Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. 'Ebum n'uche anyị bụ ka anyị mụta ejima yiri onwe ha ga-alụ ejima ọzọ dịka anyị'

    Ụmụejima nụrụ onwe ya

    Ebe foto si, VILLA DIGITAL STUDIO

    Ụmụokorobia gbara afọ 33 bụ Hassan Sulaiman Indabawa na ejima ya bụ Hussain nụrụ ejima ụmụnwaanyị ọzọ Hassana Ado Ashir na Hussaina na Kano ụbọchị Fraịda, 20, Nọvemba, 2020.

    Ha gwara BBC na ịhe ha na-arịọ chukwu bụ ka ọ nye ha ejima ga-alụ ejima ọzọ.

    Hassan na onwe ya sị na ya na ejima ya na-emekọrịta ihe kemgbe ha bụ nwata, na ha na-echekwa na ọ ga-amagbu onwe ya ma ha lụọ ejima abụọ.

    "Mgbe anyị nọ n'ụlọakwụkwọ, anyị na eyi otu akwa, eri ofu nri, nọrọkwa n'otu klasị n'ụlọakwụkwọ ahụike ebe ọnụọgụ nwanne m bụ 010, nke nwanne m bụrụ 011". " Ọbụghị taa ka anyị chọwara ilu ejima. Oteelarị ndị be anyị chọwara ka anyị lụọ ejima abụọ".

    Ndị nke mbụ anyị nwetere adabaghị.

    Mana ugbua obi dị anyị ụtọ na-anye enwetela

  2. Ndị uweojii ndị ntọrị nwụchiri na Zamfara agbaala ọsọ

    Ndị uweojii Naịjirịa

    Ebe foto si, APC

    Akụkọ si Zamfara steeti na-ekwu na ndi uweojii ndi ntọrị nwụchiri n'ụzọ si Zamfara gawa Katsina agbapụla.

    Ndị ma maka ihe a gwara BBC Hausa na ndị ntọrị a tụghapụrụ mmadụ ise n'ime ndi uweojjii dịka mmadụ asatọ n'ime ha gbara ọsọ n'ebe e ji ha.

    Mmadụ ise ndi ntọrị ji aka ha tughapụ nọ n'ụlọ ọgwụ dị n'obodo Gusau anata ọgwụgwọ.

    Cheta na ndị ama gwara BBC Hausa na ndị ntọ ahụ nwụchiri ndi uweojii 12.

    Agbanyeghi na a na-ekwu na ndị uweojii akwụghị ụgwọ iji nwere onwe ha, otu onye ma maka ihe a mere kwuru na otu n'ime ndị uweojii ahụ sị na ha kwuru ụgwọ iji gbapụta onwe ya.

  3. Mba Chaịna agaghị ejichi akụ na ụba anyị - Mba Mozambique

    Onyeisiala mba Chaịna

    Ebe foto si, Getty Images

    Mba Mozambique agbaahala akụkọ na-efegharị na-ekwu na mba China ga-ejichi ụfọdụ akụ na ụba ha maka ụwgọ ha ji.

    Minista ego nke mba ahụ bụ Adriano Maleiane kwuru na onweghi eziokwu dị na ya chaa chaa.

    O kwuru na nkwekọrịta dị n'etiti ha na mba Chaịna bụ nke ziri ezi.

  4. Naịjirịa ga-amalite ịzụ mmanụ agbịdị n'aka mba Niger

    Okporo mmanụ agbịdị

    Naịjirịa na Nije ebinyela aka n'akwụkwọ nkwekọrịta nke ga-ahụ na Naịjrịa ga na-ego mmanụ agbịdị site Nije.

    Timipre Sylva bụ minista na-ahu maka mmadụ agbịdị sị na Nije nwere ọtụtụ mmanụ ọ chọrọ ire ebe Naịjirịa nwere ahịa a ga-ere ya.

    Ha kwuru na ha malitere mkparịtaụka na nzụkọ gbasara atụmatụ a kemgbe afọ anọ gara aga tupu o nwee isi.

  5. Akpụpụla gọọmentị Tanzania ụlọikpe maka ịmachị ụmụakwukwọ tụrụ ime ịgụ akwụkwọ

    Ụmụ akwụkwọ ụmụ nwaanyị

    Ebe foto si, Tolu Ogunlese

    Otu na-ahụ maka ọdịmma ụmụwaanyị ak[ọrọ “Equity Now” akpụpụla gọọmentị Tanzania ụlọikpe na-ahụ maka mmekpa ahụ bụ “Africa Court on Human and People’s Rights” maka mmachị ọ machịrị ụmụakwụkwọ tụrụ ime.

