Ọkụ agbagbuola ndị njem 14 na Kano
Ngalaba na-ahụ maka nchekwa n'okporoụzọ bụ Federal Road Safety Corps ekwuola na ọkụ gbagburu mmadụ 14 na-eme njem n'ihe mberede okporoụzọ mere n'ụzọ Gaya-Wudil dị na Kano steeti.
Onyeisi FRSC nke Kano bụ Zubairu Mato, onye gbara ama kwuru na ya bụ ọdachi mere n'ime obodo Rege dị n' Antukuwani,n'okporoụzọ si Kano gawa Gaya n'ebe Elekere Asaa nke ụbọchị ụka dịka ụgbọala bọọsụnwere akara GML 102 TA nke ụlọrụ njem Kano Line si Gombe steeti na ụgbọala Jeep sukọtara isi.
Mato kwuru na mmadụ 13 nwụrụ ozugbo ebe ihe ahụ mere , ebe mmadụ isii merụụ ahụ mana otu onye n'ime ha mechara nwụọ n'ụlọọgwụ.