Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ndị NYSC ga-eme nnyocha coronavirus tupu anabata ha n'ogige ọzụzụ ha

    NYSC

    Ebe foto si, NYSC

    Ụlọọrụ NCDC ekwuola na ha ga-eme ụmụntorobia ji otu afọ efe ala nna nnyocha coronavirus tupu ha abata ogige ọzụzụ ha Bekee kpọrọ orientation camp.

    Onyeisi ndị ụlọọrụ a bụ Chikwe Ihekweazu bụ onye kwuru nke a mgbe ọ na agwa ndị ntaakụkọ okwu ụnyaahụ siri na nke a ga-enyere ha aka ịmata ka ọnọdụ dị na ebe ndị ọzọ na Naịjirịa.

    O kwukwara na gọomentị amalitela nke ha kpọrọ Infection Prevention and control Vangard bụ nke ọ rịọrọ ndị ntorobịa chọrọ isonye ka ha bịa tinye aha ha maka ọzụzụ.

    Ihekweazu sị na ha na-atụanya na nne na nna ga-enyeaka ịgbaziri ụmụ ha ezigbo ụzọ maka ihe ha kwesiri ịme.

  2. Ụnụ asaala chi e! Ndu mmiri, ndụ azụ. Mmiri atala ma azụ anwụla.

  3. Ka chi fo

    Ọ bụ ebe ka anyị ga-apịachi nke taa.

    Sonyere anyị echi.

    Ndewo.

  4. Trump ekelela ụmụ Naijiria meere ya mgbasaozi nkwado

    Onyeisiala Mba Amerịka bụ Donald Trump eekela ụmụ Naijiria gosiri ya nkwado site na ngaghrị ha mere ya na Naijiria.

    O kwuru 'ọ bụ nnukwu ihe nkwanye ugwu."

    Taa ka mba Amerika mere atụmvootu iji họpụta otu n'etiti Trump na Joe Biden.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  5. Jiri otu nkeji gere akụkọ gbasara Coronavirus ka ọ dị n'Afrịka

  6. Umahi ewetuola ụgwọ akwụkwọ mahadum 'Ebonyi State University'

    David Umahi

    Ebe foto si, David Umahi/Facebook

    Gọvanọ Ebonyi steeti bụ David Umahi ewetuola ụgwọ akwụkwọ ụmụakwụkwọ mahadum "Ebonyi State University."

    Dịka ozi nke odeakwụkwọ gọọmenti steeti ahụ bụ Kenneth Ugbala binyere aka ma wepụtara, nd Umahi iji puku naira iri abụọ wetuo ụgwọ akwụkwọ ndị bụ ụmụafọ Ebonyi steeti ma were pnaira puku iri wetuo nke ndị abụghị ụmụafọ steeti ahụ.

    Dịka Umahi siri kọwara , nke a bụ iji belatara ndị nne na nna ụfụ so ụkọ ego nke ọrịa coronavirus butere.

    Akwụkwọ Mgbasaozi si n'aka Gọọmenti Ebonyi steeti

    Ebe foto si, David Umahi/Facebook

  7. Oloidi, onye nkuzi mahadum 'University of Nigeria' anwụọla

    Ola Oloidi

    Ebe foto si, Prof Ozioma

    Ụmụakwụkwọ nakwa ndị nkuzi na mahadum 'University of Nigeria Nsukka' nọ n'iru ụjụ dịka otu onye nkuzi mahadum ahụ kajara akaja bụ Ola Oloidi hapụrụ ụwa ụbọchị Monde, abalị abụọ nke ọnwa Novemba afọ 2020.

    Onyeisi ngalaba "Fine and Arts" na mahadum ahụ bụ Ọkammụta Ozioma Onuzulike kwuru na "ọ zụọla ọtụtụ ndị nwere PhD."

    "Ọ bịara Nsukka na 70s, oge ọtụtụ n'ime anyị ka na-asa ahụ n'afọ n'afọ."

    Ndị mara Oloidi na-ekwu na ya bụ onye nkuzi bụ onye obi umeala na-akpakarị ọchị.

    Onuzulike kọwara sị, " Ebe ọbụla ọ hụrụ gi ọ ga-amasị gị njakịlị, gwusa gị egwu. Ndị mmadụ jiri ya mara ya."

    Oloidi ebiela ala Igbo ihe karịrị afọ iri atọ.

    Ola Oloidi tupu ọ nwụọ bụ ọkaibe na nkuzi " Art History" na "Art Criticism" ma bụrụ kwa onye a ma dịka "nna 'Modern Nigerian Arts History'.