    Ngalaba a kwuru na ha na-aga ụlọikpe a maka mgbọ niile ha gbara banyere ihe a amịtaghị mkpụrụ.

    Gọọmentị Tanzania etinyebeghị ọnụ n’okwu ikpe a.

    Iwu ha hibere n’afọ 2002 nyere ohere ka achụpụ ụmụakwụkwọ tụtara ime n’ụlọakwụkwọ.

    Iwu a sị na a ga-achụpụ-ụmụakwụkwọ a maka “mpụ” na “imegide alụmdị na nwunye”.

    Otu ọdịmma ụmụnwaanye na-arịọ gọọmentị kemgbe ka ọ gbanwe iwu a.

    Ihe ruru ụmụakwụkwọ 800 na-ahapụ ụlọakwụkwọ kwa afọ maka ịtụ ime, dịka otu Human Rights Watch siri kwuo.

    Equality Now sị na mmachị a na-emegide ụmụnwaanyị ma na-aranye ha na okirikiri ụkpa ma na-eme ka ha danye n’ihe dị ka ibi ugwu.

  6. Femi Gbajabiamila etiela ezinaụlọ nwoke nwụrụ n'Abuja aka n'obi

    Onyeisi ụlọomeiwu nta bụ Femi Gbajabiamila

    Ebe foto si, @Femigbaja/Twitter

    Onyeisi ndị omeiwu obele na Naịjirịa bụ Femi Gbajabiamila ekwuola na ya achụọla onye uweojii na-arụrụ ya ọrụ maka ogbugbu onye na-are Newspaper.

    Gbajabiamila sị na ọ bụ oge ndị uweojii na-achekwa ya gbalịlị egbe elu iji chụsasịa ndị nọchịrịụgbọala ya ụzọ ka mgbọ tụrụ nwoke a gbuo ya.

    N'ozi o depụtara n'akara Twitter ya, o kwuru na ọnwụ nwoke ahụ wutere ya nke ukwu ma zigara ezinaụlọ nwoke ahụ ozi itiakanobi.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  7. Joe Biden emeriela ngụgharị vootu emere na Georgia

    Joe Biden

    Ebe foto si, Reuters

    Mmeri Joe Biden na ntụliaka onyeisiala mba Amerịka kwụ chị m ugbua dịka o meriri ngụgharị ntuliaka emere na steeti Georgia.

    N'otu aka ahụ mbọ niile Donald Trump na-agba ịgbagha ya bụ mmeri n'ụlọikpe enwebeghi isi dịka ụlọikpe steeti atọ tụpụrụ ya.

    Biden ji vootu ruru 12,284 were merie Trump nke ngụkọ iwu steeti ahụ hibere si gosi.

    A na-atụ anya na Biden ga-abanye n'ọkwa n'ọnwa Jenụwarị afọ 2021 na-abịa.

  8. Unu apụtala ụtụtụ?

    Nnọọ nụ na peeji anyị taa.

    Akụkọ dị ọkụ ka o si dị ọkụ bụ ihe anyị ga na-ewetara unu taa.

  9. Ndị agha Ethiopia ebola Tedros Adhanom Ghebreyesus ebubo ịkwado ndị agha nnupuisi Tigray

    Tedros Adhanom Ghebreyesus

    Ebe foto si, AFP

    N'Afrịka, Ọchịagha mba Ethiopia bụ Gen Berhanu Jula ebola onyeisi WHO bụTedros Ghebreyesus ebubo ịdọnyere ndị agha nnupuisi ndị Tigray ukwu dịka agha dị na mba ahụ tarala isi ọtụtụ mmadụ.

  10. 'Ọ dịka gọọmentị achọghị ka ụmụakwụkwọ mahadum malite akwụkwọ n'afọ a' - ASUU

    Ụmụakwụkwọ Mahadum

    Otu jịkọrọ ndị nkuzi mahadam bụ ASUU n'ịchafụ ekwuola na ọnụokwu gọọmentị egosila na o nweghị mgbe ha chọrọ ka ha mepee ụlọakwụkwọ mahadum n'afọ a.

    Nke a bụ na nsahachi okwu Minista na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige kwuru bụ ebe ọ sị na usoro akwụm ụgwọ ọnwa ha wetere bụ IPPIS agaghị akwusili mpụ na mahadum Naịjirịa.

  11. Ihe Paul Okoye sara onye sị ka ya na ejima Peter mee udo

    Paul Okoye

    Ebe foto si, Paul Okoye

    Paul Okoye akatọọla otu onye ọ kpọrọ ‘Aunty’ maka inye ya na ejima ya Peter ozi ekele n’ụbọchị ncheta ọmụmụ ha ma sị ha gbalịa mee udo.

