Ọktoba.

  14. Mmadụ 19 anwụọla n'ụgbọelụ ndị njem dara n'iyi Lake Victoria dị na Tazania

    Ụgbọelu mba Tanzania bụ ndị njem adanyela na mmiri Lake Victoria na nso obodo Bukoba..

    A zọpụtaburu mmadụ 26 n'ime 43 buga ha ụlọọgwụ dịka ụlọntaakụkọ ndị na mba ahụ si kwuo.

    Ndị ọrụ gbatagbata na ndị ọkụazụ ji ụgbọmmiri achọ ihụ ma ha ga-azọpụta ndị fọrọ afọ.

    E kwuru na ọ dị ka ọ bụ oke ikuku na mmiri ozizo buturu ụgbọelu ahụ.

    Ụgbọelu ahụ nke ụlọọrụ ‘Precision Air’ nwe daara si obodo kachasị na Tazania bụ Dares Salaam na-aga Bukoba oge o zutere oke ikuku na mmiri ozizo.

    Ndị na-anya ya bụ gbọelụ gwara ndị mmadụ okwu site n'ime mpio ebe ha na anọ n'ugbọelụ ahụ mgbe ya bụ ihe mechere, mana onyeisiala mba ahụ sị na ha abụọ nwereike ịnwụla kemgbe.

    Ya bụ ụgbọelụ dara na ngwụcha okporoụzọ ya n'ọdọụgbọelu dị na Bukoba, nke a mere ndị ọrụ gbatagbata jiri nweeike ịba mmiri ahụ ga zọpụta ndị mmadụ.

    Abdul Nuri nọ na ya bụ ọdọụgbọelụ na-eche ka ya bụ ụgbọelu bata, ruo mgbe ha hụzịrị ya bụ ụgbọ gboro isiala.

    "Ya bụ ihe mapụrụ anyị obi. Ọtụtụ malitere itimkpu, ebe ụfọdụ na-ebe akwa", ka ọ gwara BBC.

    "Ọtụtụ ndị na-eche ịnabata ndị nke ka tiwara mkpuakwa".

    Akụkọ ka na-abịa.

  15. Ntuliaka 2023: Ihe mere ụlọikpe ji sị Inec wepụ aha Hamza Al-Mustapha dịka onye ji ọkọlọtọ AA

    Ụlọikope Ukwu nke Abuja enyela iwu ka ụlọọrụ na-ahazị ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (Inec) wepụ aha Hamza Al-Mustapha na-azọrọ pati 'Action Alliance' dịka onye ji ọkọtọ patị ahụ.

    Ụlọikpe ahụ kwuru na Inec gahiere site na nabata aha Mustapha ma nye iwu ka ha were aha ndị onyeisi alaka pati ahụ bụ Adekunle Rufai Omoaje weteere ha ma wepụ ndị nke Kenneth Udeze bụkwa onyeisi alaka ọzọ wetere.

    Omoaje mere mkpesa n’ụlọikpe n’aha ya nakwa aha pati ahụ maka etu Inec siri ghara iwere aha ndị o wetere ha kpọrọ ihe nke mere mpụtara ikpe ahụ jir nye iwu ka e werezie aha ndị ọ wegara Inec dochie ndị nke ọzọ.

  16. Etu e si gbapụta mmadụ abụọ tọrọ n’ala abalị itolu na South Korea

    A zọpụtala ụmụnwoke abụọ tọrọ n’okpuru ala ebe ha na-egwupụta ọnatarachi eji eme igwe na mba South Korea.

    Otu onye gbara afọ 62 ebe onye nke ọzọ gwara afọ 56, dịka e kwuru na ha abụọ anọghị n’ọnọdụ nkụda ahụike nke ọjọọ ya.

    Mmadụ abụọ a gaara iji pụta dịka e gwupụtara ha.

    Ha tọrọ n’okpuruala egwumiri ruo ogogo 200 mịta nke zere n’ụbọchị 26 nke ọnwa Ọktoba n’obodo Bonghwa dịka agbapụtara n’ụbọchị nke anọ n’ọnwa Nọvemba.

    Onyeisiala mba a bụ Yoon Suk-yeo toro ndị ọrụ gbata gbata ma kwuo na mgbapụta ndị a bụ ‘ezigbo ihe iribama tụrụ ọha n’anya’.

