Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. 'Ọgwụ mgbochi coronavirus kpatara ọnụahịa mmanụ ụgbọala ji gbagoo' - Mịnịsta

    Timipre Sylva

    Ebe foto si, Twitter/Timipre Sylva

    Nkọwa foto, Timipre Sylva

    Mịnịsta na-ahụ maka mmanụ agbidi bụ Timipre Sylva ekwuola na ọ bụ n'ihi nchọpụta a chọpụtara ọgwụ mgbochi coronavirus kpatara ọnụahịa mmanụ ụgbọala ji gbagoo na Naịjirịa.

    Sylva kwuru nke a oge ndị ntaakụkọ gbara ya ajụjụ ọnụ n'obi gọọmentị n'Abuja.

    Ọ kọwara sị: "Oge akụkọ pụtara na achọpụtala ọgwụ mgbochi Covid-19, nke a mere ka ọnụahịa mmanụ agbidi n'ahịa mbaụwa gbalie."

    "Ọ bụ nke a kpatara ọnụahịa mmanụ ụgbọala ji gbagoo na Naịjirịa, n'ihi na ọ bụ mmanụ agbidi ka e ji emepụta mmanụ ụgbọala."

    "N'oge mbụ, gọọmentị ji aka ha tinye ọnụahịa mmanụ ụgbọala na Naịjirịa, mana ọ dịghịzi etu ahụ ugbua n'ihi na gọọmentị emeela 'deregulation'."

    Mmanụ ụgbọala bụzị otu narị naịra na iri asaa (N170) maka otu lita ugbua. N'izuụka gara ọ bụ otu narị naịra na iri isii (N160).

  2. Ọnụahịa ihe niile na Naịjirịa arịala elu ọjị - NBS

    Nwaanyị na-ere azụ.

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ihe oriri so na ihe kacha gdaa oke ọnụ n'ahịa Naịjirịa taa

    Ngalaba ngụkọ na Naịjirịa bụ 'National Bureau of Statistics' ekwupụtala na ọnụahịa ọtụtụ ihe (inflation) agbagoola gafee pasentị iri na anọ na ụma abụọ (14.23%) n'ọnwa Ọkutoba.

    Nke a bụ mbuli ọnụ ahịa kacha njọ na Naịjirịa n'ime afọ abụọ na ọnwa isii.

    N'akwụkwọ ozi ndị NBS zipụtara n'ụbọchị Mọnde, ha kwuru na 'inflation' nọbụ na pasenti iri na atọ na ụma asaa (13.7%) n'ọnwa Sepụtemba.

    Kamgbe Naịjirịa kpọchiri oke ala ya n'afọ 2019, ọnụahịa ngwaahịa dị icheiche na-arị arị, mana nke a kawanyere njọ n'ihi ọrịa coronavirus nakwa ndatu ọnụahịa mmanụ agbidi na-adatu n'ụwa.

    Dịka ndị NBS si kwuo, otu n'ime ihe ndị ọnụahịa ya kacha rịa bụ ihe oriri dịka buredi, ọka, nduku, ji, anụ, azụ, mkpụrụosisi, akwụkwọ nri, na ihe ndị ọzọ.

    Ihe ọzọkwa gbaliri nnọọ elu bụ ọnụego njem ụgbọelu, ụlọọgwụ, njem ụgbọala, ọgwụ, ụgbọala, nruzi ụgbọala nakwa akụrụngwa e ji edozi ya.

    N'ọnwa Ọkutoba, ebe ihe kacha galaa ọnụ bụ na Sokoto, Edo, nakwa Akwa Ibom, mana ebe ọnụahịa arịchaghị elu bụ na Oyo, Taraba, na Jigawa.

  3. Gọọmentị Legọs arịọla gọọmentị etiti ego iji dozie ihe e mebiri n'ọgbaaghara End SARS

    Babajide Sanwo-Olu

    Ebe foto si, Twitter/Babajide Sanwo-Olu

    Nkọwa foto, Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu na-egosi ndị Mịnịsta ọtụtụ ihe e mebiri na steeti ahụ

    Gọọmentị Legọs steeti ekwuola na ihe e mebiri n'ọgbaaghara dapụtara dịka ndị ntorobịa mere ngagharịiwe 'End SARS' n'ọdị nso a.

    Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu kwuru nke a n'ọgbakọ e nwere n'ụbọchị Mọnde iji kpaa etu a ga-esi mezie ọtụtụ ụlọorụ, ụgbọala nakwa akụrụngwa gọọmentị e mebiri.

    Ọ rịọrọ arịrịọ ka gọọmentị etiti wepụta ego pụrụ iche n'ime bọjeetị 2020 iji nyere Legọs steeti aka.

    Sanwo-Olu kwuru sị: "Ọgbaaghara a metụtara akụkụ niile anyị si ebi ndụ na Legọs steeti dịka ụlọọrụ gọọmentị nwe, ihe ọkpụkpụ e ji chọọ obodo mma, ụlọ ebe a na-echekwa ihe mgbe ochie, ụgbọala gọọmentị, nakwa ọtụtụ ụlọahịa na ụlọ obibi ndị mmadụ nkịtị."

    "Ọgbaaghara a adọghachila Legọs steeti azụ nnụkwurunnụ ijeri naịra, mana anyị nwere olileanya na anyị ga-apụta na nnukwu ọdachi a."

    Osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo, nọkwa n'ọgbakọ a wee kwe nkwa na gọọmentị etiti ga-enye gọọmentị Legọs nkwado niile dị ha mkpa iji wulikwaa akụnụba steeti ahụ.

    Osinbajo kwuru na ndị ọchịchị Legọs kweskwara iwuli ntụkwasịobi ndị mmadụ nwere n'ebe ha nọ.

  4. Nkeji Coronavirus

  5. Ụmụ Naịjirịa ruru 753 chọrọ isi mba Ghana lọghachi

    Abike Dabiri-Erewa

    Ebe foto si, Twitter/Abike Dabiri-Erewa

    Nkọwa foto, Abike Dabiri-Erewa bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka ndị Naịjirịa bi n'ofesi

    Dịka okwu mmekpa ahụ a na-emekpa ụmụ Naijirịa bi na mba Ghana ka na-arị elu, ụmụ Naijirịa ruru narị asaa na iri ise na atọ ekwuola na ha chọrọ isi Ghana lọghachi.

    Ọ bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka ndị Naịjirịa bi n’ofesi bụ Abike Dabiri-Erewa kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ndị Channels TV nwere n'ụbọchị Mọnde.

    Dabiri-Erewa kwuru na ndị Mịnịsta atọ ya bụ ihe gbasara na-atule etu ha ga-esi gaa kpọlata ndị ahụ chọrọ ịlọghachi ma marakwanụ etu gọọmentị ga-esi nyere ha aka.

    O kwuru sị: "Mmadụ narị asaa na iri ise na atọ bụ ndị binyere aka n'akwụkwọ ma kwuo na ha chọrọ ịlọghachi."

    "Ndị Mịnịsta atọ okwu a gbasara enweela mkparịtaụka ugboro ugboro iji mata ihe ọzọ a ga-eme."

    "Ugbua ndị a kwuru na ha chọrọ ịlọghachi obodo ha, nsogbu adịghị ya. Ha bụ ndị Naịjirịa, obi dị anyị ụtọ na ha chọrọ ịlọghachi, mana ọ dịghị mma ka ha lọghachi na-enweghị ihe ọbụla anyị kwadooro ha."

    Dabiri-Erewa kwukwara na ọ bụghị maka okeala Naịjirịa nke gọọmentị etiti kpọchiri kpatara ụdị agwa gọọmentị Ghana na-akpa.

    O kwuru na o teela ya bụ okwu malitere, nke onyeisiala Muhammadu Buhari na onyeisiala mba Ghana bụ Nana Akfuo-Addo tinyere ọnụ na ya.

    Mana ya bụ okwu ka na-enye nsogbu ruo taa.

  6. Olileanya Inglandi nwere iru agba nke ikpeazụ na Uefa Nation's Lig akpụọla afọ n'ala

    England na Belgium

    Ebe foto si, Getty Images

    N'egwuregwu, n'Uefa Natons League agbara ụnyaahụ, ji ọkpụ goolu abụọ Merie England.

    Nke a pụtara na-olileanya ndị England nwere iwu n'agba nke ikpeazụ egwurrgwu ahụ akpụọla afọ n'ala.

    Ndị Inglandị gbaliri ike ha ịnye goolu maka ya bụ ike ha amịtaghị mkpụrụ.

    Inglandi gbatara ndị nke atọ n'afọ 2019.