    Paul depụtara nke a n’akara Instagram ya ma kwuo na onye ahụ ọ kpọrọ ‘Aunty’ na-aghọ ag hụghọ na aka ya dị na-eseme okwu dị n’etiti ya na ejima ya.

    Ọ sị na kamgbe afọ anọ gara aga na ‘Aunty’ a kpọtụbeghi ya n’ekwentị kama n’ụbọchị 18 Nọvemba afọ ọbụla ọ pụta na soshal midia na-ekele ha ka ndị mmadụ sị na ọ bụ onye ọma.

    Mana ndị mmadụ agaghị ama ihe ọjọọ ọ na-eme n’ime ụlọ, na ọ pụta n’ezi o mee ka onye mmụọ ozi.

    Paul sị na ọ gaghị ata ya ụta maka na ọ bụ soshal midia nyere ya ohere ikwu ihe o kwuruna ọ gwa afọ ọzọ ọ bịa dee ihe ọzọ.

    Ihe Paul Okoye dere

    Ebe foto si, @kingrudy

    N’agbanyeghi na Paul akpọghị onye bụ ‘Aunty’ a aha mana aka onye ọbụla na-arụ nwunye ejima bụ Lola Omotayo Okoye aka na ọ bụ ka Paul na-ekwu.

    Nke a bụ maka na Lola ziteere Paul na di ya Peter ozi ekele ncheta ụbọchị ọmụmụ ha n'akara instagram ya ebe o zipụtara foto ha abụọ.

    Skip Instagram post
    Hapụ Instagram ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of Instagram post

    BBC Igbo gbara mbọ ịnụta n’ọnụ Peter Okoye site n’aka ọnụ na-ekwuru ya mana ọ zaghị mgbe a kpọrọ ya.

    Cheta ejima abụọ a malitere iti egwu n’afọ 2003 ebe ha etiela ọtụtụ egwu wuru ewu na Naịjirịa nakwa ụwa.

    Mana n’afọ 2017, akụkọ pụtara na ejima abụọ a agbasala n’ihi esemokwu dị n’ezinaụlọ.

  12. Etu nabata David Umahi na APC si aga n'Abakiliki

    David Umahi bụ aka na-achị Ebonyi steeti afeela pati o si n'aka ha bụrụ gọvanọ bụ Peoples Democratic Party (PDP) aka.

    Emune eji anabata ya na-aga n'ihu n'Abakaliki ugbua.

    David Umahi na ndị na anabata ya na APC
    Nkọwa foto, David Umahi sị na ọ bụ maka etu pati PDP si mee Ọwụwa Anyanwụ ka o ji pụọ na pati ahụ
    David Umahi na ndị na anabata ya na APC
    David Umahi na ndị na anabata ya na APC
    David Umahi na ndị na anabata ya na APC
    David Umahi na ndị na anabata ya na APC
    David Umahi na ndị na anabata ya na APC
    David Umahi na ndị na anabata ya na APC
  13. Ihe anyị mere ndị Igbo kemgbe 1998 dị ọtụtụ- PDP

    PDP logo

    Ebe foto si, @OfficialPDP

    Otu PDP agọola sị na ebubo Gọvanọ David Umahi nke Ebonyi steeti boro ha na ha megburu Igbo na agbanyeghị nkwado puru iche site na mpaghara Ọwụwa-Anyanwụ.

    N'ozi nke ha wepụtara nke odeakwụkwọ mgbasaozi ha bụ Kola Ologbondiyan binyere aka, PDP kwuru na ihe ha mere ndị Igbo karịrị akarị.

    Nnamani,Enwerem, Anyim,Okadigbo, Wabara

    Ebe foto si, Nnamani,Anyim,Wabara,Okadigbo

    PDP, ndị jụrụ ihe APC merela ndị Igbo kwuru na ha nyere Igbo :

    1. Ọkwa onyeisi Sineti ụgboro ise:nke Evans Enwerem, Chuba Okadigbo, Anyim Pius Anyim, Adolphus Wabara na Ken Nnamani jiri.

    2. Ọkwa Osote Onyeisi Sineti nke Sen Ike Ekweremadu onye ji ọkwa ahụ afọ 12

    3. Ọkwa Onyeisi Ụlọnnọchiteanyị nke Emeka Ihedioha jiri

    4. Ọkwa onyeisioche pati nke Vincent Ogbulafor na Okwesilieze Nwodo jiri.

