Fashola akpọkwala anyị aha - Ụlọomeiwu ukwu

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọomeiwu ukwu agwala Babatunde Fashola bụ minista ọrụ na ụlọ, ya gbara ọgwụ ya ṅụọ n’ihi ụta ha sị na ọ tara ha maka ọnọdụ ụfọdụ okporoụzọ gọọmentị etiti na-elekọta dị na Benue steeti.
N’ozi ha si n’aka Ajibola Basiru kesaa n’ụbọchị Sọnde, ha kwuru na ọ bụghị ndị omeiwu ka e kwesịrị ịta ụta maka ụzọ ọjọọ ọbụla dị na Naịjiria.
Ha kwuru sị na ọ bụ "ezigbote akụkọ ụgha", ma kwuo na Fashola na-achọ ịrakọ ndị omeiwu na ndị ọha site n'ibo ha ụdịrị ebubo a.
Basiru kwuru na Fashola kwuru okwu a n'ụlọọrụ ya n'Abuja, oge ndị larala ezumiike nka nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu si mpaghara Benue Saụt bịaara ya njem nleta.
Ha bịara ikpesara ya maka ụzọ ọjọọ ndị dị na mpaghara ha.