    Ndị ọrụ gbata gbata kwuru na ihe so zọọ ndị ndụ bụ na ha nọ na-aṅụ mmiri si n’elu na-adabata n’ime ụmị ebe ha tọrọ dịka ha ji kọfị mere nrị n’abali itolu ahụ.

    Nwa nwanne otu n'ime ụmụnowke abụọ ahụ kọwara etu nwanne nna ya si ghara ịmata ya mgbe o zutere ya, n'ihi na o yi mkpuchianya o ji chekwa anya maka ọkụ ihe na-awụba ha n’anya ka ha nọchara abalị itolu n’okpuru ala ebe gbara ọchịchịrị.

    Nke a na-abịa dịka oge iru uju ka na-akpọtụ na mba South Korea, soihe ọdachị gburu ihe karịrị mmadụ 150 n’isiobodo Seoul n'izu gara aga.

    Ihe ọdachị so nzugbu azogburu ndị mmadụ n’emume ‘Halloween’ ebe ahụ.

  17. Jack Dorsey so nwerebuo Twitter ekwuola okwu nke mbụ ya kemgbe Elon Musk malitere ichi ụlọọrụ ahụ

    Onye so mepụta Twitter na onye sobu nwere ụlọọrụ ahụ bụ Jack Dorsey ekwuola ekwu mbụ ya maka ọtụtụ ndị mmadụ achụrụ n’ọrụ n'ụlọọrụ ahụ ma na-arịọ mgbaghara makaetu Twitter "tolie elu ngwa ngwa".

    A na-achụ ọkara ndị ọrụ n’ụlọọrụ ahụ n’ọrụ dịka Elon Musk zụtara ya na nkwekọrịta ego ya ruru nde dọla 44.

    Musk onye malitere ịbụ onyeisi ụlọọrụ ahụ n’otu izuụka a gara aga, ekwuola na “enweghị ọzọ ọ nwereike ime na-abụghị ịchụ ndị mmadụ n’ọrụ” nke bụ ụzọ ha ga-esi zọọ ya bụ ụlọọrụ n’ihi na ha na-emefu ihe karịrị nde dọla anọ kwa ụbọchị.

    Ụfọdụ ndị ọrụ Twitter amalite izipụta ozi gosiri na obi adịghị ha mma maka nke a n’akara Twitter ha.

    Dorsey nwebụ ụlọọrụ a tiri ndị ụlọọrụ ahụ aka n’obi ma kwuo na “gbasiriike” ma kwuo na ọ ma na ndị aga-achọta ụzọ ọzọ na-aga n’ihi agbenyeghị na ọ gaghị a dịrị ha mfe.

    Ọ gara n’ihu dee “Ana m arịọ mmadụ niile mgbaghar maka itinye unu n’ụdịrị ọnọdụ a ọkachasị site n’ịkwalite ụlọọrụ a ka o too ngwa ngwa”

    "Ọ bụ ihe na-aju m afọ na unu niile rụrụla n’ụlọọrụ a nyere m ịhụnanya unu n’oge ọrụ anyị. Anaghị m atụ anya na unu ga-ahụ m n’anya etu a ọzọ ugbua maọbụ oge ihe isike a gachaa, a ghọtara iwe unu.”

    Ọtụtụ na-eche na nkwupụta ya a gosiri nkwado ya nye atụmatụ ịchụ ndị a n’ọrụ. Dorsey dị afọ 45 kwadoro ọchịchị a Musk wegharala n’ụlọọrụ ahụ agbanyeghị na ọtụtụ na-atụ egwu na Musk ga-aghazịgharị usoro ọrụ ha ọkachasị n’okwu inye na ịnapụ ndị na-ekwu okwu dị aṅa ikike iji akara Twitter ha gbasaa ozi.

    Iji saa okwu a, Musk ekwuola na atumatu ụlọọrụ ahụ agaghaị "agbanwebeghị ma ncha.”

    Ọtụtụ ụlọọrụ ukwuu ndị ama ama akwụsịla itinye ego maka mgbasaozi eji ere ahịa na Twitter na nso nso nke gụnyere ụlọọrụ Volkswagen, General Motors na Pfizer.