    5. Ọkwa 'Chief of Army Staff' nke Lt. Gen. Azubuike Ihejirika jiri

    6. Ọkwa Odeakwụkwọ Gọmmentị Etiti nke Anyịm Pius Anyim jiri

    7. Ọkwa onyeisi Ụlọakụ Etiti (CBN) Dr. Charles Soludo jiri

    8. Ọkwa Mịnịsta na-ahụ maka ego nke Ngozi Okonjo-Iweala jiri

    9. Ọkwa onyeisioche Inec nke Maurice Iwu jiri

    10. Dave Umahi jiri ọkwa Onyeisioche pati ha, Osote Govano nakwa ọkwa Gọvanọ ụgbọrọ abụọ.

  14. 'Jonathan rụrụ ezigbo ọrụ na Naijirịa' - Buhari

    Goodluck Jonathan na Muhammadu Buhari

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Bihari ezigarala Goodluck Jonathan ozi ekela dịka ọ gbara afọ iri isii na atọ n'ụbọchị Frịde.

    Ọ bụ onye ode akwụkwọ onyeisiala bụ Femi Adesina ka o zịgara ya ozi ogologo ndụ na ahụ isi ike.kwuru nkea.

    Buhari kwuru na etu Jonathan siri chia wetara Naijirịa ọganiru na ugwu ziri ezi.

    Buharị kelekwara Jonathan maka mbọ ọ na-agba dịka onye nnọchite anya na onyeisi ngalaba ECOWAS iweta udo na mba Mali.

  15. Ọ fọrọ obere ka gọọmentị wepụta 'Finance Bill' nke afọ 2020

    Muhammadu Buhari

    Ebe foto si, Presidency Nigeria/ Twitter

    Ụlọọrụ onyeisiala Naijirịa ekwuola na ọ fọrọ obere ka gọọmentị wepụta iwu nkwado nke ga-enyere aka ị hụta na-emezuru ihe dị n'ime Bọjet 2021.

    Ya bụ iwu gụnyere ụtụisi ndị ọzọ na atụmatụ nke ga-ebelata ahụhụ ndị Naijirịa na-ata maka etu onodụ akụnụba obodo dị.

    Lee ụfọdụ ihe gbara okpụrụkpụ

    1) Ibelata ụgwọ ụtụisi ndị na-ebubata ụgbọala eji akọ ugbo na nke ehi ebu ibu na ndị mmadụ na Naijirịa

    2) Inye ohere ka ụlọọrụ ndị bere mpe hapụ ịkwụ ụtụisi nke TETFUND

  16. NBA Draft 2020: Lee Ụmụafo Naịjirịa ahọpụtara isonye tụọ bọọlụ nkata NBA n'afọ a

  17. Mmadụ atọ anwụọla maka ọgbaaghara sochiri nwụchi Bobi Wine

    Ndị na-eme ngagharị iwe na Uganda

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị uweojii mba Uganda ekwuola na mmadụ atọ anwụọla ebe ọtụtụ ndị ọzo merụrụ ahụ dịka ọgbaaghara dapụtara mgbe ndị mmadụ mere ngaghariiwe maka nwuchi a nwuchiri onye soro azọ ọkwa onyeisiala mba ahụ bụ Robert Kyagulani bụ onye eji Bobi wine mara oge ha na-eme emume achụmnta votu.

    Akwụkwọ ozi ndị uweojii ekwughị etu mmadụ atọ a siri nwụọ.

    Kama ihe onyonyo na-agagharị na Soshal Midia gosiri ndị mmadụ ọbara juru ahụ ebe ụfọdụ n'ime ha tọgbọrọ ka ndị nwụrụ anwụ.

    A nwụchiri Bobi Wine na mpaghara Luuka dịka ndị uweojii boro ya ebubo na o hiwere nzụkọ nke nupuru isi n'usoro nchekwa ọrịa coronavirus gọọmentị hiwere.

    A nwuchikwara onye ọzọ sọ azọ ọkwa onyeisiala mba ahụ aha ya bụ Patrick Amuriat Oboi.

    Mba Uganda ga-eme ntuliaka maka ọkwa onyeisiala ha n'ọnwa Jenuarị nke mere na ndị uweojii na-amachi nzụkọ ọbụla maka nchekwa ọrịa coronavirus.

  18. O nwere gọvanọ PDP ọzọ ga-aba APC - Wike

    Gọvanọ na-achị Rivas steeti bụ Nyesom Wike ekwuola na o nwere gọvanọ ọzọ no na pati Peoples Democratic Party (PDP) ga-esoro gọvanọ na-achị Ebonyi Steeti bụ David Umahi gawa pati All Progressive Congress (APC).

    Wike kwuru nke a dịka ọ na-eme mkaprịta ụka na Channels TV ụnyaahụ bụ Wenesde.