    Ọ bịdoro ọrụ na mahadum 'University of Nigeria Nsukka' n'afọ 1976 dịka 'Lecturer II' rute afọ 1996 oge o nwetara nzere 'Professor' n'afọ 1996.

  8. E nweghị 'Restructuring,' o nweghị ebe Naijiria ji azụ aga- Ohaneze, Afenifere, Ihe Nnamdi Kanu, Onyeka Onwenu, Pat Utomi na ndị ọzọ kwuru maka 'restructuring', mmekọrịta Yoroba na Igbo

    Nnamdi Kanu,Onyeka Onwenu,Ayo Adebanjo,Pat Utomi

    Ebe foto si, Getty Images,Onyeka Onwenu

    Ndị nwere agba n'Igbo nakwa ala Yoroba ekwuola na Naijiria agaghị enwe ọganihu ọbụla ma ọ bụrụ na enweghị nhazigharị na mpaghara na mpaghara nke Bekee kpọrọ 'Restructuring'.

    Ha kwuru nke a n'ọgbakọ 'Handshake Across the Niger' nke otu Njịkọ Ụmụnna hibere ụbọchị Monde ma kpoo noku ka ndị Igbo na ndị Yoroba jikọọ ọnụ were chọba ọdịmma Ndịda Anyanwụ.

    Lee ihe ụfọdụ ndị bịara ọgbakọ ahụ e mere n'ikuku kwuru:

    Ayo Adebanjo

    Ayo Adebanjo

    Okenye Yoroba bụ Ayọ Adebanjo gwara ndị Igbo sị, "a na-aghọgbu ụnụ si na-aga enye ụnụ ọkwa onyeisiala" ma sị na ọ kara onye ọbụla mma ka a hazịgharịa Naijiria, ugbua.

    "E meghị otu a ị mara ihe a chọrọ bụ ka Naijiria kewasịa."

    O kwuru na etu e siri hiwe Iwu Naijiria mere ya ka ọ bụrụ naanị otu mpaghara nwere ike ikpebi ebe onyeisiala ga-esi.

    "Onye ọbụla megidere 'restructuring' bụ onye iro Naijiria. Buhari bụ onye iro Naijiria n'ihi na ọ jụrụ ịhazigharị Naijiria ugbua."

    Onyeka Onwenu

    Onyeka Onwenu

    Ebe foto si, Onyeka Onwenu

    Otiegwu a ma ama bụ Onyeka Onwenu bụ onye jiri ngagharịiwe EndSARS maa atụ tụrụ arịrị sị na oge ọbụla e nwere nsogbu maọbụ nghọtahie na Naijiria, na ndị ọzọ na-ebokarị ya ndị Igbo.

    "Aghọtaghị ihe butere oke akpọmasị a. Ọtụtụ ndị iji nnukwu anya ele gara n'ihe onyonyo TV kwuo na ndị Igbo bụ ha nyụrụ ihe na-esinụ."

    O kwuru na oke asị e e nwere n'ebe ndị Igbo nọ mere ka ndị Igbo na-achị obi n'aka mgbe ọbụla.

    Ọnwenu onye rụtụrụ aka na nkwenye ndị Yoroba na nke ndị Igbo yitere, kporo oku ka ha jịkọta ọnụ were chọba ihe dara mmiri.

    Pat Utomi

    Pat Utomi

    Ebe foto si, Getty Images

    Ihe so mee ka Naijiria na-akpụ afọ n'ala bụ na na anyị nwere ọchịchị bute ka e rie.

    Utomi kwuru na nsogbu ọtụtụ nwere bụ na " anyị nwere bụ anyị anaghị agụ akwụkwọ maka ihe mere oge ochie" ọs ị na ọ bụ ya mere na ndị Igbo na ndị Yoroba si n'otu ezinaụlọ ma e lee asụsụ ha.

    Nnamdi Kanu

    Nnamdi Kanu kwuru na ma e tere ogiri ma e tere ụgba, na nkwenye ya bụ na nnwereonwe nke a ga-esi na referadum nweta.

    Nnamdi Kanu

    Ebe foto si, Getty Images

  9. Ala ọma jijiji mere na Turkey ataala isi mmadụ 100

    Ala ọma jijiji na Turkey

    Ndị nwụrụ n’ihe mberede ala ọma jijiji mere na mba Tọkị n’ụbọchị Fraịde gara aga eruola otu narị mmadụ ugbua.

    Mana n’ụbọchị Mọnde, ndị ọrụ gbatagbata zọpụtara ụmụ aka abụọ gbara afọ atọ na afọ iri na anọ na ya bụ ihe mberede.

    Ihe karịrị mmadụ narị abụọ merụkwara ahụ na ya bụ ihe mberede.