  18. Atiku na-ekwu ka e tinye Obasanjo n'ihu ego Naịjirịa CBN na-ahazịgharị ugbua

    Atiku Abubukar bụ onye ji aha pati Peoples Democratic Party (PDP) azọ ọkwa onyeisiala 2023 ekwuola na ọ ga-adị mma ka e tinye ihu aka chịbụrụ Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo n’ihu ego ụlọakụ ụkwụ Naịjirịa na-achọ ihazịgharị na nso nso a maka etu o siri bụrụ onye ọchịchị e kwesiri ịkwanyere ugwu pụrụiche.

    O kwuru nke a site n’akara Twitter ya dịka o toro Obasanjo maka ịnọ n’isi otu mkparịtụka nwetere udo n’agha a na-alụ na mba Ethopia kemgbe afọ abụọ n’izu a.

    Obasanjo n’ezie so kpee udo n’okwu dị n’etiti Gọọmenti Etiopia na ndị nnupụisi nke Tigrayan mgbe kemgbe afọ abụọ esemokwu dapụtara n’etiti ha abụọ nke tarala isi ọtụtụ puku mmadụ ma tinye ihe ruru nde kwuru nde ndị mmadụ n’ọnọdọ ndị na-achọzị enyemaka.

    Atiku kwuru na “A ma nna m ukwu, o mebuola ihe dị etu a na mba Liberia nakwa São Tomé and Príncipe mgbe mụ na ya nọ n’ọchịchị”

    “Aga m ahọpụta ya dịka onye kwesịrị inweta ihe nrite n’asọmpị ndị kacha kpee udo n’ụwa bụ asọmpị ‘Nobel Peace Prize’”

    Cheta na Atiku na Obasanjo chịkọrọ ọnụ n’ọkwa Onyeisiala na osote ya nke Atiku nọrọ dịka osote ruo afọ asatọ ha chịrị.

    N'ụbọchị 26 nke ọnwa ọktọba onyeisi ụlọakụ ukwu Naịjirịa, Central Bank of Nigeria (CBN), bụ Godwin Emefiele kwuru na ha ga-ahazịgharị ahụ ego Naịjirịa gụnyere N200, N500, na N1,000 malite n’ụbọchị 15 nke ọnwa Disemba, 2022, ebe a ga-akwụsị nnabata iji ego ochie Naịjirịa zuta maọbụ ree ahịa malite n’ụbọchị 31 nke onwa Jenụwarị 2023.

  19. Idemmiri enyela mmadụ karịrị otu nde ọsọ n'ụlọ ha na Naịjirịa

    Gọomentị etiti ekwuola na idemmiri achụpụla ihe karịrị mmadụ otu nde site n’ụlọ obibi ha na Naịjirịa na nso nso.

    Minista na-ahụ maka enyemaka na nchịkwa ọdachi bụ Sadiya Umar-Faroug kwuru nke a na Fraịde n’emumu ncheta ụbọchị ndị gbara ọsọndụ na Naịjirịa

    “Ana m eti ọtụtụ mmadụ mkpamkpa idemmiri na Naịjirịa metụtara aka n’obi. Ọdachi a achụpụla ihe karịrị mmadụ otu nde n’ụlọ ha na Naịjirịa gbaa gburugburu.”

    N’ozi ọzọ si n’akara Twitter ya, Umar-Faroug sị na ha ehiwela ụlọ obibi dị iri anọ na anọ n’ime steetị iri abụọ na anọ, na a kpọgala ndị idemmiri metụtara gawa n’elu ala ebe mmiri kọrọ.

    Cheta na idemmiri malitere ịkpa nnukwu ike na Naịjirịa n'ihe dịka n'ọnwa Sepụtemba n'ihe oke mmiri ozuzo, mgbape ọdọ mmiri Ladgo 'Dam' dị na Kameruun nakwa mgbagọ elu nke oke osimiri.

    Nke a mebiri ọtụtụ ụlọ obibi, ọrụ ugbo, okporoụzọ, ụlọahịa nakwa ngwa ndị ọzọ e ji ebi ndụ, tinyekwara ọtụtụ ndị nwụrụ n'ihi ya.

    Steetị ndị ọkachasị metụta gụnyere; Kogi, Anambra, Rivers, Bayelsa, Delta na ndị ọzọ.

  20. Igbo ndị ọma anyị ekelee ooo

    Obi ọma ka anyị ji anabata unu n'ọgbakọ anyị n'ụbọchị.

    Buru oche gị bịa gere akụkọ ndị gbapụtara ihe taa.