  7. Ụgbọ njem urukpuru abụghị nke ndị gọọmentị amalitela njem urukpuru

    Space X

    Ebe foto si, epa

    N'ofesi, mmadụ anọ si mba Amerịka na Japan amapụla njem nchọta na urukpuru bụ nke ha ji ụgbọelu ndị Space X mee.

    Gịnị ka ha na-achọ ebe ahụ? Ụlọọrụ na-eme nchọpụta maka urukpuru nke Amerịka bụ NASA sị na o ruola mgbe ụgbọelu njem urukpuru nke ndị na-achụ ntaego ga-amalitezị ịna aga n'urukpuru.

    Airspace x

    Ebe foto si, Reuters

  8. Ndị ntọ awakpola ụlọakwụkwọ mahadum teknụzụ na Kaduna steeti ebe ha tọọrọ mmadụ atọ

    Ndị uweojii

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị ntọ awakpola ụlọakwụkọ mahadum teknụzụ dị na Kaduna steeti bụ ebe ha gbara otu onye egbe ma tọrọ mmadụ atọ.

    Onye kwuru nke a bụ Mohammed Jalige bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ onye kwuru na ndị ajọ mmadụ a wakporo mahadum a n'abalị Satọde.

  9. Unu asaala chi ee! Taa bụ Orie ga-ewetere anyị ihe ọma. Ndụ mmiri ndụ azụ. Ndụ nwoke, ndụ nwaanyị

  10. Ka chi fo

    Gbaanụ mbọ soro anyị echi maka akụkọ ndị dị mkpa na-ewu n'ogbe gị.

  11. Gọvanọ Anambra steeti amanyela ụbọchị ezumike maka Nnamdi Azikiwe

    N'ozi ha ziputere, Gọọmentị Anambra steeti kwuru na ha-ekewapụtala otu ụbọchị dịka ụbọchị ezumike iji cheta ma kwanyere Nnamdi Azikiwe ugwu.

    Ụbọchị ahụ ahọpụtara bụ ụbọchị iri na isii nke ọnwa Nọvemba afọ 2020.

    Gọvanọ Willie Obiano

    Ebe foto si, Chief Willie Obiano

  12. Ndị bu egbe egbuola mmadụ 34 n'Itiopia

    Ndị omekome bu egbe agbabupla ihe ruru mmadụ iri atọ na anọ na ọdịda anyanwụ Itiopia mgbe ha wakporo out ụgbọala njem n’ebe ahụ.

    Ngalaba na-ahụ maka ikike ruru onye na mba ahụ na-ekwu na ọtụtụ mmadụ ka nwereike ịnwụ na mwakpo ahụ mere na mgbede ụbọchị satọde.

  13. Ka chi fonu!

    Ọ bịara ije nwe ụna! Ka ọ dịnụ echi.

  14. Igbos: Ọchịchị 2023 akpalitela aha ndị Igbo na Twitter ọzọ, Ihe ndị mmadụ na-ekwu mere 'Igbos' ji malite iwu na soshal midia

    Dịka afọ 2023 na-abịa nso nso, ọtụtụ nkata gbasara ọchịchị Naịjirịa n'afọ ahụ na-apụta.

    Nke dapụtara taa metụtara ndị Igbo mekwara ka ha wuo ewu na soshal midia.

    Ọ malitere mgbe otu onye bụ Hayatu kwuru na otu APC na PDP agaghị enye ndị Igbo ohere ịzọ ọkwa onyeisiala na otu ha.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Okwu ya kpalitere mmụọ ndị ọzọ nke mere na ụfọdụ mmadụ katọrọ ya na-ekwu na ọ kpọrọ ndị Igbo asị.

    Otu onye akpọrọ Dokun Ojomo pụtakwara rịọ ka ndị Igbo gbaghara ya ma kwuo na ndị Igbo agbalịala otu PDP hoo haa.

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    Afam Deluxo bụ onye a ma ama kwukwara na ọ bụrụ na ha arịọghị mgbaghara na ọ ga-esi imi n'ala hụ na ndị Igbo atụnyeghịrị Atiku na ntụliaka afọ 2023 na-abịa.

    Kedụ ihe bụ uche gị maka okwu a a na-ese?