  10. E

    Ndịagha Naịjirịa ejichiela ụfọdụ ndị otu ha e gosiri n’onyonyo ebe ha na-apịa otu nwaagbọghọ ụtarị n’ike n’Oyo steeti, maka na ha sị na o yi akwa adịghị mma.

    Akụkọ kwuru na ndị agha ahụ jidekwara ụfọdụ ụmụokorobịa ma kpụchaa ha isi, maka na ha sị na ha bu ntutu ekwesịghị ekwesị.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Onyeisi otu ndịagha a kpọrọ 'Operation Burst', rịọkwara ezinụlọ nwata nwaanyị ahụ ka ha gbaghara ihe niile ndị agha ahụ mere ha.

    O kwuru na ndị mere ihe ahụ ga-anata ntaramahụhụ dịịrị ha.

  11. Gọọmentị ga-akwado ụlọọrụ ụgbọelu maka ihe isi ike coronavirus kpatara

    Hadi Sirika

    Ebe foto si, Hadi Sirika

    Nkọwa foto, Hadi Sirika, Mịnịsta na-ahụ maka njem na Naịjirịa

    Gọọmentị etiti ewepụtala ijeri naịra ise iji nyere ngalaba njem ụgbọelu aka ma kwado ha maka ihe isi ike so ọrịa coronavirus n’azụ.

    Mịnịsta njem ụgbọelu bụ Hadi Sirika kwuru nke a n’ụbọchị Mọnde oge ya na ndị omeiwu nwere mkparịtaụka n'Abuja n'ụbọchị Mọnde.

    Mkparịtaụka a bụ maka mmegharị ndị omeiwu chọrọ imegharị iwu hibere otu dị icheiche dịka 'Nigerian Civil Aviation Authority' (NCAA), 'Nigerian Airspace Management Agency' (NAMA), 'Accident Investigation Bureau' (AIB), 'Nigerian College of Aviation Technology' (NCAT), 'Nigerian Meteorological Agency' (NIMET) na 'Federal Airports Authority of Nigeria' (FAAN).

    Mana ụfọdụ ndị omeiwu a kwuru na ijeri naịra ise agaghị ezu iji kwado ụlọọrụ ụgbọelu dị icheiche na Naịjirịa.

  12. NECO akpọpụtala ụbọchị uleakwụkwọ ha ga-amalite ọzọ

    NECO

    Ebe foto si, Neco

    Ụlọọrụ uleakwụkwọ bụ National Examiniation Council (NECO) ekwuputala ụbọchị Mọnde, na ha ga-amalitekwa uleakwụkwọ ha nke afọ 2020 maka ụmụakwụkwọ ndị ngụcha sekọndịrị na Naịjirịa gbaa gburugburu ụbọchị itoolu nke ọnwa Nọvemba a.

    Ọnụ na-ekwuru ha bụ Azeez Sani kwuru nke a ụbọchị Mọnde maka ya bụ uleakwụkwọ ha kwusiburu n'ike maka ngagharịiwe Endsars.

    N'olu ya, Saani sị na " n'ihi nlọhachite udo na Naịjirịa nakwa Abuja, anyị ga-amalitekwa uleakwụkwọ ahụ akwusiburu site n'iwepụta usoro ọhụrụ a aga eji mee ya site na ụbọchi itoolu nke ọnwa Nọvemba ruo ụbọchị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Nọvemba 2020."

    O kwuru na ha ga-ezigara ụlọakwụkwọ na ndị mmadụ usoro a na ọnwa a.

  13. Unu asaala chi e! Ndụ mmiri ndụ azụ

  14. Jiri otu nkeji gere akụkọ gbasara coronavirus ka ọ dị n'Afrịka

  15. Mpụtara ule Waec afọ 2020 apụtala

    Waec

    Ụlọọrụ nhazi ule ndị na-agụcha sekọndịrị n'Ọdịda Anyanwụ Afrịka, bụ 'West Africa Examination Council' (Waec), ewepụtala mpụtara ule nke afọ 2020.

    Onyeisi ụlọọrụ a na Naịjirịa bụ Patrick Areghan kwuru na ihe karịrị mmadụ otu nde na ọkara debanyere aha iso lee ule nke afọ a.

    N'ime ha ihe karịrị pasentị iri asatọ na isii (86.99%) nwetara akara 'credit' ise mọbụ karịa.

    Mmadụ pasentị iri isii na ise na ụma nwetara 'credit' ise, tinyere Asụsụ Bekee na mgbakọ (English & Maths).

    Mana ihe karịrị mmadụ puku narị abụọ na iri na ise agaghị ahụ mpụtara ule nke ha, n'ihi ebubo nrụrụaka ule.

    Areghan kwuru na nnyocha ka na-aga n'ihu maka ndị a e boro ebubo nrụrụaka.