    Ọ sị na ya agaghị akpọ ahọ́ gọvanọ ahụ dịka ọ na-ekwu na ihe Umahi sị mere ya jiri pụọ na PDP esighi ezi.

    "Umahi bụbụ onyeisi PDP n'Ebonyi, bụrụ osote gọvanọ tupu ọ bụru gọvanọ. Kedụ ihe mere mamdụ dị ka ya ga-asị na o nweghị ihe o ritere n'aka PDP?" bụ ajuju Wike jụrụ.

    Onye bụbụ Minista na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Osita Chidoka sokwa tinye ọnu n'okwu banyere ọpụpụ Umahi site n'ịtu ilu maka nwoke chọrọ ịdịna nwunye nna ya.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Ka o si kwuru ugbua, David Umahi na APC na steeti ya ga-eme emume nnabata taa bụ Tụzde n'Abakiliki bụ isi obodo Ebonyi.

  19. 'ASUU na gọọmentị etinyela ndụ anyị na nsogbu' - Ụmụ akwụkwọ mahadum

    Ụmụakwụkwọ Mahadum

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụmụ akwụkwọ mahadum na Naijirịa ekwuola na ọ bụ ha na-ata ahụhụ dịka ngalaba jịkorọ ndị nkuzi mahadum na Naijirịa bụ ASUU na-agba abụbọ ọrụ maka nghọtahe ha na gọọmentị nwere maka akwụm ụgwọ.

    Nkea na-eme dịka ndị ASUU na-agwa ụmụ akwụkwọ na ndị nne na nna ka ha hapụ ịtụ anya na mahadum ga-ebido akwụkwọ nsonso a.

    Abụbọ ọrụ ndị ASUU hiwere isi n'ebubo na gọọmentị Naijirịa achọghị ọdịmma ha ma jụ kwa ịkwụ ha ụgwọ ọnwa asatọ.

    Otu nwata akwụkwọ kwuru sị " Unu mere anyị bụ ụmu ndị o na-enweghị etu ọha ha ebere, anyị anọọla n'ụlọ ọnwa asatọ na nkịtị".

    Ndị ngalaba ASUU na ndị gọọmentị ka na-achọ ụzọ iji hụ na ha kpeziri.

    Ihe ụfọdụ ụmu akwụkwọ na-ekwu maka ọnọdụ ha

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2

    End of X post, 2

    Skip X post, 3

    End of X post, 3

    Skip X post, 4

    End of X post, 4

    Skip X post, 5

    End of X post, 5

    Skip X post, 6

    End of X post, 6

    Skip X post, 7

    End of X post, 7

    Skip X post, 8

    End of X post, 8

  20. Ndị agha Naịjirịa sị na ha ejirila ogbunigwe gbuo ọtụtụ ndi oji egbe awakpo mmadụ

    Ụgbọelu ndi agha

    Ebe foto si, Belgian military

    Ndị agha Naịjirịa kwuru n'ụbọchị Wenesde na ha gburu ọtụtụ ndị omekome ji egbe aga dịka ha malitere iji ogbunigwe e bu n'ụgbọelu awakpo ha na mpaghara ugwu mba ahụ.

    Nke a na-abịa dịka ntọrị mmadụ na mwakpo na-akawanye njọ na mpaghara ahụ.

    Ndị omekome atọrọla ọtụtụ mmadụ -- ma gbuo ọtụtụ -- n'ime izu ụka gara aga n'ụzọ si Abuja gawa Kaduna.

    Ndị agha sị dịka ha nwetere ama, ndị agha nọ n'ala nakwa ndị nke elu wakporo ọdọ ndị omekome a dị nso n'okporo ụzọ.

    Ha kwuru na ha gburu ọtụtụ ndị omekome, ma ha ekwughi mmadụ ole ọ bụ.

    Ọnu na-ekwuru ndị agha Naịjirịa bụ John Eneche si na ọ bụ n'ọnụ ụtụtụ ka ndị agha malitere ịkwa mgbọ n'ụlọ ha che bụ nke onyeisi ndị omekome a e ji "Major" mara.

    Ndị omekome na-eru narị kwa narị na-enye nsogbu n'ime obodo dị na mpaghara ugwu Naịjirịa n'ime afọ ole ma ole gara aga. Ha na-ezu ehi ma na-atọrị mmadụ.

    Ọ bụ ego ka ndi na-eji akpa ike a mana ndị ọkachamara n'ihe banyere nchekwa sị na ndị ofufe Alakụba chọrọ ka ndị mmadụ soro ofufe ha n'ike na-esonye ha n'ike n'ike.