    Skip X post, 3
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 3

  15. Ndị Israel gburu otu onyeisi ndị Al-Qaeda

    Ndị oyi egwu a na-achọ achọ na mba Pakịstan

    Ebe foto si, Reuters

    N'Ofesi ndị nta akụkọ Reuters ekpuheela na ndị ọrụ nchekwa nzuzo mba Israel egbuola ọnyeisi nke abụọ ndị otu Al Qaeda na mba Iran.

    Ha gbagburu Abdullah Ahemed Abdullah n'ụbọchị asaa nke ọnwa ọgụst.

    Abdullah bụ onye kpara nkata ogbunigwe gbara n'ụlọ nnọchịte mba Amerịka ndị dị n'afrịka n'afọ 1998.

    Agbagburu Abdullah bụ onye eji Abu Muhammad al-Masri mara na nwa ya nwaanyị bụ nwunye nwa Osama Bin Laden bụbu onyeisi otu ahụ.

    Ndị mba Iran na-ekwu na akụkọ a abụghị eziokwu n'ihi na enweghị otu Al Qaeda na mba ha.

  16. Ekpuheela ụgbọala ji ọku latrịka agba na Legọs steeti

    Babajide Sanwo-Olu

    Ebe foto si, Lagos state Govt/ Twitter

    Gọvanọ Legọs steeti bụ Babajide Sanwo-Olu ekpuheela ụgbọala mbụ arụrụ na Naijirịa nke na-eji ọkụ latrịk agba.

    Ọ bụ ndị ụlọọrụ Satllions Automobile rụrụ ya bụ ụgbọala nke agha ya bụ Hyundai Kona.

    Dịka Sanwo-Olu na-ekpuhe ya ka o kwuru na gọọmentị Legọs steeti ga-arụ ebe ndị mmadụ a ga-aga tinye latrịk na ya bụ ụgbọala.

    N'otu aka ahụ ka Sanwo-Olu ji ohere a kwe ndị mmadụ nkwa na gọọmentị ya dị njikere ịrụcha okporo ụzo nke Legọs-Ibadọn ma banye kwa n'agba nke abụo nke ụzọ Aradagun Imeke.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  17. Mmadụ 156 ọzọ ebutela ọrịa coronavirus na Naijirịa

    Ọnụ ọgụgu ndị bu ọrịa coronavirus

    Ebe foto si, NCDC

    Ngalaba NCDC edepụtala na ọnụ ọgụgụ ndị buterela Coronavirus na Naijirịa kamgbe o bidoro nọzị na puku iri isii na anọ, narị asatọ na iri asatọ na anọ.

    Ndepụta ọhụrụ ha depụtara gosiri na otu onye ọzọ anwụọla sịta n'aka ya bụ ọrịa ebe mmadụ otu narị na iri anọ na isii ọzọ agbakeela ebe otu onye ọzọ nwụrụ n'aka ya bụ ọrịa.

  18. Ị bọọla chị!

    Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị

  19. Ụmụ Naijiria 32 mba Germany chụrụ alọtaala

    Ụmụ NAijiria 32 mba Jamanị gbara ụgbọ nwa mkpi alọtala na Naijiria ụbọchị Fraide.

    Otu onye ọrụ ụlọọrụ na-ahụ maka mbata na ọpụpụ gwara ndị ntakụkọ na ọ bụ ụgbọelu 'EnvelopeAirlines' bulatara ha n'ọdọụgbọelu 'Murtala Muhammed Airport dị na Legos.

  20. Naijiria ga-agbazite ego dị nde dọla 750 n'aka 'World Bank'

    Gọọmenti Etiti na-achọ ịgbazitere ego dị nde dọla narị iri asaa na iri ise n'aka ụlọakụ mbaụwa Bekee kpọrọ 'World Bank'.

    Mịnịsta na-ahụ maka ego na Bọjeti bụ Zainab Ahmed bụ onye gbara ama ụbọchị Fraide n'Abuja n'emume nhibe kọmịtị na-agba mbọ maka gbapụta na nsogbu Covid-19 dọbara akụnaụba Naijiria.

    Ahmed kwuru na ego mgbazite ahụ bụ iji kwalite akụnaụba Naijiria nke Covid-19 kụpịara.

    “Niajiria dịka omba kachasị n'Afrịka agaghị arịanwụ ịtọ n'ọtanisi; ịzọta ndụ mmadụ dị nde narị abụọ bụ mgbado ụkwụ ihe anyị na-ekwu."

    Zainab Ahmed

    Ebe foto si, Federal Ministry of Finance