    O kwuru na onye ọbụla a chọpụtara na aka ya dị ọcha, a ga-ewepụta mpụtara ule nke ya.

    Ndị lere ule a gụnyere ndị nọ na ogogo sekọndịrị nke isii na mba Benin Republic, Ivory Coast, Equatorial Guinea na Naịjirịa.

    Waec Result

    Ebe foto si, Waec

    Etu ị ga-esi achọpụta ihe i nwere na Waec

    Maka ndị so wee lee ule Waec nke afọ 2020, lee etu ị ga-esi chọpụta ihe i nwere:

    • Banye n'ọbaozi Waec nke bụ www.waecdirect.com
    • Tinye akara ule gi nke bekee kpọrọ 'Examination number'
    • Tinye akara 'smartcard' gị, bụ nke e nyere gị oge ị na-edebanye aha maka ule a
    • Tinye afọ i lere ule, nakwa ụdị ule nke ọ bụ, iji maa atụ e nwere nke a kpọrọ 'private' nakwa 'candidate results'.
    • Itinyechaa ihe ndị a, nwetụ ndidi ka kọmputa buputa mpụtara ule gi
  16. Bobby Charlton nwere ọrịa dementia

    Bobby Charlton

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị mmadụ na-ezitere Bobby Charlton ozi ekele dịka akụkọ pụtara na o nwere ọrịa dementia.

    Charlton gbaara mba England na otu Manchester United bọọlụ n’oge gboo.

    Ọ gbara afọ iri asatọ na atọ (83).

    Ọrịa 'dementia' bụ ọrịa na-emetụtakarị ndị okenye.

    Cheta na onye tọrọ Bobby Charlton bụ Jack Charlton nwụrụ n'ọnwa Julaị afọ a, dịka ọ rịachakwara ọrịa 'dementia'.

    Jack sokwa gbaara England n'asọmpi iko mba ụwa afọ 1966 ebe ha nọrọ turu ugo.

  17. Ka chi foo

    Rahụnụ jụụ.

    Echi ga-efotere anyị iheọma. Iseee.

  18. Arsenal apịgbuola Manchester United ka anwụ nta

    Pogba

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Pogba emetela penariti atọ kemgbe ọ malitere ịgba bọọlụ n'afọ ọhụrụ a karịa ndị ọzọ

    Arsenal ji otu ọkpụ goolu a na-asaghị asa merie Manchester United ka ha zutere n'ọgbọegwuregwu Old Trafford.

    Nke a bụ nke mbụ Arsenal na-emeri Man Utd na Old Trafford kamgbe af iri na anọ.

    Goolu Pierre-Emerick Aubameyang ji penariti nye na nkeji 69 zuru ịsepụ Man Utd ara n'ọnụ n'abalị a.

    N'agbanyeghi na ọ bụ n'azụ ụlọ ha, Man Utd ahụghị ohere malie elu maọbụ nwee aṅụrị dịka ndị Arsenal ji ha tie okwe.

    Ndị dị ka Paul Pogba bụ ndị Man Utd na-eji aba, menyere ha ihere taa dịka Thomas Partey nke Arsenal fanyere ya n'akpa.

    Nke a kpasuru ndị na-akwado Man Utd oke iwe. Lee ihe ha nwere ikwu gbasara ya:

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    Skip X post, 3
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 3

    N'otu aka ahụ, e kelere Partey maka ịgbari bọọlụ taa.

    Skip X post, 4
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 4

    Skip X post, 5
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 5

  19. Ihe mberede okporoụzọ ataala isi mmadụ 16 n'Ondo steeti

    Ihe ruru mmadụ iri na isii anwụọla n’ihe mberede okporoụzọ n’Akungba-Akoko dị n'Ondo steeti.

    Ahmed Hassan bụ ọnụ na-ekwuru ndị FRSC n’ịchafụ na steeti ahụ, kwuru na ya bụ ihe mere mgbe trailer enweghi brake febara n’ime ahịa ma merụkwaa ndị mmadụ ahụ.

  20. Ala ọmajiji mere na mba Turkey egbuola ihe ruru mmadụ 58

    Ala ọmajijiji

    Ebe foto si, Reuters

    N’ofesi, Ndị ọrụ gbatagbata ka na-achọ ọtụtụ ndị mmadụ ka ihe mberede ala ọmajijiji mere n’obodo Izmir dị na mba Turkey kemgbe ụbọchị Fraịde.

    Ihe ruru mmadụ iri ise na asatọ anwụọla ebe a zọpụtara otu nwoke dị afọ iri asaa ụlọ dagidere kemgbe awa iri atọ na atọ gara aga.